Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kl isi 12 p. 108-117
  • Guzogide Ndị Ajọ Mmụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Guzogide Ndị Ajọ Mmụọ
  • Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ AJỌ MMỤỌ—MMALITE HA NA EBUMNOBI HA
  • ỤZỌ NDỊ AJỌ MMỤỌ SI ANWA IDUHIE GỊ
  • IHE MERE BIBLE JI AKAGBU IME MGBAASỊ
  • SITE N’ỊRATA ARATA GAA N’ỊWAKPO AWAKPO
  • ỤZỌ ISI GUZOGIDE NDỊ AJỌ MMỤỌ
  • NỌGIDE N’AGHA GỊ MEGIDE NDỊ AJỌ MMỤỌ
  • Ndị Mmụọ E Kere Eke—Otú Ha Si Emetụta Anyị
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Nabata Aka Jehova Na-enyere Anyị Iji Guzogide Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ihe Mere I Ji Kwesị Izere Mgbaasị
    Teta!—2000
  • Ihe Mere I Kwesịrị Iji Zere Mgbaasị
    Teta!—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
kl isi 12 p. 108-117

Isi nke 12

Guzogide Ndị Ajọ Mmụọ

1. Olee otú Jisọs si meghachi omume mgbe o zutere ndị ajọ mmụọ?

KPỌMKWEM mgbe baptism ya gasịrị, Jisọs Kraịst banyere n’ọzara Judia ikpe ekpere na ịtụgharị uche. N’ebe ahụ Setan Ekwensu nwara ime ka o mebie iwu Chineke. Otú ọ dị, Jisọs jụrụ ihe ụra Ekwensu, e jideghịkwa ya n’ọnyà ya. Jisọs chere ajọ mmụọ ndị ọzọ ihu n’oge ozi ya n’elu ụwa. Ma, ugboro ugboro, ọ baara ha mba ma guzogide ha.​—⁠Luk 4:1-⁠13; 8:26-⁠34; 9:37-⁠43.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

2 Ihe ndekọ Bible na-akọwa nzute ihu na ihu ndị ahụ kwesịrị ime ka anyị kwere na ndị ajọ mmụọ dị adị. Ha na-anwa iduhie ndị mmadụ. Otú ọ dị, anyị pụrụ iguzogide ndị ajọ mmụọ a. Ma olee ebe ndị ajọ mmụọ si bịa? N’ihi gịnị ka ha ji anwa iduhie ụmụ mmadụ? Oleekwa ụzọ ndị ha na-eji emezu ọchịchọ ha? Ịchọta azịza nye ajụjụ ndị dị otú a ga-enyere gị aka iguzogide ndị ajọ mmụọ.

NDỊ AJỌ MMỤỌ—MMALITE HA NA EBUMNOBI HA

3. Olee otú Setan Ekwensu si malite ịdị?

3 Jehova Chineke mere ìgwè ndị mmụọ e kere eke ogologo oge tupu o kee ụmụ mmadụ. (Job 38:​4, 7) Dị ka a kọwara n’Isi nke 6, otu n’ime ndị mmụọ ozi a zụlitere ọchịchọ nke ime ka ụmụ mmadụ na-efe ya ofufe kama ife Jehova. N’ịchụso ebumnobi ahụ, ajọ mmụọ ozi a guzogidere ma kwutọọ Onye Okike ahụ, ọbụna na-enye nwanyị mbụ echiche nke na Chineke bụ onye ụgha. Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, a matara mmụọ nke a e kere eke nke nupụrụ isi dị ka Setan (onye nguzogide) Ekwensu (onye nkwutọ).​—⁠Jenesis 3:​1-⁠5; Job 1:6.

4. Olee otú ndị mmụọ ozi ụfọdụ si mehie n’ụbọchị Noa?

4 E mesịa, ndị mmụọ ozi ọzọ dọnyeere Setan Ekwensu úkwù. N’ụbọchị nwoke ezi omume ahụ bụ́ Noa, ụfọdụ n’ime ndị a gbahapụrụ ozi ha na-eje n’eluigwe ma weghara anụ ahụ iji mejuo ọchịchọ ọjọọ ha maka isoro ụmụ nwanyị bi n’elu ụwa nwee mmekọahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Setan nwere mmetụta n’ahụ ndị mmụọ ozi ahụ ka ha wee gbasoo ụzọ nnupụisi ahụ. O dugara na ha ịmụ ụmụ gwara ọgwa a kpọrọ Nefilim, bụ́ ndị ghọrọ ndị ntigbu na-eme ihe ike. Mgbe Jehova wetara oké Iju Mmiri ahụ, o bibiri ihe a kpọrọ mmadụ rụrụ arụ na ụmụ ndị a ndị mmụọ ozi nupụrụ isi mụtara bụ́ ndị na-ekwekọghị n’okike. Ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi gbanarịrị mbibi site n’ịgbanwe anụ ahụ ha ma laghachi n’ógbè ndị bụ mmụọ. Ma Chineke gbochiri ndị mmụọ ọjọọ a site n’imeso ha dị ka ndị osu nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ. (Jenesis 6:​1-7, 17; Jud 6) Setan, “onye isi ndị mmụọ ọjọọ,” na ndị ajọ mmụọ ozi ya gakwararịị n’ihu ná nnupụisi ha. (Luk 11:15) Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ ha?

5. Olee ebumnobi Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, gịnịkwa ka ha na-eji amata ndị mmadụ n’ọnyà?

5 Ebumnobi ọjọọ nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ bụ ichigharị ndị mmadụ megide Jehova Chineke. N’ihi ya, ndị ọjọọ a anọwo na-eduhie, na-emenye egwu, ma na-awakpo ndị mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ. (Mkpughe 12:9) Ihe atụ ndị nke oge a na-emesi ya ike na ike ndị mmụọ ọjọọ na-akpa dị obi ọjọọ nke ukwuu ugbu a karịa ka ọ dịworo mgbe ọ bụla ọzọ. Iji mata ndị mmadụ n’ọnyà, ndị mmụọ ọjọọ na-ejikarị mgbaasị n’ụdị ya nile eme ihe. Olee otú ndị mmụọ ọjọọ si eji ihe ụra nke a eme ihe, oleekwa otú ị pụrụ isi chebe onwe gị?

ỤZỌ NDỊ AJỌ MMỤỌ SI ANWA IDUHIE GỊ

6. Gịnị bụ mgbaasị, oleekwa ụdị ya ụfọdụ?

6 Gịnị bụ mgbaasị? Ọ bụ iso ndị mmụọ ọjọọ, ma ọ bụ ajọ ndị mmụọ, kpọmkwem ma ọ bụ site n’onye ozi bụ́ mmadụ mekọọ ihe. Mgbaasị na-emere ndị mmụọ ọjọọ ihe ihe ụra na-emere ndị dinta: Ọ na-adọta anụ oriri. Dịkwa nnọọ ka dinta na-eji ụdị ihe ụra dị iche iche adọta anụmanụ n’ọnyà ya, otú ahụ ka ndị ajọ mmụọ na-agba ume iji ụdị dị iche iche nke mgbaasị weta ụmụ mmadụ n’okpuru nchịkwa ha. (Tụlee Abụ Ọma 119:110.) Ụfọdụ n’ime ụdị ndị a bụ ịjụ ndị mmụọ ase, majik, ịchọ isi ọma na isi ọjọọ, ịgba afa, ịkọ ọgwụ, ijekwu ndị na-ajụ ndị mmụọ ihe, na ịjụ ndị nwụrụ anwụ ihe.

7. Ruo ókè hà aṅaa ka mgbaasị gbasaruru, n’ihi gịnịkwa ka o ji na-ewu ewu ọbụna n’ala ndị a sịrị na ha bụ nke ndị Kraịst?

7 Ihe ụra ahụ dị irè, n’ihi na mgbaasị na-adọta ndị mmadụ gburugburu ụwa. Ndị bi n’ime ime obodo na-agakwuru ndị dibịa afa, ndị na-arụkwa ọrụ n’ọfịs ndị dị n’obodo ukwu na-ejekwuru ndị na-agụ kpakpando. Mgbaasị na-ewu ewu ọbụna n’ala ndị a sịrị na ha bụ nke ndị Kraịst. Nchọpụta na-egosi na n’ime United States nanị, ihe dị ka 30 magazin ndị nwere ngụkọta nke 10,000,000 ndị na-agụ ya ka e doro iche maka ụdị dị iche iche nke mgbaasị. Ndị Brazil na-emefu ihe karịrị 500 nde dollar n’ihe mgbaasị dị iche iche kwa afọ. Ma, 80 pasent nke ndị na-ejekarị n’ebe dị iche iche nke ofufe mgbaasị bụ ndị Katọlik e mere baptism bụ́ ndị na-agakwa Mas. Ebe ọ bụ na ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-eme mgbaasị, ọtụtụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe na-eche na Chineke na-anabata ime ya. Ma ọ̀ na-anabata ya?

IHE MERE BIBLE JI AKAGBU IME MGBAASỊ

8. Gịnị bụ echiche Akwụkwọ Nsọ banyere mgbaasị?

8 Ọ bụrụ na a kụziworo gị na ụdị ụfọdụ nke mgbaasị bụ ụzọ dị iche iche isi jekwuru ndị mmụọ ọma, ọ pụrụ iju gị anya ịmụta ihe Bible na-ekwu banyere mgbaasị. A dọrọ ndị Jehova aka ná ntị, sị: “Unu echela ndị na-ajụ mmụọ ihe ihu, unu echekwala ndị dibịa afa ihu; unu achọpụtala ha, iwere ha merụọ onwe unu.” (Levitikọs 19:31, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche; 20:6, 27.) Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-adọ aka ná ntị na “ndị na-agwọ nsí” ga-ejedebe “n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ na brimstone na-ere; nke bụ ọnwụ nke abụọ [nke ebighị ebi] ahụ.” (Mkpughe 21:8; 22:15) Jehova Chineke na-akagbu ụdị nile nke mgbaasị. (Deuterọnọmi 18:​10-⁠12) N’ihi gịnị ka o ji dịrị otú ahụ?

9. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwubie na ozi ndị na-esite n’ụwa nke ndị bụ́ mmụọ n’oge a esiteghị n’aka Jehova?

9 Jehova zigara ndị mmụọ ọma, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi ezi omume, ịgwa ụmụ mmadụ ụfọdụ okwu tupu e dezuo Bible. Kemgbe e dezuru ya, Okwu Chineke enyewo nduzi dị ụmụ mmadụ mkpa iji jeere Jehova ozi n’ụzọ ọ na-anakwere. (2 Timoti 3:​16, 17; Ndị Hibru 1:​1, 2) Ọ dịghị ahapụ Okwu ya dị nsọ site n’inye ndị mmadụ ozi. Ozi nile dị otú ahụ taa sitere n’ụwa nke ndị bụ́ mmụọ na-esite n’aka ndị ajọ mmụọ. Ime mgbaasị pụrụ iduba ná mmenye ụjọ nke ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ ọbụna n’ịbụ onye ndị ajọ mmụọ ji. Ya mere, Chineke ji ịhụnanya na-adọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara itinye aka n’ihe omume mgbaasị ọ bụla. (Deuterọnọmi 18:14; Ndị Galetia 5:​19-⁠21) Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme mgbaasị mgbe anyị mụtaworo echiche Jehova banyere ya, anyị ga na-adọnyere ndị ajọ mmụọ ahụ na-enupụ isi úkwù wee bụrụ ndị iro Chineke.​—⁠1 Samuel 15:23; 1 Ihe Emere 10:​13, 14; Abụ Ọma 5:4.

