Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 3/1 p. 9-13
  • Ndị A Raara Nye—Ọ̀ Bụ Nye Onye?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị A Raara Nye—Ọ̀ Bụ Nye Onye?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mba Raara Onwe Ya Nye
  • Obi Ekele Na-eduga ná Nraranye
  • Gosipụta Nraranye Gị n’Ihu Ọha
  • Ibi Ndụ Kwekọrọ ná Nraranye Anyị “Kwa Ụbọchị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gịnị Mere i ji Kwesị Ịrara Onwe Gị Nye Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Gịnị Mere I Ji Kwesị Inyefe Chineke Onwe Gị, Meekwa Baptizim?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ị̀ Dịla Njikere Inyefe Jehova Onwe Gị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 3/1 p. 9-13

Ndị A Raara Nye—Ọ̀ Bụ Nye Onye?

“Ihe nile Jehova kwuworo, anyị ga-eme ya, nụkwa.”—ỌPỤPỤ 24:7.

1, 2. (a) Gịnị ka ndị ụfọdụ raara onwe ha nye? (b) Nraranye ọ̀ bụ nanị maka ndị nwere ihe jikọrọ ha na okpukpe?

NA February 1945, a kpọkọtara ndị na-anya ụgbọ elu ndị agha bụ́ Zerofighter nke ngalaba ndị agha Yatabe Flying Corps nke Japan n’otu ụlọ ezumezu. E nyere onye nke ọ bụla mpempe akwụkwọ nke ọ ga-eji dee ma ọ̀ ga-enyefe onwe ya ịbụ onye òtù nke ndị agha na-enye ndụ ha. “Echere m na ọ bụ òkù a kpọrọ m ịchụ onwe m n’àjà n’oge a nke ọgba aghara ala anyị,” ka otu onye agha nọ mgbe ahụ kwuru. “Ịbụ onye a manyere ná mmetụta uche iwepụta onwe m, enyefere m onwe m maka ọrụ ahụ.” A zụrụ ya ịnya ụgbọ elu Ohka (ụgbọ elu rọketi na-egbu onye na-anya ya) ma kụkasịa ya n’ụgbọ agha mmiri ndị iro. Otú ọ dị, agha ahụ biri tupu ya enwee ohere ime nke ahụ wee si otú ahụ nwụọ maka mba ya na onye ọchịchị alaeze ukwu ya. Mgbe e meriri Japan n’agha ahụ, okwukwe o nwere n’onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ bụ nke a kụjasịrị.

2 N’otu oge, ọtụtụ ndị na Japan raara onwe ha nye onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ, bụ́ onye ha kwenyere na ọ bụ chi dị ndụ. N’ala ndị ọzọ, e nwewo ma ka na-enwe ihe ndị ọzọ ndị mmadụ na-efe ofufe. Ọtụtụ nde raara onwe ha nye Meri, Buddha, ma ọ bụ chi ndị ọzọ—bụ́ ndị a na-ejikarị arụsị anọchite anya ha. N’ịbụ ndị ire ụtọ na-emetụ n’ahụ dufuru, ụfọdụ na-awụnye ego ha tara ahụhụ kpata n’ime akpa ndị okwuchukwu TV ná nkwado si n’obi nile nke ya na ofufe hà nhata. Mgbe agha ahụ gasịrị, ndị Japan e mechuworo ihu chọrọ ihe ọhụrụ ọzọ ha pụrụ ịrara ndụ ha nye. Nye ụfọdụ, ọrụ ghọrọ ihe ahụ. N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma ọ bụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ, ọtụtụ na-arara onwe ha nye n’ịkpakọta akụ̀. Ndị na-eto eto na-ehiwe ndụ ha isi ná ndị na-akụ egwú, bụ́ ndị ha na-eṅomi ụzọ ndụ ha. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu taa aghọwo ndị na-efe onwe ha ofufe, na-eme ọchịchọ ndị nke aka ha ihe ha na-arara onwe ha nye. (Ndị Filipaị 3:19; 2 Timoti 3:2) Ma ihe ndị dị otú ahụ ma ọ bụ ụdị ndị ahụ hà kwesịrị ịnata nraranye nke mmadụ e ji obi dum mee?

3. Olee otú ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-arara onwe ha nye siworo ghọọ ihe ndị na-abaghị n’ihe?

3 Mgbe ha chere ihe bụ eziokwu ihu, ndị na-efe arụsị na-enwekarị obi ilu. Ife arụsị ofufe na-arụpụta nkụda mmụọ mgbe ndị ahụ na-efe ofufe ghọtara na arụsị ha nile akarịghị “ọrụ aka mmadụ.” (Abụ Ọma 115:4) Mgbe e kpughere akụkọ ọjọọ metụtara ndị okwuchukwu a ma ama, ndị nwere obi eziokwu na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị e mechuru ihu. Mgbe akụ̀ na ụba “na-esighị ike” dara, ndị ọrụ na-enwe ọrịa uche ka ha na-ahụ onwe ha n’ọnụ ọgụgụ ndị a na-achụ n’ọrụ. Ndakpọ akụ̀ na ụba ndị e nwere n’oge na-adịbeghị anya tiri ndị na-efe Mamọn aka dị egwu. Ụgwọ ndị e ji n’olileanya nke ịkpata ego dị ukwuu ghọrọ ibu arọ, na-enwe atụmanya dị nta nke ịkwụghachi ha. (Matiu 6:24, NW, okwu dị n’ala ala peji) Mgbe ndị na-akụ egwú rock na ndị ọzọ na-eme ihe ntụrụndụ a na-efe ofufe nwụrụ ma ọ bụ pụọ n’anya, a na-agbahapụ ndị na-efe ha ofufe. Ndị gbasowokwara ụzọ nke imeju ọchịchọ onwe onye na-aghọrọkarị ihe dị ilu dị ka mkpụrụ.—Ndị Galetia 6:7.

4. Gịnị na-akpali ndị mmadụ ịrara ndụ ha nye ihe ndị na-abaghị n’ihe?

4 Gịnị na-akpali ndị mmadụ ịrara onwe ha nye ụdị ihe ndị ahụ na-abaghị n’ihe? Ruo n’ókè dị ukwuu, ọ bụ mmụọ nke ụwa nọ n’okpuru Setan bụ́ Ekwensu. (Ndị Efesọs 2:2, 3) A na-ahụ mmetụta nke mmụọ nke a n’ụzọ dị iche iche. Mmadụ pụrụ ịbụ onye ọdịnala ezinụlọ nke ndị nna nna ya nyefere na-achịkwa. Agụmakwụkwọ na nzụlite pụrụ imetụta echiche mmadụ n’ụzọ siri ike. Ọnọdụ dị n’ebe a na-arụ ọrụ pụrụ inuga “ndị dike n’ọrụ” ịbụ ndị na-arụbiga ọrụ ókè nke pụrụ ịdị ize ndụ. Àgwà ịhụ ihe onwunwe n’anya nke ụwa na-akpasu ọchịchọ nke inwekwu ihe. E merụwo obi nke ọtụtụ ndị, na-akpali ha ịrara onwe ha nye ọchịchọ ọdịmma onwe ha nanị. Ha adịghị enyocha ma ihe nchuso ndị a hà kwesịrị ụdị nraranye ahụ.

Mba Raara Onwe Ya Nye

5. Nraranye dị aṅaa nye Jehova ka e mere ihe karịrị 3,500 afọ gara aga?

5 Ihe karịrị 3,500 afọ gara aga, otu mba nke ndị mmadụ hụrụ ihe kwesịrị nnọọ nraranye nke ukwuu. Ha raara onwe ha nye Chineke bụ́ ọkaaka, bụ́ Jehova. Dị ka otu ìgwè, mba Israel kwupụtara nrara ya nye Chineke n’ọzara Saịnaị.

6. Gịnị ka aha Chineke gaje ịpụtara ụmụ Israel?

6 Gịnị kpaliri ụmụ Israel ime omume n’ụzọ dị otú a? Mgbe ha nọ n’ohu n’Ijipt, Jehova nyere Mosis ọrụ iduga ha ná nnwere onwe. Mosis jụrụ otú o kwesịrị isi kọwaa Chineke zitere ya, Chineke kpughekwara onwe ya dị ka “Abụ m ihe m bụ.” Ọ gwara Mosis ka ọ gwa ụmụ Israel, sị: “Abụ m ezitewo m n’ebe unu nọ.” (Ọpụpụ 3:13, 14) Okwu a gosiri na Jehova na-aghọ ihe ọ bụla dị mkpa iji rụzuo nzube ya nile. Ọ ga-ekpughe onwe ya dị ka Onye Mmezu nke nkwa ya nile n’ụzọ nna nna ụmụ Israel na-amatụbeghị mbụ.—Ọpụpụ 6:2, 3.

7, 8. Ihe àmà ndị dị aṅaa ka ụmụ Israel nwere na Jehova bụ Chineke kwesịrị nraranye ha?

7 Ụmụ Israel hụrụ mkpagbu nke ala Ijipt na ndị ya site n’Ihe Otiti Iri ahụ. (Abụ Ọma 78:44-51) Mgbe ahụ, ikekwe ihe karịrị nde mmadụ atọ n’ime ha, tinyere ndị inyom na ụmụaka, kwakọọrọ ngwongwo ha ma pụọ n’ala Goshen n’otu abalị, nke bụ ihe dị ịrịba ama n’onwe ya. (Ọpụpụ 12:37, 38) E mesịa, n’Osimiri Uhie, Jehova kpughere onwe ya dị ka “onye agha” mgbe ọ zọpụtara ndị ya site n’aka usuu ndị agha Fero site n’ikewa osimiri ahụ iji mee ka ụmụ Israel gafee na mgbe nke ahụ gasịrị site n’ime ka ọ bịaghachi iji rie ndị Ijipt na-achụso ha. Dị ka ihe si na ya pụta, “Israel wee hụ aka ukwu nke Jehova ji megide ndị Ijipt, ndị Israel wee tụọ egwu Jehova, kwere na Jehova.”—Ọpụpụ 14:31; 15:3; Abụ Ọma 136:10-15.

8 Dị ka à ga-asị na ha ka nọ n’enweghị ihe àmà maka ihe aha Chineke pụtara, ụmụ Israel tamuru ntamu megide Jehova na onye nnọchiteanya ya bụ́ Mosis banyere ụkọ nke ihe oriri na mmiri. Jehova zitere nnụnụ quail, zoo manna dị ka mmiri, ma mee ka mmiri si n’oké nkume gbapụta na Meriba. (Ọpụpụ 16:2-5, 12-15, 31; 17:2-7) Jehova zọpụtakwara ụmụ Israel site ná mbuso agha ndị Amalek. (Ọpụpụ 17:8-13) O nweghị ụzọ ụmụ Israel pụrụ isi gọnarị ihe Jehova mesịrị gwa Mosis: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie.” (Ọpụpụ 34:6, 7) N’ezie, Jehova nwapụtara onwe ya ịbụ onye kwesịrị ofufe ha.

9. N’ihi gịnị ka Jehova ji nye ụmụ Israel ohere ikwupụta nraranye ha ijere ya ozi, oleekwa otú ha si zaghachi?

9 Ọ bụ ezie na o ruuru Jehova inwe ụmụ Israel dị ka nke ya n’ihi na ọ gbapụtawo ha site n’Ijipt, dị ka Chineke obi ọma na ebere, o nyere ha ohere n’afọ ofufo ikwupụta ọchịchọ ha ijere ya ozi. (Deuterọnọmi 7:7, 8; 30:15-20) O wepụtakwara ihe ndị dị mkpa a ga-emezu maka ọgbụgba ndụ ahụ dị n’etiti ya na ụmụ Israel. (Ọpụpụ 19:3-8; 20:1–23:33) Mgbe Mosis kọrọ ihe ndị a dị mkpa a ga-emezu, ụmụ Israel kwupụtara, sị: “Ihe nile Jehova kwuworo, anyị ga-eme ya, nụkwa.” (Ọpụpụ 24:3-7) Site n’ọchịchọ obi ha, ha ghọrọ mba nke raara onwe ya nye Eze Onyenwe anyị bụ́ Jehova.

Obi Ekele Na-eduga ná Nraranye

10. Na gịnị ka nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova kwesịrị ịdabere?

10 Jehova, bụ́ Onye Okike, nọgidere na-abụ onye kwesịrị nraranye anyị ji obi dum mee. (Malakaị 3:6; Matiu 22:37; Mkpughe 4:11) Otú ọ dị, nraranye anyị ekwesịghị ịdabere n’ikwenyere ihe ọ bụla, ná mmetụta uche ndị na-apụ ngwa ngwa, ma ọ bụ mmanye sitere n’aka ndị ọzọ—ọbụna nne na nna. Ọ ghaghị ịdabere n’ezi ihe ọmụma nke eziokwu banyere Jehova na obi ekele maka ihe Jehova mewooro anyị. (Ndị Rom 10:2; Ndị Kọlọsi 1:9, 10; 1 Timoti 2:4) Dị nnọọ ka Jehova nyere ụmụ Israel ohere n’afọ ofufo ikwupụta nraranye ha, otú ahụ ka ọ na-enye anyị ohere n’afọ ofufo ịrara onwe anyị nye na igosipụta nraranye ahụ n’ihu ọha.—1 Pita 3:21.

11. Gịnị ka ọmụmụ Bible anyị kpugheworo banyere Jehova?

11 Site n’ọmụmụ Bible, anyị na-amara Chineke dị ka onye. Okwu ya na-enyere anyị aka ịghọta àgwà ya nile dị ka a na-egosipụta ha n’okike. (Abụ Ọma 19:1-4) Anyị pụrụ ịhụ site n’Okwu ya na ọ bụghị Atọ n’Ime Otu dị omimi onye a na-apụghị ịghọta. A dịghị emeri ya n’agha wee si otú ahụ bụrụ ihe na-adịghị mkpa na ọ ga-agọnarị ịbụ Chineke ya. (Ọpụpụ 15:11; 1 Ndị Kọrint 8:5, 6; Mkpughe 11:17, 18) N’ihi na o mezuwo nkwa ya dị iche iche, a na-echetara anyị ihe aha ọma ya, bụ́ Jehova, pụtara. Ọ bụ Onye Nzube Kasị Ukwuu. (Jenesis 2:4, NW, nkọwa ala ala peji; Abụ Ọma 83:18; Aịsaịa 46:9-11) Site n’ịmụ Bible, anyị na-aghọta n’ụzọ doro anya otú o si bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi na onye a pụrụ ịdabere na ya.—Deuterọnọmi 7:9; Abụ Ọma 19:7, 9; 111:7.

12. (a) Gịnị na-adọta anyị nso n’ebe Jehova nọ? (b) Olee otú ahụmahụ ndị mere eme n’ezie nke e dekọrọ na Bible si akpali anyị ịchọ ijere Jehova ozi? (ch) Mmetụta dị aṅaa ka ị na-enwe banyere ijere Jehova ozi?

12 Ihe na-adọta anyị nso n’ebe Jehova nọ karịsịa bụ ọdịdị ịhụnanya ya. Bible na-egosipụta otú o si bụrụ onye na-ahụ n’anya, onye na-agbaghara, na onye dị obi ebere ná mmeso ọ na-emeso ụmụ mmadụ. Chee echiche otú o si gọzie Job mgbe Job jigidesịrị nguzosi ike n’ezi ihe ya n’ikwesị ntụkwasị obi. Ahụmahụ Job na-emesi ike na “Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” (Jemes 5:11; Job 42:12-17) Chee echiche otú Jehova si mesoo Devid mgbe ọ kwasịrị iko ma gbuo ọchụ. Ee, Jehova dị njikere ịgbaghara ọbụna mmehie ndị dị oké njọ mgbe onye mmehie ahụ ji “obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa” bịakwute ya. (Abụ Ọma 51:3-11, 17) Chee echiche banyere ụzọ Jehova si mesoo Sọl nke Tasọs, onye bụbu onye kpebisiri ike ịkpagbu ndị Chineke. Ihe atụ ndị a na-emesi ike obi ebere Chineke na mmesapụ aka ya n’ịdị njikere iji ndị nwere nchegharị eme ihe. (1 Ndị Kọrint 15:9; 1 Timoti 1:15, 16) Pọl chere na ya pụrụ ịtọgbọ ndụ ya n’ijere Chineke nke a na-ahụ n’anya ozi. (Ndị Rom 14:8) Ị̀ na-eche otú ahụ?

13. Ngosipụta nke ịhụnanya dị ukwuu dị aṅaa n’akụkụ Jehova na-akpali ndị obi ha ziri ezi ịrara onwe ha nye ya?

13 Nye ụmụ Israel, Jehova nyere nzọpụta pụọ n’agbụ n’Ijipt, ọ kwadebewokwa ụzọ ọ ga-esi azọpụta anyị site n’agbụ nke mmehie na ọnwụ—àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst. (Jọn 3:16) Pọl sịrị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.” (Ndị Rom 5:8) Ndokwa ịhụnanya nke a na-akpali ndị nwere obi ziri ezi ịrara onwe ha nye Jehova site na Jisọs Kraịst. “N’ihi na ịhụnanya Kraịst na-arụgide anyị; ebe anyị na-atụle nke a, na otu Onye nwụrụ n’ọnọdụ mmadụ nile, ya mere mmadụ nile nwụrụ; Ọ nwụkwara n’ọnọdụ mmadụ nile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịịrị Onye ahụ ndụ, bụ́ Onye nwụrụ n’ọnọdụ ha, e meekwa ka O si n’ọnwụ bilie.”—2 Ndị Kọrint 5:14, 15; Ndị Rom 8:35-39.

14. Nanị ihe ọmụma nke mmeso Jehova ò zuru ezu ịkpali anyị ịrara ndụ anyị nye ya? Kọwaa.

14 Ma, inwe ihe ọmụma nke ọdịdị Jehova na mmeso ọ na-emeso ihe a kpọrọ mmadụ ezughị. A ghaghị ịzụlite ekele onwe onye maka Jehova. Olee otú a pụrụ isi eme nke ahụ? Site n’itinye Okwu Chineke n’omume ná ndụ anyị, na-ahụkwa n’onwe anyị na ụkpụrụ ndị a na-ahụ n’ime ya na-arụ ọrụ n’ezie. (Aịsaịa 48:17) Anyị aghaghị inwe mmetụta nke na Jehova azọpụtawo anyị site n’apịtị nke ajọ ụwa nke a dị n’okpuru ọchịchị Setan. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 6:11.) N’ọgụ anyị na-alụ ime ezi ihe, anyị na-amụta ịdabere na Jehova, anyị na-ahụtakwa n’onwe anyị na Jehova bụ Chineke dị ndụ, “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 62:8; 65:2) N’oge na-adịghị anya anyị ga-enwe mmetụta ịnọ ya ezi nso, nweekwa ike ịkọrọ ya mmetụta anyị ndị kasị zoo ezo. Mmetụta na-ekpo ọkụ nke ịhụnanya maka Jehova na-eto n’ime anyị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a ga-eduje anyị n’ịrara ndụ anyị nye ya.

15. Gịnị kpaliri otu nwoke, onye rarabuuru onwe ya nye ọrụ, ijere Jehova ozi?

15 Ọtụtụ abịawo mara Chineke a na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, ha ararawokwa ndụ ha nye ijere ya ozi. Were dị ka ihe atụ otu onye ọrụ eletrik nwere ọrụ na-aga nke ọma. E nwere mgbe ụfọdụ ọ ga-amalite ọrụ n’ụtụtụ ma rụgide ọrụ ụbọchị nile wee banye n’ime abalị, na-alọta ụlọ n’elekere ise nke ụtụtụ echi ya. Mgbe o zusịrị ike ihe dị ka otu hour, ọ ga-apụ gaa n’ọrụ ọzọ. “M raara onwe m nye ọrụ m,” ka o chetara. Mgbe nwunye ya malitere ịmụ Bible, o sonyeere ya. Ọ na-asị: “Chi nile m maara tupu mgbe ahụ nọ nnọọ na-echere ka e jeere ha ozi, n’emeghị ihe ọ bụla iji baara anyị uru. Ma Jehova weere nzọụkwụ mbụ ma zite Ọkpara ya ọ mụrụ nanị ya n’elu ụwa n’ịchụ àjà onwe onye dị ukwuu.” (1 Jọn 4:10, 19) N’ime ọnwa iri, nwoke a raara onwe ya nye Jehova. Mgbe nke ahụ gasịrị, o tinyere uche ya n’ijere Chineke ahụ dị ndụ ozi. O weere ozi oge nile ma gaa ije ozi ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Dị ka ndị ozi ahụ, ọ ‘hapụrụ ihe nile, wee soro Jisọs.’ (Matiu 19:27) Mgbe ọnwa abụọ gasịrị, a kpọrọ ya na nwunye ya òkù ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Bible and Tract Society ná mba ha bi, ka o wee nwee ike inye aka n’ọrụ eletrik. Ugbu a, ruo ihe karịrị 20 afọ ọ nọwo na-arụ ọrụ n’alaka ahụ, na-arụ ọrụ o nwere mmasị na ya—ọ bụghị maka onwe ya kama maka Jehova.

Gosipụta Nraranye Gị n’Ihu Ọha

16. Gịnị bụ ụfọdụ nzọụkwụ mmadụ ga-ewere n’ịrara onwe ya nye Jehova?

16 Mgbe a mụsịrị Bible ruo nwa oge, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi ga-abịa ghọta Jehova na ihe o mewooro ha. Nke a kwesịrị ịkpali ha inye Chineke onwe ha. Ị pụrụ ịbụ otu n’ime ndị a. Olee otú ị pụrụ isi raara onwe gị nye Jehova? Mgbe ị narasịịrị ezi ihe ọmụma site na Bible, i kwesịrị ime ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma ahụ ma nwee okwukwe na Jehova na Jisọs Kraịst. (Jọn 17:3) Chegharịa ma chigharịa site n’ụzọ mmehie ọ bụla gara aga. (Ọrụ 3:19) Mgbe ahụ ị ga-abịa ná nzọụkwụ nke nraranye, na-ekwupụta ya n’okwu ekpere ndị si n’obi nye Jehova. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ekpere nke a ga-adịgide n’uche gị, n’ihi na ọ ga-abụ ebe mmalite nke mmekọrịta ọhụrụ n’ebe Jehova nọ.

17. (a) N’ihi gịnị ka ndị okenye na-eji esoro ndị raara onwe ha nye ọhụrụ atụleghachi ajụjụ ndị a kwadebeworo? (b) Nzọụkwụ dị aṅaa dị mkpa ka e kwesịrị iwere ngwa ngwa mgbe mmadụ rarasịịrị onwe ya nye, ná nzube dịkwa aṅaa?

17 Dị nnọọ ka Mosis kọwaara ụmụ Israel ihe ndị dị mkpa a ga-emezu iji banye ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ n’ebe Jehova nọ, ndị okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-enyere ndị meworo nraranye n’oge na-adịbeghị anya aka inyocha nnọọ ihe ọ gụnyere. Ha na-eji ajụjụ ndị a kwadebeworo anwapụta na onye nke ọ bụla na-aghọtazu ozizi ndị bụ isi nke Bible ma mara ihe ọ gụnyere ịbụ Onyeàmà Jehova. Mgbe ahụ, ememe nke igosipụta nraranye ahụ n’ihu ọha kwesịrị nnọọ ekwesị. Dị ka o si adịkarị, onye raara onwe ya nye ọhụrụ na-enwe ịnụ ọkụ n’obi ime ka ndị ọzọ mara na ya abatawo ná mmekọrịta nke a bụ ihe ùgwù nke ya na Jehova. (Tụlee Jeremaịa 9:24.) A na-eme nke a n’ụzọ kwesịrị ekwesị site n’ime baptism ime mmiri dị ka ihe atụ nke nraranye. Ịbụ onye e mikpuru n’ime mmiri ma kulitezie na-eme ihe atụ na ọ nwụrụ anwụ nye ụzọ ndụ nke ọchịchọ ọdịmma onwe onye ọ na-ebibu ma bụrụ onye e kulitere gaa n’ụzọ ndụ ọhụrụ, nke ime uche Chineke. Ọ bụghị sakrament, ọ bụghịkwa ememe okpukpe dị ka ememe Shinto bụ́ misogi yiri ebe a na-eche na a na-eji mmiri asachapụ mmadụ.a Kama nke ahụ, baptism bụ nkwupụta ihu ọha nke nraranye nke e mewororịị n’ekpere.

18. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na nraranye anyị agaghị abụ n’efu?

18 Ememe nke a dị nsọ bụ ahụmahụ a na-agaghị echezọ echezọ, na-echetara ohu ọhụrụ ahụ nke Chineke banyere mmekọrịta na-adịgide adịgide o nwere ugbu a n’ebe Jehova nọ. N’adịghị ka nraranye ahụ nke onye na-anya ụgbọ elu na-egbu onye na-anya ya meere ala na onye ọchịchị alaeze ukwu ya, nraranye nke a e mere nye Jehova agaghị abụ n’efu, n’ihi na ọ bụ Chineke pụrụ ime ihe nile nke mgbe ebighị ebi bụ́ onye na-emezu ihe nile o setịpụworo ime. Nanị ya kwesịrị ịnara nraranye anyị e ji obi dum mee.—Aịsaịa 55:9-11.

19. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Otú ọ dị, nraranye gụnyere ihe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, olee otú nraranye si emetụta ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị? A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Mankind’s Search for God, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 194-195.

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ihi gịnị ka nraranye dị ka a na-ahụ n’ụwa na-eji ejedebe ná mmechuihu?

◻ Gịnị kpaliri ụmụ Israel ịrara onwe ha nye Jehova?

◻ Gịnị na-akpali anyị ịrara onwe anyị nye Jehova taa?

◻ Olee otú anyị si arara onwe anyị nye Chineke?

◻ Gịnị ka baptism ime mmiri na-egosi?

[Foto dị na peeji nke 10]

Israel raara onwe ya nye Jehova na Saịnaị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya