Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 6/15 p. 26-29
  • Ezi Ikpe—Olee Mgbe, N’ụzọ Dịkwa Aṅaa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Ikpe—Olee Mgbe, N’ụzọ Dịkwa Aṅaa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikpe Agbagọọ
  • Usoro Ikpe Mmadụ —Ya na Adịghị Ike Mmadụ
  • “Mụ Onwe M, Jehova, Na-ahụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya”
  • “Ụzọ Ya Nile Bụ Ikpe Ziri Ezi”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ṅomie Jehova—Gosipụta Ikpe Ziri Ezi na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jehova—Isi Iyi nke Ezi Ikpe na Ezi Omume
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Jehova—Onye Na-ahụ Ezi Omume na Ezi Ikpe n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 6/15 p. 26-29

Ezi Ikpe—Olee Mgbe, N’ụzọ Dịkwa Aṅaa?

NDỊ aka ha dị ọcha ekwesịghị ịtụ ihe ọ bụla egwu site n’ezi ikpe. N’ezie, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị amaala nọ n’ebe nile nwere ihe mere ha ga-eji nwee obi ekele ma ọ bụrụ na mba ha nwere usoro iwu na-agbalị ịhụ na e nwere ikpe ziri ezi. Usoro dị otú ahụ na-agụnye ndokwa nke iwu, ndị uwe ojii ịhụ na e debere ha, na ụlọikpe ikpe ikpe ziri ezi. Ezi ndị Kraịst na-akwanyere usoro ikpe nke ebe ha bi ùgwù, n’ikwekọ ná ndụmọdụ Bible ‘ido onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi.’—Ndị Rom 13:1-7.

Otú ọ dị, usoro ikpe ná mba dị iche iche emewo njehie ndị na-emeru ahụ, na-emechukwa ihu.a Kama ịta ndị ikpe mara ahụhụ ma na-echebe ndị aka ha dị ọcha, mgbe ụfọdụ a taala ndị aka ha dị ọcha ahụhụ n’ihi mpụ ha na-emeghị. Ndị ọzọ anọwo ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ, nanị ịbụ ndị a tọhapụrụ tupu ntaramahụhụ ha a na-agwụ n’etiti obi abụọ ma hà bụ ndị ikpe mara na ndị e kwesịrị ịma ikpe. Ya mere, ọtụtụ na-ajụ, Ọ̀ dị mgbe a ga-enwe ezi ikpe maka onye ọ bụla? Ọ bụrụ otú ahụ, olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa? Ònye ka anyị pụrụ ịtụkwasị obi ichebe ndị aka ha dị ọcha? Olileanya dịkwa aṅaa dịịrị ndị e kpeere ikpe na-ezighị ezi?

Ikpe Agbagọọ

N’afọ ndị 1980, Germany hụrụ “otu n’ime usoro iwu ndị kasị akpali akpali kemgbe agha biri,” bụ́ mgbe a tụrụ otu nne mkpọrọ mkpụrụ ọka n’ihi igbu ụmụ ya nwanyị abụọ. Otú ọ dị, ọtụtụ afọ mgbe nke ahụ gasịrị, a tụleghachiri ihe akaebe ndị e nwere megide ya, a tọhapụkwara ya ruo mgbe e kpere ya ikpe ọhụrụ. Die Zeit kọrọ n’afọ 1995 na ikpe mbụ ahụ “pụrụ ịnwapụta ịbụ mmehie ihe n’ikpe.” Ruokwa n’oge a na-ede isiokwu a, nwanyị a anọwo afọ itoolu n’ụlọ mkpọrọ ma bụrụ onye ọ na-edobeghị anya ma ikpe ọ̀ mara ya ma ọ bụ na ikpe amaghị ya.

N’otu uhuruchi November n’afọ 1974, mgbawa nke bọmbụ abụọ nke gburu mmadụ 21, mere ka etiti obodo Birmingham, England, maa jijiji. Ọ bụ ihe omume nke “onye ọ bụla na Birmingham na-agaghị echefu echefu ma ọlị,” ka Chris Mullen, bụ́ onye òtù Nzukọ Ndị Isi, dere. Mgbe e mesịrị, “a mara mmadụ isii aka ha dị ọcha ikpe igbu ọchụ kasịnụ n’akụkọ ihe mere eme nke Britain.” Ka oge na-aga a kagburu ikpe a mara ha—ma ọ bụ nanị mgbe ndị ikom a nọworo afọ 16 n’ụlọ mkpọrọ!

Ọkàikpe na-ekwuchitere onye ọzọ bụ́ Ken Crispin kọrọ banyere otu ikpe nke “dọọrọ echiche ọha mmadụ n’ụzọ na-enweghị atụ n’akụkọ ihe mere eme nke usoro iwu mba Australia.” Otu ezinụlọ mara ụlọ ikwuu ha ná nso Nkume Ayers mgbe nwa ha furu, mie ala. E boro nne ya ebubo igbu ọchụ, maa ya ikpe, ma tụọ ya mkpọrọ mkpụrụ ọka. Na 1987, mgbe a tụworo ya mkpọrọ ihe karịrị afọ atọ, nchọpụta gọọmentị mere gosiri na ihe akaebe e nwere megide ya apụghị ịkwado ịma ya ikpe. A tọhapụrụ ya ma gbaghara ya.

E gburu otu nwanyị dị afọ 18 nke bi n’ebe ndịda United States na 1986. E boro otu nwoke katatụrụ ahụ ebubo, kpegbuo ya, ma maakwa ya ikpe ọnwụ. Ọ nọrọ afọ isii n’ogige ebe a na-edebe ndị a mara ikpe ọnwụ tupu a chọpụta na aka ya adịghị na mpụ ahụ.

Ndị a hà bụ ihe atụ a na-adịghị ahụkarị nke mmehie ihe n’ikpe? David Rudovsky nke Ụlọ Akwụkwọ Usoro Iwu nke Mahadum Pennsylvania dere, sị: “Anọwo m n’usoro ikpe ruo ihe dị ka afọ 25 ma hụ ọtụtụ okwu ikpe. M ga-asị na ndị ahụ a mara ikpe, ndị bụ n’ezie ndị aka ha dị ọcha . . . M na-eche na ha dị n’agbata pasent ise na iri.” Crispin na-ajụ ajụjụ ahụ na-enye nsogbu n’obi, sị: “È nwere ndị ọzọ aka ha dị ọcha nọ n’ime ụlọ mkpọrọ ná nkụda mmụọ?” Olee otú mmehie ihe dị oké njọ ndị dị otú ahụ si kwee omume?

Usoro Ikpe Mmadụ —Ya na Adịghị Ike Mmadụ

“Ọ dịghị usoro ihe mmadụ nke pụrụ ịtụ anya izu okè,” ka Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke Britain mesiri ike na 1991. Usoro ikpe pụrụ nanị ịdị mma ma bụrụ nke a pụrụ ịdabere na ya dị ka ndị mepụtara ma na-eduzi ya bụ. Ndị mmadụ na-emejọkarị ihe, ghara ime ihe n’eziokwu, ma na-enwe ajọ mbunobi. Ya mere, o kwesịghị ịbụ ihe ijuanya na usoro ikpe nke mmadụ na-egosipụta kpọmkwem ụdị ntụpọ ndị a. Tụlee ihe na-esonụ.

Dị ka Ọkaikpe Rolf Bender nke Germany si kwuo, n’ime pasent 95 nke okwu ikpe nile nke ime mpụ, okwu a nụrụ site n’ọnụ ndị akaebe na-adị ike dị ka ihe akaebe ha. Ma ndị akaebe a nọ n’ụlọ ikpe hà bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi mgbe nile? Ọkaikpe Bender echeghị otú ahụ. Ọ na-agbakọ na ọkara n’ime ndị akaebe ahụ na-apụta n’ụlọ ikpe na-ekwu okwu ụgha. Bernd Schünemann, prọfesọ ukwu nke iwu ime mpụ na Mahadum Munich, Germany, mere nchọpụta yiri nke ahụ. Mgbe Die Zeit na-agba ya ajụjụ ọnụ, Schünemann kwadoro na okwu ndị akaebe bụ ụdị ihe akaebe bụ́ isi—ọ bụ ezie na a pụghị ịdabere na ya. “M ga-asị na ihe bụ́ isi na-akpata mkpejọ ikpe bụ na ndị ikpe na-adabere n’okwu a na-apụghị ịtụkwasị obi nke ndị akaebe.”

Ndị akaebe pụrụ imejọ; otú ahụ ka ọ dịkwa ndị uwe ojii. Karịsịa mgbe e mesịrị mpụ nke kpasuworo ọha na eze iwe, a na-arụgide ndị uwe ojii ijide ndị mmadụ. N’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ndị uwe ojii ụfọdụ adabawo n’ọnwụnwa nke imepụta ihe akaebe ma ọ bụ ịrụgide onye e boro ebubo ime nkwupụta. Mgbe a tọhapụrụ mmadụ isii ahụ a mara ikpe maka bọmbụ ahụ a tụrụ na Birmingham, akwụkwọ akụkọ Britain bụ́ The Independent bu isiakụkọ bụ́: “A Tara Ndị Uwe Ojii Rụrụ Arụ Ụta Maka Ikpe A Mara Mmadụ Isii.” Dị ka The Times na-ekwu: “Ndị uwe ojii ghara ụgha, mee atụmatụ ọjọọ, duhiekwa.”

N’ọnọdụ ụfọdụ, ajọ mbunobi pụrụ ime ka ndị uwe ojii na ọha na eze na-enyo ụfọdụ ndị sitere n’agbụrụ, okpukpe, ma ọ bụ mba ọzọ enyo. Dị ka U.S.News & World Report na-ekwu, ịgwọta ime mpụ pụrụ imebizi ịghọ “okwu ịkpa ókè agbụrụ kama ịbụ nke ezi uche.”

Ozugbo okwu rutere n’ụlọ ikpe, ọ bụghị nanị ihe ndị akaebe kwuru pụrụ imetụta mkpebi e mere kamakwa ihe akaebe nke sayensị. N’akụkụ dị mgbagwoju anya nke iji sayensị nwapụta ikpe, a pụrụ ịkpọku ọkàikpe ma ọ bụ ndị ikpe ka ha kpebie ikpe ọmụma ma ọ bụ aka ịdị ọcha na-adabere n’otú égbè si agba, ma ọ bụ site n’ịmata akara mkpụrụ aka, aka akwụkwọ, ụdị ọbara, ụcha agịrị isi, eriri àkwà, ma ọ bụ ngosipụta nke ọdịdị DNA. Otu ọkàiwu kọwara na ụlọikpe na-eche “ìgwè ndị ọkà mmụta sayensị na-akọwa usoro dị mgbagwoju anya” ihu.

Ọzọkwa, magazin bụ́ Nature na-ekwu na ọ bụghị ndị ọkà mmụta sayensị nile kwenyere ná nkọwa nke ihe akaebe nke iji sayensị nwapụta ikpe. “A pụrụ inwe ezigbo nghọtahie n’etiti ndị ọkà mmụta sayensị banyere iwu.” N’ụzọ dị mwute, “ihe akaebe na-adịghị mma nke iji sayensị nwapụta ikpe bụ ihe kpataworo ọtụtụ ikpe ọmụma na-ezighị ezi.”

N’agbanyeghị ebe anyị bi, usoro ikpe nile na-arụ ọrụ ugbu a na-egosipụta adịghị ike nke mmadụ. Ya mere ònye ka anyị pụrụ ịtụkwasị obi ichebe ndị aka ha dị ọcha? Ànyị pụrụ inwe olileanya ọ bụla inweta ezi ikpe? Olileanya dịkwa aṅaa dịịrị ndị e kpeworo ikpe n’ụzọ na-ezighị ezi?

“Mụ Onwe M, Jehova, Na-ahụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya”

Ọ bụrụ na gị ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ gị abụrụ onye e kpeworo ikpe n’ụzọ na-adịghị mma, Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs, maara ihe ị nọ n’ime ya. Ikpe na-ezighị ezi dị egwu kasịnụ e kpetụworo bụ nke e kpere mgbe e gburu Kraịst n’elu osisi ịta ahụhụ. Pita onyeozi na-agwa anyị na Jisọs ‘adịghị mmehie ọ bụla O mere.’ N’agbanyeghị nke ahụ, ndị àmà ụgha boro ya ebubo, a maa ya ikpe, ma gbuo ya.—1 Pita 2:22; Matiu 26:3, 4, 59-62.

Cheedị nnọọ echiche otú Jehova ga-esiworị nwee mmetụta banyere mmeso ọjọọ e mesoro Ọkpara ya! Ikpe ziri ezi bụ otu n’ime àgwà ndị bụ́ isi nke Jehova. Bible na-agwa anyị, sị: “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi.”—Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 33:5.

Jehova nyere Israel usoro ikpe pụrụ iche. N’ihe banyere igbu ọchụ na-edoghị anya, a na-akwụ ụgwọ ọchụ ahụ site n’ịchụ àjà. E nweghị ihe nrụgide ọ bụla nke idozi mpụ nile nke pụrụ ịkpata ịma onye aka ya dị ọcha ikpe. A pụghị ịma onye ọ bụla ikpe igbu ọchụ na-adabere n’ihe akaebe na-emetụtaghị ikpe ahụ kpọmkwem ma ọ bụ nke sayensị; ọ dịkarịa ala ndị akaebe abụọ dị mkpa. (Deuterọnọmi 17:6; 21:1-9) Ihe atụ ndị a na-egosi na Jehova nwere ụkpụrụ ndị dị elu nakwa na ọ chọrọ ka e kpee ikpe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ezie, ọ na-asị: “Mụ onwe m, Jehova, na-ahụ ikpe ziri ezi n’anya.”—Aịsaịa 61:8.

Otú ọ dị, usoro ikpe nke Israel dị n’aka ụmụ mmadụ ndị nwere adịghị ike dị ka anyị. E nwere ọnọdụ ndị e ji iwu ahụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Eze Solomọn dere, sị: “Ọ bụrụ na ị hụ na a na-emegbu ogbenye, na a na-anapụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume n’ike n’ala a na-achị achị, ibobo anwụla gị n’ihe ahụ a na-eme.”—Eklisiastis 5:8.

Jehova nwere ike nke idozi ikpe na-ezighị ezi ahụ e kpere Ọkpara ya. Nke a ịbụ ihe e ji n’aka wusiri Jisọs ike, onye “n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya, na-atachi obi [n’elu osisi ịta ahụhụ, NW] Ya.” N’otu aka ahụ, olileanya ahụ na-enye ọṅụ nke ịdị ndụ n’elu ala paradaịs n’okpuru ịchịisi nke Mesaịa, ebe ikpe ziri ezi ga na-enwe mmeri, pụrụ iwusi anyị ike ịtachi obi mgbe anyị nụrụ ma ọ bụ nwee ahụmahụ nke ikpe na-ezighị ezi n’usoro ihe ochie nke a. Ọ dịghị mmerụ ahụ ọ bụla nke Jehova na-apụghị idozi n’oge ya. Ọbụna ndị tụfuru ndụ ha site ná mmehie ihe nke ikpe pụrụ ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ.—Ndị Hibru 12:2; Ọrụ 24:15.

Ọ bụrụ na anyị ataa ahụhụ dị ka ndị e kpere ikpe na-ezighị ezi, anyị pụrụ inwe ekele na ọtụtụ usoro ikpe nwere usoro nkwurịta okwu iwu nke pụrụ inyere anyị aka idozi ọnọdụ ahụ. Ndị Kraịst pụrụ iji usoro ndị dị otú ahụ mee ihe. Otú ọ dị, ha na-eburu eziokwu a n’obi: Usoro ikpe na-ezughị okè bụ ngosipụta nke ọha mmadụ nke nwere mkpa nrụzigharị dị ukwuu. Nke ahụ ga-ewere ọnọdụ n’isi nso—site n’aka Chineke.

Jehova ga-ekpochapụ usoro ihe a nke ikpe na-ezighị ezi n’isi nso ma were usoro ihe ọhụrụ nke ‘ezi omume bi n’ime ya’ dochie ya. Anyị pụrụ inwe obi ike kpam kpam na Onye Okike anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ahụ site n’aka Eze Mesaịa ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Ezi ikpe maka onye ọ bụla dị nso! Lee ekele anyị pụrụ inwe maka olileanya nke a.—2 Pita 3:13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’ọnọdụ ndị e kwuru okwu ha n’ebe a, Ụlọ Nche anaghị atụ aro ikpe ọmụma ma ọ bụ aka ịdị ọcha nke onye ọ bụla, magazin a anaghịkwa ebuli usoro ikpe nke otu mba elu dị ka nke ka nke ọzọ mma. Ọzọkwa, magazin a anaghị akwado otu ụdị ntaramahụhụ karịa ụdị ọzọ. Isiokwu a na-ekwu nanị ihe bụ eziokwu dị ka a maara ha n’oge a na-ede ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Usoro ikpe na-ezughị okè—tinyere gọọmentị rụrụ arụ, okpukpe jọgburu onwe ya, na azụmahịa na-enweghị ụkpụrụ—bụ ngosipụta nke ọha mmadụ nke nwere mkpa nrụzigharị dị ukwuu

[Igbe dị na peeji nke 28]

Nkasi Obi Sitere n’Akwụkwọ Nsọ

Na November 1952, Derek Bentley na Christopher Craig tiwara ma banye n’otu ụlọ nkwakọba ihe na Croydon, nke dị nso na London, England. Bentley dị afọ 19, Craig dịkwa afọ 16. A kpọrọ ndị uwe ojii, Craig gbagbukwara otu n’ime ndị uwe ojii ahụ. Craig nọrọ afọ itoolu n’ụlọ mkpọrọ, ebe a kwụgburu Bentley na January 1953 n’ihi igbu ọchụ.

Nwanne nwanyị Bentley, bụ́ Iris, mere mkpọsa ruo afọ 40 iji hichapụ aha ya n’igbu ọchụ nke aka ya na-adịghị. Na 1993, Eze nyere mgbaghara banyere ọmụma ikpe ahụ, na-ekweta na e kwesịghị ịkwụgbu Derek Bentley ma ọlị. Iris Bentley dere banyere ikpe ahụ n’akwụkwọ bụ́ Let Him Have Justice:

“N’ihe dị ka otu afọ tupu mgbagbu ahụ o zutere otu Onyeàmà Jehova n’okporo ámá . . . Nwanna Nwanyị Lane bi ebe dị anyị nso na Fairview Road, ọ kpọkwara Derek òkù ịbịa n’ụlọ ya iji gere akụkọ Bible. . . . Ihe nyere aka bụ na Nwanna Nwanyị Lane nwere akụkọ Bible ndị ahụ na rekọd, bụ́ nke ọ gbazinyere ya [ebe Derek na-adịghị agụ ihe nke ọma]. . . . Ọ na-alọghachi wee gwa m ihe ọ gwaworo ya, ihe ndị dị ka na anyị nile ga-alọghachi ọzọ mgbe anyị nwụrụ.”

Iris Bentley gara leta nwanne ya nwoke n’ebe a na-edebe ndị a mara ikpe ọnwụ tupu e gbuo ya. Olee otú ọ dị nwanne ya nwoke? “Ihe ndị ahụ Nwanna Nwanyị Lane gwara ya nyeere ya aka n’ụbọchị ole na ole ndị ikpeazụ ahụ.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.

Ọ bụrụ na i nweta ihe isi ike site na mkpejọ ikpe, ọ ga-adị mma ka ị gụọ ma tụgharịa uche n’eziokwu Bible. Nke a pụrụ inye nkasi obi dị ukwuu, n’ihi na Jehova Chineke bụ “Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile; Onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.

[Foto dị na peeji nke 29]

E kpere ikpe na-ezighị ezi dị egwu mgbe e gburu Kraịst

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya