Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/1 p. 24-26
  • ‘Site n’Ọnụ Ụmụ Ọhụrụ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Site n’Ọnụ Ụmụ Ọhụrụ’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Àgwà Ọma Na-agba Àmà
  • Ndịàmà Na-eto Eto Ndị Dị Irè
  • Obi Ike nke Ndị Na-eto Eto Agbaa Àmà Dị Mma
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/1 p. 24-26

‘Site n’Ọnụ Ụmụ Ọhụrụ’

MGBE Samuel bụ nwa okoro na-eto eto, ọ rapagidesiri ike n’ụkpụrụ ndị ziri ezi n’agbanyeghị omume ọjọọ nke ụmụ ndị ikom Onye Isi Nchụàjà bụ́ Ịlaị. (1 Samuel 2:22; 3:1) N’ụbọchị Elaịsha, otu nwatakịrị onye Israel a dọtara n’agha gaa Siria ji obi ike gbaa àmà nye nne ya ukwu. (2 Ndị Eze 5:2-4) Mgbe Jisọs dị afọ 12, o ji anyaike gwa ndị nkụzi nke Israel okwu, na-ajụ ajụjụ ma na-enye azịza ndị tụrụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ n’anya. (Luk 2:46-48) N’ime akụkọ ihe mere eme nile, ndị na-eto eto na-efe Jehova ejeworo ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.

Ndị na-eto eto taa, hà na-egosi otu ụdị mmụọ ahụ nke ikwesị ntụkwasị obi? Ee, n’ezie! Akụkọ ndị sitere n’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower Society na-egosi na ọtụtụ ndị na-eto eto kwere ekwe “bụ onyinye afọ ofufo” n’ozi Jehova. (Abụ Ọma 110:3) Ihe dị mma ndị na-esite ná mgbalị ha apụta na-agba ndị Kraịst nile ume, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, ‘ka ike ghara ịgwụ ha n’obi n’ime ihe ọma.’—Ndị Galetia 6:9.

Otu ihe atụ dị mma bụ Ayumi, obere nwata nwanyị sitere Japan, onye ghọrọ onye nkwusa mgbe ọ dị afọ isii ma mee ya ihe mgbaru ọsọ ya ịgba àmà nye onye ọ bụla nọ na klasị ya. Ọ natara ikike idebe ọtụtụ akwụkwọ n’ọba akwụkwọ klasị ahụ, na-akwadebe onwe ya ịza ajụjụ ọ bụla ụmụ akwụkwọ ibe ya pụrụ ịjụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụmụ klasị ibe ya nile tinyekwara onye nkụzi ya matara akwụkwọ ndị ahụ. N’ime afọ isii ya n’ụlọ akwụkwọ elementrị, Ayumi dokwara maka ọmụmụ Bible 13. E mere ya baptism mgbe ọ nọ na klasị nke anọ, e mekwara otu n’ime ndị enyi ya ọ mụwooro ihe baptism na klasị nke isii. Ọzọkwa, nne na ụmụnne ndị inyom abụọ nke onye mmụta Bible nke a mụkwara ihe, wee bụrụkwa ndị e mere baptism.

Àgwà Ọma Na-agba Àmà

“Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ,” ka Pita onyeozi kwuru, ndị Kraịst na-eto eto na-ewerekwa iwu nke a dị ka ihe dị oké mkpa. (1 Pita 2:12) Dị ka ihe na-esi na ya apụta, omume ọma ha na-agbakarị àmà. Ná mba Africa ahụ bụ́ Cameroon, otu nwoke bịara nzukọ ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova na nke ugboro abụọ ya, o wee daba na ọ nọdụrụ n’akụkụ otu nwa agbọghọ nta. Mgbe ọkà okwu kpọrọ ndị na-ege ntị òkù ịchọta otu ebe n’ime Bible, nwoke ahụ rịbara ama na nwa agbọghọ nta ahụ chọtara amaokwu ahụ n’ime Bible nke ya ma gbasochie ọgụgụ ya anya. Àgwà ya masịrị nwoke ahụ nke na mgbe e mechisịrị nzukọ ahụ, ọ gakwuuru ọkà okwu ahụ, wee sị: “Nwa agbọghọ nta a emewo ka m chọọ isoro unu mụọ Bible.”

Na South Africa e nwere otu ụlọ akwụkwọ ebe 25 ụmụ akwụkwọ bụ ụmụaka Ndịàmà Jehova. Ezi àgwà ha ewetaworo Ndịàmà Jehova aha ọma. Otu onye nkụzi gwara otu onye mụrụ ụmụ bụ́ Onyeàmà na ya aghọtaghị ụzọ Ndịàmà si na-azụ ụmụaka ha nke ọma otú a, karịsịa ebe ọ bụ na chọọchị nke ya egosiwo na ọ pụghị inyere ndị na-eto eto aka. Otu onye nkụzi ọhụrụ bịara inye aka n’ụlọ akwụkwọ ahụ ma hụta ezi àgwà nke ụmụaka Ndịàmà ahụ n’egbughị oge. Ọ jụrụ otu nwa okoro bụ́ Onyeàmà ihe ya na-aghaghị ime iji ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ kọwara na o kwesịrị ịmụ Bible, o mekwara ndokwa ka ndị mụrụ ya sochie mmasị ahụ anya.

Na Costa Rica, Rigoberto ghọtara izi ezi nke eziokwu ahụ mgbe ụmụ klasị ibe ya abụọ jiri Bible zaa ajụjụ ndị o nwere banyere Atọ n’Ime Otu, mkpụrụ obi, na ọkụ hell. Ihe ha kwuru nwere mmetụta dị mma n’ebe ọ nọ ọ bụghị nanị n’ihi ikike ha nwere iji Akwụkwọ Nsọ eme ihe kamakwa n’ihi na àgwà ha magburu onwe ya dị nnọọ iche n’ihe ọ hụworo na chọọchị dị iche iche nke Krisendọm. N’agbanyeghị mmegide ezinụlọ, Rigoberto na-enwe ọganihu dị mma n’ọmụmụ Bible ya.

Na Spain Ndịàmà Jehova abụọ—otu n’ime ha dị afọ itoolu—letara otu nwoke aha ya bụ Onofre. Ọ bụ ezie na Onyeàmà nke toruworo ogo mmadụ kwuru ihe ka n’okwu ahụ, Onyeàmà ahụ na-eto eto ji Akwụkwọ Nsọ nke ya na-eso ihe a na-agụ ma hotakwa akụkụ Bible ụfọdụ n’isi. Ọ masịrị Onofre. O kpebiri na ya chọrọ ịmụ Bible n’otu ebe ahụ nwa okoro ahụ na-eto eto mụtaworo iji Akwụkwọ Nsọ mee ihe nke ọma otú a. Ya mere, n’isi ụtụtụ nke Sunday na-esochi, ọ gara Ụlọ Nzukọ Alaeze. O cheere n’èzí ruo n’etiti ehihie, mgbe Ndịàmà ahụ bịara maka nzukọ ha. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, o nwere ọganihu dị mma ma gosipụta nraranye ya site na baptism mmiri.

Ndịàmà Na-eto Eto Ndị Dị Irè

Ee, Jehova na-eji ma ndị na-eto eto ma ndị toruworo ogo mmadụ eme ihe ijekwuru ndị dị umeala n’obi. A hụkwuru nke ahụ n’otu ahụmahụ sitere Hungary. N’ebe ahụ, otu nọọsụ n’ụlọ ọgwụ rịbara ama na mgbe ọ bụla ndị ọbịa bịara ileta otu onye ọrịa dị afọ iri, ha na-ewetara ya ihe ọgụgụ tinyere ihe oriri. N’ịbụ onye a kpaliri mmasị ya, o chere echiche banyere ihe nwa agbọghọ nta ga na-agụ banyere ya ma chọpụta na ọ bụ Bible. Nọọsụ ahụ gwara ya okwu, ma mesịa sị: “Site nnọọ ná mmalite, ọ na-ezi m ihe n’ezie.” Mgbe nwa agbọghọ nta ahụ hapụrụ ụlọ ọgwụ, ọ kpọrọ nọọsụ ahụ òkù ịbịa otu mgbakọ, ma nọọsụ ahụ jụrụ. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, o kwetara ije Mgbakọ Distrikti “Asụsụ Dị Ọcha.” N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, ọ malitere ịmụ Bible, otu afọ kwa ka e mesịrị e mere ya baptism—ha dum n’ihi otu nwa agbọghọ nta iji oge ọ nọrọ n’ụlọ ọgwụ na-agụ akwụkwọ Bible.

