Ị̀ Gaara Amataworị Mesaịa Ahụ?
JISỌS KRAỊST tinyere afọ atọ na ọkara n’ikwusa Okwu Chineke n’etiti ụmụ Israel. Ma ka ọ na-erule n’oge ozi elu ala ya bịara ná njedebe, ihe ka ọtụtụ ná ndị biri n’oge ya jụrụ ya dị ka Mesaịa ahụ, ma ọ bụ “Onye E Tere Mmanụ” nke Chineke kwere ná nkwa. N’ihi gịnị?
Bible na-enyere anyị aka ịmata ọtụtụ ihe mere ndị Juu narị afọ mbụ ji ghara ịnakwere Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. Atọ n’ime ihe ndị a na-egbochi ọtụtụ ịnakwere ọkwá Jisọs n’oge a dị ka Eze Mesaịa ahụ na-achị achị.
“Anyị Na-achọ Ịhụ Ihe Ịrịba Ama”
Otu ihe mere ndị Juu narị afọ mbụ ji ghara ịmata Mesaịa ahụ bụ ọjụjụ ha jụrụ ịnakwere ihe ịrịba ama ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ na-arụtụ Ịbụ Mesaịa ya aka. N’otu oge, ndị na-ege Jisọs ntị chọrọ ka o mee otu ihe ịrịba ama iji gosi na ya sitere n’ebe Chineke nọ. Dị ka ihe atụ, Matiu 12:38 na-akọ na ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii kwuru, sị: “Onye ozizi, anyị na-achọ ịhụ ihe ịrịba ama site n’aka Gị.” Ọ̀ bụ na Jisọs ebubeghị ụzọ gosi ha ihe ịrịba ama? N’ezie o gosiwo ha.
Tupu oge ahụ Jisọs arụọlarị ọtụtụ ọrụ ebube. O meworị ka mmiri ghọọ mmanya, gwọọ nwa okoro nọ n’ọnụ ọnwụ, gwọọ nne nwunye Pita na-arịa ọrịa, mee ka nwoke ekpenta dị ọcha, mee ka nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nwee ike ije ije, weghachi ahụ ike nke otu nwoke rịaworo ọrịa ruo afọ 38, mee ka aka kpọnwụrụ akpọnwụ nke otu nwoke dịghachi mma, gwọọ ajọ ọrịa nke ọtụtụ ndị mmadụ, gwọọ ohu otu onye ọchịagha, kpọlite nwa nwoke nke nwanyị di ya nwụrụ n’ọnwụ, gwọọkwa nwoke kpuru ìsì nke na-adịghị ekwu okwu. Ọrụ ebube ndị a mere na Kena, Kapanaun, Jerusalem, na Nain. Ọzọkwa, akụkọ banyere ọrụ ebube ndị ahụ gbasara na Judia nile nakwa mba ndị gbara ya gburugburu.—Jọn 2:1-12; 4:46-54; Matiu 8:14-17; 8:1-4; 9:1-8; Jọn 5:1-9; Matiu 12:9-14; Mak 3:7-12; Luk 7:1-10; 7:11-17; Matiu 12:22.
N’ụzọ doro anya, e nweghị ụkọ ihe ịrịba ama ndị na-egosipụta na Jisọs bụ Mesaịa ahụ. Ọ bụ ezie na o mere ọtụtụ ihe ịrịba ama n’ihu ndị mmadụ, ha etinyeghị okwukwe n’ebe ọ nọ. Ndị hụrụ ihe àmà na Chineke zitere Jisọs ma ghara ịnabata ya dị ka Mesaịa ahụ kpuru ìsì n’ụzọ ime mmụọ. Obi ha kpọrọ nkụ ma bụrụ nke eziokwu na-adịghị abanye.—Jọn 12:37-41.
Gịnị banyere oge anyị? Ụfọdụ ndị na-akpọsa, sị, “M na-ekwere nanị ihe m ji anya m hụ.” Ma nke ahụ ọ̀ bụ n’ezie ụzọ amamihe ịgbaso? Amụma Bible na-egosi na e meworị ka Jisọs nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze eluigwe n’Alaeze Mesaịa ahụ. Ebe ọ bụ na a dịghị ahụ ya anya, ihe ịrịba ama dị anyị mkpa iji nyere anyị aka ịghọta ịchịisi ya, nke kara mmalite nke mgbe ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a akara. Ị̀ na-amata ihe ịrịba ama ahụ?—Matiu 24:3.
Dị ka Bible si kwuo, mmalite nke ịchịisi Kraịst dị ka Eze Mesaịa bụ nke agha, ala ọma jijiji, ụkọ nri, na ọrịa na-efe efe n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ ga-aka akara. N’ime “mgbe ikpeazụ,” a ga-eji ịchọ ọdịmma onwe onye, anyaukwu, na enweghị njide onwe onye mara mmekọrịta ụmụ mmadụ. (2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:6, 7; Luk 21:10, 11) E wezụga ihe àmà ngụkọ oge, ihe karịrị akụkụ 20 dị iche iche nke mgbe ikpeazụ ahụ na-arụtụ aka ná mmalite nke ọchịchị Mesaịa ahụ na 1914.—Lee Ụlọ Nche nke March 1, 1993, peji nke 5.
“Ndị Na-ahụ Ego n’Anya”
Ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ ihe ọzọ mere ndị Juu ji jụ Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. Iwere akụ̀ na ụba dị ka ihe dị oké mkpa gbochiri ọtụtụ ndị isoro Jisọs. Dị ka ihe atụ, a maara ndị Farisii dị ka “ndị na-ahụ ego n’anya.” (Luk 16:14) Tụlee ihe banyere otu nwa okorobịa bụ onye ọchịchị nke bara ọgaranya bụ́ onye bịakwutere Jisọs ma jụọ otú ọ ga-esi nweta ndụ ebighị ebi. “Debe ihe nile e nyere n’iwu,” bụ nzaghachi Jisọs. “Ihe ndị a nile ka m rịbara ama: gịnị fọdụụrụ m ọzọ ime?” ka nwa okorobịa ahụ jụrụ, n’ụzọ doro anya na-eche na a chọrọ ihe karịrị idebe iwu ụfọdụ. “Ree ihe nile i nwere, nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe: bịakwa, so m,” ka Jisọs gwara ya. Lee ohere ọma ọ bụ—ịbụ onye na-eso ụzọ Mesaịa ahụ! Ma onye ọchịchị ahụ wezugara onwe ya, n’iwe. N’ihi gịnị? N’ihi na akụ̀ dị n’ụwa dị ya mkpa karịa akụ̀ dị n’eluigwe.—Matiu 19:16-22.
Ọnọdụ ahụ agbanwebeghị. Ịghọ ezi onye na-eso ụzọ Eze Mesaịa ahụ pụtara idebe ọdịmma ime mmụọ n’ihu ihe ọ bụla ọzọ, tinyere ihe onwunwe ụwa. Nye onye ọ bụla nwere echiche ịhụ ihe onwunwe n’anya, nke a bụ ihe ịma aka. Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye bụ ndị ozi ala ọzọ n’otu ala dị n’Ọwụwa Anyanwụ gwara otu nwanyị okwu banyere Bible. N’ikwere na ya ga-enwe mmasị ịmụkwu banyere Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, di na nwunye ahụ nyefere ya Ụlọ Nche na Teta! Olee otú o si meghachi omume? “Magazin ndị a hà ga-enyere m aka ịkpatakwu ego?” ka ọ jụrụ. Nwanyị ahụ nwere mmasị n’ihe onwunwe karịa n’ihe ime mmụọ.
