Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ịhazi na Iji Oge Ezumike Eme Ihe n’Ụzọ Amamihe
1 Ọ́ bụghị eziokwu na o yikarịrị ka anyị ga-eru ihe mgbaru ọsọ anyị ndị dị mma mgbe anyị mere atụmatụ maka ụzọ kasị mma anyị ga-esi jiri oge anyị nwere mee ihe? Oge ezumike na-enye ọtụtụ n’ime ndị na-eto eto anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ ezumike a chọsiri ike site n’ihe omume ụlọ akwụkwọ ha. Otú ọ dị, ọ pụkwara ikwe mee na a ga-ahapụ ọtụtụ ụmụaka ime otú masịrị ha n’oge a, ha ewee si otú a mebisịa oge ha. (Ilu 29:15) N’ihi ya, ọtụtụ ndị ntorobịa pụrụ iji ihe ka ukwuu n’oge ezumike ha kirie telivishọn ma ọ bụ ụdị vidio dị iche iche ma ọ bụ tinye aka n’ihe omume ndị ọzọ na-eri oge ma ọ bụ na-adịghị ewuli elu. Ma o kwesịghị ịdị otú a.
2 Ndị mụrụ ụmụ, oge ezumike bụụrụ unu ohere dị mma iji mee atụmatụ maka ihe omume ndị kwesịrị ekwesị dị ka ezinụlọ. Ọtụtụ ndị nne na nna achọpụtawo na ọ bara uru ime atụmatụ inwe ezumike afọ ha n’ụfọdụ n’ime oge ezumike ụmụ ha ka ezinụlọ ha wee nwee ike ịgakọ ezumike na imekọ njem ọnụ dị ka otu ụzọ nke isi mee ihe dị iche n’ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị. Ọ pụkwara ịbụrụ ezinụlọ ahụ ohere nke ikere òkè n’ịmụba ihe ndị metụtara ọchịchị Chineke. (Ilu 21:5) Olee otú a pụrụ isi mee ya?
3 Gịnị ma unu mee atụmatụ dị ka ezinụlọ ịmụba ozi ubi unu n’oge ezumike? Oge ezumike ụlọ akwụkwọ bụ ohere ndị na-eto eto nwere iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ ejiri ịdị uchu mee atụmatụ, ọ pụkwara ikwe ha omume isoro ụmụ ha sụọ ụzọ. N’August a, ka anyị na-emechi afọ ije ozi a, onye ọ bụla kwesịrị itinye mgbalị siri ike iji kere òkè zuru ezu ruo n’ókè o kwere mee n’ozi. Ọ bụrụ na ezinụlọ emee atụmatụ ikerekwu òkè n’ozi, mgbe ahụ mmadụ nile pụrụ ịrụ ọrụ iji mee ka ọ gaa nke ọma.—Ilu 15:22.
4 Ùnu pụrụ ime atụmatụ inyere ọgbakọ dịdewere unu nke chọrọ enyemaka aka iji rụzuo ókèala ya? Unu pụrụ ime ndokwa dị ka ezinụlọ ime nkwusa n’ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ na ya ma ọ bụ nke unu na-eketaghị.—Mat. 24:14.
5 N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na unu na ezinụlọ unu ga-aga ezumike n’ebe ọzọ, meenụ atụmatụ iso ọgbakọ dị n’ebe ahụ gaa nzukọ ma kere òkè n’ozi ubi. Ọ bụrụ na unu gara ileta ndị ikwu na-abụghị Ndịàmà, burunụ ụzọ kwadebe ụzọ dị iche iche unu pụrụ isi soro ha kerịta eziokwu ahụ.—Lee Ụlọ Nche nke February 15, 1990, peeji nke 25-27.
6 Gịnị ka unu na-eme atụmatụ ime n’oge ezumike ọzọ na-abịanụ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na unu ga-achọ ka ezinụlọ unu nweta ume ọhụrụ n’ụzọ anụ ahụ. Ma unu elegharala ohere ndị ka mkpa dịnụ anya maka iji kpalie ezinụlọ unu n’ụzọ ime mmụọ site n’ịnọgide na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ụzọ ná ndụ unu.—Mat. 6:33; Efe. 5:15, 16.