Nne na Nna, Nwetanụ Obi Ụtọ n’Ụmụ Unu
“Ka nna gị na nne gị ṅụrịa.”—ILU 23:25.
1. Gịnị ga-eme ka ndị nne na nna nweta obi ụtọ n’ụmụ ha?
LEE ka o si dị mma ịhụ osisi ọhụrụ ka ọ na-eto, na-aghọkwa osisi gbara agba nke na-enye ịma mma na ndo—karịsịa ọ bụrụ na ị kụrụ ma lekọta ya! N’otu aka ahụ, nne na nne ndị na-elekọta ụmụaka na-etolite ịbụ ndị ohu Chineke tozuru okè na-enweta obi ụtọ dị ukwuu na ha, dị ka ilu Bible na-asị: “Nna nke onye ezi omume ga-etegharị egwú ọṅụ nke ukwuu: onye na-amụkwa onye maara ihe ga-aṅụrị ọṅụ na ya. Ka nna gị na nne gị ṅụrịa, ka nwanyị mụworo gị tegharịakwa egwú ọṅụ.”—Ilu 23:24, 25.
2, 3. (a) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi zere iru újú na obi ilu? (b) Gịnị dị ma osisi ọhụrụ ma ụmụaka mkpa iji bụrụ ihe na-enye obi ụtọ?
2 Ma, nwatakịrị anaghị aghọ “onye ezi omume” na “onye maara ihe” n’onwe ya. Mgbalị dị ukwuu dị mkpa iji gbochie ndị na-eto eto ịghọ ihe na-akpata “iru újú” na “ihe ilu,” ọbụna dị ka ọ pụrụ iwe ọrụ n’ime ka osisi ọhụrụ ghọọ osisi gbara agba. (Ilu 17:21, 25) Dị ka ihe atụ, osisi nkwado pụrụ ịzụ osisi ọhụrụ ahụ na-eto eto ito n’ụzọ kwụ ọtọ ma sie ike. Ịgba ya mmiri mgbe nile dị oké mkpa, ọ pụkwara ịdị osisi ọhụrụ mkpa ịbụ nke e chebere pụọ n’ụmụ ahụhụ. N’ikpeazụ, ịkwa osisi na-enye aka imepụta osisi mara mma.
3 Okwu Chineke na-ekpughe na ọ dị ụmụaka mkpa inwe ihe ndị dị ka ọzụzụ Chineke, ịgbade ha mmiri nke eziokwu Bible, nchebe pụọ ná mmetọ n’ụzọ omume, na inye ahụhụ ịhụnanya iji wepụsịa àgwà ndị na-adịghị mma. Iji gboo mkpa ndị a, a na-agba ndị nna ume karịsịa ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Gịnị ka nke a gụnyere?
Imesi Okwu Jehova Ike
4. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị nne na nna nwere n’ebe ụmụ ha nọ, gịnịkwa ka a chọrọ tupu ha enwe ike imezu ya?
4 “Ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị” pụtara ịchịkwa echiche anyị ikwekọ n’uche Jehova. Mgbe ahụ, ndị nne na nna aghaghị ịkụnye echiche Jehova n’okwu dị iche iche n’ime ụmụntakịrị ha. Ha aghaghịkwa iṅomi ihe nlereanya Chineke nke inye ahụhụ ọmịiko, ma ọ bụ ọzụzụ na-agbazi olu. (Abụ Ọma 103:10, 11; Ilu 3:11, 12) Ma tupu ndị nne na nna emee nke a, ha onwe ha aghaghị ịmịkọrọ okwu Jehova, dị ka onye amụma Chineke bụ́ Mosis dụrụ ụmụ Israel oge ochie ọdụ, sị: “Okwu ndị a [sitere n’aka Jehova], nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Deuterọnọmi 6:6.
5. Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ndị Israel bụ́ nne na nna ga-ezi ụmụ ha ihe, gịnịkwa ka “izi” ihe pụtara?
5 Ịmụchi Bible anya, ntụgharị uche, na ekpere na-akwadebe ndị nne na nna ime ihe ọzọ Mosis nyere n’iwu: “Ị ga-ejisikwa ike izi ụmụ gị [okwu Jehova], ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Okwu Hibru a sụgharịrị “izi” pụtara “ikwughachi,” “ikwu ugboro ugboro,” “ime ka ọ bamie nke ọma.” Rịba ama otú Mosis si mesikwuo mkpa ọ dị idebe okwu Jehova n’ihu ike: “Ị ga-ekekwa ha n’elu aka gị ka ha bụrụ ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa mkpọ n’ihu n’etiti anya gị abụọ. Ị ga-edekwasịkwa ha n’awara ụzọ abụọ nke ụlọ gị, na n’ọnụ ụzọ ámá gị nile.” N’ụzọ doro anya, Jehova chọrọ ka ndị nne na nna nye ụmụ ha nlebara anya ịhụnanya mgbe nile!—Deuterọnọmi 6:7-9.
6. Gịnị ka ndị nne na nna ga-ezi ụmụ ha, gịnịkwa bụ abamuru ya?
6 Gịnị bụ “okwu ndị a” nke Jehova nke ndị nne na nna ga-ezi ụmụ ha? Mosis ka kwughachisịrị ihe a na-akpọkarị Iwu Iri ahụ, tinyere iwu egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, agbala àmà ụgha, na agụụ ihe onye ọzọ agụla gị. Ụdị omume ndị ahụ a chọrọ, nakwa iwu bụ na “ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya,” bụ karịsịa ihe ndị nne na nna bụ́ ndị Israel ga-ezi ụmụntakịrị ha. (Deuterọnọmi 5:6-21; 6:1-5) Ị́ gaghị ekwere na nke a bụ ụdị nkụzi dị ụmụaka mkpa taa?
7. (a) Gịnị ka e ji ụmụaka tụnyere na Bible? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle ugbu a?
7 A gwara onye Israel bụ́ nna, sị: “Nwunye gị ga-adị ka osisi vine na-amị mkpụrụ n’ime ime ụlọ nke ụlọ gị: ụmụ gị ga-adị ka ome osisi olive gburugburu table gị.” (Abụ Ọma 128:3) Ma, ka ndị nne na nna nweta obi ụtọ ‘n’osisi ọhụrụ’ ha kama inweta iru újú, ha aghaghị inwe mmasị onwe onye n’ebe ụmụ ha nọ kwa ụbọchị. (Ilu 10:1; 13:24; 29:15, 17) Ka anyị tụlee otú ndị nne na nna pụrụ isi zụọ, kwọsa mmiri n’ụzọ ime mmụọ, chebe, ma nye ụmụ ha ahụhụ n’ịhụnanya n’ụzọ ha ga-abịa nweta ezi obi ụtọ na ha.
Ọzụzụ Site na Nwa Ọhụrụ
8. (a) Olee ndị jere ozi dị ka osisi nduzi maka Timoti? (b) Olee mgbe ọzụzụ ahụ malitere, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
8 Tụlee Timoti, bụ́ onye natara nkwado site na, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, osisi nduzi abụọ a manyesiri ike n’ala—nne na nne nne ya. Ebe ọ bụ na nna Timoti bụ onye Grik nakwa n’ụzọ ihe àmà na-egosi onye na-ekweghị ekwe, ọ bụ nne ya onye Juu, bụ́ Yunaịsị, na nne Yunaịsị, bụ́ Lọịs, zụrụ nwa okoro ahụ ‘site na nwa ọhụrụ n’ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ.’ (2 Timoti 1:5; 3:15; Ọrụ 16:1) A kwụghachiri ịdị uchu ha n’ịkụziri Timoti—ọbụna mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ—“oké ọrụ [Jehova] nile nke Ọ rụworo” ụgwọ ọrụ n’ụba. (Abụ Ọma 78:1, 3, 4) Timoti ghọrọ onye ozi ala ọzọ n’ala ndị dị anya, ikekwe mgbe ọ ka nọ n’afọ iri na ụma, o kerekwaara òkè pụtara ìhè n’iwusi ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ ike.—Ọrụ 16:2-5; 1 Ndị Kọrint 4:17; Ndị Filipaị 2:19-23.
9. Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi mụta izere ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya?
9 Ndị nne na nna, ụdị osisi nduzi dị aṅaa ka unu bụ? Dị ka ihe atụ, ùnu chọrọ ka ụmụ unu zụlite echiche ziri ezi banyere ihe onwunwe? Mgbe ahụ unu aghaghị isetịpụ ezi ihe nlereanya site n’ịghara ịchụso ngwá ụlọ eletrik ndị kasị ọhụrụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-adịghị unu mkpa n’ezie. Ọ bụrụ na unu ahọrọ ịchụso uru ihe onwunwe, ya ejula unu anya mgbe ụmụ unu na-eṅomi unu. (Matiu 6:24; 1 Timoti 6:9, 10) N’ezie, ọ bụrụ na osisi nduzi ahụ eguzoghị ọtọ, olee otú osisi ọhụrụ ahụ pụrụ isi tolite n’agbagọghị agbagọ?
10. Nduzi ònye ka ndị nne na nna kwesịrị ịchọ mgbe nile, àgwà dịkwa aṅaa ka ha kwesịrị inwe?
10 Ndị nne na nna ndị na-enweta obi ụtọ n’ụmụ ha ga-anọgide na-achọ enyemaka Chineke iji zụọ ha, na-eburu n’uche mgbe nile ihe bụ ọdịmma kasịnụ nke ụmụ ha n’ụzọ ime mmụọ. Otu nne nke ụmụ anọ kọrọ, sị: “Ọbụna tupu anyị amụọ ụmụ anyị, anyị na-ekpegara Jehova ekpere mgbe nile inyere anyị aka ịbụ ezi nne na nna, ịbụ ndị Okwu ya duziri, nakwa itinye ya ná ndụ anyị.” Ọ gbakwụnyere, sị: “‘Jehova na-ebute ụzọ’ abụghị nanị okwu e ji emekarị ihe kama ọ bụ ụzọ anyị si bie ndụ anyị.”—Ndị Ikpe 13:8.
Ịgba “Mmiri” Mgbe Nile
11. Gịnị ka ma osisi ọhụrụ ma ụmụaka chọrọ maka uto?
11 Inweta mmiri mgbe nile dị osisi ndị ọhụrụ mkpa, dị ka e gosiri site n’otú osisi na-esi eto nke ọma n’akụkụ osimiri. (Tụlee Mkpughe 22:1, 2.) Ụmụ ọhụrụ kwa ga-eme nke ọma n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na a na-enye ha mmiri nke eziokwu Bible mgbe nile. Ma ọ dị ndị nne na nna mkpa iburu n’uche ogologo oge nwa ha ga-etinyeru uche n’ihe. Ikekwe mkpirikpi nnọkọ izi ihe ndị a na-enwe mgbe mgbe ga-adị irè karịa ole na ole ndị toro ogologo. Ebelatala uru nke ụdị ihe ọmụmụ ndị ahụ dị nkenke karị. Iwepụta oge nọkọọ ọnụ dị oké mkpa iji zụlite nkekọ n’etiti nne ma ọ bụ nna na nwa, ichi anya a gbara ume ya n’Akwụkwọ Nsọ ugboro ugboro.—Deuterọnọmi 6:6-9; 11:18-21; Ilu 22:6.
12. Gịnị bụ uru nke isoro ụmụntakịrị na-ekpe ekpere?
12 Otu n’ime nnọkọ ahụ e sooro ụmụntakịrị nwee pụrụ ịbụ ná ngwụsị ụbọchị. Otu onye ntorobịa na-echeta, sị: “Ndị mụrụ m ga-anọdụ n’ụkwụ ihe ndina anyị kwa anyasị ma gee anyị ntị ka anyị na-ekpe ekpere nke onwe anyị.” Banyere uru nke ime nke a, onye ọzọ kwuru, sị: “Nke ahụ mere ka m nwee àgwà nke ikpegara Jehova ekpere kwa anyasị tupu mụ alakpuo ụra.” Mgbe ụmụaka na-anụ kwa ụbọchị ka nne na nna ha na-ekwu banyere Jehova ma kpegara ya ekpere, ọ na-aghọ onye dị adị n’ezie nye ha. Otu nwa okorobịa kwuru, sị: “M pụrụ imechi anya m n’ekpere nye Jehova ma hụ onye nwere omume nna nna n’ezie. Ndị mụrụ m nyeere m aka ịhụ na Jehova na-ekere òkè n’ihe ọ bụla anyị na-eme, na-ekwukwa.”
13. Gịnị ka oge ntụziaka a na-enwe mgbe nile pụrụ ịgụnye?
13 Iji nyere ụmụntakịrị aka ịmịkọrọ mmiri nke eziokwu Bible, ndị nne na nna pụrụ ịgụnye ọtụtụ ihe ndị bara uru n’oge inye ntụziaka ahụ a na-enwechi anya. Nne na nna nke ụmụaka abụọ na-erubeghị afọ iri na atọ kwuru, sị: “Ụmụaka abụọ ahụ malitere ịnata ọzụzụ ịnọrọ jụụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze malite n’izu ole na ole mbụ nke ndụ ha.” Otu onye bụ nna kọwara ihe ezinụlọ ya mere, sị: “Anyị depụtasịrị akwụkwọ nile nke Bible na kaadị index ma mụgharịa ido ha n’usoro, anyị nile na-eme ya onye mee ibe ya emee. Ụmụaka ahụ na-elepụkarị anya maka ya.” Ọtụtụ ezinụlọ na-agụnye oge ntụziaka dị mkpirikpi tupu ma ọ bụ mgbe e risịrị nri. Otu nna kwuru, sị: “Nri anyasị abụrụwo oge dị mma nye anyị ịtụle ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị.”
14. (a) Olee ọrụ na-enye ụgwọ ọrụ n’ụzọ ime mmụọ ndị a pụrụ isoro ụmụntakịrị kerịta? (b) Ikike dị aṅaa nke ịmụta ihe ka ụmụaka nwere?
14 Ụmụntakịrị na-enwekwa mmasị igere ihe ndekọ Bible doro anya ndị dị n’Akwukwọm nke Akukọ Bible.a “Mgbe ụmụaka ahụ dị ntakịrị,” ka otu di na nwunye kwuru, “a ga-atụlesị otu ihe mmụta n’akwụkwọ Akukọ Bible, mgbe ahụkwa ụmụ ahụ ga-eyiri uwe ihe nkiri ma mee akụkụ ya n’ụdị ntakịrị ihe nkiri. Ha nwere mmasị na nke a, ọtụtụ mgbekwa na-esi ọnwụ na ha ga-eme ihe karịrị otu akụkọ n’ọmụmụ ihe ọ bụla.” Eledala ikike nwa gị nwere ịmụta ihe anya! Ụmụaka dị afọ anọ eburuwo isiakwụkwọ nile nke akwụkwọ Akukọ Bible n’isi ma ọbụna mụta ịgụ Bible! Otu onye ntorobịa na-echeta na mgbe ọ dị ihe dị ka afọ atọ na ọkara, ọ ga-akpọhie “ihe e kpere n’ikpe” mgbe mgbe, ma nna ya gbara ya ume ịnọgide na-amụgharị ya.
15. Okwu ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịgụnye mgbe e sooro ụmụaka na-ekwurịta okwu, ihe àmà dịkwa aṅaa ka e nwere na ụdị nkwurịta okwu ahụ bara uru?
15 A pụkwara iji oge nnọkọ nke gị na ụmụaka gị kwadebe ha isoro ndị ọzọ kerịta mmiri nke eziokwu ahụ, dị ka site n’ịza ajụjụ ná nzukọ. (Ndị Hibru 10:24, 25) “N’oge nnọkọ mmụgharị ihe anyị, m ga-aza ajụjụ n’okwu nke aka m,” ka otu onye ntorobịa na-echeta. “E kweghịdị ka m gụọ ihe n’aghọtaghị ya.” Tụkwasị na nke a, a pụrụ ịzụ ụmụaka ikere òkè bara uru n’ozi ubi. Otu nwanyị nke nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere na-akọwa, sị: “Ọ dịghị mgbe anyị bụ ndị nsogharị bụ́ nanị ndị na-esonyere ndị mụrụ anyị n’ọrụ ha. Anyị maara na anyị nwere òkè, ọ bụrụgodị nanị ịkụ mgbịrịmgba ụzọ na ịhapụ mpempe akwụkwọ. Site n’iji nlezianya mee nkwadebe tupu ihe omume ngwụsị izu ọ bụla, anyị maara ihe anyị ga-ekwu. Ọ dịghị mgbe anyị tetara ụra n’ụtụtụ Saturday na-ajụ ma anyị ga-aga ozi. Anyị maara na anyị ga-aga.”
16. N’ihi gịnị ka isoro ụmụaka na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya ji dị mkpa?
16 A pụghị ikwubiga okwu ókè banyere mkpa ọ dị inye ụmụntakịrị mmiri nke eziokwu Bible mgbe nile, nke pụtara na ọmụmụ Bible ezinụlọ kwa izu dị mkpa. Otu nna nke ụmụ abụọ na-azọrọ na “otu ihe gbara ọkpụrụkpụ na-akpasu ụmụaka iwe bụ emechighị ihe anya.” (Ndị Efesọs 6:4) Ọ sịrị: “Mụ na nwunye m họọrọ otu ụbọchị na oge ma duzie ọmụmụ ihe ezinụlọ n’usoro ahụ n’ikwesị ntụkwasị obi. O teghị anya ụmụaka ahụ tụrụ anya ya n’oge ahụ.” Ụdị ọzụzụ ahụ nile malite na nwa ọhụrụ dị mkpa, n’ikwekọ n’okwu ahụ bụ eziokwu, ‘Otú e si na-agbazi ome osisi, otú ahụ ka osisi ahụ si eto.’
17. Gịnị dị mkpa dị ka inye ụmụntakịrị eziokwu Bible?
17 Inye ụmụntakịrị eziokwu Bible dị mkpa, ma ihe nlereanya ndị nne na nna dịkwa mkpa. Ụmụ gị hà na-ahụ gị ka ị na-amụ ihe, na-agachi nzukọ anya, na-ekere òkè n’ozi ubi, ee, na-enweta ọṅụ n’ime uche Jehova? (Abụ Ọma 40:8) Ọ dị mkpa na ha mere otú ahụ. N’ụzọ dị ịrịba ama, otu nwa nwanyị kwuru banyere nne ya, bụ́ onye tachiri obi ná mmegide di ya ma zụliteworị ụmụ isii ịghọ Ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ihe masịrị anyị karịsịa bụ ihe nlereanya nne m—o kwuru ihe dara ụda karịa okwu.”
Inye Ụmụntakịrị Nchebe
18. (a) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nye ụmụaka nchebe dị ha mkpa? (b) Ụdị ntụziaka dị aṅaa ka ụmụntakịrị nọ n’Israel natara banyere akụkụ ahụ ndị e ji amụ nwa?
18 Dị ka osisi ọhụrụ na-achọkarị nchebe pụọ n’ụmụ nje dị ize ndụ, n’ajọ usoro ihe a, ụmụntakịrị chọrọ nchebe pụọ n’aka ndị “ajọ mmadụ nile.” (2 Timoti 3:1-5, 13) Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nye nchebe a? Site n’inyere ha aka inweta amamihe Chineke! (Eklisiastis 7:12) Jehova nyere ndị Israel iwu—tinyere ‘ụmụntakịrị’ ha—ige ntị n’ọgụgụ nke Iwu ya, bụ́ nke gụnyere ịmata omume mmekọahụ kwesịrị ekwesị na nke na-ekwesịghị ekwesị. (Deuterọnọmi 31:12; Levitikọs 18:6-24) A kpọrọ aha akụkụ ahụ e ji amụ nwa ugboro ugboro, tinyere “mkpụrụ amụ” na “akụkụ ahụ mmekọahụ.” (Levitikọs 15:1-3, 16, NW; 21:20; 22:24; Ọnụ Ọgụgụ 25:8; Deuterọnọmi 23:10) N’ihi ịkpa àgwà na-ezighị ezi fere ókè nke ụwa taa, ọ dị ụmụntakịrị mkpa ịma ụzọ kwesịrị ekwesị na nke na-ekwesịghị ekwesị e si eji akụkụ ahụ ndị dị otú ahụ a gụnyere n’ihe okike nke Chineke kpọrọ ihe “dị mma nke ukwuu” eme ihe.—Jenesis 1:31; 1 Ndị Kọrint 12:21-24.
19. Gịnị bụ ntụziaka kwesịrị ekwesị inye ụmụntakịrị banyere akụkụ ahụ dịịrị nanị ha?
19 N’ụzọ dị mma, nne na nna ahụ, ma ọ bụ onye ọ bụla toworo eto na-elekọta nwa, kwesịrị ime ka nwa ahụ mata akụkụ ahụ dịịrị nanị ya. Mgbe ahụ ha kwesịrị ịkọwa na e kwesịghị ikwe ka onye ọzọ kpatụ akụkụ ahụ ndị a aka. Ebe ọ bụ na ndị na-emetọ ụmụaka na-anwalekarị otú ụmụaka si emeghachi omume ná mwakpo mmekọahụ dị aghụghọ, e kwesịrị ịkụziri nwatakịrị iguzogidesi ike ma sị, “M ga-ekpe gị!” Kụziere ụmụntakịrị gị na ha kwesịrị mgbe nile ikpe onye ọ bụla nwara imetụ ha aka n’ụzọ na-eme ka ha ghara inwe ahụ iru ala, n’agbanyeghị iyi egwu na-atụ ụjọ e mere.
Inye Ahụhụ Ịhụnanya
20. (a) Olee otú inye ahụhụ si dịrị ka ịkwa osisi? (b) Gịnị bụ mmetụta mbụ nke inye ahụhụ, ma gịnị ka ọ na-arụpụta?
20 Ụmụntakịrị na-erite uru site n’ahụhụ ịhụnanya, dị ka osisi na-eme site n’ịkwa ya akwa. (Ilu 1:8, 9; 4:13; 13:1) Mgbe e gbupụrụ alaka ndị a na-achọghị, a na-akwalite uto nke ndị ọzọ. Ya mere ọ bụrụ na ụmụ gị na-elekwasị anya karịsịa n’ihe onwunwe ma ọ bụ na-enwe mkpakọrịta ọjọọ ma ọ bụ ntụrụndụ na-adịghị mma, ọchịchọ ọjọọ ndị a dị ka alaka ndị dị mkpa ka e gbupụ ha. Ọ bụrụ na e wepụ ha, a ga-enyere ụmụ gị aka itoro gaa n’ihe ime mmụọ. Ná mmalite ụdị inye ahụhụ ahụ adịghị atọ ụtọ, dị nnọọ ka ịkwa osisi pụrụ inye osisi nsogbu. Ma ezi ihe nke inye ahụhụ na-arụpụta bụ uto e mere ka ọ dị ọhụrụ gaa n’ebe ị chọrọ ka nwa gị toro gaa.—Ndị Hibru 12:5-11.
21, 22. (a) Gịnị na-egosi na ahụhụ adịghị enye obi ụtọ inye ma ọ bụ ịnara? (b) N’ihi gịnị ka ndị nne na nna na-ekwesịghị igbochi inye ahụhụ?
21 A pụrụ ikweta ngwa ngwa na inye ahụhụ adịghị enye obi ụtọ ma ọ bụ inye ya enye ma ọ bụ ịnara ya anara. “Nwa m nwoke na-eso otu onye ntorobịa akpakọ bụ́ onye ndị okenye dọworo m aka ná ntị na ọ bụghị ezi mkpakọrịta,” ka otu nna kwuru. “M kwesịrị imeworị ihe ngwa ngwa karịa ka m mere. Ọ bụ ezie na nwa m nwoke etinyeghị aka n’ajọ omume doro anya, o wetụrụ oge ịgbazi echiche ya.” Nwa ya nwoke kwuru, sị: “Mgbe e kewapụrụ m n’ebe ezi enyi m nọ, o gburu mmụọ m.” Ma ọ gbakwụnyere, sị: “Nke a bụ mkpebi dị mma, ebe n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị a chụpụrụ ya.”
22 “Ọ bụkwa ụzọ ndụ ka ịba mba nile nke ịdọ aka ná ntị bụ,” ka Okwu Chineke na-ekwu. Ya mere n’agbanyeghị otú inye ahụhụ si sie ike inye, egbochila inye ya ụmụ gị. (Ilu 6:23; 23:13; 29:17) Ka oge na-aga, ha ga-enwe ekele na ị gbaziri ha olu. “M na-echeta iwesa nne na nna m iwe nke ukwuu mgbe e nyere m ahụhụ,” ka otu onye ntorobịa chetara. “Ugbu a m ga-ewe iwe ọbụna karị ma ọ bụrụ na nne na nna m hapụrụ inye m ahụhụ ahụ.”
Ụgwọ Ọrụ Ya Kwesịrị Mgbalị Ya
23. N’ihi gịnị ka nlebara anya ịhụnanya nile e mere n’isi ụmụntakịrị ji kwesị mgbalị ya?
23 A pụghị inwe ajụjụ ọ bụla banyere ya, ụmụaka ndị nne na nna, nakwa ndị ọzọ, na-achọta obi ụtọ n’ebe ha nọ bụ ihe sitere na nlebara anya ịhụnanya dị ukwuu, nke a na-enye kwa ụbọchị. Otú ọ dị, mgbalị nile e mere n’isi ha—ma ha bụ ụmụ anụ ahụ ma hà bụ nke ime mmụọ—kwesịrị nnọọ ụgwọ ọrụ nke a pụrụ inweta. Jọn onyeozi meworo agadi gosiri nke a mgbe o dere, sị: “Enweghị m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, bụ́ ịnụ ka ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.”—3 Jọn 4.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị dị ma osisi ọhụrụ ma ụmụaka mkpa iji ghọọ ndị kwesịrị otuto?
◻ Dị ka a pụrụ ikwu ya, olee otú ndị nne na nna pụrụ isi jee ozi dị ka osisi nduzi dị irè?
◻ Gịnị ka a pụrụ ịgụnye n’oge nnọkọ izi ihe ntụziaka e so ụmụntakịrị na-enwe, gịnịkwa ka e kwesịrị ịkụziri ha iguzogide?
◻ Olee otú inye ahụhụ si abara nwatakịrị uru, dị ka ịkwa osisi na-abara osisi uru?
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 10]
Site n’ikike Green Chimney’s Farm