Ndụ na Ije Ozi Jisọs
N’ihu Nnọkọ Ikpe Sanhedrin, E Mesịa Kpọjere Ya Paịlat
ANYASỊ ahụ na-abịaru nso ọgwụgwụ ya. Pita agọnarịwo Jisọs nke ugbo atọ, ndị òtù nnọkọ ikpe Sanhedrin ahụ ekpesịwokwa ikpe ịkwa emo ha wee lasasịa. Otú ọ dị, ha zukọtakwara ọzọ n’ụtụtụ Friday ozugbo chi malitere ịbọ, ugbu a, ọ bụ n’ỤIọ Nzukọ nke nnọkọ ikpe Sanhedrin ha. O yiri ka nzube ha ọ̀ bụ ime ka o yie ka à ga-asị na ikpe ahụ ha kpere n’abalị nwere nkwado nke iwu. Mgbe a kpọtara Jisọs n’ihu ha, ha kwuru, dịkwa ka ha kwuworo n’anyasị ahụ, sị: “Ọ bụrụ na gị onwe gị bụ Kraịst, gwa anyị.”
Jisọs zara, sị, “Ọ bụrụ na mụ agwa unu, unu agaghị ekwe. . . . Ma ọ bụrụ na mụ ajụọ anụ ajụjụ, unu agaghị aza.” Otú ọ dị, Jisọs ji obi ike kọwaa onwe ya, na-asị: “Ma site ugbu a ka Nwa nke mmadụ ga-anọdụ n’aka nri nke ike Chineke.”
Ha nile chọrọ ịmara, ha wee sị, “Gị onwe gị [ị̀] bụkwa Ọkpara Chineke?”
Jisọs zaghachiri, sị, “Unu onwe unu sị na mụ onwe m bụ ya.”
Nye ndị ikom ndị a obi ha tụkwasịrị n’igbu ọchụ, azịza nke a ezuwo. Ha lere ya anya dị ka okwu nkwulu. Ha jụrụ, sị, “Ọ̀ bụ mkpa àmà gịnị na-akpa anyị ọzọ? N’ihi na anyị onwe anyị nụrụ site n’ọnụ ya.” Ha wee kee Jisọs agbụ, duru ya pụọ, wee nyefee ya n’aka onye ọchịchị Rom bụ Pọntiọs Paịlat.
Judas, bụ́ onye ahụ nke raara Jisọs nye, anọwo na-ekiri ihe na-emenụ. Mgbe ọ hụrụ na a mawo Jisọs ikpe ọnwụ, o nwere mwute. Ya mere, o jekwuuru ndị isi nchụàjà na ndị okenye iweghachiri ha 30 ego ọlaọcha ahụ, na-akọwa, sị: “Emehiere m n’ịrara ọbara onye ikpe na-amaghị nye.”
Ha ji obi ịta mmiri zaghachi, sị, “Olee nke dịịrị anyị n’ime ya? Gị onwe gị lee nke ahụ.” Judas wee tụba ego ọlaọcha ahụ n’ime ụlọ nsọ wee pụọ ma nwaa ịkwụgbu onwe ya. Otú ọ dị, o yiri ka alaka osisi nke Judas kegidere eriri ahụ gbajiri, o wee dakwasị n’elu oké nkume ndị dị n’okpuru, ebe o tikasịrị.
Ndị isi nchụàjà ahụ amaghị ihe ha ga-eji ego ọlaọcha ahụ mee. Ha kwubiri, sị, “O zighị ezi n’iwu ịtụba ha n’ebe a na-edebe ihe e nyere Chineke, ebe ọ bụ ọnụ ahịa ọbara.” Ya mere, mgbe ha gbakọsịrị izu, ha ji ego ahụ zụta ubi onye ọkpụ ite, ebe a ga na-eli ndị ọbịa. E si otú a malite ịkpọ ubi ahụ “Ubi Ọbara.”
Ọ ka bụ isi ụtụtụ mgbe a kpọọrọ Jisọs jee n’obíeze onye ọchịchị ahụ. Ma ndị Juu ndị so ya jee n’ebe ahụ jụrụ ịbanye n’ihi na ha kweere na mkpakọrịta chiri anya otú a n’ebe ndị Jentaịl nọ ga-emerụ ha. Ya mere, iji wee nabata ha nile, Paịlat pụtara n’èzí. Ọ jụrụ, sị, “Ọ̀ bụ ebubo gịnị ka unu na-ebo nwoke a?”
Ha zara, sị, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye na-eme ihe ọjọọ, anyị agaghị araraworị ya nye n’aka gị.”
N’ịchọ ịghara itinye aka ya n’okwu ahụ, Paịlat zaghachiri, sị: “Unu onwe unu were ya, kpeekwanụ ya ikpe dị ka iwu unu si dị.”
N’igosipụta echiche ọjọọ ha, ndị Juu ahụ kwuru, sị: “O zighịrị anyị ezi n’iwu igbu onye ọ bụla.” N’ezie, ọ bụrụ na ha egbuo Jisọs n’oge Ememe Ngabiga ahụ, ọ pụrụ ịkpaliworị ọgba aghara ọha mmadụ, ebe ọtụtụ ndị na-ele Jisọs anya n’ụzọ oké nsọpụrụ. Ma ọ bụrụ na ha enwee ike ime ka ndị Rom gbuo ya n’okwu metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nke a ga-eyi ka ọ̀ ga-ewepụ ụta n’ebe ha nọ n’ihu ndị mmadụ.
Ya mere, ndị ndú okpukpe ahụ, n’ekwughị ihe ọ bụla banyere ikpe ha buworo ụzọ kpee Jisọs, bụ́ nke ha nọ na ya maa ya ikpe ọnwụ n’ihi nkwulu, wee malite iwelite ebubo dị iche iche. Ha boro ya ebubo ahụ nwere akụkụ atọ, bụ: “Anyị hụrụ onye a, ka [1] ọ na-eduhie mba anyị, [2] na-egbochi ha ịtụ ụtụ nye Siza, [3] na-asịkwa na ya onwe ya bụ Kraịst, bụrụkwa eze.”
Ọ bụ ebubo ahụ nke sịrị na Jisọs kwuru na ya bụ eze metụtara Paịlat. N’ihi ya, ọ banyeghachiri n’obíeze ahụ, wee kpọta Jisọs n’ebe ọ nọ, wee jụọ, sị: “Gị onwe gị [ị̀] bụ eze ndị Juu?” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ì mebiwo iwu site n’ịkpọsa onwe gị dị ka eze nke na-emegide Siza?
Jisọs chọrọ ịmata ókè Paịlat nụruworo ihe banyere ya, o wee jụọ, sị: “Gị onwe gị [ị̀] na-ekwu nke a n’onwe gị, ma ọ̀ bụ na ndị ọzọ gwara gị okwu banyere m?”
Paịlat kwupụtara na ya amaghị ihe ọ bụla banyere ya, na ya chọkwara imata nke bụ eziokwu. Ọ zaghachiri, sị, “Mụ onwe m [m̀] bụ onye Juu? Mba nke gị na ndị isi nchụàjà raara gị nye n’aka m: gịnị ka i mere?”
Ọ dịghị ụzọ ọ bụla Jisọs si nwaa izere isiokwu ahụ, bụ́ nke metụtara ọbụbụeze. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na azịza Jisọs nyere ugbu a bụụrụ Paịlat ihe ijuanya. Luk 22:66-23:3; Matiu 27:1-11; Mak 15:1; Jọn 18:28-35; Ọrụ 1:16-20.
◆ Ò bụ n’ihi nzube dị aṅaa ka Sanhedrin ahụ zukọtakwara ọzọ n’ụtụtụ?
◆ Olee otú Judas si nwụọ, gịnịkwa ka e ji 30 ego ọlaọcha ahụ mee?
◆ N’ihi gịnị ka ndị Juu ji chọọ ka ọ bụrụ ndị Rom gburu Jisọs, kama igbu ya n’onwe ha dị ka ha nwaworo ime n’oge dị iche iche tupu mgbe ahụ?
◆ Ebubo dịgasị aṅaa ka ndị Juu boro Jisọs?