Otu di na nwunye ahụ duziiri otu nwa okorobịa malitere ịbịa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Bible. “Ị na-egbu oge gị,” ka nne na nna ya gwara ya. “I kwesịrị inweta ọrụ nke abụọ n’uhuruchi ma kpatakwuo ego.” Lee ka o si dị mwute mgbe ndị nne na nna na-agba ụmụ ha ume itinye ihe onwunwe n’ihu ịmụta banyere Eze Mesaịa ahụ! “N’agbanyeghị akụ̀ na ụba ya nile onye ọchịchị apụghị ịzụta puku afọ iri nke ndụ,” ka otu ilu ndị China na-ekwu.
Ọtụtụ abịawo ghọta na ịmụ banyere na ịgbaso Eze Mesaịa ahụ adịghị enye ohere maka ịhụ ego n’anya. Otu Onyeàmà Jehova bụ́ onye nweburu azụmahịa nke ya nke na-enye ego dị ukwuu, sịrị: “Inwe oké ego dị ụtọ nke ukwuu ma ọ dịghị mkpa. Ego abụghị ihe na-eme mmadụ obi ụtọ.” Ọ bụ ugbu a onye òtù nke ezinụlọ Betel dị n’otu alaka Watch Tower Society dị na Europe.
“Egwu Ndị Juu”
Ịtụ mmadụ egwu bụkwa ihe ọzọ mere ndị Juu ji ghara ịnabata Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. Ịnakwere ịbụ Mesaịa ya n’ihu ọha pụtara itinye aha ha n’ihe ize ndụ. Nye ụfọdụ ụgwọ ahụ dị ukwuu gabiga ókè. Tụlee Nikọdimọs, onye òtù nke ụlọikpe dị elu ndị Juu a kpọrọ Sanhendrin. N’ịbụ onye ihe ịrịba ama na ozizi Jisọs masịrị, o kwetara, sị: “Rabaị, anyị matara na Ị bụ onye ozizi Nke siworo n’ebe Chineke nọ bịa: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ime ihe ịrịba ama ndị a nke Gị onwe gị na-eme, ma ọ bụrụ na Chineke [anọnyereghị] ya.” Ma Nikọdimọs bịakwutere Jisọs n’abalị, ikekwe iji zere ịbụ onye ndị Juu ọzọ matara.—Jọn 3:1, 2.
Nye ọtụtụ ndị nụrụ ka Jisọs na-ekwu okwu, nnwapụta nke ndị mmadụ dị mkpa karịa nke Chineke. (Jọn 5:44) Mgbe Jisọs nọ na Jerusalem maka Ememe Ụlọ Ntu na 32 O.A., “oké ntamu dịkwa n’etiti ìgwè mmadụ nile banyere Ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ọ dịghị onye kwuru okwu banyere Jisọs n’ihu ọha “n’ihi egwu ndị Juu.” (Jọn 7:10-13) Ọbụna nne na nna otu nwoke Jisọs gwọrọ ìsì adịghị njikere ikwupụta na ọrụ ebube ahụ bịara site n’aka onye nnọchiteanya Chineke. Ha onwe ha kwa “na-atụ egwu ndị Juu.”—Jọn 9:13-23.
Taa, ụfọdụ ghọtara na Jisọs na-achị ugbu a dị ka Eze Mesaịa n’eluigwe, ma ụjọ na-atụ ha ikwupụta ya n’ihu ọha. Nye ha ụgwọ nke ịtụfu ọkwá ha nwere n’ebe ndị ọzọ nọ dị ukwuu gabiga oké. Dị ka ihe atụ, na Germany, otu Onyeàmà Jehova sooro otu nwoke nwee nkwurịta okwu Bible bụ́ onye kwetara, sị: “Ihe unu bụ́ Ndịàmà na-ekwusa banyere Bible bụ eziokwu. Ma ọ bụrụ na m ghọọ Onyeàmà taa, ka ọ na-erule echi onye ọ bụla ga-ama banyere ya. Gịnị ka ha ga-eche n’ebe m na-arụ ọrụ, n’agbata obi, nakwa n’òtù mụ na ezinụlọ m nọ n’ime ya? Apụghị m idili nke ahụ.”
Gịnị na-akpata ịtụ mmadụ egwu? Nganga, ịhụnanya maka ịbụ onye a ma ama n’ime ezinụlọ na n’etiti ndị enyi, ụjọ ịkwa emo na mweda n’ala, nchegbu banyere ịdị iche n’ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nọ. Ụdị echiche ahụ na-abụ ule karịsịa nye ndị malitere isoro Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ nwere obi ụtọ ịmụta banyere Paradaịs ahụ nke Alaeze Mesaịa ga-eguzobe n’ụwa n’okpuru ịchịisi Jisọs Kraịst. Ma o nwere oké mmasị n’egwú disko, ịtụ mmadụ egwu gbochikwara ya ịgwa ndị ọzọ banyere olileanya a. N’ikpeazụ, ọ kara obi ikwu banyere Bible n’enweghị ihe mgbochi. Ndị enyi ya na-eso ya agba egwú disko jụrụ ya, ma di ya na nne na nna ya gosiri mmasị. E mesịrị mee nwanyị ahụ na nne ya baptism, di ya na nna ya malitekwara ịmụ Bible. Lee ụgwọ ọrụ ọ bụ maka imeri ịtụ mmadụ egwu!
Ị̀ Matara Mesaịa ahụ n’Ezie?
Mgbe Jisọs na-anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ, ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya nọ ya. Ha amataworị ya dị ka Mesaịa ahụ e buru n’amụma. Ndị ọzọ nọkwa ya bụ ndị ọchịchị ndị Juu, bụ́ ndị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ka na-achọ ihe ịrịba ama. “Ya zọpụta Onwe ya, ọ bụrụ na Onye a bụ Kraịst [ma ọ bụ Mesaịa] nke Chineke, Onye Ọ họpụtara.” (Luk 23:35) Ọ̀ dị mgbe ha ga-akwụsị ịjụ maka ihe ịrịba ama? Jisọs arụworị ọtụtụ ọrụ ebube. Tụkwasị na nke a, ọmụmụ, ozi, ikpe, ogbugbu, na mbilite n’ọnwụ ya mezuru ọtụtụ amụma Akwụkwọ Nsọ Hibru.—Lee “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 343-344.
Ndị na-agafenụ kọchara Jisọs, ebe ha jụworo ihe àmà nke ịbụ Mesaịa ya. (Matiu 27:39, 40) Ndị agha ji ụzọ ịhụ ihe onwunwe n’anya kee uwe Jisọs n’etiti onwe ha, na-efe nzà maka uwe ime ya. (Jọn 19:23, 24) Ịtụ mmadụ egwu keere òkè n’ọnọdụ ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, tụlee Josef nke Arimatia, onye òtù nke Sanhedrin. Ọ “na-eso ụzọ Jisọs, ma na nzuzo n’ihi egwu ndị Juu.” Mgbe Mesaịa nwụsịrị, Josef na Nikọdimọs lekọtara ozu Jisọs. Josef si otú a merie ịtụ mmadụ egwu ya.—Jọn 19:38-40.
Ọ̀ bụrụ na ị dịrịị ndụ na narị afọ mbụ, ị̀ gaara amataworị Jisọs dị ka Mesaịa ahụ? Ime otú ahụ gaara achọ na ị nabatara ihe àmà Akwụkwọ Nsọ, jụ echiche ịhụ ihe onwunwe n’anya, ma ghara ịdaba n’ịtụ mmadụ egwu. Na mgbe ikpeazụ a, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ matara Jisọs ugbu a dị ka Eze Mesaịa eluigwe?’ N’isi nso ọ ga-eweghara ihe omume nke ụwa. Mgbe nke ahụ mere, ị̀ ga-eso n’ime ndị matara Jisọs Kraịst n’ezie dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa?
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Ya adịla mgbe ị ga-ama ụma jụ ihe àmà na-egosi na Jisọs bụ Eze Mesaịa ahụ
[Foto dị na peeji nke 31]
Ịmụ banyere Mesaịa ahụ na-apụtakarị imeri egwu nke ihe ndị ọzọ pụrụ ikwu