Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 5/1 p. 5-7
  • Ònye Bụ Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Jehova?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Aha Ya Pụtara
  • Àgwà Jehova Ndị Bụ Isi
  • Chineke nke Mba Nile
  • Uru nke Ịmara Jehova
  • Ònye Bụ Ezi Chineke Ahụ?
    Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Bulie Jehova Elu Dị Ka Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke Ahụ
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Gịnị Bụ Aha Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2019
  • Ònye Bụ Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 5/1 p. 5-7

Ònye Bụ Jehova?

JEHOVA gwara otu n’ime ndị fere ya ofufe n’ikwesị ntụkwasị obi, sị: “Mmadụ agaghị ahụ m anya, dịkwa ndụ.” (Ọpụpụ 33:20) “Chineke bụ Mmụọ,” ndị mmadụ apụghịkwa iji anya nkịtị ha hụ ya. (Jọn 4:24) Dị nnọọ ka ilegide anya n’anyanwụ n’ehihie ga-ebibi anya anyị, otú ahụ ka ọ ga-abụ ihe ga-akpatara anyị ọdachi ịhụ Isi Iyi dị ukwuu nke ike nke kere ọ bụghị nanị anyanwụ anyị na-enye ìhè nke ọma kamakwa anyanwụ ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ dị na mbara igwe.

N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ dịghị anyị mkpa ịhụ Chineke anya iji mata banyere ya. Bible na-eme ka a mata ma Onye kwadebere ngwugwu ahụ dị ebube, bụ́ ụwa, maka anyị ma na-ekpughere anyị ụdị onye ọ bụ. Ya mere ọ bara uru ileba anya na Bible iji chọpụta banyere Nna ahụ nyere anyị ndụ, nyekwa anyị ebe obibi mara mma a ga-anọ nụ ụtọ ndụ ahụ.

Ihe Aha Ya Pụtara

Aha nile nwere ihe ndị ha pụtara, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị nwere ike ghara ịma ha taa. Dị ka ihe atụ, aha Bekee a maara nke ọma bụ́ David sitere n’okwu Hibru nke pụtara “Onye A Hụrụ n’Anya.” Aha Onye Okike, bụ́ Jehova, nwekwara ihe ọ pụtara. Gịnị ka ọ bụ? N’asụsụ mbụ e ji dee Bible bụ́ Hibru, e dere aha Chineke ná mkpụrụ akwụkwọ anọ bụ́, YHWH, ọ pụtakwara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’akụkụ Hibru nke Bible. A ghọtara aha Chineke ịpụta “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Ọ na-enye echiche na Jehova ji amamihe na-eme onwe ya ịghọ ihe ọ bụla ọ dị ya mkpa ịghọ iji mezuo nzube ya. Ọ bụ Onye Okike, Ọkaikpe, Onye Nzọpụta, Onye Nkwado nke Ndụ, n’ihi ya kwa, ọ pụrụ imezu nkwa ya. Ọzọkwa, n’asụsụ Hibru aha ahụ bụ́ Jehova dị n’ụdị na-egosi ọrụ nke a na-aga ịrụzu. Ee, Jehova ka na-eme onwe ya ịghọ onye mmezu nke nzube ya. Ọ bụ Chineke dị ndụ!

Àgwà Jehova Ndị Bụ Isi

Bible na-akọwa Onye Okike dị ka “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, Onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie.” (Ọpụpụ 34:6, 7) Okwu ahụ bụ́ “ebere” na-asụgharị otu okwu Hibru nwere nnọọ ihe ọ pụtara. Ọ na-egosi ebere ji ịhụnanya na-arapagide onwe ya n’ihe ruo mgbe nzube ya maka ihe ahụ mezuru. A pụkwara ịsụgharị ya ịbụ “ịhụnanya na-eguzosi ike.” Ebere Jehova ji ịhụnanya na-arapagide onwe ya n’ihe ndị o kere eke ma na-emezu nzube ya dị ebube. Ọ̀ bụ na ị gaghị eji ịhụnanya dị otú ahụ sitere n’Onye ahụ nyeworo gị ndụ kpọrọ oké ihe?

Jehova adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ na-agbagharakwa anyị njehie anyị ngwa ngwa. Ọ na-enye obi ụtọ ịnọ onye dị otú ahụ nso. Ma, nke ahụ adịghị apụta na ọ na-anakwere omume ọjọọ. Ọ sịrị: “Mụ onwe m, Jehova, na-ahụ ikpe ziri ezi n’anya, ana m akpọ nnapụ n’ihe ike n’ajọ omume asị.” (Aịsaịa 61:8) Dị ka Chineke nke ikpe ziri ezi, ọ gaghị anọgide na-agbachi ndị siri ọnwụ na-eme mmehie nkịtị ruo mgbe ebighị ebi bụ́ ndị nọgidesiri ike n’ajọ omume ha. N’ihi ya, anyị pụrụ ijide n’aka na mgbe oge ya ruru, Jehova ga-edozi ikpe na-ezighị ezi ndị dị n’ụwa. Ọ gaghị eleghara ndị a na-emekpọ ọnụ anya.

Ọ dịghị mfe ịnọgide na-enwe nguzozi zuru okè n’agbata ịhụnanya na ikpe ziri ezi. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ọ̀ na-esiri gị ike ikpebi mgbe, otú, nakwa ókè ị ga-agbaziru ụmụ gị mgbe ha kpajọrọ àgwà? Ime ka ikpe ziri ezi na ọmịiko ịhụnanya nọrọ n’ezi nhazi chọrọ amamihe dị ukwuu. Àgwà ahụ ka Jehova na-egosipụta n’ụba mgbe ọ na-emeso ụmụ mmadụ ihe. (Ndị Rom 11:33-36) N’ezie, a pụrụ ịhụ amamihe Onye Okike ebe nile, dị ka ihe atụ, n’ihe okike dị ịtụnanya ndị gbara anyị gburugburu.—Abụ Ọma 104:24; Ilu 3:19.

Otú ọ dị, inwe amamihe ezughị. Iji mezuo uche ya, Onye Okike ahụ aghaghị inwekwa ike, Bible na-ekpughekwa na ọ dị ike nke ukwuu: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ Onye kere ihe ndị a? ọ bụ Onye ahụ Nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka Ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike Ya, na n’ihi na O nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.” (Aịsaịa 40:26) “N’ịba ụba nke ike Ya,” Jehova na-emezu ihe. Ọ̀ bụ na àgwà dị otú ahụ agaghị adọrọ gị gaa n’ebe ọ nọ?

Chineke nke Mba Nile

‘Ma Jehova ọ́ bụghị Chineke nke “Agba Ochie,” Chineke nke Israel oge ochie?’ ka ị pụrụ iche. Ọ bụ ezie na Jehova kpugheere ụmụ Israel onwe ya. Ma, n’ihi ike di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ, Jehova bụ Chineke “Onye e sitere na ya gụọ eriri nna nile ọ bụla . . . n’elu ụwa aha.” (Ndị Efesọs 3:15) Ọ bụrụ na i kwere na o ziri ezi ịkwanyere ndị nna ochie gị ùgwù, ọ̀ bụ na ọ gaghị ekwesị ekwesị ịkpọ isiala nye Onye ahụ nyere mmadụ mbụ, bụ́ nna ochie anyị nile ndụ, onye bụ mmalite nke usoro ọmụmụ nile dị n’ụwa taa?

Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ abụghị onye na-adịghị anabata ndị ọzọ. N’eziokwu, n’otu oge ya na mba Israel nwere mmekọrịta pụrụ iche. Ọbụna mgbe ahụ, ọ gbasapụụrụ ndị nile kpọkuru aha ya aka ya. Otu eze maara ihe nke Israel kwuru n’ekpere ya nye Jehova, sị: “Ihe banyere onye ala ọzọ, nke ọ bụghị ná ndị Gị, bụ́ Israel, ka o sitere, ma o siwo n’ala dị anya bịa n’ihi aha Gị . . . ; Gị onwe gị nụrụkwa n’eluigwe . . . mee dị ka ihe nile si dị nke onye ala ọzọ ahụ na-akpọku Gị; ka ndị nile nke ụwa wee mara aha Gị.” (1 Ndị Eze 8:41-43) Ruo taa, ndị nke mba nile pụrụ ịbịa mara Jehova ma soro ya nwee ezi mmekọrịta. Ma olee otú nke ahụ si emetụta gị?

Uru nke Ịmara Jehova

N’ịlaghachi n’ihe atụ dị n’isiokwu bu ụzọ, ọ bụrụ na ị natara ngwugwu a fụchiri nke ọma, ọ bụ ihe dị ka o kwesịrị na ị ga-achọ ịmata ihe onyinye ahụ bụ maka ya. Olee otú e kwesịrị isi jiri ya mee ihe ma lekọta ya? N’otu aka ahụ, anyị chọrọ ịma ihe Chineke bu n’uche mgbe ọ kwadebeere anyị ụwa. Bible na-asị na “ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya,” kama “ọ bụ ka e wee biri n’ime ya,” ya bụ, ka mmadụ biri n’ime ya, ka ọ “kpụrụ ya.”—Aịsaịa 45:18.

Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ elekọtabeghị onyinye Onye Okike ahụ. Ha na-emebi ụwa, n’ụzọ na-akpasu Jehova iwe nke ukwuu. Ma, n’ikwekọ n’ihe aha ya pụtara, Jehova ekpebisiwo ike imezu nzube mbụ ya maka mmadụ na ụwa. (Abụ Ọma 115:16; Mkpughe 11:18) Ọ ga-emezi ụwa, nyekwa ya ndị nile dị njikere ibi ndụ dị ka ụmụ ya na-erube isi ịbụ ihe nketa.—Matiu 5:5.

Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-akọwa otú ihe ga-adị mgbe nke ahụ mere, sị: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, Ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke Ya, . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:3, 4) Mgbe ahụ ọ dịghị onye ga-agba anya mmiri nke ihe mgbu ma ọ bụ ruo újú n’ihi ịbụ onye onye ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ. Ọ dịghị onye ga-eti mkpu n’ihi oké mkpa maka enyemaka ma ọ bụ nwee ihe mgbu nke ọrịa ndị na-akpata ọnwụ. Ọbụna “a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 15:26; Aịsaịa 25:8; 33:24) Nke a na-akọwa ụdị ndụ Jehova chọrọ ka anyị nụ ụtọ ya ná mbụ mgbe o kere ndị nna nna mbụ anyị.

N’ezie, ị pụrụ ịhụperetụ ọnọdụ paradaịs ahụ ugbu a n’etiti ndị na-efe Jehova ofufe. Ọ na-agwa ha, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17) Jehova bụ Nna nwere obiọma onye na-akụziri anyị, bụ́ ụmụ ya, ụzọ kasị mma isi bie ndụ. Ụkpụrụ nduzi ya nile maka mmadụ na-enye, ọ bụghị ihe mgbochi na-enweghị isi, kama nchebe ịhụnanya. Ịgbaso ha ga-arụpụta ezi nnwere onwe na obi ụtọ, dị nnọọ ka e deworo ya, sị: “Ma Onyenwe anyị bụ Mmụọ ahụ: ma ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrint 3:17) Site n’ịgbaso ụkpụrụ nduzi e setịpụrụ na Bible, ndị nakweere ịchịisi ya na-enweta udo nke uche ugbu a nke ga-agbasaru ụwa dum nke ihe a kpọrọ mmadụ otu ụbọchị.—Ndị Filipaị 4:7.

Lee nnọọ Nna na-eme ihe ọma Jehova bụ! Ị̀ dị njikere ịmụtakwu banyere Onye ahụ mere ihe nile dị ebube nke okike? Nye ndị dị njikere, uru ya dị oké ọnụ ahịa ọbụna ugbu a. N’ọdịnihu kwa ngọzi ya nile ga-adịru ebighị ebi.

[Foto dị na peeji nke 5]

A pụrụ ịhụ aha Chineke e dere ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ n’ahụ ọtụtụ ụlọ chọọchị ochie

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya