Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 3/15 p. 29-31
  • Ihud—Nwoke Okwukwe na Obi Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihud—Nwoke Okwukwe na Obi Ike
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Moab Bịakwasịrị Ha
  • Ihud Ezute Eglọn
  • Ihud Alọghachi
  • Nchọpụta na Mmeri
  • Ịmụta Ihe Site n’Ihe Nlereanya Ihud
  • Ihud Agbajie Yok Onye Mmegbu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Akụkọ Banyere Inwe Obi Ike na Ime Ihe Dị Ịtụnanya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ndị Ikpe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 3/15 p. 29-31

Ihud—Nwoke Okwukwe na Obi Ike

ỌTỤTỤ afọ agafewo eri ụmụ Israel zọnyere ụkwụ mbụ n’Ala Nkwa ahụ. Ọ dịwo anya Mosis na onye nọchiri ya, bụ́ Joshua, nwụrụ. Mgbe ndị ikom okwukwe dị otú ahụ na-anọghị, mmasị maka ofufe dị ọcha dakpọrọ. Ọbụna na ụmụ Israel ebidowo ife Bealim na Asherọt.a N’ihi ya, Jehova nyere ndị ya n’aka ndị Siria ruo afọ asatọ. Mgbe ahụ ụmụ Israel tikuru Chineke mkpu maka enyemaka. N’obi ebere, o gere ntị. Jehova mere ka onye ikpe, bụ́ Otniel, bilie ịzọpụta ndị Ya.—Ndị Ikpe 3:7-11.

Ihe omume ndị a kwesịrị ịkụziworo ụmụ Israel otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ—nrubeisi nye Jehova na-eweta ngọzi, ebe nnupụisi na-eweta nkọcha. (Deuterọnọmi 11:26-28) Otú ọ dị, ụmụ Israel amụtaghị nke a. Mgbe afọ 40 nke udo gasịrị, ha gbahapụrụ ofufe dị ọcha ọzọ.—Ndị Ikpe 3:12.

Moab Bịakwasịrị Ha

N’oge a Jehova hapụrụ ndị ya ka ha daba n’aka Eze Eglọn nke Moab. Bible na-akọwa ya dị ka “nwoke mara abụba nke ukwuu.” Site n’enyemaka nke Amọn na Amalek, Eglọn wakporo Israel ma guzobe obí eze ya na Jeriko, nke bụ́ “obodo nkwụ.” Lee ka o si ghara ikwesị ekwesị na obodo ukwu mbụ nke Kenean ụmụ Israel ga-emeri bụ ugbu a ebe isi ụlọ ọrụ nke onye na-efe chi ụgha bụ́ Kemọsh ofufe dị!b—Ndị Ikpe 3:12, 13, 17.

Eglọn kpagburu ụmụ Israel ruo afọ 18 na-esote, na-achọ dị ka o doro anya ụtụ isi bụ ibu arọ site n’aka ha. Site n’ịchọ ụtụ a na-atụ site n’oge ruo n’oge, Moab wusiri ọnọdụ akụ̀ na ụba nke ya ike ebe ọ na-amịkọrọ ihe onwunwe Israel. N’ụzọ kwere nghọta, ndị Chineke tiri mkpu maka ahụ efe, Jehova gekwara ntị ọzọ. O mere ka onye nzọpụta ọzọ biliere ha—na nke oge a onye agbụrụ Benjamin aha ya bụ Ihud. Iji kwụsị ọchịchị nchịgbu nke Eglọn na-achị Israel, Ihud mere atụmatụ ime ihe n’ụbọchị ịkwụ ụtụ nke na-esote.—Ndị Ikpe 3:14, 15.

Iji kwadebe maka ihe obi ike ọ gaje ime, Ihud mere mma agha nwere ihu abụọ nke dị otu cubit n’ogologo. Ọ bụrụ na nke a bụ cubit dị mkpirikpi, ihe agha ahụ dị ihe dị ka sentimita 38 n’ogologo. Ụfọdụ ndị ga-ewere ya ịbụ daga. O doro anya na ọ dịghị ihe ntụbichi dị n’etiti ihu mma ahụ na isi ya. N’ihi ya, Ihud pụrụ izo mma agha nta ya n’ebe fụkọrọ afụkọ n’uwe ya. Ọzọkwa, ebe Ihud na-eme aka ekpe, ọ pụrụ ikegide mma agha ya n’akụkụ aka nri ya—ọ bụghị ebe a na-ekenyekarị ihe agha.—Ndị Ikpe 3:15, 16.

Atụmatụ Ihud abụghị nke na-enweghị ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, olee ma ọ bụrụ na ndị na-ejere eze ozi nyochara Ihud maka ngwá agha? Ọ bụrụgodị na ha emeghị ya, n’ezie ha agaghị ahapụ eze ha ịnọ nanị ya na onye Israel! Ma ọ bụrụ na ha ahapụ ha, nke pụrụ ime ka e gbuo Eglọn, olee otú Ihud ga-esi agbapụ? Olee ebe ọ ga-agbaru tupu ndị na-ejere Eglọn ozi achọpụta ihe meworonụ?

Obi abụọ adịghị ya na Ihud tụgharịrị okwu ndị dị otú ahụ n’uche, ikekwe na-eche banyere ọtụtụ ihe ọdachi pụrụ ịdapụta. Otú o sina dị, ọ gara n’ihu n’atụmatụ ya, na-egosipụta obi ike ma na-enwe okwukwe na Jehova.

Ihud Ezute Eglọn

Ụbọchị a ga-enye ụtụ nke na-esote eruwo. Ihud na ndị ikom ya banyere n’obí eze ahụ. N’oge na-adịghị anya, ha na-eguzo n’ihu Eze Eglọn n’onwe ya. Ma oge erubeghị maka Ihud ịwakpo ya. Mgbe e nyefesịrị ụtụ ahụ, Ihud zilagara ndị obu ụtụ ahụ.—Ndị Ikpe 3:17, 18.

Gịnị mere Ihud ji gbuo oge n’itigbu Eglọn? Ò kwere ka egwu tụọ ya? Ọ dịghị ma ọlị! Iji mezuo atụmatụ ya, Ihud chọrọ ka eze gee ya ntị nanị ya—bụ́ ihe a na-enyeghị ya ná nzute mbụ a. Ọzọkwa, Ihud ga-achọ ime mgbapụ dị ngwa. Mgbapụ ga-aka nnọọ mfe maka otu nwoke karịa maka ìgwè ahụ dum nke ndị obu ụtụ. N’ihi ya, Ihud cheere oge ya. Mkparịta ahụ dị mkpirikpi o soro Eglọn nwee mere ka o kwe ya omume ịmata ụkpụrụ nke obí eze ahụ nke ọma na ịchọpụta ókè eze ahụ nweruru nchebe.

Mgbe o rusịrị ‘n’arụsị a pịrị apị ndị dị na Gilgal,’ Ihud hapụrụ ndị ikom ya ma gaghachi n’obí Eglọn. Ije ahụ dị ihe dị ka kilomita abụọ nyere Ihud obere oge iche banyere ọrụ ya na ikpe ekpere maka ngọzi Jehova.—Ndị Ikpe 3:19.

Ihud Alọghachi

O doro anya na a nabataghachiri Ihud n’ime obí eze ahụ. Ikekwe ụtụ afọ ọma o nyere na mbụ etinyewo Eglọn n’ọnọdụ obi ụtọ. Ọ pụrụ ịbụ na n’agbanyeghị na nleta mbụ ahụ dị mkpirikpi, o nyere Ihud ohere zuru ezu iguzobe mmekọrịta dị mma nke ya na eze. Nke ọ bụla ọ bụ, Ihud abịaghachiwo n’ihu Eglọn.

“Okwu nzuzo ka m nwere ịgwa gị, eze,” ka Ihud kwuru. Eziokwu bụ na ọ bịaruwo ókè a bụ ihe àmà na Jehova na-eduzi ya. Ma, e nwere otu nsogbu. A pụghị ikwu “okwu nzuzo” nke Ihud ji n’ihu ndị na-ejere eze ozi. Ọ bụrụ na Jehova ga-etinye aka, enyemaka ahụ dị Ihud mkpa ozugbo. “Nọdụnụ duu,” ka eze ahụ nyere n’iwu. Ebe Eglọn na-achọghị ka a nụpere “okwu nzuzo” a, ọ chụpụrụ ndị na-ejere ya ozi. Cheedị ahụ efe Ihud nwere!—Ndị Ikpe 3:19.

Eglọn na-anọdụ n’ime ụlọ elu ya mgbe Ihud bịakwutere ya ma kwuo, sị: “Okwu Chineke ka m nwere ịgwa gị.” Site n’ihota “Chineke,” Ihud ọ̀ na-ekwu banyere Kemọsh? Eglọn pụrụ icheworị otú ahụ. N’ịbụ onye a kpaliri mmasị ya, o siri n’ocheeze ya bilie ma kwụrụ n’olileanya. Ihud abịa nso, jiri nlezianya na-eje dị ka o yiri ka ọ ghara ịkpali eze inyowe ya enyo maka mwakpo. Mgbe ahụ, n’ime ihe ọsọ ọsọ, “Ihud wee setịpụ aka ekpe ya, si n’apata ụkwụ aka nri ya were mma agha ahụ, maa [Eglọn] n’afọ ya: isi mma wee sorokwa ihu mma baa; abụba wee gbochipụ ihu mma, na ọ dọpụtaghị mma agha ahụ n’afọ ya; o wee pụọ n’otule ya.”—Ndị Ikpe 3:20-22.

N’ịnọ na-akwụgharị n’ebe dị nso, ndị na-ejere eze ozi akụjaghị. Ma Ihud ka nọ n’ihe ize ndụ. Ndị ohu Eglọn pụrụ ịwụbata n’oge ọ bụla ma chọpụta ozu eze ha daworo ada. Ọ dị Ihud mkpa ịgbapụ ngwa ngwa! N’ịkpọchi ọnụ ụzọ ndị ahụ, o sitere n’oghere ikuku si abata n’ụlọ elu ahụ gbalaga.—Ndị Ikpe 3:23, 24a.

Nchọpụta na Mmeri

N’oge na-adịghị anya ndị ohu Eglọn nwewara ọchịchọ ịmata ihe na-emenụ. Ma, ha achọtụdịghị imejọ eze site ịkwụsịtụ nzukọ nzuzo ya. Mgbe ahụ ha hụrụ na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ elu ahụ akpọchi. “Ọ bụ nanị na ọ na-ekpuchi ụkwụ ya abụọ n’ime ụlọ ọjụjụ oyi ya,” ka ha tụgharịrị n’uche. Otú ọ dị, ka oge na-agafe, mkpali nke nchegbu nọchiri anya ọchịchọ nkịtị nke ịmata ihe. Ndị na-ejere Eglọn ozi apụghị icherekwu. “Ha wee were mkpịsị ugodi, meghe [ọnụ ụzọ ndị ahụ nke ụlọ elu ahụ]: ma, lee, onyenwe ha adawo n’ala nwụọ.”—Ndị Ikpe 3:24b, 25.

Ka ọ dị ugbu a, Ihud agbapụwo. Ọ gafere arụsị a pịrị apị dị na Gilgal ma mesịa ruo Seira, otu ebe dị n’ógbè ugwu Efraim. Ihud kpọkọrọ ndị ikom Israel, duokwa ha ná mwakpo e jikọtara ọnụ megide ndị Moab. Ihe ndekọ ahụ na-akọ na “ha wee tigbuo Moab na mgbe ahụ, ihe hà ka [puku mmadụ iri], nwoke ọ bụla nke buru ibu, na nwoke ọ bụla bụ dimkpa; ọ dịghịkwa nwoke ọ bụla wepụgara onwe ya.” Site n’iweda Moab n’ala, ala Israel enweghị nsogbu ọzọ ruo afọ 80.—Ndị Ikpe 3:26-30.

Ịmụta Ihe Site n’Ihe Nlereanya Ihud

Okwukwe n’ebe Chineke nọ kpaliri Ihud. Ndị Hibru isi 11 akpọtụghị ya aha kpọmkwem dị ka otu onye ná “ndị sitere n’okwukwe lụgbuo alaeze, . . . mee ka ha dị ike n’agha, ndị sitere n’okwukwe chụlaga usuu ndị agha nke ndị ala ọzọ.” (Ndị Hibru 11:33, 34) Otú o sina dị, Jehova kwadoro Ihud ka o ji okwukwe mee ihe ma napụta Israel site n’aka ike ọchịchị nchịgbu nke Eze Eglọn.

Obi ike bụ otu n’ime àgwà ndị Ihud nwere. Ọ ghaghị inwe obi ike iji jiri mma agha nkịtị mee ihe n’ụzọ tụrụ ụzụ. Dị ka ndị ohu Chineke nke oge a, anyị adịghị ebuli mma agha dị otú ahụ. (Aịsaịa 2:4; Matiu 26:52) Ma, anyị na-eji “mma agha nke Mmụọ Nsọ,” bụ́ Okwu Chineke eme ihe. (Ndị Efesọs 6:17) Ihud dị irè n’iji ihe agha ya mee ihe. Ọ dịkwa anyị mkpa ịdị nkà n’iji Okwu Chineke eme ihe ka anyị na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. (Matiu 24:14) Ọmụmụ ihe onwe onye nke Bible, ịnọrọchi anya ná nzukọ ndị Kraịst, iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ozi, na iji ekpere dabere ná Nna anyị nke eluigwe ga-enyere anyị aka iṅomi àgwà ndị Ihud gosipụtara, onye bụ́ n’ezie nwoke okwukwe na obi ike.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a O yiri ka Asherọt hà bụ ọtụtụ ihe oyiyi nke akụkụ ahụ nwoke. E jikọtara ha na ajọ mmekọahụ rụrụ arụ.—1 Ndị Eze 14:22-24.

b Kemọsh bụ arụsị bụ isi nke ndị Moab. (Ọnụ Ọgụgụ 21:29; Jeremaịa 48:46) N’ọnọdụ ụfọdụ ma ọ dịkarịa ala, e jiri ụmụaka chụọ àjà ma eleghị anya nye chi ụgha a rụrụ arụ.—2 Ndị Eze 3:26, 27.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ihud na ndị ikom ya nyefere Eze Eglọn ụtụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

E sepụtaghachiri ya site n’Illustrirte Pracht - Bibel/Heilige Schrift des Alten und Neuen Testaments, nach der deutschen Uebersetzung D. Martin Luther’s

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya