Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fy isi 14 p. 163-172
  • Imekọ Agadi Ọnụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Imekọ Agadi Ọnụ
  • Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • KWEKỌỌ NÁ NNWERE ONWE NKE ỤMỤ GỊ
  • IMESIWANYE IHE NKEKỌ ALỤMDI NA NWUNYE GỊ IKE
  • NWEE ỌṄỤ N’ỤMỤ ỤMỤ GỊ
  • MEE NHAZIGHARỊ KA Ị NA-AKA NKÁ
  • ỊNAGIDE ỌNWỤ DI MA Ọ BỤ NWUNYE
  • ỊBỤ ONYE CHINEKE JI KPỌRỌ IHE N’OGE NKÁ
  • Ndị Nne Na Nna Ochie—Ọṅụ Ha Na Ihe Ịma Aka Ha
    Teta!—1999
  • Mgbe Ndị Nne Na Nna Ochie Ghọrọ Nne Na nna
    Teta!—1999
  • N’ihi Gịnị Ka M Ji Kwesị Ịma Nne na Nna M Ochie?
    Teta!—2001
  • Nwetara Ezinụlọ Gị Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
fy isi 14 p. 163-172

ISI NKE IRI NA ANỌ

Imekọ Agadi Ọnụ

1, 2. (a) Mgbanwe dịgasị aṅaa na-ewere ọnọdụ ka oge agadi na-eru nso? (b) Olee otú ndị ikom na-asọpụrụ Chineke n’oge Bible si nweta afọ ojuju n’oge agadi?

ỌTỤTỤ mgbanwe na-ewere ọnọdụ ka anyị na-emekwu agadi. Ike ọgwụgwụ anụ ahụ na-amịkọrọ ume anyị. Ile anya n’enyo na-ekpughe ahụ ndọlị ndị ọhụrụ na nchanwụ nwayọọ nwayọọ nke ntutu—ọbụna mfu nke ntutu. Anyị pụrụ inwe nsogbu ụfọdụ n’icheta ihe. Mmekọrịta ndị ọhụrụ na-etolite ka ụmụ na-alụ di ma ọ bụ nwunye, ọzọkwa mgbe a malitere inwe ụmụ ụmụ. Nye ụfọdụ, ịla ezumike nkà na-akpata usoro dị iche nke ibi ndụ.

2 N’ikwu eziokwu, ime agadi pụrụ iweta ule. (Eklisiastis 12:1-8) Ka o sina dị, tụlee ndị ohu Chineke n’oge Bible. Ọ bụ ezie na ha mesịrị nwụọ, ha nwetara ma amamihe ma nghọta, bụ́ ndị wetaara ha nnukwute afọ ojuju n’oge agadi. (Jenesis 25:8; 35:29; Job 12:12; 42:17) Olee otú ha si nwee ihe ịga nke ọma n’iji obi ụtọ na-eme agadi? N’ezie ọ bụ site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị anyị na-ahụ taa na e dekọrọ na Bible.—Abụ Ọma 119:105; 2 Timoti 3:16, 17.

3. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Pọl nyere maka agadi ndị ikom na ndị inyom?

3 N’akwụkwọ ozi o degaara Taịtọs, Pọl onyeozi nyere ndị na-eme agadi nduzi ọma. O dere, sị: “Ka agadi ndị ikom nwee anya udo, kwesịrị nsọpụrụ, nwee uche zuru okè, nwee ezi ndụ n’ime okwukwe anyi, n’ime ịhụnanya, n’ime ntachi obi: otú ahụ ka agadi ndị inyom dị nsọ n’omume ha, ghara ịbụ ndị na-ebo ebubo ụgha, gharakwa ịbụ ohu nke ịṅụbiga mmanya ókè, ka ha bụrụ ndị na-ezi ihe ọma.” (Taịtọs 2:2, 3) Ịṅa ntị n’okwu ndị a pụrụ inyere gị aka iche ihe ịma aka dị iche iche nke ime agadi ihu.

KWEKỌỌ NÁ NNWERE ONWE NKE ỤMỤ GỊ

4, 5. Olee otú ọtụtụ nne na nna si emeghachi omume mgbe ụmụ ha na-ahapụ ụlọ, oleekwa ụzọ ụfọdụ si ahazigharị ihe ikwekọ n’ọnọdụ ọhụrụ ahụ?

4 Ọnọdụ ndị na-agbanwe agbanwe na-achọ ime nkwekọ. Lee ka nke a si abụ eziokwu mgbe ụmụ toworo eto na-ahapụ ụlọ ma banye n’alụmdi na nwunye! Nye ọtụtụ nne na nna nke a bụ ihe ncheta mbụ nke na ha na-eme agadi. Ọ bụ ezie na obi dị ha ụtọ na ụmụ ha etopụtawo mmadụ, ndị nne na nna na-enwekarị nchekasị banyere ma hà mere ihe nile ha pụrụ ime iji kwadebe ụmụaka ahụ maka nnwere onwe. Agụụ ụmụ ahụ ịnọ gburugburu ha pụkwara ịdị na-agụ ha.

5 N’ụzọ kwere nghọta, ndị nne na nna na-anọgide na-echegbu onwe ha banyere ọdịmma ụmụ ha, ọbụna mgbe ụmụ ahụ hapụrụ ụlọ. “A sị nnọọ na m pụrụ ịdị na-enweta ozi ha ọtụtụ mgbe, iji mesie onwe m obi ike na ahụ dị ha—nke ahụ ga-eme m obi ụtọ,” ka otu nne kwuru. Otu nna na-akọ, sị: “Mgbe ada anyị hapụrụ ụlọ, ọ bụ oge siri oké ike. O gbuwara oghere dị ukwuu n’ezinụlọ anyị n’ihi na anyị emekọwo ihe ọnụ mgbe nile.” Olee otú ndị nne na nna a siworo nagide anọghị n’ụlọ nke ụmụ ha? N’ọtụtụ ọnọdụ, site n’iwepụta onwe ha ma nyere ndị ọzọ aka.

6. Gịnị na-enye aka idebe mmekọrịta ezinụlọ n’ọnọdụ ha kwesịrị ekwesị?

6 Mgbe ụmụ banyere n’alụmdi na nwunye, ọnọdụ ndị nne na nna na-agbanwe. Jenesis 2:24 na-asị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Nghọta nke ụkpụrụ Chineke ndị metụtara ịbụisi na usoro ọma ga-enyere ndị nne na nna aka idebe ihe nile n’ọnọdụ kwesịrị ha.—1 Ndị Kọrint 11:3; 14:33, 40.

7. Àgwà ọma dị aṅaa ka otu nna zụlitere mgbe ụmụ ya ndị inyom hapụrụ ụlọ gaa di?

7 Mgbe ụmụ ndị inyom abụọ nke otu di na nwunye gasịrị di ma kwapụ, o yiri di na nwunye ahụ ka ndụ ha ọ̀ tọgbọ chakoo. Na mbụ, di ahụ wesoro ndị bụ di ụmụ ya iwe. Ma ka ọ tụgharịrị uche n’ụkpụrụ ịbụisi, ọ ghọtara na ndị bụ di ụmụ ya bụ ndị ezinụlọ ha dị iche iche dị n’ubu ugbu a. Ya mere, mgbe ụmụ ya ndị inyom chọrọ okwu ndụmọdụ, ọ na-ajụ ha ihe di ha chere, mgbe ahụ ọ na-ejide n’aka na o nyere nkwado ruo ókè o nwere ike. Ndị bụ di ụmụ ya na-ele ya anya ugbu a dị ka enyi ma na-anabata ndụmọdụ ya.

8, 9. Olee otú ụfọdụ nne na nna siworo hazigharịa ihe iji kwekọọ ná nnwere onwe nke ụmụ ha toworo eto?

8 Gịnị ma ọ bụrụ na ndị gbara akwụkwọ ọhụrụ, ọ bụ ezie na ha adịghị eme ihe ọ bụla megidere Akwụkwọ Nsọ, ajụ ime ihe nne na nna ha chere kasị mma? “Anyị na-enyere ha aka mgbe nile ịhụ echiche Jehova,” ka otu di na nwunye nwere ụmụ banyeworo n’alụmdi na nwunye na-akọwa, “ma ọ bụrụ na anyị ekwenyeghị ná mkpebi ha, anyị na-anakwere ya ma nye ha nkwado na agbamume anyị.”

9 N’ala ụfọdụ nke Esia, ọ na-esiri ndị nne ụfọdụ ike nke ukwuu ịnakwere nnwere onwe nke ụmụ ha ndị ikom. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha na-akwanyere usoro na ịbụisi ndị Kraịst ùgwù, ha na-achọpụta na esemokwu ha na ndị nwunye ụmụ ha na-ebelata. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst na-achọpụta na ọpụpụ ụmụ ya ndị ikom site n’ebe obibi ezinụlọ ahụ abụwo “isi iyi nke obi ekele na-ehiwanye nne.” Ọ na-atọgbu ya atọgbu ịhụ ikike ha ilekọta ezinụlọ ha ndị ọhụrụ. N’aka nke ọzọ, nke a apụtawo mbelata nke ibu nkịtị na nke uche ndị ya na di ya na-aghaghị ibu ka ha na-eme agadi.

IMESIWANYE IHE NKEKỌ ALỤMDI NA NWUNYE GỊ IKE

Foto ndị dị na peeji nke 166

Ka unu na-eme agadi, mesighachi ịhụnanya maka ibe unu ike

10, 11. Ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa ga-enyere ndị mmadụ aka izere ọnyà ụfọdụ a na-enwe mgbe a na-akatatụ ahụ?

10 Ụmụ mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ dị iche iche ka ha na-akatatụ ahụ. Ndị ikom ụfọdụ na-eyi ákwà n’ụzọ dị iche ná mgbalị iji yie ndị na-eto eto. Ọtụtụ ụmụ nwanyị na-enwe nchekasị banyere mgbanwe ndị nkwụsị ịhụ nsọ na-eweta. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị na-eme agadi na-akpasu di ma ọ bụ nwunye ha iwe na ekworo site n’iso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha bụ́ ndị ka ha nwata na-eme mfegharị. Ma, agadi ndị ikom na-atụ egwu Chineke “nwere uche zuru okè,” na-egbochi ọchịchọ ndị na-ekwesịghị ekwesị. (1 Pita 4:7) Ndị inyom tozuru okè n’otu aka ahụ na-arụ ọrụ ijigide nkwụsi ike nke alụmdi na nwunye ha, n’ihi ịhụnanya maka di ha na ọchịchọ ime Jehova obi ụtọ.

11 N’ike mmụọ nsọ, Eze Lemuel dekọrọ otuto maka “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” nke ji ‘ezi ihe, ọ bụghịkwa ihe ọjọọ, ụbọchị nile nke ndụ ya’ na-enye di ya ụgwọ ọrụ. Di bụ́ onye Kraịst agaghị ahapụ igosi ekele maka ụzọ nwunye ya si na-agbalịsi ike ịnagide nsogbu mmetụta uche ọ bụla ọ na-enwe ka ọ na-eme agadi. Ịhụnanya ya ga-akpali ya ịdị “na-etokwa ya.”—Ilu 31:10, 12, 28.

12. Olee otú ndị di na nwunye si adịwanye nso ka ọtụtụ afọ na-agafe?

12 N’afọ ndị ahụ nke iji ọrụ n’aka n’ịzụlite ụmụ, unu abụọ nwere ike ijiwo ọṅụ wezụga ọchịchọ onwe unu n’akụkụ iji hụ maka mkpa ụmụ unu. Mgbe ha pụsịrị ọ bụ oge ileghachi anya ná ndụ alụmdi na nwunye unu. “Mgbe ụmụ m ndị inyom hapụrụ ụlọ,” ka otu di na-ekwu, “amalitere m n’isi iso nwunye mee mbedo ọzọkwa.” Di ọzọ na-asị: “Anyị na-elekwasị anya n’ahụ ike ibe anyị ma na-echetara ibe anyị banyere mkpa inwe mmega ahụ.” Iji ghara inwe owu ọmụma, ya na nwunye ya na-ele ndị ọzọ n’ọgbakọ ọbịa. Ee, igosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ na-eweta ngọzi. Ọzọkwa, ọ na-eme Jehova obi ụtọ.—Ndị Filipaị 2:4; Ndị Hibru 13:2, 16.

13. Òkè dị aṅaa ka ezoghị ọnụ na ikwu eziokwu na-emezu ka di na nwunye na-emekọ agadi ọnụ?

13 Ekwela ka ụkọ nke nkwurịta okwu tolite n’etiti gị na onye ị lụrụ. Kwurịtanụ okwu nke ọma. (Ilu 17:27) “Anyị na-eme ka nghọta anyị banyere ibe anyị miwanye emi site n’igosi nchegbu na nchebara echiche,” ka otu di na-ekwu. Nwunye ya kwenyere, na-asị: “Ka anyị meworo agadi, anyị abịawo na-anụ ụtọ ịṅụkọ tii ọnụ, ịkparịta nkata, na imekọ ihe ọnụ.” Ezoghị ọnụ na ikwu eziokwu nke gị pụrụ inye aka ime ka ihe nkekọ alụmdi na nwunye unu sie ike, na-enye ya ike nguzogide nke ga-echigharị mwakpo nile nke Setan, onye ntisa alụmdi na nwunye ihu.

NWEE ỌṄỤ N’ỤMỤ ỤMỤ GỊ

14. Òkè dị aṅaa ka nne ochie Timoti keere dị ka ihe àmà na-egosi ná ntolite ya dị ka onye Kraịst?

14 Ụmụ ụmụ bụ “okpueze” ndị agadi. (Ilu 17:6) Mkpakọrịta nke ụmụ ụmụ pụrụ ịbụ nnọọ ihe ụtọ—na-ekpo ọkụ ma na-enye ume ọhụrụ. Bible na-ekwu nke ọma banyere Lọịs, otu nne ochie bụ́ onye, ya na nwa ya nwanyị bụ́ Yunaịsi, sooro nwa nwa ọhụrụ ya bụ́ Timoti, kerịta ihe ndị o kwenyere. Nwatakịrị a tolitere na-amara na ma nne ya ma nne ya ochie ji eziokwu Bible kpọrọ ihe.—2 Timoti 1:5; 3:14, 15.

15. Banyere ụmụ ụmụ, ụtụ dị aṅaa bara uru ka ndị nne na nna ochie pụrụ ịtụnye, ma gịnị ka ha kwesịrị izere?

15 Ya mere, nke a bụ akụkụ ebe ndị nne na nna ochie pụrụ ịtụnye ụtụ bara oké uru. Ndị nne na nna ochie, unu esoroworị ụmụ unu kerịta ihe ọmụma nke nzube Jehova. Ugbu a unu pụrụ ime otu ihe ahụ n’ebe ọgbọ ọzọkwa nọ! Ọ na-atọgbu ọtụtụ ụmụntakịrị atọgbu ịnụ ka nne na nna ochie ha na-akọ akụkọ Bible. Ma, ị dịghị eweghara ibu ọrụ nke nna nke izi ụmụ ya eziokwu Bible. (Deuterọnọmi 6:7) Kama nke ahụ, ị na-akwado nke a. Ka ekpere gị bụrụ nke ọbụ abụ ahụ: “Ọbụna ruo agadi na isi awọ ahapụla m, Chineke; ruo mgbe m ga-egosi ọgbọ ọzọ ogwe aka Gị, gosikwa onye ọ bụla nke ga-abịa ịdị ike Gị.”—Abụ Ọma 71:18; 78:5, 6.

16. Olee otú ndị nne na nna ochie pụrụ isi zere ịbụ ihe na-akpata ihe isi ike na-ebilite n’ezinụlọ ha?

16 Ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ nne na nna ochie na-azụtọ ụmụntakịrị nke ukwuu nke na esemokwu na-ebilite n’etiti ndị nne na nna ochie na ụmụ ha toworo eto. Otú ọ dị, obi ọma gị sitere n’obi pụrụ ma eleghị anya mee ya ka ọ dị mfe ụmụ ụmụ gị ikpughere gị izu nzuzo ha mgbe ha na-adịghị achọ ikpughere nne na nna ha ihe. Mgbe ụfọdụ ụmụaka na-enwe olileanya na nne na nna ochie ha na-anabata ihe nile ga-adọnyere ha úkwù megide ndị mụrụ ha. Mgbe ahụ gịnị? Gosi amamihe ma gbaa ụmụ ụmụ gị ume ịhapụ izo ọnụ n’ebe ndị mụrụ ha nọ. Ị pụrụ ịkọwa na nke a na-atọ Jehova ụtọ. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ị pụrụ iwepụta onwe gị imeghe ụzọ maka ụmụntakịrị ahụ ijekwuru ndị mụrụ ha site n’ikwunyere nne na nna ha okwu. Na-agwa ụmụ ụmụ gị eziokwu banyere ihe ị mụtaworo n’ọtụtụ afọ. Ikwu eziokwu na ịkwụwa aka ọtọ gị pụrụ ịbara ha uru.

MEE NHAZIGHARỊ KA Ị NA-AKA NKÁ

17. Mkpebisi ike dị aṅaa nke ọbụ abụ ahụ kwesịrị ka ndị Kraịst na-eme agadi ṅomie?

17 Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ị ga-ahụta na ị pụghị imeli ihe nile ị na-emebu ma ọ bụ ihe nile ị chọrọ ime. Olee otú mmadụ si eche usoro ịka nká ihu? N’uche gị ị pụrụ inwe mmetụta nke ịdị 30 afọ, ma ileru anya n’enyo na-egosi izi ezi dị iche. Enwela nkụda obi. Ọbụ abụ ahụ kpọkuru Jehova, sị: “Etufula m na mgbe agadi; mgbe ike m gwụsịrị ahapụla m.” Zubesie ike iṅomi mkpebisi ike nke ọbụ abụ ahụ. Ọ sịrị: “Mgbe nile ka m ga na-eche Gị, wee tụkwasị otuto n’otuto Gị nile.”—Abụ Ọma 71:9, 14.

18. Olee otú onye Kraịst tozuru okè pụrụ isi jiri ezumike nká mee ihe bara uru?

18 Ọtụtụ emewo nkwadebe n’oge iji welite otuto ha na-eto Jehova mgbe ha lara ezumike nká. “Emere m atụmatụ n’oge banyere ihe m ga-eme mgbe ada anyị gụsịrị akwụkwọ,” ka otu nna laworo ezumike nká ugbu a na-akọwa. “Ekpebisiri m ike na m ga-amalite ozi nkwusa oge nile, m rekwara azụmahịa m iji nwere onwe m ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị. Ekpere m ekpere maka nduzi Chineke.” Ọ bụrụ na ị na-eru nso afọ ndụ nke ịla ezumike nká, nweta nkasi obi site ná nkwupụta nke Onye Okike Ukwu anyị, bụ́: “Ruo agadi Mụ onwe m bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ Mụ onwe m ga-eku unu n’aka.”—Aịsaịa 46:4.

19. Ndụmọdụ dị aṅaa ka e nyere maka ndị na-eme agadi?

19 Imezigharị ihe iji kwekọọ n’ezumike nká nwere ike ọ gaghị adị mfe. Pọl onyeozi dụrụ agadi ndị ikom ọdụ ka ha “nwee anya udo.” Nke a na-achọ njighachi azụ n’ihe nile, n’adabaghị n’ọchịchọ nke ịchụso ndụ dị mfe. A pụrụ inwe mkpa ọbụna nke ka ukwuu maka ịdị n’usoro na ịrụ ahụ onwe onye ụka mgbe a lara ezumike nká karịa ka ọ dị na mbụ. Ya mere, jide ọrụ n’aka, “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:58) Gbasapụ ihe ndị ị na-eme iji nyere ndị ọzọ aka. (2 Ndị Kọrint 6:13) Ọtụtụ ndị Kraịst na-eme nke a site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ a hazigharịrị ahazigharị. Ka ị na-eme agadi, “nwee ezi ndụ n’ime okwukwe anyị, n’ime ịhụnanya, n’ime ntachi obi.”—Taịtọs 2:2.

ỊNAGIDE ỌNWỤ DI MA Ọ BỤ NWUNYE

20, 21. (a) N’usoro ihe dị ugbu a, gịnị ga-emesị kewaa di na nwunye? (b) Olee ụzọ Ana si setịpụ ihe atụ ọma nye ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ?

20 Ọ bụ eziokwu dị mwute na n’usoro ihe dị ugbu a, ọnwụ na-emesị kewaa ndị di na nwunye. Ndị Kraịst di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ maara na ndị ha hụrụ n’anya na-arahụ ụra ugbu a, obi sikwara ha ike na ha ga-ahụ ha ọzọ. (Jọn 11:11, 25) Ma ọnwụ ahụ ka na-akpata iru újú. Olee otú onye nke nọ ndụ pụrụ isi nagide ya?a

21 Iburu n’uche ihe otu onye n’ime Bible mere ga-enye aka. Di Ana nwụrụ mgbe nanị afọ asaa nke alụmdi na nwunye ya gasịrị, mgbe anyị gụkwara banyere ya, ọ dị 84 afọ. Anyị pụrụ ijide n’aka na o ruru újú mgbe di ya nwụnahụrụ ya. Olee otú o si nagide ya? O jeere Jehova Chineke ozi dị nsọ n’ụlọ nsọ ahụ ehihie na abalị. (Luk 2:36-38) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndụ Ana nke iji ekpere na-eje ozi bụ nnukwu ihe ngwọta nke obi ilu na owu ọmụma o nwere dị ka nwanyị di ya nwụrụ.

22. Olee otú ụfọdụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ siworo nagide owu ọmụma?

22 “Ihe ịma aka kasịnụ nye m abụwo enweghị onye ibe m ga-ekwunyere okwu,” ka otu nwanyị dị 72 afọ nke di ya nwụrụ iri afọ gara aga na-akọwa. “Di m ma ka e si ege ntị. Anyị ga-ekwurịta banyere ọgbakọ na òkè anyị na-ekere n’ozi ndị Kraịst.” Nwanyị ọzọ di ya nwụrụ na-asị: “Ọ bụ ezie na oge na-ebelata obi ọjọọ, achọpụtawo m na o ziri ezi karị ikwu na ọ bụ ihe mmadụ ji oge ya na-eme na-enyere ya aka inwetaghachi onwe ya. Ị nọ n’ọnọdụ ka mma inyere ndị ọzọ aka.” Otu nwanyị dị 67 afọ nke di ya nwụrụ kwenyere, na-asị: “Ụzọ magburu onwe ya isi nagide ọnwụ bụ iwepụta onwe gị ịkasi ndị ọzọ obi.”

ỊBỤ ONYE CHINEKE JI KPỌRỌ IHE N’OGE NKÁ

23, 24. Nnukwu nkasi obi dị aṅaa ka Bible na-enye ndị agadi, karịsịa ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụworo?

23 Ọ bụ ezie na ọnwụ na-ewere di ma ọ bụ nwunye a hụrụ n’anya, Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe nile, a na-eji ya n’aka mgbe nile. “Otu ihe ka m rịọworo n’aka Jehova,” ka Eze Devid oge ochie bụrụ n’abụ, “nke ahụ ka m na-achọ; ọ bụ ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị nile nke ndụ m, ịhụ ịdị ụtọ Jehova, na ịjụta ihe n’ụlọ ukwu Ya.”—Abụ Ọma 27:4.

24 “Na-asọpụrụ ndị inyom di ha nwụrụ, bụ́ ndị nọ n’ezie n’ọnọdụ ndị inyom di ha nwụrụ,” ka Pọl onyeozi na-agba ume ya. (1 Timoti 5:3) Ndụmọdụ nke na-eso ntụziaka a na-egosi na ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị ruru eru na-enweghị ndị ikwu dị nso pụrụ inwewo mkpa nkwado ihe onwunwe site n’ọgbakọ. Ka o sina dị, nghọta dị ná ntụziaka ahụ bụ́ “na-asọpụrụ” gụnyere echiche nke iji ha kpọrọ ihe. Lee aha nkasi obi ndị na-asọpụrụ Chineke di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ pụrụ inweta site n’ihe ọmụma nke na Jehova ji ha akpọrọ ihe, na ọ ga-akwagidekwa ha!—Jemes 1:27.

25. Ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka na-echere ndị agadi?

25 “Ihe nsọpụrụ ndị okenye ka isi awọ bụkwa,” ka Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee na-ekwu. Ọ bụ “okpueze nke mara mma . . . , n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” (Ilu 16:31; 20:29) Ya mere, ma ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ na ị nọ nanị gị ọzọkwa, nọgide na-edebe ijere Jehova ozi n’ọnọdụ mbụ ná ndụ gị. Ị ga-esi otú ahụ nwee aha ọma n’ebe Chineke nọ ugbu a na atụmanya nke ndụ agwụghị agwụ n’ụwa ebe ihe mgbu nile nke ịka nká na-agaghị adịkwa.—Abụ Ọma 37:3-5; Aịsaịa 65:20.

a Maka nkọwa zuru ezu karị n’isiokwu a, lee broshuọ ahụ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

OLEE OTÚ ỤKPỤRỤ BIBLE NDỊ A PỤRỤ ISI NYERE . . . NDỊ DI NA NWUNYE AKA KA HA NA-EME AGADI?

Ụmụ ụmụ bụ “okpueze” maka ndị agadi.—Ilu 17:6.

Oge agadi pụrụ iwetakwu ohere ijere Jehova ozi.—Abụ Ọma 71:9, 14.

A na-agba ndị agadi ume ka ha “nwee anya udo.”—Taịtọs 2:2.

Ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ, ọ bụ ezie na ha na-eru újú nke ukwuu, pụrụ inweta nkasi obi n’ime Bible.—Jọn 11:11, 25.

Jehova ji ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi akpọrọ ihe.—Ilu 16:31.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya