Ndị Na-eto Eto—Na-agụnụ Okwu Chineke!
1 Oge ntorobịa bụ oge ihe ịma aka na oge ime mkpebi ndị siri ike. Kwa ụbọchị, ọtụtụ n’ime unu bụ́ ndị ntorobịa Ndị Kraịst na-enweta nrụgide ndị na-achọ ka unu mebie ụkpụrụ omume ndị Chineke setịpụrụ. Ka unu na-amalite ime mkpebi onwe onye ndị metụtara agụmakwụkwọ, ọrụ, na alụmdi na nwunye, unu kwesịrị isetịpụworị ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ. Ọ bụ nanị n’ụzọ dị otú ahụ ka unu pụrụ ime mkpebi ndị ọzọ bụ́ ndị ga-akpụzi ihe fọdụrụ ná ndụ unu n’ụzọ dị mma. Ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị a kapịrị ọnụ ga-enyere unu aka ime omume n’ụzọ amamihe dị na ya ma mee ka unu nwee ihe ịga nke ọma. Site n’ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke mgbe nile, unu ga-abụ ndị a kwaliri ibi ndụ kwekọrọ ná ndụmọdụ ya sitere n’ike mmụọ nsọ, mgbalị ziri ezi ndị unu na-eme ga-agakwa nke ọma.—Josh. 1:8; Ọma 1:2, 3.
2 Olee Otú Ọ Ga-esi Baara Unu Uru? Ụwa Setan jupụtara n’ihe ndị na-arata mmadụ ime ihe ọjọọ. (1 Jọn 2:15, 16) Unu pụrụ ịma banyere ụmụ klas unu ma ọ bụ ndị ọgbọ unu ndị ọzọ bụ́ ndị nwetaworo ọdachi n’ihi ikwe ka nrụgide ndị ọgbọ nwee mmetụta n’ebe ha nọ. Ịgbasochi ndụmọdụ Bible anya ga-eme ka unu nwee ike nke omume na nke ime mmụọ iji jụ ibi ndụ n’ụzọ mmehie. Ọzọkwa, ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke pụrụ inyere unu aka izere ọnyà Setan bụ́ ndị zoro ezo. (2 Kọr. 2:11; Hib. 5:14) Ije ije n’ụzọ Chineke ga-eme ka unu nwee ezi obi ụtọ—afọ ojuju n’ụzọ unu si ebi ndụ.—Ọma 119:1, 9, 11.
3 Ụkpụrụ ndị na-adịghị agbanwe agbanwe bụ́ ndị dị n’Okwu Chineke karịrị amamihe mmadụ. (Ọma 119:98-100) Ịmara ụkpụrụ Bible nke ọma na ịtụgharị uche ná nzube Jehova ndị o mere ka a mara, tinyere ikpe ekpere sitere n’obi, ga-enyere unu aka iso Onye maara ihe nile nke chepụtara Bible, bụ́ Jehova Chineke, na-enwe mkpakọrịta chiri anya. Ọ na-ekwe nkwa, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.”—Ọma 32:8.
4 Wepụta Oge Iji Na-agụ Ya: Otu Onye Kraịst na-eto eto mere ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ ya ịgụcha Bible, ọ gụsịkwara ya n’ime otu afọ. Olee uru o ritere? Ọ na-echeta, sị: “Amụtara m ihe dị ukwuu banyere Jehova—ihe ndị mere ka m bịarukwuo ya nso ma mee ka m chọọ ịtụ egwu ya ná ndụ m fọdụrụnụ.” (Jes. 4:8) Ùnu agụzuwo Bible? Ọ bụrụ na unu agụzubeghị ya, gịnị ma unu mee ya ihe mgbaru ọsọ unu ịgụzu ya? N’ezie, Jehova ga-agọzi mgbalị unu, unu ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ dị ukwuu.