Kpachara Anya Maka “Ndị Epikurean”
“Ọ bụ nnọọ ezigbo mmadụ! Ọ na-adị ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume ndị dị elu. Ọ naghị ese siga, eji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ọ bụ na-ekwu okwu rụrụ arụ. N’ezie, ọ bụ ezigbo mmadụ karịa ụfọdụ ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst!”
Ị̀ NỤWO ka ụfọdụ ji iche echiche dị otu ahụ na-akwado ọbụbụenyi na-ekwesịghị ekwesị ha na-azụlite? Ọ̀ na-akwụsi ike ma e jiri Akwụkwọ Nsọ nyochaa ya? Ihe atụ sitere n’otu ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ na-akọwa okwu a.
Na narị afọ mbụ, Pọl onyeozi dọrọ ọgbakọ dị na Kọrint aka ná ntị, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu: Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” Ikekwe ụfọdụ ndị Kraịst sooro ndị nkà ihe ọmụma Grik nwere mmetụta n’ebe ha nọ kpachie anya, gụnyere ndị Epikurean. Olee ndị bụ ndị Epikurean? N’ihi gịnị ka ha ga-eji bụrụ ihe iyi egwu ime mmụọ nye ndị Kraịst nọ na Kọrint? È nwere mmadụ ndị dị ka ha taa, megide ole ndị ka anyị kwesịrị ịnọ na nche?—1 Ndị Kọrint 15:33.
Olee Ndị Bụ Ndị Epikurean?
Ndị Epikurean bụ ndị na-eso ụzọ onye ọkà ihe ọmụma Grik bụ́ Epicurus, onye dịrị ndụ site na 341 ruo 270 T.O.A. Ọ kụziri na ihe ụtọ bụ nanị ma ọ bụ ihe kasị mma ná ndụ. Nke ahụ ọ̀ pụtara na ndị Epikurean ahụ dịrị ndụ n’ụzọ rụrụ arụ, n’enweghị ụkpụrụ, na-ahọrọ omume ndị na-eweda n’ala n’ọchịchọ ha nọgidere na-achọ ihe ụtọ? N’ụzọ na-eju anya, Epicurus akụzighịrị ụmụazụ ya ibi ndụ otú ahụ! Kama, ọ kụziri na a na-enweta ihe ụtọ karịsịa site n’ịdị ndụ kwekọrọ n’amamihe, obi ike, njide onwe onye, na ikpe ziri ezi. Ọ kwadoro nchụso, ọ bụghị nke ihe ụtọ dị ugbu a na nke na-adịru nwa oge, kama ọ bụ ihe ụtọ nke na-adịru ndụ nile. Otú a ndị Epikurean pụrụ iyiworị ndị na-eme ezi ihe ma e were ha tụnyere ndị na-eme mmehie dị oké njọ.—Tụlee Taịtọs 1:12.
Ò Yiri Iso Ụzọ Kraịst?
Ọ bụrụ na ị nọ n’ọgbakọ Kọrint oge mbụ, ndị Epikurean hà gaara enwe mmetụta n’ahụ gị? Ụfọdụ pụrụ icheworị na ụkpụrụ ndị dị elu nke ndị Epikurean mere ha ndị mkpakọrịta na-adịghị ize ndụ maka ndị Kraịst. N’imekwu ngọpụ, ndị Kọrint pụrụ ịhụworị ihe dị ka myirịta dị n’etiti ụkpụrụ ndị Epikurean na ndị nke Okwu Chineke.
Dị ka ihe atụ, ndị Epikurean gosiri imeru ihe n’ókè ná nchụso ha na-achụso ihe ụtọ. Ha ji ihe ụtọ nke uche kpọrọ ihe karịa ihe ụtọ nke anụ ahụ. Ihe mmadụ riri adịghị mkpa dị ka mmekọrịta nke ya na onye ya na ya riri ya. Ọbụna na ndị Epikurean ekereghị òkè na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ime ihe ọjọọ na nzuzo. Lee ka ọ pụworo isi dị mfe iche, sị: “Ha dị nnọọ ka anyị!”
Otú ọ dị, ndị Epikurean hà dị ka ndị Kraịst oge mbụ n’ezie? Ọ dịghị ma ọlị. Ndị nwere ike nghọta a zụrụ nke ọma pụrụ ịhụta ọdịiche ndị dị ịrịba ama. (Ndị Hibru 5:14) Ị̀ pụrụ? Ka anyị leruo ozizi Epicurus anya nke ọma.
Akụkụ Dị Njọ ná Nkụzi Epicurus
Iji nyere ụmụ mmadụ aka imeri egwu nke chi dị iche iche na nke ọnwụ, Epicurus kụziri na chi ndị ahụ enweghị mmasị n’ihe a kpọrọ mmadụ, ha adịghịkwa etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ. Dị ka Epicurus si kwuo, chi ndị ahụ ekeghị eluigwe na ala, ndụ malitekwara na mberede. Nke a ó megideghị nkụzi Bible bụ na e nwere “otu Chineke,” bụ́ Onye Okike, nakwa na ọ na-elekọta mmadụ ndị o kere eke?—1 Ndị Kọrint 8:6; Ndị Efesọs 4:6; 1 Pita 5:6, 7.
Epicurus kụzikwara na ndụ apụghị ịdị mgbe a nwụsịrị. Nke a, n’ezie, megidere nkụzi Bible nke mbilite n’ọnwụ. N’ezie, mgbe Pọl onyeozi kwuru okwu n’Areọpagọs, ma eleghị anya ndị Epikurean ahụ so ná ndị gbaghara okwu Pọl banyere ozizi nke mbilite n’ọnwụ.—Ọrụ 17:18, 31, 32; 1 Ndị Kọrint 15:12-14.
Ọ pụrụ ịbụ na ihe kasị ize ndụ n’ozizi Epicurus bụkwa nke kasị dị aghụghọ. Nkweta ọ na-ekwetaghị ná ndụ mgbe a nwụsịrị dugara ya n’ikwubi na mmadụ kwesịrị ịdị ndụ obi ụtọ ruo n’ókè o kwere mee n’oge mkpirikpi ndụ ya n’elu ala. Dị ka anyị hụworo, echiche ya abụchaghị ịdị ndụ nke mmehie kama, ịnụ ụtọ nke oge ugbu a, ebe ọ bụ na ugbu a bụ oge nile anyị nwere.
N’ihi ya, Epicurus agbaghị ume ime ihe ọjọọ na nzuzo iji zere ụjọ nke ịbụ onye a chọpụtara, bụ́ ihe na-eyi obi ụtọ nke oge dị ugbu a egwu. Ọ gbara ume imeru ihe n’ókè iji zere ihe na-esi n’imebiga ihe ókè pụta, bụ́ ihe ọzọ na-egbochi obi ụtọ dị ugbu a. Ọ gbakwara ume iso ndị ọzọ nwee ezi mmekọrịta n’ihi na ha imeghachi omume n’ụzọ dị otú ahụ bara uru. N’ezie, izere ime ihe ọjọọ na nzuzo, imeru ihe n’ókè, na ịzụlite ọbụbụenyi dịcha mma n’onwe ha. Ya mere, n’ihi gịnị ka nkà ihe ọmụma Epicurus ji dị ize ndụ nye onye Kraịst? N’ihi na ndụmọdụ ya dabeere n’echiche ya nke enweghị okwukwe: “Ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.”—1 Ndị Kọrint 15:32.
N’ikwu eziokwu, Bible na-egosi ndị mmadụ ụzọ e si ebi ndụ obi ụtọ ugbu a. Otú ọ dị, ọ na-enye ndụmọdụ, sị: “Debe onwe unu n’ịhụnanya Chineke, na-eche ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ruo ndụ ebighị ebi.” (Jud 21) Ee, Bible na-emesi ọdịnihu agwụghị agwụ ike karị, ọ bụghị oge dị ugbu a nke na-apụ n’anya. Nye onye Kraịst, ijere Chineke ozi bụ mmasị bụ́ isi, ọ na-achọpụtakwa na mgbe o debere Chineke n’ọnọdụ mbụ, ọ na-enwe obi ụtọ na afọ ojuju. N’ụzọ yiri nke ahụ, Jisọs, kama imikpu onwe ya n’ọdịmma onwe ya, ji ume ya mee ihe n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị iji jeere Jehova ozi, nyekwara ụmụ mmadụ aka. Ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya imere ndị ọzọ ihe ọma, ọ bụghị n’olileanya nke ịbụ ndị e meghachiiri ha, kama site n’ezi ịhụnanya maka ha. N’ụzọ doro anya, mkpali ndị bụ isi nke Nkụzi Epicurus na Iso Ụzọ Kraịst dị nnọọ iche.—Mak 12:28-31; Luk 6:32-36; Ndị Galetia 5:14; Ndị Filipaị 2:2-4.
Ihe Ize Ndụ Dị Aghụghọ
N’ụzọ na-emegide onwe ya, ọ bụ ezie na ndị Epikurean mesiri inwe obi ụtọ ike otú ahụ, n’ọnọdụ kasị mma obi ụtọ ha bụ nke a kpaara ókè. N’enweghị “ọṅụ Jehova,” Epicurus kpọrọ ndụ “onyinye dị ilu.” (Nehemaịa 8:10) Lee obi ụtọ ndị Kraịst oge mbụ nwere ná ntụnyere! Jisọs adịghị ekwu ka a dịrị ndụ enweghị obi ụtọ nke ịnapụ onwe onye ihe. N’ezie, ịgbaso ụzọ ya bụ nke na-eduga n’obi ụtọ kasị ukwuu.—Matiu 5:3-12.
Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ Kọrint chere na ha pụrụ isoro ndị echiche ndị Epikurean nwere mmetụta n’ahụ ha kpakọọ n’etinyeghị okwukwe ha n’ize ndụ, ha hiere ụzọ. N’oge Pọl na-ede akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrint, ụfọdụ n’ime ha enwekwaghị okwukwe ná mbilite n’ọnwụ.—1 Ndị Kọrint 15:12-19.
È Nwere Nkụzi Epicurus Taa?
Ọ bụ ezie na nkụzi Epicurus pụrụ n’anya na narị afọ nke anọ O.A., e nwere taa ndị nakweere echiche yiri nke ihe onye riri ka o bu. Ndị a nwere okwukwe dị nta ná nkwa Chineke nke ndụ agwụghị agwụ. Ma, ụfọdụ ha nwere nnọọ ụkpụrụ àgwà dịtụ elu.
A pụrụ ịnwa onye Kraịst iso ndị dị otú ahụ nwee mkpakọrịta chiri anya, ikekwe na-eche na àgwà ha ndị dị mma mere ka ịbụ enyi ha zie ezi. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na anyị adịghị ele onwe anyị anya dị ka ndị ka mma, anyị aghaghị iburu n’uche na ndị ‘mkparịta ọjọọ’ nile—gụnyere ndị mmetụta ha dị aghụghọ karị—“na-emebi omume ọma.”
Echiche ihe onye riri ka o bu na-ebilitekwa n’ụfọdụ nzukọ ọmụmụ ihe achụmnta ego, akwụkwọ enyemaka onwe onye, akwụkwọ ọgụgụ, sịnịma, ihe omume telivishọn, na egwú. Ọ bụ ezie na ha adịghị akwalite àgwà mmehie kpọmkwem, echiche a nke okwukwe na-adịghị na ya ọ̀ pụru imetụta anyị n’ụzọ ndị dị aghụghọ? Dị ka ihe atụ, ànyị pụrụ imikpu onwe anyị n’imeju ọchịchọ onwe onye nke na anyị adịkwaghị ahụ ihe iseokwu nke ọbụbụeze Jehova? À pụrụ ịdọpụ uche anyị gaa ‘n’iwere ya nwayọọ’, kama ‘ịrụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè’? Ka à pụrụ iduhie anyị gaa n’inwe obi abụọ n’izi ezi na abamuru nke ụkpụrụ Jehova? Ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche megide ma ịbụ ndị e kpughere kpọmkwem nye omume rụrụ arụ, ime ihe ike, na mgbaasị ma megide ndị echiche nke ụwa nwere mmetụta n’ahụ ha!—1 Ndị Kọrint 15:58; Ndị Kọlọsi 2:8.
Ya mere, ka anyị zụlite mkpakọrịta, karịsịa n’etiti ndị na-agbaso nduzi Jehova site n’obi dum. (Aịsaịa 48:17) N’ihi ya, a ga-eme ka àgwà ọma anyị sie ike. A ga-ewusi okwukwe anyị ike. Anyị ga-adị ndụ obi ụtọ ọ bụghị nanị ugbu a kama n’ọdịnihu, na-atụ anya ndụ ebighị ebi.—Abụ Ọma 26:4, 5; Ilu 13:20.
[Foto dị na peeji nke 24]
Epicurus kụziri na chi dị iche iche enweghị mmasị n’ihe a kpọrọ mmadụ
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike nke The British Museum