Iwusawanye Alaka Ụlọ Ọrụ Dị na Nigeria
1. N’ụzọ dị nkenke, kọọ otú Betel anyị dị n’Igieduma si malite.
1 N’afọ 1984, a malitere ịrụ mgbidi Betel anyị dị n’Igieduma. Na January 20, 1990, bụ́ mgbe afọ isii gasịrị, a raara Betel ahụ nye Jehova. N’ezie, oge ahụ bụ oge obi ụtọ nke a na-anaghị echefu echefu. Ọ bụ oge dị nnọọ ịrịba ama ma a bịa n’akụkọ banyere ọrụ nkwusa na Nigeria! A rụrụ ụlọ obibi ndị dị na Betel nke Igieduma maka narị mmadụ anọ. Ala a rụrụ ụlọ obibi ndị a na ya ji ihe karịrị okpukpu abụọ karịa Betel nke ochie, bụ́ nke dị na Shomolu, Lagos.
2. Olee ndị bịarala kirie Betel anyị dị n’Igieduma kemgbe e bidoro rụwa ya?
2 Kemgbe a malitere ọrụ na Betel anyị dị n’Igieduma, ọtụtụ iri puku ụmụnna abịala leta ya. Ọtụtụ n’ime unu ahụla ihe ndị mara mma a rụrụ n’ebe ahụ. Ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà, gụnyere ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị, na-abịakwa ekiri ọmarịcha Betel anyị. Anyị na-ejikwa obi ụtọ anabata mmadụ nile.
3. Olee mmụba anyị nwerela kemgbe afọ 1990?
3 Kemgbe afọ 1990, ọrụ anyị na-arụ na Nigeria amụbaala. Ọmarịcha ihe ndị a rụrụ na Betel emeela ka anyị nwee ike ijere unu ozi n’ụzọ ka mma, o meekwala ka e nwee mkpa nke iwusawanye Betel ugbu a. Na January 1990, bụ́ mgbe a raara Betel nye Jehova, ndị nkwusa e nwere ná mba a dị otu narị puku na iri puku atọ na itoolu, na otu narị na iri ise. Ole ka ha dị ugbu a? Ha eruola narị puku abụọ na iri puku asatọ na isii, na narị anọ na iri ise na ise, nke ji ihe karịrị okpukpu abụọ karịa ole ha dị mgbe ahụ! Iji nwee ike ịhụ maka mmụba ndị a a na-enwe, ọnụ ọgụgụ ndị ezinụlọ Betel mụbakwara. Ugbu a, anyị nwere narị mmadụ ise na iri asaa na-eje ozi na Betel, ọ bụrụkwa na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị abịa ụlọ akwụkwọ ha, anyị na-eru ihe karịrị narị isii. Biko, unu echefukwala na a rụrụ ụlọ obibi Betel anyị maka nanị narị mmadụ anọ. Nke a emeela ka ụlọ obibi Betel anyị gharazie ịdị na-aba anyị aba.
4, 5. Olee otú ọrụ banyere ịrụ ụlọ ndị a na-anọ efe Chineke si gaa n’ihu n’ihu kemgbe 1990?
4 A kwụsịghị iwu ihe owuwu na Nigeria mgbe e wuchara alaka ụlọ ọrụ anyị n’afọ 1990. Obere oge e wusịrị ya, a malitere ịrụ Ụlọ Mgbakọ ndị mara mma ma buo ibu n’ebe dị iche iche na mba a. Ebe ndị ahụ bụ Akure, Daluwon, Enugu, Ibadan, Igwurita Ali, Mgboko Umuoria, Ota, Ubogo, na Uli.
5 A malitekwara iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị na-ebughị oké ibu, ma ha dị ùgwù n’anya, na-adọrọkwa mmasị. Ìgwè iri atọ na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze anọrọla na-arụsi ọrụ ike, ọgbakọ ndị ha na-arụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na-enyekwara ha aka. Ka ọnwa August 2006 na-agwụla, e wuola ma rara Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ dị otu puku, narị ise na iri asaa na anọ, nye Jehova! Ọgbakọ ndị nọrọla na-amụ ihe ruo ọtụtụ afọ n’ụlọ mgbe ochie ma ọ bụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze a na-ewuchaghị ewucha, enweela ụlọ ndị mara mma ma kwesị ekwesị ha na-anọ efe ezi ofufe n’obodo ha. Ọgbakọ ndị a nwere nnọọ oké ọṅụ ma na-ekele Jehova maka ya! Ọrụ ka na-agakwa n’ihu ugbu a n’ihi na a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ karịrị narị atọ kwa afọ. Anyị ka nwere ihe dị ka narị Ụlọ Nzukọ Alaeze itoolu anyị ga-ewu.
6. Olee ihe dị ọhụrụ banyere Ụlọ Mgbakọ ndị a na-arụ ugbu a?
6 N’ezie, kemgbe afọ atọ gara aga, a nọwo na-ewu ma Ụlọ Nzukọ Alaeze ma Ụlọ Mgbakọ ndị ọhụrụ n’ebe dị iche iche ná mba a. E nwere ụdị Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ ndị a na-arụ ugbu a. A rụchaala ụdị Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ a n’Agbor, n’Awi (nke dịdebere Calabar), nakwa na Benin City. Otu ìgwè nke ndị na-ewu ihe owuwu na-ewu Ụlọ Mgbakọ ndị ọhụrụ, ebe ìgwè nke ọzọ na-arụchapụ ndị nke a na-arụchaghị arụcha. N’afọ gara aga, a rụchapụrụ Ụlọ Mgbakọ ndị dị n’Akure, Igwuruta Ali, na Ilesa.
7. (a) Gịnị bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze a rụrụ n’ụdị a pụrụ iji mere Ụlọ Mgbakọ? (b) Ole ka a rụcharala na Nigeria, oleekwa ebe ndị a rụrụ ha?
7 Anyị na-arụkwa Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a pụrụ iji mere Ụlọ Mgbakọ, n’ebe dị iche iche na mba a. A rụchaala ha n’Akaeze Ukwu, Amassoma, Bori, Ikot Akan, Ilorin, Jos, Kabba, Kaduna, Katsina Ala, Makurdi, Numan, Obehie Asa, na Zaria. Ụdị Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a bụ ndị nwere nnukwu ibo ọnụ ụzọ n’azụ ya, bụ́ nke ọ ga-abụ e meghechaa ya, Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ aghọọ Ụlọ Mgbakọ nwere ike ịba ihe dị ka narị mmadụ isii ma ọ bụ otu puku na otu narị mmadụ n’oge a nọ na ya enwe mgbakọ ukwu na nke nta. E nwere ha n’ọtụtụ ebe ná mba a, bụ́ ebe ndị ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa e nwere na ha na-erughị ihe a ga-eji maka ya rụwa Ụlọ Mgbakọ. Ọgbakọ dị iche iche na-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a enwe ọmụmụ ihe ha, ma a na-eji ha emere ụlọ mgbakọ ma ọ́ dị mkpa.
8. Olee otú anyị nile n’otu n’otu pụrụ isi kwadoo nnukwu ọrụ ihe owuwu a na-aga n’ihu na Nigeria?
8 Dị ka unu pụrụ ịhụ, a na-ewu ọtụtụ ihe owuwu ná mba a, ọ na-efukwa oké ego iji wuo ha. Anyị na-ekele unu maka onyinye ndị unu nile na-enye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, bụ́ ndị a na-eji ewu nnukwu ihe a nile. Anyị anọwo na-enweta enyemaka mgbe nile site ná mba ofesi; ma n’ihi nnukwu mkpa e nwere n’ọtụtụ ebe n’ụwa, ego anyị si mba ofesi enweta ebughịzi ibu. N’ihi ya, anyị onwe anyị bụ́ ndị bi ná mba a kwesịrị ime ike anyị iji kwadoo ọrụ a.
9. (a) Olee ozi na-enye obi ụtọ anyị nwere? (b) Olee ihe mbụ a ga-arụ n’ọrụ mwusawanye a anyị na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ Nigeria? (ch) Ebee ka ọfịs ọhụrụ ahụ anyị na-arụ na Lagos dị, oleekwa ụfọdụ n’ime ihe ndị a na-arụ na ya?
9 Ka ọ dị ugbu a, anyị enweela ozi na-enye obi ụtọ! Obi ga-adị unu ụtọ ịma na Òtù Na-achị Isi akwadoola ka a rụnyekwuo ihe na Betel anyị n’ihi nnukwu mkpa nke a dị. Ọrụ amalitelarị. Ná mmalite afọ gara aga, a malitere ịrụ ọfịs ọhụrụ na Lagos. Ihe mere o ji dị mkpa ka a rụọ ya bụ na ọfịs anyị nwere na Lagos ugbu a anaghịzi aba ịnọ na ya rụọ ihe ndị ọ dị mkpa ka a nọrọ na Lagos rụọ. Site n’ebere Jehova, anyị nwetara ala buru ibu nke ga-aba ihe ndị a chọrọ ịrụ na ya. Ala ahụ dị na Mobolaji Johnson Avenue, n’akụkụ Secretariat nke gọọmenti Lagos. Ọ dịdebere okporo ụzọ awara awara siri Lagos gawa Ibadan, ọ dịkwa nso n’ebe e nweburu toll gate. Ihe a na-arụ ebe ahụ bụ otu ụlọ nke a ga-eji mere ụlọ nkwakọba ihe na ọfịs, nakwa ụlọ obibi nke ga-aba ihe ruru mmadụ 48 bụ́ ndị ọrụ Betel. Ụlọ obibi ahụ bụ ụlọ elu dị okpukpu atọ. Ọ bụ otu ụlọ ọrụ na-ewu ihe owuwu ná mba a ka e goro ọrụ ahụ. Ọrụ ahụ na-agakwa n’ihu otú a tụrụ anya ya, e bukwa n’obi ịrụcha ya n’August 1, 2007. Ị ga-ahụ foto nke ọfịs ọhụrụ ahụ a na-arụ na Lagos n’Ozi Alaeze Anyị a. Ị ga-ahụkwa ihe osise na-egosi otú ọ ga-adị ma a rụchaa ya. Ọ na-ewute anyị na anyị agaghị ekwe ka unu bịa leta ụlọ ọhụrụ ahụ ugbu a a ka na-arụ ya arụ n’ihi na ọ bụghị anyị ji aka anyị arụ ya.
10. (a) Olee ihe ndị a ga-arụ n’ọrụ mwusawanye ahụ a na-aga ịrụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Igieduma? (b) Olee ndị ga-ahụ maka ọrụ ahụ, gịnịkwa mere a ga-eji kwuo na ihe a bụ nnukwu ọrụ?
10 Anyị na-atụ anya na tupu a rụchaa ya, anyị ga-amalite iwusawanye alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Igieduma. Olee ihe ndị e bu n’obi ịrụ n’Igieduma? A ga-ewusawanye ụlọ obibi na ụlọ ọfịs okpukpu abụọ! A rụọla ọtụtụ ihe iji kwadebe maka ọrụ a. E nweela ọtụtụ ndị si mba ofesi bịa ịhụ maka ọrụ ndị ahụ, a na-atụkwa anya na ọtụtụ ndị ọzọ ka ga-abịa n’oge na-adịghị anya. Na nke mbụ a a ga-ewusawanye ụlọ obibi Betel, a ga-ewusawanye ya otú ma ụlọ ndị nke a ga-arụ ọhụrụ ma ndị nke dị adị ga-aba narị mmadụ asaa na iri ise. Mgbe a ga-ewusawanye ya ọzọ, a ga-ewusawanye ya otú ọ ga-aba otu puku mmadụ. Nke a ga-abụ nnukwu ọrụ n’ezie!
11. (a) Olee ihe ndị a ga-arụ n’alaka ụlọ anyị dị n’Igieduma? (b) Olee ndị ga-arụ ya?
11 Na nke mbụ a a ga-ewusawanye alaka ụlọ ọrụ Nigeria, a ga-arụ ụlọ ọhụrụ a ga-adọba nnukwu ìgwè ndị ọhụrụ ga na-enye ọkụ eletrik, bụ́ ndị ikike ha ga-eji okpukpu abụọ karịa ikike nke ìgwè ọkụ ndị anyị nwere ugbu a. A ga-ewukwa ụlọ obibi anọ ndị ọhụrụ, ụlọ ọhụrụ a ga na-akpọ services building, bụ́ nke ga-enwe ebe a na-anọ asa ákwà, nwee kichin na ya, nweekwa ebe a ga-anọ na-eri ihe, nke ga-aba otu puku mmadụ. A ga-arụnyekwu ihe n’ụlọ ọfịs e nwere ugbu a, nke na ọ ga-eji ihe karịrị okpukpu abụọ buo ibu karịa otú ọ há ugbu a. A ga-arụgharị ime ụlọ nke ụlọ a na-akpọ services building ugbu a, ma jirizie ya mere ụlọ a ga-anọ na-arụzi ìgwè ọrụ dị iche iche. Ụlọ ndị ọzọ a ga-arụzigharị ime ha bụ ebe e ji mere ọfịs n’ụlọ a na-anọ ebi akwụkwọ, ụlọ ọfịs e nwere ugbu a, ụlọ a ga-ebufe ngalaba na-ahụ maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụlọ a ga-eji mere klas Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, na ụlọ a ga-ebufe ngalaba na-ahụ maka ndị ọrịa. A ga-arụkwa okporo ụzọ ndị ọhụrụ. E nwekwara ọtụtụ ọrụ ndị a ga-arụ iji chọọ ala Betel mma. Anyị nwere nnọọ nnukwu ọrụ anyị ga-arụ! Anyị amabeghị ma ànyị ga-arụ ọrụ a n’onwe anyị ma nye ndị ọrụ ngo ụfọdụ ọrụ, ka ànyị ga-enye ya ụlọ ọrụ na-ewu ihe owuwu ka ha rụchaa ihe nile dị na ya dị ka anyị mere banyere ọfịs ọhụrụ a anyị na-arụ na Lagos. Ka o sina dị, ọ ga-efu nnukwu ego iji rụọ ihe nile a. Anyị ga-achọ enyemaka nke ụmụnna si n’ọgbakọ dị iche iche, ka oge na-aga, anyị ga-emekwa ka unu mara mgbe anyị chọrọ enyemaka unu.
12, 13. (a) N’ihi ọtụtụ nnukwu ọrụ ihe owuwu anyị na-arụ ugbu a, gịnị ka a na-atụ anya n’aka onye ọ bụla n’ime anyị? (b) N’ihi gịnị ka obi kwesịrị iji sie anyị ike iji mmesapụ aka nye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ?
12 Ole ndị ga-akwụ ụgwọ ihe nile a a ga-ewu, ma nke a na-ewu na Lagos, ma mwusawanye a ga-ewusawanye Betel dị n’Igieduma, ma Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche, ma Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a na-arụ n’ụdị a pụrụ iji mere Ụlọ Mgbakọ? Anyị na-arịọ unu ugbu a, ụmụnna nile n’ọgbakọ nile dị na Nigeria, ka unu kwadoo nnukwu ọrụ a a ga-arụ site n’ịdị na-enye onyinye afọ ofufo maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Dị ka unu maara, ego e ji arụ ụlọ na-arị elu kwa afọ. Anyị ga-achọ ọtụtụ onyinye ego iji rụchaa nnukwu ọrụ a anyị ji n’aka. N’ihi ya, anyị ga-achọ enyemaka unu nke ukwuu.
13 Ọtụtụ mmadụ nyere onyinye n’oge mbụ a na-arụ Betel dị n’Igieduma. Olee ihe anyị pụrụ ime na nke ugbu a? Ebe bụ́ isi a ga-esi nweta ego a ga-eji rụọ ihe ndị a bụ site n’onyinye afọ ofufo. N’ihi ya, ka anyị jiri ego kwadoo ọrụ a ruo ókè anyị nwere ike. Inye onyinye ego na nke ihe onwunwe anọwo na-abụ otu n’ime ihe ndị dị mkpa e ji mara ofufe dị ọcha. Ọ nọwokwa na-abụ otu n’ime ihe ndị na-enye obi ụtọ dị ukwuu. (1 Ihe 29:9; 2 Kọr. 9:7-11) Jidenụ n’aka na a ga-eji shịshị ọ bụla unu nyere n’onyinye mee ihe e ji maka ya nye ya. Onyinye ọ bụla unu nyere dị mkpa, obi ga-adịkwa anyị ụtọ maka ya.—Mak 12:41-44; 14:3-8.
14. Olee ihe na-emesi anyị obi ike?
14 Anyị bụ́ ndị Nigeria, ànyị ga-ebuli ibu a chere anyị ihu ugbu a? Ihe a bụ ọrụ Jehova. Ọ bụghị nke mmadụ ọ bụla. O mesiri anyị obi ike n’Abụ Ọma 127:1, sị: “Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” Ebe ọ bụ na Jehova kwere nkwa ịkwado anyị, anyị ji n’aka na anyị ga-arụcha ụlọ ọhụrụ ndị ahụ anyị na-aga ịrụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị.
[Foto dị na peeji nke 4]
Ihe osise na-egosi otú ọfịs ọhụrụ ahụ a na-arụ na Lagos ga-adị ma a rụchaa ya
[Foto dị na peeji nke 5]
Ụlọ obibi
[Foto dị na peeji nke 6]
Ụlọ a ga-eji mere ụlọ nkwakọba ihe na ọfịs