Isi nke 11
Ndị A Bụ Mgbe Ikpeazụ!
1. N’ihi gịnị ka o ji eri ọtụtụ ndị ọnụ mgbe ha na-atụgharị uche banyere ọnọdụ ụwa, ma olee ebe a pụrụ ịchọta nkọwa a pụrụ ịdabere na ya banyere ihe ndị na-eme n’ụwa?
OLEE otú ụwa anyị na-agba aghara si rute n’ọnọdụ a? Olee ebe anyị na-eche ihu? Ị̀ jụtụwo ajụjụ ndị dị otú ahụ? Ọ na-eri ọtụtụ ndị ọnụ mgbe ha lere anya n’ọnọdụ ụwa. Ihe ndị na-eme eme n’ezie dị ka obubu agha, ọrịa, na mpụ na-etinye ndị mmadụ n’ijuanya banyere ihe ọdịnihu ga-eweta. Ndị ndú ọchịchị na-enye olileanya dị nta. Otú ọ dị, a pụrụ inweta nkọwa a pụrụ ịdabere na ya nke ụbọchị ndị a siri ike site n’aka Chineke n’ime Okwu ya. Bible na-enyere anyị aka n’ụzọ kwesịrị ndabere ịhụ ebe anyị nọ ná ngafe nke oge. Ọ na-egosi anyị na anyị nọ na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe dị ugbu a.—2 Timoti 3:1.
2. Olee ajụjụ ndị na-eso ụzọ Jisọs jụrụ ya, oleekwa ụzọ o si zaghachi?
2 Tụlee, dị ka ihe atụ, azịza Jisọs nyere ajụjụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya welitere. Ụbọchị atọ tupu Jisọs anwụọ, ha jụrụ ya, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?”a (Matiu 24:3, NW) Ná nzaghachi, Jisọs kwuru banyere ihe omume na ọnọdụ ụfọdụ kpọmkwem n’ụwa bụ́ ndị ga-egosi n’ụzọ doro anya na usoro ihe a nke asọpụrụghị Chineke abanyewo na mgbe ikpeazụ ya.
3. N’ihi gịnị ka ọnọdụ dị n’ụwa ji kawanye njọ mgbe Jisọs malitere ịchị?
3 Dị ka e gosiri n’isiakwụkwọ bu ụzọ, usoro ọgụgụ oge Bible na-eduga ná nkwubi okwu bụ na Alaeze Chineke amaliteworị ịchị. Ma olee otú nke ahụ pụrụ isi bụrụ eziokwu? Ihe akawo njọ, ọ bụghị ịka mma. N’ezie, nke a bụ ihe ngosi dị ike na Alaeze Chineke amaliteworị ọchịchị. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, Abụ Ọma 110:2 na-eme ka anyị mara na ruo oge ụfọdụ Jisọs ga-achị ‘n’etiti ndị iro ya.’ N’ezie, ihe mbụ o mere dị ka Eze eluigwe bụ ịchụda Setan na ndị mmụọ ozi ọjọọ ya bịa na gburugburu elu ụwa. (Mkpughe 12:9) Gịnị bụ mmetụta ya? Ọ bụ kpọmkwem ihe Mkpughe 12:12 buru n’amụma: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” Anyị na-ebi ugbu a n’ime “nwa oge” ahụ.
4. Olee akụkụ ụfọdụ nke mgbe ikpeazụ ahụ, gịnịkwa ka ha na-egosi? (Lee igbe.)
4 Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe a jụrụ Jisọs ihe ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ usoro ihe a, azịza ya na-akpata ntụgharị uche. A na-ahụ ihe dị iche iche mejupụtara ihe ịrịba ama ahụ n’igbe dị na peji nke 102. Dị ka ị pụrụ ịhụ, ndị ozi bụ́ ndị Kraịst bụ́ Pọl, Pita, na Jọn nyekwuru anyị nkọwa banyere mgbe ikpeazụ ahụ. N’eziokwu, ihe kanụ n’akụkụ dị iche iche nke ihe ịrịba ama ahụ na nke mgbe ikpeazụ ahụ gụnyere ọnọdụ ihe isi ike dị iche iche. Ka o sina dị, mmezu nke amụma ndị a kwesịrị imesi anyị obi ike na usoro ihe ọjọọ nke a nọ nso ọgwụgwụ ya. Ka anyị leruo anya n’akụkụ ụfọdụ ndị gbara ọkpụrụkpụ nke mgbe ikpeazụ ahụ.
AKỤKỤ DỊ ICHE ICHE NKE MGBE IKPEAZỤ AHỤ
5, 6. Olee otú amụma ndị metụtara obubu agha na ụnwụ nri si na-emezu?
5 “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.” (Matiu 24:7; Mkpughe 6:4) Ernest Hemingway na-ede akwụkwọ kpọrọ Agha Ụwa Mbụ “mgbukpọsị kasị ukwuu, nke kasị sụọ ndị mmadụ akwụ, nke a na-achịkwaghị achịkwa, nke meworo n’elu ụwa.” Dị ka akwụkwọ bụ́ The World in the Crucible—1914-1919 kwuru, nke a bụ “ụdị dị nnọọ ọhụrụ nke agha, agha mbụ metụtara ihe nile n’ahụmahụ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ogologo oge o were, otú o siruru n’ike, na ọ̀tụ̀tụ̀ ya gafere ihe ọ bụla ọzọ a maara na mbụ ma ọ bụ nke mmadụ nile leworo anya ya.” Mgbe ahụ Agha Ụwa nke Abụọ sochiri, bụ́ nke bibiri ihe nke ukwuu karịa Agha Ụwa Mbụ. “Narị afọ nke iri abụọ,” ka prọfesọ mmụta akụkọ ihe mere eme bụ́ Hugh Thomas na-ekwu, “abụwo nke égbè ukwu na-awụpụ mgbọ, tankị, ụgbọ elu B-52, bọmbụ nuklia, na, n’ikpeazụ, ogbunìgwè a na-agbapụ agbapụ jupụtara n’ime ya. E jiwo agha ndị wụfuru ọbara karị, wetakwa ọdachi nke ukwuu karịa nke ọgbọ ọ bụla ọzọ kaa ya akara.” N’eziokwu, e kwuru ihe dị ukwuu banyere nkwasa ngwá agha mgbe Agha Nzuzo ahụ gwụsịrị. Ma, otu akụkọ na-eme atụmatụ na mgbe mbilata e mere ndokwa ya gasịrị ihe dị ka 10,000 ruo 20,000 nsí nuklia ga-afọdụ—ihe karịrị 900 okpukpu nke ike ngwá agha e jiri mee ihe n’oge Agha Ụwa nke Abụọ.
6 “Oké ụnwụ . . . ga-adịkwa.” (Matiu 24:7; Mkpughe 6:5, 6, 8) Eri 1914 e nwewo ọ dịkarịa ala 20 ụnwụ nri ndị dị oké njọ. Ebe ndị o metụtara gụnyere Bangladesh, Burundi, Cambodia, China, Etiopia, Gris, India, Nigeria, Russia, Rwanda, Somalia, na Sudan. Ma ọ bụghị ụkọ nri na-akpata ụnwụ nri mgbe nile. “Nri a na-emepụta n’elu ụwa n’ime afọ iri ndị ikpeazụ amụbawanyewo ngwa ngwa karịa ụba mmadụ ya,” ka otu ìgwè ndị mmụta sayensị mmepụta nri na ọnọdụ akụ̀ na ụba kwubiri. “Ma n’ihi na ọ dịkarịa ala 800 nde mmadụ na-anọgide n’ajọ ogbenye ọnụ ntụ, . . . ha enweghị ike ịzụta ihe zuru ezu site ná njupụta a iji napụta ha n’erighị nri na-edozi ahụ mgbe nile.” E nwere ntinye aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ọnọdụ ndị ọzọ. Dr. Abdelgalil Elmekki nke University of Toronto hotara ihe atụ abụọ ebe ọtụtụ puku mmadụ na-anwụ n’agụụ ka mba ha dị iche iche na-ebuga ọ̀tụ̀tụ̀ nri dị ukwuu n’ofesi. Ọchịchị ndị ahụ yiri ka ha nwere nchegbu ka nnọọ ukwuu n’iwelite ọ̀tụ̀tụ̀ ego ofesi ha iji nweta ego maka agha ha dị iche iche kama inye ndị ala ha nri. Gịnị bụ nkwubi okwu Dr. Elmekki? Ọtụtụ mgbe ụnwụ nri bụ “okwu nke nkesa ihe na ụkpụrụ ọchịchị.”
