Ime Mkpesa Nile Hà Dị Njọ?
Olee mkpasu iwe ndị na-egbu mgbu karịa ndị ahụ anyị na-apụghị ime mkpesa ha?—Marquis De Custine, 1790-1857.
RUO afọ abụọ o diwo iyi egwu mmekọahụ site n’aka onye ọrụ ibe ya. Mkpesa ya kpatara ịkpọ iyi na ịbụ onye a na-adịghị atụpụrụ ọnụ. Nrụgide ahụ e jichiri ejichi nọ na-emetụta ahụ ike ya, ma gịnị ka ọ pụrụ ime? N’otu aka ahụ, a chụpụrụ nwa akwụkwọ na-agba onye mbụ na klas ya n’ihi na akọ na uche ya ekweghị ya ka o kere òkè n’ọzụzụ iji aka alụ ọgụ bụ́ nke ụlọ akwụkwọ chọrọ. Ha abụọ chere na e mejọwo ha, ma hà kwesịrị ime mkpesa? Ọ bụrụ na ha emee, hà pụrụ ịtụ anya inweta ahụ efe ka ọ̀ ga-eme nanị ka ihe ka njọ?
Mkpesa yiri ndị a na ndị ọzọ dị n’ebe nile taa, ebe anyị na-ebi n’etiti ndị mmadụ na-ezughị okè n’ime ụwa ihe nke na-adịtụghị otú o kwesịrị. Ime mkpesa na-emetụta ọtụtụ ihe malite n’igosipụta enweghị mmasị, mwute, ihe mgbu, ma ọ bụ iwe n’ihi ọnọdụ ụfọdụ, ruo n’ibo otu onye ebubo nkịtị. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-ahọrọ izere ime mkpesa na esemokwu; ma, ọ̀ bụ iwu na mmadụ ga-agbachi nkịtị mgbe nile? Gịnị bụ echiche Bible?
Mmetụta Ọjọọ Ya n’Ahụ Onwe Onye na Ndị Ọzọ
Obi abụọ adịghị ya na mmụọ ime mkpesa na-adịghị ala ala na-emebi ihe, a katọkwara ya n’ime Bible. Onye mkpesa ga-ewetara onwe ya mbibi anụ ahụ na nke ime mmụọ, na-akpasukwa ndị ọ na-eme mkpesa banyere ha iwe. N’ikwu banyere nwunye na-eme mkpesa, ilu Bible na-asị: “Mmiri ọtụtụ nke na-atụ mgbe nile n’ụbọchị oké mmiri ozuzo, ya na nwanyị nke na-ese okwu yiri.” (Ilu 27:15) Mkpesa a na-eme megide Jehova ma ọ bụ otu n’ime ndokwa ya kwesịrị ụta karịsịa. Mgbe mba Israel mere mkpesa banyere manna e ji ọrụ ebube nye n’oge njem ọzara ha nke were afọ 40, na-akpọ ya ‘achịcha dị mfe,’ Jehova zigara agwọ ọjọọ iji taa ndị mkpesa ahụ na-enweghị nkwanye ùgwù ahụhụ, ọtụtụ nwụkwara.—Ọnụ Ọgụgụ 21:5, 6.
Ọzọkwa, Jisọs dụrụ ụmụazụ ya ọdụ ka ha ghara ime mkpesa banyere “irighiri ahịhịa” nke mmejọ dị n’ime ndị mmadụ ibe anyị, kama ịmara nke ọma banyere “ntụhie” ka ukwuu nke emezighị emezi ndị anyị onwe anyị nwere. (Matiu 7:1-5) N’ụzọ yiri nke ahụ, Pọl katọrọ ikpe onye ọzọ ikpe (ụdị nke ime mkpesa) dị ka ‘nke na-enweghị ngọpụ n’ihi na gị onye na-ekpe ikpe na-eme otu ihe ahụ.’ Ịdọ aka ná ntị ndị a megide ime mkpesa kwesịrị ịkwali anyị izere ịbụ ndị na-eme nkatọ n’ụzọ na-adịghị mkpa na ịzụlite mmụọ ime mkpesa.—Ndị Rom 2:1.
À Katọrọ Ime Mkpesa Nile?
Mgbe ahụ, ànyị kwesịrị ikwubi na a gaje ịkatọ ụdị nile nke ime mkpesa? Ee e, anyị ekwesịghị. Bible na-egosi na e nwere ọtụtụ ikpe na-ezighị ezi n’ụwa jupụtara ná ntụpọ anyị bi n’ime ya bụ́ ndị kwesịrị n’ezie ka e dozie. N’otu ilu, Jisọs kwuru banyere otu ajọ onye ikpe nke na-ejighị obi ya nile nye otu nwanyị di ya nwụrụ a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ka o wee ghara “ime ka ike gwụsịa [ya] site n’ọbịbịa ọ na-abịa mgbe nile.” (Luk 18:1-8) N’ọnọdụ ụfọdụ anyị pụkwara ịnọgide na-eme mkpesa ruo mgbe e dozichara ihe ọjọọ.
Site n’ịgba anyị ume ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ọ̀ bụ na Jisọs akpọkughị anyị ịmata ihe ndị kọrọ ụwa a na ‘ịkpọku’ Chineke maka ihe ngwọta? (Matiu 6:10) Mgbe “iti mkpu” banyere ajọ omume nke Sọdọm na Gọmọra oge ochie ruru ya ntị, Jehova zigara ndị ozi ya iji “hụ ma ọ̀ bụ dị ka iti mkpu ha si dị, nke ruru m ntị, ka ha mezuworo” na iweta ihe ngwọta. (Jenesis 18:20, 21) Iji nye ndị kpesawooro ya ahụ efe, Jehova mesịrị dozie ọnọdụ ahụ site n’ibibi obodo abụọ ahụ na ndị rụrụ arụ bi n’ime ha.
Ọgbakọ Ndị Kraịst
Ò kwesịrị ịdị iche n’etiti ụmụnna n’ime ọgbakọ ndị Kraịst? N’agbanyeghị na ha bụ ndị ikom na ndị inyom na-ezughị okè, ndị Kraịst na-agbalịsi ike ijere Chineke ozi n’udo na ịdị n’otu. Ma, ọnọdụ ndị ga-eme ka e mee mkpesa ruo n’ókè ụfọdụ ga-ebilite n’etiti ha, nke ga-achọkwa ihe ngwọta. Na narị afọ mbụ, otu ọnọdụ bilitere n’ọgbakọ ndị e tere mmanụ n’oge na-adịghị anya mgbe Pentikọst gasịrị. Ọtụtụ ndị Kraịst a tọghatara ọhụrụ nọgidere na Jerusalem iji nwetakwuo ntụziaka na agbamume. A na-ekesa ihe oriri ndị e nwere. Ma, “ndị Juu na-asụ asụsụ Grik malitere ịtamu megide ndị Hibru, n’ihi na e lefuuru ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ anya n’ije ozi, bụ́ ikere ndị Kraịst òkè, kwa ụbọchị.” Kama ịkatọ ndị mkpesa a dị ka ndị na-akpata nsogbu, ndị ozi mere ihe iji dozie ọnọdụ ahụ. Ee, ndị nlekọta dị n’aka n’ọgbakọ ga-eji obi umeala gee ntị ma mee ihe banyere ezi mkpesa ndị e ji ezi nkwanye ùgwù na mmụọ kwesịrị ekwesị mee.—Ọrụ 6:1-6; 1 Pita 5:3.
Nye Ikike Kwesịrị Ekwesị
Ị̀ rịbara ama site n’ihe atụ ndị dị n’elu na e kwesịrị iji mmụọ kwesịrị ekwesị mee mkpesa nakwa nye ikike kwesịrị ekwesị? Dị ka ihe atụ, ọ gaghị aba uru ikpesara onye uwe ojii banyere ibu arọ nke oké ụtụ isi ma ọ bụ mmadụ ikpesara ọkàikpe banyere ọrịa ya. N’otu aka ahụkwa, ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ikpesara onye na-enweghị ikike ọ bụla ma ọ bụ nke na-apụghị inye aka banyere ọnọdụ ụfọdụ dị n’ime ma ọ bụ n’èzí ọgbakọ.
N’ihe ka n’ọtụtụ ala taa, e nwere ụlọikpe na ikike ndị ọzọ kwesịrị ekwesị ndị a pụrụ ikpesara n’olileanya nke inwetatụ ahụ efe. Mgbe nwa akwụkwọ ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite isiokwu a wegara mkpesa ya n’ụlọikpe, ndị ọkàikpe kwuru na ikpe amaghị ya, a kpọghachitekwara ya, ụlọ akwụkwọ ahụ rịọkwara ya mgbaghara. N’ụzọ yiri nke ahụ, nwanyị ahụ na-arụ ọrụ e yiri egwu mmekọahụ chọtara ahụ efe site n’aka òtù ndị ọrụ ndị inyom. Bọọdụ ụlọ akwụkwọ rịọrọ ya mgbaghara. Ndị were ya n’ọrụ wekwaara nzọụkwụ iji kwụsị iyi egwu mmekọahụ.
Otú ọ dị, e kwesịghị ịtụ anya na mkpesa nile ga-arụpụta otu ihe ahụ. Eze Solomọn maara ihe kwuru n’izi ezi, sị: “Ihe nke gbagọrọ agbagọ, a pụghị ime ka ọ dịzie.” (Eklisiastis 1:15) Anyị ga-eme nke ọma ịmata na okwu ụfọdụ aghaghị nnọọ ichere ka Chineke dozie ha mgbe oge ya ruru.
[Foto dị na peeji nke 31]
Ndị okenye na-ege ntị ma na-eme ihe banyere mkpesa ndị ziri ezi