-
Mikpuo Onwe Gị n’Igụ IheỤlọ Nche—1996 | Mee 15
-
-
nke Akwụkwọ Nsọ na-amụta ihe bara uru: Guzosie ike n’ihe nye Jehova, a ga-agọzikwa gị n’ụba.—Rut 2:12; 4:17-22; Ilu 10:22; Matiu 1:1, 5, 6.
16. Ule dị aṅaa ka ndị Hibru atọ nwetara, oleekwa otú akụkọ a pụrụ isi nyere anyị aka?
16 Akụkọ maka ndị Hibru atọ ahụ aha ha bụ Shedrak, Mishak, na Abednego pụrụ inyere anyị aka ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’ọnọdụ ndị na-ele mmadụ ule. Jiri anya nke uche hụ ihe ahụ merenụ ka a na-agụpụta Daniel isi nke 3. Nnukwute onyinyo ọlaedo guzo ná ndagwurugwu Dura, bụ́ ebe e meworo ka ndị isi nke Babilọn zukọta. Mgbe a nụrụ ụda nke ngwá egwú dị iche iche, ha dara n’ala wee fee onyinyo ahụ nke Eze Nebukadneza guzobeworo. Ya bụ, mmadụ nile mere otú ahụ e wezụga Shedrak, Mishak, na Abednego. N’ụzọ nkwanye ùgwù, ma n’ụzọ ịkwụsi ike, ha gwara eze ahụ na ha agaghị efe chi ya nile, feekwa onyinyo ọlaedo ahụ. A tụbara ndị Hibru atọ a na-eto eto n’ime oké ọkụ nke e mere ka ọ dịbiga ọkụ oké. Ma gịnị mere? N’ilenye anya n’ime ya, eze ahụ hụrụ ndị ikom anọ dị ike, otu n’ime ha “yiri nwa nke ndị bụ chi.” (Daniel 3:25) E si n’oké ọkụ ahụ wepụta ndị Hibru atọ ahụ, Nebukadneza gọzikwara Chineke ha. Ọ bụrụwo ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ iji anya nke uche hụ akụkọ ahụ. Leekwa ihe mmụta ọ na-enye banyere ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’okpuru ule!
Rite Uru Site n’Ịgụ Bible Dị Ka Ezinụlọ
17. Ná mkpirikpi kọọ ụfọdụ n’ime ihe ndị bara uru ezinụlọ gị pụrụ ịmụta site n’ịgụkọ Bible ọnụ.
17 Ezinụlọ gị pụrụ irite ọtụtụ uru ma ọ bụrụ na unu na-etinyechi oge anya na-agụkọ Bible ọnụ. Na-amalite na Jenesis, unu pụrụ iji anya nke uche hụ okike ihe ma nyobanye anya n’ebe obibi mbụ nke mmadụ nke bụ́ Paradaịs. Unu pụrụ ikerịta ahụmahụ nke ndị nna ochie kwesịrị ntụkwasị obi na ezinụlọ ha ma sonyere ndị Israel ka ha na-agafe Osimiri Uhie n’ala akọrọ. Unu pụrụ ịhụ nwatakịrị nwoke ahụ na-azụ atụrụ bụ́ Devid ka o gburu dike Filistia ahụ bụ́ Golaịat. Ezinụlọ gị pụrụ ịhụ owuwu nke ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem, ha pụrụ ịhụ mbibi nke usuu ndị agha Babilọn bibiri ya, ha pụkwara ịhụ mwughachi ya n’okpuru Onye Ọchịchị Zerubabel. N’isonyere ndị ọzụzụ atụrụ dị ala nọ nso na Betlehem, unu pụrụ ịnụ ịma ọkwa ahụ nke mmụọ ozi banyere ọmụmụ Jisọs. Unu pụrụ ịmụta ụmụ irighiri ihe banyere baptism ya na ozi ya, unu pụrụ ịhụ ka o nyefere ndụ mmadụ ya dị ka ihe mgbapụta, unu pụkwara ikere òkè n’ọṅụ nke mbilite n’ọnwụ ya. Ọzọkwa, unu pụrụ isoro Pọl onyeozi mee njem ma hụ nguzobe nke ọgbakọ dị iche iche ka Iso Ụzọ Kraịst na-agbasa. E mesịa, n’akwụkwọ Mkpughe ezinụlọ gị pụrụ inwe mmasị n’ọhụụ dị ebube nke Jọn onyeozi banyere ọdịnihu, gụnyere Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst.
18, 19. Aro dịgasị aṅaa ka e nyere banyere ọgụgụ Bible ezinụlọ?
18 Ọ bụrụ na unu na-agụpụta Bible dị ka otu ezinụlọ, gụọ ya n’ụzọ doro anya na n’ịnụ ọkụ n’obi. Mgbe unu na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ, otu onye òtù ezinụlọ—ikekwe nna—pụrụ ịgụ akụkọ ahụ nile. Ndị ọzọ n’ime unu pụrụ iwere ọrụ nke ndị a kpọrọ aha n’ime Bible, jiri mmetụta kwesịrị ekwesị na-agụ akụkụ nke gị.
19 Ka unu na-ekere òkè n’ọgụgụ Bible dị ka otu ezinụlọ, ikike ịgụ ihe unu pụrụ ịkawanye mma. Ma eleghị anya, ihe ọmụma unu nwere banyere Chineke ga-amụba, nke a kwesịkwara ịdọta unu nso karị n’ebe ọ nọ. Esaf bụrụ abụ, sị: “Ma, mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma: edowo m ebe mgbaba m n’Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, ka m wee kọọ akụkọ banyere ije ozi Gị nile.” (Abụ Ọma 73:28) Nke a ga-enyere ezinụlọ gị aka ịdị ka Mosis, bụ́ onye “nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya,” ya bụ, Jehova Chineke.—Ndị Hibru 11:27.
Ịgụ Ihe na Ozi Ndị Kraịst
20, 21. Olee otú e si jikọta ọrụ ime nkwusa anyị na ikike ịgụ ihe?
20 Ọchịchọ anyị ife “Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya” kwesịrị ịkpali anyị ịrụ ọrụ iji bụrụ ndị na-agụ ihe nke ọma. Ikike ịgụ ihe nke ọma na-enyere anyị aka ịgba àmà site n’Okwu Chineke. N’ezie ọ na-enyere anyị aka ịnọgide na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ nke Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ịrụ mgbe ọ sịrị: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile ka ha hà bụ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Ịgba àmà bụ ọrụ bụ isi nke ndị Jehova, ikike ịgụ ihe na-enyekwara anyị aka ịrụzu ya.
21 A chọrọ mgbalị iji bụrụ onye na-agụ ihe nke ọma na onye nkụzi dị nkà nke Okwu Chineke. (Ndị Efesọs 6:17) Ya mere, ‘na-anụ ọkụ n’obi iche onwe gị n’ihu mmadụ dị ka onye Chineke nwapụtaworo, na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.’ (2 Timoti 2:15) Mụbaa ihe ọmụma gị nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ na ikike gị dị ka Onyeàmà Jehova site n’imikpu onwe gị n’ịgụ ihe.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Olee otú obi ụtọ si adabere n’ịgụ Okwu Chineke?
◻ Gịnị mere ị ga-eji atụgharị uche n’ihe ị gụtara na Bible?
◻ Gịnị mere a ga-eji jiri njikọta na iji anya nke uche mee ihe mgbe a na-agụ Akwụkwọ Nsọ?
◻ Olee ihe ụfọdụ a ga-amụta site n’ọgụgụ Bible?
◻ N’ihi gịnị ka a ga-eji na-agụpụta Bible dị ka otu ezinụlọ, njikọ dịkwa aṅaa dị n’agbata ịgụ ihe na ozi ndị Kraịst?
-
-
Gụọ Okwu Chineke Ma Jeere Ya Ozi n’EziokwuỤlọ Nche—1996 | Mee 15
-
-
Gụọ Okwu Chineke Ma Jeere Ya Ozi n’Eziokwu
“Zi m ụzọ Gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu Gị.”—ABỤ ỌMA 86:11.
1. N’ụzọ bụ isi, gịnị ka mbipụta mbụ nke magazin a kwuru banyere eziokwu?
JEHOVA na-ezipụta ìhè na eziokwu. (Abụ Ọma 43:3) Ọ na-enyekwa anyị ikike nke ịgụ Okwu ya, bụ́ Bible, na ịmụta eziokwu. Mbipụta mbụ nke akwụkwọ a—July 1879 (Bekee)—kwuru, sị: “Eziokwu, dị ka okooko osisi nta dị ala nke dị n’ọzara nke ndụ, bụ nke uto na-ama pokopoko nke ahịhịa nke okwu ụgha gbara gburugburu ma fọ nke nta ka ha kpagbuo. Ọ bụrụ na ị ga-achọta ya ị ghaghị ịnọgide na-achọgharị ya. Ọ bụrụ na ị ga-ahụ ịma mma ya ị ghaghị inuchapụ n’akụkụ ahịhịa nile nke okwu ụgha na ogwu nile nke ịkpọ ekwo nkụ. Ọ bụrụ na ị ga-enweta ya ị ghaghị ihulata ala iji nweta ya. Ekwela ka otu okooko osisi nke eziokwu ju gị afọ. A sị na otu zuru a garaghị enweworị ndị ọzọ. Nọgide na-achịkọba, nọgide na-achọ.” Ịgụ na ịmụ Okwu Chineke na-eme ka anyị nwee ike inweta ezi ihe ọmụma ma jee ije n’eziokwu ya.—Abụ Ọma 86:11.
-