Isi 29
Ịrụ Ọrụ Ọma n’Ụbọchị Izu Ike
Ọ BỤ oge opupu ihe ubi nke 31 O.A. Ọnwa ole na ole agafewo kemgbe Jisọs gwara nwanyị ahụ okwu n’olulu mmiri dị na Sameria mgbe o si Judia na-aga Galili.
Ugbu a, mgbe ọ kụzisịrị ihe nke ukwuu na Galili nile, Jisọs na-alaghachikwa Judia ọzọ, bụ́ ebe ọ na-ezi ozi ọma n’ụlọ nzukọ dị iche iche. E jiri ihe Bible kwuru banyere ozi ya na Galili tụnyere ọrụ Jisọs na Judia n’oge ọbịbịa ya na n’ọnwa ndị ọ nọrọ n’ebe ahụ mgbe Ememe Ngabiga nke mbụ gasịrị, Bible kwuru nnọọ ihe dị nta banyere nke a. N’ụzọ ihe àmà dị na ya, a nabataghị ozi ya nke ọma na Judia dị ka e mere na Galili.
Jisọs nọ n’ụzọ o si na-aga n’isi obodo Judia bụ́ Jerusalem maka Ememe Ngabiga nke 31 O.A. N’ebe a, na nso Ọnụ Ụzọ Ama nke Atụrụ nke obodo ahụ, e nwere ọdọ mmiri a na-akpọ Betesda, bụ́ ebe ọtụtụ ndị ahụ na-esighị ike, ndị ìsì na ndị ngwụrọ na-abịa. Ha kwere na a pụrụ ime ka ahụ dị ndị mmadụ ike site n’ịbanye n’ime mmiri nke ọdọ mmiri ahụ mgbe a kpasuru ya.
Ọ bụ Ụbọchị Izu Ike, Jisọs hụkwara otu nwoke nọ n’ọdọ mmiri ahụ bụ́ onye rịaworo ọrịa ruo 38 afọ. Ebe ọ bụ na ọ maara ogologo oge ọrịa nwoke ahụ dịworo, Jisọs na-ajụ, sị: “Ị̀ na-achọ ka e mee ka ahụ dị gị mma?”
Ọ zaghachiri Jisọs, sị: “Onyenwe anyị, enweghị m mmadụ, ka ọ tụba m n’ọdọ mmiri nta nke a, mgbe ọ bụla a kpasuru mmiri: ma mgbe mụ onwe m nọ na-abịa, onye ọzọ eburu m ụzọ rịdaa.”
Jisọs gwara ya, sị: “Bilie, chịrị ute [“ihe ndina nta,” NW] gị, na-ejegharị.” Ka o kwuru nke ahụ, nwoke ahụ nwetara ahụ ike ya ozugbo, chịlie ute ya, ma na-ejegharị!
Ma mgbe ndị Juu hụrụ nwoke ahụ, ha kwuru, sị: “Ọ bụ ụbọchị izu ike, o zighịkwa ezi n’iwu ka ị chịrị ute [“ihe ndina nta,” NW] gị.”
Nwoke ahụ zara ha, sị: “Onye mere ka ahụ dị m mma, onye ahụ sịrị m, Chịrị ute [“ihe ndina nta,” NW] gị, na-ejegharị.”
Ha jụrụ sị, “Ònye bụ mmadụ ahụ nke sịrị gị, Chịrị ute [“ihe ndina nta,” NW] gị na-ejegharị?” Jisọs ewezụgawo onwe ya n’ebe ahụ n’ihi ìgwè mmadụ ahụ, onye ahụ e mere ka ahụ ya dị ike amaghịkwa aha Jisọs. Otú ọ dị, ka oge na-aga, Jisọs na nwoke ahụ zutere n’ụlọ ukwu, nwoke ahụ matakwara onye ọ bụ nke mere ka ahụ dị ya ike.
Ya mere nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa ya na-achọ ebe ndị Juu ahụ nọ iji gwa ha na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya ọrịa ya. Ka ha matara nke a, ndị Juu gakwuuru Jisọs. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ iji mara ebe o si nweta ikike nke o ji na-eme ihe ndị a dị ebube? Ee e. Kama ọ bụ iji chọta ihe ọjọọ a ga-asị na o mere n’ihi na ọ na-arụ ọrụ ọma ndị a n’Ụbọchị Izu Ike. Ọbụna na ha malitere ịkpagbu ya! Luk 4:44; Jọh 5:1-16.
▪ Ihe dị ka ogologo oge ha aṅaa gabigaworo kemgbe Jisọs jere Judia nke ikpeazụ?
▪ Gịnị mere ọdọ mmiri ahụ a na-akpọ Betesda ji bụrụ ebe a ma ama otú a?
▪ Ọrụ ebube dị aṅaa ka Jisọs rụrụ n’ọdọ mmiri ahụ, gịnịkwa bụ mmeghachi omume nke ndị Juu?