Kere Òkè n’Ịkpọsa Ụtụ Ga-aga nke Ọma
1 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị adịghị enwe mmasị n’ozi Alaeze ahụ ma nwee mmasị n’ihe omume ha nke ụwa, ahụmahụ na-egosi na anyị pụrụ iji ozi Bible e biri ebi mee ka ha malite inwe mmasị. Otu ụzọ bụ site n’inyefe ụtụ mgbe ọ bụla ohere dapụtara. Otú ọ dị, iji mee ya n’ụzọ dị irè, ọ dị mmadụ mkpa inwe àgwà ziri ezi, isetịpụ ihe mgbaru ọsọ onwe onye, iche ihe n’ihu mmadụ n’ụzọ dị irè, iji ohere nile na-adapụta eme ihe, nakwa inwe mpempe akwụkwọ e ji edejupụta ụtụ.
2 Nwee Àgwà Ziri Ezi: “Onye na-arịba ifufe ama agaghị agha mkpụrụ; ọzọ, onye na-elekwasị igwe ojii anya agaghị ewe ihe ubi,” ka Bible na-ekwu n’Eklisiastis 11:4. Anyị ekwesịghị ikwubi na anyị agaghị enyefeli ụtụ. Ọ chọrọ nanị inwe àgwà ziri ezi na ịgbaso aro ndị na-enye aka òtù ohu ahụ na-atụ. (Tụlee Luk 5:4-6; Matiu 24:45-47.) Otu nwanna nwoke nke nụrụ ka ndị okenye na-agba ume ka a malite ozi ịsụ ụzọ, dejupụtara akwụkwọ ịmalite ya. Ọ tọrọ ya ụtọ nke ukwuu nke na ọ sụkwuru ụzọ n’ọnwa na-eso ya. O nyefere ụtụ 79 n’ime ọnwa abụọ ahụ.
3 Setịpụrụ Onwe Gị Ihe Mgbaru Ọsọ Ezi Uche Dị na Ya: Ọtụtụ n’ime ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’inyefe ụtụ ekwuwo na isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ezi uche dị ya keere òkè n’ihe ịga nke ọma ha nwere. Anyị na-agba mmadụ nile ume ka ha setịpụ ihe mgbaru ọsọ ma gbalịa iru ya.
4 Jiri Ụzọ Dị Irè Jekwuru Mmadụ: O zughị ezu ịgwa ndị mmadụ na ha pụrụ inweta magazin ndị ahụ n’ebe obibi ha site na post ọfịs. Mee ka ha mara ihe ndị ha ga na-atụ anya ha. Mee ka ụzọ i si eche ya n’ihu ha kwesị ọnọdụ ha. Lee arọ ụfọdụ:
5 Mgbe ị na-agba àmà ụlọ n’ụlọ, ị pụrụ ịmalite iche ihe n’ihu mmadụ n’ụzọ dị otú a:
◼ “Ndewo, aha m bụ _________________________. Ana m akpọtụrụ ndị agbata obi m taa n’ihi na ama m na ọtụtụ mmadụ nwere mmasị n’ige akụkọ. Ikekwe iji si na ha mụta ihe ma ọ bụ iji mụrụ anya banyere ihe ize ndụ ọ bụla na-abịanụ. Ì nwere otu echiche ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin ndị a bu akụkọ dị iche iche si gburugburu ụwa, ha na-enyekwara anyị aka ịmụta ihe site n’akụkọ ndị a. [Dọrọ uche onye ahụ nwe ulọ gaa n’otu akụkọ kwesịrị ekwesị na-adọrọ mmasị, mgbe ahụ gaakwa n’ihu.] Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị, obi ga-adị m ụtọ ime ndokwa ka a na-ewetara gị magazin ndị ọzọ a ga na-ebipụta ruo otu afọ na-abịanụ.” Ọ bụrụ na o kwuru na ọ masịrị ya, nyefee ụtụ ahụ n’ọnụ ego a na-enyefe ya.
6 Ọ bụrụ na i zute onye ị na-ezutebeghị na mbụ, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Obi dị m ụtọ ịhụ gị. Aha m bụ _________________________. Ama m na e nwere ahụhụ n’ala anyị nakwa n’ebe ndị ọzọ n’ụwa dum. Nke a emewo ka ọtụtụ mmadụ na-eche ma nsogbu anyị ọ̀ pụkwara inwe ngwọta. Ọ̀ dịwo mgbe ọ bụla i chere echiche banyere nke a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin ndị a na-egosi ụzọ kasị mma isi kwụsị nsogbu ndị mmadụ na-enwebeghị ike kwụsị eri ọtụtụ narị afọ gara aga. Ọ ga-amasị m ime ndokwa ka a na-ewetara gị ndị nke ọhụrụ ya ruo otu afọ na-abịanụ n’ụtụ ₦320.00. Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ka a na-ezitere gị ha site na post ọfịs, ị ga-enweta ha n’ụtụ ₦450.00.” Mee ndokwa maka nletaghachi.
7 Ọ bụrụ na ị maara mmadụ nke ọma, ị pụrụ ijiri akọ mee ka ozi gị kwekọọ n’ọnọdụ ya iji nyere ya aka ịhụ uru nke magazin ndị ahụ bara. Ị pụrụ igosi ya isi ihe ndị ga-akpali mmasị ya na magazin ndị ahụ. Gwazie ya otú ya na ndị ọ hụrụ n’anya pụrụ isi nweta ngọzi ndị magburu onwe ha sitere n’aka Chineke. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ekwuo na ya enweghị ego, ị pụrụ inyefe ya magazin ndị nke dị n’akpa gị.
8 Jiri Ohere Nile Dapụtaranụ Mee Ihe: Jiri ohere ndị dịnụ nyefee ụtụ n’ụzọ zuru ezu. Hụ na i keere òkè ná nnyefe ụtụ nke bụ akụkụ ihe omume nke ọgbakọ n’ọnwa a. Cheta ka i mee ihe iji dejupụtaghachi ụtụ ndị a gwara gị na ha agwụwala. Ị pụrụ ime ndokwa iji nye mmadụ ụtụ dị ka onyinye. Nke a nwere abamuru na-adịgide adịgide karịa onyinye nkịtị. Ozi ya na-azọpụta ndụ. Ị pụkwara inyefe ndị nọ n’ụzọ magazin gị na ndị ị na-amụrụ Bible ụtụ. Hụ na ị na-akwado ndokwa ọgbakọ mere maka Ụbọchị Magazin (kwa Saturday).
9 N’otu aka ahụ, elegharakwala ohere ndị na-adapụta maka inyefe ụtụ mgbe ị na-agba àmà mberede anya. (Ekli. 11:6) Ezinụlọ nke nwatakịrị nwanyị dị afọ anọ nwere onye ọbịa. Otu ụbọchị, onye ọbịa ahụ chọrọ ịgụ ihe ma mee mkpesa, sị, “Ọ́ dịghị ihe a na-agụ agụ dị n’ụlọ a?” Onyeàmà ahụ na-eto eto wee gbanye aka n’ukwu jụghachi ya, “Ị̀ na-ekwu na ọ dịghị ihe a na-agụ agụ dị n’ụlọ a? Chetụgodị.” O wee gbaga n’ọnụ ụlọ mama ya, rịgoro n’oche, kpopụtakwa magazin mama ya, Ụlọ Nche na Teta! Ọ chịgaara ha onye ọbịa ahụ ma kwuo, sị, “Ugbu a lee ma ọ̀ bụ na ọ dịghị ihe a na-agụ agụ!” Magazin ndị ahụ tọrọ onye ọbịa ahụ ụtọ nke ukwuu nke na nwatakịrị ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ inweta ha n’ụlọ gị site na post ọfịs.” Gịnị si na ya pụta? E nyefere ụtụ abụọ!
10 Zite Ụtụ Ndị A Natara Ozugbo: Ndị tụrụ ụtụ pụrụ inwe nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na ha enwetaghị magazin ndị ha tụrụ ụtụ ha ruo ogologo oge. Dị ka ọ na-adịkarị, ụtụ ndị ọhụrụ e ziteere Society nwere ike ghara iwe ihe karịrị ọnwa ole na ole tupu onye ahụ tụrụ ha amalite inweta magazin ndị ahụ. Ma oge ọ ga-ewe pụrụ ịdị nnọọ ukwuu karị ma ọ bụrụ na e ziteghịrị Society ụtụ ndị ahụ n’oge. Nke a mere o ji dị mkpa inye ọgbakọ mpempe akwụkwọ ndị ahụ e ji edejupụta ụtụ ndị e dejupụtasịworo ná nzukọ ọgbakọ na-esonụ. Nwanna na-ahụ maka ụtụ kwesịrị idejupụtazi fọm Weekly Subscriptions ozugbo ma nye ya odeakwụkwọ bụ́ onye ga-eji nlezianya nyochaa ha, bịanye aka na ya ma zitere ya Society n’otu izu ahụ.
11 Mgbe onye ọ bụla n’ime anyị keere òkè nke ya ná mkpọsa ụtụ a, obi siri anyị ike na Jehova ga-agọzi mgbalị anyị.