Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
N’ikwu ya n’ụzọ ịkpọ okwu aha kpọmkwem, è nwere ọdịiche dị n’etiti okwu Bible ndị bụ́ “atụrụ ọzọ” na “oké ìgwè mmadụ”?
Ee, ọ bụ ezie na anyị ekwesịghị ịdị na-esi ọnwụ banyere iji okwu eme ihe ma ọ bụ bụrụ ndị a kpasuru iwe ma ọ bụrụ na mmadụ ejiri okwu ndị ahụ mee ihe n’ụzọ mgbanwerịta.
Ihe ka ọtụtụ ná ndị Kraịst maara nke ọma akụkụ ihe odide ndị ahụ ebe anyị na-achọta okwu ndị a. Jọn 10:16 bụ otu. N’ebe ahụ Jisọs sịrị: “Atụrụ ọzọ ka M nwekwara, ndị na-esiteghị n’ogige atụrụ nke a: aghaghị m idutekwa ndị ahụ, ha ga-anụkwa olu m; otu ìgwè atụrụ ga-adịkwa, otu Onye ọzụzụ atụrụ.” Okwu nke ọzọ, bụ́ “oké ìgwè mmadụ,” pụtara ná Mkpughe 7:9. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ihe ndị a gasịrị m wee hụ, ma lee, oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwa atụrụ ahụ, e gbokwasịworo ha uwe mwụda dị ọcha, igu nkwụ dịkwa n’aka ha.”
Ka anyị buru ụzọ tụlee Jọn 10:16. Olè ndị bụ atụrụ ahụ? Ọ dị mma, ọ ga-adị mma iburu n’uche na a na-ezo aka n’ebe ndị nile ji ịnọgidesi ike n’ihe na-eso ụzọ Jisọs nọ dị ka atụrụ. Na Luk 12:32, NW, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ndị ahụ ga-eje eluigwe “ìgwè nta.” Ìgwè nke gịnị? Nke atụrụ. “Atụrụ” nke “ìgwè nta” ahụ ga-abụ akụkụ nke Alaeze ahụ n’eluigwe. Otú ọ dị, e nwere ndị ọzọ, ndị nwere olileanya dị iche, ndị Jisọs na-elekwa anya dị ka atụrụ.
Anyị pụrụ ịhụ nke a na Jọn isi 10. Mgbe o kwusịrị okwu banyere atụrụ dị ka ndị ozi ya ndị ọ ga-akpọrọ maka ndụ n’eluigwe, Jisọs gbakwụnyere n’amaokwu nke 16, sị: “Atụrụ ọzọ ka M nwekwara, ndị na-esiteghị n’ogige atụrụ nke a: aghaghị m idutekwa ndị ahụ.” Ndịàmà Jehova amatawo eri ogologo oge na n’amaokwu a, Jisọs na-ekwu banyere ndị mmadụ nwere olileanya nke ndụ n’elu ala. Ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst, dị ka Abraham, Sera, Noa, na Malakaị, nwere olileanya ndị dị otú ahụ. Ya mere anyị pụrụ ịgụnye ha n’izi ezi dị ka akụkụ nke “atụrụ ọzọ” ahụ nke Jọn 10:16. N’oge Narị Afọ Iri ahụ, a ga-akpọlite ndị àmà dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst n’ọnwụ, mgbe ahụ ha ga-amụ banyere ma nakwere Kraịst Jisọs, na-aghọ “atụrụ ọzọ” nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ.
Anyị makwaara na kemgbe ọkpụkpọ nke ndị ahụ ga-eje eluigwe gwụsịrị, ọtụtụ nde mmadụ aghọwo ezi ndị Kraịst. A na-akpọkwa ndị a n’izi ezi “atụrụ ọzọ,” ebe ọ bụ na ha abụghị akụkụ nke “ìgwè nta” ahụ. Kama nke ahụ, atụrụ ọzọ ahụ taa na-atụ anya ịdịgide ndụ gaa n’ihu baa na paradaịs elu ala.
Ugbu a, gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ndị bụ “oké ìgwè mmadụ” ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 7:9? Ọ dị mma, lee anya n’amaokwu nke 13 na ajụjụ ahụ bụ́, “Hà bụ olè ndị, olee ebe ha si bịakwa?” Anyị na-achọta azịza ya ná Mkpughe 7:14: “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.” Ya mere, ndị mejupụtara “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụ ndị ahụ pụtara site ná, ma ọ bụ lanarịrị, oké mkpagbu ahụ. Dị ka amaokwu nke 17 na-ekwu, a ‘ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ’ n’elu ụwa.
Otú ọ dị, n’ụzọ kwere nghọta, ka ndị a wee nwee ike ịlanarị oké mkpagbu ahụ na-abịanụ, ha aghaghị ịsaworị uwe mwụda ha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ, na-aghọ ndị na-efe ezi ofufe. N’ihi ya, ọ bụ ezie na Mkpughe 7:9 na-akọwa ìgwè nke a mgbe mkpagbu ahụ gasịrị, anyị pụrụ iji okwu ahụ bụ “oké ìgwè mmadụ” mee ihe banyere ndị nile nwere olileanya elu ala ndị na-ejere Jehova ozi dị nsọ ugbu a, kpọmkwem tupu oké mkpagbu ahụ etiwapụ ya na mbuso agha nke mba dị iche iche megide okpukpe ụgha.
Ná nchịkọta, anyị pụrụ icheta “atụrụ ọzọ” dị ka okwu sara mbara karị, na-agụnyekọta ndị ohu nile nke Chineke nwere olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ọ gụnyere ìgwè a kpaara ókè karị nke ndị yiri atụrụ taa bụ́ ndị a na-achịkọta dị ka “oké ìgwè mmadụ” na-enwe olileanya nke ịdị ndụ kpọmkwem gabiga oké mkpagbu ahụ na-abịanụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị Kraịst ahụ na-anọgidesi ike n’ihe bụ́ ndị dị ndụ taa bụ “atụrụ ọzọ” ahụ, ha bụkwa akụkụ nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ.
Ọ dị mma ikwughachi na, ọ bụ ezie na ọ dị mma ka okwu ndị a doo anya, ọ dịghị mkpa ka onye Kraịst ọ bụla na-atụchasịkarị okwu—ihe a pụrụ ịkpọ ịkọchagharị okwu. Pọl dọrọ aka ná ntị banyere ụfọdụ bụ́ ndị ‘a fụliworo elu’ ndị na-etinye aka “n’esemokwu n’ihi okwu efu.” (1 Timoti 6:4) Ọ bụrụ na anyị aghọta ọdịiche ndị e nwere n’okwu n’onwe anyị, nke ahụ dị mma. Ma, ọ dịghịrị anyị mkpa, ma ọ bụ n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtaghị, ịkatọ onye ọzọ nke nwere ike ghara iji okwu Bible ndị ahụ mee ihe n’ụzọ kwesịkarịsịrị ekwesị.