7. Olee ihe ụfọdụ bụ ezie banyere ọrịa na-efe efe taa?
7 “Ajọ ọrịa na-efe efe.” (Luk 21:11; Mkpughe 6:8) Ahụ ọkụ Spain nke 1918-1919 tara isi nke ọ dịkarịa ala 21 nde mmadụ. “Ọ dịbeghị mgbe otu ogbu mmadụ nke gburu ọtụtụ mmadụ oké ngwa ngwa tikpọsịworo ụwa n’akụkọ ihe mere eme,” ka A. A. Hoehling dere n’akwụkwọ bụ́ The Great Epidemic. Taa, ajọ ọrịa na-efe efe ka na-akpa ike. Kwa afọ, ọrịa cancer na-egbu nde mmadụ ise, ọrịa dị iche iche nke afọ ọsịsa na-ata isi ihe karịrị nde atọ nke ụmụ ọhụrụ na ụmụaka, ụkwara nta na-egbukwa nde mmadụ atọ. Ọrịa dị iche iche nke usoro iku ume, karịsịa oyi ịba n’ahụ, na-egbu kwa afọ nde ndị na-eto eto atọ na nkera bụ́ ndị na-erubeghị afọ ise. Ijeri mmadụ abụọ na nkera kwa na-ebu isi—ọkara nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa—na-arịa ọrịa ndị na-esite n’ụkọ mmiri ma ọ bụ na nke e metọrọ emetọ na ọnọdụ ịdị ọcha na-adịghị mma. Ọrịa AIDS na-eselite isi dị ka ihe ncheta ọzọ nke na mmadụ, n’agbanyeghị ihe ndị dị ịrịba ama ọ rụzuworo ná mmụta ọgwụ na ahụ ike, enweghị ike ikpochapụ ajọ ọrịa na-efe efe.
8. Olee otú ndị mmadụ si na-aghọ “ndị na-ahụ ego n’anya”?
8 “Mmadụ ga-abụ . . . ndị na-ahụ ego n’anya.” (2 Timoti 3:2) N’ala dị iche iche gburugburu ụwa, ndị mmadụ yiri ka ha nwere ọchịchọ na-adịghị ebi ebi maka akụ̀ na ụba ka ukwuu. A na-atụkarị “ihe ịga nke ọma” site n’otú ego mmadụ na-arụta hà, “ihe a rụzuru” site n’ihe ole mmadụ nwere. “Ịhụ ihe onwunwe n’anya ga-anọgide na-abụ otu n’ime ike mkpali ndị e nwere n’ọha na eze America . . . na ikike na-adịwanye mkpa n’ógbè azụmahịa ndị ọzọ buru ibu kwa,” ka osote onye isi oche nke otu ụlọ ọrụ ime mkpọsa kwuru. Nke a ọ̀ na-eme n’ebe i bi?
9. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ekwenyereghị ndị nne na nna e buru n’amụma?
9 “Ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha.” (2 Timoti 3:2) Ndị nne na nna, ndị nkụzi, na ndị ọzọ n’oge a enwewo ahụmahụ n’onwe ha na ọtụtụ ụmụaka enweghị nkwanye ùgwù, ha na-enupụkwa isi. Ụfọdụ n’ime ndị a na-eto eto na-emeghachi omume n’ihi ma ọ bụ na-eṅomi àgwà ọjọọ nke ndị nne na nna ha. Ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ụmụaka enwekwaghị okwukwe n’ụlọ akwụkwọ, n’iwu, n’okpukpe, na ná ndị mụrụ ha—na-enupụkwa isi megide ha. “Dị ka ihe na-ewu ewu,” ka otu onye nkụzi nweworo ahụmahụ na-ekwu, “ha yiri ka ha nwere nkwanye ùgwù dị nnọọ nta maka ihe ọ bụla.” Ma, ọ bụ ihe obi ụtọ na ọtụtụ ụmụaka na-atụ egwu Chineke bụ ezi ihe nlereanya n’akparamàgwà.
10, 11. Olee ihe àmà e nwere na ndị mmadụ dị ka anụ ọhịa ma nọrọ n’ụkọ ịhụnanya ebumpụta ụwa?
10 “Ndị dị ka anụ ọhịa.” (2 Timoti 3:3) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ka anụ ọhịa” pụtara ‘azụghị azụ, ara ara, enweghị ọmịiko na obi ebere mmadụ.’ Lee ka nke a si kwesị ọtụtụ ndị na-eme ihe ike ndị a na-eme taa! “Ndụ jupụtara nnọọ n’ihe na-aghasasị isi, bụrụ nke ihe iyi egwu tetọsịrị ọbara nke na ọ na-ewe ịka obi iji gụọ akụkọ kwa ụbọchị,” ka otu uche akwụkwọ akụkọ kwuru. Otu sajent ndị uwe ojii na-elekọta ụlọ rịbara ama na ọtụtụ ndị ntorobịa yiri ka ha na-ajụ ịhụ ihe ndị na-esite n’omume ha. Ọ sịrị: “E nwere echiche nke na, ‘Amaghị m banyere echi. M ga-enweta ihe m chọrọ taa.’”
11 “Ghara inwe ịhụnanya ebumpụta ụwa.” (2 Timoti 3:3, NW) A sụgharịtara mkpirikpi ahịrị okwu nke a site n’okwu Grik pụtara “enweghị mmetụta, adịghị ebere,” na-enyekwa echiche nke “ụkọ nke ịhụnanya ebumpụta ụwa, nke ezinụlọ.” (The New International Dictionary of New Testament Theology) Ee, ịhụnanya na-abụkarị nke a na-achọ achọ kpọmkwem n’ógbè ebe o kwesịrị ijupụta—n’ụlọ. Akụkọ nke mmeso mmetọ nke ndị òtù ọlụlụ, ụmụaka, na ọbụna nke nne na nna bụ́ ndị meworo agadi ejuwo ebe nile n’ụzọ na-enye nsogbu n’uche. Otu ìgwè ndị nchọpụta kwuru, sị: “Ime ihe ike mmadụ—ma ọ̀ bụ ịma ọra ma ọ bụ ịkwa aka, iti mma ma ọ bụ ịgba égbè—na-ewere ọnọdụ ọtụtụ ugboro na gburugburu ezinụlọ karịa n’ebe ọ bụla ọzọ n’etiti ọha mmadụ anyị.”
12. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ndị mmadụ nwere nanị ụdị nke nsọpụrụ Chineke?
12 “Na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha [na-agọnarị] ike ya.” (2 Timoti 3:5) Bible nwere ike ịgbanwe ndụ ndị mmadụ ka ọ ka mma. (Ndị Efesọs 4:22-24) Ma, ọtụtụ ndị taa na-eji okpukpe ha emere ihe mkpuchi nke ha na-anọ n’azụ ya eme ihe ọjọọ dị iche iche na-ewute Chineke. Ndị ndú okpukpe na-agbachikarị ịgha ụgha, izu ohi, na omume ọjọọ nke mmekọahụ nkịtị. Ọtụtụ okpukpe na-ekwusa ịhụnanya ma na-akwado obubu agha. “N’aha Onye Okike ahụ Kasị Elu,” ka otu uche akwụkwọ akụkọ dị na magazin bụ́ India Today rịbara ama, “ụmụ mmadụ akpawo arụ ndị kasị njọ megide ndị ibe ha e kere eke.” N’ezie, esemokwu ndị a kasị wụfuo ọbara na ha n’oge ndị na-adịbeghị anya gara aga—Agha Ụwa Mbụ na nke Abụọ—tiwapụrụ n’etiti Krisendọm.
13. Olee ihe àmà e nwere nke na a na-emebi ụwa?
13 “Na-emebi ụwa.” (Mkpughe 11:18) Ihe karịrị 1,600 ndị ọkà mmụta sayensị, tinyere 104 ndị ritere onyinye Nobel, site na gburugburu ụwa bịanyere aka n’otu ịdọ aka ná ntị, nke Òtù Ndị Mmụta Sayensị Na-enwe Nchegbu (UCS) nyere, bụ́ nke na-asị: “Ụmụ mmadụ na ụwa nọ n’ọnọdụ nsọrịta isi. . . . E nweghị ihe karịrị iri afọ ole na ole fọdụrụnụ tupu ohere nke izere iyi egwu ndị na-eche anyị ihu ugbu a efunahụ anyị.” Akụkọ ahụ kwuru na ihe ụmụ mmadụ na-eme bụ́ ndị na-eyi ndụ egwu “pụrụ ịgbanwegharịsị ụwa nke ukwuu nke na ọ gaghị enwe ike ịkwado ndụ n’ụzọ anyị maara.” E hotara mbelata nke ikuku ozone, mmetọ mmiri, igbukpọsị ọhịa, mfu nke ike imepụta nri nke ala, na mkpochapụ nke ọtụtụ ụdị anụmanụ na ihe ọkụkụ dị ka nsogbu ndị siri ike a na-aghaghị ịhụ maka ha. “Anyị ịkpaghasị njikọ nke ndabererịta nke ndụ,” ka òtù UCS ahụ kwuru, “pụrụ ịkpalite mmetụta ndị gbasazuru ebe nile, tinyere ndakpọ nke usoro dị iche iche nke ihe ndị dị ndụ bụ́ ndị anyị na-aghọtachaghị ụzọ ha si na-arụ ọrụ.”
14. Olee otú ị pụrụ isi nwapụta na a na-emezu Matiu 24:14 n’ụbọchị anyị?
14 “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14) Jisọs kwuru na a ga-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ gburugburu ụwa, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile. Site n’enyemaka na ngọzi Chineke, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova na-etinye ọtụtụ ijeri hour n’ọrụ a nke ime nkwusa na ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19, 20) Ee, Ndịàmà ghọtara na ikpe ọbara ga-ama ha ma ọ bụrụ na ha akpọsaghị ozi ọma ahụ. (Ezikiel 3:18, 19) Ma obi dị ha ụtọ na kwa afọ ọtụtụ puku mmadụ na-eji obi ekele anakwere ozi Alaeze ahụ ma na-ewere nguzo ha dị ka ezi ndị Kraịst, ya bụ, dị ka Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ihe ùgwù na-enweghị ọ̀tụ̀tụ̀ ijere Jehova ozi na isi otú a na-agbasa ihe ọmụma Chineke. Mgbe e kwusasịkwara ozi ọma nke a n’elu ụwa dum mmadụ bi, ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a ga-abịa.
JIRI IHE ÀMÀ AHỤ MEE IHE
15. Olee otú usoro ihe ọjọọ dị ugbu a ga-esi gwụsịa?
15 Olee otú usoro ihe a ga-esi gwụsịa? Bible na-ebu amụma “mkpagbu ukwu” nke ga-eji usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa ịwakpo “Babilọn Ukwu ahụ,” alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, malite. (Matiu 24:21; Mkpughe 17:5, 16) Jisọs kwuru na n’oge a ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya, kpakpando nile ga-adakwa site n’eluigwe, a ga-emekwa ka ike nile nke eluigwe mee mkpatụ.’ (Matiu 24:29) Nke a pụrụ ịpụta ihe nkịtị ndị ga-eme n’eluigwe. Ka o sina dị, a ga-ekpughepụ ma wepụsịa ìhè ndị na-egbuke egbuke nke ụwa okpukpe. Mgbe ahụ Setan, nke a kpọrọ “Gọg, nke ala Megọg,” ga-eji ụmụ mmadụ rụrụ arụ mee ihe n’ime mwakpo site n’obi nile megide ndị Jehova. Ma ọ gaghị agara Setan nke ọma, n’ihi na Chineke ga-abịa ịnapụta ha. (Ezikiel 38:1, 2, 14-23) “Oké mkpagbu” ahụ ga-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’Amagedọn, “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile.” Ọ ga-azachapụ akụkụ nta ikpeazụ nile nke nzukọ elu ala Setan, na-emeghepụ ụzọ maka ngọzi na-adịghị agwụ agwụ irutere ihe a kpọrọ mmadụ lanarịrịnụ.—Mkpughe 7:9, 14; 11:15; 16:14, 16; 21:3, 4.
16. Olee otú anyị si mara na akụkụ nile nke mgbe ikpeazụ e buru n’amụma metụtara oge anyị?
16 N’onwe ha, akụkụ ụfọdụ nke amụma ndị ahụ na-akọwa mgbe ikpeazụ ahụ pụrụ iyi ka ha metụtara oge ndị ọzọ n’akụkọ ihe mere eme. Ma mgbe a chịkọtara ha ọnụ, ihe àmà ndị e buru amụma ha na-atụ aka n’oge anyị. Iji maa atụ: Akara ndị mejupụtara usoro akara mkpịsị aka mmadụ na-aghọ usoro ihe na-apụghị ịdịrị onye ọ bụla ọzọ. N’otu aka ahụ, mgbe ikpeazụ ahụ nwere usoro akara, ma ọ bụ ihe omume ndị nke ya. Ndị a na-aghọ “usoro akara mkpịsị aka” nke na-apụghị ịdịrị oge ọ bụla ọzọ. Mgbe a tụlekọrọ ya na ihe ngosi ndị dị na Bible nke na Alaeze eluigwe Chineke na-achị achị ugbu a, ihe àmà ahụ na-enye ihe ndabere siri ike maka ikwubi na ndị a bụ n’ezie mgbe ikpeazụ ahụ. Ọzọkwa, e nwere ihe nnwapụta Akwụkwọ Nsọ doro anya na n’isi nso a ga-ebibi ajọ usoro ihe dị ugbu a.
17. Gịnị ka ihe ọmụma nke na ndị a bụ mgbe ikpeazụ ahụ kwesịrị ịkpali anyị ime?
17 Olee otú ị ga-esi jiri ihe àmà nke na ndị a bụ mgbe ikpeazụ mee ihe? Tụlee nke a: Ọ bụrụ na ajọ ifufe na-ebibi ihe na-eru nso, anyị na-eme ihe n’egbughị oge iji zere ọdachi. Ee, ihe Bible buru n’amụma maka usoro ihe dị ugbu a kwesịrị ịkwali anyị ime ihe. (Matiu 16:1-3) Anyị pụrụ ịhụ nke ọma na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke usoro ụwa nke a. Nke a kwesịrị ịkpali anyị ime mgbanwe ọ bụla dị mkpa iji nweta ihu ọma Chineke. (2 Pita 3:3, 10-12) Na-ezo aka n’ebe ya onwe ya nọ dị ka ngwá ọrụ nke nzọpụta, Jisọs na-akpọ òkù ahụ dị ngwa: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà: n’ihi na otú a ka ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile. Ma mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:34-36.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Bible ụfọdụ ji okwu bụ́ “ụwa” kama “usoro ihe” mee ihe. Expository Dictionary of New Testament Words nke W. E. Vine na-asị na okwu Grik bụ́ ai·onʹ “na-egosi ogologo oge a na-akaghị aka, ma ọ bụ oge nke a na-ele anya ná ndabere nke ihe na-eme n’ime oge ahụ.” Greek and English Lexicon to the New Testament nke Parkhurst (peji nke 17) tinyere okwu bụ́ “usoro ihe nke a” n’ịtụle ojiji e ji ai·oʹnes (ụbara okwu) mee ihe ná Ndị Hibru 1:2. Ya mere nsụgharị bụ́ “usoro ihe” kwekọrọ n’ihe odide Grik mbụ.
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
Gịnị ka Bible buru n’amụma banyere ihe ndị ga-eme n’ụwa ná mmalite nke ịchịisi Kraịst?
Olee akụkụ ụfọdụ nke mgbe ikpeazụ ahụ?
Gịnị na-eme ka i kwere na ndị a bụ mgbe ikpeazụ ahụ?
Igbe dị na peeji nke 102]
AKỤKỤ ỤFỌDỤ NKE MGBE IKPEAZỤ AHỤ
• Obubu agha na-enweghị atụ.—Matiu 24:7; Mkpughe 6:4.
• Ụnwụ nri.—Matiu 24:7; Mkpughe 6:5, 6, 8.
• Ajọ ọrịa na-efe efe.—Luk 21:11; Mkpughe 6:8.
• Ihe na-emebi iwu na-aba ụba.—Matiu 24:12.
• Imebi ụwa.—Mkpughe 11:18.
• Ala ọma jijiji.—Matiu 24:7.
• Oge dị oké egwu.—2 Timoti 3:1.
• Ịhụnanya gabigara ókè maka ego.—2 Timoti 3:2.
• Ekwenyereghị ndị nne na nna.—2 Timoti 3:2.
• Ụkọ nke ịhụnanya ebumpụta ụwa.—2 Timoti 3:3.
• Ịhụ ihe ụtọ kama ịhụ Chineke n’anya.—2 Timoti 3:4.
• Ụkọ nke njide onwe onye.—2 Timoti 3:3.
• Ahụghị ezi ihe n’anya.—2 Timoti 3:3.
• Achọghị ịma maka ihe ize ndụ na-eru nso.—Matiu 24:39.
• Ndị na-akwa emo ịjụ ihe nnwapụta nke mgbe ikpeazụ.—2 Pita 3:3, 4.
• Nkwusa zuru ụwa ọnụ nke Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.
[Foto dị na peeji nke 101]