Ana Ruth, n’El Salvador, nọ n’afọ nke abụọ ya n’ụlọ akwụkwọ dị elu. O nwere àgwà nke ịhapụ akwụkwọ Bible n’elu table ya ka ndị ọzọ gụọ ha ma ọ bụrụ na ha achọọ. N’ịchọpụta na akwụkwọ ahụ na-apụ n’anya ma pụtaghachi mgbe obere oge gasịrị, Ana Ruth chọpụtara na nwa akwụkwọ ibe ya, bụ́ Evelyn, na-agụ ya. Mgbe obere oge gasịrị, Evelyn nakweere ọmụmụ ihe ma malite ije nzukọ dị iche iche nke ọgbakọ. N’ikpeazụ, e mere ya baptism, ugbu a kwa ọ na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka oge nile. Ana Ruth bụ onye ọsụ ụzọ oge nile.

Na Panama otu nwanna nwanyị maliteere otu nwanyị ọmụmụ ihe bụ́ onye di ya malitere imegide eziokwu ahụ ruo n’ókè nke na ọ fọrọ nke nta ka ọmụmụ ihe ahụ kwụsị. Otú ọ dị, àgwà di ya ji nwayọọ nwayọọ dịtụ nro. Obere oge ka e mesịrị, nwanne ya nwoke ya na ya si n’otu afọ, bụ́ Onyeàmà, gwara ya ka o tinye mgbịrịgba mgbaàmà n’ụlọ ya. Ka ọ na-etinye mgbịrịgba mgbaàmà ahụ, nwa nwanne ya dị afọ itoolu lọtara na-adị ka onye ihe na-ewute. Ọ jụrụ ya ihe merenụ, nwa nwanne ya ahụ kwuru na ya na nwanne ya nwanyị nke okenye gara iduzi ọmụmụ Bible ma na onye ahụ anọghị n’ụlọ, ya mere na ya enwebeghị ike imere Jehova ihe ọ bụla n’ụbọchị ahụ. Nwanne nna ya sịrị: “Gịnị ma i zie m ozi ọma? Mgbe ahụ ị ga-emere Jehova ihe.” Nwa nwanne ya ji obi ụtọ were ọsọ gaa weta Bible ya, a malitekwara ọmụmụ ihe ozugbo.

Nne ya (nwunye nwanne nwoke ahụ) nọ na-ege ntị. O chere na ihe ahụ dum bụ nanị egwuregwu, ma mgbe ọ bụla nwoke ahụ gara ụlọ ya, ọ na-arịọ nwa nwanne ya maka ọmụmụ Bible. Mgbe nne ya hụrụ na nwanne di ya ji ihe ọ na-eme kpọrọ ihe dị mkpa ma nweekwa ajụjụ ụfọdụ ndị siri ike, o kpebiri iduzi ọmụmụ ihe ahụ n’onwe ya n’ebe nwa ya nwanyị nọ ya. Ọ malitere ịmụ ihe ugboro abụọ n’izu ma nwee ọganihu dị oké ngwa. N’ikpeazụ, o ruru n’ogo nke nraranye, e meekwa ya baptism n’otu mgbakọ ahụ e mere nwunye ya—n’ihi àgwà ọma nke nwa nwanne ya na-eto eto.

Obi Ike nke Ndị Na-eto Eto Agbaa Àmà Dị Mma

Bible na-asị: “Dị ike, ka obi gị nweekwa ume; ee, na-ele anya Jehova.” (Abụ Ọma 27:14) Okwu ndị a dịịrị ndị ohu Chineke nile, ma ndị na-eto eto ma ndị toruworo ogo mmadụ ejiriwo ha mee ihe n’ime afọ gara aga. N’Australia, mgbe otu nwata nwanyị dị afọ ise malitere akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ọhụrụ, nne ya gara na nke onye nkụzi ya ịkọwa ihe ndị Ndịàmà Jehova kwere na ha. Onye nkụzi ahụ kwuru, si: “Amaara m rịị ihe unu kwere na ya. Nwa gị nwanyị akọwaworo m ihe nile.” Nwata nwanyị a na-eto eto asọghị oké ihere nanị ya ịgakwuru onye nkụzi ya ịkọwara ya ihe ndị o kwere na ha.

Andrea dị afọ ise na Romania gosikwara obi ike. Mgbe nne ya hapụrụ okpukpe Orthodox ịghọ Onyeàmà, ndị agbata obi ya jụrụ ige ya ntị. Otu ụbọchị n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, Andrea nụrụ ka onye nlekọta ije ozi mesiri ike mkpa ọ dị mmadụ ikwusara ndị agbata obi ya ozi ọma. O chesiri echiche ike banyere nke a, mgbe ha laghachikwara n’ụlọ ọ gwara nne ya, sị: “Ọ bụrụ na ị gawa ọrụ, m ga-ebili, kwazie akwụkwọ n’akpa m dị ka ị na-eme, Mama, aga m ekpegakwara Jehova ekpere ka o nyere m aka ịgwa ndị agbata obi anyị okwu banyere eziokwu ahụ.”

N’ụbọchị na-eso ya Andrea mezuru ihe o kwere ná nkwa. Mgbe ahụ, n’imesi onwe ya obi ike, ọ kụrụ mgbịrịgba nke otu onye agbata obi. Mgbe onye agbata obi ahụ mepere ọnụ ụzọ, nwa agbọghọ nta a sịrị: “Amatara m na kemgbe nne m ghọrọ Onyeàmà, ihe ya amasịghị unu. Ọ gbalịwo ịgwa unu okwu ọtụtụ ugboro, ma unu achọghị ige ya ntị. Nke a na-ewe ya iwe, ma achọrọ m ka unu mata na anyị hụrụ unu n’anya.” Mgbe ahụ, Andrea gara n’ihu ịgba àmà dị mma. N’ime otu ụbọchị, o kesara akwụkwọ isii, magazin isii, akwụkwọ nta anọ, na traktị anọ. Kemgbe ahụ, ọ na-ejechi ozi ubi anya.

Na Rwanda ọ dịwo ụmụnna anyị mkpa igosi obi ike dị ukwuu n’ihi agha a na-alụ n’ebe ahụ. N’otu oge e tinyere otu ezinụlọ nke Ndịàmà n’ime otu ọnụ ụlọ ebe ndị agha kwadoro igbu ha. Ezinụlọ ahụ rịọrọ ka e nye ha ohere ibu ụzọ kpee ekpere. E nyere ha ohere ime nke a, ha nile ma e wezụga nwa ha nwanyị, bụ́ Deborah, kpere ekpere n’ime obi ha. Dị ka otu akụkọ si kọọ, Deborah kpere ekpere n’olu dara ụda, sị: “O Jehova, mụ na papa m tinyere magazin ise. Olee otú anyị ga-esi jeghachi na nke ndị a iji zie ha eziokwu ahụ ma nyere ha aka inweta ndụ? E wezụga nke ahụ, olee otú m ga-esi ghọọ onye nkwusa ugbu a? Achọrọ m ka e mee m baptism ka m wee fee gị.” Mgbe ha nụrụ nke a, otu onye agha sịrị: “Anyị apụghị igbu unu n’ihi nwa agbọghọ nta a.” Deborah zaghachiri, sị: “Unu emeela.” A hapụrụ ezinụlọ ahụ ndụ.

Mgbe Jisọs mere mbanye ya dị ebube na Jerusalem mgbe ọgwụgwụ ndụ elu ala ya na-eru nso, ọnụ ọgụgụ bara ụba nke oké ìgwè mmadụ nwere obi ụtọ kelere ya. Ndị mejupụtara ìgwè mmadụ ahụ bụ ụmụaka na ndị toruworo ogo mmadụ. Dị ka ihe ndekọ ahụ si kọọ, ụmụ okoro “na-eti mkpu n’ụlọ ukwu Chineke, sị, Hosanna dịịrị Nwa Devid.” Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ kwugidere nke a, Jisọs zaghachiri, sị: “Ọ́ dịghị mgbe ọ bụla unu gụrụ, I si n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara mee ka ọjịja zuo okè?”—Matiu 21:15, 16.

Ọ́ bụghị ihe na-akpali akpali ịhụ na okwu Jisọs bụ eziokwu ọbụna taa? ‘Site n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara’—na, ka anyị pụrụ ịgbakwụnye, ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ—Jehova emewo ka a nụ otuto. N’ezie, mgbe a bịara n’ito Jehova, e nweghị afọ ndụ dịkarịsịrị ala.—Joel 2:28, 29.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya