-
“Unu Dị Otú Chineke Tụrụ Anya Ka Anyị Dịrị”Ụlọ Nche—1999 | Jenụwarị 15
-
-
“Unu Dị Otú Chineke Tụrụ Anya Ka Anyị Dịrị”
N’IKWENYERE ndị ọchịchị “n’ihi Onyenwe anyị,” ndị Kraịst pụrụ ịtụ anya inweta ‘otuto dị ka ndị na-eme ezi ihe.’ (1 Pita 2:13-15) Ndịàmà Jehova nọ na South Africa nwere ahụmahụ nke a n’oge ụfọdụ gara aga ná mgbakọ distrikti ha nwere n’ụlọ ezumezu nke otu ụlọ akwụkwọ kọleji.
N’ụbọchị mbụ nke mgbakọ ahụ, ndị uwe ojii nchekwa nke kọleji ahụ jikeere onwe ha maka ndị iwe na ndị ekwe ekwe na-abịakarịnụ, dị ka ha nwere ahụmahụ ya n’ụdị mgbakọ ndị ọzọ. Otú ọ dị, n’ịbụ ndị ha na Ndịàmà Jehova na-emekọbeghị ihe na mbụ, ha gaje inweta ihe ịtụnanya obi ụtọ!
Dị ka akụkụ nke nnyocha nchekwa ha n’ọnụ ụzọ ámá ndị ahụ, ndị uwe ojii nchekwa ahụ nyochara ụgbọala ọ bụla na-abata ma na-apụ n’ihe owuwu ahụ. O juru ha anya mgbe e ji ihu enyi, ndidi, na nkwanye ùgwù kelee ha, ọ bụ ezie na nnyocha ahụ gburu ndị ahụ bịara mgbakọ oge. A hụghị nke ọ bụla n’ime nguzogide, ịrụ ụka, na okwu ndị na-adịghị mma ndị a na-ahụkarị. “N’adịghị ka ndị ọbịa ndị ọzọ,” ka otu ọfịsa nchekwa kwuru, “unu na-egosipụta mmụọ obi umeala na ịdị ùgwù nke ịdị nwayọọ nke pụtara ìhè nye anyị nile.”
Ozugbo onyeisi nchekwa matara banyere omume nkwenye nke Ndịàmà Jehova, o kpebiri na ọ dịghị mkpa inyocha ụgbọala ha “n’ihi na a zụrụ unu azụ nke ọma,” ka ọ sịrị. N’ihi ya, e kwere ka ụgbọala ndị a mapawara akwụkwọ ndọba ụgbọala ndị e dere “JW” banye n’enyochaghị ha.
Ná ngwụsị nke mgbakọ ahụ, onyeisi nchekwa ahụ kwuru na ya nwere olileanya ịhụ Ndịàmà ka ha bịaghachiri ọzọ n’oge na-adịghị anya. “Anyị ahụtụbeghị ndị na-akpa ezi àgwà dị otú a,” ka o kwuru. “Unu dị otú Chineke tụrụ anya ka anyị dịrị.” Ịja mma dị otú ahụ bụkwu ihe mkpali nye ezi ndị Kraịst iji ‘na-ebi obi nke ọma,’ ka ndị mmadụ wee ‘site n’ọrụ ọma nile ha, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto.’—1 Pita 2:12.
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?Ụlọ Nche—1999 | Jenụwarị 15
-
-
Ọ̀ Ga-amasị Gị Ka Mmadụ Bịa na Nke Gị?
Ọbụna n’ụwa a nọ ná nsogbu, ị pụrụ inweta obi ụtọ site n’ezi ihe ọmụma nke Bible banyere Chineke, Alaeze ya, na nzube ya dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma ma ọ bụ nwee mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji duziere gị ọmụmụ Bible n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2.
-