Ememe Ndị Dị Ịrịba Ama n’Akụkọ Israel
“Ugbo atọ n’afọ ka a ga-ahụ ndị ikom gị nile n’ihu Jehova, bụ́ Chineke gị, n’ebe ahụ nke Ọ ga-ahọpụta . . . , a gaghị ahụkwa ha n’ihu Jehova n’aka efu.”—DEUTERỌNỌMI 16:16.
1. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere oge ememe ndị dị n’oge Bible?
GỊNỊ na-agbata gị n’uche mgbe i chere banyere ememe? E jiri imebiga ihe ókè na omume rụrụ arụ kaa ememe ụfọdụ n’oge ochie akara. Otu ihe ahụ bụkwa eziokwu n’ihe banyere ememe ụfọdụ nke oge a. Ma ememe ndị e depụtara n’Iwu Chineke nyere Israel dị iche. Ọ bụ ezie na ha bụ oge obi ụtọ, a pụkwara ịkọwa ha dị ka “mkpọkọta nsọ.”—Levitikọs 23:2.
2. (a) Gịnị ka a chọrọ ka ndị ikom Israel mee ugbo atọ n’afọ? (b) Dị ka e si jiri okwu ahụ mee ihe na Deuterọnọmi 16:16, gịnị bụ “ememe”?
2 Ndị ikom Israel kwesịrị ntụkwasị obi—bụ́ ndị ndị ezinụlọ ha na-esonyerekarị—nwetara obi ụtọ na-enye ume ọhụrụ n’ime njem gaa Jerusalem, ‘ebe ahụ Jehova họpụtara,’ ha jikwa mmesapụ aka tụnye ụtụ n’ememe ukwu atọ. (Deuterọnọmi 16:16) Akwụkwọ bụ́ Old Testament Word Studies na-akọwa okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ “ememe” na Deuterọnọmi 16:16 dị ka “oge oké ọṅụ . . . bụ́ mgbe a na-eji ịchụ àjà na oriri echeta oge ihu ọma ndị pụrụ iche nke Chineke.”a
Uru nke Ememe Ukwu Ndị Ahụ
3. Olee ngọzi ndị ememe atọ ndị ahụ a na-eme kwa afọ na-echetara anyị?
3 Ebe ha bụ ndị na-akọ ugbo, ụmụ Israel dabeere ná ngọzi Chineke n’ụdị nke mmiri ozuzo. Ememe ukwu atọ ahụ dị n’Iwu Mosis dabakọrọ ná nchịkọta nke owuwe ihe ubi barley ná mmalite oge opupu ihe ubi, owuwe ihe ubi ọka wheat ná ngwụsị oge opupu ihe ubi, nakwa owuwe ihe ubi ndị ọzọ ná ngwụsị oge okpomọkụ. Ndị a bụ oge oké ọṅụ na inye Onye Nkwado nke usoro mmiri ozuzo na Onye Mere ala na-emepụta ihe ekele. Ma ememe ndị ahụ gụnyere ihe ka nnọọ ukwuu.—Deuterọnọmi 11:11–14.
4. Olee ihe omume mere ihe akụkọ nke e ji ememe mbụ ahụ mee ncheta ya?
4 Ememe nke mbụ weere ọnọdụ n’ọnwa mbụ nke kalenda oge ochie nke Bible, malite na Nisan 15 ruo 21, bụ́ nke kwekọrọ ná ngwụsị March ma ọ bụ ná mmalite April anyị. A kpọrọ ya Ememe Achịcha Na-ekoghị Eko, n’ihi na o sochikwara ngwa ngwa mgbe Ememe Ngabiga nke Nisan 14 gasịrị, a kpọkwara ya ‘ememe ngabiga.’ (Luk 2:41; Levitikọs 23:5, 6) Ememe a chetaara Israel banyere mgbapụta ha pụọ ná mweda n’ala n’Ijipt, ebe a kpọrọ achịcha na-ekoghị eko ahụ “achịcha mweda n’ala.” (Deuterọnọmi 16:3) O chetaara ha na mgbapụ ha site n’Ijipt bụ nnọọ nke e mere ọkụ ọkụ nke na e nweghị oge itinye ihe na-eko achịcha n’ime ụtụ ọka ha gwọrọ agwọ ma chere ya ka o koo. (Ọpụpụ 12:34) N’oge ememe a a gaghị ahụ achịcha koro eko n’ụlọ onye Israel. A ga-egbu onye ọ bụla na-eme ememe ahụ, tinyere onye ọbịa, nke riri achịcha koro eko.—Ọpụpụ 12:19.
5. Olee ihe ùgwù a pụrụ ichetaworịị site n’ememe nke abụọ ahụ, oleekwa ndị a gụnyere n’ịṅụrị ọṅụ ahụ?
5 Ememe nke abụọ weere ọnọdụ izu asaa (ụbọchị 49) mgbe Nisan 16 gasịrị, ọ dabakwara n’ụbọchị nke isii nke ọnwa nke atọ, bụ́ Sivan, nke kwekọrọ ná ngwụsị nke May anyị. (Levitikọs 23:15, 16) A kpọrọ ya Ememe nke Izu Asaa nke Ụbọchị Asaa (n’ụbọchị Jisọs, a kpọkwara ya Pentikọst, nke pụtara “nke Iri Ise” na Grik), o wekwaara ọnọdụ na nso otu oge ahụ n’ime afọ mgbe Israel banyere n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 19:1, 2) N’oge ememe a, ọ pụrụ ịbụworịị na ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi tụgharịrị uche n’ihe ùgwù ha nke ịbụ ndị e doro iche dị ka mba dị nsọ nke Chineke. Ha ịbụ ndị pụrụ iche nye Chineke chọrọ nrubeisi n’Iwu Chineke, dị ka iwu nke igosipụta nlekọta ịhụnanya maka ndị ọ na-adịghị ka ọ hà ha ka ndị a kwa nwee ike ịnụ ụtọ ememe ahụ.—Levitikọs 23:22; Deuterọnọmi 16:10-12.
6. Olee ahụmahụ nke ememe nke atọ ahụ chetaara ndị Chineke?
6 A kpọrọ nke ikpeazụ n’ememe ukwu atọ ndị a a na-eme kwa afọ Ememe Nchịkọta, ma ọ bụ Ememe Ụlọ Ntu. O weere ọnọdụ n’ọnwa nke asaa, bụ́ Tishri, ma ọ bụ Etanim, malite n’ụbọchị nke 15 ruo n’ụbọchị nke 21, na-ekwekọ ná mmalite nke ọnwa October anyị. (Levitikọs 23:34) N’oge a, ndị nke Chineke biri n’èzí ma ọ bụ n’elu ụlọ ha n’ime ndo nwa oge (ụlọ ntu) e ji alaka na akwụkwọ osisi wuo. Nke a chetaara ha njem afọ 40 ha mere site n’Ijipt gaa n’Ala Nkwa ahụ, bụ́ mgbe mba ahụ na-aghaghị ịmụta ịdabere na Chineke maka ihe na-akpa ha kwa ụbọchị.—Levitikọs 23:42, 43; Deuterọnọmi 8:15, 16.
7. Olee otú anyị si erite uru site ná ntụleghachi nke ememe oriri n’Israel oge ochie?
7 Ka anyị tụleghachi ememe ụfọdụ ndị dị ịrịba ama n’akụkọ ihe mere eme nke ndị Chineke n’oge ochie. Nke a kwesịrị ịbụ ihe na-agba ume nye anyị taa, ebe a kpọkwara anyị òkù ịdị na-ezukọta ọnụ n’ụzọ chiri anya kwa izu na ugbo atọ n’afọ ná mgbakọ dị iche iche.—Ndị Hibru 10:24, 25.
N’oge Ndị Eze Si n’Eriri Devid
8. (a) Olee ememe wuru ewu e mere n’ụbọchị Eze Solomọn? (b) Mmezu dị ebube dị aṅaa nke Ememe Ụlọ Ntu ihe atụ ahụ ka anyị pụrụ ịtụ anya ya?
8 Otu ememe wuru ewu n’oge Ememe Ụlọ Ntu weere ọnọdụ n’oge ọchịchị nwere ihe ịga nke ọma nke Eze Solomọn, bụ́ nwa Devid. “Oké mkpọkọta ukwu” sitere na nsọtụ nile nke Ala Nkwa ahụ zukọta maka Ememe Ụlọ Ntu ahụ na nraranye nke ụlọ nsọ ahụ. (2 Ihe E Mere 7:8) Mgbe e mesịrị ya, Eze Solomọn zilagara ndị ahụ mere ememe, bụ ndị ‘gọziri eze, laa n’ụlọikwu ha na-aṅụrị ọṅụ, obi dịkwa ha mma, n’ihi ezi ihe nile nke Jehova meere Devid, bụ́ ohu Ya, nke O mekwaara Israel, bụ́ ndị Ya.’ (1 Ndị Eze 8:66) Nke ahụ bụ n’ezie ememe dị ịrịba ama. Taa, ndị ohu Chineke na-elepụ anya n’ihu ná mmezu dị ebube nke Ememe Ụlọ Ntu ihe atụ ahụ ná ngwụsị nke Ọchịchị Puku Afọ nke Solomọn Ka Ukwuu ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. (Mkpughe 20:3, 7-10, 14, 15) N’oge ahụ, ndị bi n’akụkụ nile nke ụwa, tinyere ndị e si n’ọnwụ kpọlite na ndị lanarịrị Amagedọn, ga-abụ ndị e jikọtara n’ọṅụ nke ofufe Jehova Chineke.—Zekaraịa 14:16.
9-11. (a) Gịnị dugara n’ememe dị ịrịba ama n’ụbọchị Eze Hezekaịa? (b) Olee ihe nlereanya nke ọtụtụ ndị sitere n’alaeze ebo iri nke ebe ugwu setịpụrụ, banyere gịnịkwa ka ọ na-echetara anyị taa?
9 E mere ememe ọzọ pụtara ìhè a kọrọ na Bible mgbe ịchịisi nke ajọ Eze Ehaz gasịrị, bụ́ onye mechiri ụlọ nsọ ahụ ma duba alaeze Juda ná ndapụ n’ezi ofufe. Onye nọchiri anya Ehaz bụ ezi Eze Hezekaịa. N’afọ mbụ nke ọchịchị ya, mgbe ọ dị afọ 25, Hezekaịa malitere oké usoro ihe omume nke mweghachi na mgbanwe. O meghere ụlọ nsọ ahụ ozugbo ma mee ndokwa maka ndozi ya. Mgbe ahụ eze ahụ zigaara ndị Israel bi n’alaeze ebo iri dị n’ebe ugwu nke Israel na-enweghị omume enyi akwụkwọ ozi, na-akpọ ha òkù ịbịa mee Ememe Ngabiga na Ememe Achịcha Na-ekoghị Eko. Ọtụtụ bịara n’agbanyeghị ịkwa emo nke ndị amaala ibe ha.—2 Ihe E Mere 30:1, 10, 11, 18.
10 Ememe ahụ ọ̀ gara nke ọma? Bible na-akọ, sị: “Ụmụ Israel ndị a hụrụ n’ime Jerusalem wee mee ememe achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa n’ọṅụ ukwu: ndị Livaị na ndị nchụàjà na-etokwa Jehova kwa ụbọchị, chịrị ihe na-adasi ụda ike na-eto Jehova.” (2 Ihe E Mere 30:21) Lee ihe nlereanya ọma ndị Israel ahụ setịpụụrụ ndị Chineke taa, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha na-anagide mmegide ma mee ogologo njem iji jee mgbakọ dị iche iche!
11 Dị ka ihe atụ, tụlee Mgbakọ Distrikti “Nsọpụrụ Chineke” atọ e mere na Poland na 1989. N’ime 166,518 ndị bịara bụ ìgwè buru ibu ndị si n’ebe bụbu Soviet Union na mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe ndị ọzọ bụ́ ebe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’oge ahụ. “Nye ụfọdụ ndị bịara mgbakọ ndị a,” ka akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdomb na-akọ, “ọ bụ nke mbụ ha na-anọ ná nnọkọ buru ibu nke ihe karịrị ndị Jehova 15 ma ọ bụ 20. Obi ha jupụtara n’ekele ka ha na-ekiri ọtụtụ iri puku ndị nọ n’ámá egwuregwu ndị ahụ, sonyere ha n’ekpere, ma jikọọ olu ha n’abụ otuto nye Jehova.”—Peji nke 279.
12. Gịnị dugara n’ememe dị ịrịba ama n’oge ọchịchị nke Eze Josaịa?
12 Mgbe ọnwụ Hezekaịa gasịrị, ndị Judia dabakwara ọzọ n’ofufe ụgha n’okpuru ndị Eze bụ́ Manase na Emọn. E mesịa nwee oge ọchịchị nke eze ọma ọzọ, bụ́ Josaịa na-eto eto, onye ji obi ike mee ihe n’iweghachi ezi ofufe. Mgbe ọ dị afọ 25, Josaịa nyere iwu ka e dozie ụlọ nsọ ahụ. (2 Ihe E Mere 34:8) Ka a na-eme ndozi ahụ, a chọtara n’ụlọ nsọ ahụ Iwu ahụ Mosis dere. Ihe Eze Josaịa gụtara n’ime Iwu Chineke kwaliri ya nke ukwuu, o mekwara ndokwa ka a gụọrọ ya ndị ahụ nile. (2 Ihe E Mere 34:14, 30) Mgbe ahụ, dị ka ihe e dere ede si dị, ọ haziri maka ime Ememe Ngabiga. Eze ahụ setịpụkwara ihe nlereanya ọma site n’ịtụnye ụtụ n’ụzọ mmesapụ aka maka ememe ahụ. N’ihi ya, Bible na-akọ, sị: “E meghịkwa ememe ngabiga dị ka nke a n’Israel site n’ụbọchị Samuel, bụ́ onye amụma.”—2 Ihe E Mere 35:7, 17, 18.
13. Banyere gịnị ka ememe oriri ndị nke Hezekaịa na Josaịa na-echetara anyị taa?
13 Mgbanwe ndị Hezekaịa na Josaịa mere yiri mweghachi dị ebube nke ezi ofufe bụ́ nke werewooro ọnọdụ n’etiti ezi ndị Kraịst kemgbe e mere ka Jisọs Kraịst nọkwasị n’ocheeze na 1914. Dị ka ọ dị karịsịa ná mgbanwe ndị nke Josaịa, mweghachi nke oge a adaberewokwa n’ihe e dere n’Okwu Chineke. N’iyikwa ụbọchị Hezekaịa na Josaịa, mweghachi nke oge a abụrụwo nke e ji mgbakọ dị iche iche bụ́ ebe e nyeworo nkọwa na-akpali akpali nke amụma Bible na ụzọ itinye ụkpụrụ Bible ndị bịara n’oge ha n’ọrụ kaa akara. Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị a na-eme baptism na-etinyekwu ihe n’ọṅụ nke oge ndị a a na-amụta ihe na ha. Dị ka ụmụ Israel chegharịrịnụ n’ụbọchị Hezekaịa na Josaịa, ndị ọhụrụ e mere baptism agbakụtala ajọ omume nile nke Krisendọm na akụkụ nile ọzọ nke ụwa Setan azụ. Na 1997 e mere ihe karịrị 375,000 baptism ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Chineke dị nsọ, bụ́ Jehova—nkezi nke ihe karịrị 1,000 kwa ụbọchị.
Mgbe Ibi n’Ala Ọzọ Gasịrị
14. Gịnị dugara n’ememe dị ịrịba ama na 537 T.O.A.?
14 Mgbe ọnwụ Josaịa gasịrị, mba ahụ chigharịkwuuru ofufe ụgha na-eweda n’ala ọzọ. N’ikpeazụ, na 607 T.O.A., Jehova tara ndị ya ahụhụ site n’idunye usuu ndị agha Babịlọn megide Jerusalem. E bibiri obodo ahụ na ụlọ nsọ ya, meekwa ka ala ahụ tọgbọrọ n’efu. Afọ 70 nke ndọrọ n’agha ndị Juu laa na Babilọn sochiri. Mgbe ahụ, Chineke tụteghachiri ihe fọdụrụ ná ndị Juu chegharịrịnụ, bụ́ ndị laghachiri n’Ala Nkwa ahụ iweghachi ezi ofufe. Ha bịarutere n’obodo Jerusalem ahụ e bibiri ebibi n’ọnwa nke asaa nke afọ 537 T.O.A. Ihe mbụ ha mere bụ iwu ebe ịchụàjà iji na-achụ àjà mgbe nile kwa ụbọchị dị ka e depụtara n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Nke ahụ bụ kpọmkwem n’ezi oge maka ememe ọzọ mere ihe akụkọ. “Ha wee mee ememe ụlọ ntu, dị ka e deworo ya.”—Ezra 3:1-4.
15. Ọrụ dị aṅaa dị n’ihu ihe fọdụrụ ahụ e weghachiri na 537 T.O.A., oleekwa otú ọnọdụ yiri nke ahụ si dị na 1919?
15 Ọrụ dị ukwuu dị n’ihu ndị a si n’ala ọzọ lọghachi—mwughachi nke ụlọ nsọ Chineke na nke Jerusalem na mgbidi ya nile. E nwetara mmegide dị ukwuu site n’aka ndị agbata obi na-ekwo ekworo. Mgbe a na-ewu ụlọ nsọ ahụ, ọ bụ “ụbọchị ihe nta.” (Zekaraịa 4:10) Ọnọdụ ahụ yiri ọnọdụ nke ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ na 1919. N’afọ ahụ kwesịrị ncheta, a tọhapụrụ ha site ná ndọrọ n’agha ime mmụọ na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ọnụ ọgụgụ ha dị nanị puku ole na ole, ha chekwara ụwa na-enweghị omume enyi ihu. Ndị iro Chineke hà pụrụ ịkwụsị ọganihu nke ezi ofufe? Azịza nye ajụjụ ahụ na-echetara anyị ememe oriri abụọ ikpeazụ e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.
16. Gịnị dị ịrịba ama banyere otu ememe e mere na 515 T.O.A.?
16 E mesịrị wughachi ụlọ nsọ ahụ n’ọnwa Adar na 515 T.O.A., kpọmkwem n’ezi oge maka ememe oge opupu ihe ubi Nisan. Bible na-akọ, sị: “Ha wee were ọṅụ mee ememe achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa: n’ihi na Jehova mere ka ha ṅụrịa ọṅụ, O mekwara ka obi eze Asiria chigharịa n’ebe ha nọ, ime ka aka ha dị ike n’ije ozi nke ụlọ Chineke, bụ́ Chineke Israel.”—Ezra 6:22.
17, 18. (a) Olee ememe dị ịrịba ama e mere na 455 T.O.A.? (b) Olee otú anyị si nọrọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ taa?
17 Afọ 60 ka e mesịrị, na 455 T.O.A., e mere ihe ọzọ dị ịrịba ama. Ememe Ụlọ Ntu n’afọ ahụ kara akara ngwụsị nke mwughachi mgbidi Jerusalem. Bible na-akọ, sị: “Mkpọkọta ahụ nile nke ndị na-alata site ná ndọta n’agha ahụ mere ụlọ ntu, wee nọdụ n’ụlọ ntu ha: n’ihi na ụmụ Israel emeghị otú a site n’ụbọchị [Joshua] nwa Nun ruo ụbọchị ahụ. Oké ọṅụ dị ukwuu wee dị.”—Nehemaịa 8:17.
18 Lee mweghachi kwesịrị ncheta nke ezi ofufe Chineke nke a bụ n’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ! Ọnọdụ dị taa yiri nke ahụ. N’agbanyeghị ọtụtụ mkpagbu na mmegide, ọrụ ukwu ahụ nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke eruwo na nsọtụ nile nke ụwa, a kpọsawokwa ozi ikpe Chineke n’ebe nile. (Matiu 24:14) Ịka akara ikpeazụ nke ihe ahụ fọdụrụ na 144,000 e tere mmanụ na-eru nso. A chịkọbatawo ihe karịrị nde ise nke “atụrụ ọzọ” bụ́ ndị enyi ha site ná mba nile ịghọ “otu ìgwè atụrụ” ha na ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ. (Jọn 10:16; Mkpughe 7:3, 9, 10) Lee mmezu dị ebube nke ihe atụ amụma nke Ememe Ụlọ Ntu nke a bụ! Ọrụ nchịkọbata ukwu a ga-adịrị banye n’ụwa ọhụrụ ahụ bụ́ mgbe a ga-akpọ ọtụtụ ijeri nke ndị a kpọlitere n’ọnwụ òkù isonye n’ime Ememe Ụlọ Ntu ihe atụ ahụ.—Zekaraịa 14:16-19.
Na Narị Afọ Mbụ O.A.
19. Gịnị mere ka Ememe Ụlọ Ntu na 32 O.A. pụọ iche?
19 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ememe ndị Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, jere so n’ememe ndị kasị pụta ìhè e dekọrọ n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, tụlee ojije Jisọs jere Ememe Ụlọ Ntu (ma ọ bụ, Ụlọikwuu) n’afọ 32 O.A. O jiri oge ahụ kụzie eziokwu ndị dị mkpa ma kwadoo ozizi ya site n’ihota ihe site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Jọn 7:2, 14, 37-39) Omenala nke ịmụnye ọkụ n’ihe ndọba oriọna ukwu anọ ndị dị n’ogige ime nke ụlọ nsọ ahụ bụ nke a na-emechi anya n’ememe a. Nke a tụnyere ụtụ n’ịnụ ụtọ nke ihe omume nile nke ememe ahụ nke na-adịru ime abalị. O yiri ka Jisọs zoro aka n’ìhè ukwu ndị a mgbe ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ Ìhè nke ụwa: onye na-eso m agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ ga-enwe Ìhè nke ndụ.”—Jọn 8:12.
20. N’ihi gịnị ka Ememe Ngabiga na 33 O.A. ji pụọ iche?
20 Mgbe ahụzi Ememe Ngabiga na Ememe Achịcha Na-ekoghị Eko nke afọ ahụ dị ịrịba ama bụ́ 33 O.A. eruo. N’Ụbọchị Ememe Ngabiga ahụ, ndị iro Jisọs gburu ya, ọ ghọkwara Nwa Atụrụ ihe atụ nke Ememe Ngabiga ahụ, onye nwụrụ iji bupụ “mmehie nke ụwa.” (Jọn 1:29; 1 Ndị Kọrint 5:7) Ụbọchị atọ ka e mesịrị, na Nisan 16, Chineke kpọlitere Jisọs n’ọnwụ na-enye ya ahụ mmụọ na-adịghị anwụ anwụ. Nke a na ịchụ àjà nke mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi barley dabakọrọ dị ka Iwu ahụ si kwuo. Onyenwe anyị bụ́ Jisọs Kraịst si otú a ghọọ “mkpụrụ mbụ nke ndị daworo n’ụra ọnwụ.”—1 Ndị Kọrint 15:20.
21. Gịnị mere na Pentikọst 33 O.A.?
21 Ememe pụtara ìhè n’ezie bụ Pentikọst na 33 O.A. N’ụbọchị a, ọtụtụ ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu zukọrọ na Jerusalem, tinyere ihe dị ka ndị na-eso ụzọ 120 nke Jisọs. Ka ememe ahụ na-aga n’ihu, Onyenwe Anyị Jisọs Kraịst ahụ a kpọlitere n’ọnwụ wụsara mmadụ 120 ahụ mmụọ nsọ Chineke. (Ọrụ 1:15; 2:1-4, 33) Ha si otú a bụrụ ndị e tere mmanụ wee ghọọ mba ọhụrụ Chineke họpụtara site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke Jisọs Kraịst bụ onye ogbugbo ya. N’oge ememe ahụ, onyeisi nchụàjà ndị Juu chụrụ ógbè achịcha abụọ koro eko e si ná mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ọka wheat mee n’àjà nye Chineke. (Levitikọs 23:15-17) Ógbè achịcha ndị a koro eko na-ese onyinyo mmadụ 144,000 na-ezughị okè bụ́ ndị Jisọs ‘gbataara Chineke’ ije ozi dị ka ‘alaeze na ndị nchụàjà . . . ịbụ eze n’elu ụwa.’ (Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 3) A pụkwara iji ógbè achịcha koro eko abụọ ndị ahụ mee ihe atụ nke eziokwu bụ́ na ndị ọchịchị eluigwe a sitere n’alaka abụọ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie, bụ́ ndị Juu na ndị Jentaịl.
22. (a) Gịnị mere ndị Kraịst adịghị eme ememe ndị dị n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
22 Mgbe ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malitere ịdị irè na Pentikọst 33 O.A., ọ pụtara na ọgbụgba ndụ Iwu ochie ahụ abaghịkwa uru n’anya Chineke. (2 Ndị Kọrint 3:14; Ndị Hibru 9:15; 10:16) Nke ahụ apụtaghị na ndị Kraịst e tere mmanụ enweghị iwu. Ha nọ n’okpuru iwu Chineke nke Jisọs Kraịst kụziri, nke e dekwara n’obi ha. (Ndị Galetia 6:2) Ya mere, ndị Kraịst adịghị eme ememe atọ ndị ahụ a na-eme kwa afọ, ebe ha bụ akụkụ nke ọgbụgba ndụ Iwu ochie ahụ. (Ndị Kọlọsi 2:16, 17) Otú o sina dị, anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’àgwà nke ndị ohu Chineke tupu oge ndị Kraịst n’ebe ememe ha na nzukọ ndị ọzọ maka ofufe dị. N’isiokwu anyị na-esonụ, anyị ga-atụle ihe atụ ndị ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ha ga-akwali mmadụ nile ịghọta mkpa ọ dị ịdị na-anọ mgbe nile ná mgbakọ nke ndị Kraịst.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Leekwa Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, Mpịakọta nke 1, peji nke 820, kọlụm nke 1, paragraf nke 1 na 3, n’okpuru isiokwu bụ́ “Festival [Ememe].”
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ Nzube dị aṅaa ka ememe ukwu atọ nke Israel mezuru?
◻ Gịnị kara ememe ndị nke ụbọchị Hezekaịa na Josaịa akara?
◻ Gịnị bụ ihe dị ịrịba ama e mere ememe ya na 455 T.O.A., n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ ihe agbamume nye anyị?
◻ Gịnị dị ịrịba ama banyere Ememe Ngabiga na Pentikọst na 33 O.A.?
[Igbe dị na peeji nke 12]
Ihe Mmụta Sitere n’Ememe Maka Anyị Taa
Ndị nile ga-erite uru n’ụzọ na-adịgide adịgide site n’àjà mkpuchi mmehie Jisọs aghaghị ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Ememe Achịcha Na-ekoghị Eko na-ese onyinyo ya. Ememe ihe atụ a bụ ememe ọṅụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ maka mgbapụta ha pụọ n’ajọ ụwa nke a nakwa ntọpụ ha pụọ n’amamikpe nke mmehie site n’ihe mgbapụta Jisọs. (Ndị Galetia 1:4; Ndị Kọlọsi 1:13, 14) Ememe nkịtị ahụ dịruru ụbọchị asaa—ọnụ ọgụgụ e ji mee ihe n’ime Bible iji mee ihe atụ izu ezu ime mmụọ. Ememe ihe atụ ahụ na-adịru n’oge dum ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ ga-adịru n’elu ala, a ghaghịkwa iji “ịdị ọcha na eziokwu” mee ya. Nke ahụ pụtara ịnọ na nche mgbe nile megide ihe iko achịcha ihe atụ. E jiri ihe iko achịcha mee ihe n’ime Bible ise onyinyo nkụzi rụrụ arụ, ihu abụọ, na ịdị njọ. Ndị na-efe Jehova ezi ofufe aghaghị igosi ịkpọasị maka ihe iko achịcha dị otú ahụ, ghara ikwe ka o mebie ndụ ha onwe ha, gharakwa ikwe ka o mebie ịdị ọcha nke ọgbakọ ndị Kraịst.—1 Ndị Kọrint 5:6-8; Matiu 16:6, 12.
[Foto dị na peeji nke 9]
A na-achụ ùkwù barley ọhụrụ e wetara n’ubi n’àjà kwa afọ na Nisan 16, bụ́ ụbọchị a kpọlitere Jisọs n’ọnwụ
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Jisọs pụrụ izoworị aka n’ìhè ememe ahụ mgbe ọ kpọrọ onwe ya “Ìhè nke ụwa”