Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ndịàmà Jehova Ibe Anyị:
Pọl onyeozi ji ohere ọ bụla ọ hụrụ gwa ndị kwere ekwe ibe ya na ọ hụrụ ha n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe. O degaara Ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ ozi, sị: “Ana m enye Chineke m ekele site n’aka Jizọs Kraịst banyere unu niile, n’ihi na a na-ekwu banyere okwukwe unu n’ụwa dum.” (Rom 1:8) Ee, na narị afọ mbụ, e ji okwukwe siri ike Ndị Kraịst nwere nakwa otú ha si anụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma mara ha n’ebe niile Alaeze Ukwu Rom na-achị. (1 Tesa. 1:8) Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji hụ nnọọ ụmụnna ya n’anya!
Dị ka Pọl, anyị na-ekele Jehova mgbe ọ bụla anyị chetara unu. Anyị hụrụ unu niile n’anya nke ukwuu! Anyị jikwa n’aka na Jehova hụrụ unu n’anya n’otu n’otu. A na-akpagbu ụfọdụ n’ime unu mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ma unu nọgidesiri ike na-ekwusa ozi ọma. O doro nnọọ anya na mmụọ nkwuwa okwu na nke atụghị ụjọ unu nwere na-eme nnọọ ka obi Jehova ṅụrịa!—Ilu 27:11.
Yearbook nke afọ 2008 nwere ọtụtụ ihe na-egosi na Onyenwe Anyị Jizọs Kraịst na-aga n’ihu “na-emeri, ka o wee nwezuo mmeri ya,” nakwa na ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụsoo ụmụazụ Kraịst ọgụ agaghị aga nke ọma.—Mkpu. 6:2; Aịza. 54:17.
Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Filipaị akwụkwọ ozi, sị: “Ana m ekele Chineke . . . n’ihi ọrụ unu rụworo n’ịgbasa ozi ọma.” (Fil. 1:3-5) Anyị bụ́ Òtù Na-achị Isi na-ekelekwa Chineke maka unu. N’ime afọ ije ozi nke 2007, ndị nkwusa dị nde isii, narị puku isii na iri itoolu na otu, narị asaa na iri itoolu ji awa otu ijeri, narị nde anọ na iri atọ na otu, narị puku asaa na iri isii na otu, na narị ise na iri ise na anọ kwusaa ozi ọma na narị ala abụọ na iri atọ na isii gburugburu ụwa. Unu na-arụ ọrụ dị nnọọ ukwuu n’ịhụ na a gbasara ozi ọma ahụ! Cheedị echiche mmadụ ole mgbalị anyị niile merela ka ha gbanwee ndụ ha, ihe a niile na-ewetakwara Jehova otuto!
N’oge ọzọ, Pọl gosiri na ya nwere ọmịiko dị ukwuu n’ahụ́ ụmụnna ya. O degaara ndị nke nọ na Tesalonaịka akwụkwọ ozi, sị: “Anyị na-eburu n’uche mgbe niile . . . ntachi obi unu n’ihi olileanya unu nwere n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’ihu Chineke bụ́ Nna anyị.” (1 Tesa. 1:2, 3) O doro anya na ndụ jupụtara ná nsogbu. Anyị ga-ezute nsogbu, ma ọ dị mkpa ka anyị tachie obi. Olee nsogbu ị nọ na ya ugbu a? Ị̀ daala mbà n’obi n’ihi na oké ọrịa ebelatala nnọọ ihe ị na-enwe ike ime n’ozi Jehova? Onye iro ahụ afọ na-anatụghị eju, bụ́ Shiol, ọ̀ narala gị di ma ọ bụ nwunye gị ị hụrụ n’anya nke gị na ya birila ọtụtụ afọ? (Ilu 30:15, 16) Ị̀ chọọla di ma ọ bụ nwunye hụrụ Jehova n’anya otú i si hụ Ya ma ya eyie ka ị gaghị achọta, ma gị aka jiri ikwesị ntụkwasị obi na-erubere ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ahụ nke sịrị ka anyị lụọ naanị n’ime Onyenwe anyị isi? (1 Kọr. 7:39) Ụkọ ego ọ̀ na-enye gị nsogbu ka ị na-agba mbọ ịzụ ụmụ gị? N’agbanyeghị ọnọdụ ị nọ na ya, ọ bụrụ na i bute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ, obi sie gị ike na Jehova agaghị ‘echefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.’ Bikonụ, ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị, unu ‘adala mbà n’ime ihe dị mma’!—Hib. 6:10; Gal. 6:9.
Olee ihe ga-enyere unu aka ịtachi obi? Dị ka ndị Tesalonaịka, ọ bụ “olileanya unu nwere n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” E nwere ezi ihe mere Pọl ji mesịa jiri “olileanya nke nzọpụta” tụnyere okpu ígwè nke ga-echebe uche Onye Kraịst ka ọ ghara ịdị na-eche ihe ndị na-abaghị uru, gharakwa ịdị na-enwe obi abụọ mgbe niile.—1 Tesa. 5:8.
N’ezie, ọ bụrụ na unu ejiri ọṅụ na-atachi obi, unu na-eme ka Jehova nwee ihe ọ ga-aza Setan maka ebubo ahụ o boro ya n’ihe metụtara onye o ruuru ịchị eluigwe na ụwa. Setan kwuru na ndị ohu Chineke bụ nnọọ ndị na-eche naanị banyere onwe ha site n’ọmụmụ, nakwa na ọ bụ ezie na ha nwere ike ijere Chineke ozi ruo oge ụfọdụ, na ha ga-eselata aka n’ofufe ha na-efe Chineke ma ọ bụrụ na e lewekwuo ha ule ma ọ bụ ma ọ bụrụ na ụwa ochie a anọọ karịa otú ha tụrụ anya ya. Unu nwere nnọọ ike igosi na Ekwensu bụ ajọ onye ụgha! Ụbọchị ọ bụla gaferenụ ná ndụ unu na-eme ka unu rukwuo nso ụbọchị a ga-emezu olileanya unu.
Dị nnọọ ka Pọl ji ohere ọ bụla ọ hụrụ jaa ụmụnna ya mma maka ọmarịcha okwukwe ha nwere, mbọ ha na-agba n’ikwusa ozi ọma, na maka ntachi obi ha, anyị chọrọ iji ohere a jaa unu mma ma chetara unu na anyị hụrụ unu n’anya. Jidenụ nke unu ji!
Ka Chineke gọzie anyị n’ụba n’afọ a. Anyị na-asị ya dịrị unu ná mma, anyị bụ
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova