Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 3 p. 25-34
  • “M Dị . . . Umeala n’Obi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “M Dị . . . Umeala n’Obi”
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ Dịwo Anya Ọ Nọ Na-egosi Ịdị Umeala n’Obi
  • Ịdị Umeala n’Obi Jizọs Mgbe Ọ Bụ Mmadụ
  • Ịkụziri Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ka Ha Dị Umeala n’Obi
  • Ị̀ Ga-eso Ihe Nlereanya Jizọs Setịpụrụ?
  • Jizọs Gosiri Anyị Otú E Si Adị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Yikwasị Ịdị Umeala n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ihe Atụ nke Obi Umeala Ndị A Ga-eṅomi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 3 p. 25-34

ISI NKE ATỌ

“M Dị . . . Umeala n’Obi”

Ihe Osise dị na peeji nke 27

“Lee! Eze gị na-abịakwute gị”

1-3. Olee otú Jizọs si banye Jeruselem, gịnịkwa mere ọ ga-eji ju ụfọdụ ndị so n’ìgwè mmadụ nọ na-ekiri ya anya?

MKPỌTỤ na-eme n’ebe niile na Jeruselem. Onye ukwu na-abịa! Ndị mmadụ guzocha n’ụzọ e si abata n’obodo ahụ. Ọ na-anụ ha ọkụ n’obi ịnabata nwoke a, n’ihi na ụfọdụ na-asị na ọ bụ ya ga-eketa ọchịchị Eze Devid, na ọ bụkwa ya ka o ruuru n’ezie ịbụ Onye Ọchịchị Izrel. Ọtụtụ ndị ji igu nkwụ ha ga na-efegharị iji nabata ya; ndị ọzọ gbasara uwe, tụsasịakwa alaka osisi n’okporo ụzọ ka ụzọ ọ ga-esi gafere wee dị larịị. (Matiu 21:7, 8; Jọn 12:12, 13) Ma eleghị anya, ọtụtụ ndị nọ na-eche otú mbata ya ga-adị.

2 Ikekwe, ụfọdụ na-atụ anya na ọ ga-egosi na ya bụ onye ukwu. N’ezie, e nweela ndị oké mmadụ ha maara bụ́ ndị batara n’obodo n’ụdị dị ebube. Dị ka ihe atụ, nwa Devid bụ́ Absalọm kpọsara na ya aghọwo eze. O mere ka ndị ikom iri ise na-agba ọsọ n’ihu ụgbọ ịnyịnya ya. (2 Samuel 15:1, 10) Onye ọchịchị Rom bụ́ Julius Caesar kwuru ka e mee ka nke ya kpọtụ akpọtụ karịa nke ahụ; n’otu mgbe, o duuru ìgwè mmadụ na-aṅụrị ọṅụ n’ihi mmeri o meriri gaa n’ụlọ ọchịchị obodo Rom, enyí iri anọ ndị bu oriọna nọ ya n’aka nri nakwa n’aka ekpe! Ma, ugbu a, ndị bi na Jeruselem na-echere nwoke dị nnọọ ukwuu karịa onye ahụ. Ma ìgwè mmadụ ahụ hà ghọtara ya ma ọ bụ na ha aghọtaghị ya, ọ bụ onye a bụ Mesaya, nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ. Ma, mgbe Eze a nke ga-achị n’ọdịnihu ga-abata n’obodo a, ọ ga-eju ụfọdụ ndị anya.

3 Ha ahụghị ụgbọ ịnyịnya, ha ahụghị ndị ọgba ọsọ, ha ahụghịkwa ịnyịnya, ma ya fọdụzie enyí. Kama nke ahụ, Jizọs nọ n’elu anụ nkịtị na-ebu ibu, ya bụ, ịnyịnya ibu.a Onye a nke nọ n’elu ịnyịnya ibu ejighị ejiji mara mma pụrụ iche, ọ dịghịkwa nke e ji chọọ ịnyịnya ibu ya mma. Ihe o ji nọkwasị n’elu ịnyịnya ahụ adịghị oké ọnụ. Kama nke ahụ, ọ bụ ákwà ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ha na ya na-akpachi anya gbasara n’elu anụ ahụ. Gịnị mere Jizọs ji họrọ ịbanye Jeruselem n’ụzọ dị nnọọ ala otú a, n’agbanyeghị na ndị ikom na-enwetụdịghị ebe ha ruru ya banyere n’ụzọ dị nnọọ ebube karịa otú o si banye?

4. Gịnị ka Baịbụl buru n’amụma banyere otú Eze bụ́ Mesaya ga-esi banye Jeruselem?

4 Jizọs na-emezu amụma nke sịrị: “Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu . . . Tie mkpu ọṅụ, gị ada bụ́ Jeruselem. Lee! Eze gị na-abịakwute gị. Ọ bụ onye ezi omume, ee, onye a zọpụtara azọpụta; ọ dị umeala n’obi, ọ nọkwa n’elu ịnyịnya ibu.” (Zekaraya 9:9) Amụma a na-egosi na otu ụbọchị, Onye Chineke Tere Mmanụ, bụ́ Mesaya, ga-egosi ndị bi na Jeruselem na ọ bụ ya bụ onye Chineke họpụtara ịbụ Eze. Otú ọ ga-esikwa mee nke a, na ụdị anụ ọ ga-ahọrọ ịnọ n’elu ya, ga-ekpughe àgwà magburu onwe ya o nwere n’ime obi ya, ya bụ, ịdị umeala n’obi.

5. Gịnị mere ịdị umeala n’obi Jizọs ji bụrụ nke na-eru n’obi ma e chebara ya echiche, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị mụta iṅomi ịdị umeala n’obi Jizọs?

5 Ịdị umeala n’obi Jizọs bụ otu n’ime àgwà ya ndị kasị mma, bụ́ nke na-eru n’obi ma e chebara ya echiche. Dị ka anyị tụlere n’Isi nke Abụọ, ọ bụ naanị Jizọs bụ “ụzọ na eziokwu na ndụ.” (Jọn 14:6) O doro anya na ọ dịghị otu n’ime ọtụtụ ijeri mmadụ ndị dịworo ndụ n’ụwa nke há ka Ọkpara Chineke. Ma, Jizọs egositụdịghị mpako, nganga, ma ọ bụ ibuli onwe onye elu, nke ji ụmụ mmadụ aka ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ọ dị anyị mkpa ịlụso mpako ọgụ. (Jems 4:6) Cheta na Jehova kpọrọ nganga asị. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị mụta iṅomi ịdị umeala n’obi Jizọs.

Ọ Dịwo Anya Ọ Nọ Na-egosi Ịdị Umeala n’Obi

6. Gịnị bụ ịdị umeala n’obi, oleekwa otú Jehova si mara na Mesaya ga-adị umeala n’obi?

6 Ịdị umeala n’obi bụ adịghị nganga ma ọ bụ adịghị mpako. Ọ bụ àgwà nke na-amalite n’obi, nke mmadụ na-egosi n’okwu ọ na-ekwu, n’omume ya, nakwa n’otú o si emeso ndị ọzọ ihe. Olee otú Jehova si mara na Mesaya ga-adị umeala n’obi? Ọ maara na Ọkpara ya na-eṅomi ihe nlereanya zuru okè O setịpụrụ n’ịdị umeala n’obi. (Jọn 10:15) Ọ hụwokwa ka Ọkpara ya na-egosi ịdị umeala n’obi. Olee otú nke a si bụrụ eziokwu?

7-9. (a) Olee otú Maịkel si gosi ịdị umeala n’obi n’okwu ya na Setan sere? (b) Olee otú Ndị Kraịst pụrụ isi ṅomie Maịkel n’ịdị umeala n’obi?

7 Akwụkwọ Jud na-enye anyị otu ihe atụ magburu onwe ya: “Mgbe Maịkel onyeisi ndị mmụọ ozi na Ekwensu sere okwu ma na-arụrịta ụka banyere ozu Mozis, ọ nwaghị anwa iji okwu ọjọọ maa Ekwensu ikpe, kama ọ sịrị: ‘Ka Jehova baara gị mba.’” (Jud 9) Maịkel bụ aha a kpọrọ Jizọs—tupu ya ebie ndụ n’ụwa nakwa mgbe o bisịrị ndụ n’ụwa. A kpọrọ ya aha a n’ihi ọrụ ọ na-arụ dị ka onyeisi ìgwè ndị mmụọ ozi Jehova.b (1 Ndị Tesalonaịka 4:16) Ma, rịba ama ihe Maịkel mere n’okwu ya na Setan sere.

8 Ihe Jud dere agwaghị anyị ihe Setan chọrọ iji ozu Mozis mee. Ma anyị pụrụ ijide n’aka na Ekwensu bu ihe ọjọọ n’obi. Ikekwe, ọ chọrọ ime ihe ga-eme ka e were ozu nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-efe ofufe ụgha. Ọ bụ ezie na Maịkel gbasoro atụmatụ ọjọọ Setan mgba, o gosikwara njide onwe onye. N’ezie, e kwesịrị ịbara Setan mba. Ma, Maịkel ghọtara na ọ bụ naanị Jehova bụ́ Chineke kwesịrị ikpe ụdị ikpe ahụ, n’ihi na n’oge ahụ ya na Setan na-arụrịta ụka, e nyebeghị ya ikike “ikpe ikpe niile.” (Jọn 5:22) Ebe ọ bụ na Maịkel bụ onyeisi ndị mmụọ ozi, o nwere ikike dị ukwuu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ hapụụrụ Jehova okwu ahụ kama ịzọwa ka ya nwetakwuo ikike. E wezụga ịdị umeala n’obi, o gosikwara imeru ihe n’ókè, ma ọ bụ àgwà ịmara ebe ike ya ruru.

9 E nwere ihe mere mmụọ nsọ ji kpalie Jud ide ihe a merenụ. Ọ dị mwute na ndị Kraịst ụfọdụ n’oge Jud adịghị umeala n’obi. Ha ji nganga “na-akatọ ihe niile ha na-amaghị.” (Jud 10) Lee otú o si dịrị anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe ikwe ka mpako rie anyị isi! Mgbe anyị na-aghọtaghị ihe e mere n’ọgbakọ Ndị Kraịst—ikekwe, ya abụrụ ihe metụtara mkpebi òtù ndị okenye mere—olee ihe anyị na-eme? Ọ bụrụ na anyị ekwuwe okwu nkatọ na okwu na-adịghị mma, ọ bụ ezie na anyị apụghị ịmata ihe mere ha ji mee mkpebi ahụ, ọ́ gaghị egosi na anyị adịghị umeala n’obi? Kama nke ahụ, ka anyị ṅomie Maịkel, ma ọ bụ Jizọs, ghara itinye ọnụ n’ikpe Chineke na-enyeghị anyị ikike ikpe.

10, 11. (a) Gịnị mere o ji bụrụ ihe pụrụ iche na Ọkpara Chineke kwere ịbịa n’ụwa? (b) Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ịdị umeala n’obi Jizọs?

10 Ọkpara Chineke gosiri ịdị umeala n’obi site n’ikwere ịbịa n’ụwa. Chetụgodị echiche ihe ndị ọ hapụrụ. Ọ bụ ya bụ onyeisi ndị mmụọ ozi. Ọ bụ ya bụkwa “Okwu ahụ,” ya bụ, Ọnụ Na-ekwuru Jehova. (Jọn 1:1-3) O biri n’eluigwe, bụ́ ‘ebe obibi Jehova nke dị elu, ebe obibi ya dị nsọ, nke mara mma.’ (Aịzaya 63:15) Otú ọ dị, Ọkpara ahụ “mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi mmadụ.” (Ndị Filipaị 2:7) Chee echiche ihe ọ na-abịa ịrụ n’ụwa! E mere ka ndụ ya banye n’akpa nwa nke nwa agbọghọ Juu na-amaghị nwoke, ka ọ nọrọ ebe ahụ ruo ọnwa itoolu wee too ghọọ nwa ọhụrụ bụ́ mmadụ. Mgbe a mụrụ ya, ọ bụ nwa ọhụrụ nke na-apụghị ilekọta onwe ya n’ezinụlọ onye ọkwá nkà nke dara ogbenye. O wee ghọọ nwa na-amụ ije ije, nwa okoro, na onye na-eto eto. Ọ bụ ezie na o zuru okè, n’oge ọ na-eto, o doro onwe ya n’okpuru nne na nna ya na-ezughị okè. (Luk 2:40, 51, 52) Ịdị umeala n’obi nke a enweghị atụ!

11 Anyị pụrụ iṅomi ịdị umeala n’obi Jizọs site n’ikwere ịrụ ọrụ ndị nwere ike iyi ọrụ dị ala mgbe ụfọdụ? Dị ka ihe atụ, ọrụ anyị nwere ikwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke pụrụ iyi ọrụ dị ala mgbe ndị mmadụ gosiri na ha enweghị mmasị, kwaa anyị emo, ma ọ bụ buso anyị iro. (Matiu 28:19, 20) Ma, ọ bụrụ na anyị atachie obi n’ọrụ a, anyị pụrụ inye aka ịzọpụta ndụ. Ọ bụrụgodị na anyị azọpụtaghị ndụ, anyị ga-amụta ịdị umeala n’obi dị ukwuu. Anyị ga-esokwa nzọụkwụ nke Nna anyị ukwu, bụ́ Jizọs Kraịst.

Ịdị Umeala n’Obi Jizọs Mgbe Ọ Bụ Mmadụ

12-14. (a) Olee otú Jizọs si gosi ịdị umeala n’obi mgbe ndị mmadụ toro ya? (b) Olee ụzọ ụfọdụ Jizọs si jiri ịdị umeala n’obi meso ndị ọzọ ihe? (ch) Gịnị na-egosi na ịdị umeala n’obi Jizọs abụghị iji mezuo iwu ma ọ bụ ka a sịkwa na ọ na-akpa ezi àgwà?

12 E ji ịdị umeala n’obi mara ozi Jizọs jere n’ụwa site ná mmalite ruo n’ọgwụgwụ ya. O gosiri nke a n’ụzọ o si mee ka otuto niile na nsọpụrụ niile gaara Nna ya. Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ toro Jizọs maka amamihe o ji kwuo okwu, ike o ji rụọ ọrụ ebube, nakwa ọbụna otú àgwà ya si dị mma. Ọtụtụ mgbe, Jizọs anaraghị nsọpụrụ ahụ, kama, o nyere ya Jehova.—Mak 10:17, 18; Jọn 7:15, 16.

13 Jizọs gosiri ịdị umeala n’obi n’ụzọ o si meso ndị mmadụ ihe. N’eziokwu, o mere ka o doo anya na ya bịara n’ụwa ka ya jeere ndị ọzọ ozi, ọ bụghị ka e jeere ya ozi. (Matiu 20:28) O gosiri ịdị umeala n’obi n’otú o si jiri ịdị nwayọọ na ezi uche meso ndị mmadụ ihe. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya mere ihe wutere ya, o jighị olu ike baara ha mba; ọ nọgidere na-agbalị iru n’obi ha. (Matiu 26:39-41) Mgbe ìgwè mmadụ bịakwutere ya n’oge ọ na-achọ ka o zuru ike n’ebe dị jụụ nke ndị mmadụ na-adịghị anọkarị, ọ chụpụghị ha; ọ nọgidere na-agbasi mbọ ike wee na-ezi ha “ọtụtụ ihe.” (Mak 6:30-34) Mgbe nwaanyị na-abụghị onye Izrel nọgidere na-arịọ ya ka ọ gwọọ nwa ya nwaanyị, o gosiri na ya achọghị ime otú ahụ ná mmalite. Ma, o jighị iwe jụ; o meere nwaanyị ahụ ihe ọ rịọrọ n’ihi okwukwe ya pụrụ iche, dị ka anyị ga-atụle n’Isi nke Iri na Anọ.—Matiu 15:22-28.

14 N’ọtụtụ ụzọ, Jizọs mezuru ihe o kwuru banyere onwe ya mgbe ọ sịrị: “M dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.” (Matiu 11:29) Ịdị umeala n’obi ya abụghị nke elu ọnụ, nke e ji emezu iwu ma ọ bụ ka a sịkwa na ọ na-akpa ezi àgwà. O si ya n’obi, n’ala ala obi ya. Ka a sịkwa ihe mere Jizọs ji were ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya ka ha dị umeala n’obi dị ka ihe dị oké mkpa!

Ịkụziri Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ka Ha Dị Umeala n’Obi

15, 16. Dị ka Jizọs kwuru, gịnị bụ ihe dị iche n’àgwà ndị na-achị achị n’ụwa nwere na àgwà ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịmụta?

15 Ndịozi Jizọs amụtaghị ịdị umeala n’obi ngwa ngwa. Jizọs gbalịrị ugboro ugboro ịkụziri ha ịdị umeala n’obi. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, Jems na Jọn si n’aka nne ha rịọ Jizọs ka o kwe ha nkwa inye ha ọkwá dị elu n’Alaeze Chineke. Jizọs ji obi umeala zaa ha, sị: “Ọ bụghị m na-eme ka a nọdụ n’aka nri m na n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.” Ndịozi iri ndị nke ọzọ ‘wesoro Jems na Jọn iwe.’ (Matiu 20:20-24) Olee otú Jizọs si lebara okwu a anya?

16 O ji obiọma baara ha niile mba, sị: “Unu maara na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị ukwu ha na-achịkwa ha n’aka ike. O kwesịghị ịdị otú ahụ́ n’etiti unu; kama onye ọ bụla nke na-achọ ịbụ onye ukwu n’etiti unu aghaghị ịbụ onye na-ejere unu ozi, onye ọ bụla nke na-achọkwa ịbụ onye mbụ n’etiti unu aghaghị ịbụ onye ohu.” (Matiu 20:25-27) Ikekwe, ndịozi ya ahụwo nnọọ otú “ndị na-achị ndị mba ọzọ” si dị mpako, nweekwa oké ọchịchọ ma na-achọ naanị ọdịmma nke onwe ha. Jizọs gosiri na ndị na-eso ụzọ ya agaghị adị ka ndị ọchịchị aka ike ahụ. Ha kwesịrị ịdị umeala n’obi. Ndịozi ahụ hà ghọtara ihe o kwuru?

17-19. (a) N’abalị ikpeazụ tupu Jizọs anwụọ, olee ụzọ a na-agaghị echefu echefu o si kụziere ndịozi ya ịdị umeala n’obi? (b) Olee ụzọ kasị mkpa Jizọs si kụzie ịdị umeala n’obi mgbe ọ bụ mmadụ?

17 Ọ dịrịghị ha mfe. Ihe a abụghị nke mbụ ma ọ bụkwanụ nke ikpeazụ Jizọs kụziiri ha nke a. O nweela mgbe ha rụrịtara ụka banyere onye kasị ukwuu n’etiti ha, o wee kpọrọ otu nwatakịrị, mee ka o guzoro n’etiti ha wee gwa ha ka ha dịrị ka ụmụntakịrị, bụ́ ndị na-adịghị mpako, ndị na-enweghịkwa oké ọchịchọ, ndị na-adịghịkwa azọ ọkwá, dị ka ndị dimkpa. (Matiu 18:1-4) N’agbanyeghị nke ahụ, n’abalị ikpeazụ tupu ya anwụọ, ọ hụrụ na mpako ka na-enye ndịozi ya nsogbu. O wee kụziere ha ihe ha na-agaghị echefu echefu. O kere ákwà e ji asa ahụ́ n’úkwù wee rụọ ọrụ kasị ala, bụ́ ọrụ ndị na-eje ozi n’oge ahụ na-arụrụ ndị bịara n’ụlọ ha. Jizọs sara ụkwụ onye nke ọ bụla n’ime ndịozi ya—tinyere Judas, onye na-aga ịrara ya nye!—Jọn 13:1-11.

18 Jizọs mere ka ha ghọta nke a mgbe ọ sịrị ha: “M na-enye unu ihe nlereanya.” (Jọn 13:15) Nke a ò mesịrị ruo ha n’obi? Mgbe e mesịrị n’abalị ahụ, ha rụrịtakwara ụka ọzọ banyere onye kasị ukwuu n’etiti ha! (Luk 22:24-27) N’agbanyeghị nke a, Jizọs nọ na-enwere ha ndidi, jirikwa ịdị umeala n’obi kụziere ha ihe. Ọ gakwara n’ihu ịkụziri ha ihe n’ụzọ kasị mkpa: “O wedara onwe ya ala wee rube isi ruo ọnwụ, ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.” (Ndị Filipaị 2:8) Jizọs ji obi ya kwere ịnwụ ọnwụ na-emenye ihere, e wee ma ya ikpe na-ezighị ezi na ọ bụ onye na-eme mpụ na onye na-ekwulu Chineke. Ọkpara Chineke gosiri na ya pụrụ iche, n’ihi na n’ime ndị niile Jehova kere, ọ bụ Jizọs gosiri ịdị umeala n’obi zuru okè nke na-enweghị atụ.

19 Ikekwe, ọ bụ ụzọ ikpeazụ a Jizọs si kụzie ịdị umeala n’obi mgbe ọ bụ mmadụ kụnyesiri àgwà a ike n’obi ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi. Baịbụl na-agwa anyị na ndị ikom a ji ịdị umeala n’obi rụọ ọrụ ọtụtụ afọ, ọbụna ọtụtụ iri afọ, mgbe e mesịrị. Olee maka anyị onwe anyị?

Ị̀ Ga-eso Ihe Nlereanya Jizọs Setịpụrụ?

20. Olee otú anyị ga-esi mara ma ànyị dị umeala n’obi?

20 Pọl dụrụ onye ọ bụla n’ime anyị ọdụ, sị: “Nweenụ ụdị echiche a n’ime onwe unu bụ́ nke Kraịst Jizọs nwekwara.” (Ndị Filipaị 2:5) Ọ dị mkpa ka anyị dị umeala n’obi dị ka Jizọs dị. Olee otú anyị pụrụ isi mara ma ànyị dị umeala n’obi? Pọl chetaara anyị ka anyị ‘ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka anyị.’ (Ndị Filipaị 2:3) Ya mere, azịza ya dabeere n’otú anyị si ele ndị ọzọ anya ma anyị were ha tụnyere onwe anyị. Anyị kwesịrị iwere ha na ha ka anyị, nakwa na ha dị mkpa karịa anyị. Ị̀ ga-anabata ndụmọdụ a?

21, 22. (a) Gịnị mere ndị nlekọta ọgbakọ ji kwesị ịdị umeala n’obi? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị yi ịdị umeala n’obi dị ka uwe?

21 Ọtụtụ afọ mgbe Jizọs nwụsịrị, Pita onyeozi ka nọ na-eche echiche banyere otú ịdị umeala n’obi si dị mkpa. Pita kụziiri ndị nlekọta ọgbakọ ka ha jiri ịdị umeala n’obi na-arụ ọrụ ha, ghara inwe mgbe ha ga-eme atụrụ Jehova dị ka ọ̀ bụ ha nwe ha. (1 Pita 5:2, 3) Ọrụ e nyere anyị ekwesịghị ime ka anyị dị mpako. Kama nke ahụ, ọrụ e nyere mmadụ kwesịrị ime ka ọ dịkwuo umeala n’obi n’ezie. (Luk 12:48) Ma, ọ bụghị naanị ndị nlekọta ka àgwà a dị mkpa, kama ọ dị Ndị Kraịst niile mkpa.

22 O doro anya na ọ dịghị mgbe Pita chefuru abalị ahụ Jizọs sara ya ụkwụ—n’agbanyeghị na Pita jụrụ ná mmalite! (Jọn 13:6-10) Pita degaara Ndị Kraịst akwụkwọ, sị: “Unu niile, werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’otú unu si emeso ibe unu.” (1 Pita 5:5) Okwu ndị ahụ bụ́ “kee onwe unu” na-egosi ihe onye na-eje ozi na-eme, bụ́ onye na-eyiri uwe eprọn ka o wee rụọ ọrụ dị ala. Okwu ndị ahụ pụrụ ichetara anyị oge ahụ Jizọs ji ákwà e ji ehicha ahụ́ kee n’úkwù wee hulata ka ọ saa ụkwụ ha. Ọ bụrụ na anyị esoro Jizọs, ọ̀ dị ọrụ ọ bụla Chineke nyere anyị nke anyị ga-ewere na anyị etofeela ịrụ? Ịdị umeala n’obi anyị kwesịrị ịbụ nke mmadụ niile na-ahụ, dị ka à ga-asị na anyị yi ya dị ka uwe.

23, 24. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ịlụso ọchịchọ ịdị nganga ọgụ? (b) Olee echiche na-ezighị ezi e nwere banyere ịdị umeala n’obi nke Isi nke Anọ ga-enye aka ịgbazi?

23 Nganga dị ka nsí. Ọ pụrụ imebi ihe nke ukwuu. Ọ bụ àgwà nke pụrụ ime ka onye kasị nwee onyinye ghara ịbara Chineke uru. Otú ọ dị, ịdị umeala n’obi pụrụ ime ka onye kasị nta baara Jehova uru nke ukwuu. Ọ bụrụ na anyị amụta àgwà ọma a site n’ịgbalị iji ịdị umeala n’obi na-eso nzọụkwụ Kraịst, ụgwọ ọrụ anyị ga-enweta enweghị atụ ma anyị chebara ya echiche. Pita dere, sị: “Ya mere, wedanụ onwe unu ala n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee bulie unu elu mgbe oge ruru.” (1 Pita 5:6) N’ezie, Jehova buliri Jizọs elu n’ihi na o wedara onwe ya ala kpamkpam. Ọ ga-amasịkwa Chineke anyị ịkwụ gị ụgwọ n’ihi ịdị umeala n’obi gị.

24 Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị chere na mmadụ ịdị umeala n’obi na-egosi na ọ dịghị ike. Ihe nlereanya Jizọs na-enyere anyị aka ịghọta na echiche ahụ ezighị ezi, n’ihi na ọ bụ onye kasị dịrị umeala n’obi n’etiti ụmụ mmadụ bụ onye kasị nwee obi ike. Ọ bụ nke a bụ isiokwu a ga-atụle n’Isi nke Anọ.

a Otu akwụkwọ nke kọwara ihe a merenụ kwuru na anụ a “bụ anụ a na-eleda anya.” O kwukwara, sị: “Ọ bụ anụ dị isi ike nke ndị ogbenye na-eji arụ ọrụ. Ọ dịghị garagara. Ọ maghịkwa mma.”

b Iji ghọtakwuo ihe na-egosi na Maịkel bụ Jizọs, lee peeji nke 218 ruo nke 219 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?

  • Mgbe ị hụrụ na ị na-achọ ịnya isi n’ihi ihe ndị ị rụrụ, olee otú ihe nlereanya Jizọs pụrụ isi nyere gị aka?​—Matiu 12:15-19; Mak 7:35-37.

  • Olee otú ị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Jizọs site n’ịrụrụ ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwaanyị ọrụ dị ala?​—Jọn 21:1-13.

  • Olee otú ihe nlereanya Jizọs pụrụ isi baara gị uru ma ọ bụrụ na ị hụ na ị na-achọ ịbụ onye a ma ama na onye ihe na-agara nke ọma n’usoro ihe nke a?​—Jọn 6:14, 15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya