Chebe Echiche nke Ịdị Ngwa Gị
GỊNỊ bụ otu ụzọ e ji n’aka, nke Chineke nwapụtara nke isi nọgide jiri obi dum na-ejere Jehova ozi? Ọ bụ inwe echiche ziri ezi nke ịdị ngwa n’ime ime obi anyị. Iji obi dum jeere Chineke ozi pụtara iji onwe anyị dum jeere ya ozi, ọ chọkwara nrubeisi sitere n’obi, nke zuru ezu n’ihe nile ọ sịrị anyị mee.
Onye amụma bụ́ Mosis mesiri mkpa nke a dị ike mgbe o nyere mba Israel ntụziaka, sị: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” (Deuterọnọmi 6:5) Ọtụtụ narị afọ n’ihu Kraịst Jisọs nyeghachikwara otu iwu ahụ, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Pọl onyeozi zoro aka n’otu ihe a a chọrọ anyị n’aka mgbe ọ gwara ndị Efesọs ka ha “na-eme ihe Chineke na-achọ site ná mkpụrụ obi [ha],” na mgbe ọ gbara ndị Kọlọsi ume, sị: “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ.”—Ndị Efesọs 6:6; Ndị Kọlọsi 3:23.
Otú ọ dị, o siri ike itinye obi anyị na mkpụrụ obi anyị n’ozi anyị na-ejere Chineke ma ọ bụrụ na anyị enweghị echiche nke ịdị ngwa n’ime onwe anyị ma ọ bụ ọ bụrụ na echiche nke ịdị ngwa anyị nweburu adịkwaghị nkọ́ ugbu a—ikekwe bụrụ nke e tufuru. Taa, anyị na-ebi n’oge dị ngwa nke na-enweghị oge ọ bụla ọzọ yiri ya n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.
Oge Ụfọdụ Kpọmkwem Dị Ngwa
Tupu oge ndị Kraịst e nwere ọtụtụ oge dị ngwa. Ụbọchị Noa na oge ndị dịịrị rute ná mbibi nke Sọdọm na Gọmọra bụ kpọmkwem oge ndị dị ngwa n’ezie. (2 Pita 2:5, 6; Jud 7) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na afọ ndị dị tupu Iju Mmiri ahụ jupụtara n’ihe omume dị ngwa. Ọ bụ ezie na Noa na ezinụlọ ya amaghị kpọmkwem mgbe Iju Mmiri ahụ ga-amalite, “egwu Chineke” ha ga-emeworị ka ha ghara ịdị na-eyigharị ihe.—Ndị Hibru 11:7.
N’otu aka ahụ, tupu mbibi nke Sọdọm na Gọmọra, ndị mmụọ ozi ahụ “nụkpọrọ Lọt” wee gwa ya, sị: “Wepụga onwe gị n’ihi ndụ gị.” (Jenesis 19:15, 17) Ee, n’oge ahụkwa, ime ihe ngwa ngwa zọpụtara ndụ ndị ezi omume. Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị a gbara ndị Juu e ji eji bụ́ ndị nọ na Babilọn ume, sị: “Wezụganụ onwe unu, wezụganụ onwe unu, sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe rụrụ arụ: sinụ n’etiti ya pụọ.” (Aịsaịa 52:11) Na 537 T.O.A., ihe dị ka 200,000 ndị a dọtara n’agha mere ngwa si na Babilọn pụọ ná nrubeisi nye iwu amụma ahụ dị ngwa.
Echiche nke ịdị ngwa n’ime nke ọ bụla n’ọnọdụ ndị ahụ mere ka ndị ahụ chere ma nọgide na-eche na ha na-ebi n’oge ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa jiri obi ha dum jee ozi.
Ịdị Ngwa n’Oge Ndị Kraịst
A pụkwara ịnụ mkpu nile nke ịdị ngwa ebe nile n’ime Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. “Lezienụ anya,” “mụrụnụ anya,” “na-echenụ nche,” “unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo”—ndị a nile bụcha okwu ndị Kraịst Jisọs ji kụnye echiche ịdị ngwa ziri ezi n’ime ụmụazụ ya. (Matiu 24:42-44; Mak 13:32-37) Tụkwasị, ihe atụ ya dị iche iche banyere ụmụ agbọghọ iri, ajọ ohu ahụ, talent ndị ahụ, na ikewa ụmụ atụrụ pụọ n’ụmụ ewu ha nile na-akpali atụmanya ihe ma na-akpasu mmetụta nke ịdị ngwa.—Matiu 25:1, 14, 15, 32, 33.
Ọ bụghị nanị na Jisọs kwuru okwu banyere ịdị ngwa kama ọ kwadokwara ịbụ ezie nke ihe ndị o kwuru site n’iji ịdị ngwa na-arụ ọrụ. N’otu oge ọ gwara ìgwè mmadụ mgbe ha nwara igbochi ya ịpụ, sị: “Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke: n’ihi na e zitere m ime nke a.” (Luk 4:42, 43) Ọzọkwa, ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha rịọ Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ izipụkwu ndị ọrụ gaa n’owuwe ihe ubi Ya n’ihi na “owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” (Matiu 9:37, 38) Arịrịọ dị otú ahụ e ji ekpere rịọ na-egosi mmụọ nke ịdị ngwa.
Ịdị Ngwa Dị Otú ahụ Ò Hiere Ụzọ?
Ụfọdụ pụrụ iwelite ajụjụ ahụ ezi uche dị na ya bụ́, N’ihi gịnị ka echiche nke ịdị ngwa ji dị mkpa laa azụ n’oge ahụ ma ọ bụrụ na “mkpagbu ukwu” ahụ e buru n’amụma ka bụ ọtụtụ narị afọ n’ihu?—Matiu 24:21.
Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụghị nnọọ aghụghọ efu Jisọs ji mee ka ndị na-eso ụzọ ya na-arụsi ọrụ ike n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe. Ee e, ọ bụ ịhụnanya Kraịst nwere maka ndị na-eso ụzọ ya, tinyere nghọta ya zuru okè banyere otú Jehova si ele oge anya, bụ́ ebe ndụmọdụ ya banyere ịdị ngwa dabeere. Ee, Kraịst Jisọs maara na echiche nke ịdị ngwa dị mkpa iji mezuo uche Jehova dị ka nzube Chineke si dị. Ọzọkwa, ọ maara na ndị na-eso ụzọ ya ga-erite uru n’onwe ha n’ụzọ ime mmụọ site n’ịnọgide na-enwe echiche nke ịdị ngwa ruokwa mgbe ọ ga-alaghachi.
Jisọs Kraịst egosiworị n’ụzọ doro anya na e nwere ọrụ ịgba àmà zuru ụwa ọnụ a ga-arụzu n’ime ntakịrị oge. (Matiu 24:14; Mak 13:10) Nkebi dị iche iche na-aga n’ihu nke ọrụ a bụ nke e kpughere nanị ka ọrụ ahụ pụtara ìhè. Ma ịdị ngwa dị mkpa iji rụzuo àgbà nke ọ bụla. Jisọs gosiri usoro ịga n’ihu nke ọrụ a mgbe ọ sịrị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Nke ahụ bụkwa otú ọrụ ahụ siworo na-apụta ìhè rute taa. Ọ pụtaworo ndị ohu Chineke ihe ijuanya ụfọdụ ka oge na-aga, na-eme ka ọ dị mkpa mgbe ụfọdụ inwe mgbanwe ná nghọta.
Echiche ịdị ngwa nke ndị Kraịst emezuwo nzube Jehova. O nyeworo ndị na-eso ụzọ Kraịst aka ịrụzu usoro ịga n’ihu nke ọrụ ha dị ka usoro oge na-adịghị ada ada nke Jehova si dị. Ya mere taa, n’ileghachi anya azụ n’ihe fọrọ nke ka ọ bụrụ 2,000 afọ, anyị na-aghọta usoro oge ahụ nke Chineke nke ọma karị.
Ịdị ngwa nke ndị Kraịst nyeere ndị na-eso ụzọ aka ịgba àmà nke ọma na Jerusalem, Judia, Sameria, na nye ndị Juu gbasasịrị agbasasị tupu 36 O.A. mgbe amara pụrụ iche e gosiri Israel bịara ná njedebe. (Daniel 9:27; Ọrụ 2:46, 47) N’otu aka ahụ, ịdị ngwa ndị Kraịst nyeere ọgbakọ oge gboo aka n’inye ndị Juu nile ịdọ aka ná ntị doro anya na usoro ihe ha ga-agwụsị n’oge na-adịghị anya. (Luk 19:43, 44; Ndị Kọlọsi 1:5, 6, 23) Mgbe ọ gwụsịkwara na mberede na 70 O.A., ịdị ngwa nyeere ndị àmà Kraịst nke narị afọ mbụ aka ịkpọsara ọtụtụ ndị olileanya eluigwe tupu ndapụ n’ezi ofufe ahụ e buru n’amụma agbasapụ ọchịchịrị ime mmụọ ya na-eweta ọnwụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3; 2 Timoti 4:2) Mgbe ahụ, n’ime ọtụtụ narị afọ Mgbe Ụwa Ka Nọ n’Ìsì, ndị Kraịst ole na ole yiri ọka jigidere olileanya Alaeze ahụ, dị ka Kraịst Jisọs buru n’amụma. (Matiu 13:28-30) N’ikpeazụ, n’oge ya a kara aka, Jehova mere ka ọgbakọ nke oge a, nke dị ike bilite, bụ́ nke ozi ikpe ya dị ngwa maka ndị na-ebi n’ọgbọ ikpeazụ a na-akwali.—Matiu 24:34.
Dị ka Daniel nke oge ochie, Ndịàmà Chineke nke oge a na-ekwesị ntụkwasị obi adịghị mgbe ha ga-anwa anwa ịjụ Jehova ajụjụ, ịjụ ya, sị: “Gịnị ka ị nọworo na-eme?” (Daniel 4:35, NW) Ha nwere obi ike na Jehova maara kpọmkwem ihe dị mkpa iji rụzuo ọrụ ya n’oge ya kpọmkwem. Ya mere kama ime mkpesa banyere ụzọ Jehova si ahazi ihe, obi dị ha ụtọ na Chineke enyewo ha ohere nke isoro ya na-arụkọ ọrụ n’oge ndị a dị mkpa.—1 Ndị Kọrint 3:9.
Agbamume Ọzọ Maka Ịdị Ngwa
Ihe ọzọ kpatara ịdị ngwa bụ ike anyị na-enweghị ikwu kpọmkwem ụbọchị na hour maka ntiwapụ mberede nke mkpagbu ukwu ahụ. Kraịst Jisọs kwuru hoo haa na ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ụwa nke maara ụbọchị na hour ahụ a kara aka maka mmalite nke oké ihe omume ahụ. (Matiu 24:36) N’oge ọzọ ọ gwara ndị ozi ya ọ dị ọkụ n’obi, sị: “Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna m debere n’ike nke aka Ya.” (Ọrụ 1:7) Ee, ihe ga-esi na ya pụta doro anya, ma ọ dịghịrị anyị ịma ihe nile n’ụzọ sara mbara.
Pọl onyeozi nwere àgwà ziri ezi nke ịdị ngwa. Ikekwe o bu okwu Jisọs n’uche mgbe o degaara ndị Tesalọnaịka akwụkwọ banyere ọnụnọ Kraịst, sị: “Ma ọ dịghị unu mkpa, ụmụnna anyị, ka e degara unu akwụkwọ banyere oge ahụ nile na ụbọchị ahụ nile.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:1) O dere akwụkwọ ozi nke a ihe dị ka afọ 17 ka Jisọs kwusịrị: “Unu ga-abụkwa ndị àmà m . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) N’oge ahụ ọ dịghị ihe ọzọ a pụrụ ide n’ihi na ọ dịghị ihe ọzọ e kpugheworo. N’agbanyeghị na ọ dịghị, ha pụrụ inwe obi ike na ụbọchị Jehova aghaghị ịbịa “dị ka onye ohi na-abịa n’abalị” mgbe ndị Kraịst ka ga-eji ịdị ngwa na-eme nkwusa.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2.
O yighị ka ndị Kraịst narị afọ mbụ ha chere na ụbọchị Jehova ka bụ ọtụtụ narị afọ n’ihu, na-eburu okwu ndị a n’uche. N’eziokwu, ha maara maka ilu Jisọs banyere eze ahụ nke jere ala dị anya na banyere nwoke ahụ nke jere ala ọzọ. Ha makwaara na ilu ndị ahụ gosiri na eze ahụ ga-alaghachite “n’ikpeazụ” (NW), nakwa onye ahụ jere ala dị anya “mgbe ogologo oge gasịrị.” Ma ihe ịrụ ụka adịghị ya na ajụjụ ndị dị ka, Olee mgbe bụ “n’ikpeazụ”? juru ha anya. Gịnịkwa ka “mgbe ogologo oge gasịrị” pụtara? Ọ̀ bụ afọ iri? Iri afọ abụọ? Iri afọ ise? Ka ọ̀ bụ karị? (Luk 19:12, 15; Matiu 25:14, 19) Okwu Jisọs ga-anọgide na-ada ụda ná ntị ha: “Unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—Luk 12:40.
Mmetụta Dị Mma nke Ịdị Ngwa
Ee, echiche ịdị ngwa ahụ nke Chineke kpaliri nwere mmetụta na-agba ume n’ụzọ magburu onwe ya n’ahụ ndị Kraịst narị afọ mbụ, na-enyere ha aka iji ọrụ n’aka n’ọrụ ahụ kasị mkpa nke ime nkwusa na izi ihe. Ọ nọgidere na-agba anyị ume taa n’ọtụtụ ụzọ. Ọ na-echebe anyị pụọ n’ịghọ ndị afọ juru n’onwe anyị ma ọ bụ ‘ndị ike gwụrụ n’ọrụ ọma.’ (Ndị Galetia 6:9, King James Version) Ọ na-echebe anyị pụọ n’itinyebiga aka ókè n’ụwa na ịhụ ihe onwunwe n’anya ya dị aghụghọ. Ọ na-eme ka uche anyị dịkwasị ná “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie.” (1 Timoti 6:19) Onyenwe anyị bụ́ Jisọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-eyi “atụrụ n’etiti agụ,” ọ makwaara mkpa ọ dị anyị ịnọgide na-enwe echiche siri ike, nke dịkwasịrị n’otu ebe iji lụsoo ụwa ọgụ. Ee, echiche ịdị ngwa anyị nke ndị Kraịst echekwawo anyị, chebe anyị.—Matiu 10:16.
Jehova Chineke n’amamihe ya na-enweghị ọgwụgwụ anọwo mgbe nile na-enye ndị ohu ya ihe ọmụma zuru ezu ka ha wee jigide echiche ha nke ịdị ngwa. O jiwo obi ọma mesie anyị obi ike na anyị na-ebi “na mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe nke a rụrụ arụ. (2 Timoti 3:1) A nọgidere na-echetara anyị na anyị aghaghị ịdị na-enwu dị ka ndị na-enye ìhè ruo mgbe ọgbọ nke anyị bi n’ime ya gabigara n’oké mkpagbu ahụ, isi njedebe ya kwa na Ha–Magedọn.—Ndị Filipaị 2:15; Mkpughe 7:14; 16:14, 16.
Ee, echiche Chineke nke ịdị ngwa bụ akụkụ nke ozi e ji obi dum na-ejere Jehova. Ọ na-egbochi ma na-enye aka imebi mgbalị nile nke Ekwensu ime ka ndị ohu Chineke “daa mbà ná mkpụrụ obi [ha].” (Ndị Hibru 12:3) Ruo mgbe ebighị ebi, nraranye sitere n’obi dum ga-eme ndị ohu Jehova ka ha na-erubere ya isi, ma ugbu a, n’ụbọchị ndị a tupu Amagedọn, echiche ịdị ngwa miri emi, nke bụ ezie, bụ akụkụ dị mkpa nke nraranye sitere n’obi dum.
Ka Jehova bụ́ Chineke anyị nyere anyị nile aka ichebe echiche ịdị ngwa anyị ka anyị na-anọgide na-ekwupụta okwu ndị ahụ nke Jọn onyeozi: “Amen: bịa, Onyenwe anyị Jisọs.”—Mkpughe 22:20.