Ememe Owuwe Ihe Ubi Hà Na-amasị Chineke?
MKPỤRỤ osisi ndị dị ụtọ, akwụkwọ nri ndị dị mma n’anya, na ùkwù ọkà ji ahụ e kpokọbara, bụ ihe na-akpali akpali ịhụ. N’oge owuwe ihe ubi, ụdị ngosi ndị dị otú ahụ na-achọ ọlta na ikpo okwu nke chọọchị ndị dị gburugburu England mma. Na Europe, dịkwa ka n’ebe ndị ọzọ, ọtụtụ ememe na-aka ma mmalite ma ngwụsị nke oge owuwe ihe ubi akara.
Ndị ihe ha ji ebi ndụ dabeere n’ala nwere ekele karịsịa maka ihe ala na emepụta. N’ezie, Chineke kpọkuru mba Israel ochie ka ha mee ememe atọ kwa afọ bụ́ ndị e jikọtara ha na owuwe ihe ubi n’ụzọ chiri anya. Ná mmalite oge opupu ihe ubi, n’oge Ememe Achịcha Ekoghị Eko, ụmụ Israel nyere Chineke ùkwù ọkà nke mkpụrụ mbụ nke obibi ọkà barley. N’ememe nke Izu Asaa nke Ụbọchị Asaa (ma ọ bụ, Pentikọst) ná ngwụsị opupu ihe ubi, ha nyere ogbe achịcha e ji mkpụrụ mbụ nke obibi ọkà wheat mee. Ememe nke Nchịkọta Ihe, nke kara ngwụsị nke afọ ọrụ ubi nke Israel akara na-abịa n’oge mgbụsị akwụkwọ. (Ọpụpụ 23:14-17) Ememe ndị a bụ “mkpọkọta nsọ” na oge ịṅụrị ọṅụ.—Levitikọs 23:2; Deuterọnọmi 16:15.
Mgbe ahụ, gịnị banyere ememe owuwe ihe ubi ndị nke oge a? Hà na-amasị Chineke?
Ihe E Jikọrọ Ha na Ikpere Arụsị
N’ịbụ onye omume ụwa nke oriri na ọṅụṅụ ọdịnala n’oge owuwe ihe ubi na ịṅụbiga mmanya ókè nke e jikọrọ ya na ememe ahụ nyere nsogbu, otu onye ụkọchukwu Anglịkan na Cornwall dị n’England, kpebiri na 1843 iweghachite omenala owuwe ihe ubi oge ochie. O weere ụfọdụ mkpụrụ akụkụ mbụ e wetara n’ubi ma jiri ya mee achịcha maka ememe oriri nsọ na chọọchị ya. N’ime nke a, o mere ka ememe Lammas dịgide—ememe “ndị Kraịst” nke ụfọdụ na-ekwu na ọ malitere n’ofufe oge ochie nke chi ndị Celt bụ́ Lugh.a N’ihi ya, ememe owuwe ihe ubi nke Anglịkan n’oge a nwere ihe jikọrọ ya na ikpere arụsị.
Gịnị banyere ememe ndị ọzọ ndị na-ewere ọnọdụ ná ngwụsị oge owuwe ihe ubi? Dị ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica si kwuo, ọtụtụ n’ime omenala ndị na-aka oriri na ọṅụṅụ ndị a akara nyere ihe àmà na ọ malitere na “nkwenkwe ndị ọgọ mmụọ nke mmụọ ọka [mkpụrụ akụkụ] ma ọ bụ nne ọka.” N’ógbè ụfọdụ ndị ọrụ ubi kwenyere na otu mmụọ na-ebi n’ime ùkwù ọka ikpeazụ a ga-eweta n’ubi. Iji chụpụ mmụọ ahụ, ha na-akụda mkpụrụ akụkụ ahụ n’ala. N’ebe ọzọ, ha na-adụkọta ụfọdụ akwụkwọ mkpụrụ akụkụ ahụ ịghọ “nwa bebi ọka” nke ha chekwara nke ọma maka inweta “chi ọma” ruo oge ịkụ mkpụrụ n’afọ na-esochi. Mgbe ahụ, ha akọnyeghachi mkpụrụ akụkụ ndị ahụ n’ala, na-enwe olileanya na nke a ga-agọzi ihe ọkụkụ ọhụrụ ahụ.
Ụfọdụ akụkọ mgbe ochie na-ejikọ oge owuwe ihe ubi na ofufe chi Babilọn ahụ bụ́ Tamuz, bụ́ onye ibe nke chi nwanyị ọmụmụ bụ́ Ishta. Igburu mkpụrụ akụkụ chara acha yiri nnwụchu ọnwụ nke Tamuz. Ọbụna akụkọ mgbe ochie ndị ọzọ jikọrọ oge owuwe ihe ubi na iji mmadụ achụ àjà—bụ́ omume Jehova Chineke kpọrọ asị.—Levitikọs 20:2; Jeremaịa 7:30, 31.
Gịnị Bụ Echiche Chineke?
Mmeso Chineke mesoro Israel oge ochie na-ekpughe n’ụzọ doro anya na Jehova, bụ́ Onye Okike na Isi Iyi nke ndụ, chọrọ ka ndị na-efe ya fee nanị ya ofufe. (Abụ Ọma 36:9; Nehum 1:2) N’ụbọchị Ezikiel onye amụma, omume nke ịkwara chi Tamuz ákwá bụ ‘oké ihe arụ’ n’anya Jehova. Ihe ndị a, tinyere ememe okpukpe ụgha ndị ọzọ, mere ka Chineke ghara ịṅa ntị n’ekpere nke ndị ofufe ụgha ahụ.—Ezikiel 8:6, 13, 14, 18.
Were nke a tụnyere ihe Jehova Chineke ziri ụmụ Israel ime n’ihe banyere owuwe ihe ubi. N’Ememe nke Nchịkọta Ihe, ụmụ Israel nwere nzukọ bụ́ oge ndị na-eto eto na ndị agadi, ndị ọgaranya na ndị ogbenye biri n’ebe obibi nwa oge nke e ji akwụkwọ na-ama pokopoko nke osisi ndị na-eme nke ọma chọọ mma. Nke a bụụrụ ha oge oké ọṅụ, ọ bụkwa oge ịtụgharị uche ná mgbapụta Chineke gbapụtara nna ha n’oge Ọpụpụ ha site n’Ijipt.—Levitikọs 23:40-43.
N’oge ememe ụmụ Israel, e nyere Jehova, onye nanị ya bụ ezi Chineke, onyinye ịnata ihu ọma. (Deuterọnọmi 8:10-20) N’ihe banyere nkwenkwe ndị ọgọ mmụọ ndị a kpọtụrụ uche na mbụ, ọ dịghị ebe Bible na-ekwu banyere ihe e nwetara n’ubi, dị ka ùkwù ọka wheat, dị ka ọbụna nke nwere mkpụrụ obi.b Akwụkwọ Nsọ na-egosikwa n’ụzọ doro anya na arụsị ka bụkwa ihe na-adịghị ndụ, na-enweghị ike ikwu okwu, ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, ịnụ ísìsì, inwe mmetụta, ma ọ bụ inyere ndị na-efe ha aka ọ bụla.—Abụ Ọma 115:5-8; Ndị Rom 1:23-25.
Ndị Kraịst taa anọghị n’okpuru ọgbụgba ndụ iwu nke Chineke na mba Israel ochie gbara. N’eziokwu, Chineke ‘wepụrụ ya site n’ịkpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ Jisọs.’ (Ndị Kọlọsi 2:13, 14, NW) Ndị ohu Jehova nke oge a na-edebe “iwu Kraịst,” jirikwa obi ekele na-azaghachi maka ihe nile Chineke na-enye.—Ndị Galetia 6:2.
Pọl onyeozi kwuru kpọmkwem na ememe ndị Juu bụ “onyinyo nke ihe gaje ịbịa,” na-agbakwụnye, “ma [ihe bụ ezie, NW] bụ nke Kraịst.” (Ndị Kọlọsi 2:16, 17) N’ihi ya, ezi ndị Kraịst na-anakwere echiche Akwụkwọ Nsọ: “Ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghịkwa Chineke ka ha na-achụrụ . . . Unu apụghị ịṅụ iko Onyenwe anyị na iko ndị mmụọ ọjọọ.” (1 Ndị Kọrint 10:20, 21) Ọzọkwa, ndị Kraịst na-aṅa ntị na ndụmọdụ bụ́ “unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka.” N’ihi ya, ememe owuwe ihe ubi nke oge a nke na-enye echiche ikpere arụsị ma ọ bụ okpukpe ụgha adịghị ọcha n’anya Chineke, ezi ndị Kraịst na-ezerekwa ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova site n’itinye aka n’ofufe e merụrụ emerụ.—2 Ndị Kọrint 6:17.
Mgbe nwatakịrị nwere obi ekele natara onyinye n’aka nna ya, ònye ka ọ ga-ekele? Ọ̀ bụ onye ọ na-amatụghị ka ọ bụ onye mụrụ ya? N’ekpere sitere n’ala ala obi, ndị na-efe Chineke na-ekele Jehova kwa ụbọchị, bụ́ nna eluigwe ha, n’ihi ụba nke mmesapụ aka ya.—2 Ndị Kọrint 6:18; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17, 18.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E wetara okwu ahụ bụ́ “Lammas” site n’okwu Bekee Ochie pụtara “ogbe achịcha.”
b Insight on the Scriptures na-ekwu, sị: “E jighị Neʹphesh (mkpụrụ obi) mee ihe n’izo aka n’okike nke ndụ ihe ọkụkụ ‘n’ụbọchị’ nke atọ nke okike (Jen 1:11-13) ma ọ bụ mgbe ọ gasịrị, ebe ihe ọkụkụ bụ ihe na-enweghị ọbara.”—Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara ya.