Nọgidenụ Na-ejegharị n’Ìhè na Ịhụnanya
Isi Ihe Ndị Sitere na Jọn nke Mbụ
JEHOVA bụ Isi Iyi nke ìhè na ịhụnanya. Anyị aghaghị ilegara Chineke anya maka ìhè ime mmụọ. (Abụ Ọma 43:3) Ịhụnanya sokwa ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ya.—Ndị Galetia 5:22, 23.
A kọrọ banyere ìhè, ịhụnanya, na ihe ndị ọzọ n’akwụkwọ ozi mbụ nke Jọn ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ nke o yikarịrị ka e deturu ya n’Efesọs ma ọ bụ na nso ebe ahụ n’ihe dị ka 98 O.A. Ihe bụ isi e ji dee ya bụ ichebe ndị Kraịst pụọ n’ịdapụ n’ezi ofufe na inyere ha aka ịnọgide na-ejegharị n’ìhè. Ebe anyị na-eche ihe ịma aka dị iche iche ihu banyere ịhụnanya, okwukwe, na iguzosi ike n’eziokwu anyị, ịtụle akwụkwọ ozi nke a aghaghị ịbara anyị uru.
‘Na-ejegharịnụ n’Ìhè’
Jọn mere ka o doo anya na ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi aghaghị ịdị na-ejegharị n’ihe ime mmụọ. (1:1–2:29) O kwuru, sị: “Chineke bụ ìhè, ọ dịghịkwa ọchịchịrị ọ bụla (ọ dịghị ihe ọjọọ, omume rụrụ arụ, ma ọ bụ ụgha, ma ọ bụ ihe na-adịghị nsọ) dị n’ime ya.” N’ihi na ndị Kraịst e ji mmụọ tee mmanụ ‘na-ejegharị n’ìhè,’ ha na Chineke, Kraịst na ibe ha ‘na-enwekọ ihe.’ E jiriwokwa ọbara Jisọs mee ka ha dị ọcha pụọ ná mmehie.
Ma ànyị bụ ndị Kraịst e tere mmanụ ndị nwere olileanya eluigwe ma ọ bụ na anyị na-ele anya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa, anyị ga-anọgide na-erite uru site n’àjà Jisọs Kraịst nanị ma ọ bụrụ na anyị hụ ụmụnna anyị n’anya kama ịhụ ụwa n’anya. Anyị aghaghịkwa izere mmetụta nke ndị si n’ezi ofufe dapụ, dị ka “onye nke na-emegide Kraịst,” bụ́ onye na-agọnarị ma Nna ahụ ma Ọkpara ahụ. Ka anyị gharakwa ichefu na ọ bụ nanị ndị na-arapagidesi ike n’eziokwu ma na-eme ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi.
Ụmụ Chineke Na-egosipụta Ịhụnanya
Jọn gara n’ihu igosipụta ndị bụ ụmụ Chineke. (3:1–4:21) Otu ihe bụ na ha na-eme ezi omume. Ha na-erubekwa isi n’iwu Jehova Chineke nke bụ ‘ka ha kwere n’aha nke Ọkpara ya Jisọs Kraịst, hụrịtakwa onwe ha n’anya.’
Onye ọ bụla nke nwere ‘ihe ọmụma nke Chineke’ maara banyere nzube nile nke Jehova na otú e si gosipụta ịhụnanya Ya. Nke a kwesịrị inyere onye ahụ aka igosipụta ịhụnanya. N’ezie, “onye na-adịghị ahụ n’anya amaghị Chineke n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.” E gosipụtara ịhụnanya Chineke mgbe Chineke ‘zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie anyị.’ Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otú a, anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya. Ee, onye ọ bụla nke na-asị na ya hụrụ Chineke n’anya aghaghịkwa ịhụ nwanna ime mmụọ ya n’anya.
Okwukwe “Na-emeri Ụwa”
Ịhụnanya na-akpali ụmụ Chineke idebe ihe ndị o nyere n’iwu, ma ọ bụ site n’okwukwe ka ha “na-emeri ụwa.” (5:1-21) Okwukwe anyị n’ebe Chineke, Okwu ya, na Ọkpara ya nọ na-enyere anyị aka ‘imeri ụwa’ site n’ịjụ echiche na ụzọ ya nile ndị na-ezighị ezi na site n’idebe iwu nile nke Jehova. Chineke enyewo ‘ndị ahụ na-emeri ụwa’ olileanya nke ndụ ebighị ebi, ọ na-anụkwa ekpere ha ndị kwekọrọ ná nzube ya. N’ihi na onye ọ bụla “nke a mụworo site na Chineke” adịghị eme mmehie, Setan adịghị ejigidesi onye dị otú a ike. Ma ndị e tere mmanụ ma ndị ohu Jehova nwere olileanya elu ala kwesịrị icheta na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.”
Igbe/Foto dị na peeji nke 29]
Ihe Ịjụrụ Obi: Jisọs “bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị [bụ́ nke ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ]; ma ọ bụghị ihe ịjụrụ ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama ọ bụkwa ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie nke ụwa dum,” bụ́ ihe fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ. (1 Jọn 2:2) Ọnwụ ya bụ “ihe ịjụrụ obi” (Grik, hi·la·smosʹ, nke na-egosi “ihe iji mejụọ ihe,” “ikpuchi mmehie”) kama ọ bụghị n’echiche nke imezi mmetụta ndị e mejọrọ emejọ n’akụkụ nke Chineke. Kama nke ahụ, àjà nke Jisọs mejụrụ ma ọ bụ mezuo ihe nile ikpe ziri ezi zuru okè nke Chineke na-achọ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ime ka e nwee ihe ndabere maka ịgbaghara mmehie nke ndị ezi omume, ka Chineke “wee bụrụ onye ezi omume, bụrụkwa onye na-agụ onye ahụ [nwere mmehie n’ime onwe ya] n’onye ezi omume, bụ́ onye nọ n’okwukwe e kwere na Jisọs.” (Ndị Rom 3:23-26; 5:12) Site n’ime ka e nwee ohere iji kwụzuo ihe nile maka mmehie mmadụ, àjà Jisọs mere ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ obi ma ọ bụ ihe debere mmadụ n’ọnọdụ dị mma iji chọọ ma nataghachi mmekọrịta dị mma n’etiti ya na Jehova. (Ndị Efesọs 1:7; Ndị Hibru 2:17) Lee ka anyị nile kwesịrị isi nwee ekele dị ukwuu maka nke a!