Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fy isi 11 p. 128-141
  • Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Gị
  • Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ BỤRỤ NA DI GỊ NỌ N’OKPUKPE DỊ ICHE
  • MGBE NWUNYE NA-EJIGHỊ ISO ỤZỌ KRAỊST KPỌRỌ IHE
  • ỊZỤLITE ỤMỤAKA
  • Ọ BỤRỤ NA OKPUKPE GỊ ABỤGHỊ NKE NDỊ MỤRỤ GỊ
  • IHE ỊMA AKA NKE ỊBỤ NNE MA Ọ BỤ NNA NKUCHI
  • NCHỤSO IHE ONWUNWE HÀ NA-EKEWA EZINỤLỌ GỊ?
  • Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Mkpịsị Ugodi Abụọ Na-eduga n’Alụmdi na Nwunye Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndụ Ezinụlọ nke Na-atọ Chineke Ụtọ
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Ndokwa Ezinụlọ nke Jehova Ji Ịhụnanya Mee
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
fy isi 11 p. 128-141

ISI NKE IRI NA OTU

Nọgide Na-enwe Udo n’Ezinụlọ Gị

1. Olee ihe ụfọdụ pụrụ ịkpata nkewa n’ezinụlọ?

OBI ụtọ na-adịrị ndị nọ n’ezinụlọ ebe e nwere ịhụnanya, nghọta, na udo. Anyị nwere olileanya na nke gị bụ ezinụlọ dị otú ahụ. Ọ bụ ihe mwute ikwu na ọtụtụ ezinụlọ adịghị ekwekọ ná nkọwa ahụ, e kewakwara ha ekewa n’ihi otu ihe ma ọ bụ ọzọ. Gịnị na-ekewa ezinụlọ? N’isiakwụkwọ nke a anyị ga-atụle ihe atọ. N’ezinụlọ ụfọdụ, ndị òtù ha anọghị n’otu okpukpe. Ná ndị ọzọ, ụmụ nwere ike ha agaghị enwe otu nne na nna mụrụ ha. Ná ndị ọzọ kwa, mgba inweta ihe ndị e ji ebi obi ma ọ bụ ọchịchọ inwetakwu ihe onwunwe yiri ka ha na-amanye ndị òtù ezinụlọ ịga iche iche. Ka o sina dị, ihe ndị kewara otu ezinụlọ nwere ike ha agaghị emetụta ọzọ. Gịnị na-akpata ọdịiche?

2. Olee ebe ụfọdụ na-elegara anya maka nduzi ná ndụ ezinụlọ, ma gịnị bụ isi iyi kasị mma nke nduzi dị otú ahụ?

2 Ụzọ e si eche echiche bụ otu ihe. Ọ bụrụ na i jiri ezi obi gbalịa ịghọta echiche onye nke ọzọ, o yikarịrị ka ị ga-ahụ ụzọ isi chebe ezinụlọ dị n’otu. Ihe nke abụọ bụ isi iyi gị maka nduzi. Ọtụtụ ndị na-agbaso okwu ndụmọdụ ndị ọrụ ibe ha, ndị agbata obi, ndị na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ, ma ọ bụ ndị nduzi ọzọ bụ́ mmadụ. Ma, ụfọdụ achọpụtawo ihe Okwu Chineke na-ekwu banyere ọnọdụ ha, ha etinyewokwa ihe ha mụtara n’ọrụ. Olee otú ime nke a pụrụ isi nyere ezinụlọ aka ịnọgide na-enwe udo n’ụlọ?—2 Timoti 3:16, 17.

Ọ BỤRỤ NA DI GỊ NỌ N’OKPUKPE DỊ ICHE

Foto dị na peeji nke 130

Gbalịa ịghọta ụzọ onye nke ọzọ si eche echiche

3. (a) Gịnị bụ ndụmọdụ Bible banyere ịlụ onye nọ n’okpukpe dị iche? (b) Olee ụkpụrụ ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ na-abata n’ọrụ ma ọ bụrụ na otu onye n’ime di na nwunye kwere ekwe ma onye nke ọzọ ekweghị?

3 Bible na-adụsi anyị ọdụ ike megide ịlụ onye nwere okwukwe okpukpe dị iche. (Deuterọnọmi 7:3, 4; 1 Ndị Kọrint 7:39) Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na ị mụtara eziokwu ahụ site na Bible mgbe agbamakwụkwọ gị gasịrị ma di gị amụtaghị ya. Mgbe ahụ gịnị ga-eme? N’ezie, nkwa ọlụlụ ahụ ka dị irè. (1 Ndị Kọrint 7:10) Bible na-emesi ndịgide nke nkekọ alụmdi na nwunye ike ma na-agba ndị di na nwunye ume idozi ndịrịta iche ha nile kama isi na ha gbalaga. (Ndị Efesọs 5:28-31; Taịtọs 2:4, 5) Ma, gịnị ma ọ bụrụ na di gị na-emegidesi gị ike ikpe okpukpe nke Bible? Ọ pụrụ ịnwa igbochi gị ịga nzukọ ọgbakọ, ma ọ bụ ọ pụrụ ikwu na ọ chọghị ka nwunye ya na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-ekwu banyere okpukpe. Gịnị ka ị ga-eme?

4. N’ụzọ dị aṅaa ka nwanyị pụrụ isi gosi ọmịiko ma ọ bụrụ na di ya anọghị n’okpukpe ya?

4 Jụọ onwe gị, ‘N’ihi gịnị ka o ji dị di m otú ahụ?’ (Ilu 16:20, 23) Ọ bụrụ na ọ ghọtaghị n’ezie ihe ị na-eme, ọ pụrụ ịdị na-echegbu onwe ya banyere gị. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịnọ ná nrụgide site n’aka ndị ikwu n’ihi na ị dịkwaghị ekere òkè n’omenala ụfọdụ dị mkpa nye ha. “N’ịnọ nanị m n’ụlọ, ọ dị m ka a gbahapụrụ m,” ka otu di kwuru. Nwoke a chere na okpukpe na-anapụ ya nwunye ya. Ma nganga ekweghị ya kweta na owu na-ama ya. Di gị pụrụ inwe mkpa mmesighachi obi ike nke na ịhụnanya gị maka Jehova apụtaghị na ugbu a i nwere ịhụnanya ka nta maka di gị karịa ka ọ dị n’oge gara aga. Hụ na i wepụtara oge nọnyere ya.

5. Nguzozi dị aṅaa ka nwanyị di ya nọ n’okpukpe dị iche na-aghaghị idebe?

5 Otú ọ dị, a ghaghị ịtụle ihe dị mkpa ọbụna karị ma ọ bụrụ na ị gaje iji amamihe chee ọnọdụ ahụ ihu. Okwu Chineke na-agba ndị nwunye ume, sị: “Na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu, dị ka ọ na-ekwesị unu n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:18) Otú a, ọ na-adọ aka ná ntị megide mmụọ nke nnwere onwe. Tụkwasịkwa, site n’ịsị “dị ka ọ na-ekwesị unu n’ime Onyenwe anyị,” akụkụ akwụkwọ nsọ a na-egosi na ido onwe onye n’okpuru di kwesịkwara ịgụnye ido onwe onye n’okpuru Onyenwe anyị. A ghaghị inwe nguzozi.

6. Ụkpụrụ dịgasị aṅaa ka nwunye bụ́ onye Kraịst kwesịrị iburu n’uche?

6 Nye onye Kraịst, ịga nzukọ ọgbakọ na mmadụ ịgbara ndị ọzọ àmà banyere okwukwe ya dabeere na Bible bụ akụkụ ndị dị mkpa nke ezi ofufe, nke a na-agaghị eleghara anya. (Ndị Rom 10:9, 10, 14; Ndị Hibru 10:24, 25) Ya mere, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ enye gị iwu kpọmkwem ka ị ghara ikwere n’ihe doro anya Chineke chọrọ? Ndị ozi Jisọs Kraịst kwupụtara, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Ihe nlereanya ha na-esetịpụ ụkpụrụ nke dị irè n’ọtụtụ ọnọdụ ná ndụ. Ịhụnanya maka Jehova ọ̀ ga-akwali gị inye ya ofufe ruuru ya? N’otu oge ahụ, ịhụnanya na nkwanye ùgwù gị maka di gị ọ̀ ga-eme gị ka ị nwaa ime nke a n’ụzọ nke ọ na-anakwere?—Matiu 4:10; 1 Jọn 5:3.

7. Mkpebisi ike dị aṅaa ka nwunye bụ́ onye Kraịst na-aghaghị ime?

7 Jisọs rịbara ama na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. Ọ dọrọ aka ná ntị na n’ihi mmegide a na-emegide ezi ofufe, ọ ga-adị ndị òtù kwere ekwe nke ezinụlọ ka e kewapụrụ ha iche, dị ka a ga-asị na mma agha abịawo n’etiti ha na ndị ọzọ n’ezinụlọ ahụ. (Matiu 10:34-36) Otu nwanyị na Japan nwere ahụmahụ nke a. Di ya megidere ya ruo afọ 11. O mekpọrọ ya ọnụ nke ukwuu, kpọchibidokwa ya ụzọ n’èzí ọtụtụ ugbo. Ma ọ tachiri obi. Ndị enyi n’ọgbakọ ndị Kraịst nyeere ya aka. Ọ nọgidesiri ike n’ekpere ma nweta agbamume dị ukwuu site na 1 Pita 2:20. Nwanyị a bụ́ onye Kraịst kwenyere na ọ bụrụ na o guzosie ike, otu ụbọchị di ya ga-esonyere ya n’ijere Jehova ozi. O sonyekwaara ya.

8, 9. Olee otú nwunye kwesịrị isi mee ihe iji zere itinye ihe mgbochi ndị na-enweghị isi n’ihu di ya?

8 E nwere ọtụtụ ihe dị irè ị pụrụ ime iji nwee mmetụta n’àgwà di ma ọ bụ nwunye gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na di gị na-ajụ okpukpe gị, enyela ya ezi ihe ndị ọ ga-emere mkpesa n’akụkụ ndị ọzọ. Na-edebe ụlọ ọcha. Lekọta otú ị na-adị n’anya. Na-ekwu ọtụtụ okwu ịhụnanya na ekele. Kama ịdị na-akatọ akatọ, na-enye nkwado. Gosi na ị na-elegara ya anya maka ịbụisi. Emegwarala ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka e mejọrọ gị. (1 Pita 2:21, 23) Nye ohere maka ezughị okè mmadụ, ọ bụrụkwa na esemokwu ebilite, n’obi umeala bụrụ onye mbụ ịrịọ mgbaghara.—Ndị Efesọs 4:26.

9 Ekwela ka gị ịga nzukọ bụrụ ihe na-eme ka nri ya bụrụ n’azụ oge. Ị pụkwara ịhọrọ ikere òkè n’ozi ndị Kraịst n’oge dị iche iche mgbe di gị na-anọghị n’ụlọ. Ọ bụ ihe amamihe ka nwunye bụ́ onye Kraịst ghara imere di ya nkwusa mgbe ọ na-adịghị anabata nke a. Kama nke ahụ, ọ na-agbaso ndụmọdụ Pita onyeozi, bụ́: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu; ka, ọbụna a sị na ụfọdụ ekwenyeghị okwu Chineke, ka e wee site n’ibi obi nwunye ha rite ha n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu; mgbe ha na-ele ibi obi unu dị ọcha, ya na egwu.” (1 Pita 3:1, 2) Ndị nwunye bụ́ ndị Kraịst na-arụ ọrụ igosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke n’ụzọ zuru ezu karị.—Ndị Galetia 5:22, 23.

MGBE NWUNYE NA-EJIGHỊ ISO ỤZỌ KRAỊST KPỌRỌ IHE

10. Olee otú di kwere ekwe kwesịrị isi meso nwunye ya ma ọ bụrụ na nkwenkwe ya dị iche?

10 Gịnị ma ọ bụrụ na ọ bụ di bụ onye ji iso ụzọ Kraịst kpọrọ ihe ma nwunye abụghị? Bible na-enye nduzi maka ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Ọ na-asị: “Ọ bụrụ na nwanna ọ bụla nwere nwunye na-ekweghị ekwe, ọ bụrụkwa na ọ dị nwanyị ahụ ezi mma ka ya na ya biri, ka di ya ghara ịhapụ ya.” (1 Ndị Kọrint 7:12) Ọ na-adụkwa ndị bụ di ọdụ, sị: “Hụnụ nwunye unu n’anya.”—Ndị Kọlọsi 3:19.

11. Olee otú di pụrụ isi gosi nghọta ma jiri akọ bụụrụ nwunye ya isi ma ọ bụrụ na o jighị Iso Ụzọ Kraịst kpọrọ ihe?

11 Ọ bụrụ na ị bụ di nke nwunye ya nọ n’okpukpe dị iche na nke gị, lezie anya karịsịa iji kwanyere nwunye gị ùgwù, na-echebakwara mmetụta ya echiche. Dị ka onye toro eto, o ruru eru inweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe ime ihe kwekọrọ na nkwenkwe okpukpe ya, ọbụna ma ọ bụrụ na i kwenyeghị na ha. Mgbe mbụ ị gwara ya banyere okpukpe gị, atụla anya na ọ ga-agbakụta nkwenkwe ndị o nweworo eri ogologo oge azụ ma nara ihe ọhụrụ. Kama ikwu ngwa ngwa na ihe omume ndị ya na ezinụlọ ya jiworo kpọrọ oké ihe eri ogologo oge bụ ụgha, jiri ndidi gbalịa iso ya tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ pụrụ ịbụ na ọ na-adị ya ka a na-eleghara ya anya ma ị na-etinye oge dị ukwuu n’ihe omume dị iche iche nke ọgbakọ. Ọ pụrụ iguzogide mgbalị gị ijere Jehova ozi, ma ozi bụ isi ọ na-ezipụ pụrụ ịbụ nanị: “Achọkwuru m oge gị!” Nwee ndidi. Site ná nchebara echiche gị nke ịhụnanya, mgbe oge na-aga a pụrụ inyere ya aka ịnakwere ezi ofufe.—Ndị Kọlọsi 3:12-14; 1 Pita 3:8, 9.

ỊZỤLITE ỤMỤAKA

12. Ọbụna ma ọ bụrụ na di na nwunye ya nọ n’okpukpe dị iche iche, olee otú e kwesịrị isi tinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ná nzụlite nke ụmụ ha?

12 N’ezinụlọ nke na-adịghị n’otu n’ofufe, izi ụmụaka ihe okpukpe na-abụ ihe iseokwu mgbe ụfọdụ. Olee otú e kwesịrị isi tinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ? Bible na-ekenye nna ibu ọrụ bụ isi nke izi ụmụaka ihe, ma nne nwekwara òkè dị mkpa ikere. (Ilu 1:8; tụlee Jenesis 18:19; Deuterọnọmi 11:18, 19.) Ọbụna ma ọ bụrụ na ọ dịghị anakwere ịbụisi nke Kraịst, nna ahụ ka bụkwa isi ezinụlọ.

13, 14. Ọ bụrụ na di amachibido nwunye ya ịkpọrọ ụmụaka gaa nzukọ ndị Kraịst ma ọ bụ ịmụrụ ha ihe, gịnị ka ọ pụrụ ime?

13 Ndị nna ụfọdụ na-ekweghị ekwe adịghị ajụ ma ọ bụrụ na nne na-ezi ụmụaka ihe n’okwu okpukpe. Ndị ọzọ na-ajụ. Gịnị ma ọ bụrụ na di gị ajụ inye gị ikike ịkpọrọ ụmụaka ahụ gaa nzukọ ọgbakọ ma ọ bụ ọbụna machibido gị ịmụrụ ha Bible n’ụlọ? Ugbu a ị ghaghị itinye ibu ọrụ dị iche iche n’ezi nguzo—ibu ọrụ gị n’ebe Jehova Chineke nọ, nye di bụ́ isi gị, na nye ụmụ gị ị hụrụ n’anya. Olee otú ị pụrụ isi mee ka ndị a kwekọọ?

14 N’ezie ị ga-ekpe ekpere banyere okwu ahụ. (Ndị Filipaị 4:6, 7; 1 Jọn 5:14) Ma n’ikpeazụ, ọ bụ gị bụ onye ga-ekpebi ụzọ ị ga-agbaso. Ọ bụrụ na i jiri akọ mee ihe, na-eme ka o doo di gị anya na ị dịghị ama ịbụisi ya aka, mmegide ya nwere ike imesị belata. Ọbụna ma ọ bụrụ na di gị amachibido gị ịkpọrọ ụmụ gị gaa nzukọ ma ọ bụ iduziri ha ọmụmụ Bible a haziri ahazi, ị ka pụrụ ịkụziri ha ihe. Site ná nkwurịta okwu gị kwa ụbọchị na ihe nlereanya ọma gị, gbalịa ịkụnye n’ime ha ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịhụnanya maka Jehova, okwukwe n’Okwu ya, nkwanye ùgwù maka nne na nna—gụnyere nna ha—nchegbu ịhụnanya maka ndị ọzọ, na iji àgwà ịdị uchu n’ọrụ kpọrọ ihe. Mgbe oge na-aga, nna ahụ pụrụ ịhụta mkpụrụ ọma ndị a na-amịpụta ma jiri uru nke mgbalị gị nile kpọrọ ihe.—Ilu 23:24.

15. Gịnị bụ ibu ọrụ nke nna kwere ekwe n’ọzụzụ ụmụaka?

15 Ọ bụrụ na ị bụ di kwere ekwe ma nwunye gị abụghị, mgbe ahụ ị ghaghị ibu ibu ọrụ nke ịzụlite ụmụ gị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ka ị na-eme nke ahụ, i kwesịrị, n’ezie, ịdị obi ọma, na-ahụ n’anya, nweekwa ezi uche n’imeso nwunye gị ihe.

Ọ BỤRỤ NA OKPUKPE GỊ ABỤGHỊ NKE NDỊ MỤRỤ GỊ

16, 17. Ụkpụrụ dịgasị aṅaa nke Bible ka ụmụaka na-aghaghị icheta ma ọ bụrụ na ha anakwere okpukpe dị iche na nke ndị mụrụ ha?

16 Ọ bụkwaghị ihe ọhụrụ ka ọbụna ụmụntakịrị nakwere echiche okpukpe ndị dị iche na nke ndị mụrụ ha. Ì mewo nke ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, Bible nwere ndụmọdụ maka gị.

17 Okwu Chineke na-asị: “Na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ndị Efesọs 6:1, 2) Nke ahụ na-agụnye nkwanye ùgwù dị mma maka ndị nne na nna. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na nrubeisi nye nne na nna dị mkpa, ọ dịghị ihe ga-eme ka e nye ya n’echebaraghị ezi Chineke ahụ echiche. Mgbe nwatakịrị toruru ịmalite ime mkpebi, ọ na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ibu ọrụ ka elu maka ihe ndị ọ na-eme. Nke a bụ eziokwu ọ bụghị nanị n’ihe banyere iwu ndị ọchịchị kamakwa karịsịa n’ihe banyere iwu Chineke. “Onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke,” ka Bible na-ekwu.—Ndị Rom 14:12.

18, 19. Ọ bụrụ na ụmụaka nọ n’okpukpe dị iche na nke ndị mụrụ ha, olee otú ha pụrụ isi nyere ndị mụrụ ha aka ịghọtakwu okpukpe ha?

18 Ọ bụrụ na nkwenkwe gị emee gị ka i mee mgbanwe ná ndụ gị, gbalịa ịghọta ụzọ nne na nna gị si eche echiche. O yikarịrị ka ọ ga-amasị ha ma ọ bụrụ na, dị ka ihe sitere na gị ịmụta na itinye nkụzi Bible n’ọrụ, ị na-akwanyekwu ùgwù, na-erubekwu isi, na-adịkwu uchu n’ihe ha na-achọ gị n’aka. Otú ọ dị, ọ bụrụ na okpukpe ọhụrụ gị emeekwa ka ị jụ nkwenkwe na omenala ndị ha onwe ha ji kpọrọ oké ihe, ọ pụrụ ịdị ha ka ị na-elelị ihe nketa ha na-achọsi ike inye gị. Ha pụkwara ịtụ egwu maka ọdịmma gị ma ọ bụrụ na ihe ị na-eme abụghị ihe a na-anabata n’ógbè ahụ ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ na-adọpụ uche gị ná nchụso ndị ha chere pụrụ inyere gị aka ịga n’ihu n’ụzọ ihe onwunwe. Nganga pụrụ ịbụkwa ihe mgbochi. Ha pụrụ iche na gị, n’ụzọ a na-ahụ anya, na-asị na i ziri ezi nakwa na ha ezighị ezi.

19 Ya mere, ngwa ngwa o kwere omume, gbalịa idokwa ka nne na nna gị zute ụfọdụ n’ime ndị okenye ma ọ bụ Ndịàmà ọzọ tozuru okè site n’ọgbakọ ị nọ. Gbaa ndị mụrụ gị ume ileta Ụlọ Nzukọ Alaeze iji nụrụ n’onwe ha ihe a na-atụle ma jiri anya ha hụ ụdị mmadụ Ndịàmà Jehova bụ. Mgbe oge na-aga, àgwà nne na nna gị pụrụ ịdị nro. Ọbụna mgbe nne na nna kwesiri olu ike ná mmegide ha, bibie akwụkwọ Bible, ma machibido ụmụaka iwu ịga nzukọ ndị Kraịst, a na-enwekarị ohere ịgụ akwụkwọ n’ebe ọzọ, ikwunyere ndị Kraịst ọzọ okwu, na ịgbara ndị ọzọ àmà na inyere ha aka n’ụzọ a na-ebughị ụzọ mee ndokwa ya. Ị pụkwara ikpegara Jehova ekpere. Ụfọdụ ndị na-eto eto aghaghị ichere ruo mgbe ha toruru ịhapụ ebe obibi ezinụlọ tupu ha enwee ike imekwu ihe. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ọnọdụ dị n’ụlọ, echefula ‘ịsọpụrụ nna gị na nne gị.’ Mee òkè gị n’itinye ihe n’udo dị n’ụlọ. (Ndị Rom 12:17, 18) Karịsịa ihe nile, gbalịa iso Chineke dị n’udo.

IHE ỊMA AKA NKE ỊBỤ NNE MA Ọ BỤ NNA NKUCHI

20. Mmetụta dịgasị aṅaa ka ụmụaka pụrụ inwe ma ọ bụrụ na nna ma ọ bụ nne ha bụ nke nkuchi?

20 N’ọtụtụ ezinụlọ ọnọdụ nke na-eweta ihe ịma aka kasịnụ abụghị okpukpe kama nke isi n’otu ọbara. Ọtụtụ ezinụlọ taa gụnyere ụmụ sitere n’alụmdi na nwunye ndị gara aga nke otu n’ime nne na nna ma ọ bụ ha abụọ. N’ezinụlọ dị otú ahụ, ụmụaka pụrụ inwe ekworo na iwe ma ọ bụ ma eleghị anya nsogbu nke amaghị onye a ga-egosi nnọgidesi ike n’ihe. N’ihi ya, ha pụrụ iguzogide mgbalị ndị sitere n’ezi obi nke nne ma ọ bụ nna nkuchi ịbụ ezi nne ma ọ bụ nna. Gịnị pụrụ inye aka ime ezinụlọ nkuchi nke na-aga nke ọma?

Foto dị na peeji nke 138

Ma ị bụ nne ma ọ bụ nna mụrụ ụmụ ma ọ bụ nke nkuchi, dabere na Bible maka nduzi

21. N’agbanyeghị ọnọdụ ha pụrụ iche, n’ihi gịnị ka ndị nne ma ọ bụ nna nkuchi kwesịrị iji lega anya n’ụkpụrụ ndị a na-achọta na Bible maka enyemaka?

21 Mata na n’agbanyeghị ọnọdụ ndị pụrụ iche, ụkpụrụ Bible ndị na-eweta ihe ịga nke ọma n’ezinụlọ ndị ọzọ dịkwa irè n’ebe a. Ileghara ụkpụrụ ndị ahụ anya pụrụ, ruo nwa oge, iyi ka ọ na-ebelata otu nsogbu ma o yikarịrị ka ọ ga-eduba n’obi mgbu ma e mesịa. (Abụ Ọma 127:1; Ilu 29:15) Zụlite amamihe na nghọta—amamihe itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ na-eburu abamuru ndị na-adịte anya n’uche, na nghọta ịmata ihe mere ndị òtù ezinụlọ ji ekwu ma ọ bụ eme ihe ụfọdụ. E nwekwara mkpa maka ọmịiko.—Ilu 16:21; 24:3; 1 Pita 3:8.

22. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji siere ụmụaka ike ịnakwere nne ma ọ bụ nna nkuchi?

22 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nkuchi, ị pụrụ icheta na dị ka enyi ezinụlọ ahụ, ụmụaka ahụ ma eleghị anya nabatara gị. Ma mgbe ị ghọrọ nne ma ọ bụ nna nkuchi ha, àgwà ha nwere ike ịgbanwewo. N’icheta nne ma ọ bụ nna mụrụ ha bụ́ onye na-ebinyekwaraghị ha, ụmụaka ahụ pụrụ ịdị na-agbaso nsogbu nke onye ha ga-egosi nnọgidesi ike n’ihe mgba, ma eleghị anya na-eche na ị na-achọ iwepụ ịhụnanya ha nwere maka nne ma ọ bụ nna ahụ nke na-anọkwaghị ya. Mgbe ụfọdụ, ha pụrụ ịsaghepụ ọnụ chetara gị na ị bụghị nna ha ma ọ bụ nne ha. Okwu dịgasị otú ahụ na-etiwa obi. Otú ọ bụla o si dị, “ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị.” (Eklisiastis 7:9) Nghọta na ọmịiko dị mkpa iji nagide mmetụta uche ụmụaka ahụ.

23. Olee otú a pụrụ isi dọọ aka ná ntị n’ezinụlọ nwere ụmụ nkuchi?

23 Àgwà ndị ahụ dị oké mkpa mgbe mmadụ na-enye ịdọ aka ná ntị. Ịnọgidesi ike n’ịdọ aka ná ntị dị mkpa. (Ilu 6:20; 13:1) Ebe ọ bụkwa na ụmụaka nile abụghị otu, ịdọ aka ná ntị pụrụ ịdị iche site n’otu ọnọdụ gaa n’ọzọ. Ụfọdụ ndị nne ma ọ bụ nna nkuchi na-achọpụta na, ma ọ dịghị ihe ọzọ ná mmalite, ọ pụrụ ịka mma ka onye nke mụrụ ya lekọta akụkụ nke a nke ịbụ nne ma ọ bụ nna. Ma, ọ dị mkpa na nne na nna ahụ kwekọtara n’ịdọ aka ná ntị ahụ ma jigide ya, hapụ imelara nwa afọ mmadụ karịa nwa nkuchi. (Ilu 24:23) Nrubeisi dị mkpa, ma ọ dị mkpa inye ohere maka ezughị okè. Emeghachila omume gabiga ókè. Dọọ aka ná ntị n’ịhụnanya.—Ndị Kọlọsi 3:21.

24. Gịnị pụrụ inye aka igbochi nsogbu omume n’etiti ndị nwoke na nwanyị n’ezinụlọ nkuchi?

24 Nkwurịta okwu ezinụlọ pụrụ ime ihe dị ukwuu iji gbochie nsogbu. Ndị a pụrụ inyere ezinụlọ aka ilegide okwu ndị ka mkpa ná ndụ anya. (Tụlee Ndị Filipaị 1:9-11.) Ha pụkwara inyere onye ọ bụla aka ịhụ ụzọ ọ pụrụ isi soro mee ka e nweta ihe mgbaru ọsọ dị iche iche nke ezinụlọ. Tụkwasịkwa, nkwurịta okwu ezinụlọ n’obi eziokwu pụrụ igbochi nsogbu omume. Ọ dị ndị inyom mkpa ịghọta ụzọ isi jie ejiji ma kpaa àgwà n’ebe nna nkuchi na ụmụnne nwoke nkuchi ha nọ, ndị ikom nwekwara mkpa ndụmọdụ n’àgwà kwesịrị ekwesị n’ebe nne nkuchi na ụmụnne nwanyị nkuchi ọ bụla nọ.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-8.

25. Àgwà dịgasị aṅaa pụrụ inye aka idebe udo n’ezinụlọ nkuchi?

25 N’izute ihe ịma aka pụrụ iche nke ịbụ nne ma ọ bụ nna nkuchi, nwee ndidi. Ọ na-ewe oge iji zụlite mmekọrịta ndị ọhụrụ. Inweta ịhụnanya na nkwanye ùgwù nke ụmụaka ndị gị na ha na-enweghị nkekọ ọmụmụ bụ oké ọrụ. Ma ọ na-ekwe omume. Obi nke maara ihe ma na-aghọta ihe, tinyere ọchịchọ siri ike ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, bụ ugodi na-eduje n’udo n’ezinụlọ nkuchi. (Ilu 16:20) Àgwà ndị dị otú ahụ pụkwara inyere gị aka ịnagide ọnọdụ ndị ọzọ.

NCHỤSO IHE ONWUNWE HÀ NA-EKEWA EZINỤLỌ GỊ?

26. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka nsogbu na àgwà dị iche iche banyere ihe onwunwe pụrụ isi kewaa ezinụlọ?

26 Nsogbu na àgwà dị iche iche banyere ihe onwunwe pụrụ ikewa ezinụlọ n’ọtụtụ ụzọ. N’ụzọ dị mwute, esemokwu banyere ego na ọchịchọ ịba ọgaranya—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ịbatụkwu ọgaranya—na-akpaghasị ezinụlọ ụfọdụ. Nkewa pụrụ ibilite mgbe ma di ma nwunye na-arụ ọrụ ego ma zụlite àgwà nke “ego m, ego gị.” Ọbụna ma ọ bụrụ na e zere arụmụka, mgbe ma di ma nwunye na-arụ ọrụ ha pụrụ ịhụta na ha nwere usoro ihe omume nke na-ahapụ oge dị nta maka ibe ha. Omume na-arị elu n’ụwa bụ ka ndị nna biri n’ebe ezinụlọ ha na-ebighị ruo ogologo oge—ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ afọ—iji kpatakwuo ego karịa ka ha ga-akpata mgbe ọ bụla n’ebe obibi ha. Nke a pụrụ iduba ná nsogbu ndị siri ike nke ukwuu.

27. Olee ụkpụrụ ụfọdụ pụrụ inyere ezinụlọ nọ ná nrụgide ego aka?

27 A pụghị iti iwu maka ilekọta ọnọdụ ndị a, ebe ọ bụ na ezinụlọ dị iche iche na-eche nrụgide na mkpa dịgasị iche iche ihu. Ka o sina dị, ndụmọdụ Bible pụrụ inye aka. Dị ka ihe atụ, Ilu 13:10 na-egosi na a pụrụ igbochi esemokwu na-enweghị isi mgbe ụfọdụ site ‘n’ịdụkọrịta ọdụ.’ Nke a adịghị agụnye nanị ikwu echiche onwe onye kama ịchọ okwu ndụmọdụ na ịchọpụta ụzọ onye nke ọzọ si ele okwu anya. Ọzọ, ime atụmatụ mmefu ego ezi uche dị na ya pụrụ inye aka ijikọta mgbalị nile ezinụlọ na-eme ọnụ. Mgbe ụfọdụ ọ dị mkpa—ikekwe ruo nwa oge—ka ma di ma nwunye na-arụ ọrụ n’èzí ebe obibi iji lekọta mmefu ndị a gbakwụnyere, karịsịa mgbe e nwere ụmụaka ma ọ bụ ndị ọzọ a ga-elekọta. Mgbe nke a bụ ọnọdụ dịnụ, di pụrụ imesi nwunye ya obi ike na ya ka nwere oge maka ya. Ya na ụmụaka pụrụ iji ịhụnanya nye aka n’ụfọdụ ọrụ ọ pụrụ ịdị na-arụbu nanị ya.—Ndị Filipaị 2:1-4.

28. Ihe ncheta ndị dị aṅaa, ma ọ bụrụ na e debe ha, ga-enyere ezinụlọ aka ịrụ ọrụ iji dị n’otu?

28 Otú ọ dị, buru n’uche na ọ bụ ezie na ego bụ ihe dị mkpa n’usoro ihe a, ọ dịghị eweta obi ụtọ. Ọ dịghị enye ndụ. (Eklisiastis 7:12) N’ezie, ikwubiga okwu ókè banyere ihe onwunwe pụrụ ịkpata mbibi ime mmụọ na nke omume. (1 Timoti 6:9-12) Lee ka o si ka mma nke ukwuu ibu ụzọ chọọ Alaeze Chineke na ezi omume ya, na-enwe obi ike inweta ngọzi ya ná mgbalị anyị nile iji nweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ! (Matiu 6:25-33; Ndị Hibru 13:5) Site n’ibute ọdịmma ime mmụọ ụzọ na site n’ibu ụzọ chụsoo udo n’ebe Chineke nọ, ị pụrụ ịchọpụta na ezinụlọ gị, ọ bụ ezie na ikekwe ọnọdụ ụfọdụ kewara ya, ga-abụ nke dị n’otu n’ezie n’ụzọ ndị kasị mkpa.

OLEE OTÚ ỤKPỤRỤ BIBLE NDỊ A PỤRỤ ISI NYERE . . . NDỊ ÒTÙ EZINỤLỌ AKA ICHEBE UDO N’EBE OBIBI?

Ndị Kraịst na-azụlite nghọta.—Ilu 16:21; 24:3.

Di na nwunye igosipụta ịhụnanya na nkwanye ùgwù adabereghị na ha ịnọ n’otu okpukpe.—Ndị Efesọs 5:23, 25.

Onye Kraịst agaghị ama ụma mebie iwu Chineke ma ọlị.—Ọrụ 5:29.

Ndị Kraịst bụ ndị na-eme udo.—Ndị Rom 12:18.

Ewela iwe ngwa ngwa.—Eklisiastis 7:9.

ALỤMDI NA NWUNYE KWESỊRỊ EKWESỊ NA-EWETA ÙGWÙ NA UDO

N’ụbọchị anyị ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom na-ebikọta dị ka di na nwunye n’enweghị nraranye ọ bụla iwu kwadoro. Nke a bụ ọnọdụ nke onye ọhụrụ kwere ekwe pụrụ iche ihu. N’ihe atụ ụfọdụ, omenala ndị ógbè ma ọ bụ agbụrụ pụrụ ịnakwere njikọ ahụ, ma ọ bụghị nke iwu kwadoro. Otú ọ dị, ụkpụrụ Bible chọrọ ka alụmdi na nwunye bụrụ nke e dejupụtara n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Taịtọs 3:1; Ndị Hibru 13:4) Nye ndị nọ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst, Bible setịpụkwara na a ga-enwe nanị otu di na otu nwunye ná njikọ alụmdi na nwunye. (1 Ndị Kọrint 7:2; 1 Timoti 3:2, 12) Ikwekọ n’ụkpụrụ a bụ nzọụkwụ mbụ gaa n’inweta udo n’ezinụlọ gị. (Abụ Ọma 119:165) Ihe Jehova chọrọ abụghị ihe ezi uche na-adịghị na ha ma ọ bụ ibu arọ. Ihe ọ na-ezi anyị bụ nke a kwadebere iji baara anyị uru.—Aịsaịa 48:17, 18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya