Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche—1999 | Eprel 15
    • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

      E nyewo ụfọdụ n’ime Ndịàmà Jehova ọrụ metụtara ụlọ ma ọ bụ ihe onwunwe okpukpe. Gịnị bụ echiche Akwụkwọ Nsọ banyere ọrụ dị otú ahụ?

      Okwu a pụrụ iche ndị Kraịst ihu bụ́ ndị ji ezi obi chọọ itinye 1 Timoti 5:8 n’ọrụ, bụ́ nke na-emesi ike mkpa ọ dị mmadụ igbo mkpa ezinụlọ ya n’ụzọ ihe onwunwe. Ọ bụ ezie na ndị Kraịst kwesịrị n’ezie itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ, ọ dịghị eme ka ha ịnara ụdị ọrụ ego nile, n’agbanyeghị ụdị ọrụ ọ bụ, zie ezi. Ndị Kraịst na-aghọta mkpa ọ dị ime ihe n’ikwekọ n’ihe ndị ọzọ e kwuru bụ́ uche Chineke. Dị ka ihe atụ, ọchịchọ nwoke na-achọ ilekọta ezinụlọ ya agaghị eme ka ya imebi ihe Bible na-ekwu banyere omume rụrụ arụ ma ọ bụ igbu mmadụ zie ezi. (Tụlee Jenesis 39:4-9; Aịsaịa 2:4; Jọn 17:14, 16.) Ọ dịkwa mkpa ka ndị Kraịst na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’iwu ahụ bụ́ isi na Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, pụta.—Mkpughe 18:4, 5.

      Gburugburu ụwa, ndị ohu Chineke na-eche ọtụtụ ọnọdụ metụtara ọrụ ihu. Ọ ga-abụ ihe na-enweghị isi na ihe na-erughịrị anyị idepụta ihe nile ọ pụrụ ịgụnye na ime ụkpụrụ ndị a kapịrị ọnụ. (2 Ndị Kọrint 1:24) Otú ọ dị, ka anyị hota ihe ụfọdụ ndị Kraịst kwesịrị ịtụle mgbe ha na-emere onwe ha mkpebi ndị metụtara ọrụ. E depụtara ihe ndị a ná mkpirikpi n’Ụlọ Nche nke January 15, 1983, n’isiokwu na-ekwu banyere irite uru site n’akọ na uche nke Chineke nyere anyị. Otu igbe welitere ajụjụ abụọ gbara ọkpụrụkpụ ma depụtazie ihe ndị ọzọ ga-enye aka.

      Ajụjụ mbụ gbara ọkpụrụkpụ bụ nke a: Bible ọ̀ katọrọ ọrụ ego ahụ n’onwe ya? N’ikwu okwu na nke a, Ụlọ Nche ahụ kwuru na Bible mara izu ohi, iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na ikpere arụsị ikpe. Onye Kraịst kwesịrị izere ọrụ ego nke na-akwalite kpọmkwem ihe omume ndị Chineke na-akwadoghị, dị ka ndị ahụ a ka hotasịrị.

      Ajụjụ nke abụọ bụ: Ịrụ ọrụ a ọ̀ ga-eme ka mmadụ bụrụ onye na-etinye aka n’omume a katọrọ akatọ? N’ụzọ doro anya, onye e were n’ọrụ n’ebe a na-agba chaa chaa, n’ụlọ ahụ ike na-esikwopụ afọ ime, ma ọ bụ n’ụlọ ndị akwụna ga-abụ onye na-etinye aka n’omume Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Ọ bụrụgodị na ọrụ ọ na-arụ kwa ụbọchị n’ebe ahụ bụ nanị ịzacha ala ụlọ ma ọ bụ ịza fon, ọ ga na-atụnye ụtụ n’omume Okwu Chineke mara ikpe.

      Ọtụtụ ndị Kraịst chere mkpebi ndị metụtara ọrụ ihu achọpụtawo na ịtụle nanị ajụjụ ndị ahụ nyeere ha aka ime mkpebi onwe onye.

      Dị ka ihe atụ, site n’ajụjụ abụọ ahụ, mmadụ pụrụ ịhụ ihe mere onye na-efe ezi ofufe na-agaghị eji bụrụ kpọmkwem onye òtù okpukpe ụgha were n’ọrụ, onye na-arụrụ chọọchị ọrụ ma ọ bụ na-arụ ọrụ n’ime ya. Mkpughe 18:4 na-enye iwu bụ́: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile.” Mmadụ ga na-ekere òkè n’ọrụ na ná mmehie nke Babilọn Ukwu ahụ ma ọ bụrụ na ọ bụ onye ọrụ oge nile nke okpukpe na-akụzi ofufe ụgha. Ma onye ọrụ ahụ ọ̀ bụ onye nlekọta ubi, onye nlekọta ụlọ, onye na-arụzi ihe, ma ọ bụ onye mpịazi ego, ọrụ ya ga-enye aka n’ịkwalite ofufe nke na-ekwekọghị n’ezi okpukpe. Ọzọkwa, ndị na-ahụ onye ọrụ a ka ọ na-arụ ọrụ iji chọọ chọọchị ahụ mma, iji lekọta ya, ma ọ bụ maka ọdịmma nke okpukpe ahụ, ga-ewere ya n’ụzọ ezi uche dị na ya na o so n’okpukpe ahụ.

      Otú ọ dị, gịnị banyere onye na-abụghị onye ọrụ oge nile nke otu chọọchị ma ọ bụ òtù okpukpe? Ikekwe a kpọrọ ya nanị ka ọ bịa rụzie ihe dapụtara na mberede na paịpụ mmiri dị n’okpuru ụlọ nke chọọchị ahụ. Nke ahụ ọ̀ gaghị adị iche na ya itinye akwụkwọ inweta ọrụ ngo, dị ka ịmachite elu ụlọ chọọchị?

      Ọzọ, a pụrụ ichepụta ụdị ọnọdụ dị iche iche. Ya mere ka anyị tụleghachi ihe ise ọzọ Ụlọ Nche ahụ depụtara:

      1. Ọrụ ahụ ọ̀ bụ nanị ijere mmadụ ozi bụ́ nke Akwụkwọ Nsọ na-ekwughị na ọ dị njọ? Were dị ka ihe atụ onye na-ekesa akwụkwọ ozi. Nkesa ọ na-ekesa akwụkwọ ozi agaghị apụta ma ọlị na ọ na-akwalite omume a mara ikpe ma ọ bụrụ na otu ụlọ o wegaara akwụkwọ ozi n’ógbè ahụ bụ ụlọ chọọchị ma ọ bụ ụlọ ahụ ike na-esikwopụ afọ ime. Chineke na-enye ìhè anyanwụ nke na-esi na windo achabata n’ụlọ nile, nke gụnyere ụlọ chọọchị ma ọ bụ ụlọ ahụ ike. (Ọrụ 14:16, 17) Onye Kraịst bụ́ onye na-ekesa akwụkwọ ozi pụrụ ikwubi na ya na-ejere mmadụ nile ozi kwa ụbọchị. Ọ pụrụ ịbụ otu ihe ahụ banyere onye Kraịst nke na-aza òkù ọnọdụ mberede—onye plọmba a kpọrọ ka ọ bịa kwụsị mmiri na-asọ na chọọchị ma ọ bụ onye nlekọta ahụ ike na-anọ n’ụgbọala e ji ebu ndị ọrịa nke a kpọrọ ka ọ bịa lekọta onye dara n’oge a na-aka ụka. Ọ pụrụ iwere nke a nanị dị ka inyere mmadụ aka ná ndapụta.

      2. Ruo ókè hà aṅaa ka onye ahụ nwere ikike n’ihe ahụ a na-eme? Ọ ga-esi ike onye Kraịst nwere ụlọ ahịa ịtụ ọda na ire arụsị, ọgwụ nchebe, siga, ma ọ bụ ngwọngwọ ọbara. Dị ka onyenwe ụlọ ahịa, ọ bụ ya na-achịkwa ya. Ndị mmadụ pụrụ ịgba ya ume ire siga ma ọ bụ arụsị ma na-enweta uru, ma ọ ga-eme ihe kwekọrọ na nkwenkwe ya ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. N’aka nke ọzọ, a pụrụ inye onye Kraịst e were n’ọrụ ná nnukwu ụlọ ahịa na-ere nri ọrụ ịnakọta ego, ime ka ala ụlọ na-egbuke egbuke, ma ọ bụ ime ndekọ ego. Ọ dịghị achịkwa ngwá ahịa ndị a na-atụ ọda ha ma na-ere, a sịgodị na ole na ole n’ime ndị a dị njọ, dị ka siga ma ọ bụ ihe ndị e ji eme ememe okpukpe.a (Tụlee Luk 7:8; 17:7, 8.) Nke a metụtara akụkụ na-esonụ.

      3. Ruo ókè hà aṅaa ka onye ahụ na-etinyeru aka? Ka anyị laghachi n’ihe atụ nke ụlọ ahịa. Ikekwe onye e were n’ọrụ nke e nyere ọrụ ịnakọta ego ma ọ bụ ịkpọsa ngwá ahịa na shelf na-emetụ siga ma ọ bụ ngwongwo okpukpe aka, nanị site n’oge ruo n’oge; nke ahụ bụ akụkụ dị nta nke ọrụ nile ọ na-arụ. Otú ọ dị, lee ka nke ahụ si dị iche n’ebe onye e were n’ọrụ n’otu ụlọ ahia ahụ nke na-arụ ọrụ n’ebe a na-ere ụtaba! Ọrụ ya nile, kwa ụbọchị, hiwere isi n’ihe megidere nkwenkwe ndị Kraịst. (2 Ndị Kọrint 7:1) Nke a na-egosi ihe mere a na-aghaghị iji tụlee ókè a na-etinyeru aka ma ọ bụ a na-emeru ya mgbe a na-eme mkpebi n’okwu ndị metụtara ọrụ.

      4. È si ebee enweta ego e ji akwụ ụgwọ ahụ ma ọ bụ olee ebe a na-anọ arụ ọrụ ahụ? Tụlee ọnọdụ abụọ. Iji mee ka ọha na eze na-elekwu ya anya ọma, ụlọ ahụ ike na-esikwopụ afọ ime ekpebie ịkwụ otu nwoke ụgwọ ka ọ na-azacha okporo ámá ndị dị n’ógbè ahụ. E si n’ụlọ ahụ ike ahụ na-esikwopụ afọ ime enweta ego e ji akwụ ya ụgwọ, ma ọ naghị arụ ọrụ ebe ahụ, ọ dịghịkwa onye ọ bụla na-ahụ ya n’ụlọ ahụ ike ahụ ụbọchi nile. Kama nke ahụ, ha na-ahụ ya ka ọ na-arụrụ ọha na eze ọrụ nke na-emegideghị Akwụkwọ Nsọ, n’agbanyeghị onye na-akwụ ya ụgwọ. Ugbu a lee ọdịiche. Ná mba ebe iwu kwadoro ịgba akwụna, ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụ ike ọha na eze na-akwụ otu nọọsụ ụgwọ ka ọ na-arụ ọrụ n’ụlọ ndị akwụna, na-eme nnyocha ahụ ike ndị nzube ha bụ iji belata mgbasapụ nke ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụ ike ọha na eze na-akwụ ya ụgwọ, ọrụ ya nile n’ụlọ ndị akwụna, na-eme ka omume ahụ rụrụ arụ ghara ịdịcha ize ndụ ma bụrụ ihe a na-anakwere karị. Ihe atụ ndị a na-egosi ihe mere ebe e si enweta ego e ji akwụ mmadụ ụgwọ na ebe a nọ arụ ọrụ ji bụrụ akụkụ ndị a ga-atụle.

      5. Gịnị bụ mmetụta ịrụ ọrụ ahụ na-enwe; ọ̀ ga-emebi akọ na uche mmadụ ma ọ bụ mee ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ? E kwesịrị ịtụle akọ na uche, ma nke anyị ma nke ndị ọzọ. Ọ bụrụgodị na otu ọrụ (gụnyere ebe a na-anọ arụ ya na ebe e si enweta ego e ji akwụ ụgwọ) yiri ihe dị mma nye ihe ka ukwuu ná ndị Kraịst, mmadụ pụrụ ịchọpụta na ọ ga-enye akọ na uche ya nsogbu. Pọl onyeozi, bụ́ onye setipụrụ ezi ihe nlereanya, kwuru, sị: “E mere ka anyị kwenye na anyị nwere akọ na uche ọma, ebe anyị na-achọ ibi obi nke ọma n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Anyị kwesịrị izere ịrụ ọrụ ga-enye anyị nsogbu n’obi; ma, anyị ekwesịghịkwa ịkatọ ndị ọzọ akọ na uche ha dị iche. N’aka nke ọzọ, onye Kraịst nwere ike ọ gaghị ahụ ihe ọ bụla megidere Bible dị na ya ịrụ otu ọrụ, ma ọ ghọtara na ọ ga-enye ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ nakwa n’ógbè ahụ nnọọ nsogbu n’obi. Pọl gosipụtara àgwà ziri ezi n’okwu ya bụ́: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla n’ihe ọ bụla, ka a ghara ịta ije ozi anyị ụta; kama n’ihe nile anyị na-eme ka mmadụ mara anyị, dị ka ndị na-ejere Chineke ozi.”—2 Ndị Kọrint 6:3, 4.

      Ugbu a ka anyị laghachi azụ n’ajụjụ ahụ bụ́ isi banyere ịrụ ọrụ n’ụlọ chọọchị, dị ka itinye windo ọhụrụ, ihicha kapet, ma ọ bụ ịrụzi ite ọkụ. Olee otú ọ pụrụ isi metụta ihe ndị ahụ dị n’elu?

      Cheta okwu banyere inwe ikike. Onye Kraịst ahụ ọ̀ bụ onye nwe ụlọ ọrụ ahụ ma ọ bụ manịja ya nke pụrụ ikpebi ma ọ̀ ga-anakwere ọrụ dị otú ahụ n’ụlọ chọọchị? Onye Kraịst nwere ikike dị otú ahụ ọ̀ ga-achọ isoro Babilọn Ukwu ahụ kerịta ihe site n’itinye akwụkwọ ịchọ ọrụ ma ọ bụ ịnara ọrụ ngo iji nyere otu okpukpe aka ịkwalite ofufe ụgha? Nke ahụ ò yighị mmadụ ikpebi ire siga ma ọ bụ arụsị n’ụlọ ahịa ya?—2 Ndị Kọrint 6:14-16.

      Ọ bụrụ na onye Kraịst ahụ bụ onye e were n’ọrụ nke na-enweghị ọnụ ikpebi ọrụ a ga-anata, e kwesịrị ịtụle ihe ndị ọzọ, dị ka ebe a ga-anọ arụ ya na ókè a ga-etinyeru aka na ya. À gwara onye ahụ e were n’ọrụ nanị ka o buga ma ọ bụ dozie oche ọhụrụ n’otu oge ma ọ bụ ka o jeere ndị mmadụ ozi, dị ka onye ọrụ mmenyụ ọkụ imenyụ ọkụ na chọọchị tupu ọ gbasaa? Ọtụtụ ndị ga-ahụ nke a dị ka ihe dị iche n’onye e were n’ọrụ achụmnta ego na-etinye oge dị ukwuu n’ite chọọchị ágbá ma ọ bụ ilekọta ogige ya mgbe nile iji mee ka ọ maa mma. Omume a na-eme ihe dị otú ahụ mgbe dum ma ọ bụ ruo ogologo oge, ga-amụba oyiyi o yiri ka ọtụtụ ndị hà ga-ewere onye Kraịst ahụ dị ka onye so n’okpukpe ọ na-azọrọ na ya akwadoghị, ọ pụkwara ime ka ha sụọ ngọngọ.—Matiu 13:41; 18:6, 7.

      Anyị atụlewo ọtụtụ ihe dị mkpa e kwesịrị ịtụle n’ihe metụtara ọrụ. E kwuru ihe ndị a n’ihi otu ajụjụ kpọmkwem nke metụtara okpukpe ụgha. Ma, a pụkwara ịtụle ha n’ihe metụtara ụdị ọrụ ndị ọzọ. N’ọnọdụ nke ọ bụla, e kwesịrị iji ekpere nyochaa ya, na-atụle akụkụ ndị a kapịrị ọnụ—na ikekwe ndị pụrụ iche—nke ọnọdụ dịnụ. Ihe ndị e kwuru n’elu enyewororị ọtụtụ ndị Kraịst nwere obi eziokwu aka iji akọ na uche mee mkpebi ndị na-egosipụta ọchịchọ ha ije ije n’ụzọ kwụ ọtọ ma zie ezi n’ihu Jehova.—Ilu 3:5, 6; Aịsaịa 2:3; Ndị Hibru 12:12-14.

      [Ihe e dere n’ala ala peeji]

      a Ụfọdụ ndị Kraịst na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ atụlewo okwu a metụtara ikike. Dibịa bekee pụrụ inwe ikike idepụta ọgwụ a ga-enye ma ọ bụ usoro ndị a ga-eji agwọ onye ọrịa. Olee otú onye Kraịst bụ́ dọkịta nke ọ dị n’aka pụrụ isi kwuo ka a mịnye ọbara ma ọ bụ sikwopụ afọ ime, ebe ọ maara ihe Bible na-ekwu banyere ihe ndị ahụ, ọ bụrụgodi na onye ọrịa ahụ nabatara ya? N’ụzọ dị iche, onye nọọsụ e were n’ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ nwere ike ghara inwe ikike dị otú ahụ. Ka ọ na-arụ ọrụ ya, onye dọkịta pụrụ ịgwa ya ka o mee nnyocha ọbara n’ihi ihe ụfọdụ ma ọ bụ ilekọta onye ọrịa nke bịara isikwopụ afọ ime. N’ikwekọ n’ihe atụ ahụ e dekọrọ ná 2 Ndị Eze 5:17-19, ọ pụrụ ikpebi na ebe ọ na-abụghị ya bụ onye ọ dị n’aka nke kwuru ka a mịnye ọbara ma ọ bụ sikwopụ afọ ime, na ya pụrụ ijere onye ọrịa ozi. N’ezie, ọ ka ga-atụle akọ na uche ya, iji jiri ‘ezi akọ na uche biri n’ihu Chineke.’—Ọrụ 23:1.

  • Ị̀ Na-echeta?
    Ụlọ Nche—1999 | Eprel 15
    • Ị̀ Na-echeta?

      Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

      ◻ N’ihi gịnị ka okwu Pọl bụ́ “ndị [nnọchianya, NW] n’ọnọdụ Kraịst” ji bụrụ nke kwesịrị ekwesị nye ndị Kraịst e tere mmanụ? (2 Ndị Kọrint 5:20)

      N’oge ochie, a na-ezipụ ndị nnọchianya karịsịa n’oge ọgba aghara iji hụ ma a pụrụ igbochi agha. (Luk 14:31, 32) Ebe ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie bụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ, ọ na-ezipụ ndị nnọchianya ya e tere mmanụ ime ka ndị mmadụ mara banyere ndokwa ya maka ime ka a dịghachi n’otu, na-agba ha ume ka ha chọọ udo n’ebe Chineke nọ.—12/15, peji nke 18.

      ◻ Ihe anọ dị aṅaa mere ka okwukwe Abraham sie ike?

      Nke mbụ, o gosipụtara okwukwe n’ebe Jehova nọ site n’ịṅa ntị mgbe Chineke kwuru okwu. (Ndị Hibru 11:8); nke abụọ, okwukwe na olileanya ya nwere njikọ chiri anya (Ndị Rom 4:18); nke atọ, Abraham sooro Jehova kwurịta okwu mgbe mgbe; na nke anọ, Jehova nyere Abraham nkwado mgbe ọ gbasoro nduzi Chineke. Ihe ndị ahụ pụkwara ime ka okwukwe anyị sie ike taa.—1/1, peji nke 17, 18.

      ◻ Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Ewebakwala anyị n’ime ọnwụnwa” pụtara? (Matiu 6:13)

      Anyị na-arịọ Chineke ka ọ ghara ikwe ka anyị daa mgbe a nwara anyị ọnwụnwa inupụrụ ya isi. Jehova pụrụ iduzi anyị ka anyị ghara ịda, ka Setan, bụ́ “ajọ onye ahụ,” gharakwa imeri anyị. (1 Ndị Kọrint 10:13)—1/15, peji nke 14.

      ◻ Gịnị ka mmadụ na-aghaghị ime iji nweta mgbaghara Chineke maka ime ihe ọjọọ?

      Ịkwa ụta na “mkpụrụ kwesịrị nchegharị” aghaghị isonyere imere Chineke nkwupụta. (Luk 3:8) Mmụọ nchegharị na ọchịchọ imezi mmejọ ahụ ga-akpalikwa anyị ịchọ enyemaka ime mmụọ nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye. (Jemes 5:13-15)—1/15, peji nke 19.

      ◻ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji gbalịsie ike ịdị umeala n’obi?

      Onye dị umeala n’obi na-enwe ndidi na ogologo ntachi obi, ọ dịghịkwa eche echiche banyere onwe ya gabiga ókè. Ịdị umeala n’obi na-adọta ezi ndị enyi hụrụ gị n’anya. Karịa nke ahụ, ọ na-eweta ngọzi Jehova. (Ilu 22:4)—2/1, peji nke 7.

      ◻ Olee ọdịiche dị mkpa dị n’ọnwụ Jisọs na nke Adam?

      Ọnwụ Adam nwụrụ kwesịrị ya, n’ihi na ọ kpachapụrụ anya nupụrụ Onye Okike ya isi. (Jenesis 2:16, 17) N’ụzọ dị iche, ọnwụ Jisọs nwụrụ ekwesịghị ya ma ọlị, n’ihi na “ọ dịghị mmehie ọ bụla O mere.” (1 Pita 2:22) Ya mere mgbe Jisọs nwụrụ, o nwere ihe dị oké ọnụ ahịa nke Adam onye mmehie ahụ na-enweghị mgbe ọ nwụrụ—ikike inwe ndụ mmadụ zuru okè. N’ihi ya, ọnwụ Jisọs bara uru dị ka àjà n’ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ.—2/15, peji nke 15, 16.

      ◻ N’ọhụụ amụma Ezikiel, gịnị ka obodo ahụ na-ese onyinyo ya?

      Ebe ọ bụ na obodo ahụ dị n’etiti ala na-adịghị nsọ, ọ ghaghị ịbụ ihe dị n’elu ala. N’ihi ya, o yiri ka ọ na-ese onyinyo ọchịchị elu ala nke ga-abara mmadụ nile ga-emejupụta òtù ụwa ọhụrụ ahụ nke ezi omume uru.—3/1, peji nke 18.

      ◻ N’ihi gịnị ka Jisọs ji saa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha na-eme Ememe Ngabiga na 33 O.A.?

      Jisọs adịghị eguzobe usoro ịsa ụkwụ. Kama nke ahụ, ọ na-enyere ndị ozi ya aka inwe àgwà ọhụrụ—nke ịdị umeala n’obi na ịdị njikere ịrụrụ ụmụnna ha ọrụ ndị kasị ala.—3/1, peji nke 30.

      ◻ Mgbe anyị na-ezi ndị ọzọ ihe, gịnị dị mkpa karịa ikike ebumpụta ụwa?

      Ọ bụ omume ndị anyị nwere na àgwà ime mmụọ ndị anyị zụliteworo nke ndị anyị na-amụrụ ihe pụrụ iṅomi. (Luk 6:40; 2 Pita 3:11)—3/15, peji nke 11, 12.

      ◻ Olee otú ndị na-ekwu okwu n’ihu ọha pụrụ isi mee ka ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ ha ka mma?

      Site n’ịdị na-amụ ịgụ ihe. Ee, site n’ịgụ ihe ugboro ugboro n’olu dara ụda ruo mgbe ha nwere ike ịgụ ihe were were. Ọ bụrụ na e nwere kaseti Bible a na-ege ege, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ige ntị n’imesi echiche okwu ike na mgbanwe olu nke onye ahụ na-agụ ya ma rịba ama otú e si akpọpụta aha na okwu ndị a na-adịghị ahụkebe.—3/15, peji nke 20.

      ◻ Olee otú ‘mmụọ si alaghachikwuru Chineke’ mgbe mmadụ nwụrụ? (Eklisiastis 12:7)

      Ebe mmụọ ahụ bụ ike ndụ, ọ ‘na-alaghachikwuru Chineke’ n’echiche nke na olileanya ọ bụla nke onye ahụ ịdị ndụ n’ọdịnihu dabeere ugbu a kpam kpam n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ iweghachi mmụọ ahụ, ma ọ bụ ike ndụ, na-eme ka mmadụ dịghachi ndụ. (Abụ Ọma 104:30)—4/1, peji nke 17.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya