-
À Mụrụ Jizọs Na December?Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
-
-
ozuzo, ike adịghịkwa anyị iguzo n’èzí.’ (Ezra 10:9, 13; Jeremaịa 36:22) Ka a sịkwa ihe mere ndị ọzụzụ atụrụ biri n’akụkụ ụwa ahụ ji ahụ na ha na ìgwè atụrụ ha anọghị n’èzí n’abalị n’ọnwa December!
Otú ọ dị, Bible kwuru na ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa na-elekọta ìgwè atụrụ ha n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs. N’eziokwu, Luk, bụ́ onye so dee Bible, kwuru na n’oge ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ “bi ebi n’ọhịa, na-echekwa ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.” (Luk 2:8-12) Rịba ama na ndị ọzụzụ atụ ahụ bi ebi n’ọhịa, ọ bụghị na ha nọ nanị na-agagharị agagharị n’ehihie. Ha na ìgwè atụrụ ha nọ n’ọhịa n’abalị. Nkọwa dị otú ahụ e nyere nke bụ́ na ha bi n’ọhịa ọ̀ ga-ekwe omume n’oge oké oyi na mmiri ozuzo a na-enwe na Betlehem na December? Mbanụ, ọ gaghị ekwe omume. N’ihi ya, ọnọdụ ndị e nwere n’oge a mụrụ Jizọs na-egosi na a mụghị ya na December.a
Okwu Chineke gwara anyị kpọmkwem oge Jizọs nwụrụ, ma o nyere ihe ọmụma dị nta banyere oge a mụrụ ya. Nke a na-echetara anyị ihe Eze Solomọn kwuru: “Ezi aha dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.” (Eklisiastis 7:1) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Bible na-enye ihe ọmụma dị ukwuu banyere ozi na ọnwụ Jizọs ma na-enye ihe ọmụma dị nta banyere oge a mụrụ ya.
Mgbe a mụrụ Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ na ìgwè atụrụ ha nọ n’ọhịa n’abalị
-
-
Ànyị Kwesịrị Ime Ememe Okpukpe?Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
-
-
IHE ODIDE NTỤKWASỊ
Ànyị Kwesịrị Ime Ememe Okpukpe?
EMEME okpukpe na ememe ndị ọzọ na-ewu ewu bụ́ ndị a na-eme n’ọtụtụ ebe n’ụwa esiteghị na Bible. Oleezi ebe ememe ndị dị otú ahụ sitere? Ọ bụrụ na i nwere ike ịga n’ọ́bá akwụkwọ mee nchọpụta, ị ga-ahụ nnọọ ihe akwụkwọ dị iche iche na-ekwu banyere ememe ndị na-ewu ewu n’ebe i bi. Tụlee ihe atụ ole na ole.
Ista. “Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’Agba Ọhụrụ nke na-egosi na e mere ememe Ista,” ka The Encyclopædia Britannica na-ekwu. Oleezi otú Ista si malite? O sitere n’aka ndị ọgọ mmụọ. N’agbanyeghị na a na-azọrọ na e ji ememe a echeta mbilite n’ọnwụ Jizọs, omenala ndị a na-eme n’oge Ista abụghị nke Ndị Kraịst.
Ememe Afọ Ọhụrụ. Mba dị iche iche nwegasịrị ụbọchị ha na-eme ememe Afọ Ọhụrụ nakwa otú ha na-esi eme ya. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu banyere mmalite nke ememe a, sị: “Onye ọchịchị Rom bụ́ Julius Caesar wepụtara January 1 dị ka Ụbọchị Afọ Ọhụrụ na 46 nke O.A. Ndị Rom raara ụbọchị a nye Janus, bụ́ chi nke ọnụ ụzọ ámá, nke ọnụ ụzọ ụlọ, nakwa nke mmalite ihe. E si na Janus, bụ́ nke ihu ya dị abụọ—otu na-ele n’ihu nke ọzọ na-ele n’azụ—nweta aha ọnwa ahụ bụ́ January.” N’ihi ya, ememe Afọ Ọhụrụ sitere n’ememe ndị ọgọ mmụọ.
Ememe Halloween. Banyere ememe a nke yiri ememe a na-eme maka ndị nwụrụ anwụ, The Encyclopedia Americana na-ekwu, sị: “Ihe ndị a na-eme n’ememe Halloween sitere n’ememe ndị Druid [ndị ndú okpukpe ndị Celt oge ochie] nke a na-eme tupu oge Ndị Kraịst. Ndị Celt nwere ememe a na-emere chi abụọ ndị bụ́ isi—chi anyanwụ na chi ndị nwụrụ anwụ (nke a na-akpọ Samhain), bụ́ nke a na-emere ememe na November 1, bụ́ mmalite nke Afọ Ọhụrụ nke ndị Celt. E ji nke nta nke nta webata ememe ahụ a na-emere ndị nwụrụ anwụ n’ememe Ndị Kraịst.”
Ememe Ndị Ọzọ. Anyị agaghị enwe ike ịtụlecha ememe nile a na-eme gburugburu ụwa. Otú ọ dị, Jehova adịghị anakwere ememe ndị e ji ebuli ndị mmadụ ma ọ bụ òtù dị iche iche nke mmadụ elu. (Jeremaịa 17:5-7; Ọrụ 10:25, 26) Burukwa n’uche na otú ememe okpukpe si malite na-ekpebi ma ọ̀ ga-amasị Chineke ma ọ bụ na ọ gaghị amasị ya. (Aịsaịa 52:11; Mkpughe 18:4) Ụkpụrụ Bible ndị a kpọtụrụ uche n’Isi nke 16 nke akwụkwọ a ga-enyere gị aka ikpebi otú Chineke si ele ikere òkè n’ememe ndị ọzọ na-abụghị ndị nke okpukpe anya.
-