Isi nke 1
I Pụrụ Inwe Ọdịnihu Obi Ụtọ!
1, 2. Gịnị ka Onye Okike gị chọrọ ka i nwee?
MMAKỤ na-ekpo ọkụ nke onye ị hụrụ n’anya makụrụ gị. Ọchị si n’obi n’oge gị na ezi ndị enyi gị na-eri ezi nri. Obi ụtọ dị n’ikiri ụmụ gị ka ha ji ihu ọchị na-egwuri egwu. Oge ndị dị otú a bụ oge obi ụtọ ná ndụ. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị ndụ yiri ka ọ na-eweta otu oké nsogbu mgbe nke ọzọ gasịrị. Ọ bụrụ na nke ahụ abụwo ahụmahụ gị, nwee obi ike.
2 Ọ bụ uche Chineke ka ị nụ ụtọ nke obi ụtọ na-adịgide adịgide n’okpuru ọnọdụ ndị kasị mma na gburugburu ebe ndị magburu onwe ha. Nke a abụghị nrọ nkịtị, n’ihi na n’ezie Chineke na-enye gị mkpịsị ugodi isi nweta ọdịnihu obi ụtọ dị otú ahụ. Mkpịsị ugodi ahụ bụ ihe ọmụma.
3. Ihe ọmụma dị aṅaa bụ mkpịsị ugodi e si enweta obi ụtọ, n’ihi gịnịkwa ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Chineke pụrụ inye ihe ọmụma ahụ?
3 Anyị na-ekwu banyere ụdị ihe ọmụma pụrụ iche nke karịrị amamihe mmadụ nke ukwuu. Ọ bụ “ihe ọmụma Chineke.” (Ilu 2:5) Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga, otu onye so dee Bible kwuru, sị: “Ezinụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya; ma Onye rụrụ ihe nile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Cheedị echiche banyere ihe ọmụma nke Onye Mere ihe nile na-aghaghị inwe! Bible na-ekwu na Chineke na-agụ kpakpando nile ọnụ ma na-akpọ ha aha. Lee echiche na-ebu isi nke ahụ bụ, ebe e nwere ọtụtụ narị ijeri kpakpando n’usoro ụyọkọ kpakpando nke anyị, ndị na-enyocha mbara igwe na-ekwukwa na e nwere ihe dị ka otu narị ijeri ụyọkọ kpakpando ndị ọzọ! (Abụ Ọma 147:4) Chineke makwa ihe nile banyere anyị, n’ihi ya olee onye ọzọ pụrụ inye azịza ndị ka mma nye ajụjụ ndị dị mkpa banyere ndụ?—Matiu 10:30.
4. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ Chineke anya n’aka inye ntụziaka ndị ga-eduzi anyị, oleekwa akwụkwọ na-emezu mkpa nke a?
4 Cheedị banyere ndị ikom abụọ na-anwa ịrụzi ụgbọ ala ha. N’obi nkoropụ, otu chịsara ngwá ọrụ ya. Onye nke ọzọ jiri nwayọọ dozie nsogbu ahụ, gbanwuo ya, ma mụmụọ ọnụ ọchị ka injin ahụ malitere ma na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ gaghị esiri gị ike ikwu n’ime ndị ikom abụọ ahụ onye nke nwere akwụkwọ ntụziaka site n’aka onye rụrụ ụgbọ ala ahụ. Ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na Chineke ga-enye ntụziaka iji duzie anyị ná ndụ? Dị ka ị pụrụ ịma, Bible na-ekwu na ya bụ nke ahụ kpọmkwem—akwụkwọ ntụziaka na nduzi sitere n’aka Onye Okike anyị, nke a haziri inye ihe ọmụma Chineke.—2 Timoti 3:16.
5. Ruo ókè hà aṅaa ka ihe ọmụma dị na Bible bara uru?
5 Ọ bụrụ na ihe Bible na-ekwu bụ eziokwu, cheedị banyere akụ̀ nke ihe ọmụma nke na-aghaghị ịdị n’ime akwụkwọ ahụ! N’Ilu 2:1-5, ọ na-agba anyị ume ịchọ amamihe, igwu maka ya dị ka anyị ga-egwu ala maka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke zoro ezo—ọ bụghị n’ájá nke echiche ụmụ mmadụ, kama n’Okwu Chineke n’onwe ya. Ọ bụrụ na anyị achọọ n’ebe ahụ, anyị ‘ga-achọta ihe ọmụma Chineke.’ Ebe Chineke na-aghọta erughị eru na mkpa anyị dị iche iche, ọ na-enye anyị ntụziaka nke ga-enyere anyị aka ịdị ndụ n’udo na n’obi ụtọ. (Abụ Ọma 103:14; Aịsaịa 48:17) Ọzọkwa, ihe ọmụma Chineke na-enye anyị ozi ọma na-akpali akpali.
NDỤ EBIGHỊ EBI!
6. Ihe mmesi obi ike dị aṅaa ka Jisọs Kraịst nyere banyere ihe ọmụma Chineke?
6 Onye a maara nke ọma n’akụkọ ihe mere eme bụ́ Jisọs Kraịst kọwara akụkụ nke a nke ihe ọmụma Chineke n’ụzọ pụtara ìhè. O kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Cheedị banyere ya—ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi!
7. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na Chineke ezubeghị ka anyị na-anwụ anwụ?
7 Adịla ngwa n’iwezụga ndụ ebighị ebi dị ka nrọ nkịtị. Kama nke ahụ, lee otú e si mee ahụ mmadụ. A haziri ya n’ụzọ magburu onwe ya ịnụ ụtọ ihe, ịnụ ihe, ịnụ ísìsì ihe, ịhụ ụzọ, na inwe mmetụta. E nwere ọtụtụ ihe n’elu ala bụ́ ndị na-atọ akụkụ ahụ anyị dị iche iche ụtọ—nri dị ụtọ, abụ dị ụtọ nke ụmụ nnụnụ, okooko ọhịa na-esi ísì ụtọ, ebe ndị mara mma, mkpakọrịta na-enye obi ụtọ! Ụbụrụ anyị dị ịtụnanya karịkwara ígwè ọkpọka kọmputa nke ukwuu, n’ihi na ọ na-enyere anyị aka ịghọta na ịma ụtọ ihe nile ndị ahụ. Ị̀ na-eche na Onye Okike anyị chọrọ ka anyị nwụọ ma tụfuo ihe nile a? Ọ́ gaghị abụ ihe ezi uche dị n’ime ya karị ikwubi na ọ chọrọ ka anyị bie ndụ obi ụtọ ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? Ee, nke ahụ bụ ihe ihe ọmụma Chineke nwere ike ịpụtara gị.
NDỤ N’IME PARADAỊS
8. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ọdịnihu ihe a kpọrọ mmadụ?
8 A pụrụ ịchịkọta ihe Bible na-ekwu banyere ọdịnihu nke ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ ọnụ n’otu okwu—Paradaịs! Jisọs Kraịst kwuru banyere ya mgbe ọ gwara otu nwoke na-anwụ anwụ, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na aha a kpọtụrụ Paradaịs chetaara nwoke ahụ ọnọdụ obi ụtọ nke nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv. Mgbe Chineke kere ha, ha zuru okè ma biri n’ogige yiri ubi nke Onye Okike haziri ma kụọ. N’ụzọ kwesịrị ekwesị a kpọrọ ya ogige Iden, aha nke na-egosipụta obi ụtọ.
9. Olee ihe ọ dị ka ya ibi n’ime Paradaịs mbụ ahụ?
9 Lee ihe obi ụtọ ogige ahụ bụ! Ọ bụ paradaịs n’ezie. N’ime osisi ya ndị mara mma e nwere ndị na-amị mkpụrụ na-atọ ụtọ. Ka Adam na Iv na-amata ebe obibi ha nke ọma, na-aṅụ mmiri sitere ná mmiri ya ndị dị ụtọ, na-aghọkwa mkpụrụ sitere n’osisi ya dị iche iche, ha enweghị ihe ọ bụla mere ha ga-eji nwee nchegbu ma ọ bụ tụọ egwu. Ọbụna ụmụ anụmanụ abụghị ihe iyi egwu, n’ihi na Chineke enyewo nwoke ahụ na nwunye ya ike ịhụnanya n’elu ha nile. Tụkwasịkwa, nwoke na nwanyị mbụ ahụ nwere ezi ahụ ike. Ọ bụrụhaala na ha anọgide na-erubere Chineke isi, ọdịnihu ebighị ebi nke obi ụtọ na-echere ha. E nyere ha ọrụ na-eju afọ nke ilekọta ebe obibi ha dị ebube bụ́ Paradaịs. Ọzọ, Chineke nyere Adam na Iv iwu ‘ijupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe ha.’ Ha na ụmụ ha gaje ịgbasapụ ókèala nile nke Paradaịs ahụ ruo mgbe mbara ala anyị dum ghọrọ ebe mara mma na ebe obi ụtọ.—Jenesis 1:28.
10. Mgbe Jisọs kwuru okwu banyere Paradaịs, gịnị ka o bu n’uche?
10 Otú ọ dị, mgbe Jisọs kpọtụrụ Paradaịs aha, ọ dịghị agwa nwoke ahụ na-anwụ anwụ ka o chee echiche banyere oge dị anya gara aga. Ee e, Jisọs na-ekwu banyere ọdịnihu! Ọ maara na ebe obibi elu ala anyị dum ga-aghọ paradaịs. Chineke ga-esi otú a mezuo nzube mbụ ya maka ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa anyị. (Aịsaịa 55:10, 11) Ee, a ga-eweghachi Paradaịs! Oleekwa ihe ọ ga-adị ka ya? Ka Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ, zaa.
NDỤ N’IME PARADAỊS AHỤ E WEGHACHIRI
11. N’ime Paradaịs e weghachiri, gịnị ga-eme ọrịa, ịka nká, na ọnwụ?
11 Ọrịa, ịka nká, na ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe. Mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:5, 6) “Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara [ihe a kpọrọ mmadụ], bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
12. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na a gaghị enwe mpụ, ime ihe ike, na ajọ omume n’ime Paradaịs ọdịnihu ahụ?
12 Mpụ, ime ihe ike, na ajọ omume ga-agabiga ruo ebighị ebi. “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:9-11) “Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—Ilu 2:22.
13. Olee otú Chineke ga-esi weta udo?
13 Udo ga-ejupụta n’ụwa dum. “[Chineke] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; Ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; Ọ na-esure ụgbọ ala nile n’ọkụ.” (Abụ Ọma 46:9) “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị.”—Abụ Ọma 72:7.
14, 15. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ụlọ obibi, ọrụ, na nri n’ime Paradaịs ahụ e weghachiri?
14 Ebe obibi ga-abụ ihe e ji n’aka, ọrụ ana-ejukwa afọ. “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha . . . Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu, ha agaghị amụ ụmụ nye obi ọlụlọ mmiri.”—Aịsaịa 65:21-23.
15 Nri na-enye ahụ ike ga-adị n’ụba. “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) “Ala emewo ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.”—Abụ Ọma 67:6.
16. N’ihi gịnị ka ndụ n’ime Paradaịs ga-eji dịrị ụtọ?
16 Ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs ga-abụ nke obi ụtọ. “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) “Obi ga-atọ ọzara na ala kpọrọ nkụ ụtọ; ala ihe na-adịghị ga-etegharịkwa egwú ọṅụ, gbawaa okooko ọhịa, dị ka rose.”—Aịsaịa 35:1
IHE ỌMỤMA NA ỌDỊNIHU GỊ
17. (a) Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ndụ n’ime Paradaịs na-adọrọ mmasị gị? (b) Olee otú anyị si mara na Chineke ga-eme ka e nwee mgbanwe ndị dị ukwuu n’elu ala?
17 Ọ bụrụ na ndụ n’ime Paradaịs na-adọrọ mmasị gị, ekwela ka ihe ọ bụla dọlaa gị azụ inweta ihe ọmụma Chineke. Ọ hụrụ ihe a kpọrọ mmadụ n’anya, ọ ga-emekwa ka e nwee mgbanwe ndị ga-eme ka ụwa bụrụ paradaịs. E kwuwerị, ọ bụrụ na i nwere ike iweta nhụsianya na ikpe na-ezighị ezi jupụtara n’ụwa ná njedebe, ị́ gaghị eme otú ahụ? Ànyị ga-atụ Chineke anya ime ihe dị ala? N’ezie, Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya banyere oge mgbe Chineke ga-ewepụ usoro ihe nke a jupụtara ná nsogbu ma jiri ịchịisi zuru okè, nke ezi omume dochie ya. (Daniel 2:44) Ma Bible na-eme ihe karịrị ịgwa anyị ihe a nile. Ọ na-egosi anyị otú anyị pụrụ isi lanarị banye n’ime ụwa ọhụrụ Chineke o kwere ná nkwa.—2 Pita 3:13; 1 Jọn 2:17.
18. Gịnị ka ihe ọmụma Chineke pụrụ imere gị ugbu a?
18 Ihe ọmụma Chineke pụkwara imere gị ihe dị ukwuu kpọmkwem ugbu a. A zara ajụjụ ndị kasị mie emi na ndị kasị na-enye nsogbu n’uche banyere ndụ n’ime Bible. Ịnakwere nduzi ya ga-enyere gị aka iwulite ọbụbụenyi gị na Chineke. Lee aha ihe ùgwù dị ukwuu nke ahụ bụ! Nke a ga-emekwa ka i nwee ike inwe udo nke ọ bụ Chineke nanị pụrụ inye. (Ndị Rom 15:13, 33) Ka ị na-amalite ịnara ihe ọmụma a dị oké mkpa, ị na-abanye n’ọrụ kasị mkpa na nke kasị enye ụgwọ ọrụ ná ndụ gị. Ị gaghị akwa ụta ma ọlị inweta ihe ọmụma Chineke nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.
19. Ajụjụ dị aṅaa ka anyị ga-atụle n’isiakwụkwọ na-esonụ?
19 Anyị ezowo aka n’ebe Bible dị dị ka akwụkwọ nke nwere ihe ọmụma Chineke. Ma, olee otú anyị si mara na ọ bụghị akwụkwọ nke amamihe mmadụ, kama ihe ka nnọọ ukwuu? Anyị ga-atụle ajụjụ a n’isiakwụkwọ na-esonụ.
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
N’ihi gịnị ka ihe ọmụma Chineke pụrụ iji duga gị n’obi ụtọ ebighị ebi?
Olee otú ndụ ga-adị n’ime ụwa Paradaịs na-abịanụ?
N’ihi gịnị ka ị ga-eji rite uru site n’inweta ihe ọmụma Chineke ugbu a?