Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 11/15 p. 19-24
  • Okwukwe Na-eme Ka Anyị Tachie Obi Ma Na-anọgide n’Ekpere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwukwe Na-eme Ka Anyị Tachie Obi Ma Na-anọgide n’Ekpere
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agụụ Ihe Ọjọọ Na-ebibi Ihe
  • Unu Ekpela Ibe Unu Ikpe
  • Zere Obi Ike Onwe Onye E Ji Anya Isi
  • Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Ndị Ọgaranya
  • Okwukwe Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi
  • Okwukwe na Ekpere Anyị
  • Ihe Dịịrị Anyị Nile
  • Mụta Ihe n’Aka Nwanne Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • N’agbanyeghị Ọnwụnwa, Jidesie Okwukwe Gị Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Okwukwe Na-akwali Anyị Ime Ihe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ṅomie Ndidi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 11/15 p. 19-24

Okwukwe Na-eme Ka Anyị Tachie Obi Ma Na-anọgide n’Ekpere

‘Na-atachinụ obi; meenụ ka obi unu guzosie ike, n’ihi na [ọnụnọ, NW] nke Onyenwe anyị dị nso.’—JEMES 5:8.

1. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji tụgharịa uche na Jemes 5:7, 8?

“ỌNỤNỌ” Jisọs Kraịst a nọworo na-atụ anya ya eri ogologo oge bụ eziokwu ugbu a. (Matiu 24:3-14) Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ndị nile na-ekwu na ha nwere okwukwe na Chineke na Kraịst aghaghị ịtụgharị uche n’okwu ndị a nke Jemes onye na-eso ụzọ: “Ụmụnna m, na-atachinụ ogologo ntachi obi ruo [ọnụnọ] nke Onyenwe anyị. Lee, onye ọrụ ubi na-eche mkpụrụ dị oké ọnụ ahịa nke ala, na-atachi ogologo ntachi obi n’ebe ọ dị, ruo mgbe ọ ga-anata mmiri ozuzo mbụ na mmiri ozuzo ikpeazụ. Unu onwe unu, na-atachikwanụ ogologo ntachi obi; meenụ ka obi unu guzosie ike: n’ihi na [ọnụnọ] nke Onyenwe anyị dị nso.”—Jemes 5:7, 8.

2. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime nsogbu chere ndị Jemes degaara akwụkwọ ihu?

2 Ọ dị ndị Jemes degaara akwụkwọ ozi ya sitere n’ike mmụọ nsọ mkpa inwe ogologo ntachi obi ma dozie nsogbu dị iche iche. Ọtụtụ na-eme ihe megidere ihe a tụrụ anya ya n’aka ndị na-ekwu na ha nwere okwukwe na Chineke. Dị ka ihe atụ, e nwere ihe dị mkpa ka e mee banyere agụụ ụfọdụ ndị biliteworo n’obi ụfọdụ ndị. Ọ dị mkpa ka e weghachi ịdị jụụ n’etiti ndị Kraịst oge mbụ ahụ. Ọ dịkwa mkpa ka e nye ha ndụmọdụ banyere ịtachi obi na ịnọgide n’ekpere. Ka anyị na-atụle ihe Jemes gwara ha, ka anyị hụ otú anyị pụrụ isi tinye okwu ya n’ọrụ ná ndụ anyị.

Agụụ Ihe Ọjọọ Na-ebibi Ihe

3. Gịnị bụgasị ihe kpatara esemokwu dị n’ọgbakọ, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta na nke a?

3 Udo adịghị n’etiti ụfọdụ ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst, agụụ ihe ọjọọ bụkwa isi ihe kpatara ọnọdụ a. (Jemes 4:1-3) Esemokwu nọ na-akpata nkewa, ụfọdụ na-ekpekwa ụmụnna ha ikpe n’ụzọ ịhụnanya na-adịghị na ya. Nke a na-eme n’ihi na oké ọchịchọ maka ihe ụtọ nọ na-ebuso ihe ndị dị ha n’ahụ agha. Ọ pụkwara ịdị anyị mkpa ikpe ekpere maka enyemaka iji jụ oké ọchịchọ anụ ahụ anyị na-achọ nkwanye ùgwù, ike, na ihe onwunwe ka anyị wee ghara ime ihe ọ bụla iji kpaghasịa udo nke ọgbakọ. (Ndị Rom 7:21-25; 1 Pita 2:11) N’etiti ụfọdụ ndị Kraịst narị afọ mbụ, anyaukwu ebilitewo ruo n’ókè nke mmụọ ịkpọasị, nke igbu ọchụ. Ebe ọ bụ na Chineke agaghị emejụ agụụ ihe ọjọọ ha, ha nọgidere na-alụ ọgụ ná mgbalị iru ihe mgbaru ọsọ ha. Ọ bụrụ na anyị nwere agụụ ihe ọjọọ yiri nke ahụ, anyị nwere ike ịrịọ ma ghara ịnata, ebe ọ bụ na Chineke anyị dị nsọ adịghị aza ụdị ekpere ahụ.—Abụ Ákwá 3:44; 3 Jọn 9, 10.

4. N’ihi gịnị ka Jemes ji akpọ ụfọdụ “ndị na-akwa iko,” oleekwa otú okwu a kwesịrị isi metụta anyị?

4 Omume ụwa, anyaụfụ, na nganga dịrị n’etiti ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ. (Jemes 4:4-6) Jemes na-akpọ ụfọdụ “ndị na-akwa iko” n’ihi na ha bụ enyi nke ụwa wee si otú ahụ bụrụ ndị ikpe ịkwa iko ime mmụọ mara. (Ezikiel 16:15-19, 25-45) N’ezie, anyị achọghị iyi ndị ụwa n’àgwà, okwu, na omume, n’ihi na nke ahụ ga-eme anyị ndị iro Chineke. Okwu ya na-egosi anyị na ‘ụzọ ekworo’ bụ otu akụkụ nke ajọ echiche, ma ọ bụ “mmụọ,” dị n’ime ụmụ mmadụ na-eme mmehie. (Jenesis 8:21; Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3; Abụ Ọma 106:16, 17; Eklisiastis 4:4) Ya mere ọ bụrụ na anyị achọpụta na ọ dị anyị mkpa ịlụso ekworo, nganga, ma ọ bụ ọchịchọ ọjọọ ndị ọzọ ọgụ, ka anyị chọọ enyemaka Chineke site na mmụọ nsọ. Ike ahụ, nke ebere Chineke n’erughịrị mmadụ na-enye karịrị ‘ụzọ ekworo.’ Ebe ọ bụkwa na Jehova na-emegide ndị nganga, ọ ga-enye anyị amara ma ọ bụrụ na anyị alụsoo ọchịchọ ime mmehie ọgụ.

5. Iji nweta amara Chineke, iru eru ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị inwe?

5 Olee otú anyị pụrụ isi nata amara Chineke? (Jemes 4:7-10) Iji nweta amara sitere n’aka Jehova, anyị aghaghị irubere ya isi, nakwere ndokwa ya, ma kwenye n’ihe ọ bụla bụ uche ya. (Ndị Rom 8:28) Anyị aghaghịkwa ‘iguzogide’ Ekwensu. Ọ ‘ga-agbapụkwa n’ebe anyị nọ’ ma ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike dị ka ndị nkwado nke ọbụbụeze eluigwe na ala Jehova. Anyị nwere enyemaka nke Jisọs, bụ́ onye na-egbochi ngwá ọrụ ọjọọ nke ụwa ka ihe ọ bụla ghara inwe ike imerụ anyị ahụ n’ụzọ na-adịgide adịgide. Echefukwala nke a mgbe ọ bụla: Site n’ekpere, nrubeisi, na okwukwe, anyị na-abịaru Chineke nso, ọ na-anọkwa anyị nso.—2 Ihe Emere 15:2.

6. Gịnị mere Jemes ji akpọ ụfọdụ ndị Kraịst “ndị mmehie”?

6 N’ihi gịnị ka Jemes ji jiri okwu bụ “ndị mmehie” mee ihe maka ụfọdụ ndị na-ekwu na ha nwere okwukwe na Chineke? N’ihi na ikpe “agha” na ịkpọasị nke na-akpata igbu ọchụ—àgwà ndị Kraịst na-adịghị anakwere, mara ha. (Taịtọs 3:3) “Aka” ha, jupụtara n’ime ihe ọjọọ, chọrọ ka e mee ka ha dị ọcha. Ọ dịkwa ha mkpa ime ka “obi” ha, bụ́ isi iyi nke mkpali, dị ọcha. (Matiu 15:18, 19) Ndị ahụ “nwere uche abụọ” na-awagharị n’agbata ịbụ enyi Chineke na ịbụ enyi nke ụwa. N’ịbụ ndị e ji ihe atụ ọjọọ ha dọọ aka ná ntị, ka anyị mụrụ anya mgbe nile ka ihe ndị dị otú ahụ ghara ibibi okwukwe anyị.—Ndị Rom 7:18-20.

7. N’ihi gịnị ka Jemes ji agwa ụfọdụ ndị ka ha ‘ruo újú, kwaakwa ákwá’?

7 Jemes na-agwa ndị na-agụ akwụkwọ ya ka ha ‘hụjuo anya, ruokwa újú, kwaakwa ákwá.’ Ọ bụrụ na ha gosipụtara mwute dị ka Chineke si chọọ, ọ ga-abụ ihe àmà nke nchegharị. (2 Ndị Kọrint 7:10, 11) Taa, ụfọdụ ndị na-ekwu na ha nwere okwukwe na-achọ ịbụ enyi nke ụwa. Ọ bụrụ na ndị ọ bụla n’ime anyị na-agbaso ụzọ dị otú ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iru újú n’ihi ọnọdụ adịghị ike ime mmụọ anyị ma mee ihe ozugbo iji dozie ihe? Ime mgbanwe ndị dị mkpa na ịnata mgbaghara Chineke ga-arụpụta ịṅụrị ọṅụ n’ihi akọ na uche dị ọcha na atụmanya na-enye ọṅụ nke ndụ ebighị ebi.—Abụ Ọma 51:10-17; 1 Jọn 2:15-17.

Unu Ekpela Ibe Unu Ikpe

8, 9. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ikwutọ ma ọ bụ ikpe ibe anyị ikpe?

8 Ọ bụ mmehie ikwutọ onye kwere ekwe ibe anyị. (Jemes 4:11, 12) Ma ụfọdụ na-akatọ ndị Kraịst ibe ha, ikekwe n’ihi àgwà ezi omume onwe onye ha ma ọ bụ n’ihi na ha chọrọ ibuli onwe ha elu site n’iweda ndị ọzọ ala. (Abụ Ọma 50:20; Ilu 3:29) Okwu Grik a sụgharịrị ‘ikwutọ’ na-egosi ibu iro, na-apụtakwa ibo ebubo gabigara ókè ma ọ bụ nke ụgha. Nke a pụtara ịma nwanna ikpe. Olee otú nke a si bụrụ ‘ikwutọ na ikpe iwu Chineke ikpe’? Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ‘jụrụ ihe Chineke nyere n’iwu nke ọma,’ jirikwa ụkpụrụ nke ha kpee ikpe. (Mak 7:1-13) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na anyị amaa nwanna ikpe bụ́ onye Jehova na-agaghị ama ikpe, ọ̀ bụ na anyị agaghị ‘na-ekpe iwu Chineke ikpe’ ma na-egosi n’ụzọ mmehie na o zughị ezu? Sitekwa n’ịkatọ nwanna anyị n’ụzọ na-ezighị ezi, anyị agaghị na-edebezu iwu nke ịhụnanya.—Ndị Rom 13:8-10.

9 Ka anyị na-echeta nke a: “Nanị otu Onye bụ onye na-enye iwu, bụrụkwa onyeikpe”—Jehova. ‘Iwu ya zuru oke,’ ọ dịghị ihe kọrọ ya. (Abụ Ọma 19:7; Aịsaịa 33:22) Nanị Chineke nwere ikike isetịpụ ụkpụrụ na ụkpụrụ nduzi maka nzọpụta. (Luk 12:5) Ya mere Jemes na-ajụ, sị: “Gị onwe gị bụ ònye, gị onye na-ekpe onye agbata obi gị ikpe?” Ọ dịghị n’aka anyị ikpe ndị ọzọ ikpe na ịma ha ikpe. (Matiu 7:1-5; Ndị Rom 14:4, 10) Ịtụgharị uche n’ọbụbụeze na eleghị mmadụ anya n’ihu nke Chineke na ọnọdụ ime mmehie nke anyị kwesịrị inyere anyị aka ịghara ikpe ndị ọzọ ikpe n’ụzọ ezi omume onwe onye.

Zere Obi Ike Onwe Onye E Ji Anya Isi

10. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji buru Jehova n’uche ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị?

10 Anyị kwesịrị iburu Jehova na iwu ya n’uche mgbe nile. (Jemes 4:13-17) N’ileghara Chineke anya, onye nwere obi ike onwe onye na-asị: ‘Taa ma ọ bụ echi ka anyị ga-aga otu obodo, nọọkwa n’ebe ahụ otu afọ, zụọkwa ahịa, ritekwa uru.’ Ọ bụrụ na anyị ‘akpakọbara onwe anyị akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ,’ ndụ anyị pụrụ ịbịa ná njedebe echi, anyị nwekwara ike ghara inwe ohere ijere Jehova ozi. (Luk 12:16-21) Dị ka Jemes na-ekwu, anyị yiri alụlụ ụtụtụ “nke na-apụta ìhè nwa oge, e mesịa o wee pụọ n’anya.” (1 Ihe Emere 29:15) Nanị site n’igosipụta okwukwe na Jehova ka anyị pụrụ inwe olileanya maka ọṅụ na-adịgide adịgide na ndụ ebighị ebi.

11. Gịnị ka ọ pụtara ikwu, sị, “A sị na Onyenwe anyị chọrọ”?

11 Kama iji mpako na-elefuru Chineke anya, anyị kwesịrị ịnakwere echiche a: “A sị na Onyenwe anyị chọrọ, anyị ga-adị ndụ, meekwa ihe a ma ọ bụ ihe ahụ.” Ịsị, “A sị na Onyenwe anyị chọrọ” na-egosi na anyị na-agbalị ime ihe kwekọrọ n’uche ya. Ọ pụrụ ịdị mkpa ịzụ ahịa iji kwadoo ezinụlọ anyị, ime njem n’ọrụ Alaeze, na ihe ndị ọzọ. Ma ka anyị ghara ịnya isi. “Ịnya isi nile dị otú a bụ ajọ ihe” n’ihi na ọ na-elefuru ịdabere na Chineke anya.—Abụ Ọma 37:5; Ilu 21:4; Jeremaịa 9:23, 24.

12. Gịnị ka e bu n’obi n’okwu Jemes 4:17?

12 Eleghị anya iji mechie okwu ya banyere obi ike onwe onye na ịnya isi, Jemes na-asị: “Onye matara ime ihe ọma, ma o meghị ya, ọ bụụrụ onye ahụ mmehie.” Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị iji obi umeala nakwere ndabere ya n’ebe Chineke nọ. Ọ bụrụ na o meghị otú ahụ, “ọ bụụrụ onye ahụ mmehie.” N’ezie, otu ụkpụrụ ahụ dịkwa maka ihe ọ bụla a na-emeghị bụ nke okwukwe n’ebe Chineke nọ na-achọ n’aka anyị.—Luk 12:47, 48.

Ịdọ Aka ná Ntị Banyere Ndị Ọgaranya

13. Gịnị ka Jemes na-ekwu banyere ndị ji akụ̀ ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?

13 N’ihi na ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ aghọwo ndị hụrụ ihe onwunwe n’anya ma ọ bụ na-egosi oké mmasị n’ebe ndị nwere akụ̀ na ụba nọ, Jemes na-ekwu okwu dị ike banyere ụfọdụ ndị ọgaranya. (Jemes 5:1-6) Ndị ikom bụ́ ndị ụwa ji akụ̀ ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ‘ga-akwa ákwá, tiekwa mkpu n’ihi nhụjuanya nile ga-abịakwasị ha’ mgbe Chineke kwụghachiri ha dị ka ọrụ ha nile si dị. N’oge ahụ, ihe kasị mejupụta akụ̀ na ụba ọtụtụ ndị bụ ihe ndị dị ka uwe, ọka, na mmanya. (Joel 2:19; Matiu 11:8) Ụfọdụ n’ime ndị a pụrụ ire ure ma ọ bụ ‘ghọọ ihe nla ripịara,’ ma Jemes na-emesi ike abaghị uru nke akụ̀ na ụba, ọ bụghị ikwe omume nke ịla n’iyi ya. Ọ bụ ezie na ọlaedo na ọlaọcha adịghị agba nchara, ọ bụrụ na anyị ejichie ha, ha ga-abụ ihe na-abaghị uru dị ka ihe gbaworo nchara. “Nchara” na-egosi na e jighị ụba ihe onwunwe mee ihe bara uru. Ya mere, anyị nile kwesịrị icheta na ‘ihe dị ka ọkụ’ bụ ihe ndị na-atụkwasị obi n’ihe onwunwe ha ‘kpadoworo na mgbe ikpeazụ’ mgbe iwe Chineke ga-abịakwasị ha. Ebe ọ bụ na anyị na-ebi na “mgbe ọgwụgwụ,” okwu ndị dị otú ahụ nwere ihe pụrụ iche ha pụtara nye anyị.—Daniel 12:4; Ndị Rom 2:5.

14. Olee otú ndị ọgaranya si emekarị ihe, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ime banyere nke ahụ?

14 Ndị nwere akụ̀ na ụba na-aghọgbukarị ndị na-ewere ha ihe ubi, ndị ụgwọ ọrụ ha e jichiri ejichi “na-eti mkpu” maka nkwụghachi. (Tụlee Jenesis 4:9, 10.) Ndị ikom ụwa bara ọgaranya “biri n’oké oriri na ọṅụṅụ.” N’imebiga ihe ókè ná ndụ ihe ụtọ, ha na-azụlite obi mara abụba, nke na-enweghị mmetụta, ha ka ga-anọkwa na-eme nke a “n’ụbọchị” e setịpụrụ maka ogbugbu ha. Ha ‘na-ama onye ezi omume ikpe, na-egbukwa ya.’ Jemes na-ajụ, sị: “Ọ́ dịghị emegide unu?” (NW) Ma nsụgharị ọzọ bụ, “onye ezi omume ahụ; ọ dịghị edo onwe ya imegide unu.” Otú o sina dị, anyị ekwesịghị ịdị na-ele ndị ọgaranya anya n’ihu. Anyị aghaghị ibute ọdịmma ime mmụọ ụzọ ná ndụ.—Matiu 6:25-33.

Okwukwe Na-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi

15, 16. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa inwe ntachi obi?

15 N’ịbụ onye kwuworo okwu banyere ndị ọgaranya nke ụwa na-emegbu emegbu, Jemes na-agbazi ndị Kraịst a na-emegbu emegbu ume ịtachi obi. (Jemes 5:7, 8) Ọ bụrụ na ndị kwere ekwe ji ntachi obi nagide ihe isi ike ha, a ga-akwụ ha ụgwọ ọrụ maka ikwesị ntụkwasị obi n’oge ọnụnọ Kraịst, mgbe a ga-ama ndị na-akpagbu ha ikpe. (Matiu 24:37-41) Ọ dị ndị Kraịst oge mbụ ahụ mkpa ịdị ka onye ọrụ ubi nke ji ntachi obi na-echere mmiri ozuzo mbụ nke oge mgbụsị akwụkwọ, bụ́ mgbe ọ pụrụ ịkụ ihe ọkụkụ, na mmiri ozuzo ikpeazụ nke oge opupu ihe ubi nke na-eme ka mkpụrụ dị. (Joel 2:23) Ọ dịkwa anyị mkpa ịtachi obi na ime ka obi anyị guzosie ike, karịsịa ebe ọ bụ na “ọnụnọ nke Onyenwe anyị” Jisọs Kraịst abịawo!

16 N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịtachi obi? (Jemes 5:9-12) Ntachi obi na-enyere anyị aka ịghara ịsụ ude ma ọ bụ ịtamu ntamu mgbe ndị kwere ekwe ibe anyị kpasuru anyị iwe. Ọ bụrụ na anyị ejiri iwe ‘tamuo ntamu megide ibe anyị,’ a ga-ama anyị ikpe site n’aka Onyeikpe bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 5:22) Ugbu a “ọnụnọ” ya maliteworo, o wee “na-eguzo n’ihu ọnụ ụzọ,” ka anyị kwalite udo site n’ịtachiri ụmụnna anyị obi, bụ́ ndị na-eche ọtụtụ ule nke okwukwe ihu. A na-ewusi okwukwe anyị ike mgbe anyị chetara na Chineke kwụghachiri Job ụgwọ n’ihi na o ji ndidi tachie obi n’ọnwụnwa ya nile. (Job 42:10-17) Ọ bụrụ na anyị egosi okwukwe na ntachi obi, anyị ga-ahụ na “Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.”—Maịka 7:18, 19.

17. N’ihi gịnị ka Jemes ji asị, “Unu aṅụla iyi”?

17 Ọ bụrụ na anyị atachighị obi, anyị pụrụ iji ire mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi mgbe anyị nọ ná nrụgide. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịṅụ iyi n’ọkụ ọkụ. “Unu aṅụla iyi,” ka Jemes na-ekwu, na-adọ aka ná ntị megide ịṅụ iyi n’echeghị echiche. Iji ịṅụ iyi na-agba akaebe ihe e kwuru mgbe nile yikwara omume ihu abụọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị nnọọ ikwu eziokwu, na-ekwe ka ee anyị bụrụ ee, ee e anyị abụrụkwa ee e. (Matiu 5:33-37) Otú ọ dị, Jemes adịghị ekwu na ịṅụ iyi ikwu eziokwu n’ụlọikpe dị njọ.

Okwukwe na Ekpere Anyị

18. N’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị ‘ikpe ekpere’ na ‘ịbụ abụ ọma’?

18 Ekpere aghaghị ikere òkè gbara ọkpụrụkpụ ná ndụ anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-achịkwa okwu anyị, nwee ntachi obi, ma nọgide na-enwe ezi okwukwe na Chineke. (Jemes 5:13-20) Karịsịa mgbe anyị nọ n’okpuru ọnwụnwa ma ọ bụrụ na anyị ‘na-ekpe ekpere.’ Ọ bụrụ na anyị nwere obi ụtọ, ka anyị “bụọ abụ ọma,” dị ka Jisọs na ndị ozi ya mere mgbe o guzobere Ememe Ncheta nke ọnwụ ya. (Mak 14:26, nkọwa ala ala peji nke NW) Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ijupụta n’ekele dị otú ahụ nye Chineke nke na anyị na-abụ abụ ọma ọbụna n’ime obi. (1 Ndị Kọrint 14:15; Ndị Efesọs 5:19) Leekwa ọṅụ ọ bụ ito Jehova n’abụ ná nzukọ ndị Kraịst!

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị daa ọrịa ime mmụọ, n’ihi gịnịkwa ka a ga-eji were nzọụkwụ dị otú ahụ?

19 Anyị nwere ike ghara ịchọ ịbụ abụ ma ọ bụrụ na anyị na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ, ikekwe n’ihi omume ọjọọ ma ọ bụ erighị ihe mgbe nile na table Jehova. Ọ bụrụ na anyị nọ n’ọnọdụ ahụ, ka anyị jiri obi umeala kpọọ ndị okenye ka ha nwee ike ‘ikpe ekpere n’isi anyị.’ (Ilu 15:29) Ha ‘ga-etekwa anyị mmanụ n’aha Onyenwe anyị.’ Dị ka mmanụ na-akụjụ ahụ e tere n’ọnyá, okwu nkasi obi na ndụmọdụ ha sitere n’Akwụkwọ Nsọ ga-enyere anyị aka ibelata ịda mbà n’obi, obi abụọ, na egwu. ‘Ekpere nke okwukwe ga-eme ka ahụ dị anyị ike’ ma ọ bụrụ na e ji okwukwe anyị kwadoo ya. Ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta na ọ bụ mmehie dị oké njọ kpatara ọrịa ime mmụọ anyị, ha ga-eji obiọma mee ka mmehie anyị doo anya ma gbalịa inyere anyị aka. (Abụ Ọma 141:5) Ọ bụrụkwa na anyị nwere nchegharị, anyị pụrụ inwe okwukwe na Chineke ga-anụ ekpere ha ma gbaghara anyị.

20. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji ekwupụta mmehie anyị ma na-ekpere ibe anyị ekpere?

20 ‘Ikwupụta mmehie anyị gwa ibe anyị’ kwesịrị ije ozi dị ka ihe mgbochi megide imekwu mmehie. O kwesịrị ịkwalite ọmịiko mmadụ na ibe ya, bụ́ àgwà ga-akwali anyị ‘ikpe ekpere n’ihi ibe anyị.’ Anyị pụrụ inwe okwukwe na nke a ga-aba uru n’ihi na ekpere “onye ezi omume”—onye na-egosipụta okwukwe, nke Chineke na-ewerekwa dị ka onye ziri ezi—na-arụzu ihe dị ukwuu n’ebe Jehova nọ. (1 Pita 3:12) Elaịja onye amụma nwere adịghị ike ndị yiri nke anyị, ma ekpere ya dị irè. O kpere ekpere, mmiri ezoghịkwa ruo afọ atọ na ọkara. Mgbe o kpere ekpere ọzọ, mmiri zoro.—1 Ndị Eze 17:1; 18:1, 42-45; Luk 4:25.

21. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na onye Kraịst ibe anyị “si n’eziokwu jehie”?

21 Gịnị ma ọ bụrụ na onye òtù ọgbakọ “si n’eziokwu jehie,” na-akpafu site n’ezi ozizi na àgwà? Anyị nwere ike isite na ndụmọdụ Bible, ekpere, na enyemaka ndị ọzọ mee ka o si ná mmehie ya chigharịa. Ọ bụrụ na anyị enwee ihe ịga nke ọma, nke a na-eme ka ọ nọrọ n’okpuru ihe mgbapụta Kraịst ma na-azọpụta ya n’ọnwụ ime mmụọ na amamikpe mbibi. Site n’inyere onye mmehie ahụ aka, anyị na-ekpuchi ọtụtụ n’ime mmehie ya. Mgbe onye mmehie ahụ a baara mba si n’ụzọ ọjọọ ya chigharịa, chegharịa, ma chọọ mgbaghara, anyị ga-aṅụrị ọṅụ na anyị rụrụ ọrụ dugara n’ikpuchi mmehie ya.—Abụ Ọma 32:1, 2; Jud 22, 23.

Ihe Dịịrị Anyị Nile

22, 23. Olee otú okwu Jemes kwesịrị isi metụta anyị?

22 O doro anya na akwụkwọ ozi Jemes nwere ihe baara anyị nile uru. Ọ na-egosi anyị ụzọ isi merie ọnwụnwa dị iche iche, na-enye anyị ndụmọdụ megide ile mmadụ anya n’ihu, ma na-agba anyị ume ịrụ ezi ọrụ. Jemes na-agba anyị ume ịchịkwa ire, ịjụ mmetụta nke ụwa, na ịkwalite udo. Okwu ya kwesịkwara ime ka anyị nwee ntachi obi, na-ekpekwa ekpere.

23 N’ezie, ọ bụ ndị Kraịst oge mbụ e tere mmanụ ka e zigaara akwụkwọ ozi Jemes na mbụ. Ma, anyị nile kwesịrị ikwe ka ndụmọdụ ya nyere anyị aka ịrapara n’okwukwe anyị. Okwu Jemes pụrụ ịtụkwasị ihe n’okwukwe nke na-akwali anyị ime ihe pụtara ìhè n’ozi Chineke. Akwụkwọ ozi a sitere n’ike mmụọ nsọ na-ewulitekwa okwukwe na-adịgide adịgide nke na-eme ka anyị bụrụ Ndịàmà Jehova nwere ntachi obi, ndị na-ekpe ekpere taa, n’oge “ọnụnọ nke Onyenwe anyị” Jisọs Kraịst.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ mkpa ịgbanwe àgwà na omume ha?

◻ Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jemes na-enye ndị ọgaranya?

◻ N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịtachi obi?

◻ N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ikpechi ekpere anya?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ dị ụfọdụ ndị Kraịst oge mbụ mkpa inwekwu ntachi obi n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha nọ

[Foto dị na peeji nke 24]

Ọ dị ndị Kraịst mkpa ịtachi obi, igosi ịhụnanya, ịdị na-ekpe ekpere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya