ISI NKE ANỌ
Olee Otú Ị Pụrụ Isi Lekọta Ezinụlọ?
1. N’ihi gịnị ka ilekọta ezinụlọ ji bụrụ ihe siri oké ike taa?
“ỌNỌDỤ ụwa nke a na-agbanwe agbanwe.” (1 Ndị Kọrint 7:31, NW) E dere okwu ndị ahụ ihe karịrị 1,900 afọ gara aga, ma lee otú ha si bụrụ eziokwu taa! Ihe na-agbanwe, karịsịa n’ihe metụtara ndụ ezinụlọ. Ihe e lere anya dị ka ihe dị mma ma ọ bụ ọdịnala 40 ma ọ bụ 50 afọ gara aga na-abụkarị ihe a na-adịghị anakwere taa. N’ihi nke a, ilekọta ezinụlọ n’ụzọ na-aga nke ọma pụrụ iweta ihe ịma aka buru ibu. Otú o sina dị, ọ bụrụ na e gee ntị na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ, ị pụrụ ịnagide ihe ịma aka ndị ahụ.
KONYE AKPA GỊ EBE AKA GỊ GA-ERU
2. Ọnọdụ akụ̀ na ụba dịgasị aṅaa na-akpata nrụgide n’ime ezinụlọ?
2 Taa afọ adịkwaghị eju ọtụtụ ndị ná ndụ dị mfe, nke inwe mmasị n’ezinụlọ. Ka ụwa azụmahịa na-emepụta ọtụtụ ngwá ahịa karị ma na-eji nkà ime mkpọsa ya na-agbalị ịrata ọha na eze, ọtụtụ nde ndị nna na ndị nne na-etinye ọtụtụ hour n’ọrụ ka ha wee nwee ike ịzụta ngwá ahịa ndị a. Ọtụtụ nde ndị ọzọ nọ n’ịgba mbọ kwa ụbọchị nanị iji wee nweta ihe ha ga-eri. Ha aghaghị itinye oge ka nnọọ ukwuu n’ọrụ karịa ka ọ na-adịbu, ikekwe na-ejide ọrụ abụọ, nanị iji wee kwụọ ụgwọ maka ihe ndị dị mkpa. Ndị ọzọkwa ga-enwe obi ụtọ ịchọta ọrụ, ebe enweghị ọrụ bụ nsogbu gbasaruru ebe nile. Ee, ndụ adịghị abụkarị ihe dị mfe nye ezinụlọ nke oge a, ma ụkpụrụ Bible pụrụ inyere ezinụlọ aka ime ihe kasị mma ha pụrụ ime dị ka ọnọdụ ha si dị.
3. Ụkpụrụ dị aṅaa ka Pọl onyeozi kọwara, oleekwa ụzọ itinye ya n’ọrụ ga-esi nyere mmadụ aka inwe ihe ịga nke ọma n’ilekọta ezinụlọ?
3 Pọl onyeozi nwere ahụmahụ nke nrụgide akụ̀ na ụba. N’ime ihe banyere ha, ọ mụtara ihe bara uru, nke ọ kọwara n’akwụkwọ ozi ya nye enyi ya bụ́ Timoti. Pọl na-ede, sị: “Anyị ewetaghị ihe ọ bụla n’ụwa, ọ bụkwa n’ihi na anyị apụghị iwere ihe ọ bụla pụọ n’ime ya; ma ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:7, 8) N’eziokwu, ezinụlọ chọrọ ihe karịrị nanị ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ. Ọ chọkwara ebe a ga-ebi. Ụmụaka nwere mkpa agụmakwụkwọ. E nwekwara ụgwọ ụlọ ọgwụ na mmefu ndị ọzọ. Otú ọ bụla o si dị, ụkpụrụ ahụ dị n’okwu Pọl dị irè. Ọ bụrụ na ọ na-eju anyị afọ imeju mkpa anyị kama ịchụso ọchịchọ anyị, ndụ ga-aka mfe.
4, 5. Olee otú ibu ụzọ chee echiche ma mee atụmatụ pụrụ isi enye aka ná nlekọta ezinụlọ?
4 A na-achọta ụkpụrụ ọzọ na-enye aka n’otu n’ime ihe atụ Jisọs. Ọ sịrị: “Ònye n’ime unu, nke na-achọ iwu ụlọ elu, na-ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe, ma o nwere ego ọ ga-eji rụzuo ya?” (Luk 14:28) N’ebe a Jisọs na-ekwu banyere ibu ụzọ chee echiche, ibu ụzọ mee atụmatụ. Anyị hụrụ n’isiakwụkwọ bu nke a ụzọ otú nke a si enye aka mgbe mmadụ abụọ na-eche echiche ịlụ di na nwunye. Mgbe alụmdi na nwunye ahụ gasịkwara, ọ na-abụkwa ihe enyemaka n’ilekọta ezinụlọ. Ibu ụzọ chee echiche n’ọnọdụ nke a gụnyere inwe atụmatụ mmefu ego, ibu ụzọ mee atụmatụ ka i wee jiri amamihe were ihe i nwere mee ihe nke ọma. N’ụzọ dị otú a ezinụlọ pụrụ ịchịkwa mmefu ego, na-esetịpụ ego maka ihe ndị dị mkpa maka ụbọchị ọ bụla ma ọ bụ izu ọ bụla, ọ bụghị ibi ndụ gabiga ikike ya.
5 Ná mba ụfọdụ, ụdị ime atụmatụ mmefu ahụ pụrụ ịpụta iguzogide ọchịchọ nke ibiri ego n’ọmụrụ nwa dị ukwuu maka ịzụ ihe ndị na-enweghị isi. Ná ndị ọzọ, ọ pụrụ ịpụta inwe oké nchịkwa siri ike n’iji kaadị ịzụta ihe eme ihe. (Ilu 22:7) Ọ pụkwara ịpụta iguzogide ịzụ ihe ná mkpali—ịzụ ihe ozugbo ọ gbatara n’uche n’ebughị ụzọ tụlee mkpa dịnụ na ihe ndị ga-esi na ya pụta. Ọzọkwa, atụmatụ mmefu ga-eme ka ọ pụta ìhè na ego e mefuru n’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe nanị n’ịgba chaa chaa, ise ụtaba, na ịṅụbiga mmanya ókè na-emebi ọnọdụ akụ̀ na ụba nke ezinụlọ, bụrụkwa ime ihe na-emegide ụkpụrụ Bible.—Ilu 23:20, 21, 29-35; Ndị Rom 6:19; Ndị Efesọs 5:3-5.
6. Eziokwu Akwụkwọ Nsọ ndị dị aṅaa na-enyere ndị na-aghaghị ibi ndụ ogbenye aka?
6 Ma, gịnị banyere ndị a manyere ịda ogbenye? Otu ihe bụ na ha pụrụ inweta nkasi obi ịmara na nsogbu a zuru ụwa ọnụ bụ nanị ruo nwa oge. N’ụwa ọhụrụ ahụ nke na-abịa ọsọ ọsọ, Jehova ga-ehichapụ ịda ogbenye tinyere ajọ ihe ndị ọzọ na-akpatara ihe a kpọrọ mmadụ nhụsianya. (Abụ Ọma 72:1, 12-16) N’oge dị ugbu a, ezi ndị Kraịst, ọ bụrụgodị na ha dara oké ogbenye, adịghị enwe nkoropụ obi kpam kpam, n’ihi na ha nwere okwukwe ná nkwa Jehova: “M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.” Ya mere, onye kwere ekwe pụrụ iji obi ike kwuo, sị: “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka; m gaghị atụ egwu.” (Ndị Hibru 13:5, 6) N’ụbọchị ndị a siri ike, Jehova akwadowo ndị na-efe ya ofufe n’ọtụtụ ụzọ mgbe ha na-ebi ndụ dị ka ụkpụrụ ya dị iche iche si dị ma na-etinye Alaeze ya n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha. (Matiu 6:33) Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu n’ime ha pụrụ ịgba akaebe, na-asị, n’okwu Pọl onyeozi: “N’ihe ọ bụla na n’ihe nile e ziwo mụ ihe omimi a, bụ ịnọ n’afọ ojuju na ịnọkwa n’agụụ, ịbabiga ókè na ịnọkwa ná mkpa. Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.”—Ndị Filipaị 4:12, 13.
IKERỊTA IBU AHỤ
Ilekọta ebe obibi bụ ọrụ nke ezinụlọ
7. Okwu ndị dị aṅaa nke Jisọs, ma e tinye ha n’ọrụ, ga-enye aka ná nlekọta ezinụlọ na-aga nke ọma?
7 N’ọgwụgwụ nke ozi elu ala ya, Jisọs kwuru, sị: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Itinye ụkpụrụ nke a n’ọrụ n’ezinụlọ na-enye aka nke ukwuu n’ilekọta ezinụlọ. E kwuwerị, olee ndị bụ ndị agbata obi kasị dị anyị nso, ndị anyị hụkarịrị n’anya ma ọ bụghị ndị so anyị biri n’ezinụlọ—ndị di na nwunye, ndị mụrụ ụmụ na ụmụaka? Olee ụzọ ndị òtù ezinụlọ ga-esi gosi ịhụnanya maka ibe ha?
8. Olee otú a pụrụ isi gosipụta ịhụnanya n’ime ezinụlọ?
8 Otu ụzọ bụ site n’onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ imezu òkè ya kwesịrị ekwesị n’ọrụ ụlọ. Ya mere, ọ dị mkpa ịkụziri ụmụaka idebeghachi ihe mgbe ha jirisịrị ha mee ihe, ma ndị a hà bụ ákwà ma ọ bụ ihe egwuregwu. Ọ pụrụ iwe oge na mgbalị iji dozie àkwà n’ụtụtụ ọ bụla, ma ọ bụ ihe inyeaka buru ibu ná nlekọta nke ezinụlọ. Otú ọ dị, a pụghị izere mkpasasị ụfọdụ ndị dị nta, nke na-adịru nwa oge, ma mmadụ nile pụrụ ịrụkọ ọrụ ọnụ iji wee debe ụlọ ọcha ruo otú dị mma, tinyere ịsachasị ihe mgbe e richara nri. Ịdị umengwụ, imeju ọchịchọ onwe onye, na mmụọ ime ntamu, nke dị ọbọ na-enwe mmetụta na-adịghị mma n’ebe onye ọ bụla nọ. (Ilu 26:14-16) N’aka nke ọzọ, mmụọ nke obi na-atọ ụtọ, nke nwere ọchịchọ obi na-akwalite ndụ ezinụlọ obi ụtọ. “Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 Ndị Kọrint 9:7.
9, 10. (a) Ibu arọ dị aṅaa na-adakwasịkarị nwanyị nke nọ n’ụlọ, oleekwa ụzọ a pụrụ isi mee ka nke a ka mfe? (b) Echiche ziri ezi dị aṅaa banyere ọrụ ụlọ ka a tụrụ aro ya?
9 Nchebara echiche na ịhụnanya ga-enye aka igbochi ọnọdụ nke bụ oké nsogbu n’ebe obibi ụfọdụ. Ndị nne abụwo n’ụzọ ọdịnala ndị nkwado bụ́ isi nke ndụ ebe obibi. Ha elekọtawo ụmụaka, debe ụlọ ọcha, sụọ ákwà ezinụlọ, zụta ma siekwa ihe oriri. N’ala ụfọdụ, ndị inyom n’ikwekọ n’omenala arụwokwa ọrụ n’ubi, ree ihe si na ha pụta n’ahịa, ma ọ bụ tụnye ụtụ n’ụzọ ndị ọzọ n’ego ezinụlọ. Ọbụna n’ebe nke a na-abụbughị omenala, mkpa arụgidewo ọtụtụ nde ndị inyom nọ na di ịchọta ọrụ n’èzí ebe obibi. Onye bụ nwunye na nne nke na-arụsi ọrụ ike n’akụkụ ndị a dị iche iche kwesịrị ịja mma. Dị ka “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” a kọwara na Bible, ụbọchị ya jupụtara nke ọma n’ịrụsi ọrụ ike. “Ọ bụghịkwa nri umengwụ ka ọ na-eri.” (Ilu 31:10, 27) Ma, nke a apụtaghị na ọ bụ nanị nwanyị bụ onye pụrụ ịrụ ọrụ n’ebe obibi. Mgbe di na nwunye rụsịworo ọrụ ụbọchị nile n’èzí ebe obibi, nwunye ò kwesịrị iburu ibu arọ nke ịrụ ọrụ n’ụlọ nanị ya mgbe di na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ na-atụrụ ndụ? O kwesịghị ma ọlị. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 8:13, 14.) Ya mere, dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nne ahụ na-aga ịkwadebe nri, ọ pụrụ inwe obi ekele ma ndị ọzọ so n’ezinụlọ enye aka ná nkwadebe ahụ site n’ibupụta nri na table, ịga ahịa mgbe ụfọdụ, ma ọ bụ ime nhichasị ụfọdụ gburugburu ụlọ. Ee, mmadụ nile pụrụ ikere òkè n’ibu ọrụ ahụ.—Tụlee Ndị Galetia 6:2.
10 Ụfọdụ pụrụ ikwu, sị: “N’ebe m bi ọ bụghị ọrụ nwoke ime ihe ndị dị otú ahụ.” Nke ahụ pụrụ ịbụ eziokwu, ma ọ́ gaghị adị mma ịtụletụ okwu nke a? Mgbe Jehova Chineke malitere ezinụlọ, o tighị iwu na ọrụ ụfọdụ ga-abụ nanị ndị inyom ga-arụ ha. N’otu oge, mgbe ndị ozi pụrụ iche Jehova zitere bịakwutere nwoke ahụ nwere okwukwe bụ́ Abraham, o keere òkè n’onwe ya n’ịkwadebe na inye ndị ọbịa ya ihe oriri. (Jenesis 18:1-8) Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya.” (Ndị Efesọs 5:28) Ọ bụrụ na, ná ngwụsị nke ụbọchị, ike gwụrụ di, ọ chọọkwa izu ike, ọ̀ bụ na o yighị ka ọ dịkwa nwunye otú ahụ, ikekwe ọbụna karịa? (1 Pita 3:7) Mgbe ahụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị ekwesị ekwesị, bụrụkwa ihe ịhụnanya dị na ya ka di ahụ nye aka n’ebe obibi?—Ndị Filipaị 2:3, 4.
11. N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si setịpụ ihe nlereanya dị mma maka onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ?
11 Jisọs bụ ihe nlereanya kasị mma nke onye mere ihe na-atọ Chineke ụtọ ma wetara ndị na-eso ya obi ụtọ. N’agbanyeghị na ọ lụghị nwanyị, Jisọs bụ ezi ihe nlereanya nye ndị bụ di, nakwa nye ndị bụ nwunye na ụmụaka. O kwuru banyere onwe ya, sị: “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi,” ya bụ, ijere ndị ọzọ ozi. (Matiu 20:28) Lee aha obi ụtọ ezinụlọ ndị ahụ na-enwe ebe ndị nile mejupụtara ya na-azụlite àgwà dị otú ahụ!
ỊDỊ ỌCHA—GỊNỊ MERE O JI DỊ OKÉ MKPA?
12. Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka ndị na-ejere ya ozi?
12 A na-achọta ụkpụrụ Bible ọzọ nke pụrụ inye aka ná nlekọta ezinụlọ ná 2 Ndị Kọrint 7:1. N’ebe ahụ anyị na-agụ: “Ka anyị sachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ.” Ndị na-erubere okwu a e ji ike mmụọ nsọ dee isi bụ ndị Jehova na-anara, bụ́ onye na-achọ “okpukpe . . . nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ.” (Jemes 1:27) Ezinụlọ ha na-enwetakwa abamuru ndị so ya.
13. N’ihi gịnị ka ịdị ọcha ji dị mkpa ná nlekọta ezinụlọ?
13 Dị ka ihe atụ, Bible na-emesi anyị obi ike na ụbọchị na-abịa mgbe ọrịa na nrịanrịa na-agaghị adịkwa ọzọ. N’oge ahụ, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:4, 5) Otú ọ dị, tupu mgbe ahụ, ezinụlọ nile ga na-anagide ọrịa site n’oge ruo n’oge. Ọbụna Pọl na Timoti rịara ọrịa. (Ndị Galetia 4:13; 1 Timoti 5:23) Otú ọ dị, ndị ọkachamara ná mmụta ọgwụ na ahụ ike na-ekwu na a pụrụ igbochi ọtụtụ ọrịa. Ezinụlọ ndị maara ihe na-agbanarị ụfọdụ ọrịa a pụrụ igbochi ma ọ bụrụ na ha ezere adịghị ọcha nke anụ ahụ na nke ime mmụọ. Ka anyị tụlee ụzọ nke a pụrụ isi mee.—Tụlee Ilu 22:3.
14. N’ụzọ dị aṅaa ka ịdị ọcha n’omume pụrụ isi chebe ezinụlọ pụọ n’ọrịa?
14 Ịdị ọcha nke ime mmụọ gụnyere ịdị ọcha omume. Dị ka a maara nke ọma, Bible na-akwado ụkpụrụ omume dị elu ma na-akagbu ụdị ọ bụla nke mmekọrịta mmekọahụ n’ebe na-abụghị n’alụmdi na nwunye. “Ndị na-akwa iko, . . . ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Idebe ụkpụrụ ndị a na-adịghị agbanwe agbanwe dị mkpa maka ndị Kraịst na-ebi ndụ n’ụwa taa nke retọrọ eretọ. Ime otú ahụ na-atọ Chineke ụtọ ma na-enye aka ichebe ezinụlọ megide ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ dị ka ọrịa AIDS, ọrịa syphilis, gonorrhea, na chlamydia.—Ilu 7:10-23.
15. Nye ihe atụ nke adịghị ọcha elu ahụ nke pụrụ ịkpata nrịanrịa nke na-ekwesịghị ekwesị.
15 ‘Ịsachapụ onwe onye mmerụ nile nke ahụ’ na-enye aka ichebe ezinụlọ megide ọrịa ndị ọzọ. Adịghị ọcha anụ ahụ na-akpata ọtụtụ ọrịa. Ihe atụ pụtara ìhè bụ àgwà nke ise ụtaba. Ọ bụghị nanị na ise ụtaba na-emetọ akpa ume, uwe, na ikuku n’onwe ya kamakwa ọ na-eme ka ndị mmadụ daa ọrịa. Ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ kwa afọ n’ihi na ha sere ụtaba. Chee echiche banyere ya; kwa afọ, ọtụtụ nde ndị mmadụ agaraghị ada ọrịa ma nwụchuo ọnwụ ma ọ bụrụ na ha zeere ‘mmerụ ahụ nke anụ ahụ’!
16, 17. (a) Iwu dị aṅaa nke Jehova nyere chebere ndị Israel pụọ ná nrịanrịa ụfọdụ? (b) Olee ụzọ a pụrụ isi tinye ụkpụrụ dị na Deuterọnọmi 23:12, 13 n’ọrụ n’ezinụlọ nile?
16 Tụlee ihe atụ ọzọ. Ihe dị ka 3,500 afọ gara aga, Chineke nyere mba Israel Iwu ya iji wee hazie ofufe ha na, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ, ndụ ha na-adị kwa ụbọchị. Iwu ahụ nyere aka ichebe mba ahụ megide ọrịa site n’iguzobe ụkpụrụ iwu ụfọdụ bụ isi nke ịdị ọcha. Otu n’ime iwu dị otú ahụ bụ nke metụtara mkpofu nke nsị mmadụ, nke a ga-eli nke ọma n’ala n’ebe dị anya site n’ọmụma ụlọikwuu ahụ ka e wee ghara imetọ ikuku nke ebe ahụ ndị mmadụ bi. (Deuterọnọmi 23:12, 13) Iwu ochie ahụ ka bụkwa ndụmọdụ dị mma. Ọbụna taa ndị mmadụ na-ada ọrịa ma na-anwụ anwụ n’ihi na ha adịghị agbaso ya.a
17 N’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ iwu Israel ahụ, ebe ezinụlọ na-asa ahụ na ebe a na-eje mposi—ma ha dị n’ime ma ọ bụ n’èzí nke ebe obibi ahụ—kwesịrị ka e debe ha ọcha ma fesasịa ihe na-egbu nje na ha. Ọ bụrụ na e debeghị ebe ije mposi ahụ ọcha ma kpuchie ya, ijiji ga-ezukọ n’ebe ahụ ma kesaa nje n’ebe ndị ọzọ nke ebe obibi ahụ—na n’elu ihe oriri anyị na-eri! Ọzọkwa, ụmụaka na ndị okenye kwesịrị ịkwọ aka ha mgbe ha gasịrị n’ụlọ mposi. Ma ọ bụghị ya, ha na-ebu nje n’elu ahụ ha alaghachi. Dị ka otu onye dọkịta nke France kwuru, ịkwọ aka “ka bụ otu n’ime ihe ndị e ji n’aka maka mgbochi nke ụfọdụ ọrịa nke ikike igweri nri, iku ume, ma ọ bụ akpụkpọ ahụ.”
Idebe ihe ọcha dị ọnụ ala karịa ịzụrụ ọgwụ
18, 19. Aro ndị dịgasị aṅaa ka a na-atụ maka ịnọgide na-enwe ụlọ dị ọcha ọbụna n’ógbè ndị ogbenye?
18 N’eziokwu, ịdị ọcha bụ ihe ịma aka n’ógbè ndị ogbenye. Otu onye nke maara banyere ógbè dị otú ahụ nke ọma kọwara, sị: “Ihu igwe nke na-ekpo oké ọkụ na-eme ka ọrụ nke idebe ihe ọcha bụrụ ihe siri ike okpukpu abụọ. Oké ifufe uzuzu na-eji ntụ na-acha nchara nchara ekpuchi akụkụ ọ bụla n’ụlọ. . . . Ọnụ ọgụgụ ụba mmadụ na-arị oké elu n’obodo ukwu dị iche iche, nakwa n’ime obodo ụfọdụ, na-akpatakwa ihe ize ndụ ahụ ike. Paịpụ nsị ghere oghe, mkpokọba nke ihe mkpofu a na-ekpokọtaghị ekpokọta, ụlọ mposi ndị ruru unyi ọha ji eme ihe, òké, ọchịcha, na ijiji ndị bu ọrịa abụrụwo ihe a na-ahụ ebe nile.”
19 Ịnọgide na-adị ọcha n’okpuru ọnọdụ ndị a siri ike. Ka o sina dị, o kwesịrị mgbalị e tinyere na ya. Ncha na mmiri na ntakịrị ọrụ dị ọnụ ala karịa ọgwụ na ụgwọ ụlọ ọgwụ. Ọ bụrụ na i bi n’ụdị gburugburu ebe obibi dị otú ahụ, ruo n’ókè o kwere omume, debe ụlọ gị na gburugburu ụlọ gị ọcha, ka ọ gharakwa inwe nsị ụmụ anụmanụ. Ọ bụrụ na okporo ụzọ nke na-eduga n’ụlọ gị na-enwe apịtị n’udu mmiri, ị̀ pụrụ ịwụsa okwute ma ọ bụ nkume n’okporo ụzọ ahụ iji nye aka ime ka apịtị ghara ịbata n’ụlọ? Ọ bụrụ na e yiri akpụkpọ ụkwụ, à pụrụ iyipụ ha tupu onye yi ha abanye n’ụlọ ahụ? Ọzọkwa, ị ghaghị idebe ebe i si enweta mmiri ọcha pụọ ná mmerụ. E mere ngụkọ na ọ dịkarịa ala ọnwụ nde mmadụ abụọ kwa afọ bụ n’ihi ọrịa ndị e jikọtara ha na mmiri ruru unyi na adịghị ọcha.
20. Ọ bụrụ na ụlọ ahụ ga-adị ọcha, olee ndị na-aghaghị ikere òkè n’ibu ọru ahụ?
20 Ebe obibi dị ọcha dabeere n’onye ọ bụla—nne, nna, ụmụaka, na ndị ọbịa. Otu nne nke ụmụ asatọ na Kenya sịrị: “Mmadụ nile amụtawo ime òkè ha.” Ebe obibi dị ọcha, nke e doziri nke ọma na-akọ akụkọ banyere ezinụlọ ahụ dum. Otu ilu ndị Spain kwuru, sị: “E nweghị ọgụ ọ bụla n’etiti ịda ogbenye na ịdị ọcha.” Ma mmadụ ò bi ná nnukwute ụlọ, otu ọnụ ụlọ, ebe obibi dị ọgọ, ná nkịrịka ụlọ, ịdị ọcha bụ mkpịsị ugodi nke na-eduga n’ezinụlọ nwere ahụ ike karị.
AGBAMUME NA-EME KA ANYỊ MEE NKE ỌMA
21. N’ikwekọ n’Ilu 31:28, gịnị ga-enye aka iweta obi ụtọ n’ezinụlọ?
21 Mgbe ọ na-atụle nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma, akwụkwọ Ilu na-asị: “Ụmụ ya ebiliwo, kpọọ ya nwanyị ihe na-agara nke ọma; di ya kwa, ọ na-etokwa ya.” (Ilu 31:28) Olee mgbe ikpeazụ ị jara onye òtù ezinụlọ gị mma? N’ezie, anyị dị ka ihe a kụrụ n’ubi n’oge opupu ihe ubi nke dị njikere ịgbawa okooko mgbe ha nwetara ụfọdụ okpomọkụ na mmiri. N’ọnọdụ nke anyị, anyị nwere mkpa ikpo ọkụ nke ịja mma. Nwunye ịmara na di ya na-enwe obi ekele maka ịrụsi ọrụ ike na nlekọta ịhụnanya ya nakwa na ọ dịghị emeso ya dị ka ihe na-abaghị n’ihe na-enye aka. (Ilu 15:23; 25:11) Ọ na-abụkwa ihe obi ụtọ mgbe nwunye jara di ya mma maka ọrụ ya n’èzí na n’ime ụlọ ahụ. Ụmụaka n’otu aka ahụ na-emekwa nke ọma mgbe ndị nne na nna ha na-eto ha maka mgbalị ha n’ebe obibi, n’ụlọ akwụkwọ, ma ọ bụ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Leekwa ihe dị ukwuu ntakịrị obi ekele na-arụzu! Gịnị ka ọ na-ewe gị iji sị: “I meela”? Ntakịrị ihe, ma ihe ọ na-arụpụta n’ọdịmma nke ezinụlọ pụrụ ịdị ukwu.
22. Gịnị dị mkpa ka ezinụlọ wee bụrụ nke e ‘guzosiri ike,’ oleekwa ụzọ a pụrụ isi nweta nke a?
22 N’ihi ọtụtụ ihe, ilekọta ezinụlọ adịghị mfe. Ka o sina dị, a pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ime ya. Otu ilu Bible na-asị: “Amamihe ka e ji ewu ụlọ; ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike.” (Ilu 24:3) A pụrụ inweta amamihe na nghọta ma ọ bụrụ na mmadụ nile n’ezinụlọ agbalịa ịmụta uche Chineke na itinye ya n’ọrụ ná ndụ ha. Ezinụlọ obi ụtọ n’ezie kwesịrị mgbalị e tinyere!
a N’otu akwụkwọ nke na-enye ndụmọdụ ụzọ isi zere afọ ọsịsa—ọrịa dị ebe nile nke na-eduga n’ọnwụ ọtụtụ ụmụ ọhụrụ—Òtù Ahụ Ike Ụwa kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nweghị ụlọ mposi: nyụọ nsị n’ebe dị anya site n’ụlọ, na site n’ebe ụmụaka na-egwu egwu, nakwa ma ọ dịkarịa ala mita 10 site n’ebe e si enweta mmiri; jiri ájá kpochie nsị ahụ.”