Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 3/15 p. 23
  • Ihe Mere Okwukwe na Amamihe Ji Dị Anyị Mkpa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Okwukwe na Amamihe Ji Dị Anyị Mkpa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwukwe, Ọnwụnwa, na Ọrụ Dị Iche Iche
  • Amamihe Sitere n’Eluigwe na Ekpere
  • “Ndị Na-eme Okwu ahụ” n’Ọṅụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • N’agbanyeghị Ọnwụnwa, Jidesie Okwukwe Gị Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Okwukwe Na-akwali Anyị Ime Ihe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Mụta Ihe n’Aka Nwanne Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 3/15 p. 23

Ihe Mere Okwukwe na Amamihe Ji Dị Anyị Mkpa

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi nke Jemes

Ọ DỊ ndị ohu Jehova mkpa inwe ntachi obi mgbe ha nọ n’okpuru ọnwụnwa. Ha aghaghịkwa izere omume ndị ga-ewetara ha nkatọ nke Chineke. E mere ka isi ihe ndị dị otú ahụ pụta ìhè n’akwụkwọ ozi nke Jemes, ime ihe pụtara ìhè banyere ha chọkwara okwukwe siri ike na amamihe nke si n’eluigwe bịa.

Onye dere akwụkwọ ozi nke a akọwaghị onwe ya dị ka otu n’ime ndị ozi Jisọs abụọ ahụ aha ha bụ Jemes kama dị ka ‘ohu nke Chineke na nke Kraịst.’ N’otu aka ahụ, onye ahụ otu nne ji ya na Jisọs, bụ́ Jud kwuru na ya bụ “ohu nke Jisọs Kraịst, na nwanne Jemes.” (Jemes 1:1; Jud 1; Matiu 10:2, 3) Ya mere, ihe àmà na-egosi na ọ bụ onye ahụ otu nne ji ya na Jisọs, bụ́ Jemes dere akwụkwọ ozi ahụ nke a kpọkwasịrị aha ya.—Mak 6:3.

Akwụkwọ ozi nke a ekwughị ihe ọ bụla banyere mbibi nke Jerusalem n’afọ 70 O.A., onye ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Josephus gosikwara na e gburu Jemes n’ihi okwukwe ya n’oge na-adịghị anya mgbe onye ọchịchị Rom ahụ bụ Festọs nwụsịrị n’ihe dị ka n’afọ 62 O.A. Ya mere, ọ pụtara ìhè na e dere akwụkwọ ozi ahụ tupu afọ 62 O.A. E degaara ya ‘ebo iri na abụọ’ nke Israel ime mmụọ, n’ihi na ọ bụ ndị ahụ ‘na-enwe okwukwe nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst’ ka e lekwasịrị anya dee ya.—Jemes 1:1; 2:1; Ndị Galetia 6:16.

Jemes jiri ihe atụ ndị pụrụ inyere anyị aka icheta ndụmọdụ ya wee mee ihe. Dị ka ihe atụ, o gosiri na mmadụ nke na-arịọ amamihe n’aka Chineke ekwesịghị inwe obi abụọ, “n’ihi na onye nwere obi abụọ yiri ebili mmiri nke oké osimiri mgbe ifufe na-efegharị ya, na-atụlikwa ya elu.” (1:5-8) E kwesịrị ịchịkwa ire anyị n’ihi na ọ pụrụ iduzi ụzọ anyị na-agbaso dị ka ụmara isi ụgbọ na-eduzi ụgbọ mmiri. (3:1, 4) Ijikwa nagide ọnwụnwa dị iche iche, ọ dị mkpa ka anyị gosipụta iji ndidi nwee ntachi obi dị ka onye ọrụ ugbo na-eme mgbe ọ na-echere oge owuwe ihe ubi.—5:7, 8.

Okwukwe, Ọnwụnwa, na Ọrụ Dị Iche Iche

Jemes bu ụzọ gosipụta na anyị pụrụ inwe obi ụtọ dị ka ndị Kraịst n’agbanyeghị ọnwụnwa anyị nile. (1:1-18) Ụfọdụ n’ime ọnwụnwa ndị a, dị ka ịrịa ọrịa, na-emetụta mmadụ nile, ma ndị Kraịst na-atakwa ahụhụ n’ihi ịbụ ndị ohu nke Chineke na nke Kraịst. Jehova ga-enye anyị amamihe dị mkpa iji nwee ntachi obi ma ọ bụrụ na anyị anọgide jiri okwukwe na-arịọ maka ya. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ na-eji ihe ọjọọ na-anwa anyị ọnwụnwa, anyị pụkwara ịdabere na ya inye anyị ezi ihe.

Iji wee nweta enyemaka Chineke, anyị aghaghị ife ya ofufe site n’ọrụ ndị na-egosipụta okwukwe anyị. (1:19–2:26) Nke a chọrọ anyị n’aka ịbụ “ndị na-eme okwu ahụ,” ọ bụghị nanị ndị na-anụ anụ. Anyị aghaghị ịchịkwa ire anyị, lekọta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ, nọgidekwa n’enweghị ntụpọ site n’ụwa. Ọ bụrụ na anyị emenyere ndị ọgaranya ma leda ndị ogbenye anya, anyị ga-emebi “iwu nke eze anyị” nke ịhụnanya. Ọ dịkwa mkpa ka anyị cheta na a na-egosipụta okwukwe site n’ọrụ, dị ka ihe nlereanya nke Abraham na Rehab mere ka ọ pụta ìhè. N’eziokwu, “okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya.”

Amamihe Sitere n’Eluigwe na Ekpere

Ọ dị mkpa ka ndị ozizi nwee ma okwukwe ma amamihe iji wee rụzuo ọrụ ha nke ọma. (3:1-18) Ha nwere ibu ọrụ dị oké arọ dị ka ndị na-ezi ihe. Dị ka ha, anyị aghaghị ịchịkwa ire anyị—bụ́ ihe amamihe sitere n’eluigwe na-enyere anyị aka ime.

Amamihe na-emekwa ka anyị nwee ike ịghọta na ịdaba n’ime omume ụwa ga-emebi mmekọrịta anyị na Chineke. (4:1–5:12) Ọ bụrụ na anyị agbawo mgba imezu ọchịchọ ọdịmma onwe onye dị iche iche ma ọ bụ na anyị akatọwo ụmụnna anyị, ọ dị mkpa ka anyị chegharịa. Leekwa ka o si dị mkpa izere ọbụbụenyi nke anyị na ụwa nke a, n’ihi na nke a bụ ịkwa iko ime mmụọ! Ka anyị ghara ilefuru uche Chineke anya mgbe ọ bụla site n’ime atụmatụ inweta ihe onwunwe, ka anyị nọrọkwa na nche megide mmụọ nke enweghị ndidi na ịtamu ntamu megide ibe anyị.

Onye ọ bụla nke nọ n’ọrịa ime mmụọ kwesịrị ịchọ enyemaka nke ndị okenye ọgbakọ. (5:13-20) Ọ bụrụ na e mewo mmehie, ekpere ha na ndụmọdụ amamihe ha ga-enye aka ime ka onye mmehie nke nwere nchegharị nwetaghachi ahụ ike ime mmụọ ya. N’eziokwu, “onye meworo ka onye mmehie si ná njehie nke ụzọ ya chigharịa ga-azọpụta mkpụrụ obi [nke onye mmehie ahụ] n’ọnwụ [ime mmụọ nke na-adịru ebighị ebi].”

Igbe dị na peeji nke 23]

Ndị Na-eme Okwu ahụ: Anyị kwesịrị ịbụ ‘ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghị ndị na-anụ nanị ọnụnụ.’ (Jemes 1:22-25) Onye na-anụ nanị ọnụnụ “yiri nwoke nke na-ekiri ihu ya n’enyo, bụ́ ihu o nwere mgbe a mụpụtara ya.” Mgbe nnyocha dị mkpirikpi gasịrị, ọ na-ahapụ pụọ “ngwa ngwa o wee chezọọ aha mmadụ ọ bụ.” Ma ‘onye na-eme okwu ahụ’ na-eji nlezianya leba anya n’iwu zuru okè, nke zukwara ezu, nke Chineke, bụ́ nke na-ejikọta ihe nile a chọrọ onye Kraịst n’aka. Ọ ‘na-anọgide na ya,’ nọgide na-enyocha iwu ahụ ná nzube nke ime ndozigharị dị iche iche ka o wee kwekọọ na ya n’ụzọ chiri anya. (Abụ Ọma 119:16) Olee ụzọ “onye na-eme eme nke na-arụ ọrụ” si dị iche n’onye lebara anya n’enyo nwa oge wee chefuo ihe o gosiri? Ee, onye na-eme ya eme na-etinye okwu Jehova n’ọrụ, na-enwetakwa ihu ọma Ya!—Abụ Ọma 19:7-11.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya