Isi nke Iri
Ònye Pụrụ Iguzogide Onyeisi nke Ndị Isi?
1, 2. N’ihi gịnị ka ọhụụ Daniel hụrụ n’afọ nke atọ nke ọchịchị Belshaza ji dị anyị mkpa?
AFỌ 57 agafewo kemgbe e bibisịrị ụlọ nsọ Jehova dị na Jerusalem. Belshaza na nna ya, bụ́ Nabonidus, jikọrọ aka chịa Alaeze Ukwu Babilọn, bụ́ ike ọchịchị ụwa nke atọ nke amụma Bible.a E mere ka onye amụma Chineke bụ́ Daniel gaa biri n’ala Babilọn. “N’afọ nke atọ nke ọbụbụeze nke Belshaza, bụ́ eze,” Jehova zijeere Daniel otu ọhụụ nke na-ekpughe nkọwa ụfọdụ sara mbara banyere mweghachi nke ezi ofufe.—Daniel 8:1.
2 Ọhụụ amụma ahụ Daniel hụrụ nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ ya, ọ na-adọrọkwa nnọọ mmasị anyị bụ́ ndị bi na “mgbe nke ọgwụgwụ ihe nile.” Mmụọ ozi Gebriel na-agwa Daniel, sị: “Lee, m gaje ime ka ị mara ihe ahụ nke ga-adị n’ikpeazụ nke oké iwe a: n’ihi na ọ dịịrị mgbe a kara aka nke ọgwụgwụ ihe nile.” (Daniel 8:16, 17, 19, 27) Mgbe ahụ, n’inwe ezi mmasị, ka anyị tụlee ihe Daniel hụrụ na ihe ọ pụtaara anyị taa.
EBULE NWERE MPI ABỤỌ
3, 4. Olee anụ Daniel hụrụ guzo n’ihu mmiri, gịnịkwa ka ọ na-anọchi anya ya?
3 Daniel na-ede, sị: “M wee hụ n’ọhụụ ahụ; o wee ruo, mgbe m na-ahụ, na mụ onwe m nọ na Shushan, bụ́ ụlọukwu eze nke dị n’Ilam, bụ́ ala a na-achị achị; m wee hụ n’ọhụụ ahụ, ma lee, mụ onwe m nọ n’akụkụ osimiri Ulai.” (Daniel 8:2) E kwughị ma Daniel ọ̀ nọ kpọmkwem na Shushan (Susa)—bụ́ isi obodo Ilam, nke dị ihe dị ka kilomita 350 n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Babilọn—ka ọ̀ nọ n’ebe ahụ nanị n’ọhụụ.
4 Daniel gara n’ihu: “M wee welie anya m, hụ, ma, lee, otu ebule na-eguzo n’ihu osimiri ahụ nke nwere mpi abụọ.” (Daniel 8:3a) Ihe ebule ahụ bụ anọgideghị na-abụrụ Daniel ihe omimi. Mmụọ ozi Gebriel mesịrị kwuo, sị: “Ebule ahụ nke ị hụrụ, nke nwere mpi abụọ, ha bụ eze nke Midia na Peasia.” (Daniel 8:20) Ndị Midia sitere n’ebe dị larịị nke ugwu n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Asiria, ndị Peasia n’oge mbụ na-ebikwa ndụ mwagharị n’akụkụ ugwu nke Gulf nke Peasia. Otú ọ dị, ka Alaeze Ukwu Medo-Peasia na-eto, ndị bi na ya malitere inwe ọchịchọ pụrụ iche ibi ndụ okomoko.
5. Olee otú mpi ahụ “kpe azụ pute” siri dị elu karịa?
5 “Mpi abụọ ahụ dịkwa elu,” ka Daniel na-akọ, “ma otu dị elu karịa ibe ya: ma nke ka elu kpe azụ pute.” (Daniel 8:3b) Mpi nke ka ibe ya elu bụ́ nke pụtaranụ ka oge na-aga na-ese onyinyo ndị Peasia, ebe mpi nke ọzọ na-anọchite anya ndị Midia. Na mbụ, ndị Midia ka ike. Ma na 550 T.O.A., Saịrọs bụ́ onye ọchịchị nke Peasia meriri Eze Astyages nke Midia n’ụzọ dị mfe. Saịrọs jikọrọ omenala na iwu nke mba abụọ ahụ, jikọọ alaeze ha, ma gbasapụ mmeri ha. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, alaeze ukwu ahụ ghọrọ nke mba abụọ mejupụtara.
EBULE AHỤ MERE ONWE YA UKWUU
6, 7. Olee otú o si bụrụ na “ọ dịghị anụ ọ bụla na-eguzo n’ihu” ebule ahụ?
6 N’ịga n’ihu ná nkọwa ọ na-akọwa ebule ahụ, Daniel kwuru, sị: “Ahụrụ m ebule ahụ ka ọ na-asọ mpi n’akụkụ Ọdịda anyanwụ, na n’akụkụ Ugwu, na n’akụkụ Ndịda; ma ọ dịghị anụ ọ bụla na-eguzo n’ihu ya, ọ dịghịkwa onye na-anapụta ihe n’aka ya; ma ọ na-eme dị ka ọ tọrọ ya ụtọ, mee onwe ya ukwuu.”—Daniel 8:4.
7 N’ọhụụ bu ụzọ e nyere Daniel, anụ ọhịa nke si n’oké osimiri rịgopụta nke yikwara ọdụm nwere nku ugo esewo onyinyo Babilọn. (Daniel 7:4, 17) Anụ ọhịa ihe atụ ahụ ghọrọ nke na-enweghị ike iguzo n’ihu “ebule” nke ọhụụ ọhụrụ a. Saịrọs Onye Ukwuu meriri Babilọn na 539 T.O.A. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 50 mgbe nke ahụ gasịrị, ‘ọ dịghị anụ,’ ma ọ bụ ọchịchị ọ bụla nwere ike imeri Alaeze Ukwu Medo-Peasia—ike ọchịchị ụwa nke anọ nke amụma Bible.
8, 9. (a) Olee otú “ebule” ahụ si “na-asọ mpi n’akụkụ Ọdịda anyanwụ, na n’akụkụ Ugwu, na n’akụkụ Ndịda”? (b) Gịnị ka akwụkwọ Esta na-ekwu banyere onye nọchiri Eze Daraịọs nke Mbụ nke Peasia?
8 N’isite “n’ọwụwa anyanwụ” bịa, Ike Ọchịchị Ụwa Medo-Peasia mere ihe masịrị ya, “na-asọ mpi n’akụkụ Ọdịda anyanwụ, na n’akụkụ Ugwu, na n’akụkụ Ndịda.” (Aịsaịa 46:11) Eze Cambyses nke Abụọ, bụ́ onye nọchiri Saịrọs Onye Ukwu, meriri Ijipt. Onye nọchiri ya bụ Eze Daraịọs Mbụ nke Peasia, bụ́ onye gara n’akụkụ ọdịda anyanwụ gabiga ọwa mmiri Bosporus na 513 T.O.A. ma wakpoo ókèala Europe bụ́ Thrace, nke isi obodo ya bụ Byzantium (bụ́ Istanbul ugbu a). N’afọ 508 T.O.A., o meriri Thrace, o merikwara Masedonia na 496 T.O.A. Ya mere, ka ọ na-erule oge Daraịọs, “ebule” nke Medo-Peasia enwetawo ókèala n’akụkụ atọ bụ́ isi: akụkụ ebe ugwu banye na Babylonia na Asiria, n’ebe ọdịda anyanwụ gabiga Asia Minor, sitekwa na ndịda banye n’Ijipt.
9 N’ịgba akaebe banyere ịdị ukwuu nke Alaeze Ukwu Medo-Peasia, Bible na-ekwu banyere onye nọchiri Daraịọs, bụ́ Xerxes nke Mbụ, dị ka “Ahasuerọs nke bụ eze [otu narị ala a na-achị achị na iri abụọ na asaa], site n’India wee ruo Etiopia.” (Esta 1:1) Ma alaeze ukwu a ga-apụrụ ọzọ n’ụzọ, n’akụkụ a kwa, ọhụụ Daniel na-ekpughe ụfọdụ ihe ọmụma sara mbara na-akpali akpali ndị kwesịrị iwusi okwukwe anyị ike n’okwu amụma nke Chineke.
MKPI AHỤ ETIDA EBULE AHỤ
10. N’ọhụụ Daniel, olee anụ tigburu “ebule” ahụ?
10 Cheedị nnọọ otú ihe Daniel na-ahụ ugbu a na-aghaghị isiworị ju ya anya. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Mụ onwe m nọ na-achịgharị uche m, ma, lee, otu mkpi siri n’Ọdịda anyanwụ bịa n’elu ụwa nile, ma ọ dịghị emetụ ala ma ọlị: mkpi ahụ nwekwara mpi juru anya n’olile n’etiti anya ya abụọ. O wee bịakwute ebule ahụ nke nwere mpi abụọ, nke m hụrụ ka ọ na-eguzo n’ihu osimiri ahụ, o wee gbakwasị ya ọsọ n’ọnụma nke ike ya. M wee hụ ya ka ọ na-abịarutụ ebule ahụ nso, o wee wesa ya iwe dị ilu, tigbuo ebule ahụ, sọjie mpi ya abụọ; ike adịghịkwa ebule ahụ iguzo n’ihu ya, o wee tụda ya n’ala, zọda ya ụkwụ; ọ dịghịkwa onye na-anapụta ebule n’aka ya.” (Daniel 8:5-7) Gịnị ka ihe a nile pụtara?
11. (a) Olee otú mmụọ ozi Gebriel si kọwaa “mkpi ahụ nke nwere ajị́ hie nne” na “mpi ukwu” ya? (b) Ònye ka mpi ahụ pụtara ìhè sere onyinyo ya?
11 A hapụghị ma Daniel ma anyị onwe anyị ịnọ na-akọ nkọ ihe ọhụụ ahụ nwere ike ịbụ. “Mkpi ahụ nke nwere ajị́ hie nne bụ eze Jevan [Gris, NW]: ma mpi ukwu ahụ nke dị n’etiti anya ya abụọ, nke ahụ bụ eze mbụ,” ka mmụọ ozi Gebriel gwara Daniel. (Daniel 8:21) Na 336 T.O.A., e chiri eze ikpeazụ nke Alaeze Ukwu Peasia, Daraịọs nke Atọ (Codommanus), eze. N’otu afọ ahụ, Alexander ghọrọ eze na Masedonia. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na Alexander Onye Ukwu ghọrọ “eze Gris” nke mbụ ahụ e buru n’amụma. Na-amalite “n’Ọdịda anyanwụ,” n’afọ 334 T.O.A., Alexander mere ihe ngwa ngwa. Dị ka a ga-asị na “ọ dịghị emetụ ala ma ọlị,” o meriri ókèala dị iche iche ma tigbuo “ebule ahụ.” N’iweta ọchịchị Medo-Peasia nke nọworo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ abụọ ná njedebe, Gris si otú a ghọọ ike ọchịchị ụwa nke ise dị mkpa n’akụkọ Bible. Lee ka o si bụrụ mmezu dị ịrịba ama nke amụma Chineke!
12. Olee otú e si ‘gbajie mpi ukwu’ nke mkpi ihe atụ ahụ, oleekwa mpi anọ pupụtara n’ọnọdụ ya?
12 Ma ike Alexander agaghị adịte aka. Ọhụụ ahụ gara n’ihu na-ekpughe, sị: “Mkpi ahụ wee mee onwe ya ukwuu hie nne: ma mgbe o nwere ume, a gbajiri mpi ukwu ya; mpi anọ nke juru anya n’olile wee pute n’ọnọdụ ya chere ihu n’ifufe anọ nke eluigwe.” (Daniel 8:8) N’ịkọwa amụma ahụ, Gebriel na-ekwu, sị: “Mpi ahụ, nke gbajiri agbaji, nke mpi anọ guzoro n’ọnọdụ ya, alaeze anọ ga-esi ná mba ahụ guzo, ma ọ bụghị n’ike ya.” (Daniel 8:22) Dị ka e buru n’amụma, mgbe ọ nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke mmeri ya, a “gbajiri” Alexander, ma ọ bụ ọ nwụrụ, mgbe ọ dị nanị afọ 32. Anọ n’ime ndị ọchịagha ya mesịkwara kewaa alaeze ukwu ya.
OTU MPI NTA BỤ́ IHE OMIMI
13. Gịnị topụtara n’otu n’ime mpi anọ ahụ, oleekwa otú o si mee omume?
13 Akụkụ nke ọzọ nke ọhụụ ahụ dịruru ihe karịrị afọ 2,200, mmezu ya dịruru oge a. Daniel na-ede, sị: “Otu n’ime ha [mpi anọ ahụ] ka otu mpi nta siri pụta, o wee [dịkarịsịa] ukwuu, n’ụzọ Ndịda, na n’ụzọ Ọwụwa anyanwụ, na n’ụzọ ala ahụ mara mma. O wee dị ukwuu ruo usuu ihe nile nke eluigwe; o wee mee ka ụfọdụ n’ime usuu ihe nile nke eluigwe na n’ime kpakpando daa n’ala, o wee zọda ha ụkwụ. Ọbụna ruo Onyeisi nke usuu ahụ ka o mere onwe ya ukwuu; ọ bụkwa n’aka Ya ka ọ napụrụ àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe dum, a tụdakwara ọnọdụ nke ebe nsọ Ya. A na-enyekwa ya usuu ndị agha imegide àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe dum n’ihi mmehie; o wee tụda eziokwu n’ala, mee ihe, ihe gakwaara ya.”—Daniel 8:9-12.
14. Gịnị ka mmụọ ozi Gebriel kwuru banyere ihe mpi nta ihe atụ ahụ na-eme, gịnịkwa ga-eme mpi ahụ?
14 Tupu anyị enwee ike ịghọta ihe okwu ndị ahụ a ka hotasịrị n’elu pụtara, anyị aghaghị ịṅa mmụọ ozi Chineke ntị. Mgbe ọ rụtụsịrị aka ná mmalite ọchịchị nke alaeze anọ ahụ sitere n’alaeze ukwu Alexander, mmụọ ozi Gebriel na-ekwu, sị: “Na mgbe ikpeazụ nke alaeze ha, mgbe ndị njehie ga-ejehiezuworị, otu eze ga-eguzo ọtọ, nke nwere ihu dị ike, ọ bụkwa onye na-aghọta okwu omimi dị iche iche. Ike ya ga-esikwa ike, ma ọ bụghị n’ike nke aka ya; ọ ga-ebibikwa n’ụzọ dị ebube, ihe ga-agakwara ya nke ọma, ọ ga-emekwa ihe: ọ ga-ebibikwa ndị nwere ume na ndị ahụ, bụ́ ndị nsọ. Ọ ga-esitekwa n’ezi uche ya mee ka aghụghọ gaa nke ọma n’aka ya; ọ bụkwa n’obi ya ka ọ ga-eme onwe ya ukwuu; ọ bụkwa na mgbe udo ha ka ọ ga-ebibi ọtụtụ mmadụ: ọ bụkwa imegide onyeisi nke ndị isi ka ọ ga-eguzo; ma a ga-agbaji ya n’ejighị aka.”—Daniel 8:23-25.
15. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ gwara Daniel ka o mee n’ihe banyere ọhụụ ahụ?
15 “Gị onwe gị zobe ọhụụ ahụ,” ka mmụọ ozi ahụ na-agwa Daniel, “n’ihi na ọ dịịrị ọtụtụ ụbọchị dị n’ihu.” (Daniel 8:26) Mmezu nke akụkụ a nke ọhụụ ahụ agaghị ewere ọnọdụ ruo “ọtụtụ ụbọchị,” Daniel ‘ga-ezobekwa ọhụụ ahụ.’ O doro anya na ihe ọ pụtara nọgidere na-abụrụ Daniel ihe omimi. Otú ọ dị, ka ọ dị ugbu a, “ọtụtụ ụbọchị” ndị ahụ aghaghị ịgafeworị. Ya mere anyị na-ajụ: ‘Gịnị ka akụkọ ihe mere eme nke ụwa na-ekpughe banyere mmezu nke ọhụụ amụma a?’
MPI NTA AHỤ ADỊ IKE NKE UKWUU
16. (a) Olee mpi ihe atụ nke mpi nta ahụ si na ya pute? (b) Olee otú Rom si ghọọ ike ọchịchị ụwa nke isii nke amụma Bible, ma n’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ mpi nta ihe atụ ahụ?
16 Dị ka akụkọ ihe mere eme na-egosi, mpi nta ahụ si n’otu n’ime mpi ihe atụ anọ ahụ—nke dịkarịsịrị anya n’ebe ọdịda anyanwụ—pupụta. Nke a bụ alaeze Gris nke Ọchịagha Cassander nke chịrị Masedonia na Gris. Ka oge na-aga, alaeze Ọchịagha Lysimachus, bụ́ eze Thrace na Asia Minor weghaara alaeze a. Na narị afọ nke abụọ tupu Oge Anyị, Rom meriri akụkụ ọdịda anyanwụ ndị a nke ógbè Gris. Ka ọ na-erulekwa afọ 30 T.O.A., Rom weghaara alaeze Gris nile, na-eme onwe ya ike ọchịchị ụwa nke isii nke amụma Bible. Ma Alaeze Ukwu Rom abụghị mpi nta ahụ dị n’ọhụụ Daniel, n’ihi na alaeze ukwu ahụ anọgideghị ruo “mgbe a kara aka nke ọgwụgwụ ihe nile.”—Daniel 8:19.
17. (a) Njikọ dị aṅaa ka Britain na Alaeze Ukwu Rom nwere? (b) Olee njikọ dị n’etiti Alaeze Ukwu Britain na alaeze ndị Gris bụ́ Masedonia na Gris?
17 Mgbe ahụ, gịnị ka akụkọ ihe mere eme kọwara dị ka ‘eze nwere ihu dị ike’ nke na-eme mwakpo? N’ezie Britain bụ ihe dị n’akụkụ ọdịda anyanwụ ebe ugwu nke si n’Alaeze Ukwu Rom pụta. Ruokwa ná mmalite nke narị afọ nke ise O.A., e nwere ógbè ndị Rom n’ihe bụ Britain ugbu a. Ka oge na-aga, Alaeze Ukwu Rom dalatara, ma mmetụta nke mmepeanya Gris na Rom dịgidere na Britain nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke Europe ndị nọbu n’okpuru ọchịchị Rom. “Mgbe Alaeze Ukwu Rom dara,” ka onye Mexico na-ede uri na akwụkwọ nke ritere Onyinye Nobel bụ́ Octavio Paz dere, “Chọọchị weghaara ọnọdụ ya.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ndị nna Chọọchị, nakwa ndị ọkà mmụta pụtara ka oge na-aga, webatara nkà ihe ọmụma ndị Gris n’ozizi ndị Kraịst.” Onye ọkà ihe ọmụma na onye ọkà mgbakọ na mwepụ nke narị afọ nke 20 bụ́ Bertrand Russell kwuru, sị: “Mmepeanya nke Ebe Ọdịda Anyanwụ, bụ́ nke si na Gris pụta, dabeere n’echiche nkà ihe ọmụma na nke sayensị nke malitere na Militọs [obodo ndị Gris dị n’Asia Minor] puku afọ abụọ na ọkara gara aga.” Ya mere, a pụrụ ikwu na ọdịbendị nke Alaeze Ukwu Britain malitere site n’alaeze ndị Gris bụ́ Masedonia na Gris.
18. Gịnị bụ mpi nta ahụ nke ghọrọ ‘eze nwere ihu dị ike’ “na mgbe nke ọgwụgwụ ihe nile”? Kọwaa.
18 Ka ọ na-erule afọ 1763 O.A., Alaeze Ukwu Britain emeriwo mba abụọ siri ike na-ama ya aka, bụ́ Spain na France. Malite mgbe ahụ o gosipụtara onwe ya ịbụ mba kasị ike n’oké osimiri na ike ọchịchị ụwa nke asaa nke amụma Bible. Ọbụna mgbe ókèala 13 nke America kewapụsịrị onwe ha site na Britain na 1776 iji guzobe United States of America, Alaeze Ukwu Britain mụbara ịgụnye otu ụzọ n’ụzọ anọ nke elu ala na otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi na ya. Ike ọchịchị ụwa nke asaa a nwetakwara ike ka ukwuu mgbe United States of America sonyeere Britain iji guzobe ike ọchịchị ụwa ahụ dị abụọ bụ́ Anglo-America. N’ụzọ akụ̀ na ụba na n’ike agha, ike ọchịchị a n’ezie aghọwo ‘eze nwere ihu dị ike.’ Mgbe ahụ, mpi nta ahụ nke ghọrọ ike ọchịchị dị ike “na mgbe nke ọgwụgwụ ihe nile” bụ Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America.
19. Gịnị bụ “ala ahụ mara mma” e kwuru banyere ya n’ọhụụ ahụ?
19 Daniel hụrụ na mpi nta ahụ “dịkarịsịrị ukwuu” “n’ụzọ ala ahụ mara mma.” (Daniel 8:9) Ala Nkwa ahụ nke Jehova nyere ndị ya ọ họọrọ, mara nnọọ mma nke na a kpọrọ ya “ịma mma nke ala nile,” ya bụ, nke ụwa nile. (Ezikiel 20:6, 15) N’eziokwu, Britain weghaara Jerusalem na December 9, 1917, n’afọ 1920 kwa, òtù Njikọ Mba Nile nyere Great Britain ike ịchị Palestine ruo May 14, 1948. Ma ọhụụ ahụ bụ amụma, na-enwe ọtụtụ ihe nnọchianya. “Ala ahụ mara mma” e kwuru banyere ya n’ọhụụ ahụ na-anọchikwa anya, ọ bụghị Jerusalem, kama ọnọdụ elu ala nke ndị Chineke weere dị ka ndị dị nsọ n’oge ike ọchịchị ụwa nke asaa ahụ. Ka anyị lee otú Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America si nwaa iyi ndị nsọ egwu.
A TỤDA “EBE NSỌ YA”
20. Olee ndị bụ “usuu ihe nile nke eluigwe” na “kpakpando” nke mpi nta ahụ na-anwa ime ka ha daa n’ala?
20 Mpi nta ahụ “wee dị ukwuu ruo usuu ihe nile nke eluigwe; o wee mee ka ụfọdụ n’ime usuu ihe nile nke eluigwe na n’ime kpakpando daa n’ala.” Dị ka mmụọ ozi ahụ si kọwaa ya, “usuu ihe nile nke eluigwe” na “kpakpando” nke mpi nta ahụ na-anwa ime ka ha daa n’ala bụ “ndị nsọ.” (Daniel 8:10, 24) “Ndị nsọ” a bụ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. N’ihi ịbụ ndị e mere ka ha na Chineke nwee mmekọrịta site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke ọbara Jisọs Kraịst wụsịrị mere ka ọ malite ịdị irè, e mere ka ha dị nsọ, dịkwa ọcha, dookwa ha iche maka ijere nanị Chineke ozi. (Ndị Hibru 10:10; 13:20) Ebe e meworo ka ha bụrụ ndị ha na Ọkpara ya ga-eketakọ ihe nketa eluigwe, Jehova na-ewere ha dị ka ndị dị nsọ. (Ndị Efesọs 1:3, 11, 18-20) Mgbe ahụ, n’ọhụụ Daniel, “usuu ihe nile nke eluigwe” na-ezo aka n’ihe fọdụrụ n’elu ala n’ime “ndị nsọ” ahụ dị 144,000, bụ́ ndị ga-eso Nwa Atụrụ ahụ chịa n’eluigwe.—Mkpughe 14:1-5.
21. Ònye nọ ‘n’ebe nsọ’ ahụ nke ike ọchịchị ụwa nke asaa ahụ na-anwa ime ka ọ tọgbọrọ n’efu?
21 Taa, ihe fọdụrụnụ n’ime 144,000 bụ ndị nnọchiteanya elu ala nke “Jerusalem nke dị n’eluigwe”—Alaeze Chineke nke yiri obodo—na ndokwa ụlọ nsọ ya. (Ndị Hibru 12:22, 28; 13:14) N’echiche a ha nọ ‘n’ebe nsọ’ nke ike ọchịchị ụwa nke asaa ahụ na-anwa ịzọda na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu. (Daniel 8:13) N’ikwukwa banyere ebe nsọ ahụ dị ka “ọnọdụ nke ebe nsọ [Jehova],” Daniel na-asị: “Ọ bụkwa n’aka [Jehova] ka ọ napụrụ àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe dum, a tụdakwara ọnọdụ nke ebe nsọ Ya. A na-enyekwa ya usuu ndị agha imegide àjà nsure ọkụ a na-esure mgbe dum n’ihi mmehie; o wee tụda eziokwu n’ala, mee ihe, ihe gakwaara ya.” (Daniel 8:11, 12) Olee otú e si mezuo nke a?
22. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, olee otú ike ọchịchị ụwa nke asaa ahụ si mee “mmehie” dị ịrịba ama?
22 Gịnị bụ ahụmahụ Ndịàmà Jehova n’oge Agha Ụwa nke Abụọ? A kpagburu ha nke ukwuu! Ọ malitere na mba ndị Nazi na nke ndị Fascist. Ma n’oge na-adịghị anya ‘a nọ na-atụda eziokwu n’ala’ n’ebe nile ‘mpi nta ahụ nke ike ya dịworo ike’ na-achị. A machibidoro “usuu” ndị nkwusa Alaeze ahụ na ọrụ ha nke ikwusa “ozi ọma” ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná mba nile so ná Njikọ nke Mba Ndị Nọbụ n’Okpuru Britain. (Mak 13:10) Mgbe mba ndị a na-edebanye aha ndị ala ha n’ọrụ agha, ha jụrụ ịgụpụ Ndịàmà Jehova dị ka ndị ozi, n’egosighị nkwanye ùgwù ọ bụla maka nhọpụta Chineke họpụtara ha dị ka ndị ozi ya. Ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi nọ na United States bụ ndị ìgwè ndị mmadụ mesoro ihe ike ma kparịa nnọọ n’ụzọ dị iche iche. N’ezie, ike ọchịchị ụwa nke asaa ahụ nwara iwepụ àjà otuto—“mkpụrụ egbugbere ọnụ”—nke ndị Jehova na-achụrụ ya mgbe nile dị ka akụkụ nke ofufe ha na-efe ya “mgbe dum.” (Ndị Hibru 13:15) Ike ọchịchị ụwa ahụ si otú a mee “mmehie” nke ịwakpo ebe kwesịrị ịbụ ógbè Chineke Kasị Ihe Nile Elu—“ọnọdụ nke ebe nsọ Ya.”
23. (a) N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, olee otú Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America si guzo “imegide onyeisi nke ndị isi”? (b) Ònye bụ “onyeisi nke ndị isi”?
23 Site n’ịkpagbu “ndị nsọ” ahụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, mpi nta ahụ mere onwe ya ka ọ dị ukwuu “ruo Onyeisi nke usuu ahụ.” Ma ọ bụ, dị ka mmụọ ozi Gebriel na-ekwu, o guzoro “imegide onyeisi nke ndị isi.” (Daniel 8:11, 25) Utu aha ahụ bụ́ “onyeisi nke ndị isi” dịịrị nanị Jehova Chineke. Okwu Hibru bụ́ sar, nke a sụgharịrị ịbụ “onyeisi,” yiri ngwaa pụtara “chịa ọchịchị.” Tụkwasị n’izo aka n’ọkpara eze ma ọ bụ onye nọ n’ọkwá eze, okwu ahụ na-emetụta onye bụ́ isi. Akwụkwọ Daniel na-ehota ndị isi ndị ọzọ bụ́ ndị mmụọ ozi—dị ka ihe atụ, Maịkael. Chineke bụ Onyeisi Kasịnụ nke ndị isi nile dị otú ahụ. (Daniel 10:13, 21; tụlee Abụ Ọma 83:18.) Ànyị pụrụ iche na onye ọ bụla pụrụ imegide Jehova—Onyeisi nke ndị isi?
E WETA “EBE NSỌ” N’EZI ỌNỌDỤ
24. Mmesi obi ike dị aṅaa ka Daniel 8:14 na-enye anyị?
24 Ọ dịghị onye pụrụ iguzogide Onyeisi nke ndị isi ahụ—ọbụnadị eze nke “ihu ya siri ike” dị ka Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America agaghị emeli ya! Mbọ eze a gbara ime ka ebe nsọ Chineke bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu agaghị aga nke ọma. Mgbe “puku ụbọchị abụọ na narị atọ” gasịrị, ka mmụọ ozi ahụ na-ekwu, “a ga-eweta ebe nsọ ahụ n’ezi ọnọdụ ya n’ezie,” ma ọ bụ ọ “ga-enwe mmeri.”—Daniel 8:13, 14; The New English Bible.
25. Olee otú ụbọchị 2,300 ahụ e buru n’amụma haruru n’ogologo, oleekwa ihe omume a ga-ejikọrịrị ya na ya?
25 Ụbọchị 2,300 ahụ bụ oge amụma. N’ihi ya, ọ gụnyere ụbọchị 360 nke afọ amụma. (Mkpughe 11:2, 3; 12:6, 14) Mgbe ahụ, ụbọchị 2,300 a ga-adị afọ 6, ọnwa 4, na ụbọchị 20. Olee mgbe e nwere oge a? N’afọ ndị 1930, a malitere ịkpagbu ndị Chineke n’ụzọ na-arịwanye elu ná mba dị iche iche. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ kwa, a kpagburu Ndịàmà Jehova n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ ná mba ndị dị n’okpuru ike ọchịchị ụwa dị abụọ bụ́ Anglo-America. N’ihi gịnị? N’ihi nnọgide ha nọgidere ‘na-ekwenyere Chineke karịa mmadụ.’ (Ọrụ 5:29) Ya mere, a ga-ejikọtarịrị ụbọchị 2,300 ahụ na agha ahụ.b Ma gịnị ka a pụrụ ikwu banyere mmalite na ọgwụgwụ nke oge amụma a?
26. (a) Malite ole mgbe, ma ọ dịkarịsịa anya, ka e kwesịrị ịmalite gụwa ụbọchị 2,300 ahụ? (b) Olee mgbe oge ahụ dị ụbọchị 2,300 gwụsịrị?
26 Iji ‘weta,’ ma ọ bụ weghachi “ebe nsọ” ahụ n’otú o kwesịrị ịdị, ụbọchị 2,300 ahụ aghaghị ịmaliteworị n’oge ọ nọbu “n’ezi ọnọdụ” n’ụzọ Chineke si ele ihe anya. Ma ọ dịkarịsịa anya, nke a bụ na June 1, 1938, mgbe Ụlọ Nche (Bekee) bipụtara akụkụ nke 1 nke isiokwu bụ́ “Nhazi.” Akụkụ nke 2 pụtara ná mbipụta nke June 15, 1938. Ịgụ ụbọchị 2,300 (afọ 6, ọnwa 4, na ụbọchị 20 na kalenda ndị Juu) malite na June 1 ma ọ bụ 15, 1938, na-eweta anyị n’October 8 ma ọ bụ 22, 1944. N’ụbọchị mbụ nke mgbakọ pụrụ iche e nwere na Pittsburgh, Pennsylvania, U.S.A., na September 30 na October 1, 1944, onyeisi oche nke Watch Tower Society kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Nkwekọ Ọchịchị Chineke Taa.” Ná nzukọ ndị òtù ya bụ́ nke a na-enwe kwa afọ nke e nwere n’October 2, e mezigharịrị akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ nke Society ná mgbalị ime ka o kwekọọ ná ndokwa ọchịchị Chineke karị ruo n’ókè iwu ga-enye ohere ya. Site ná mbipụta nke nkọwa doro anya karị nke ihe ndị Bible chọrọ, e guzobere nhazi ọchịchị Chineke n’ụzọ zuru ezu karị n’ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova n’oge na-adịghị anya.
27. Olee ihe ama na-egosi na e gbochiri ‘ihe ahụ a na-eme mgbe dum’ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ahụ jupụtara ná mkpagbu?
27 Ọ bụ ezie na ụbọchị 2,300 ahụ weere ọnọdụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, bụ́ nke malitere na 1939, e gbochiri ịchụ àjà nke ‘ihe ahụ a na-eme mgbe dum’ n’ebe nsọ Chineke ruo n’ókè dị ukwuu n’ihi mkpagbu. Na 1938 Watch Tower Society nwere alaka 39 na-elekọta ọrụ Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, ma ka ọ na-erule 1943, e nwere nanị 21. Mmụba ndị e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze dịkwa ntakịrị n’oge ahụ.
28, 29. (a) Ka Agha Ụwa nke Abụọ na-abịa ná ngwụsị ya, gịnị weere ọnọdụ ná nzukọ Jehova? (b) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere mgbalị kpụ ọkụ n’ọnụ nke onye iro ahụ mere iji bibie ma mee ka “ebe nsọ” ahụ tọgbọrọ n’efu?
28 Dị ka anyị rịbaworo ama, n’ọnwa ikpeazụ nke Agha Ụwa nke Abụọ, Ndịàmà Jehova kwupụtaghachiri mkpebi ha ibuli ịchịisi Chineke elu site n’ijere ya ozi dị ka nzukọ ọchịchị Chineke. Ọ bụ iji mezuo nke ahụ mere e ji malite ịhazigharị ọrụ na usoro nlekọta ha na 1944. N’ezie, Ụlọ Nche nke October 15, 1944, (Bekee) nwere isiokwu a kpọrọ “Ndị A Haziri Maka Ọrụ Ikpeazụ.” Ya na isiokwu ndị ọzọ metụtara ije ozi ndị e nwere n’otu oge ahụ gosiri na ụbọchị 2,300 ahụ agwụsịwo nakwa na “ebe nsọ” ahụ abịaghachiwo ọzọ “n’ezi ọnọdụ ya.”
29 Mgbalị kpụ ọkụ n’ọnụ nke onye iro ahụ mere ibibi na ime ka “ebe nsọ” ahụ tọgbọrọ n’efu akụọla afọ n’ala kpam kpam. N’ezie, “ndị nsọ” ahụ fọdụrụ n’ụwa, ha na ndị enyi ha bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ, emeriwo. (Mkpughe 7:9) Ebe nsọ ahụ, n’ịbụ nke nọ n’ezi ọnọdụ ya n’ọchịchị Chineke, na-aga n’ihu ugbu a ijere Jehova ozi dị nsọ.
30. Gịnị ga-eme ‘eze ahụ nwere ihu dị ike’ n’isi nso?
30 Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America ka nọ n’ọkwá ya. “Ma a ga-agbaji ya n’ejighị aka,” ka mmụọ ozi Gebriel kwuru. (Daniel 8:25) N’isi nso, a ga-agbaji ike ọchịchị ụwa nke asaa a nke amụma Bible—‘eze a nwere ihu dị ike’—ọ bụghị site n’aka mmadụ, kama site n’ike karịrị nke mmadụ n’Amagedọn. (Daniel 2:44; Mkpughe 16:14, 16) Lee ka o si bụrụ ihe obi ụtọ ịmara na a ga-ewepụ ọbụbụeze Jehova Chineke, bụ́ Onyeisi nke ndị isi nile n’ụta mgbe ahụ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ike ọchịchị ụwa asaa ndị dị mkpa n’ụzọ pụrụ iche na Bible bụ Ijipt, Asiria, Babylonia, Medo-Peasia, Gris, Rom, na ike ọchịchị ụwa ahụ dị abụọ bụ́ Anglo-America. Ha nile dị ịrịba ama n’ihi na ha na ndị Jehova mekọrọ ihe.
b Daniel 7:25 na-ekwukwa banyere oge mgbe ‘a ga-eme ka ndị nsọ nke Onye ahụ nke kachasị ihe nile elu kaa nká.’ Dị ka a kọwara n’isiokwu bu ụzọ, e jikọtara nke a na agha ụwa mbụ.
GỊNỊ KA Ị GHỌTARA?
• Gịnị ka ihe ndị na-esonụ sere onyinyo ha?
“ebule” nwere “mpi abụọ.”
“mkpi ahụ nke nwere ajị́ hie nne” ya na “mpi ukwu” ya.
mpi anọ nke na-epupụta n’ọnọdụ “mpi ukwu ahụ.”
mpi nta ahụ nke pụtara site n’otu n’ime mpi anọ ahụ.
• N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, olee otú Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America si nwaa ime ka “ebe nsọ” ahụ tọgbọrọ n’efu, ò meliri ya?
[Map/Foto dị na peeji nke 166]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
ALAEZE UKWU MEDO-PEASIA
MASEDONIA
IJIPT
Memfis
ETIOPIA
Jerusalem
Babilọn
Akmeta
Susa
Persepolis
INDIA
[Map/Foto dị na peeji nke 169]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Alaeze Ukwu Gris
MASEDONIA
IJIPT
Babilọn
Osimiri Indus
[[Map dị na peeji 172]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Alaeze Ukwu Rom
GREAT BRITAIN
ITALI
Rom
Jerusalem
IJIPT
[Foto dị na peeji nke nke 164]
[Foto ndị dị na peeji nke 174]
Ụfọdụ ndị a ma ama n’Ike Ọchịchị Ụwa Anglo-America:
1. George Washington, president mbụ nke United States (1789-1797)
2. Eze Nwanyị Victoria nke Britain (1837-1901)
3. Woodrow Wilson, president United States (1913-1921)
4. David Lloyd George, praịm minista nke Britain (1916-1922)
5. Winston Churchill, praịm minista nke Britain (1940-1945, 1951-1955)
6. Franklin D. Roosevelt, president United States (1933-1945)