Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 3/15 p. 30
  • Nọgidesie Ike n’Okwukwe!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgidesie Ike n’Okwukwe!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Àgwà nke Dabeere n’Ụkpụrụ Nile nke Chineke
  • Ntachi Obi Na-eweta Ngọzi
  • Ò Kwesịrị Ka Ụmụ Nwanyị Na-ezo Mma ha?
    Teta!—2005
  • Ka Anyị Jisie Okwukwe Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Nduzi Amamihe Dị Na Ya Maka Ndị Di Na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • “Chebaranụ Ụdị Mmadụ Unu Kwesịrị Ịbụ Echiche”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 3/15 p. 30

Nọgidesie Ike n’Okwukwe!

Isi Ihe Ndị Sitere na Pita nke Mbụ

NDỊÀMÀ JEHOVA na-eche ọnwụnwa, ma ọ bụ ule dị iche iche nke okwukwe ha ihu. N’ala ụfọdụ, a na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ha n’okpuru mkpagbu dị ukwuu. Ọ bụ Setan bụ Ekwensu na-akpali mgbalị ndị a na ndị ọzọ a na-eme ibibi mmekọrịta ha na Chineke nwere. Ma ọ gaghị enwe ihe ịga nke ọma, n’ihi na Jehova na-ewusi ndị ohu ya ike—ee, mee ka ha guzosie ike n’okwukwe.

Pita nwere ihe ùgwù nke ‘ime ka ụmụnna ya guzosie ike,’ bụ́ ndị ‘nọ ná mwute n’ọnwụnwa dị iche iche.’ (Luk 22:32; 1 Pita 1:6, 7) O mere otú ahụ n’akwụkwọ ozi ya nke mbụ, bụ́ nke e dere n’ihe dị ka afọ 62-64 O.A. site na Babilọn. N’ime ya, Pita nyere ndụmọdụ, nye nkasi obi, gbaakwa ndị Kraịst, bụ́ ndị Juu na ndị Jentaịl ume, na-enyere ha aka iguzogide mbuso agha nile nke Setan, ‘nọgidekwa na-adị ike n’okwukwe.’ (1 Pita 1:1, 2; 5:8, 9) Ugbu a, mgbe oge fọdụụrụ Ekwensu dị mkpirikpi, mgbe mbuso agha ya na-adịkwa njọ nke ukwuu, o doro anya na ndị Jehova pụrụ irite uru site n’okwu Pita ndị sitere n’ike mmụọ nsọ.

Àgwà nke Dabeere n’Ụkpụrụ Nile nke Chineke

Ma olileanya anyị ọ̀ bụ ije eluigwe ma ọ bụ ịnọ n’elu ala, o kwesịrị inyere anyị aka ịtachi obi n’ọnwụnwa dị iche iche, na-emekwa omume n’ụzọ nke Chineke. (1:1–2:12) Olileanya nke ihe nketa eluigwe na-eme ka ndị e tere mmanụ ṅụrịa ọṅụ n’agbanyeghị ọnwụnwa dị iche iche, bụ́ nke na-eme ka okwukwe ha dịwanye mma n’ezie. Dị ka ụlọ ime mmụọ nke e wukwasịrị n’elu ntọala nke bụ Kraịst, ha na-achụ àjà ime mmụọ ndị Chineke na-anara nke ọma, na-eduzikwa onwe ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị, bụ́ ndị na-ewetara Ya otuto.

Ụkpụrụ Chineke kwesịrị iduzi mmeso nile anyị na-emeso mmadụ ibe anyị. (2:13–3:12) Pita gosiri na anyị kwesịrị ido onwe anyị n’okpuru ndị ọchịchị bụ mmadụ. Ndị ohu nọ n’ụlọ ga-edo onwe ha n’okpuru ndị nwe ha, ndị bụ nwunye ga-edokwa onwe ha n’okpuru di ha. Àgwà nsọpụrụ Chineke nke onye Kraịst bụ nwunye pụrụ ime ka di ya nke bụ onye na-ekweghị ekwe gbanwee wee kwenye n’ezi okwukwe ahụ. Onye bụ di nke kwere ekwe kwesịkwara ‘ikenye nwunye ya nsọpụrụ dị ka onye na-adịghị ike karị.’ Ndị Kraịst nile kwesịrị igosipụta mmetụta n’ebe mmadụ ibe ha nọ, na-enwe ịhụnanya ụmụnna, na-eme ezi ihe, na-agbasokwa udo.

Ntachi Obi Na-eweta Ngọzi

Ezi ndị Kraịst iji ikwesị ntụkwasị obi na-atachi obi n’ahụhụ ga-arụpụta ngọzi. (3:13–4:19) Ọ bụrụ na anyị ataa ahụhụ n’ihi ezi omume, anyị kwesịrị inwe obi ụtọ. Karịsịa, ebe ọ bụ na Kraịst tara ahụhụ n’anụ ahụ iji wee duje anyị n’ebe Chineke nọ, anyị ekwesịghị ịnọgide na-adị ndụ dị ka ọchịchọ nile nke anụ ahụ si dị. Ọ bụrụ na anyị anagide ọnwụnwa dị iche iche n’ikwesị ntụkwasị obi, anyị ga-ekere òkè n’ọṅụ dị ukwuu ná mkpughe nke Jisọs. Ịnagide nkọcha n’ihi aha Kraịst, ma ọ bụ dị ka ndị na-eso ụzọ ya, kwesịrị ime ka anyị nwee obi ụtọ n’ihi na ọ na-anwapụta na anyị nwere mmụọ Jehova. Ya mere, ka anyị nọ na-ata ahụhụ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke, ka anyị rara onwe anyị nye n’aka ya, nọgidekwa na-eme ezi ihe.

Dị ka ndị Kraịst, ọ dị mkpa ka anyị rụzuo ọrụ anyị nile n’ikwesị ntụkwasị obi, jiri obi umeala doo onwe anyị n’okpuru aka dị ike nke Chineke. (5:1-14) Ndị okenye aghaghị iji afọ ofufo zụọ ìgwè atụrụ Chineke, anyị nile kwesịkwara ịtụkwasị Jehova nchekasị anyị nile, na-aghọta na ọ na-echegbu onwe ya n’ezie banyere anyị. Ọ dịkwa mkpa ka anyị guzosie ike imegide Ekwensu, gharakwa ikwe ka anyị nwee nkụda obi, n’ihi na ụmụnna anyị na-enwetakwa otu ụdị ịta ahụhụ ahụ anyị na-enweta. Na-echeta mgbe nile na Jehova Chineke ga-ewusi anyị ike, na ọ ga-emekwa ka anyị nwee ike iguzosi ike n’okwukwe.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 30]

Ịchọ Mma Ndị Inyom: N’okwu ndụmọdụ ọ gwara ndị Kraịst bụ ndị inyom, Pita sịrị: “Ka [ịchọ mma unu] ghara ịbụ mma ahụ nke ahụ nke bụ ịkpa isi, na iyikwasị ihe ọlaedo, ma ọ bụ iyikwasị ọtụtụ uwe; kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi, n’uwe a na-apụghị imebi nke bụ mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo, nke dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.” (1 Pita 3:3, 4) N’ime narị afọ mbụ O.A., ndị inyom na-ekpere arụsị na-edozi isi ha n’ụzọ dị iche iche, na-akpa ogologo agịrị isi ha gaa n’ụzọ dị iche iche a chọrọ mma, na-ekenyekwa ihe ịchọ mma ọlaedo n’isi ahụ a kpara akpa. O yiri ka ọtụtụ n’ime ha mere otú ahụ iji mee oké ngosi nke ihe onwunwe—bụ́ ihe na-ekwesịghịrị ndị Kraịst. (1 Timoti 2:9, 10) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụghị ịchọ mma nile dị njọ, n’ihi na Pita gụnyere ‘iyikwasị uwe’—nke doro anya na ọ bụ ihe dị mkpa. Ndị ohu Chineke nke oge ochie jikwara ọla dị iche iche e ji achọ mma mee ihe. (Jenesis 24:53; Ọpụpụ 3:22; 2 Samuel 1:24; Jeremaịa 2:32; Luk 15:22) Otú ọ dị, nwanyị onye Kraịst na-eji amamihe zere ihe ịchọ mma ndị e ji eme oké ngosi na ejiji ndị na-enye mkpali na-ezighị ezi, o kwesịkwara ilezi anya na ojiji ọ bụla o ji ihe ntecha na-eme ihe bụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Isi ihe dị n’okwu ndụmọdụ onyeozi ahụ bụ na o kwesịrị ilekwasịkarị anya ọ bụghị n’ịchọ mma nke elu ahụ, kama na nke ime obi. Iji bụrụ onye mara mma n’ezie, ọ ghaghị iji ejiji dị mma n’anya, na-akpakwa àgwà onye na-atụ egwu Chineke.—Ilu 31:30; Maịka 6:8.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]

Israel Department of Antiquities and Museums; Israel Museum/David Harris

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya