Ụgwọ Ọrụ nke Ịsọpụrụ Ndị Nne na Nna Meworo Agadi
EZI ndị na-efe Chineke ofufe na-akwanyere nne na nna ha meworo agadi ùgwù, na-asọpụrụ, na-elekọtakwa ha n’ihi na ha hụrụ ha n’anya. Ọ bụ akụkụ nke ofufe ha. Bible na-ekwu, sị: “Ka [ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ] buru ụzọ mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka ha, na inyeghachi ndị mụrụ ha ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke.” (1 Timoti 5:4, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Ma anyị ka bụ nwata ma ọ bụ okenye, o kwesịrị ekwesị na anyị ‘nyeghachiri’ ndị nne na nna na ndị nne na nna ochie anyị ihe. N’ụzọ dị otú a anyị na-egosi ekele maka ịhụnanya ha, nrụsi ọrụ ike ha, na nlekọta ha lekọtara anyị ruo ọtụtụ afọ. Leenụ, anyị dị ndụ n’ihi nne na nna anyị!
Rịba ama na inyeghachi ndị nne na nna na ndị nne na nna ochie ihe “bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke.” E jikọrọ ya na anyị “ịsọpụrụ Chineke.” N’ihi ya, site n’imezu ndụmọdụ a, a na-enye anyị ụgwọ ọrụ, n’ịmara na anyị na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. Nke ahụ na-ewetara anyị ọṅụ.
Ọṅụ dị n’inye ndị ọzọ ihe, karịsịa mgbe anyị na-enye ndị jiworo mmesapụ aka nye anyị ihe. (Ọrụ 20:35) Mgbe ahụ, lee ụgwọ ọrụ dị n’ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible: “Nye nna gị na nne gị ihe ga-eme ka obi dị ha ụtọ, ka onye mụrụ gị ṅụrịa ọṅụ”!—Ilu 23:25, The New English Bible.
Olee otú anyị pụrụ isi nyeghachi nne na nna na nne na nna ochie anyị ihe? N’ụzọ atọ: n’ụzọ ihe onwunwe, n’ụzọ mmetụta uche, na n’ụzọ ime mmụọ. Nke ọ bụla na-eweta ụgwọ ọrụ nke ya.
Inye Ihe n’Ụzọ Ihe Onwunwe
Ndị na-ejere Chineke ozi maara na ọ dị mkpa inye ndị òtù ezinụlọ ha ihe n’ụzọ ihe onwunwe. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.”—1 Timoti 5:8.
Tunji na Joy bi n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Ọ bụ ezie na ihe na-esiri ha ike n’ụzọ ego, ha kpọrọ nne na nna Joy meworo agadi ka ha kwakwute ha. Nna ya na-arịa ọrịa, mesịakwa nwụọ. Tunji chere echiche laa azụ: “Mgbe Papa nwụrụ, Mama makụrụ nwunye m ma sị: ‘Unu mere ihe nile mmadụ nwere ike ime. O kwesịtụghị ka unu nwee mmetụta nke ikpe ọmụma maka ọnwụ Papa.’ Ọ bụ ezie na ọnwụ Papa na-ewute anyị, anyị maara na anyị zụtaara ya ọgwụ kasị mma ma mee mgbe nile ka o nwee mmetụta nke ịbụ onye e nwere mmasị na ya na onye a chọrọ; anyị mere ike anyị nile imezu ibu ọrụ Chineke nyere anyị. Anyị nwere afọ ojuju.”
Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile nọ n’ọnọdụ inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ihe onwunwe. Otu nwoke bi na Nigeria sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ apụghị ịkpara onwe ya nri, oleezi otú ọ pụrụ isi kpaara onye ọzọ nri?” N’ọtụtụ ala ọnọdụ ahụ ọbụna pụrụ ịka njọ n’afọ ndị na-abịanụ. Dị ka ihe òtù Mba Ndị Dị n’Otu kwuru ga-emenụ, n’isi nso ọkara nke ndị bi ná mba Africa ndị dị na ndịda Sahara ga na-ebi n’ogbenye ọnụ ntụ.
Ọ bụrụ na ị chọta onwe gị n’ọnọdụ akụ̀ na ụba dị njọ, ị pụrụ inweta nkasi obi site n’akụkọ mere eme nke otu nwanyị di ya nwụrụ nọ ná mkpa. Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ na-enye onyinye dị nta n’ebe a na-atụnye ụtụ n’ụlọ nsọ. O nyere nanị “ego nta abụọ.” Ma, n’ịmara ọnọdụ ya, Jisọs sịrị: “N’ezie asị m unu, Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karịa ha nile: n’ihi na ndị a nile sitere n’inwebiga akụ̀ ókè ha tụba n’onyinye: ma nwanyị ahụ sitere n’ụkọ ya tụba ihe nile o nwere nke o ji biri.”—Luk 21:1-4.
N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị emee ike anyị nile n’ilekọta nne na nna ma ọ bụ nne na nna ochie anyị n’ụzọ ihe onwunwe, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị nta, Jehova na-ahụ ma na-enwe mmasị na ya. Ọ dịghị atụ anyị anya ime karịa ihe anyị nwere ike ime. Eleghị anya nne na nna ma ọ bụ nne na nna ochie anyị ga-enwekwa mmetụta dị otú ahụ.
Inye Ihe n’Ụzọ Mmetụta Uche
Inye nne na nna na nne na nna ochie anyị ihe na-akpa ha gụnyere ihe karịrị nanị ilekọta mkpa anụ ahụ ha. Anyị nile nwere mkpa mmetụta uche. Onye ọ bụla, tinyere ndị meworo okenye, nwere ọchịchọ ịbụ ndị a hụrụ n’anya, ndị dị mkpa na ndị a chọrọ, nakwa ịbụ ndị òtù ezinụlọ e ji kpọrọ ihe.
Mary, onye bi na Kenya, elekọtawo nne di ya meworo agadi ruo afọ atọ. Mary na-asị: “E wezụga igbo mkpa anụ ahụ ya, anyị na-esokarị ya ekwurịta okwu. Nne enweghị ike ime ihe dị ukwuu n’ụlọ, ma anyị na-ekwurịta okwu, anyị aghọwokwa ndị enyi chiri anya. Mgbe ụfọdụ anyị na-ekwurịta banyere Chineke, mgbe ụfọdụ banyere ndị nọ n’obodo. Ọ bụ ezie na ọ gafewo afọ 90, ikike ncheta ihe ya dị nnọọ mma. Ọ na-echeta ma na-ekwu banyere ndụ mgbe ọ bụ nwatakịrị nwanyị, tupu 1914.”
Mary gara n’ihu: “Ọ dịghị mfe ilekọta onye kaworo nká, ma ya iso anyị biri ewetaworo anyị ụgwọ ọrụ bara ụba. Anyị nwere udo na ịdị n’otu n’ezinụlọ anyị. Mụ inye ya ihe akpasuwo mmụọ nke inye ihe n’ime ndị ọzọ so n’ezinụlọ anyị. Di m nwekwuru nkwanye ùgwù n’ebe m nọ. Ọ bụrụkwa na Nne anụ ka onye ọ bụla ji olu ike na-agwa m okwu, ọ na-ekwulite okwu ngwa ngwa iji gbachitere m. Ọ dịghị onye pụrụ ịgwa m okwu na-agba agba ma ọ nọrọ ya!”
Inye Ihe n’Ụzọ Ime Mmụọ
Dị nnọọ ka inye ihe n’ụzọ ihe onwunwe na n’ụzọ mmetụta uche na-ewetara onye na-enye enye ụgwọ ọrụ, otú ahụ ka ọ dị ihe ime mmụọ. Pọl onyeozi degaara ọgbakọ ndị Kraịst dị na Rom akwụkwọ, sị: “Ịhụ unu anya na-agụsi m ike, ka m wee mee ka unu keta onyinye amara ụfọdụ nke Mmụọ Nsọ, ka e wee mee ka unu guzosie ike; nke ahụ bụ, ka e wee kasie mụ na unu obi n’etiti unu, site n’okwukwe anyị kwekọrọ, ma nke unu ma nke mụ onwe m.”—Ndị Rom 1:11, 12.
N’otu ụzọ ahụ, mgbe a bịara n’inye ndị agadi na-ejere Chineke ozi ihe n’ụzọ ime mmụọ, a na-enyerịtakarị agbamume. Osondu, onye bi na Nigeria, na-akọ, sị: “Ihe kasị amasị m banyere nne na nna m ochie bụ ohere ha na-enye m ịmata ihe ndị gara aga. Nna m ochie, n’anya na-egbukepụ egbukepụ, ga-akọ banyere ókèala ọ rụrụ ọrụ na ya dị ka onye ozi oge nile n’afọ ndị 1950 na 1960. Ọ na-eji ọdịdị ọgbakọ n’oge a atụnyere otú ọ dị mgbe ọ ghọrọ Onyeàmà. Ahụmahụ ndị a na-enyere m aka n’ozi m dị ka onye ọsụ ụzọ.”
Ndị ọzọ n’ọgbakọ ndị Kraịst pụkwara inye aka n’inye ndị meworo okenye ihe. Tunji, onye a kpọtụrụ aha na mbụ, kọwara ihe mere n’ọgbakọ ya: “Otu nwanna nwoke na-eto eto bụ́ onye ọsụ ụzọ nke e kenyere ikwu okwu ihu ọha wetaara Papa ihe ndepụta ya ka ha kwadebekọọ ya. Onye na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche bịara gwa Papa, sị: ‘I nwere ahụmahụ. Gịnị ka ị pụrụ ikwu iji nyere m aka inwe ọganihu.’ Papa nwere ike inye okenye ahụ ụfọdụ ndụmọdụ dị irè. Ụmụnna ndị ahụ kpọrọ aha Papa n’ekpere ọgbakọ ọtụtụ oge. Ihe ndị a nile mere ya ka o nwee mmetụta ịbụ onye a chọrọ.”
Ezi Àgwà Na-adọta Ndị Mmadụ n’Ebe Chineke Nọ
Mgbe ụfọdụ, ka anyị na-egosi nne na nna na nne na nna ochie anyị nsọpụrụ na ịhụnanya, anyị na-adọta ndị mmadụ n’ebe Chineke nọ. Pita onyeozi dere, sị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 2:12.
Andrew, onye Kraịst bụ́ okenye n’Ọdịda Anyanwụ Africa, na-eme njem gaa kilomita 95 ugboro abụọ n’otu izu iji lekọta nna ya na-arịa ọrịa, bụ́ onye na-ekweghị ekwe. Ọ na-akọ, sị: “Mgbe m ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, nna m megidere m nke ukwuu. Ma mgbe ọ hụrụ otú m si na-elekọta ya mgbe ọ na-arịa ọrịa, ọ nọgidere na-agba ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị m tọrọ ume, sị, ‘Unu ga-abanye okpukpe nwanne unu nwoke!’ Nke ahụ kpaliri ha, ugbu a kwa ụmụ nna m itoolu bụcha Ndịàmà Jehova.”
Ịsọpụrụ na ilekọta nne na nna anyị meworo agadi pụrụ ịbụ ihe ịma aka, karịsịa n’oge ihe isi ike akụ̀ na ụba. Ma ka ndị Kraịst na-agbalị ime nke a, ha na-enweta ọtụtụ ụgwọ ọrụ. Nke kasịnụ, ha na-enweta ọṅụ nke inye ihe, tinyere afọ ojuju nke ịmara na ha na-eme ihe na-atọ Jehova Chineke ụtọ, onye bụ n’onwe ya “Nna nke anyị nile.”—Ndị Efesọs 4:6.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ndụmọdụ Chineke Maka Ndị A Na-elekọta na Maka Ndị Na-enye Ya
Na-agba Ume: “Onye ọ bụla n’etiti anyị, ya mee ihe ga-atọ onye agbata obi ya ụtọ iwetara ya ezi ihe, ka o wee wulie ya elu dị ka ụlọ.”—Ndị Rom 15:2.
Na-eguzosi Ike: “Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.”—Ndị Galetia 6:9.
Dị Umeala n’Obi: “Unu emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma.”—Ndị Filipaị 2:3.
Bụrụ Onye Na-eme Ihe Ọma: “Ka onye ọ bụla ghara ịchọ ọdịmma nke aka ya, kama ọdịmma nke mmadụ ibe ya.”—1 Ndị Kọrint 10:24.
Nwee Ezi Uche: “Meenụ ka mmadụ nile mara [ezi uche, NW] unu.”—Ndị Filipaị 4:5.
Nwee Ọmịiko: “Nwerịtanụ obiọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu.”—Ndị Efesọs 4:32.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị okenye na-akatachabeghị ahụ pụrụ irite uru site n’ahụmahụ nke ndị tọrọ ha