Rụọ Ọrụ Iji Chebe Ezinụlọ Gị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ Chineke
“Gị onwe gị, Jehova, ga-edebe ha, ị ga-echezi ha ka ha pụọ n’aka ọgbọ a ruo mgbe ebighị ebi.”—ABỤ ỌMA 12:7.
1, 2. (a) Olee ihe bụ ọnọdụ nke ezinụlọ ụfọdụ n’okpuru nrụgide ndị oge ikpeazụ a? (b) Olee ụzọ ezinụlọ ndị Kraịst pụrụ isi chọọ nlanarị?
“TAA obi m jupụtara n’ọṅụ!” ka otu onye Kraịst bụ́ okenye aha ya bụ John kwupụtara. Gịnị kpatara obi ụtọ nke a? “E mere nwa m nwoke dị afọ 14 na nwa m nwanyị dị afọ 12 baptism,” ka ọ kọwara. Ma ọ bụghị nanị nke ahụ na-enye ya ọṅụ. “Nwa m nwoke dị afọ 17 na nwa m nwanyị dị afọ 16 anọwo na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka kemgbe afọ gara aga,” ka o kwukwara.
2 Ọtụtụ ezinụlọ n’etiti anyị n’otu aka ahụ na-enweta ezi ihe ndị a rụpụtara ka ha na-etinye ụkpụrụ nile nke Bible n’ọrụ. Otú ọ dị, ụfọdụ na-enwe nsogbu. “Anyị nwere ụmụ ise,” ka otu di na nwunye bụ́ ndị Kraịst dere, “ọ bụkwa ihe nọgidere na-esi ike karị ịzụ ha. Otu nwa anyị efunahuworị anyị baa n’usoro ihe ochie nke a. Ụmụ anyị ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu yiri ka hà bụ ebe bụ isi Setan na-awakwasị ugbu a.” E nwekwara ndị di na nwunye na-enwe oké ihe isi ike alụmdi na nwunye, mgbe ụfọdụ na-akpata nkewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm. Otú o sina dị, ezinụlọ ndị na-azụlite àgwà nile nke ndị Kraịst pụrụ ịlanarị “mkpagbu ukwu” ahụ, bụrụkwa ndị e chebere baa n’ime ụwa ọhụrụ Chineke nke na-abịanụ. (Matiu 24:21; 2 Pita 3:13) Ya mere, gịnị ka ị pụrụ ime iji jide nchebe nke ezinụlọ gị n’aka?
Imeziwanye Nkwurịta Okwu
3, 4. (a) Ruo ókè hà aṅaa ka nkwurịta okwu ná ndụ ezinụlọ bụ ihe dị mkpa, n’ihi gịnịkwa ka nsogbu ndị dị na ya ji ebilite mgbe mgbe? (b) N’ihi gịnị ka ndị bụ di kwesịrị iji mee mgbalị ịbụ ndị na-aṅa ntị nke ọma?
3 Ezi nkwurịta okwu bụ ihe ji ume nke ahụ ike ezinụlọ; mgbe ọ na-adịghị, nrụgide na ihe isi ike na-amụba. “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị,” ka Ilu 15:22 na-asị. N’ụzọ na-akpali mmasị, otu onye na-enye ndụmọdụ n’alụmdi na nwunye na-akọ, sị: “Mkpesa m kasị na-anụ site n’ọnụ ndị nwunye m na-enye ndụmọdụ bụ: ‘Ọ gaghị ekwunyere m okwu,’ na ‘Ọ naghị aṅa m ntị.’ Mgbe mụ na ndị di ha na-ekwukwa banyere mkpesa nke a, ha onwe ha adịghịkwa aṅa m ntị.”
4 Gịnị na-akpata enweghị nkwurịta okwu? Otu ihe bụ na ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị dị iche, ọtụtụ mgbe ha na-enwekwa ọdịiche pụtara ìhè n’ụdị nkwurịta okwu. Otu isiokwu rịbara ama na onye bụ di “yiri ka ọ̀ na-ekwu ihe kpọmkwem ma na-ekwu ihe mere eme” ná nkwurịta okwu ya, ebe “ihe [onye bụ nwunye] chọrọ karịa ihe ọ bụla ọzọ bụ onye ga-eji ọmịiko ṅaa ya ntị.” Ọ bụrụ na nke a bụ nsogbu n’alụmdi na nwunye gị, rụọ ọrụ iji dozie ya. Ọ pụrụ ịdị onye Kraịst bụ di mkpa ịrụsi ọrụ ike iji bụrụ onye na-aṅa ntị nke ọma karị. “Ka mmadụ ọ bụla,” ka Jemes kwuru, “bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu.” (Jemes 1:19) Mụta izere inye ọda, ịdụ ọdụ, ma ọ bụ ikwu ihe a ga-eme mgbe nwunye gị chọrọ nnọọ “obi ọmịiko.” (1 Pita 3:8) “Onye na-egbochi okwu ọnụ ya maara ihe ọmụma,” ka Ilu 17:27 na-asị.
5. Olee ụzọ ụfọdụ ndị bụ di pụrụ isi meziwanye ihe n’ikwupụta ihe bụ echiche na mmetụta ha?
5 N’aka nke ọzọ, e nwere “mgbe ikwu okwu,” ọ pụkwara ịdị mkpa ka ị mụtakwuo ikwupụta ihe bụ echiche na mmetụta gị. (Eklisiastis 3:7) Dị ka ihe atụ, ị̀ na-aja nwunye gị mma ọtụtụ mgbe maka ihe ndị ọ rụzuru? (Ilu 31:28) Ị̀ na-egosi na i nwere ekele maka ịrụsi ọrụ ike ya n’inye gị nkwado nakwa n’ilekọta ụlọ? (Tụlee Ndị Kọlọsi 3:15.) Ma ọ bụ ma eleghị anya ọ dị mkpa ka ị mụtakwuo ikwu ‘okwu ịhụnanya.’ (Abụ Nke Abụ 1:2) Ime otú ahụ pụrụ ịdị gị arọ n’ọnụ ná mmalite, ma ọ pụrụ inye aka nke ukwuu n’ime ka nwunye gị nwee mmetụta nke ịhụnanya i nwere n’ebe ọ nọ.
6. Gịnị ka ndị bụ nwunye pụrụ ime iji meziwanye nkwurịta okwu ezinụlọ?
6 Gịnị banyere ndị Kraịst bụ nwunye? A sịrị na otu onye bụ nwunye kwuru na di ya maara na ya nwere mmasị n’ebe ọ nọ, ya mere ọ dịghị mkpa ya ije kwuwe ya n’ihu ya. Otú ọ dị, ụmụ nwoke na-emekwa nke ọma ma e nwee okwu ekele, okwu ịja mma, na okwu otuto. (Ilu 12:8) Ọ̀ dị mkpa ka ị na-ekwupụtakwu nke a karị? N’aka nke ọzọ, ma eleghị anya ọ dị mkpa ka i lekwasịkwuo anya n’otú i si aṅa ntị. Ọ bụrụ na di gị na-achọpụta na ọ na-esiri ya ike ịkọ ihe ndị bụ nsogbu ya, egwu ya, ma ọ bụ nchegbu ya n’ihu gị, ị̀ mụtawo ụzọ isi jụpụta ya ihe n’ọnụ, n’obi ọma na n’ụzọ akọ?
7. Gịnị pụrụ ime ka esemokwu alụmdi na nwunye bilite, oleekwa ụzọ a pụrụ isi gbochie ha?
7 Otú ọ dị, ọbụna di na nwunye na-emekarị nke ọma pụrụ mgbe ụfọdụ inwe ndakpọ ná nkwurịta okwu. Mmetụta uche pụrụ ịbịada ezi uche, ma ọ bụ mkparịta ụka dị nwayọọ pụrụ ịgbanwe ngwa ngwa gaa n’arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ. (Ilu 15:1) “Anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe”; otú ọ dị, o siri ike okwu di na nwunye kwuru n’iwe ịkpata ndakpọ nke alụmdi na nwunye. (Jemes 3:2) Ma “iti mkpu na nkwulu” ekwesịghị ekwesị, ọ na-ebibikwa mmekọrịta ọ bụla. (Ndị Efesọs 4:31) Dị ngwa ikpe udo mgbe e kwurịtaworo okwu ilu. (Matiu 5:23, 24) Ọtụtụ mgbe a pụrụ igbochi esemokwu ná mmalite ma ọ bụrụ na unu abụọ etinye okwu Pọl ná Ndị Efesọs 4:26 n’ọrụ: “Ekwela ka anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” Ee, kwupụtanụ nsogbu unu mgbe ha ka dị ntakịrị ma bụrụ nke a pụrụ idozi; echela ruo mgbe ị na-agaghị enwe ike ịchịkwa mmetụta uche gị. Iji minit ole na ole kwa ụbọchị na-atụle ihe ndị bụ nchegbu unu pụrụ inye aka nke ukwuu imeziwanye nkwurịta okwu ma gbochie inwe nghọtahie.
‘Ịdụ Ọdụ nke Jehova’
8. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ntorobịa pụrụ iji si n’eziokwu kpafuo?
8 O yiri ka ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ na-enwe afọ ojuju ịhapụ ka ụmụ ha na-eto n’enweghị ezigbo ntụziaka. Ụmụ ha na-aga nzukọ nile ma na-ekere òkè n’ozi ubi, ma ọtụtụ mgbe ha ewulitebeghị mmekọrịta nke onwe ha n’ebe Chineke nọ. Mgbe oge na-aga, “agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya” pụrụ iduga ọtụtụ ndị ntorobịa dị otú ahụ ịpụ n’eziokwu. (1 Jọn 2:16) Lee ihe mwute ọ ga-abụ ndị mụrụ ụmụ ịlanarị Amagedọn ma n’ihi nleghara anya ha n’oge gara aga hapụ ụmụ ha n’azụ dị ka ndị agha riri!
9, 10. (a) Gịnị ka ịzụlite ụmụ “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị” gụnyere? (b) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ikwe ka ụmụ nwere onwe ha ikwupụta ihe bụ mmetụta ha?
9 N’ihi ya, Pọl dere, sị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Iji mee otú ahụ, ị ghaghị ịbụ onye maara ụkpụrụ nile nke Jehova nke ọma n’onwe gị. I kwesịrị isetịpụ ezi ihe nlereanya mgbe a bịara n’ihe ndị dị ka ihe ndị ị na-ahọrọ ná ntụrụndụ, ọmụmụ ihe onwe onye, ịbịa nzukọ, na ije ozi ubi. Ihe Pọl kwuru pụtakwara na onye mụrụ ụmụ aghaghị (1) ịbụ onye ji nghọta na-ekiri ụmụ ya na ọ (2) na-esokwa ha enwe ezi nkwurịta okwu. Nanị site n’ime nke ahụ ka ị pụrụ ịmara ebe “ịdị ọdụ” dị ha mkpa.
10 Ọ bụ ihe a na-ahụ ná ndụ nye ndị nọ n’oge uto ime mgbalị maka inweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe. Otú ọ dị, ị ghaghị ịmụrụ anya ịchọpụta ihe àmà ndị doro anya nke mmetụta ụwa n’okwu ọnụ ha, echiche ha, uwe na ejiji ha, na ndị ha na-ahọrọ dị ka ndị enyi. Nna maara ihe kwuru dị ka e dekọrọ n’Ilu 23:26, sị: “Nwa m, nye m obi gị.” Ahụ ọ̀ na-eru ụmụ gị ala ịkọrọ gị ihe bụ uche na mmetụta ha? Mgbe ụmụ na-adịghị atụ egwu ịbụ ndị a kọchara ozugbo, ha pụrụ inwekwu ọchịchọ ikpughe ụzọ ha si eche echiche banyere ihe ndị dị ka ihe ndị a na-eme ma a gbasaa akwụkwọ, ime mkpapụ, agụmakwụkwọ dị elu, ma ọ bụ eziokwu Bible n’onwe ya.
11, 12. (a) Olee ụzọ a pụrụ isi jiri oge nri mee ihe iji kwalite nkwurịta okwu ezinụlọ? (b) Gịnị ka a pụrụ ịrụpụta site ná mgbalị nke onye mụrụ ụmụ nọgidere na-etinye n’ịkwalite nkwurịta okwu n’ebe ụmụ ya nọ?
11 N’ihe ka ọtụtụ ala, ọ bụwo ọdịnala ezinụlọ dị iche iche irikọ ihe ọnụ. Otú a, oge nri abalị pụrụ iwepụta ohere dị mma maka ndị nile nọ n’ezinụlọ ikere òkè ná nkwurịta okwu na-ewuli elu. Ọtụtụ mgbe oge ezinụlọ ji eri nri na-abụkarị nke e mebiri site na TV na ndọpụ uche ndị ọzọ. Otú ọ dị, ruo ọtụtụ hour n’esepụghị aka, ụmụ gị abụwo ndị nọ dị ka ndị e ji eji n’ụlọ akwụkwọ, bụrụkwa ndị e kpughere nye echiche ụwa. Oge nri bụ oge dị mma isoro ụmụ gị kwurịta okwu. “Anyị na-eji oge nri ekwu banyere ihe ndị mere n’ụbọchị,” ka otu onye bụ nne kwuru. Ma, oge nri ekwesịghị ịbụ oge nnọkọ ịdọ aka ná ntị na-emenye ihere ma ọ bụ oge ịjụgharị mmadụ ọnụ. Mee ka oge ahụ bụrụ nke ntụsara ahụ na nke dị ụtọ!
12 Ime ka ụmụ na-agwa gị obi ha bụ ihe ịma aka, ọ pụrụ ịchọ inwe ndidi ruo ogologo oge. Otú ọ dị, ka oge na-aga, ị pụrụ ịhụ ihe ndị na-enye obi ụtọ ọ rụpụtara. “Nwa anyị nwoke dị afọ 14 abụwo onye dara mbà n’obi na onye na-anọrọ onwe ya,” ka otu nne nke ahụ nyere nsogbu n’obi chetara. “Site n’ekpere anyị na nnọgidesi ike, ọ malitewo ikwupụta obi ya!”
Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ nke Na-ewuli Elu
13. N’ihi gịnị ka inye ụmụaka ọzụzụ n’oge ji dị oké mkpa, oleekwa ụzọ a pụrụ isi rụzuo ya?
13 “Ịdụ ọdụ” gụnyekwara inye ntụziaka dị n’Okwu Chineke. Dị ka ọ dị n’ọnọdụ Timoti, inye ọzụzụ dị otú ahụ kwesịrị ịmalite ‘site na nwa ọhụrụ.’ (2 Timoti 3:15) Ọzụzụ a malitere n’oge na-eme ka ụmụ dịrị ike maka ule nke okwukwe ndị pụrụ ịbịa n’afọ agụmakwụkwọ ha—ememe ncheta ọmụmụ, ememe ịhụ mba n’anya, ma ọ bụ ezumike okpukpe. Ọ bụrụ na e meghị nkwadebe maka ule ndị dị otú ahụ, a pụrụ ibibi okwukwe nke nwatakịrị. Ya mere jiri ngwá ọrụ ndị Watch Tower Society mepụtaworo maka obere ụmụaka mee ihe bara uru, dị ka akwụkwọ Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti na Akwukwọm nke Akukọ Bible.a
14. Olee ụzọ a pụrụ isi mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ bụrụ nke a na-emechi anya, gịnịkwa ka i meworo iji na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ chiri anya?
14 Ebe ọzọ a ga-elekwasị anya bụ ọmụmụ ihe ezinụlọ, nke pụrụ ịghọ n’ụzọ dị mfe ihe a na-adịghị emechi anya ma ọ bụ ghọọ ihe omume na-agwụ ike, nke e ji emezu iwu, nke na-etinye ma ndị mụrụ ụmụ ma ụmụ ha n’ule. Olee ụzọ ị pụrụ isi meziwanye ihe? Na nke mbụ, ị ghaghị ‘ịzụchapụta oge’ maka ọmụmụ ihe ahụ, ghara ikwe ka ọ bụrụ nke e mebiri site n’ihe nkiri TV ma ọ bụ ndọpụ uche ndị ọzọ. (Ndị Efesọs 5:15-17) “O siiri anyị ike ime ka ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị bụrụ nke chiri anya,” ka otu onye isi ezinụlọ kwupụtara. “Anyị nwalere oge dị iche iche ruo mgbe anyị mesịrị chọta oge dịịrị anyị irè nke anyị ga-eji na-eme ya n’ime mgbede. Ugbu a ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị bụ nke a na-emechi anya.”