10. Gịnị bụ ịjụ ndị mmụọ ihe, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji zere ya?

10 Otu ụdị mgbaasị na-ewu ewu bụ ịjụ ndị mmụọ ihe​—⁠ịgbalị ịmata banyere ọdịnihu ma ọ bụ ihe a na-amaghị ama site n’enyemaka ndị mmụọ. Ụdị ụfọdụ nke ịjụ ndị mmụọ ihe bụ ịgụ kpakpando, ikiri bọl nkume crystal, ize nrọ, ịgụ akara aka, na ịkọ ọdịnihu site n’iji kaadị ndị e sere ihe na ha eme ihe. Ọtụtụ na-ele ịjụ ndị mmụọ ihe anya dị ka ihe egwuregwu na-adịghị emerụ ahụ, ma Bible na-egosi na ndị na-akọ ọdịnihu na ndị ajọ mmụọ na-aga ụkwụ na ụkwụ. Dị ka ihe atụ, Ọrụ Ndị Ozi 16:​16-⁠19 (NW) hotara otu “mmụọ ịjụ ndị mmụọ ihe” nke nyere otu nwa agbọghọ ike igosipụta “nkà ịkọ ihe ga-eme n’ihu.” Otú ọ dị, ikike ya ịkọ ọdịnihu furu mgbe a chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ. N’ụzọ doro anya, ịjụ mmụọ ihe bụ ihe ụra ndị mmụọ ọjọọ na-eji araba ndị mmadụ n’ọnyà ha.

11. Olee otú mgbalị iso ndị nwụrụ anwụ kwurịta okwu si eduba n’ọnyà?

11 Ọ bụrụ na ị na-eru újú banyere ọnwụ nke onye òtù ezinụlọ a hụrụ n’anya ma ọ bụ ezigbo enyi, ọ pụrụ ịdị mfe ihe ụra ọzọ ịdọrọ gị. Onye dibịa afa pụrụ inye gị ihe ọmụma pụrụ iche ma ọ bụ kwuo okwu n’olu yiri nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Kpachara anya! Mgbalị iji kwunyere ndị nwụrụ anwụ okwu na-eduba n’ọnyà. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị nwụrụ anwụ apụghị ikwu okwu. Dị ka ị na-aghaghị icheta, Okwu Chineke na-ekwu hoo haa na n’ọnwụ mmadụ ‘na-alaghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.’ Ndị nwụrụ anwụ “adịghị ama ihe ọ bụla.” (Abụ Ọma 146:4; Eklisiastis 9:​5, 10) Ọzọkwa, ọ bụ n’ezie ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị a mawooro maka iṅomi olu ndị nwụrụ anwụ na inye dibịa na-ajụ ndị mmụọ ihe ihe ọmụma banyere onye ahụ nwụworonụ. (1 Samuel 28:​3-⁠19) Ya mere “onye na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe” bụ onye ndị mmụọ ọjọọ na-amata n’ọnyà, ọ na-emekwa ihe megidere uche Jehova Chineke.​—⁠Deuterọnọmi 18:​11, 12; Aịsaịa 8:19.

SITE N’ỊRATA ARATA GAA N’ỊWAKPO AWAKPO

12, 13. Olee ihe àmà dịnụ na ndị mmụọ ọjọọ na-esi ọnwụ n’ịnwale ndị mmadụ na imenye ha egwu?

12 Mgbe ị na-eme ihe kwekọrọ na ndụmọdụ Okwu Chineke banyere mgbaasị, ị na-ajụ ihe ụra ndị mmụọ ọjọọ. (Tụlee Abụ Ọma 141:​9, 10; Ndị Rom 12:9.) Nke a ọ̀ pụtara na ndị ajọ mmụọ ga-akwụsị ịnwa ijide gị? Ọ dịghị ma ọlị! Mgbe ọ nwasịrị Jisọs ugboro atọ, Setan “wee si n’ebe Ọ nọ pụọ ruo mgbe ọzọ.” (Luk 4:13) N’otu aka ahụ, ndị mmụọ isi kpọrọ nkụ adịghị nanị arata ndị mmadụ arata kama ha na-awakpokwa ha.

13 Cheta ntụle anyị mere mbụ banyere mwakpo Setan wakporo Job bụ́ ohu Chineke. Ekwensu kpatara mfu nke anụ ụlọ ya na ọnwụ nke ihe kanụ n’ime ndị ohu ya. Ọbụna na Setan gburu ụmụ Job. Ọzọ, o jiri ọrịa na-egbu mgbu tie Job n’onwe ya ihe otiti. Ma Job jigidere nguzosi ike n’ezi ihe ya nye Chineke, a gọzikwara ya nke ukwuu. (Job 1:7-⁠19; 2:7, 8; 42:12) Eri mgbe ahụ, ndị mmụọ ọjọọ emewo mmadụ ụfọdụ ndị ogbi ma ọ bụ ndị kpuru ìsì, ha anọgidewokwa na-enwe obi ụtọ n’ahụhụ ụmụ mmadụ. (Matiu 9:32, 33; 12:22; Mak 5:​2-⁠5) Taa, akụkọ dị iche iche na-egosi na ndị mmụọ ọjọọ na-emenye ụfọdụ egwu n’ụzọ mmekọahụ ma na-akụ ndị ọzọ ara. Ha na-akpali ndị ọzọkwa igbu mmadụ na igbu onwe ha, ihe ndị bụ mmehie megide Chineke. (Deuterọnọmi 5:17; 1 Jọn 3:15) Ka o sina dị, ọtụtụ puku mmadụ ajọ mmụọ ndị a mataburu n’ọnyà enwewo ike inwere onwe ha. Olee otú nke a siworo kwe ha omume? Ha emewo otú ahụ site n’iwere nzọụkwụ ndị dị mkpa.

ỤZỌ ISI GUZOGIDE NDỊ AJỌ MMỤỌ

14. N’ikwekọ n’ihe atụ nke ndị Efesọs bụ́ ndị Kraịst na narị afọ mbụ, olee otú ị pụrụ isi guzogide ndị ajọ mmụọ?

14 Olee otu ụzọ ị pụrụ isi guzogide ndị ajọ mmụọ ma chebe onwe gị na ezinụlọ gị pụọ n’ọnyà ha? Ndị Kraịst narị afọ mbụ n’Efesọs bụ́ ndị meburu mgbaasị tupu ha aghọọ ndị kwere ekwe weere nzọụkwụ ndị dị mma. Anyị na-agụ na “[ọtụtụ mmadụ] n’etiti ndị na-eme mgbaasị kpokọtara akwụkwọ ha, rechapụ ha ọkụ n’ihu ọha mmadụ.” (Ọrụ 19:19) Ọbụna ọ bụrụ na i metụbeghị mgbaasị, wepụ ihe ọ bụla pụrụ ịbụ nke e ji eme ihe ná mgbaasị ma ọ bụ nke nwere ihe jikọrọ ha abụọ. Nke a na-agụnye akwụkwọ, magazin, vidio, ihe mmapawa, egwú, na ihe ndị e ji eme ihe ná mgbaasị. Ọ gụnyekwara arụsị, ọgwụ okike, na ihe ndị ọzọ a na-eyi maka nchebe, na onyinye ndị a natara n’aka ndị na-eme mgbaasị. (Deuterọnọmi 7:​25, 26; 1 Ndị Kọrint 10:21) Iji maa atụ: Otu di na nwunye na Thailand abụwo ndị ndị mmụọ ọjọọ menyere egwu ruo ogologo oge. Ha wee wepụsịa ihe nile e jikọrọ ha na mgbaasị. Gịnị ka ọ rụpụtara? Ha nweere onwe ha pụọ ná mwakpo ndị mmụọ ọjọọ ma mesịzie nwee ezi ọganihu ime mmụọ.

15. N’iguzogide ndị ajọ mmụọ, olee nzọụkwụ ọzọ dị mkpa?

15 Iji guzogide ndị ajọ mmụọ, nzọụkwụ ọzọ dị mkpa bụ itinye n’ọrụ ndụmọdụ Pọl onyeozi nke bụ iyikwasị ihe agha nile nke ime mmụọ nke Chineke na-enye. (Ndị Efesọs 6:​11-⁠17) Ndị Kraịst aghaghị iwusi ihe nchebe ha ike megide ndị ajọ mmụọ. Gịnị ka nzọụkwụ nke a na-agụnye? “Tụkwasị ihe nile ndị a,” ka Pọl kwuru, “welienụ ọta nke bụ́ okwukwe, nke unu ga-apụ imenyụ akụ́ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ n’ime ya.” N’ezie, ka okwukwe gị na-esiwanye ike, otú ahụ ka ikike gị ga-aka elu iguzogide ndị ajọ mmụọ.​—⁠Matiu 17:​14-⁠20.

16. Olee otú ị pụrụ isi wusie okwukwe gị ike?

16 Olee otú ị pụrụ isi wusie okwukwe gị ike? Site n’ịnọgide na-amụ Bible ma na-etinye ndụmọdụ ya n’ọrụ ná ndụ gị. Ike nke okwukwe mmadụ na-adabere nke ukwuu n’isi ike nke ntọala ya​—⁠ihe ọmụma Chineke. Ọ̀ bụ na i kweghị na ezi ihe ọmụma i nwetaworo ma tụlee nke ọma ka ị na-amụ Bible ewulitewo okwukwe gị? (Ndị Rom 10:​10, 17) Ya mere, ihe ịrụ ụka adịghị ya, ka ị nọgidere n’ọmụmụ ihe a ma na-eme ya àgwà gị ịga nzukọ nile nke Ndịàmà Jehova, a ga-ewusiwanye okwukwe gị ike ọbụna karị. (Ndị Rom 1:​11, 12; Ndị Kọlọsi 2:​6, 7) Ọ ga-abụ ihe nchebe dị ukwuu megide mwakpo ndị mmụọ ọjọọ.​—⁠1 Jọn 5:5.

17. Olee nzọụkwụ ndị ọzọ pụrụ ịdị mkpa n’iguzogide ndị ajọ mmụọ?

17 Olee nzọụkwụ ndị ọzọ onye kpebisiri ike iguzogide ndị ajọ mmụọ pụrụ iwere? Ndị Kraịst bụ́ ndị Efesọs nwere mkpa nchebe n’ihi na ha bi n’obodo nke jupụtara n’ofufe ndị mmụọ ọjọọ. N’ihi ya, Pọl gwara ha, sị: “Na-ekpe ekpere n’oge nile n’ime Mmụọ Nsọ.” (Ndị Efesọs 6:18) Ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’ụwa nke jupụtara ná ndị mmụọ ọjọọ, ikpesi ekpere ike maka nchebe Chineke dị mkpa n’iguzogide ndị ajọ mmụọ. (Matiu 6:13) Ihe na-enye aka n’akụkụ nke a bụ enyemaka ime mmụọ na ekpere nke ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ ndị Kraịst.​—⁠Jemes 5:​13-⁠15.

NỌGIDE N’AGHA GỊ MEGIDE NDỊ AJỌ MMỤỌ

18, 19. Gịnị ka a pụrụ ime ma ọ bụrụ na ndị mmụọ ọjọọ enye mmadụ nsogbu ọzọ?

18 Ma, ọbụna mgbe e weresịịrị nzọụkwụ ndị a bụ isi, ụfọdụ abụrụwo ndị ndị ajọ mmụọ nyere nsogbu. Dị ka ihe atụ, otu nwoke na Côte d’Ivoire sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible ma bibisịa ọgwụ okike ya nile. E mesịa, o nwere ọganihu dị mma, rara ndụ ya nye Jehova, e meekwa ya baptism. Ma otu izu mgbe baptism ya gasịrị, ndị mmụọ ọjọọ malitere inye ya nsogbu ọzọ, olu dị iche iche gwakwara ya ka ọ gbahapụ okwukwe ọhụrụ ya. Ọ bụrụ na nke a emee gị, ọ̀ ga-apụta na i nwekwaghị nchebe Jehova? Ọ bụchaghị otú ahụ.

19 Ọ bụ ezie na nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs Kraịst nwere nchebe Chineke, ọ nụrụ olu nke ajọ mmụọ ahụ e kere eke bụ́ Setan Ekwensu. Jisọs gosiri ihe a ga-eme n’ọnọdụ dị otú a. Ọ gwara Ekwensu: “Laba, Setan.” (Matiu 4:​3-⁠10) N’otu ụzọ ahụ, i kwesịrị ịjụ ige ntị n’olu ndị sitere n’ụwa nke ndị bụ́ mmụọ. Guzogide ndị ajọ mmụọ site n’ịkpọku Jehova maka enyemaka. Ee, kpee ekpere n’olu dara ụda na-eji aha Chineke eme ihe. Ilu 18:10 na-asị: “Ụlọ elu dị elu ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.” Nwoke ahụ bụ́ onye Kraịst na Côte d’Ivoire mere nke a, ndị ajọ mmụọ ahụ kwụsịkwara imenye ya egwu.​—⁠Abụ Ọma 124:8; 145:18.

20. Ná nchịkọta, gịnị ka ị pụrụ ime iji guzogide ndị ajọ mmụọ?

20 Jehova ekwerewo ka ndị ajọ mmụọ nọgide na-adị adị, ma ọ na-egosipụta ike ya, karịsịa n’isi ndị ya, a na-akpọsakwa aha ya n’ụwa nile. (Ọpụpụ 9:16) Ọ bụrụ na ị nọrọ Chineke nso, ọ dịghị mkpa ka egwu ndị ajọ mmụọ na-atụ gị. (Ọnụ Ọgụgụ 23:​21, 23; Jemes 4:7, 8; 2 Pita 2:9) A kpaara ike ha ókè. E nyere ha ahụhụ n’ụbọchị Noa, chụpụ ha n’eluigwe n’oge na-adịbeghị anya gara aga, ugbu a ha na-echerekwa ikpe ikpeazụ. (Jud 6; Mkpughe 12:9; 20:1-⁠3, 7-⁠10, 14) N’ezie, egwu mbibi ha na-abịanụ na-atụ ha. (Jemes 2:19) Ya mere ma ndị ajọ mmụọ hà na-anwa iji ụdị ụfọdụ nke ihe ụra dọrọ gị ma ọ bụ na-awakpo gị n’ụzọ ọ bụla, ị pụrụ iguzogide ha. (2 Ndị Kọrint 2:11) Jụ ụdị ọ bụla nke mgbaasị, tinye ndụmọdụ Okwu Chineke n’ọrụ, chọọkwa nnwapụta Jehova. Mee nke a n’egbughị oge, n’ihi na ndụ gị dabeere na gị iguzogide ndị ajọ mmụọ!

NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ

Olee otú ndị ajọ mmụọ si anwa iduhie ndị mmadụ?

N’ihi gịnị ka Bible ji na-akagbu mgbaasị?

Olee otú mmadụ pụrụ isi nwere onwe ya pụọ n’ike ndị ajọ mmụọ?

N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji nọgide na-eguzogide ndị ajọ mmụọ?

[Foto dị na peeji nke 110]

Olee otú i si ele mgbaasị n’ọtụtụ ụdị ya anya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya