-
Nọgide ‘n’Obodo Mgbaba’ Wee Dịrị Ndụ!Ụlọ Nche—1995 | Nọvemba 15
-
-
20. Maka nchebe pụọ n’aka Onye Ọ́bọ̀ ọbara ahụ, gịnị ka ndị nọ n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ na-aghaghị ime?
20 Maka nchebe pụọ n’aka onye ọ́bọ̀ ọbara, ndị gburu mmadụ n’ọghọm aghaghị ịnọgide n’ime obodo mgbaba ma ghara ịkpapụ gabiga ala ịta nri ya. Gịnị banyere ndị nọ n’obodo mgbaba ihe atụ ahụ? Maka nchebe pụọ n’aka Onye Ọ́bọ̀ ọbara ukwu ahụ, ha agaghị apụ n’obodo ahụ ma ọlị. N’ezie, ọ dị ha mkpa ịnọ na nche megide ihe ụrà dị iche iche ịga n’ọnụ ọnụ nke ala ịta nri ndị ahụ, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ha aghaghị ilezi anya ịghara ikwe ka ịhụnanya maka ụwa Setan tolite n’ime obi ha. Nke a pụrụ ịchọ ekpere na mgbalị, ma ndụ ha dabeere na ya.—1 Jọn 2:15-17; 5:19.
-
-
Chi Nwanyị Dị Iche Iche nke Ọmụmụ na AghaỤlọ Nche—1995 | Nọvemba 15
-
-
Chi Nwanyị Dị Iche Iche nke Ọmụmụ na Agha
N’OGE otu ọrụ nkà ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala n’Ebla, Siria, a chọtara otu ihe ochie nke na-egosi Ishtar, chi nwanyị Babilọn nke ọmụmụ na agha. Onye ọkà mmụta ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala bụ́ Paolo Matthiae na-akọwa ya dị ka “akara dị ọpịrọpị ka komkom nke nwere ihe osise ebe a na-efe ofufe na-egosi eze mmụọ nwanyị nke e kpuchiri ekpuchi n’ihu otu onye bụ chi . . . nke a kwụnyere isi ya n’elu ahụ dị ogologo nke dị tịga tịga.”
Nchọpụta ahụ dị ịrịba ama, n’ihi na ihe oyiyi ahụ malitere ịdị laa azụ na narị afọ nke 18 T.O.A. Dị ka Matthiae na-ekwu, nke a na-enye “ihe nnwapụta zuru ezu” na ofufe Ishtar gara n’ihu ruo ihe dị ka 2,000 afọ.
Ofufe Ishtar malitere na Babilọn, na narị afọ ndị sochikwara ọ gbasara n’Alaeze Ukwu Rom nile. Jehova nyere ndị Israel iwu ka ha wepụsịa ihe nile metụtara ofufe ụgha n’Ala Nkwa ahụ, ma n’ihi na ha emeghị otú ahụ, ofufe Ashtarọt (chi ndị Kenean nke ya na Ishtar bụ otu ihe) ghọọrọ ha ọnyà.—Deuterọnọmi 7:2, 5; Ndị Ikpe 10:6.
Ọ bụ ezie na Ishtar na Ashtarọt ya na ya bụ otu ihe adịkwaghị, àgwà ndị e ji mara ha—omume rụrụ arụ na ime ihe ike—juru ebe nile. Anyị pụrụ nnọọ ịjụ ma ọha mmadụ nke oge a ọ̀ dị iche n’ezie pụọ site n’ìgwè mmadụ ndị ahụ dịrị n’oge ochie bụ́ ndị fere chi nwanyị ndị a nke ọmụmụ na agha.
-