Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/99 p. 7
  • Ị̀ Na-akwapụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-akwapụ?
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ị Ga-esi Eme Ka Ọgbakọ Ọhụrụ Ị Gafere Mara Gị Ahụ́
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ka E Wulie Ọgbakọ Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ka Ọgbakọ Too Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ọgbakọ Ọhụrụ Gị Mara Gị Ahụ́?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 10/99 p. 7

Ị̀ Na-akwapụ?

Mgbe azịza nye ajụjụ ahụ bụ ee, e nwere ọtụtụ ihe dị mkpa ka gị na ndị ọzọ bute ụzọ n’ime. Site n’ịgbaso nzọụkwụ ndị bụ́ isi e depụtara n’okpuru, ị ga-akwụrụ chịm ngwa ngwa n’ọgbakọ ọhụrụ gị.

(1) Ozugbo ị matara ebe ị na-akwaga, odeakwụkwọ ọgbakọ ị nọ na ya ugbu a nwere ike inweta adres Ụlọ Nzukọ Alaeze ọgbakọ ọhụrụ gị. Mgbe i rutere ebe ahụ, chọta ụlọ nzukọ ahụ ozugbo ma chọpụta mgbe ọgbakọ ahụ ji enwe nzukọ. Ọ bụrụ na ihe karịrị otu ọgbakọ ji Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ eme ihe, jụọ ndị okenye ka ha gwa gị ọgbakọ nwe ókèala i bi na ya. Egbula oge n’ịga nzukọ nakwa n’ịmata ndị okenye nọ ebe ahụ.

(2) Odeakwụkwọ ọgbakọ ị nọ na ya ugbu a na nke ọgbakọ ọhụrụ gị ga-arụkọ ọrụ ọnụ n’iziga kaadị Ihe Ndekọ Ọgbakọ Maka Onye Nkwusa nke gị na ezinụlọ gị. A ga-ezigakwara ndị okenye nọ n’ọgbakọ ọhụrụ gị akwụkwọ ozi nkọwa. (Lee Igbe Ajụjụ nke Ozi Alaeze Anyị nke March 1991.) Kọmitii Ije Ozi nke ebe ahụ kwesịrị ịgwa onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ekwesị banyere ọbịbịa gị ka o wee kpọtụrụ gị ma nyere gị aka ịchọta ebe ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọhụrụ gị na-enwe nzukọ.—Rom 15:7.

(3) Ndị nkwusa nile nọ n’ọgbakọ ọhụrụ gị nwere òkè na-enye ọṅụ ha ga-ekere—nke ịmata onye ị bụ nakwa ime ka ahụ ruo gị ala. (Tụlee 3 Jọn 8.) Otú ọ dị, nke a pụtara na ị ghaghị ịdị na-aga nzukọ ka gị na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị wee nwee ike ịgbarịta onwe unu ume ma wulirịta onwe unu elu.

(4) I kwesịghị ichere ruo mgbe e mechara ihe nile dị n’ịkwapụ akwapụ tupu i soro ọgbakọ ọhụrụ gị kere òkè n’ozi ubi. Ka ị na-ebute ọdịmma Alaeze ahụ ụzọ, a ga-egbo mkpa ndị ọzọ, ị ga-enwekwa nnọọ ahụ iru ala n’ebe ọhụrụ ị kwagara. (Mat. 6:33) Mgbe ị kwabasịrị n’ebe obibi ọhụrụ gị, ikekwe ị pụrụ ịgwa ndị ụfọdụ nọ n’ọgbakọ ka ha bịa na nke gị, unu amarakwa onwe unu nke ọma karị.—Rom 12:13b.

Nkwapụ bụ nnukwute ọrụ. Otú ọ dị, mgbe onye ọ bụla o metụtara mere ihe a tụrụ aro ya, a gaghị enwe ihe ndọghachi azụ ime mmụọ. Mmadụ nile ga-enwe mmasị dị ukwuu n’òtù ụmụnna anyị nke ndị Kraịst na-ahụ n’anya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya