Mgbukepụ nke Ìhè—Ndị Ukwu na Ndị Nta Akụkụ nke Abụọ
“N’ìhè Gị ka anyị na-ahụ ìhè.”—ABỤ ỌMA 36:9.
1. Mgbalị mbụ dị aṅaa ka e mere iji ghọta ihe atụ nke akwụkwọ Mkpughe?
AKWỤKWỌ Bible bụ́ Mkpughe akpaliwo mmasị ndị Kraịst malite n’oge mbụ. Ọ na-enye ihe atụ dị mma banyere otú ìhè nke eziokwu si enwu nke ọma karị. Na 1917, ndị Jehova bipụtara nkọwa nke Mkpughe n’akwụkwọ bụ́ The Finished Mystery. O jiri atụghị egwu kpughee ndị ndú okpukpe Krisendọm na ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma e sitere n’ebe ndị ọzọ nweta ọtụtụ n’ime nkọwa ya dị iche iche. Otú o sina dị, akwụkwọ The Finished Mystery jere ozi ịnwale iguzosi ike n’ihe nke Ndị Mmụta Bible ahụ nye ụzọ ahụ a na-ahụ anya nke Jehova ji na-eme ihe.
2. Isiokwu ahụ bụ́ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ” nyere ihe ọmụma dị aṅaa n’akwụkwọ Mkpughe?
2 Mgbukepụ ìhè na-adọrọ mmasị wakwasịrị akwụkwọ Mkpughe site ná mbipụta nke isiokwu ahụ bụ́ “Ọmụmụ nke Mba Ahụ” n’Ụlọ Nche nke March 1, 1925 (Bekee). E chewo na Mkpughe isi nke 12 kọwara agha nke dị n’etiti Rom nke ndị na-agọ mmụọ na Rom nke popu, ebe nwa nwoke ahụ na-anọchi anya ịchịisi popu. Ma isiokwu ahụ gosiri na Mkpughe 11:15-18 nwere ihe jikọrọ ya na ihe isi nke 12 pụtara, na-egosi na o metụtara ọmụmụ nke Alaeze Chineke.
3. Mbipụta ndị dị aṅaa mụkwasịrị ìhè e mere ka ọ baa ụba ná Mkpughe?
3 Ihe a nile dujere ná nghọta doro anya nke ukwuu karị nke Mkpughe nke bịara site ná mbipụta nke akwụkwọ bụ́ Light, ná mpịakọta abụọ, na 1930. Nnụcha ndị ọzọkwa pụtara n’akwụkwọ “Babylon the Great Has Fallen!” God’s Kingdom Rules! (1963) na “Then Is Finished the Mystery of God” (1969). Otú ọ dị, a ka nwekwara ihe ndị ọzọ a ga-amụ banyere akwụkwọ amụma ahụ bụ́ Mkpughe. Ee, ìhè ndị ọzọ na-enwu nke ọma karị wakwasịrị ya na 1988, site ná mbipụta nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! A pụrụ ịsị na ihe bụ isi ihe dị n’azụ ihe ọmụma nke a na-aga n’ihu n’ihu bụ eziokwu ahụ bụ́ na amụma nke Mkpughe na-enwe mmezu “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” bụ́ nke malitere na 1914. (Mkpughe 1:10) N’ihi ya a ga-aghọta akwụkwọ Mkpughe n’ụzọ doro anya karị ka oge na-aga n’ihu.
E Mee Ka A Ghọta “Ike Ndị Ka Elu”
4, 5. (a) Olee otú Ndị Mmụta Bible si lee Ndị Rom 13:1 anya? (b) Olee ihe e mesịrị hụ na ọ bụ ọnọdụ nke Akwụkwọ Nsọ banyere “ike ndị ka elu”?
4 Na 1962 a hụrụ mgbukepụ ìhè na-enwu nke ọma n’ihe banyere Ndị Rom 13:1, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ike ndị ka elu [“ndị ọchịchị ka elu,” New World Translation].” (King James Version) Ndị Mmụta Bible mbụ ghọtara na “ike ndị ka elu” a kpọtụrụ aha n’ebe ahụ na-ezo aka n’ebe ndị ọchịchị bụ́ ndị ụwa nọ. Ha ghọtara akụkụ akwụkwọ nsọ nke a ịpụta na ọ bụrụ na e jide onye Kraịst n’oge agha, iwu ji ya iyikwasị uwe ndị agha, iburu égbè, na ịga n’ihu agha, ịba n’ime ala e gwuuru ndị agha. E chere na ebe ọ bụ na ndị Kraịst apụghị igbu mmadụ ibe ha, ọ ga-abụ onye a rụgidere ịgbanye égbè ya n’ime ikuku ma ọ bụrụ na ọnọdụ kasị njọ adapụta.a
5 Ụlọ Nche nke January 1 na nke February 1, 1964, mụkwasịrị ìhè na-enwu nke ọma n’isiokwu ahụ n’ịtụle okwu ndị ahụ nke Jisọs na Matiu 22:21: “Nyeghachikwanụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” Okwu ndị ozi ahụ dị n’Ọrụ Ndị Ozi 5:29 bara uru: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” Ndị Kraịst nọ n’okpuru Siza—“ike ndị ka elu”—nanị ma ọ bụrụ na nke a adịghị achọ ka onye Kraịst mee ihe megidere iwu Chineke. A hụrụ na ịnọ n’okpuru Siza bụ ihe a kpaara ókè, ọ bụghị nke a na-akparaghị ókè. Ndị Kraịst na-enyeghachi Siza nanị ihe na-emegideghị ihe ndị Chineke chọrọ. Lee ihe na-eju afọ ọ bụ inwe nghọta doro anya n’isiokwu ahụ!
Mgbukepụ nke Ìhè n’Okwu Ndị Metụtara Nzukọ
6. (a) Iji zere ọdịdị inwe ọkwá nke jupụtara na Krisendọm, ụkpụrụ dị aṅaa ka a nakweere? (b) N’ikpeazụ gịnị ka a hụrụ dị ka ụzọ ziri ezi isi họrọ ndị na-elekọta ọgbakọ?
6 E nwere ajụjụ banyere ndị kwesịrị ije ozi dị ka ndị okenye na ndị dikin n’ime ọgbakọ. Iji zere ọdịdị nke inwe ọkwá bụ́ nke jupụtara na Krisendọm, e kwubiri na e kwesịrị ịhọpụta ndị a n’ụzọ ọchịchị onye kwuo uche ya site ná ntụliaka elu nke ndị òtù nke ọgbakọ ọ bụla. Ma ìhè na-aba ụba nke dị n’Ụlọ Nche (Bekee) nke September 1 na nke October 15, 1932, gosiri na Akwụkwọ Nsọ adịghị enye ihe mgbakwasị ụkwụ maka iji ntụliaka elu họpụta ndị okenye. Ya mere e ji kọmitii ije ozi dochie ndị a, Society wee họrọ onye nduzi ije ozi.
7. Ọganihu ndị dị aṅaa ka mgbukepụ nke ìhè rụpụtara n’ụzọ e si ahọpụta ndị ohu n’ọgbakọ?
7 Ụlọ Nche (Bekee) nke June 1 na nke June 15, 1938, nwere mgbukepụ nke ìhè na-egosi na ndị ohu n’ime ọgbakọ gaje ịbụ ndị a họpụtara ahọpụta, ya bụ, ndị a họpụtara n’ụzọ nke ọchịchị Chineke, kama ịbụ ndị e ji ntụliaka elu họpụta. Na 1971, mgbukepụ ìhè ọzọ gosiri na nanị otu onye ohu ọgbakọ agajeghị iduzi ọgbakọ nke ọ bụla. Kama nke ahụ, nke ọ bụla kwesịrị inwe otu òtù ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta, bụ́ nke ndị Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova kenyere ọrụ. Ya mere site n’ìhè na-aba ụba kemgbe ihe dị ka 40 afọ, ọ ghọrọ ihe doro anya na ndị okenye tinyere ndị dikin, ndị a maara ugbu a dị ka ndị ohu na-eje ozi, kwesịrị ịbụ ndị a họpụtara site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” site n’aka Òtù Na-achị Isi ya. (Matiu 24:45-47) Nke a kwekọrọ n’ihe weere ọnọdụ n’oge ndị ozi. A họpụtara ndị ikom dị ka Timoti na Taịtọs site n’aka òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ. (1 Timoti 3:1-7; 5:22; Taịtọs 1:5-9) Ihe a nile bụ ná mmezu na-adọrọ mmasị nke Aịsaịa 60:17: “N’ọnọdụ ọla M ga-eweta ọlaọcha, n’ọnọdụ ígwè M ga-eweta ọla, n’ọnọdụ nkume M ga-eweta ígwè: M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka [ndị na-ekenye gị ọrụ, NW] ghọọ ezi omume.”
8. (a) Eziokwu na-aba ụba wetara ọganihu dị aṅaa n’ụzọ Society si arụ ọrụ? (b) Olee kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi, gịnị bụkwa akụkụ dị iche iche nke ọrụ ma ọ bụ nlekọta anya ha n’otu n’otu?
8 E nwekwara okwu banyere ịrụ ọrụ nke Watch Tower Society. Ruo ọtụtụ afọ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na òtù ndị nduzi nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania bụ otu ihe ahụ, n’ụzọ buru ibu okwu kasị nọrọ n’aka onye isi oche ya. Dị ka e gosiri na 1977 Yearbook of Jehovah’s Witnesses (peji nke 258-259), na 1976 Òtù Na-achị Isi malitere iji kọmitii isii na-arụ ọrụ, nke ọ bụla nwere ọrụ e kenyere ya maka akụkụ ụfọdụ nke ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Kọmitii Ndị Ọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ndị ọrụ, na-agụnye ọdịmma nke ndị nile na-eje ozi n’ezinụlọ Betel zuru ụwa ọnụ. Kọmitii Mbipụta na-ahụ maka ihe nile metụtara ndị nọ n’èzí na okwu iwu, dị ka ihe onwunwe na obibi akwụkwọ. Kọmitii Ije Ozi na-ahụ maka ọrụ ịgba àmà ma na-elekọta ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ọsụ ụzọ, na ọrụ dị iche iche nke ndị nkwusa ọgbakọ. Kọmitii Izi Ihe na-ahụ maka nzukọ nile nke ọgbakọ, ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, mgbakọ sekit, na mgbakọ distrikti na nke mba nile tinyere ụlọ akwụkwọ dị iche iche maka ihe ọmụmụ ime mmụọ nke ndị Chineke. Kọmitii Ihe Odide na-ahụ maka nkwadebe na nsụgharị nke mbipụta dị iche iche n’ụdị nile, na-ejide n’aka na ihe nile kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. Kọmitii Onye Isi Oche na-elekọta ọnọdụ mberede dị iche iche na okwu ndị ọzọ chọrọ ime ihe ngwa ngwa.b Ọzọkwa n’afọ ndị 1970, otu kọmitii kama ịbụ onye nlekọta malitere iduzi alaka dị iche iche nke Watch Tower Society.
Ìhè nke Na-emetụta Àgwà Ndị Kraịst
9. Olee otú ìhè nke eziokwu si metụta mmekọrịta dị n’etiti ndị Kraịst na gọọmenti dị iche iche nke ụwa?
9 Ọtụtụ mgbukepụ nke ìhè abụrụwo banyere àgwà ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, tụlee okwu banyere nnọpụiche. Kpọmkwem otu mgbukepụ ìhè na-enwu nke ọma nyere ìhè n’okwu nke a n’isiokwu bụ́ “Nnọpụiche” nke pụtara n’Ụlọ Nche nke November 1, 1939 (Bekee). Lee nnọọ ka o si bịa n’ezi oge, na-abịa nnọọ mgbe mmalite nke Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị! Isiokwu ahụ kọwara nnọpụiche ma gosi na ndị Kraịst agaghị etinye aka ma ọlị n’okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’esemokwu dị n’etiti mba dị iche iche. (Maịka 4:3, 5; Jọn 17:14, 16) Nke a bụ ihe kpatara mba nile ji kpọọ ha asị. (Matiu 24:9) Agha dị iche iche nke Israel oge ochie eguzobeghị nzọụkwụ maka ndị Kraịst, dị ka Jisọs mere ka o doo anya na Matiu 26:52. Ọzọkwa, ọ dịghị otu mba ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ nke ọchịchị Chineke, nke Chineke na-achị, dị ka ọ dị Israel oge ochie.
10. Gịnị ka mgbukepụ nke ìhè kpughere banyere ụzọ ndị Kraịst kwesịrị isi lee ọbara anya?
10 Ìhè mụkwasịkwara n’ịdị nsọ nke ọbara. Ụfọdụ Ndị Mmụta Bible chere na mmachibido a machibidoro iri ọbara n’Ọrụ Ndị Ozi 15:28, 29, bụ nanị maka ndị Kraịst bụ́ ndị Juu. Otú ọ dị, Ọrụ Ndị Ozi 21:25 na-egosi na n’oge ndị ozi iwu nke a metụtakwara ndị mba ọzọ ghọrọ ndị kwere ekwe. Ya mere ịdị nsọ nke ọbara metụtara ndị Kraịst nile, dị ka e gosiri n’Ụlọ Nche July 1, 1945 (Bekee). Nke ahụ pụtara ọ bụghị nanị ịjụ iri ọbara anụmanụ, dị ka na ngwọngwọ ọbara, kamakwa ịhapụ ọbara mmadụ, dị ka n’ihe banyere mmịnye ọbara.
11. Gịnị ka a hụrụ banyere ụzọ ndị Kraịst si ele iji ụtaba eme ihe anya?
11 Dị ka ihe si n’ịba ụba nke ìhè pụta, àgwà ndị a na-agbarụrụ nanị ihu na mbụ bụ ihe ndị e mesịrị lee anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka mmehie ndị dị oké njọ. Otu ihe atụ banyere nke a bụ n’ihe banyere iji ụtaba eme ihe. N’ime Zion’s Watch Tower nke August 1, 1895, Nwanna Russell dọọrọ uche gaa ná 1 Ndị Kọrint 10:31 na 2 Ndị Kọrint 7:1 ma dee, sị: “Apụghị m ịhụ otú ọ ga-esi nye Chineke otuto, ma ọ bụ maka abamuru ya, onye Kraịst ọ bụla iji ụtaba mee ihe n’ụdị ọ bụla.” Kemgbe 1973 a ghọtawo ya n’ụzọ doro anya na ọ dịghị onye ọ bụla na-eji ụtaba eme ihe pụrụ ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Na 1976 e mere ka o doo anya na ọ dịghị Onyeàmà ọ bụla pụrụ ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ịgba chaa chaa ma nọgide n’ime ọgbakọ.
Nnụcha Ndị Ọzọ
12. (a) Gịnị ka otu mgbukepụ nke ìhè kpughere banyere ọnụ ọgụgụ mkpịsị ugodi nke Alaeze e nyere Pita? (b) Olee n’ọnọdụ ndị Pita jiri mkpịsị ugodi nke ọ bụla mee ihe?
12 E nwewokwa ìhè bara ụba n’ọnụ ọgụgụ nke mkpịsị ugodi Jisọs nyere Pita. Ndị Mmụta Bible chere na Pita natara mkpịsị ugodi abụọ ndị mepere ụzọ maka ndị mmadụ ịghọ ndị nketa nke Alaeze—otu maka ndị Juu, bụ́ nke e jiri mee ihe na Pentikọst 33 O.A., na nke ọzọ maka ndị Jentaịl, nke e jiri mee ihe nke mbụ ya na 36 O.A. mgbe Pita mere nkwusa nye Kọniliọs. (Ọrụ 2:14-41; 10:34-48) Ka oge na-aga, a hụrụ na e nwere ìgwè nke atọ ọ gụnyere—ndị Sameria. Pita jiri mkpịsị ugodi nke abụọ mee ihe mgbe ọ na-emeghere ha ohere maka Alaeze ahụ. (Ọrụ 8:14-17) Otú a, e jiri mkpịsị ugodi nke atọ mee ihe mgbe Pita mere nkwusa nye Kọniliọs.—Ụlọ Nche, April 1, 1980, peji nke 19-25, 29.
13. Gịnị ka mgbukepụ nke ìhè kpughere banyere ìgwè atụrụ ndị ahụ a kpọtụrụ aha na Jọn isi nke 10?
13 Site n’ìhè ọzọ, a hụrụ na Jisọs zoro aka ọ bụghị n’ìgwè atụrụ abụọ kama n’atọ. (Jọn, isi nke 10) Ndị a bụ (1) ìgwè atụrụ nke ndị Juu nke ọ bụ Jọn Onye Na-eme Baptism bụ onye nche ọnụ ụzọ ya, (2) ìgwè nke ndị nketa Alaeze e tere mmanụ, na (3) ìgwè nke “atụrụ ọzọ,” ndị nwere olileanya elu ala.—Jọn 10:2, 3, 15, 16; Ụlọ Nche, August 15, 1984, peji nke 10-20.
14. Olee otú ìhè e mere ka ọ baa ụba si mee ka ihe doo anya banyere mmalite nke ihe Jubile sere onyinyo ya?
14 Nghọta nke ihe Jubile sere onyinyo ya nwetakwara ụfọdụ ihe ido anya. N’okpuru Iwu ahụ, kwa 50 afọ ọ bụla bụ Jubile ukwu, nke ọ bụ n’ime ya ka a na-eweghachiri ndị nwe ihe ihe ha. (Levitikọs 25:10) Ruo ogologo oge a ghọtara na nke a sere onyinyo Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. Otú ọ dị, n’oge ndị na-etechabeghị anya gara aga a hụrụ na ihe Jubile sere onyinyo ya malitere n’ezie na Pentikọst 33 O.A., mgbe a tọpụrụ ndị ahụ na-anata mmụọ nsọ ahụ a wụpụrụ n’agbụ nke ọgbụgba ndụ Iwu Mosis.—Ụlọ Nche, January 1, 1987, peji nke 18-28.
Ìhè E Mere Ka Ọ Baa Ụba n’Okwu Ndị E Ji Eme Ihe
15. Ìhè dị aṅaa ka a mụkwasịworo n’ojiji e ji okwu ahụ bụ́ “atụmatụ” eme ihe?
15 “Onye mkpọkọta chọrọ ịchọpụta okwu nile na-atọ ụtọ, na ihe e deziri edezi, bụ́ okwu nile nke eziokwu.” (Eklisiastis 12:10) A pụrụ iji okwu ndị a mee ihe n’isiokwu anyị ji n’aka ugbu a, n’ihi na ìhè amụkwasịwo ọ bụghị nanị n’ihe ndị dị mkpa dị ka ozizi na omume kamakwa n’okwu ndị Kraịst ji eme ihe na izi ezi nke ihe ndị ha pụtara. Dị ka ihe atụ, n’etiti Ndị Mmụta Bible, otu n’ime mbipụta ndị a kasị hụ n’anya bụ mpịakọta mbụ nke Studies in the Scriptures, nke a kpọrọ The Divine Plan of the Ages. Otú ọ dị, ka oge na-aga, a ghọtara na Okwu Chineke na-ekwu banyere nanị ndị mmadụ dị ka ndị na-eme atụmatụ. (Ilu 19:21) Ọ dịghị mgbe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu okwu banyere Chineke ime atụmatụ. Ọ dịghị ya mkpa ime atụmatụ. Ihe ọ bụla o zubere ga-enwerịrị ihe ịga nke ọma n’ihi amamihe na ike ya na-enweghị njedebe, ọbụna dị ka anyị na-agụ ná Ndị Efesọs 1:9, 10: “Dị ka ọ dị Ya ezi mma, bụ́ ihe O zubere n’ime Ya, ruo ọchịchị ezinụlọ nke ozuzu oge a kara aka.” Ya mere nwayọọ nwayọọ a hụrụ na okwu ahụ bụ́ “nzube” bụ nke ka kwesị ekwesị mgbe a na-ezo aka n’ebe Jehova nọ.
16. Gịnị ka e ji nwayọọ nwayọọ hụ dị ka nghọta ziri ezi nke Luk 2:14?
16 Mgbe ahụ e nwere okwu banyere inweta nghọta doro anya nke Luk 2:14. Dị ka ọ dị na King James Version, ọ na-agụ, sị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu, udo dịkwa n’elu ụwa, ihu ọma n’ebe ndị mmadụ nọ.” A hụrụ na nke a egosipụtaghị echiche ziri ezi, n’ihi na a dịghị egosipụta ihu ọma Chineke n’ebe ndị ajọ omume nọ. N’ihi ya Ndịàmà lere nke a anya dị ka okwu banyere udo n’ebe ụmụ mmadụ nọ bụ́ ndị nwere ihu ọma n’ebe Chineke nọ. Ya mere ha nọgidere na-ezo aka n’ebe ndị nwere mmasị na Bible nọ dị ka ndị nwere ihu ọma. Ma mgbe ahụ a ghọtara na ihe ọ gụnyere bụ ihu ọma, ọ bụghị n’akụkụ ụmụ mmadụ, kama n’akụkụ Chineke. N’ihi ya, ntụaka ala ala peji nke New World Translation na Luk 2:14 na-ekwu banyere “ndị ọ [Chineke] na-anwapụta.” Ndị Kraịst nile na-ebi ndụ kwekọrọ na nkwa nraranye ha nwere ihu ọma Chineke.
17, 18. Gịnị ka Jehova ga-ewepụ n’ụta, gịnịkwa ka ọ ga-edo nsọ?
17 N’otu aka ahụ, ruo ogologo oge, Ndịàmà kwuru okwu banyere iwepụ aha Jehova n’ụta. Ma ọ̀ dịwo mgbe Setan rụrụ aha Jehova ụka? Banyere nke ahụ, ọ̀ dị ndị ọrụ ọ bụla nke Setan meworo otú a, dị ka à ga-asị na o rughịrị Jehova inwe aha ahụ? Ee e, ọ dịghị ma ọlị. Ọ bụghị aha Jehova ka a mara aka na nke ọ dị mkpa iwepụ n’ụta. Ọ bụ n’ihi nke ahụ mere mbipụta ndị ọhụrụ nke Watch Tower Society adịghị ekwu okwu banyere aha Jehova ịbụ nke e wepụrụ n’ụta. Ha na-ekwu okwu banyere ịchịisi Jehova ịbụ nke e wepụrụ n’ụta na aha ya ịbụ nke e doro nsọ. Nke a kwekọrọ n’ihe Jisọs gwara anyị ikpe n’ekpere, sị: “Ka e doo aha Gị nsọ.” (Matiu 6:9) Ọtụtụ mgbe, Jehova kwuru na ya ga-edo aha ya nsọ, bụ́ nke ndị Israel na-amabeghị aka kama ha edoghị ya nsọ.—Ezikiel 20:9, 14, 22; 36:23.
18 N’ụzọ na-adọrọ mmasị, na 1971, akwụkwọ bụ́ The Nations Shall Know That I Am Jehovah”—How? mere ka e nwee ọdịiche nke a: “Jisọs Kraịst na-alụ ọgụ . . . maka iwepụ Ịchịisi eluigwe na ụwa nke Jehova n’ụta na maka inye aha Jehova otuto.” (Peji nke 364-365) Na 1973, akwụkwọ bụ́ God’s Kingdom of a Thousand Years Has Approached kwuru, sị: “‘Mkpagbu ukwu’ ahụ na-abịanụ bụ oge Jehova Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ga-ewepụ ịchịisi eluigwe na ụwa ya n’ụta na iji doo aha ya dị oké ọnụ ahịa nsọ.” (Peji nke 409) Mgbe ahụ, na 1975, akwụkwọ bụ́ Man’s Salvation Out Of World Distress at Hand! kwuru, sị: “Mgbe ahụ ihe omume kasịnụ nke akụkọ ihe mere eme nke eluigwe na ụwa ga-abụ nke e mezuworo, mwepụ n’ụta nke ịchịisi eluigwe na ụwa nke Jehova na ido aha nsọ ya nsọ.”—Peji nke 281.
19, 20. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ekele anyị maka mgbukepụ nke ìhè ime mmụọ?
19 Lee ihe ngọzi ọ bụụrụ ndị Jehova inwe ọṅụ n’ime ìhè ime mmụọ nile nke a! N’ụzọ dị nnọọ iche, okwu nke a nke onye ụkọchukwu kwuru na-egosi ọchịchịrị ime mmụọ nke ndị ndú Krisendọm chọtaworo onwe ha n’ime ya: “N’ihi gịnị ka e ji nwee mmehie? N’ihi gịnị ka e ji nwee ntaramahụhụ? N’ihi gịnị ka e ji nwee ekwensu? Ihe ndị a bụ ajụjụ m chọrọ ịjụ Onyenwe anyị mgbe m gara eluigwe.” Ma Ndịàmà Jehova pụrụ ịgwa ya ihe kpatara ha: N’ihi ihe iseokwu nke iru eru nke ịchịisi eluigwe na ụwa nke Jehova na ajụjụ banyere ma ụmụ mmadụ e kere eke hà pụrụ ịnọgide na-anọgidesi ike n’ezi ihe n’ebe Chineke nọ n’agbanyeghị mmegide Ekwensu.
20 N’ime afọ ndị gara aga, mgbukepụ nke ìhè ma ndị ukwu ma ndị nta anọwo na-eme ka ìhè dị n’okporo ụzọ nke ndị ohu Jehova raara onwe ha nye. Nke a abụwo ná mmezu nke akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Abụ Ọma 97:11 na Ilu 4:18. Ma ka anyị ghara ichefu mgbe ọ bụla na ije ije n’ìhè pụtara inwe ekele maka ìhè e meworo ka ọ baa ụba na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya. Dị ka anyị hụworo, ìhè nke a e mere ka ọ baa ụba na-agụnye ma àgwà anyị ma ọrụ nkwusa e kenyere anyị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ikwu okwu banyere echiche nke a, Ụlọ Nche nke June 1 na nke June 15, 1929 (Bekee), sụgharịrị “ike ndị ka elu” ịbụ Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. N’ụzọ bụ isi ọ bụ ọnọdụ nke a ka e doziri na 1962.
b Ụlọ Nche nke April 15, 1992, mara ọkwa na a na-ekenye ụmụnna ndị a họpụtara ahọpụta n’etiti “atụrụ ọzọ” ahụ karịsịa ọrụ inyere kọmitii dị iche iche nke Òtù Na-achị Isi aka, ndị kwekọrọ ná ndị Netinim nke ụbọchị Ezra.—Jọn 10:16; Ezra 2:58.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Ìhè dị aṅaa ka a mụkwasịworo n’ido onwe onye n’okpuru “ike ndị ka elu”?
◻ Mgbukepụ nke ìhè arụpụtawo ihe ndị dị aṅaa ná ntolite nke nzukọ a?
◻ Olee otú ìhè e mere ka ọ baa ụba siworo metụta àgwà ndị Kraịst?
◻ Ìhè ime mmụọ ewetawo nnụcha ndị dị aṅaa ná nghọta anyị banyere isi ihe ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]
Mkpịsị ugodi ndị dị na peji nke 24: Ihe osise nke dabeere na foto e sere na Cooper-Hewitt, National Design Museum, Smithsonian Institution