15. Olee ụzọ ị pụrụ isi mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ gị kwekọọ ná mkpa nke ezinụlọ gị?
15 Ọzọ, tụlee ihe bụ kpọmkwem mkpa nke ezinụlọ gị. Ọ na-atọ ọtụtụ ezinụlọ ụtọ ịkwadebekọ ọmụmụ ihe Ụlọ Nche ha kwa izu. Otú ọ dị, site n’oge ruo n’oge, ezinụlọ gị pụrụ inwe isiokwu pụtara ìhè ndị ọ dị mkpa ka a tụlee, gụnyere nsogbu ndị a na-eche ihu n’ụlọ akwụkwọ. Akwụkwọ ahụ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work na isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche na Teta! pụrụ igbo mkpa nke a. “Ọ bụrụ na anyị ahọrọ ịtụle otu n’ime àgwà nke ụmụ anyị ndị nwoke, bụ́ nke ọ dị mkpa ka a gbazie,” ka otu onye bụ nna kwuru, “anyị na-elekwasị anya kpọmkwem n’isiakwụkwọ dị n’akwụkwọ Young People Ask nke tụlere ya.” Nwunye ya kwukwara, sị: “Anyị gbalịrị inwe echiche ziri ezi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe anyị mere atụmatụ ya n’ọmụmụ ihe, o wee dị mkpa na a ga-atụle ihe ọzọ, mgbe ahụ anyị na-eme mgbanwe dị ka mkpa e nwere si dị.”
16. (a) Olee ụzọ ị pụrụ isi jide n’aka na ụmụ gị ghọtara ihe ha na-amụ? (b) Gịnị ka e kwesịrị izerekarị n’iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ?
16 Olee ụzọ ị pụrụ isi jide n’aka na ụmụ gị ghọtara n’ezie ihe ha na-amụ? Onye Ozizi ahụ Kasị Mma, bụ́ Jisọs, jụrụ ajụjụ ndị e ji amata ihe bụ uche mmadụ, dị ka, “Gịnị ka i chere?” (Matiu 17:25) Site n’ime otu ihe ahụ, gbalịa ịchọpụta ihe ụmụ gị chere n’ezie. Gbaa nwa nke ọ bụla ume ịza ajụjụ n’okwu nke ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ihe ha ji obi eziokwu kwupụta ewee gị oké iwe ma ọ bụ juo gị anya nke ukwuu, ha pụrụ inwe uche abụọ banyere ịgwa gị obi ha mgbe ọzọ. Ya mere, jide onwe gị. Zere ịgbanwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ahụ ịghọ oge maka inye ahụhụ. O kwesịrị ịdị ụtọ, na-ewuli elu. “Ọ bụrụ na m achọpụta na otu n’ime ụmụ m nwere nsogbu,” ka otu onye bụ nna kwuru, “m ga-eleba ya anya n’oge ọzọ.” “Mgbe e lebaara nwa ahụ anya iche,” ka otu onye bụ nne kwukwara, “a dịghị emenye nwa ahụ ihere n’ihu otú ahụ, ọ na-adịkwa njikere ikwupụta onwe ya karịa mgbe a baara ya mba n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ.”
17. Gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ na-adọrọ mmasị, gịnịkwa dịworo irè nke ọma n’ezinụlọ gị?
17 Ime ka ụmụ na-ekere òkè n’ọmụmụ ihe ezinụlọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka, karịsịa mgbe ị na-emeso ụmụ nọ n’afọ ndụ dị iche iche. Ụmụ ndị dị nta karị pụrụ iyi ndị ahụ na-erughị ala, ndị na-eme aghara, ma ọ bụ na-etinye uche n’ihe ruo oge dị mkpirikpi. Gịnị ka ị pụrụ ime? Gbalịa ime ka ọnọdụ ọmụmụ ihe ahụ bụrụ nke ntụsara ahụ. Ọ bụrụ na ụmụ gị na-etinye uche n’ihe ruo oge dị mkpirikpi, nwalee nnọkọ ndị dị mkpirikpi karị ma bụrụ nke a na-eme mgbe mgbe karị. Ọ na-enyekwa aka ma ị bụrụ onye na-anụ ọkụ n’obi. “Onye bụ onye isi, ya were obi na-anụ ọkụ na-abụ isi.” (Ndị Rom 12:8) Mee ka onye ọ bụla na-ekere òkè. Ụmụaka ndị dị nta karị pụrụ inwe ike ikwu okwu n’ihe osise ndị e nwere ma ọ bụ zaa ajụjụ ndị dị mfe. A pụrụ ịgwa ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu ka ha mekwuo nnyocha ma ọ bụ chọta ụzọ dị irè a pụrụ isi tinye isiokwu ahụ a na-atụle n’ọrụ.
18. Olee ụzọ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi kụnye Okwu Chineke n’obi n’oge ọ bụla, gịnịkwa ka ọ na-arụpụta?
18 Otú ọ dị, ekwela ka ntụziaka ime mmụọ bụrụ nanị otu hour kwa izu. Kụnye Okwu Chineke n’obi ụmụ gị n’oge ọ bụla. (Deuterọnọmi 6:7) Wepụta oge ịṅa ha ntị. Gbaa ha ume ma kasie ha obi mgbe ọ dị mkpa. (Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 2:11.) Na-enwe ọmịiko na obi ebere. (Abụ Ọma 103:13; Malakaị 3:17) Site n’ime otú ahụ, ị ‘ga-enweta obi ụtọ’ n’ebe ụmụ gị nọ ma kwadoo nchebe ha baa n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.—Ilu 29:17.
“Mgbe Ịchị Ọchị”
19, 20. (a) Òkè dị aṅaa ka ntụrụndụ na-ekere ná ndụ ezinụlọ? (b) Olee ụzọ ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi mee ndokwa inwe ntụrụndụ maka ezinụlọ ha?
19 E nwere “mgbe ịchị ọchị . . . , mgbe ite egwú.” (Eklisiastis 3:4) A pụkwara ịsụgharị okwu Hibru ahụ bụ maka “ịchị ọchị” site n’okwu ndị dị ka “ime ememe,” “igwuri egwu,” “ime ọchị,” ma ọ bụ ọbụna “oge inwe ọṅụ.” (2 Samuel 6:21; Job 41:5; Ndị Ikpe 16:25; Ọpụpụ 32:6; Jenesis 26:8) Egwuregwu pụrụ ịrụpụta ihe bara uru, ọ bụkwa ihe dị mkpa nye ụmụaka na ndị ntorobịa. N’oge Bible ndị mụrụ ụmụ mere ndokwa inwe nnọkọ obi ụtọ na ntụrụndụ maka ezinụlọ ha. (Tụlee Luk 15:25.) Ị̀ na-eme otu ihe ahụ?
20 “Anyị na-aga n’ogige mkpapụ nke obodo,” ka otu onye Kraịst bụ di kwuru. “Anyị na-akpọ ụfọdụ n’ime ụmụnna nwoke na-eto eto isonyere anyị, nweekwa egwuregwu bọlụ na ime mkpagharị. Ha na-enwe oge ọṅụ, na-enwekwa mkpakọrịta dị mma.” Otu onye ọzọ bụ nna kwuru, sị: “Anyị na-eme atụmatụ ihe anyị na ụmụ anyị ndị nwoke ga-eme. Anyị na-apụ ije gwuo mmiri, gbaa bọlụ, legharịa anya. Ma anyị na-edebe ntụrụndụ n’ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị. Ana m emesi ike mkpa ọ dị inwe ezi nguzo.” Ntụrụndụ nke dị mma, dị ka nnọkọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụ ije mkpagharị n’ebe a na-edebe ụmụ anụmanụ na n’ebe ndebe ihe mgbe ochie, pụrụ inye aka nke ukwuu igbochi nwatakịrị ịbụ onye a dọọrọ mmasị ya gaa n’ihe ụtọ nile nke ụwa.
21. Olee ụzọ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi gbochie ụmụ ha iche na a na-emegbu ha n’ihi na ha adịghị eme ememe ezumike nile nke ụwa?
21 Ọ dịkwa mkpa na ụmụ gị adịghị eche na a na-emegbu ha n’ihi na ha adịghị eme ememe ncheta ọmụmụ ma ọ bụ ezumike ndị na-ekwesịghịrị ndị Kraịst. Site ná nhazi ụfọdụ nke i mere, ha pụrụ ilepụ anya inwe ọtụtụ oge ọṅụ n’ime afọ. Ee, ezi onye mụrụ ụmụ ekwesịghị iji oge ezumike mere ihe ngọpụ maka igosipụta ịhụnanya ya n’ụzọ ihe onwunwe. Dị ka Nna ya nke eluigwe, ọ ‘maara inye ụmụ ya ezi onyinye’—mgbe ọ bụla o ji dapụta.—Matiu 7:11.
Inwetara Ezinụlọ Gị Ọdịnihu Ebighị Ebi
22, 23. (a) Ka mkpagbu ukwu ahụ na-abịaru nso, banyere gịnị ka ezinụlọ ndị na-atụ egwu Chineke pụrụ ijide n’aka? (b) Gịnị ka ezinụlọ nile pụrụ ime n’ịrụ ọrụ iji nweta nchebe baa n’ime ụwa ọhụrụ Chineke?
22 Onye ọbụ abụ kpere ekpere, sị: “Gị onwe gị, Jehova, ga-edebe ha, ị ga-echezi ha ka ha pụọ n’aka ọgbọ a ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 12:7) Nrụgide sitere n’aka Setan gaje ịmụba n’ezie—karịsịa megide ezinụlọ nile nke Ndịàmà Jehova. Ma, ọ ga-ekwe omume iguzogide mwakwasị nke a na-anọgide na-amụba. Site n’enyemaka Jehova nakwa mkpebi siri ike na ịrụsi ọrụ ike n’akụkụ nke ndị bụ di, nwunye, na ụmụ, ezinụlọ nile—gụnyere ezinụlọ gị—pụrụ inwe olileanya nke ịbụ ndị e chebere ndụ n’oge mkpagbu ukwu ahụ.
23 Ndị bụ di na nwunye, wetanụ udo na ịdị n’otu n’alụmdi na nwunye unu site n’ịrụzu ọrụ ndị Chineke nyere unu. Ndị mụrụ ụmụ, nọgidenụ na-esetịpụ ezi ihe nlereanya nye ụmụ unu, na-azụchapụta oge iji nye ha ọzụzụ na ịdọ aka ná ntị nke dị ha oké mkpa. Na-agwa ha okwu. Na-aṅa ha ntị. Ndụ ha nọ n’ihe ize ndụ! Ụmụ, na-aṅanụ ntị ma na-erube isi nye ndị mụrụ unu. Site n’enyemaka Jehova unu pụrụ inwe ihe ịga nke ọma, nwetakwara onwe unu ọdịnihu ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke nke na-abịanụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E nwekwara tepu ndị a pụrụ igere ege n’asụsụ ụfọdụ.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee ụzọ ndị bụ di na nwunye pụrụ isi meziwanye nkwurịta okwu ha?
◻ Olee ụzọ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi zụlite ụmụ ‘n’ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị’? (Ndị Efesọs 6:4)
◻ Olee ụzọ ụfọdụ a pụrụ isi mee ka ọmụmụ ihe ezinụlọ bụrụ nke na-ewuli elu ma na-adọrọ mmasị?
◻ Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime n’ime ndokwa maka ntụrụndụ na nnọkọ obi ụtọ nke ezinụlọ?
[Igbe dị na peeji nke 16]
Egwú—Ihe Na-enwe Mmetụta Dị Ike
Otu onye na-ede akwụkwọ banyere ịzụ ụmụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na m eguzoro n’ihu ndị na-ege ntị . . . wee na-akwado ịṅụbiga mmanya ókè, iji ọgwụ cocaine, wii wii, ma ọ bụ ọgwụ ndị ọzọ na-emebi uche na-eme ka isi na-acha mmadụ ọkụ, ha ga-ele m anya n’ihe ijuanya. . . . [Ma] ọtụtụ mgbe ndị mụrụ ụmụ na-enye ụmụ ha ego iji zụta rekọd ma ọ bụ kaseti ndị na-akwado ihe ndị ahụ hoo haa.” (Raising Positive Kids in a Negative World, nke Zig Ziglar dere) Dị ka ihe atụ, na United States, okwu mmekọahụ ndị dị n’egwú ọgụgụ na-adị n’egbugbere ọnụ nke ọtụtụ ndị ntorobịa. Ị̀ na-enyere ụmụ gị aka ịkpa ókè n’ụdị egwú ha na-ahọrọ ka ha wee zere ọnyà mmụọ ọjọọ ndị dị otú ahụ?
[Foto dị na peeji nke 15]
Oge nri pụrụ ịbụ oge ndị na-enye ọṅụ nke na-akwalite ịdị n’otu ezinụlọ na nkwurịta okwu