Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
‘Mee Ihe Nile n’Ihi Ozi Ọma’ bụ isiokwu maka usoro ihe omume ọhụrụ maka ụbọchị mgbakọ pụrụ iche malite na March. (1 Kọr. 9:23) Ozi ọma Alaeze ahụ bụ ozi kasị mkpa a na-anụ taa. Usoro ihe omume ahụ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ùgwù pụrụ iche anyị nwere nke ịbụ ndị na-ezi ozi a dị ebube. Ọ ga-enyekwa anyị obi ike ịnọgide na-akpọsa ozi ọma ahụ na-esepụghị aka.—Ọrụ 5:42.
Usoro ihe omume ahụ ga-egosi anyị ụzọ isi jiri ọzụzụ ọchịchị Chineke e nyere anyị rụọ ọrụ n’ụzọ zuru ezu ka anyị wee nwee ike ịrụzu ihe ka ukwuu n’ozi ahụ. Anyị ga-anụ okwu site n’ọnụ ụfọdụ ndị meworo nhazigharị iji mụbaa ije ozi ha, tinyere ndị na-eto eto na-enye ihe nile ha nwere iji mee ka ozi ọma ahụ gaa n’ihu.—Tụlee Ndị Filipaị 2:22.
Okwu bụ́ isi, nke onye ọkà okwu si esi bịa ga-ekwu, ga-emesi ike mkpa ọ dị anyị ịnọgide bụrụ ‘ndị a nwapụtaworo ka e nye ozi ọma Ya n’aka anyị ná ntụkwasị obi idebe.’ (1 Tesa. 2:4) A ga-enyere anyị aka ịhụ na ọ bụrụ na anyị ga-ejigide ihe ùgwù ahụ nke isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ, anyị aghaghị iru eru mgbe nile n’ihe ndị Chineke chọrọ na ụkpụrụ ya n’iche echiche anyị na n’àgwà anyị. A ga-emekwa ka ngọzi ndị anyị na-enweta site n’ime nke a pụta ìhè.
Ka usoro ihe omume a dị mkpa ghara ịkwa gị. Ndị raara onwe ha nye ọhụrụ chọrọ ka e mee ha baptism n’ụbọchị mgbakọ ahụ pụrụ iche kwesịrị ịgwa onye isi oche ndị nlekọta ozugbo. Kpọọ ndị nile ị na-amụrụ ihe ka ha bịa. Ka anyị kwere ka Jehova wusie anyị ike ime ihe nile n’ihi ozi ọma ahụ ma si otú ahụ rụzuo ọrụ kasị ukwuu n’akụkụ a nke Amagedọn.