“Abụla Ndị E Kekọtara n’Ụzọ Na-ahaghị Nhata”
OKÉ ehi abụọ e sere ebe a nwere ike dị egwu, na-eme ka ha nwee ike ịdọkpụrụ ibu ndị dị arọ n’ụzọ dị mfe. Ma ka e were ya na e ji ịnyịnya ibu dochie otu n’ime oké ehi ndị ahụ. Ebe ọ bụ na ịnyịnya ibu pere mpe karị ma gharakwa ịdị ike ka oké ehi, o yiri ka ọ ga-agba isi akwara site n’ịdị na-agba mkpara jigidere ya ná nkekọta a na-ahaghị nhata ụkwụ. Ya mere, ọ bụ ezi ihe mere iwu Chineke nyere Israel ji sị: “Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu ịdọ ihe e ji gwu ala ubi.”—Deuterọnọmi 22:10.
Pọl onyeozi dere ihe yiri nke ahụ banyere ụmụ mmadụ. Ọ sịrị: “Abụla ndị e kekọtara n’ụzọ na-ahaghị nhata unu na ndị na-ekweghị ekwe.” (2 Ndị Kọrint 6:14, NW) E kwesịrị iburu nke a n’uche karịsịa mgbe a na-ahọrọ onye òtù ọlụlụ. Alụmdi na nwunye bụ njikọ na-adịgide adịgide, n’ihi na Jisọs Kraịst sịrị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.” (Matiu 19:6) A na-enwe ọtụtụ obi mgbu mgbe di na nwunye na-enweghị otu nkwenkwe, ụkpụrụ, na ihe mgbaru ọsọ. Ya mere ọ bụ nnọọ ihe ezi uche dị na ya ịgbaso okwu ịdọ aka ná ntị nke Bible nke bụ́ ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Iso onye gị na ya na-enweghị otu okwukwe okpukpe banye n’alụmdi na nwunye ga-eweta ọbụna nsogbu ka ukwuu karịa ikekọta oké ehi na ịnyịnya ibu.
Ndịrịta iche n’okpukpe bụ nanị otu ihe pụrụ ime ka di na nwunye bụrụ ndị e kekọtara n’ụzọ na-ahaghị nhata. Ndị na-achọ ịlụ onwe ha—ọbụna n’otu okpukpe ahụ—ga-eme nke ọma ịjụ sị, ‘Ànyị nwere otu ihe mgbaru ọsọ? Olee ebe anyị ga-ebi? Ònye ga-elekọta atụmatụ mmefu ego? Ànyị abụọ aga-arụ ọrụ? Gịnị banyere ụmụaka? Obi ọma na nchebara echiche hà ga-achịkwa njikọ ahụ?’
Ruo n’ókè ụfọdụ, ụzọ e si tụlee okwu ndị dị otú ahụ pụrụ igosipụta ma nkekọ ọ̀ ga-abụ nke hà nhata ma ọ bụ nke na-ahaghị. Otú ọ dị, e nweghị mmadụ abụọ kwekọrọ ekwekọ kpam kpam. Ma, n’ozuzu ya, ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-eme mbedo pụrụ ichekọ nsogbu ihu ma dozie ha, ọ bụrụkwa na ha pụrụ ighebe usoro nkwurịta okwu oghe, o yiri ka ha agaghị abụ ndị e kekọtara n’ụzọ na-ahaghị nhata.