-
Ndị Nne na Nna, Gịnị Ka Ihe Nlereanya Unu Na-akụzi?Ụlọ Nche—1999 | Julaị 1
-
-
Ndị Nne na Nna, Gịnị Ka Ihe Nlereanya Unu Na-akụzi?
“Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya; na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya.”—NDỊ EFESỌS 5:1, 2.
1. Ụdị nduzi ndị dị aṅaa ka Jehova nyere di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ?
JEHOVA bụ Onye Mmalite nke ndokwa ezinụlọ. Ọ bụ ya mere ka ezinụlọ nile dịrị n’ihi na o guzobere ezinụlọ mbụ ma nye di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ ikike ịmụ ụmụ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) O nyere Adam na Iv ntụziaka ndị bụ́ isi banyere ibu ọrụ ha, o nyekwara ha ohere hiri nne iji ọchịchọ ha mee ihe n’ịrụzu ibu ọrụ ndị a. (Jenesis 1:28-30; 2:15-22) Mgbe Adam na Iv mehiesịrị, ọnọdụ ndị ezinụlọ na-aghaghị ịnagide ghọrọ ndị dị mgbagwoju anya karị. Ma, Jehova ji ịhụnanya nye ụkpụrụ nduzi ndị ga-enyere ndị ohu ya aka ịnagide ọnọdụ ndị dị otú ahụ.
2. (a) Site n’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova siworo jiri ntụziaka e nyere n’ọnụ mesie ndụmọdụ e dere ede ike? (b) Olee ajụjụ ọ dị ndị nne na nna mkpa ịjụ onwe ha?
2 Dị ka Onye Nkụzi Ukwu anyị, Jehova emewo ihe karịrị inye anyị nduzi ndị e dere ede banyere ihe anyị kwesịrị ime na ihe anyị kwesịrị izere. N’oge ochie, o nyekọtara ntụziaka e dere ede na ntụziaka e kwuru n’ọnụ site n’aka ndị nchụàjà na ndị amụma nakwa site n’aka ndị isi ezinụlọ. Olee ndị o ji eme ihe n’oge anyị iji nye nkụzi dị otú ahụ a kụziri n’ọnụ? Ọ bụ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na ndị nne na nna. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ị̀ na-eme òkè gị iji nye ezinụlọ gị ntụziaka n’ụzọ nile nke Jehova?—Ilu 6:20-23.
3. Gịnị ka ndị isi ezinụlọ pụrụ ịmụta n’aka Jehova banyere nkụzi dị irè?
3 Olee otú e kwesịrị isi nye ntụziaka dị otú ahụ n’ime ezinụlọ? Jehova na-esetịpụ ihe nlereanya na nke a. N’ụzọ doro anya, ọ na-ekwu ihe bụ́ ezi ihe na ihe bụ́ ihe ọjọọ, ọ na-ekwughachikwa ya ugboro ugboro. (Ọpụpụ 20:4, 5; Deuterọnọmi 4:23, 24; 5:8, 9; 6:14, 15; Joshua 24:19, 20) Ọ na-eji ajụjụ ndị na-akpali echiche eme ihe. (Job 38:4, 8, 31) Site n’iji ilu na ihe atụ ndị mere eme eme ihe, ọ na-akpali mmetụta uche anyị, na-akpụzikwa obi anyị. (Jenesis 15:5; Daniel 3:1-29) Ndị nne na nna, mgbe unu na-akụziri ụmụ unu ihe, ùnu na-agbalị iṅomi ihe nlereanya ahụ?
4. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Jehova banyere inye ịdọ aka ná ntị, n’ihi gịnịkwa ka ịdọ aka ná ntị ji dị mkpa?
4 Jehova na-akwụsi ike maka ezi ihe, ma ọ na-aghọta mmetụta ezughị okè na-enwe. Ya mere tupu o nye ntaramahụhụ, ọ na-akụziri ụmụ mmadụ na-ezughị okè ihe, na-enyekwa ha ịdọ aka ná ntị na ihe ncheta ugboro ugboro. (Jenesis 19:15, 16; Jeremaịa 7:23-26) Mgbe ọ na-adọ aka ná ntị, ọ na-emeru ya n’ókè, ọ bụghị imebiga ya ókè. (Abụ Ọma 103:10, 11; Aịsaịa 28:26-29) Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka anyị si emeso ụmụ anyị ihe, ọ na-egosi na anyị maara Jehova, ọ ga-akakwa adịrị ha onwe ha mfe ịmara ya.—Jeremaịa 22:16; 1 Jọn 4:8.
5. Gịnị ka ndị nne na nna pụrụ ịmụta n’aka Jehova banyere ige ntị?
5 N’ụzọ magburu onwe ya, Jehova na-ege ntị dị ka Nna nke eluigwe na-ahụ n’anya. Ihe ọ na-eme abụghị nanị inye iwu. Ọ na-agba anyị ume ikwupụtara ya obi anyị. (Abụ Ọma 62:8) Ọ bụrụkwa na mmetụta ndị anyị na-ekwupụta ezichaghị ezi, ọ dịghị esi n’eluigwe bigbọọ n’ịbara anyị mba. Ọ na-eji ndidi akụziri anyị ihe. Ya mere, lee nnọọ ka ndụmọdụ Pọl onyeozi si kwesị ekwesị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụru n’anya”! (Ndị Efesọs 4:31–5:1) Lee ihe nlereanya ọma Jehova na-esetịpụrụ ndị nne na nna ka ha na-achọ ịkụziri ụmụ ha ihe! Ọ bụ ihe nlereanya nke na-eru anyị n’obi ma na-akpali anyị ịchọ ije ije n’ụzọ ndụ ya.
Mmetụta nke Ihe Nlereanya Na-enwe
6. Olee otú àgwà na ihe nlereanya nke ndị nne na nna si emetụta ụmụ ha?
6 Tụkwasị ná ntụziaka e nyere n’ọnụ, ihe nlereanya na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ebe ụmụaka nọ. Ma ọ̀ dị ndị nne na nna mma ma ọ bụ na ọ dịghị ha, ụmụ ha gaje iṅomi ha. Ọ pụrụ ịtọ ndị nne na nna ụtọ—mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịwụ ha akpata oyi—mgbe ha ga-anụ ka ụmụ ha na-ekwu ihe ha onwe ha kwuworo. Mgbe ma omume ma àgwà nke nne na nna na-egosipụta ekele miri emi maka ihe ime mmụọ, nke a na-enwe mmetụta dị mma n’ebe ụmụ ha nọ.—Ilu 20:7.
7. Ihe nlereanya dị aṅaa nke onye bụ́ nna ka Jefta setịpụụrụ ada ya, gịnịkwa si na ya pụta?
7 A kọwara mmetụta nke ihe nlereanya ndị nne na nna na-enwe nke ọma n’ime Bible. Jefta, bụ́ onye Jehova ji mee ihe iduru ụmụ Israel gaa merie ụmụ Amọn, bụkwa nna. Ihe ndekọ nke ihe ọ zaghachiri eze Amọn na-egosi na ọtụtụ ugboro, Jefta aghaghị ịgụwo akụkọ banyere mmeso Jehova mesoro ụmụ Israel. Ọ dịịrị ya mfe ihota akụkọ ahụ, o gosipụtakwara okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ. Obi abụọ adịghị ya na ihe nlereanya ya nyeere ada ya aka iwulite okwukwe na mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà bụ́ ndị o gosipụtara site n’ije ozi ná ndụ ya nile dị ka nwanyị na-alụghị di nke a raara nye Jehova.—Ndị Ikpe 11:14-27, 34-40; tụlee Joshua 1:8.
8. (a) Ezi àgwà dị aṅaa ka nne na nna Samuel gosipụtara? (b) Olee otú nke ahụ si baara Samuel uru?
8 Samuel gosipụtara ezi ihe nlereanya dị ka nwata ma kwesị ntụkwasị obi nye Chineke dị ka onye amụma ná ndụ ya nile. Ọ̀ ga-amasị unu ka ụmụ unu dị ka ya? Tụlee ihe nlereanya nne na nna Samuel, bụ́ Hana na Elkena, setipụrụ. Ọ bụ ezie na ọnọdụ e nwere n’ezinụlọ ha adịchaghị mma, ha gara Shaịlo mgbe mgbe maka ife ofufe, n’ebe e nwere ụlọikwuu dị nsọ. (1 Samuel 1:3-8, 21) Rịba ama otú mmetụta Hana ji kpee ekpere haruru. (1 Samuel 1:9-13) Rịba ama mmetụta ha abụọ nwere banyere ịdị mkpa nke imezu nkwa ọ bụla e kwere Chineke. (1 Samuel 1:22-28) Obi abụọ adịghị ya na ezi ihe nlereanya ha nyeere Samuel aka ịzụlte àgwà ndị mere ka o nwee ike ịgbaso ụzọ ziri ezi—ọbụna mgbe ndị gbara ya gburugburu bụ́ ndị e chere na ha na-ejere Jehova ozi na-akwanyeghịrị ụzọ nile nke Chineke ùgwù. Ka oge na-aga, Jehova nyere Samuel ọrụ dị ka onye amụma Ya.—1 Samuel 2:11, 12; 3:1-21.
9. (a) Mmetụta ọma ndị dị aṅaa ka Timoti nwetara site n’ebe obibi? (b) Ụdị mmadụ dị aṅaa ka Timoti ghọrọ?
9 Ùnu ga-achọ ka nwa unu nwoke dị ka Timoti, bụ́ onye ghọrọ enyi Pọl onyeozi mgbe ọ bụ nwa okorobịa? Nna Timoti abụghị onye kwere ekwe, ma nne ya na nne ya ochie setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke inwe ekele maka ihe ime mmụọ. Obi abụọ adịghị ya na nke a nyere aka n’ịtọ ezi ntọala maka ndụ Timoti dị ka onye Kraịst. A gwara anyị na nne ya, bụ́ Yunaịsị, na nne ya ochie bụ́ Lọịs, nwere “okwukwe ihu abụọ na-adịghị ya.” Ndụ ha dị ka ndị Kraịst abụghị nke ihu abụọ; n’ezie ha biri ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ha sịrị na ha kweere, ha kụzikwaara Timoti na-eto eto ime otu ihe ahụ. Timoti gosipụtara na ya bụ onye a pụrụ ịdabere n’ebe ọ nọ nakwa na ya ji ezi obi chee banyere ọdịmma nke ndị ọzọ.—2 Timoti 1:5; Ndị Filipaị 2:20-22.
10. (a) Ihe nlereanya ndị dị aṅaa sitere n’èzí pụrụ imetụta ụmụ anyị? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe mmetụta ndị a pụtara ìhè n’okwu ma ọ bụ n’àgwà ụmụ anyị?
10 Ihe nlereanya ndị na-emetụta ụmụ anyị adịghị esitecha n’ebe obibi. E nwere ụmụaka ha na ha na-agakọ akwụkwọ, ndị nkụzi ọrụ ha bụ ịkpụzi uche ụmụaka, ndị kwenyesiri ike na onye ọ bụla kwesịrị ikwekọ n’omenala ndị gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’agbụrụ ma ọ bụ n’ógbè, ndị ọkà n’egwuregwu bụ́ ndị a na-etokarị maka ihe ndị ha rụzuru, na ndị ọrụ obodo bụ́ ndị a na-akọ omume ha n’akụkọ. Ọtụtụ nde ụmụaka ahụwokwa obi ọjọọ na-adị n’oge agha. Ò kwesịrị iju anyị anya ma ọ bụrụ na mmetụta ndị a apụta ìhè n’okwu ma ọ bụ n’àgwà ụmụ anyị? Olee otú anyị si emeghachi omume mgbe ha mere otú ahụ? Ịba mbá n’ụzọ na-akpasu iwe ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị siri ike ọ̀ na-edozi nsogbu ahụ? Kama imeghachi omume ọkụ ọkụ n’ebe ụmụ anyị nọ, ọ́ gaghị aka mma ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ọ̀ dị ihe pụrụ inye aka n’ịghọta ụzọ isi dozie nsogbu a site n’ụzọ Jehova si emeso anyị ihe?’—Tụlee Ndị Rom 2:4.
11. Mgbe ndị nne na nna hiere ụzọ, olee otú nke a pụrụ isi metụta àgwà ụmụ ha?
11 N’ezie, ndị nne na nna na-ezughị okè agajeghị ime ihe banyere nsogbu dị iche iche mgbe nile n’ụzọ kasị mma. Ha ga-ehie ụzọ. Mgbe ụmụaka matara nke ahụ, ọ̀ ga-ebelata ùgwù ha na-akwanyere ndị mụrụ ha? Ọ pụrụ ime otú ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ndị nne na nna anwaa ikpuchi njehie ha site n’iji aka ike na-egosipụta ikike ha. Ma ihe ga-esi na ya pụta pụrụ ịdị nnọọ iche ma ọ bụrụ na ndị nne na nna dị umeala n’obi ma na-ekweta ihie ụzọ ha n’ụzọ dị mfe. Na nke a, ha pụrụ isetịpụrụ ụmụ ha ihe nlereanya bara uru, bụ́ ndị ọ dị mkpa ịmụta ime otu ihe ahụ.—Jemes 4:6.
Ihe Ihe Nlereanya Anyị Pụrụ Ịkụzi
12, 13. (a) Gịnị ka ọ dị ụmụaka mkpa ịmụta banyere ịhụnanya, oleekwa otú a pụrụ isi kụzie nke a n’ụzọ kasị dị irè? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka ụmụaka mụta ihe banyere ịhụnanya?
12 E nwere ọtụtụ ihe bara uru a pụrụ ịkụzi n’ụzọ kasị dị irè mgbe e ji ezi ihe nlereanya sochie ntụziaka e nyere n’ọnụ. Tụlee ole na ole n’ime ha.
13 Igosipụta ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya nanị: Ihe ịhụnanya pụtara bụ otu n’ime ihe mmụta ndị kasị mkpa a ga-eji ihe nlereanya mesie ike. “Anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na [Chineke] buru ụzọ hụ anyị n’anya.” (1 Jọn 4:19) Ọ bụ Isi Iyi na ihe nlereanya kasịnụ nke ịhụnanya. A kpọtụrụ ịhụnanya a nke ụkpụrụ na-eduzi, bụ́ a·gaʹpe, aha ihe karịrị 100 ugboro n’ime Bible. Ọ bụ àgwà e ji amata ezi ndị Kraịst. (Jọn 13:35) A ga-egosipụta ịhụnanya dị otú ahụ n’ebe Chineke na Jisọs Kraịst nọ, ụmụ mmadụ kwesịkwara igosipụta ya n’ebe ibe ha nọ—ọbụna n’ebe ụmụ mmadụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ihe ha adịghị amasị anyị, nọ. (Matiu 5:44, 45; 1 Jọn 5:3) Ịhụnanya a aghaghị ịdị n’obi anyị, ọ ga-apụtakwa ìhè ná ndụ anyị tupu anyị enwee ike ịkụziri ya ụmụ anyị n’ụzọ dị irè. Omume na-ekwu okwu karịa okwu ọnụ. N’ime ezinụlọ, ọ dị ụmụaka mkpa ịhụ na ịbụ ndị e gosiri ịhụnanya na àgwà ndị yiri ya, dị ka mmasị. E wepụ ihe ndị a, a na-abịada uto nwatakịrị n’ụzọ anụ ahụ, uche, na n’ụzọ mmetụta uche. Ọ dịkwa ụmụaka mkpa ịhụ ụzọ kwesịrị ekwesị e si na-egosipụta ịhụnanya na mmasị n’ebe ndị Kraịst ibe anyị bụ́ ndị na-abụghị ndị òtù ezinụlọ anyị nọ.—Ndị Rom 12:10; 1 Pita 3:8.
14. (a) Olee otú a pụrụ isi kụziere ụmụaka ịrụ ọrụ dị mma nke na-eju afọ? (b) Olee otú a pụrụ isi mee nke a n’ime ezinụlọ unu?
14 Ịmụta otú e si arụ ọrụ: Ọrụ bụ akụkụ dị oké mkpa nke ndụ. Ka mmadụ wee nwee mmetụta nke ùgwù onwe onye, ọ dị ya mkpa ịmụta otú e si arụ ọrụ dị mma. (Eklisiastis 2:24; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:10) Ọ bụrụ na e kenyere nwatakịrị ọrụ ndị e nyere ya nnọọ obere ntụziaka na ha, e mesịakwa baara ya mba n’ihi arụghị ha nke ọma, o yighị ka ọ ga-amụta ịrụ ọrụ dị mma. Ma mgbe ụmụaka na-amụ ịrụ ọrụ site n’iso ndị mụrụ ha na-arụ ọrụ n’ezie, a na-ajakwa ha mma n’ụzọ kwesịrị ekwesị, o yikarịrị ka ha ga-amụta ịrụ ọrụ na-eju afọ. Ọ bụrụ na nne na nna ejiri nkọwa sochie ihe nlereanya ha, ụmụ ha pụrụ ịmụta ọ bụghị nanị otú e si arụzu ọrụ kamakwa otú e si emeri nsogbu, otú e si anọgidesi ike n’ọrụ ruo mgbe ọ gwụrụ, na otú e si eche echiche ma mee mkpebi. N’ọnọdụ dị otú a, a pụrụ inyere ha aka ịghọta na Jehova na-arụkwa ọrụ, na ọ na-arụ ọrụ dị mma, nakwa na Jisọs na-eṅomi Nna ya. (Jenesis 1:31; Ilu 8:27-31; Jọn 5:17) Ọ bụrụ na ezinụlọ na-arụ ọrụ ugbo ma ọ bụ na-achụ nta ego, ụfọdụ n’ime ndị òtù ezinụlọ ahụ pụrụ ịrụkọ ọrụ ọnụ. Ma ọ bụ ikekwe nne pụrụ ịkụziri nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị isi nri na ihichasị ebe a nọ rie nri. Nna nke na-arụ ọrụ n’ebe na-abụghị ụlọ ya pụrụ ime atụmatụ iso ụmụ ya rụọ ọrụ n’ụlọ. Lee ka o si bụrụ ihe bara uru mgbe nne na nna bu n’uche ọ bụghị nanị ịrụzu ọrụ ndị e nwere mgbe ahụ kama, ịkwadebe ụmụ ha ná ndụ ha nile!
15. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka a pụrụ isi kụzie ihe banyere okwukwe? Nye ihe atụ.
15 Ịnọgide na-enwe okwukwe n’agbanyeghị ahụhụ: Okwukwe bụkwa akụkụ dị mkpa nke ndụ anyị. Mgbe a tụlere okwukwe n’ọmụmụ ihe ezinụlọ, ụmụaka pụrụ ịmụta ịkọwa ya. Ha pụkwara ịmata ihe na-eme ka okwukwe malite ito n’obi ha. Ma mgbe ha hụrụ ka ndị mụrụ ha na-egosipụta okwukwe kwụ chịm n’agbanyeghị ule ndị tara akpụ, mmetụta ya pụrụ ịdịru ogologo ndụ ha nile. Di nke otu onye a na-amụrụ Bible na Panama yiri ya egwu ịchụpụ ya n’ụlọ ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ijere Jehova ozi. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe nile, ya na obere ụmụ ya anọ na-eje ije ruo kilomita 16, ha abanyezie bọs gbaa kilomita 30 ọzọ iji garuo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze kasị nso. N’ịbụ ndị ihe nlereanya ahụ gbara ume, ihe dị ka mmadụ 20 so n’ezinụlọ ya anabatawo ụzọ nke eziokwu ahụ.
Isetịpụ Ihe Nlereanya n’Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị
16. N’ihi gịnị ka e ji atụ aro ọgụgụ Bible ezinụlọ kwa ụbọchị?
16 Otu n’ime omenala ndị kasị baa uru nke ezinụlọ ọ bụla pụrụ iguzobe—omenala nke ga-abara nne na nna uru ma bụrụ ihe nlereanya dịịrị ụmụ ha iṅomi—bụ ịgụchi Bible anya. Ọ bụrụ na o kwe nnọọ omume, na-agụtụnụ Bible kwa ụbọchị. Ihe kasị mkpa abụghị ókè unu gụruru. Ihe ka nnọọ mkpa bụ otú e si agụchi ya anya na ụzọ e si na-agụ ya. Tụkwasị n’ịgụ Bible, ụmụaka pụrụ ịdị na-ege kaseti ndị a na-ege ege nke Akwukwọm nke Akukọ Bible ma ọ bụrụ na e nwere ha n’asụsụ unu. Ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị na-enyere anyị aka ibute echiche Chineke ụzọ. Ọ bụrụkwa na a na-agụ ọgụgụ Bible dị otú ahụ dị ka ezinụlọ, n’abụghị nanị onye nke ọ bụla ịgụ ya n’onwe ya, nke a pụrụ inyere ezinụlọ ahụ dum aka ijegharị n’ụzọ nile nke Jehova. Ọ bụ omume a ka a gbara ume ya ná Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke” e mere na nso nso a n’ihe nkiri bụ́ Ezinụlọ—Meenụ Ọgụgụ Bible Kwa Ụbọchị Ụzọ Ndụ Unu!—Abụ Ọma 1:1-3.
17. Olee otú ọgụgụ Bible ezinụlọ na iburu akụkụ akwụkwọ nsọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n’isi si enye aka n’itinye ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Efesọs 6:4 n’ọrụ?
17 Ịgụ Bible dị ka ezinụlọ kwekọrọ n’ihe Pọl onyeozi dere n’akwụkwọ ozi o ji ike mmụọ nsọ degara ndị Kraịst nọ n’Efesọs, nke bụ́: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Gịnị ka nke ahụ pụtara? “Ịdụ ọdụ” pụtara n’ụzọ nkịtị “itinye uche n’ime”; ya mere a na-agba ndị Kraịst bụ́ nna ume itinye uche Jehova Chineke n’ime ụmụ ha—inyere ụmụ ha aka ịmara echiche Chineke. Ịgba ụmụaka ume iburu akụkụ akwụkwọ nsọ ndị gbara ọkpụrụkpụ n’isi pụrụ inye aka iji mezuo nke a. Nzube ya bụ iji mee ka echiche Jehova na-eduzi echiche ụmụaka ahụ ka ọchịchọ na omume ha wee jiri nke nta nke nta na-egosipụta ụkpụrụ nsọpụrụ Chineke ma nne na nna hà nọ ya ma ọ bụ na ha anọghị ya. Bible bụ ntọala maka iche echiche dị otú ahụ.—Deuterọnọmi 6:6, 7.
18. Mgbe a na-agụ Bible, gịnị pụrụ ịdị mkpa iji (a) ghọta ya nke ọma? (b) rite uru site na ndụmọdụ dị na ya? (ch) meghachi omume n’ihe ọ na-ekpughe banyere nzube Jehova? (d) rite uru site n’ihe ọ na-ekwu banyere àgwà na omume ndị mmadụ?
18 N’ezie, ọ bụrụ na Bible gaje imetụta ndụ anyị, ọ dị anyị mkpa ịghọta ihe ọ na-ekwu. Nye ọtụtụ ndị, nke a pụrụ ịchọ ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ụfọdụ ihe karịrị otu ugboro. Iji ghọta okwu ụfọdụ nke ọma, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịchọ okwu n’akwụkwọ ọkọwa okwu ma ọ bụ n’Insight on the Scriptures. Ọ bụrụ na ọ bụ ndụmọdụ ma ọ bụ iwu dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ, wepụtanụ oge iji kwurịta ọnọdụ ndị e kwesịrị itinye ya n’ọrụ n’oge anyị. Mgbe ahụ unu pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee otú itinye ndụmọdụ a n’ọrụ pụrụ isi baara anyị uru?’ (Aịsaịa 48:17, 18) Ọ bụrụ na akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-ekwu banyere akụkụ ụfọdụ nke nzube Jehova, jụọnụ, sị, ‘Olee otú nke a si metụta ndụ anyị?’ Ikekwe unu na-agụ akụkọ na-ekwu banyere àgwà na omume ndị mmadụ. Nrụgide ndị dị aṅaa ka ha nọ na-enwe ná ndụ? Olee otú ha si nagide ha? Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya ha? Na-ewepụtanụ oge mgbe dum iji tụlee ihe ihe ndekọ ahụ pụtara ná ndụ anyị taa.—Ndị Rom 15:4; 1 Ndị Kọrint 10:11.
19. Site n’ịbụ ndị na-eṅomi Chineke, gịnị ka anyị ga na-enye ụmụ anyị?
19 Lee ụzọ mara mma ọ bụ isi kụnye echiche Chineke n’uche na n’obi anyị! N’ụzọ dị otú a, a ga-enyere anyị aka n’ezie ịghọ “ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Ndị Efesọs 5:1) Anyị ga-esetipụkwa ihe nlereanya nke ụmụ anyị kwesịrị iṅomi n’ezie.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka a na-aghaghị iji ezi ihe nlereanya nke ndị nne na nna sochie ntụziaka e ji ọnụ nye ụmụaka?
◻ Olee ihe ụfọdụ a na-akụzi n’ụzọ kasị mma site n’ihe nlereanya nke ndị nne na nna?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi rite uru zuru ezu site n’ọgụgụ Bible ezinụlọ?
-
-
Na-amụchinụ Okwu Chineke Anya Dị Ka EzinụlọỤlọ Nche—1999 | Julaị 1
-
-
Na-amụchinụ Okwu Chineke Anya Dị Ka Ezinụlọ
“Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.”—MATIU 4:4.
1. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ibu ọrụ ndị isi ezinụlọ ịkụziri ụmụ ha ụzọ nile nke Jehova?
JEHOVA CHINEKE nyere ndị isi ezinụlọ ihe ncheta ugboro ugboro banyere ibu ọrụ ha ịkụziri ụmụ ha ihe. Ntụziaka dị otú ahụ ga-akwadebe ụmụaka maka ndụ ha dị ugbu a, ọ pụkwara inye aka ịkwadebe ha maka ndụ nke na-abịanụ. Otu mmụọ ozi nke na-anọchite anya Chineke kọwaara Abraham ibu ọrụ ya ịkụziri ezinụlọ ya ihe ka ha wee “debe ụzọ Jehova.” (Jenesis 18:19) A gwara ndị nne na nna bụ́ ndị Israel ka ha kọwaara ụmụ ha otú Chineke si napụta Israel n’aka Ijipt na otú o si nye ha Iwu ya n’Ugwu Saịnaị, nke dị na Horeb. (Ọpụpụ 13:8, 9; Deuterọnọmi 4:9, 10; 11:18-21) A dụrụ ndị Kraịst bụ́ ndị isi ezinụlọ ọdụ ịzụpụta ụmụ ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị nne ma ọ bụ nna na-ejere Jehova ozi, o kwesịrị ịgbalịsi ike ịkụziri ụmụ ya ụzọ nile nke Jehova.—2 Timoti 1:5; 3:14, 15.
2. Ọmụmụ ihe ezinụlọ ọ̀ dị mkpa ma ọ bụrụ na e nweghị ụmụaka n’ụlọ? Kọwaa.
2 Nke a apụtaghị na ọ bụ nanị ezinụlọ ndị nwere ụmụaka ka ọ dịịrị ịmụ Okwu Chineke. Mgbe di na nwunye na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ọbụna ma a sị na ha enweghị ụmụaka, nke a na-egosipụta ezi ekele maka ihe ime mmụọ.—Ndị Efesọs 5:25, 26.
3. N’ihi gịnị ka inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya ji dị mkpa?
3 Iji rụzuo ihe kasị mma, ọ dị mkpa ka a na-enyechi ntụziaka anya, n’ikwekọ n’ihe mmụta Jehova kụziiri ụmụ Israel n’ọzara: “Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.” (Deuterọnọmi 8:3) Na-adabere n’ọnọdụ ndị ezinụlọ nọ na ha, ezinụlọ ụfọdụ pụrụ ime ndokwa ịdị na-amụ ihe kwa izu; ndị ọzọ pụrụ ịdị na-enwe nnọkọ ọmụmụ ihe ka mkpirikpi kwa ụbọchị. N’agbanyeghị ndokwa ọ bụla unu họọrọ, unu ekwela ka ọmụmụ ihe ahụ bụrụ ná ndapụta. ‘Zụchapụtaranụ ya oge.’ Ihe ọ bụla ọ na-efu iji wepụta oge dị otú ahụ abụghị ihe lara n’iyi. O metụtara ndụ ndị òtù ezinụlọ unu.—Ndị Efesọs 5:15-17; Ndị Filipaị 3:16.
Nzube Ndị A Ga-eburu n’Uche
4, 5. (a) Gịnị ka Jehova si n’ọnụ Mosis gwa ndị nne na nna dị ka nzube dị mkpa n’ịkụziri ụmụaka ihe? (b) Gịnị ka nke ahụ na-agụnye taa?
4 Mgbe unu na-eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ, ọ ga-arụpụta ezi ihe karị ma ọ bụrụ na unu eburu nzube ndị doro anya n’uche. Tụlee ihe ole na ole a pụrụ ime.
5 Mgbe ọ bụla unu na-amụ ihe, gbalịanụ ịkwalite ịhụnanya maka Jehova Chineke. Ka ụmụ Israel gbakọrọ n’ọzara nke Moab, tupu ha abanye n’Ala Nkwa ahụ, Mosis dọọrọ uche ha gaa n’ihe Jisọs Kraịst ga-emesị kọwaa dị ka “ihe dị ukwuu nke e nyere n’iwu n’ime iwu [ahụ].” Gịnị ka ọ bụ? “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” (Matiu 22:36, 37; Deuterọnọmi 6:5) Mosis gbara ụmụ Israel ume ịkụnye nke a n’obi ha na ịkụziri ya ụmụ ha. Nke ahụ ga-achọ ka a na-ekwughachi ya, na-adọrọ uche gaa n’ihe ndị mere a ga-eji hụ Jehova n’anya, ime ihe banyere àgwà na omume ndị pụrụ igbochi ngosipụta nke ịhụnanya dị otú ahụ, na igosipụta ịhụnanya maka Jehova ná ndụ ha. Ntụziaka dị otú ahụ ọ̀ dị ụmụ anyị mkpa? Ee! Enyemaka dịkwa ha mkpa iji ‘bie obi ha úgwù,’ ya bụ, iwepụ ihe ọ bụla nke ga-egbochi ha ịhụ Chineke n’anya. (Deuterọnọmi 10:12, 16; Jeremaịa 4:4) Ọchịchọ maka ihe nke ụwa nakwa maka ohere nke imikpu n’ihe omume ya dị iche iche pụrụ iso n’ime ihe mgbochi ndị dị otú ahụ. (1 Jọn 2:15, 16) Ịhụnanya maka Jehova aghaghị ịbụ nke nọ n’ọrụ, nke a na-egosipụta egosipụta, na-akpali anyị ime ihe ndị na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ. (1 Jọn 5:3) Ka ọmụmụ ihe ezinụlọ unu wee nwee abamuru ndị na-adịte anya, e kwesịrị iduzi nnọkọ nke ọ bụla n’ụzọ na-ewusi ịhụnanya a ike.
6. (a) Gịnị ka a chọrọ iji kụnye ezi ihe ọmụma? (b) Olee otú Akwụkwọ Nsọ si emesi ịdị mkpa nke ezi ihe ọmụma ike?
6 Kụnyenụ ezi ihe ọmụma nke ihe Chineke na-achọ. Gịnị ka nke ahụ na-agụnye? Ọ na-agụnye ihe karịrị inwe ike ịgụpụta azịza site na magazin ma ọ bụ akwụkwọ. Ọ na-achọkarị nkwurịta okwu iji jide n’aka na a ghọtara okwu na echiche ndị bụ́ isi nke ọma. Ezi ihe ọmụma bụ isi ihe dị mkpa n’iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, n’ilekwasị anya n’ihe ndị dị mkpa n’ezie mgbe a na-edozi nsogbu ná ndụ, n’ihi ya kwa n’ime ihe na-atọ Chineke ụtọ n’ezie.—Ndị Filipaị 1:9-11; Ndị Kọlọsi 1:9, 10; 3:10.
7. (a) Ọ̀ bụ iji ajụjụ ndị dị aṅaa eme ihe pụrụ inyere ezinụlọ aka ịtụle ụzọ dị irè a pụrụ isi tinye ihe a na-amụ n’ọrụ? (b) Olee otú Akwụkwọ Nsọ si emesi uru nke ebumnobi dị otú ahụ ike?
7 Nyerenụ ha aka ịtụle ụzọ dị irè a pụrụ isi tinye ihe a na-amụ n’ọrụ. N’iburu nzube a n’uche, mgbe ọ bụla a na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ, jụọnụ, sị: ‘Olee otú ihe ọmụmụ a kwesịrị isi metụta ndụ anyị? Ọ̀ chọrọ ka anyị mee mgbanwe ọ bụla n’ihe anyị na-eme ugbu a? N’ihi gịnị ka o ji kwesị ka anyị mee mgbanwe?’ (Ilu 2:10-15; 9:10; Aịsaịa 48:17, 18) Ileba anya nke ọma n’ụzọ dị irè a pụrụ isi tinye ihe a mụtara n’ọrụ pụrụ ịbụ akụkụ dị mkpa n’uto ime mmụọ nke ndị òtù ezinụlọ.
Jirinụ Ngwá Ọrụ Ndị E Ji Akụzi Ihe Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe
8. Ngwá ọrụ ndị dị aṅaa maka ọmụmụ Bible ka òtù ohu ahụ wepụtaworo?
8 “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ewepụtawo ngwá ọrụ bara ụba a pụrụ iji mụọ ihe. E nwere magazine Ụlọ Nche, bụ́ nke e ji amụ Bible, n’asụsụ 131. E nwere akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’asụsụ 153, broshuọ n’asụsụ 284, kaseti ndị a na-ege ege n’asụsụ 61, kaseti vidio n’asụsụ 41, ọbụnadị usoro ihe omume kọmpụta nke e ji enyocha Bible, n’asụsụ 9!—Matiu 24:45-47.
9. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha na paragraf a n’orụ mgbe anyị na-enwe ọmụmụ ihe Ụlọ Nche nke ezinụlọ?
9 Ọtụtụ ezinụlọ na-eji oge ọmụmụ ihe ezinụlọ akwadebe maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nke ọgbakọ. Lee ka nke ahụ pụrụ isi bụrụ ihe na-enye aka! Ụlọ Nche nwere nri ime mmụọ ndị bụ́ isi a kwadebere iji wulie ndị Jehova elu n’ụwa nile. Mgbe unu na-amụ Ụlọ Nche dị ka ezinụlọ, meenụ ihe karịrị ịgụpụta paragraf na ịza ajụjụ ndị e biri ebi. Chọsienụ nghọta ike. Wepụtanụ oge iji tụlee akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha bụ́ ndị a na-ehotaghị. Kpọọnụ ndị òtù ezinụlọ òkù ikwu otú akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ si metụta ihe e kwuru na paragraf ahụ a na-atụle. Tinyenụ obi unu n’ihe a na-amụ.—Ilu 4:7, 23; Ọrụ 17:11.
10. Gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka ụmụaka tinye ọnụ n’ọmụmụ ihe ahụ na iji mee ka ọ bụrụ oge na-enye ọṅụ nye ha?
10 Ọ bụrụ na unu nwere ụmụaka n’ezinụlọ unu, gịnị ka unu pụrụ ime iji mee ka ọmụmụ ihe unu ghara ịbụ nanị ihe ezinụlọ ji emezu iwu kama oge na-ewuli elu, nke na-akpali mmasị, na nke obi ụtọ? Gbalịanụ iji ụzọ kwesịrị ekwesị mee ka onye nke ọ bụla tinye ọnụ, ka uche ha wee dịrị n’ihe a na-amụ. N’ebe o kwere mee, meenụ ndokwa ka nke ọ bụla n’ime ụmụ unu nwee Bible nke ya na magazin a na-amụ. N’iṅomi ịhụnanya nke Jisọs gosipụtara, nne ma ọ bụ nna pụrụ ime ka obere nwa ya nọrọ ya nso, ikekwe na-ekonye nwa ahụ aka. (Tụlee Mak 10:13-16.) Onyeisi ezinụlọ pụrụ ịgwa onye na-eto eto ka ọ kọwaa ihe osise dị n’ihe ọmụmụ ahụ. Tupu oge eruo, a pụrụ ikenye obere nwa ịgụ otu akụkụ akwụkwọ nsọ. A pụrụ ikenye onye nke katụ mee okenye ikwu ohere ndị a pụrụ iji tinye ihe ahụ a na-amụ n’ọrụ n’ụzọ dị irè.
11. Olee ngwá ọrụ ndị ọzọ e wepụtarala maka izi ihe, n’ebe ndị e nwekwara ha, olee otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe n’ụzọ bara uru n’ihe metụtara ọmụmụ ihe ezinụlọ?
11 Ọ bụ ezie na unu pụrụ ịdị na-eji Ụlọ Nche eme ihe dị ka ihe ndabere maka nkwurịta okwu unu, unu echezọla ngwá ọrụ ndị ọzọ e ji amụ ihe bụ́ ndị dị n’ọtụtụ asụsụ. Ọ bụrụ na a chọrọ ihe ọmụma banyere ebe e si nweta otu okwu Bible ma ọ bụ nkọwa ya, a pụrụ ịchọta ya n’Insight on the Scriptures. A pụrụ inweta azịza nye ajụjụ ndị ọzọ site n’ile na Watch Tower Publications Index ma ọ bụ site n’iji usoro ime nnyocha kọmputa nke Society wepụtara mee ihe. Ịmụta iji ngwá ọrụ ndị a eme ihe, ma ọ bụrụ na e nwere ha n’asụsụ unu, pụrụ ịbụ akụkụ bara uru nke ọmụmụ ihe ezinụlọ. Ná nzube nke ịkpali mmasị nke ụmụaka, unu pụkwara iji ụfọdụ n’ime oge ọmụmụ ihe unu kirie otu akụkụ nke otu n’ime vidio Society bụ́ ndị na-akụzi ihe ma ọ bụ gee otu akụkụ nke ihe nkiri dị na kaseti a na-ege ege ma kwurịtazie banyere ya. Iji ngwá ọrụ ndị a e ji amụ ihe na-eme ihe nke ọma pụrụ inye aka ime ka ọmụmụ ihe ezinụlọ unu dị ụtọ ma baara ezinụlọ unu dum uru.
Meenụ Ka O Kwekọọ ná Mkpa nke Ezinụlọ Unu
12. Olee otú ọmụmụ ihe ezinụlọ pụrụ isi rụọ ọrụ n’igbo mkpa ezinụlọ ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa?
12 Ọ pụrụ ịbụ na ezinụlọ unu na-amụkarị isiokwu Ụlọ Nche dịịrị ọmụmụ maka izu ahụ. Marakwanụ nsogbu na echiche ezinụlọ unu nwere n’oge ahụ. Ọ bụrụ na nne adịghị arụ ọrụ ego, ọ pụrụ inwe ike iso ụmụ ya na-anọkọ kwa ụbọchị mgbe ha lọtara akwụkwọ. A pụrụ ime ihe banyere ọnọdụ ụfọdụ mgbe ahụ; ndị ọzọ pụrụ ịdị mkpa ka e lebakwuoro ha anya. Mgbe ezinụlọ nwere mkpa ndị chọrọ ka e lebara ha anya ngwa ngwa, unu elegharala ha anya. (Ilu 27:12) Ha pụrụ ịgụnye ọ bụghị nanị nsogbu ndị a na-enwe n’ụlọ akwụkwọ kamakwa ọnọdụ ndị ọzọ. Họrọnụ ihe ọmụmụ kwesịrị ekwesị, tupu oge eruokwa, meenụ ka ezinụlọ mara ihe a ga-amụ.
13. N’ihi gịnị ka nkwurịta okwu ezinụlọ banyere ụzọ e si anagide ịda ogbenye pụrụ iji baa uru?
13 Dị ka ihe atụ, ịda ogbenye na-akpa akụkụ dị ukwuu nke ụwa aka ọjọọ; ya mere n’ọtụtụ ebe, ọ pụrụ ịdị mkpa ikwurịta otú a pụrụ isi nagide ya. Ọmụmụ ihe ezinụlọ nke hiwere isi n’ihe ndị na-eme eme nakwa n’ụkpụrụ Bible ọ̀ ga-abara ezinụlọ unu uru?—Ilu 21:5; Eklisiastis 9:11; Ndị Hibru 13:5, 6, 18.
14. Olee ọnọdụ ndị pụrụ ime ka ezinụlọ ikwurịta ihe bụ echiche Jehova banyere ime ihe ike, agha, na nnọpụiche ndị Kraịst bụrụ nke e kwuru n’oge ya?
14 Ime ihe ike bụ ihe ọzọ kwesịrị ka e kwurịta. Ọ dị anyị nile mkpa ịbụ ndị a kụbanyesiri echiche Jehova ike n’uche na n’obi anyị. (Jenesis 6:13; Abụ Ọma 11:5) Ọmụmụ ihe ezinụlọ nke metụtara isiokwu a pụrụ ịbụ ohere dị mma maka ikwurịta otú a pụrụ isi na-emeso ndị ọchọ okwu ihe n’ụlọ akwụkwọ, ma à ga-anara ọzụzụ n’ịgba karat, na otú a ga-esi họrọ ntụrụndụ kwesịrị ekwesị. Ọgụ ihe ike aghọọla ihe a na-ahụkarị; ma ọ́ bụghị agha obodo, esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ nke agbụrụ, ọ bụrụ agha òtù ndị omempụ, na-eti ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mba nile ihe otiti. N’ihi ya, ọ pụrụ ịdị ezinụlọ unu mkpa ikwurịta banyere ịnọgide na-enwe àgwà ndị Kraịst mgbe ìgwè ndị na-alụrịta agha gbara ha gburugburu.—Aịsaịa 2:2-4; Jọn 17:16.
15. Olee otú e kwesịrị isi nye ụmụaka ntụziaka banyere mmekọahụ na alụmdi na nwunye?
15 Ka ụmụaka na-etolite, ntụziaka kwesịrị afọ ndụ ha banyere mmekọahụ na alụmdi na nwunye, dị ha mkpa. N’ọtụtụ ebe, ihe ka ọtụtụ ná ndị nne na nna adịghị eso ụmụ ha ekwurịta banyere mmekọahụ ma ọlị. Ụmụaka na-amaghị nke a na-akọ pụrụ inweta echiche gbagọrọ agbagọ site n’aka ndị ntorobịa ndị ọzọ, ọ pụkwara ịkpata ọdachi. Ọ́ gaghị aka mma iṅomi Jehova, bụ́ onye na-enye ndụmọdụ doro anya ma dị mma banyere okwu a n’ime Bible? Ndụmọdụ Chineke ga-enyere ụmụ anyị aka ịnọgide na-enwe ùgwù onwe onye na imeso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù. (Ilu 5:18-20; Ndị Kọlọsi 3:5; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-8) Ọ bụrụgodị na unu ekwurịtaworị ihe ndị a, unu alala azụ ikwughachi ha. Ka ọnọdụ ndị ọhụrụ na-ebilite, ọ na-adị mkpa ikwughachi ihe.
16. (a) Olee mgbe ezinụlọ dị iche iche ji enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ? (b) Olee otú unu siworo merie ihe mgbochi iji na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya?
16 Olee mgbe a pụrụ inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ? N’iṅomi ezinụlọ Betel ndị e nwere gburugburu ụwa, ọtụtụ ezinụlọ na-edokwa ọmụmụ ihe ezinụlọ ha n’uhuruchi Monday. Ndị ọzọ na-eme ya mgbe dị iche. N’Argentina otu ezinụlọ dị mmadụ 11, nke gụnyere ụmụaka 9, na-eteta ụra n’elekere anya ise nke ụtụtụ kwa ụbọchị iji nwee ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. N’ihi ndokwa ọrụ dịgasị iche, ọ dịghị mgbe ọzọ ha pụrụ ime ya. Ọ dịghị mfe, ma ọ kụnyere ịdị mkpa nke ọmụmụ ihe ezinụlọ n’uche na n’obi ụmụaka ahụ. Na Philippines, otu onye okenye so nwunye ya na ụmụ ha atọ na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya ka ụmụaka ahụ nọ na-etolite. N’ime izu, nne na nna ahụ na-esokwa nke ọ bụla n’ime ụmụ ha na-amụ ihe ka nke ọ bụla n’ime ha wee mee ka eziokwu ahụ bụrụ nke ya. Na United States, otu nwanna nwanyị nke di ya na-abụghị Onyeàmà na-eji ụkwụ kpọrọ ụmụ ya gaa n’ebe ha ga-anọ banye bọs ụlọ akwụkwọ kwa ụtụtụ. Ka ha na-echere bọs, ha na-eji ihe dị ka minit iri na-agụ ma na-ekwurịta ihe ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị, mgbe ahụkwa nwanyị ahụ na-ekpe ekpere dị mkpirikpi tupu ụmụ ya abanye bọs. Na Democratic Republic of Congo, otu nwanyị nke di ya na-ekweghị ekwe gbahapụrụ ezinụlọ ha aghaghị itinye mgbalị siri ike n’ịmụ ihe n’ihi ịbụ onye nwere agụmakwụkwọ dị nta. Nwa ya nwoke nke toworo eto na-enye aka site n’ileta ezinụlọ ahụ kwa izu iji duzie ọmụmụ ihe nke na-agụnye nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke ọ tọrọ. Nne ha na-esetịpụ ezi ihe nlereanya site ná nkwadebe ọ na-eji ịdị uchu eme. È nwere ọnọdụ ụfọdụ na-eme ka inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya na-esiri ezinụlọ unu ike? Ike agwụla unu. Chọsienụ ngọzi Jehova ike ná mgbalị ndị unu na-eme iji na-enwechi ọmụmụ Bible anya.—Mak 11:23, 24.
Ụgwọ Ọrụ Ndị Na-esite n’Ịnọgidesi Ike
17. (a) Gịnị ka a chọrọ iji na-enwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya? (b) Olee ahụmahụ na-egosi uru nke ezinụlọ ịnarachi ntụziaka anya n’ụzọ nke Jehova, bara?
17 Ọ dị mkpa ime atụmatụ. A chọrọ nnọgidesi ike. Ma uru ndị a na-enweta site n’inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya kwesịrị ya. (Ilu 22:6; 3 Jọn 4) Franz na Hilda, bụ́ ndị nọ na Germany, zụlitere ezinụlọ nwere ụmụ 11. Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, nwa ha nwanyị bụ́ Magdalena kwuru, sị: “Ihe m weere dị ka ihe kasị mkpa taa bụ na ọ dịghị ụbọchị gaferenụ nke a na-enyeghị anyị ntụziaka ime mmụọ.” Mgbe mmụọ ịhụ mba n’anya biiri ọkụ n’okpuru ọchịchị Adolf Hitler, nna Magdalena ji Bible kwadebe ezinụlọ ya maka ule ndị ọ maara na ha na-abịa. Ka oge na-aga, a nwụchiri ndị nke obere so n’ezinụlọ ahụ ma kpọga ha n’ogige mgbazi; e jidere ndị ọzọ so n’ezinụlọ ahụ ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. E gburu ụfọdụ egbu. Ha nile jigidesiri okwukwe ha ike—ọ bụghị nanị n’oge ajọ mkpagbu ahụ kamakwa, n’afọ ndị sochirinụ, maka ndị nke lanarịrịnụ.
18. Olee otú e siworo kwụghachi ndị na-azụ ụmụ nanị ha ụgwọ ọrụ maka mgbalị ha?
18 N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ, nakwa ndị ha na ndị òtù ọlụlụ ha na-adịghị ekpe otu okpukpe, enyewo ụmụ ha ntụziaka Bible n’ụzọ chiri anya. N’India, otu nwanyị di ya nwụrụ, bụ́ onye nanị ya na-azụ ụmụ, rụsiri ọrụ ike iji kụnye ịhụnanya maka Jehova n’ime ụmụ ya abụọ. Otú ọ dị, obi gbawara ya mgbe nwa ya nwoke kwụsịrị iso ndị Jehova na-akpakọrịta. Ọ rịọrọ Jehova ka ọ gbaghara ya maka ebe ọ bụla ọ dara n’ọzụzụ o nyere nwa ya nwoke. Ma nwa ya nwoke ahụ echezọchabeghị ihe ọ mụtara. Mgbe ihe karịrị afọ iri gasịrị, ọ lọghachiri, nwee ọganihu ime mmụọ dị mma, ma ghọọ okenye ọgbakọ. Ugbu a, ya na nwunye ya na-eje ozi dị ka ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile. Lee ekele ndị nne na nna ahụ nwere bụ́ ndị buuru ndụmọdụ ahụ sitere n’aka Jehova na nzukọ ya n’uche nke bụ́ inyechi ntụziaka Bible anya n’ime ezinụlọ! Ùnu na-etinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ n’ime ezinụlọ unu?
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ N’ihi gịnị ka inwechi ọmụmụ ihe ezinụlọ anya ji dị mkpa?
◻ Gịnị kwesịrị ịbụ nzube anyị mgbe ọ bụla anyị na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ?
◻ Ngwá ọrụ ndị dị aṅaa maka izi ihe ka e wepụtawooro anyị?
◻ Olee otú a pụrụ isi mee ka ọmụmụ ihe kwekọọ ná mkpa ezinụlọ?
[Foto dị na peeji nke 15]
Inwe nzube ndị doro anya ga-eme ka ọmụmụ ihe ezinụlọ unu ka mma
-
-
Ezinụlọ, Toonụ Chineke Dị Ka Akụkụ nke Ọgbakọ YaỤlọ Nche—1999 | Julaị 1
-
-
Ezinụlọ, Toonụ Chineke Dị Ka Akụkụ nke Ọgbakọ Ya
“N’ime mkpọkọta mmadụ nile ka m ga-agọzi Jehova.”—ABỤ ỌMA 26:12.
1. Tụkwasị n’ịmụ ihe na ikpe ekpere n’ụlọ, gịnị bụ otu akụkụ dị mkpa nke ezi ofufe?
OFUFE Jehova abụghị nanị ekpere na ọmụmụ Bible ebe obibi ka ọ gụnyere kamakwa ihe omume dị ka akụkụ nke ọgbakọ Chineke. E nyere Israel oge ochie iwu ka ha “kpọkọta ndị Israel, bụ́ ndị ikom, na ndị inyom, na ụmụntakịrị,” ịmụta iwu Chineke iji jee ije n’ụzọ ya. (Deuterọnọmi 31:12; Joshua 8:35) A gbara ma ndị agadi ma “ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ” ume ikere òkè n’ito aha Jehova. (Abụ Ọma 148:12, 13) E nwere ndokwa yiri nke ahụ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. N’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị e nwere n’ụwa nile, ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị na-ekere òkè n’enweghị ihe mgbochi ná nnọkọ nke ndị na-ege ntị na-etinye ọnụ, ọtụtụ ndị na-enwekwa ọṅụ dị ukwuu n’ikere òkè.—Ndị Hibru 10:23-25.
2. (a) N’ihi gịnị ka ime nkwadebe ji bụrụ otu ihe bụ́ isi n’inyere ndị na-eto eto aka ịnụ ụtọ nzukọ? (b) Olee ndị ihe nlereanya ha dị mkpa?
2 N’ezie, inyere ndị na-eto eto aka isonye n’usoro ihe omume ọgbakọ nke dị mma bụ́ nke a na-eme mgbe dum pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ọ bụrụ na ihe àmà na-egosi na ụfọdụ ụmụaka ndị so ndị mụrụ ha aga nzukọ adịghị anụ ụtọ ya, gịnị pụrụ ịbụ nsogbu? N’ezie, ihe ka ọtụtụ n’ụmụaka na-etinye uche n’ihe ruo nanị nwa oge, ọ dịghịkwa esi ike ihe agwụwa ha ike. Ime nkwadebe pụrụ inye aka iji dozie nsogbu a. Ma e meghị nkwadebe, ụmụaka apụghị ikere òkè n’ụzọ bara uru ná nzukọ. (Ilu 15:23) Ma e meghị nkwadebe, ọ ga-esiri ha ike inwe ọganihu ime mmụọ nke na-enye afọ ojuju. (1 Timoti 4:12, 15) Gịnị ka a pụrụ ime? Nke mbụ, ọ dị ndị nne na nna mkpa ịjụ onwe ha ma hà na-akwadebe maka nzukọ n’onwe ha. Ihe nlereanya ha na-enwe mmetụta dị ike. (Luk 6:40) Iji nlezianya na-eme atụmatụ maka ọmụmụ ihe ezinụlọ pụkwara ịbụ isi ihe dị mkpa.
Iwulite Obi
3. N’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ, n’ihi gịnị ka e kwesịrị iji mee mgbalị pụrụ iche iji wulite obi, gịnịkwa ka nke a na-achọ?
3 Ọmụmụ ihe ezinụlọ kwesịkwara ịbụ oge iwulite obi ọ bụghị nanị oge ikpoju ihe ọmụma n’isi. Nke a na-achọ ma ịmara nsogbu ndị na-eche ndị òtù ezinụlọ ihu ma inwe nchegbu ịhụnanya maka onye nke ọ bụla. Jehova bụ ‘onye na-anwapụta obi.’—1 Ihe E Mere 29:17.
4. (a) Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye “obi amamihe kọrọ”? (b) Gịnị ka ‘inweta obi amamihe’ gụnyere?
4 Gịnị ka Jehova na-ahụ mgbe ọ na-anwapụta obi ụmụ anyị? Ihe ka ọtụtụ n’ime ha ga-asị na ha hụrụ Chineke n’anya, nke ahụ bụkwa ihe kwesịrị ịja mma. Ma, onye na-eto eto ma ọ bụ onye ka malitere ọhụrụ ịmụ banyere Jehova nwere ahụmahụ dị nta n’ụzọ Jehova. N’ihi na o nweghị ahụmahụ, ọ pụrụ ịbụ onye “obi amamihe kọrọ,” dị ka Bible si kwuo ya. Ikekwe ọ bụghị ebumnobi ya nile dị njọ, ma ọ na-ewe oge tupu mmadụ edebe obi ya n’ọnọdụ ga-adị Chineke mma n’ezie. Nke a na-agụnye mmadụ ime ka echiche, ọchịchọ, mmasị, mmetụta uche, na ihe mgbaru ọsọ ya ná ndụ kwekọọ n’ihe Chineke na-anakwere, ruo n’ókè nke a ga-ekwe mmadụ na-ezughị okè omume. Mgbe mmadụ ji ụzọ nsọpụrụ Chineke kpụzie mmadụ ime ya n’ụzọ dị otú ahụ, ọ “na-enweta obi amamihe.”—Ilu 9:4; 19:8.
5, 6. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ‘inweta obi amamihe’?
5 Ndị nne na nna hà pụrụ inyere ụmụ ha aka ‘inweta obi amamihe’? N’eziokwu, ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ itinye ọnọdụ obi dị mma n’ime onye ọzọ. E nyere onye ọ bụla n’ime anyị nnwere onwe ime nhọrọ, ihe dị ukwuu na-adaberekwa n’ihe anyị na-eche n’echiche. Otú ọ dị, site n’iji nghọta eme ihe, ndị nne na nna pụrụ ịjụpụta nwa ha okwu n’ọnụ, na-amara ihe dị ya n’obi na ebe enyemaka dị ya mkpa. Jirinụ ajụjụ ndị dị ka ndị a mee ihe, ‘Olee otú i si ele nke a anya?’ na ‘Gịnị ka ị ga-enwe mmasị ime n’ezie?’ Jirizienụ ndidi gee ntị. Unu emeghachila omume gabiga ókè. (Ilu 20:5) Ọnọdụ nke obiọma, nghọta, na ịhụnanya dị na ya dị mkpa ma ọ bụrụ na unu chọrọ iru n’obi.
6 Iji wusie ọchịchọ ziri ezi ike, kwurịtanụ ugboro ugboro banyere mkpụrụ nke mmụọ nsọ—akụkụ ya nke ọ bụla—rụkọọkwanụ ọrụ ọnụ dị ka ezinụlọ iji zụlite ya. (Ndị Galetia 5:22, 23) Wulitenụ ịhụnanya maka Jehova na Jisọs Kraịst, ọ bụghị nanị site n’ịsị na anyị kwesịrị ịhụ ha n’anya kama site n’ikwurịta ihe ndị mere anyị ji ahụ ha n’anya na otú anyị pụrụ isi gosipụta ịhụnanya ahụ. (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) Wusienụ ọchịchọ ime ihe ziri ezi ike site n’ịtụgharị uche n’uru ndị ga-esi na ya pụta. Wulitenụ ọchịchọ ịjụ echiche, okwu, na omume na-ezighị ezi site n’ikwurịta mmetụta ọjọọ ihe ndị dị otú ahụ na-enwe. (Emọs 5:15; 3 Jọn 11) Gosinụ otú echiche, okwu, na omume—ma hà dị mma ma hà dị njọ—pụrụ isi metụta mmekọrịta mmadụ na Jehova.
7. Gịnị ka a pụrụ ime iji nyere ụmụaka aka idozi nsogbu na ime mkpebi n’ụzọ ga-eme ka ha nọrọ Jehova nso?
7 Mgbe nwatakịrị nwere nsogbu ma ọ bụ mgbe ọ chọrọ ime mkpebi dị mkpa, anyị pụrụ ịjụ ya, sị: ‘Olee otú i chere Jehova si ele ihe a anya? Gịnị ka ị maara banyere Jehova nke mere i ji kwuo otú ahụ? Ì kpegaworo ya ekpere banyere ya?’ N’ịmalite nnọọ n’oge dị ka o kwere mee, nyerenụ ụmụ unu aka iwulite ụzọ ndụ nke ime mgbalị siri ike mgbe nile iji chọpụta ihe bụ uche Chineke ma mee ya. Ka ha na Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya, ha ga-achọta obi ụtọ n’ijegharị n’ụzọ ya nile. (Abụ Ọma 119:34, 35) Nke a ga-ewulite n’ime ha ekele maka ihe ùgwù nke iso ọgbakọ nke ezi Chineke ahụ na-akpakọrịta.
Ịkwadebe Maka Nzukọ Ọgbakọ
8. (a) Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịgụnye ihe nile chọrọ nlebara anya, n’ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị? (b) Olee otú ọmụmụ ihe a dịruru ná mkpa?
8 E nwere ọtụtụ ihe ọ dị mkpa ka e lebara anya n’oge a na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ. Olee otú unu pụrụ isi webata ha nile? Ọ gaghị ekwe omume ime ihe nile n’otu mgbe. Ma unu pụrụ ịhụ na ọ ga-enye aka inwe ihe ndekọ atụmatụ. (Ilu 21:5) Site n’oge ruo n’oge, tụleghachinụ ya ma kwurịta ihe ndị chọrọ nlebara anya pụrụ iche. Nweenụ ezi mmasị n’ọganihu nke onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu. Ndokwa maka ọmụmụ ihe ezinụlọ a bụ akụkụ dị mkpa nke mmụta ndị Kraịst, na-akwadebe anyị maka ndụ anyị dị ugbu a nakwa maka ndụ ebighị ebi nke na-abịanụ.—1 Timoti 4:8.
9. Ihe mgbaru ọsọ ndị dị aṅaa banyere ịkwadebe maka nzukọ ka anyị pụrụ iji nwayọọ nwayọọ rụọ ọrụ na ha n’oge anyị na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ?
9 Ọmụmụ ihe ezinụlọ unu ọ̀ na-agụnye ịkwadebe maka nzukọ ọgbakọ? E nwere ọtụtụ ihe unu pụrụ ịrụ ọrụ na ha n’ụzọ na-aga n’ihu ka unu na-amụkọ ihe ọnụ. Ụfọdụ n’ime ha pụrụ iwe ọtụtụ izu, ọnwa, ma ọ bụ ọbụna afọ iji rụzuo ha. Tụlee ihe mgbaru ọsọ ndị a: (1) onye ọ bụla n’ime ezinụlọ ịdị njikere ịza ajụjụ ná nzukọ ọgbakọ; (2) onye nke ọ bụla ịgbalị ịza ajụjụ n’okwu nke aka ya; (3) itinye akụkụ akwụkwọ nsọ n’azịza ya; na (4) ịkọwa ihe ọmụmụ ahụ na-eburu n’uche itinye ya n’ọrụ n’onwe ya. Ihe a nile pụrụ inyere mmadụ aka ime ka eziokwu ahụ bụrụ nke ya.—Abụ Ọma 25:4, 5.
10. (a) Olee otú anyị pụrụ isi lebara nke ọ bụla n’ime nzukọ ọgbakọ anyị anya? (b) N’ihi gịnị ka nke a ji kwesị ekwesị?
10 Ọ bụrụgodị na ọmụmụ ihe ezinụlọ unu na-adaberekarị n’ihe ọmụmụ Ụlọ Nche maka izu ahụ, unu elegharala ịdị mkpa nke ịkwadebe n’otu n’otu ma ọ bụ dị ka ezinụlọ maka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na Nzukọ Ije Ozi, anya. Ndị a bụkwa akụkụ dị mkpa nke usoro ihe omume maka ịkụziri anyị ije ije n’ụzọ Jehova. Site n’oge ruo n’oge, unu pụrụ ịkwadebe maka nzukọ ndị ahụ dị ka ezinụlọ. Site n’ịrụkọ ọrụ ọnụ, nkà ịmụ ihe unu ga-akawanye mma. N’ihi ya, unu ga-eritekwu uru ná nzukọ. Tinyere ihe ndị ọzọ, kwurịtanụ abamuru ndị dị n’ịkwadebe maka nzukọ ndị a mgbe nile na ịdị mkpa nke iwepụtara ya oge a kapịrị ọnụ.—Ndị Efesọs 5:15-17.
11, 12. Olee otú nkwadebe maka ịbụ abụ n’ọgbakọ ga-esi baara anyị uru, oleekwa otú a pụrụ isi mee nke a?
11 Ná Mgbakọ “Ụzọ Ndụ nke Chineke,” a gbara anyị ume ịkwadebe maka akụkụ ọzọ nke nzukọ anyị—ịbụ abụ. Ùnu amalitewo ime nke ahụ? Ime otú ahụ pụrụ inye aka ịkụbanye eziokwu Bible n’uche na n’obi anyị, n’otu mgbe ahụkwa mụbaa ọṅụ anyị na-enwe ná nzukọ ọgbakọ.
12 Nkwadebe nke gụnyere ịgụpụta na ikwurịta ihe okwu ndị dị n’ụfọdụ n’ime abụ ndị a ga-abụ pụtara, pụrụ inyere anyị aka ịbụ abụ site n’obi. N’Israel oge ochie, e jiri ngwá egwú mee ihe n’ụzọ pụtara ìhè n’ofufe. (1 Ihe E Mere 25:1; Abụ Ọma 28:7) Ọ̀ dị onye na-akpọ ngwá egwú n’ezinụlọ unu? Gịnị ma unu jiri ngwá egwú ahụ bụọ otu n’ime abụ Alaeze ndị a ga-abụ n’izu ahụ, ma bụkọzie abụ ahụ ọnụ dị ka ezinụlọ. Ihe ọzọ a pụrụ ime bụ iji tepụ abụ ndị ahụ mee ihe. N’ala ụfọdụ, ụmụnna anyị na-abụ abụ nke ọma n’ejighị ngwá egwú. Ka ha na-aga n’ụzọ ma ọ bụ na-arụ ọrụ n’ubi, ha na-abụrịkarị abụ ndị e dokwara maka nzukọ ọgbakọ n’izu ahụ.—Ndị Efesọs 5:19.
Ezinụlọ Ime Nkwadebe Maka Ozi Ubi
13, 14. N’ihi gịnị ka nkwurịta okwu ezinụlọ bụ́ ndị na-edozi obi anyị maka ozi ubi ji baa uru?
13 Ịgbara ndị ọzọ àmà banyere Jehova na nzube ya bụ akụkụ dị mkpa nke ndụ anyị. (Aịsaịa 43:10-12; Matiu 24:14) Ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị agadi, anyị na-aka enwe ọṅụ n’ọrụ a ma na-arụzu ihe ka mma ma ọ bụrụ na anyị emee nkwadebe. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a n’ime ezinụlọ?
14 Dị ka ọ dị n’okwu nile metụtara ofufe anyị, ọ dị anyị mkpa idozi obi anyị. Ọ dị anyị mkpa ikwurịta ọ bụghị nanị ihe anyị gaje ime kamakwa ihe mere anyị ga-eji eme ya. N’oge Eze Jehoshafat, e nyere ndị ahụ ntụziaka n’iwu Chineke, ma Bible na-agwa anyị na ha “edozighị obi ha.” Nke a mere ka ha bụrụ ndị ihe ndọrọ ndị pụrụ ịdọpụ ha n’ezi ofufe ga-enweta ngwa ngwa. (2 Ihe E Mere 20:33; 21:11) Ihe mgbaru ọsọ anyị abụghị nanị inwe ike inye awa ndị anyị tinyere n’ozi ubi, ọ bụghịkwa nanị inyefe akwụkwọ. Ozi anyị kwesịrị ịbụ ngosipụta nke ịhụnanya anyị nwere maka Jehova na ịhụnanya anyị nwere maka ndị chọrọ ohere ịhọrọ ndụ. (Ndị Hibru 13:15) Ọ bụ ọrụ nke anyị bụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” na ya. (1 Ndị Kọrint 3:9) Lee ihe ùgwù ọ bụ! Ka anyị na-ekere òkè n’ozi, anyị so ndị mmụọ ozi dị nsọ na-eme otú ahụ. (Mkpughe 14:6, 7) Olee oge ka mma iji wulite ekele maka nke a karịa ná nkwurịta okwu ezinụlọ, ma ọ̀ bụ n’ọmụmụ ihe anyị na-enwe kwa izu ma ọ bụ mgbe anyị na-atụle akụkụ akwụkwọ nsọ kwesịrị ekwesị site n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị!
15. Olee mgbe anyị pụrụ ịkwadebe maka ozi ubi dị ka ezinụlọ?
15 Ùnu na-eji oge unu nọ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ mgbe ụfọdụ enyere ndị òtù ezinụlọ unu aka ịkwadebe maka ozi ubi nke izu ahụ? Ime otú ahụ pụrụ ịba nnọọ uru. (2 Timoti 2:15) Ọ pụrụ inye aka ime ka ozi ha nwee nzube ma mịa mkpụrụ. Site n’oge ruo n’oge, unu pụrụ iwepụta otu oge ọmụmụ ihe dum maka ime nkwadebe dị otú ahụ. Ọtụtụ mgbe karị, unu pụrụ ịtụle akụkụ ndị metụtara ozi ubi ná nkwurịta okwu ndị ka mkpirikpi ná ngwụsi nke ọmụmụ ihe ezinụlọ ma ọ bụ n’oge ndị ọzọ n’ime izu.
16. Kwuo uru nke ọ bụla n’ime nzọụkwụ ndị ahụ e depụtara na paragraf a bara.
16 Nnọkọ ezinụlọ pụrụ ilekwasị anya n’usoro dị iche iche, dị ka ndị na-esonụ: (1) Kwadebenụ ụzọ a pụrụ isi gbaara ndị mmadụ àmà bụ́ nke a mụgharịrị nke ọma, nke gụnyere akụkụ akwụkwọ nsọ unu ga-agụpụta na Bible ma ọ bụrụ na ohere adị. (2) Ọ bụrụ na o kwe mee, jidenụ n’aka na onye nke ọ bụla nwere akpa ozi ọma, Bible, akwụkwọ ndetu ihe, mkpịsị akwụkwọ ma ọ bụ pensịl, traktị, na akwụkwọ ndị ọzọ dị n’ọnọdụ dị mma. Ọ bụghị iwu na akpa ozi ọma ahụ ga-adị oké ọnụ, ma o kwesịrị ịdị mma. (3) Tụleenụ ebe a ga-agba àmà mberede na otú a ga-esi agba ya. Wepụtanụ oge unu ga-arụkọ ọrụ ọnụ n’ozi ubi iji sochie akụkụ nke ọ bụla nke ntụziaka a. Tụọnụ aro ndị na-enye aka, ma unu enyela ndụmọdụ n’ọtụtụ ihe.
17, 18. (a) Ụdị nkwadebe dị aṅaa dị ka ezinụlọ pụrụ inye aka ime ka ozi ubi anyị mịa mkpụrụ karị? (b) Akụkụ dị aṅaa nke nkwadebe a ka a pụrụ ime kwa izu?
17 Otu akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke ọrụ Jisọs Kraịst nyere ụmụazụ ya bụ ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19, 20) Ime ndị na-eso ụzọ na-agụnye ihe karịrị ime nkwusa. Ọ na-achọ ịkụzi ihe. Olee otú ọmụmụ ihe ezinụlọ unu pụrụ isi nyere unu aka ịdị irè n’ime nke a?
18 Dị ka ezinụlọ, tụleenụ onye ọ ga-adị mma ka a gaara nletaghachi. Ụfọdụ n’ime ha pụrụ ịnatawo akwụkwọ; ụfọdụ pụrụ ịṅawo nanị ntị. A pụrụ izutewo ha n’ọrụ ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ mgbe a na-agba àmà mberede n’ahịa ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. Kwenụ ka Okwu Chineke duzie unu. (Abụ Ọma 25:9; Ezikiel 9:4) Kpebienụ ndị onye nke ọ bụla n’ime unu chọrọ ịkpọtụrụ n’izu ahụ. Gịnị ka a ga-ekwu maka ya? Nkwurịta okwu ezinụlọ pụrụ inyere onye ọ bụla n’ime ezinụlọ aka ime nkwadebe. Detuonụ kpọmkwem akụkụ akwụkwọ nsọ ndị unu ga-eso ndị nwere mmasị kerịta tinyere isi ihe ndị kwesịrị ekwesị sitere na broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Unu anwala ịmụ ihe karịrị akarị n’otu mgbe. Jụọnụ onye nwe ụlọ ajụjụ nke a ga-aza ná nleta ọzọ. Gịnị ma unu mee ka ọ bụrụ akụkụ nke ihe ezinụlọ unu na-eme kwa izu bụ́ ime ndokwa banyere nletaghachi onye nke ọ bụla gaje ime, mgbe ọ ga-eme ha, na ihe o nwere olileanya ịrụzu? Ime nke a pụrụ inye aka ime ka ozi ubi nke ezinụlọ ahụ dum mịa mkpụrụ karị.
Gaanụ n’Ihu Ịkụziri Ha Ụzọ Jehova
19. Ọ bụrụ na ndị òtù ezinụlọ ga-anọgide na-eje ije n’ụzọ Jehova, gịnị ka ha na-aghaghị inwe, gịnịkwa na-atụnye ụtụ na nke a?
19 Ịbụ onyeisi ezinụlọ n’ajọ ụwa a bụ ihe ịma aka. Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-agbalịsi ike imebi ọnọdụ ime mmụọ nke ndị ohu Jehova. (1 Pita 5:8) Ọzọkwa, taa unu ndị nne na nna, nke ka nke unu ndị na-azụ ụmụ nanị unu, nwere ọtụtụ nrụgide. Ọ na-esi ike ịchọta oge iji mee ihe ndị unu ga-achọ ime. Ma mgbalị e tinyere kwesịrị ya ọbụna ma a sị na ọ bụ nanị otu aro ka unu pụrụ itinye n’ọrụ n’otu mgbe, ma jiri nwayọọ nwayọọ meziwanye usoro ọmụmụ ihe ezinụlọ unu. Ịhụ ndị nọ gị ezi nso ka ha ji iguzosi ike n’ihe na-eje ije n’ụzọ Jehova bụ ụgwọ ọrụ na-enye obi ụtọ. Iji nwee ihe ịga nke ọma n’ije ije n’ụzọ Jehova, ọ dị ndị òtù ezinụlọ mkpa inwe ọṅụ n’ịga nzukọ ọgbakọ nakwa n’ikere òkè n’ozi ubi. Ka nke ahụ wee dị otú ahụ, a chọrọ ime nkwadebe—nkwadebe nke na-ewuli obi elu na nke na-ejikere onye nke ọ bụla ikere òkè zuru ezu.
20. Gịnị pụrụ inyekwuru ọtụtụ ndị nne na nna aka inwe ụdị ọṅụ ahụ e kwupụtara na 3 Jọn 4?
20 Banyere ndị o nyeere aka n’ụzọ ime mmụọ, Jọn onyeozi dere, sị: “Enweghị m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, bụ́ ịnụ ka ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Ọmụmụ ihe ezinụlọ ndị e bu nzube doro anya n’obi na-eduzi na ndị isi ezinụlọ bụ́ ndị ji àgwà obiọma na enyemaka na-elebara mkpa nke onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ha anya pụrụ ime ihe dị ukwuu iji mee ka ezinụlọ ahụ kerịta ọṅụ dị otú ahụ. Site n’ịzụlite ekele maka ụzọ ndụ nke Chineke, ndị nne na nna na-enyere ezinụlọ ha aka inwe ọṅụ n’ụzọ ndụ kasị nnọọ mma.—Abụ Ọma 19:7-11.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ N’ihi gịnị ka ịkwadebe maka nzukọ ji dị ụmụ anyị oké mkpa?
◻ Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ‘inweta obi amamihe’?
◻ Olee otú ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị pụrụ isi nye aka n’ịkwadebe maka nzukọ nile?
◻ Olee otú ịkwadebe maka ozi ubi dị ka ezinụlọ pụrụ isi nyere anyị aka ịdị irè karị?
-