ISI NKE ISE
“Akụ̀ Niile Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Amamihe”
1-3. Olee ebe Jizọs nọ zie ozizi ahụ o ziri n’otu ụbọchị n’oge opupu ihe ubi n’afọ 31 O.A., oleekwa ihe mere tupu ya amalite izi ihe ahụ? Gịnị mere o ji ju ndị gere okwu ya anya?
N’OTU ụbọchị, n’oge opupu ihe ubi n’afọ 31 O.A., Jizọs Kraịst nọ Kapaniọm nso, bụ́ obodo na-ekwo ekwo nke dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke ụsọ Oké Osimiri Galili. N’abalị bọtara ụbọchị ahụ, Jizọs nọ naanị ya kpee ekpere n’elu ugwu nke dị nso n’ebe ahụ. Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya, si n’etiti ha họrọ mmadụ iri na abụọ, ndị ọ kpọrọ ndịozi. Ka ọ dị ugbu a, oké ígwè mmadụ so Jizọs bịa n’ebe a. Ụfọdụ n’ime ha sikwa n’ebe dị anya. Ha wee zukọta n’ebe dị larịị n’elu ugwu ahụ. Ọ na-anụ ha ọkụ n’obi ka ha nụ ihe ọ chọrọ ikwu, ka ọ gwọọkwa ha ọrịa ha. Jizọs mere ihe ha tụrụ anya ka o mee.—Luk 6:12-19.
2 Jizọs bịakwutere ìgwè mmadụ ahụ gwọọ ndị niile na-arịa ọrịa. N’ikpeazụ, mgbe ọ na-adịghị otu n’ime ha nke ọrịa na-enye nsogbu, ọ nọdụrụ ala, malite izi ihe.a Ọ ghaghị ịbụ na okwu ahụ o kwuru n’ụbọchị ahụ mgbe ikuku ndụ na-eku n’oge opupu ihe ubi juru ndị gere ya anya. N’eziokwu, ha anụtụbeghị ebe onye ọ bụla ziri ihe otú ahụ. Ihe ọ na-ekwu iji mesie ozizi ya ike abụghị ihe ọdịnala a na-edeghị ede kwuru, ọ bụghịkwa ihe ndị rabaị a ma ama bụ́ ndị Juu kwuru. Kama nke ahụ, ọtụtụ ugboro, o kwuru kpọmkwem ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nke si n’ike mmụọ nsọ. Ọ kapịrị ozi ya ọnụ. Okwu ya dị mfe nghọta. Ihe okwu ya pụtara dokwara anya. Mgbe o kwusịrị, o juru ìgwè mmadụ ahụ anya. N’ezie, o kwesịrị iju ha anya. Onye ka gwachara ha okwu bụ nwoke kasị mara ihe nke dịtụworo ndụ!—Matiu 7:28, 29.
“Otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya”
3 E dere ozizi ahụ n’Okwu Chineke, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru na ihe ndị ọzọ o mere. Anyị kwesịrị ịchọpụta ihe ihe ahụ e dere site n’ike mmụọ nsọ kwuru banyere Jizọs, n’ihi na “akụ̀ niile dị oké ọnụ ahịa nke amamihe” dị n’ime Jizọs. (Ndị Kọlọsi 2:3) Olee ebe o si nweta amamihe dị otú ahụ, ya bụ, ikike itinye ihe ọmụma na nghọta n’ọrụ n’ụzọ bara uru? Olee otú o si gosi amamihe, oleekwa otú anyị pụrụ isi soro ihe nlereanya ya?
“Olee Ebe Nwoke a Si Nweta Amamihe A?”
4. Olee ajụjụ ndị gere okwu Jizọs mgbe ọ nọ na Nazaret jụrụ, n’ihi gịnịkwa?
4 N’otu oge Jizọs gara ikwusa ozi ọma, ọ gara Nazaret, bụ́ obodo ọ nọ too, wee malite izi ihe n’ụlọ nzukọ dị n’ebe ahụ. O juru ọtụtụ n’ime ndị gere okwu ya anya, ha wee sị: “Olee ebe nwoke a si nweta amamihe a?” Ha maara ndị ezinụlọ ya—ma ndị mụrụ ya ma ụmụnne ya—marakwa na o si n’ezinụlọ dara ogbenye. (Matiu 13:54-56; Mak 6:1-3) O doro anya na ha makwaara na ọkwá nkà a bụ́ onye ọkà okwu agaghị ụlọ akwụkwọ na-ewu ewu nke ndị rabaị. (Jọn 7:15) Ya mere, o yiri ka ezi uche ọ̀ dị n’ajụjụ ha.
5. Ebee ka Jizọs kwuru o si nweta amamihe ya?
5 Ọ bụghị naanị n’ihi na Jizọs nwere uche zuru okè mere o ji gosi amamihe ahụ. N’oge ọzọ, ka Jizọs nọ na-eje ozi ya, mgbe ọ nọ na-ezi ihe n’ihu ọha n’ụlọ nsọ, o mere ka a mara na amamihe ya si n’ebe ka nnọọ elu. Ọ sịrị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) Ee, ọ bụ Nna ahụ nke zitere Ọkpara ya nyere Jizọs amamihe ahụ n’ezie. (Jọn 12:49) Ma olee otú Jizọs si nweta amamihe n’aka Jehova?
6, 7. Olee ụzọ dị iche iche Jizọs si nweta amamihe n’aka Nna ya?
6 Mmụọ nsọ Jehova nọ na-akpa ike n’obi Jizọs nakwa n’uche ya. Aịzaya buru amụma banyere Jizọs, onye bụ́ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, sị: “Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya, bụ́ mmụọ amamihe na nke nghọta, mmụọ ndụmọdụ na nke ịdị ike, mmụọ ihe ọmụma na nke egwu Jehova.” (Aịzaya 11:2) Ebe ọ bụ na mmụọ Jehova dịkwasịrị Jizọs, na-eduzikwa echiche ya na mkpebi ya, ò kwesịrị ịbụ ihe ijuanya na okwu ya na omume ya gosiri na o nwere amamihe na-enweghị atụ?
7 O nwere ụzọ ọzọ dị mkpa Jizọs si nweta amamihe n’aka Nna ya. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Abụọ, Jizọs dịrị ndụ ruo ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ tupu ya aghọọ mmadụ. N’ime oge a, o nwere ohere ịghọta uche Nna ya n’ihe dị iche iche. Anyị apụghị ịghọta amamihe dị ukwuu Ọkpara ahụ nwetara mgbe ọ nọ n’akụkụ Nna ya, mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ dị ka “onye ọkà ọrụ” n’ike ihe ndị ọzọ niile, ma ihe ndị dị ndụ ma ihe ndị na-adịghị ndụ. Ọ bụ ya mere o ji kwesị ekwesị na tupu Ọkpara ahụ aghọọ mmadụ, a kpọrọ ya amamihe mgbe a na-akọwa onye ọ bụ. (Ilu 8:22-31; Ndị Kọlọsi 1:15, 16) N’oge niile Jizọs jere ozi n’ụwa, o ji amamihe ahụ o nwetara n’eluigwe mgbe ọ nọ n’akụkụ Nna ya rụọ ọrụ.b (Jọn 8:26, 28, 38) Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na Jizọs gosiri amamihe dị ukwuu na nghọta na-enweghị atụ mgbe ọ na-ekwu okwu. Ezi uche o gosiri n’ihe niile o mere ekwesịghịkwa iju anyị anya.
8. Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, olee otú anyị pụrụ isi nweta amamihe?
8 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị onwe anyị kwesịrị ilekwasị Jehova anya na ọ bụ ya ga-enye anyị amamihe. (Ilu 2:6) N’ezie, Jehova adịghị enye anyị amamihe n’ụzọ ọrụ ebube. Otú ọ dị, ọ na-aza ekpere anyị na-ekpesi ike ka o nye anyị amamihe nke ga-enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’imeri ihe ịma aka ndị na-abịara anyị ná ndụ. (Jems 1:5) Anyị kwesịrị itinye mgbalị dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta amamihe ahụ. Anyị kwesịrị ịdị na-achọ ya “dị ka akụ̀ zoro ezo.” (Ilu 2:1-6) Ee, anyị kwesịrị ịnọgide na-enyochasi Okwu Chineke ike, bụ́ ebe e kpughere amamihe ya. Anyị kwesịkwara ibi ndụ dị ka ihe anyị na-amụta si dị. Ihe nlereanya nke Ọkpara Jehova setịpụrụ bara uru karịsịa n’inyere anyị aka inweta amamihe. Ka anyị tụlee ụzọ dị iche iche Jizọs si gosi amamihe wee mụta otú anyị pụrụ isi ṅomie ya.
Okwu Amamihe
E kpughere amamihe Chineke n’ime Baịbụl
9. Gịnị mere amamihe dị ukwuu ji dịrị n’ozizi Jizọs?
9 Ndị mmadụ gbakọrọ n’ìgwè n’ebe Jizọs nọ ka ha gere okwu ya. (Mak 6:31-34; Luk 5:1-3) Ọ bụghị ihe ijuanya, n’ihi na mgbe ọ bụla Jizọs mepere ọnụ, ihe ọ na-ekwu bụ okwu na-egosi amamihe pụrụ iche! Ozizi ya gosiri na ọ maruru Okwu Chineke ala, nweekwa ikike na-enweghị atụ ịmata ihe mere ihe ji mee. Ozizi ya na-amasị ndị si ebe niile, ọ bakwara uru mgbe niile. Tụlee ihe atụ ụfọdụ ndị na-egosi na amamihe dị n’ihe Jizọs kwuru, onye bụ́ “Onye Ndụmọdụ Dị Ebube” e buru n’amụma.—Aịzaya 9:6.
10. Olee àgwà ọma ndị Jizọs gbara anyị ume ka anyị mụta, n’ihi gịnịkwa?
10 Ozizi Elu Ugwu ahụ, nke e kwuru banyere ya ná mmalite, bụ okwu kasị ogologo Jizọs kwuru n’ozizi ya nke a na-agbakwụnyeghị nkọwa nke onye dere ya ma ọ bụ okwu ndị ọzọ kwuru. N’ozizi a, ndụmọdụ Jizọs nyere anyị abụghị naanị ka anyị na-ekwu okwu kwesịrị ekwesị, na-akpakwa àgwà kwesịrị ekwesị. Ndụmọdụ o nyere anyị karịrị nnọọ nke ahụ. Ebe Jizọs maara na ọ bụ echiche mmadụ na otú obi ya dị na-eme ka onye ahụ kwuo ihe ọ bụla o kwuru, meekwa ihe ọ bụla o mere, ọ gbara anyị ume ka anyị mụta inwe àgwà ọma n’uche anyị nakwa n’obi anyị, ya bụ, àgwà ndị dị ka ịdị nwayọọ n’obi, agụụ ime ezi omume, ime ebere na ịchọ udo, na ịhụ ndị ọzọ n’anya. (Matiu 5:5-9, 43-48) Ọ bụrụ na anyị amụta inwe àgwà ndị ahụ n’obi anyị, ọ ga-eme ka okwu anyị na omume anyị na-atọ Jehova ụtọ, meekwa ka mmekọrịta nke anyị na ndị mmadụ ibe anyị dị mma.—Matiu 5:16.
11. Mgbe Jizọs na-enye ndụmọdụ banyere ime mmehie, olee otú o si arụtụ aka n’ihe na-akpata ya?
11 Mgbe Jizọs na-enye ndụmọdụ banyere ime mmehie, ọ na-arụtụ aka n’ihe na-akpata ya. Ihe ọ gwara anyị abụghị naanị ka anyị zere ime ihe ike. Kama, ọ dọkwara anyị aka ná ntị ka anyị ghara ibu iwe n’obi. (Matiu 5:21, 22; 1 Jọn 3:15) Ọ bụghị naanị na ọ machibidoro ịkwa iko iwu. Kama, ọ dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara inwe agụụ mmekọahụ nke na-amalite n’obi mmadụ wee duga onye ahụ n’ime omume ekwesịghị ntụkwasị obi dị otú ahụ. Ọ na-adụ anyị ọdụ ka anyị ghara ikwe ka anya anyị mee ka anyị nwee ọchịchọ na-ezighị ezi, nweekwa agụụ ihe ọjọọ. (Matiu 5:27-30) Jizọs na-elekwasị anya n’ihe na-akpata nsogbu, ọ bụghị naanị n’ihe na-egosi na nsogbu dị. Ọ na-eleba anya n’àgwà na ọchịchọ ndị na-akpata ime mmehie.—Abụ Ọma 7:14.
12. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si ele ndụmọdụ ya anya, n’ihi gịnịkwa?
12 Amamihe dị n’okwu Jizọs n’ezie! Ka a sịkwa ihe mere ‘otú o si ezi ihe ji ju ìgwè mmadụ ahụ anya.’ (Matiu 7:28) Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ ya, anyị na-ele ndụmọdụ ya anya dị ka ihe ga na-eduzi anyị ná ndụ. Anyị na-achọsi ike ka anyị mụta àgwà ọma ndị ahụ ọ kụziri—ma ebere ma udo ma ịhụnanya—ebe anyị maara na ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ime omume dị Chineke mma. Anyị na-agbalịsi ike iwepụ echiche na ọchịchọ na-adịghị mma ndị ọ sịrị anyị enwela n’obi anyị, ya bụ, àgwà ndị dị ka oké iwe, agụụ ime omume rụrụ arụ, ebe anyị maara na ime otú ahụ ga-enyere anyị aka izere ime mmehie.—Jems 1:14, 15.
Iji Amamihe Na-ebi Ndụ
13, 14. Gịnị gosiri na Jizọs ji ezi uche họrọ otú o si bie ndụ?
13 Jizọs gosiri amamihe, ọ bụghị naanị n’okwu, kamakwa n’omume. Ụzọ ndụ ya niile—ma mkpebi ya, ma otú o si na-ele onwe ya anya, ma otú o si na-emeso ndị ọzọ ihe—gosiri amamihe n’ụzọ dị iche iche mara mma. Tụlee ihe atụ ụfọdụ ndị na-egosi na Jizọs ji “ezi amamihe na ikike iche echiche” bie ndụ.—Ilu 3:21.
14 Amamihe gụnyere inwe ezi uche. Jizọs ji ezi uche họrọ otú o si bie ndụ. Cheedị echiche ụdị ndụ ọ gaara ebi—ụdị ụlọ ọ gaara arụ, ụdị ọrụ e ji akpata ego ọ gaara enwe, ma ọ bụ otú ọ gaara abụru onye a ma ama n’ụwa! Jizọs maara na mmadụ imikpu ndụ ya n’ịchụ ihe ndị ahụ ‘bụ ihe efu, bụrụkwa ịchụso ifufe.’ (Ekliziastis 4:4; 5:10) Ụdị ndụ ahụ bụ nzuzu, ya bụ, enweghị amamihe. Jizọs họọrọ ime ka otú o si ebi ndụ dịrị mfe. O nweghị mmasị n’ịchụ ego ma ọ bụ n’ịkpata akụ̀. (Matiu 8:20) Dị ka ọ kụziiri ndị mmadụ, o lekwasịrị anya kpọmkwem n’otu ihe, ya bụ, ime uche Chineke. (Matiu 6:22) Jizọs ji amamihe were oge ya na ike ya rụọ ọrụ metụtara Alaeze Chineke, bụ́ ọrụ dị mkpa, nke bakwara uru, karịa akụ̀. (Matiu 6:19-21) O si otú ahụ setịpụrụ anyị ihe nlereanya anyị kwesịrị iṅomi.
15. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si egosi na ha na-elegide anya n’otu ebe, gịnịkwa mere nke a ji bụrụ ihe amamihe dị na ya?
15 Ndị na-eso ụzọ Jizọs taa na-ahụ na amamihe dị n’ilegide anya n’otu ebe. Ya mere, ha na-ezere iji ụgwọ na-enweghị isi bogbuo onwe ha, tinyere ịchụ ihe nke ụwa nke na-adọpụ uche mmadụ gabiga ókè, meekwa ka ike gwụ onye ahụ. (1 Timoti 6:9, 10) Ọtụtụ ndị emeela ihe ụfọdụ ka otú ha si ebi ndụ dịrị mfe, ka ha nwee ike itinyekwu oge n’ozi Ndị Kraịst, ikekwe, ọbụna inwe ike ije ozi dị ka ndị nkwusa oge niile nke Alaeze Chineke. Ọ dịghị ihe ọzọ amamihe dị na ya karịa nke a, n’ihi na idebe ihe metụtara Alaeze Chineke n’ọnọdụ kwesịrị ya na-eme ka mmadụ nweta obi ụtọ na afọ ojuju kasị ukwuu.—Matiu 6:33.
16, 17. (a) Olee ụzọ ụfọdụ Jizọs si gosi na ya dị obi umeala, nakwa na ihe ọ tụrụ anya ime bụ ihe ọ ga-emeli? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị dị obi umeala, nakwa na ihe anyị na-atụ anya ime bụ ihe anyị ga-emeli?
16 Baịbụl jikọtara amamihe na ịdị obi umeala, nke gụnyere ịmara ebe ike anyị ruru. (Ilu 11:2) Jizọs dị obi umeala. Ihe ọ tụkwara anya ime bụ ihe ọ ga-emeli. Ọ maara na ya agaghị eme ka ndị niile nụrụ ozi ya chegharịa. (Matiu 10:32-39) Ọ ghọtakwara na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka ya onwe ya pụrụ izi ozi ọma. Ya mere, o ji amamihe nyefee ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:18-20) O ji ịdị obi umeala kwuo na ha ‘ga-arụ ọrụ karịrị’ nke ọ rụrụ, n’ihi na ndị ha ga-ezi ozi ọma ga-adị ọtụtụ karịa ndị o ziri. Ebe ha ga-ezirukwa ozi ọma ga-aka ebe o ziri, oge ha ga-ezirukwa ozi ọma ga-aka oge o ziri ozi ọma. (Jọn 14:12) Jizọs matakwara na ya etofebeghị inweta enyemaka. Ọ nabatara aka ndị mmụọ ozi ndị bịara ijere ya ozi n’ala ịkpa nyeere ya, nabatakwa aka otu mmụọ ozi nke bịara mee ka ọ dị ike nyeere ya n’ogige Getsemeni. Mgbe enyemaka dị Ọkpara Chineke mkpa karịsịa, o tiri mkpu ka e nyere ya aka.—Matiu 4:11; Luk 22:43; Hibru 5:7.
17 Anyị onwe anyị kwesịrị ịdị obi umeala. Ihe anyị na-atụkwa anya ime kwesịrị ịbụ ihe anyị ga-emeli. N’ezie, anyị kwesịrị iji obi anyị dum na-agbalịsi ike n’ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Luk 13:24; Ndị Kọlọsi 3:23) Ma, anyị kwesịrị icheta na Jehova adịghị eji onye ọ bụla n’ime anyị atụnyere ibe ya. Anyị ekwesịghịkwa ime otú ahụ. (Ndị Galeshia 6:4) Ezi amamihe ga-enyere anyị aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke anyị nwere ike iru, dị ka ike anyị na ọnọdụ anyị si dị. Amamihe ga-enyekwara ndị e nyere ọrụ n’ọgbakọ aka ịghọta na e nwere ihe ha na-agaghị emeli, ghọtakwa na enyemaka na agbamume dị ha mkpa mgbe mgbe. Ịdị obi umeala ga-emekwa ka ndị dị otú ahụ were obiọma nabata aka a na-enyere ha, ghọta na Jehova pụrụ iji onye kwere ekwe ibe ha ‘nyere ha aka, meekwa ka ha dị ike.’—Ndị Kọlọsi 4:11.
18, 19. (a) Gịnị na-egosi na Jizọs ji ezi uche na obiọma meso ndị na-eso ụzọ ya ihe? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị iji ezi uche na obiọma na-emeso ibe anyị ihe, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke a?
18 Jems 3:17 kwuru, sị: ‘Amamihe nke si n’elu . . . nwere ezi uche.’ Jizọs ji ezi uche na obiọma meso ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ maara mmejọ ha nke ọma, ma ọ hụrụ àgwà ọma ha nwere. (Jọn 1:47) Ọ maara na ha ga-ahapụ ya gbaa ọsọ n’abalị ahụ a ga-ejide ya, ma o nweghị obi abụọ na ha ga-eguzosi ike n’ebe ọ nọ. (Matiu 26:31-35; Luk 22:28-30) Pita gọrọ agọ ugboro atọ na ya amaghị onye Jizọs bụ. Ma, Jizọs rịọsiri arịrịọ ike n’ihi Pita, gosikwa na ya nwere obi ike na ọ ga-ekwesị ntụkwasị obi. (Luk 22:31-34) Mgbe Jizọs na-ekpeku Nna ya ekpere n’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’ụwa, o lekwasịghị anya n’ihe ndị na-eso ụzọ ya mejọrọ. Kama nke ahụ, o kwuru okwu ọma banyere omume ha mere ruo n’abalị ahụ, sị: ‘Ha edebewo okwu gị.” (Jọn 17:6) N’agbanyeghị ezughị okè ha, o nyefere ha ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 28:19, 20) Obi ike na okwukwe o nwere n’ebe ha nọ mere n’ezie ka ha nwee ike ịrụ ọrụ ahụ o nyere ha iwu ka ha rụọ.
19 Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị iṅomi ihe nlereanya o setịpụrụ na nke a. Ọ bụrụ na Ọkpara Chineke, bụ́ onye zuru okè, ji ndidi meso ndị na-eso ụzọ ya na-ezughị okè ihe, anyị onwe anyị bụ́ ụmụ mmadụ ndị na-eme mmehie kwesịrị iji ezi uche na-emeso ibe anyị ihe! (Ndị Filipaị 4:5) Kama ilekwasị anya n’adịghị ike nke Ndị Kraịst ibe anyị, anyị kwesịrị ịhụ àgwà ọma ha nwere. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya icheta na Jehova adọtawo ha. (Jọn 6:44) Ya mere, ọ ghaghị ịbụ na ọ hụrụ àgwà ọma ụfọdụ ha nwere, otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ịhụ àgwà ọma ha nwere. Ụdị echiche ahụ ga-enyere anyị aka ọ bụghị naanị “ileghara mmejọ anya,” kamakwa ịchọpụta ebe ndị anyị pụrụ ịja ndị ọzọ mma. (Ilu 19:11) Mgbe anyị gosiri na anyị nwere obi ike n’ebe ụmụnna anyị nọ, anyị na-enyere ha aka ime ihe niile ha pụrụ ime n’ijere Jehova ozi, nweekwa ọṅụ n’ije ozi ahụ.—1 Ndị Tesalonaịka 5:11.
20. Gịnị ka anyị kwesịrị iji akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke amamihe nke dị na Matiu, Mak, Luk na Jọn mee, n’ihi gịnịkwa?
20 Ihe ndị a kọrọ banyere ndụ Jizọs na ozi ya na Matiu, Mak, Luk na Jọn bụ n’ezie akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke amamihe! Gịnị ka anyị kwesịrị iji onyinye a dị oké ọnụ ahịa mee? Mgbe Jizọs na-emechi Ozizi Elu Ugwu ahụ, ihe ọ gbara ndị na-ege ya ntị ume ime abụghị naanị ịnụ okwu amamihe ya, kamakwa, ime ya eme, ma ọ bụ itinye ya n’ọrụ. (Matiu 7:24-27) Ime ka echiche anyị, ọchịchọ anyị, na omume anyị kwekọọ n’okwu amamihe Jizọs na omume ya ga-enyere anyị aka ibi ndụ kasị mma a pụrụ ibi ugbu a, nyekwara anyị aka ịnọgide n’okporo ụzọ nke na-eduba ná ndụ ebighị. (Matiu 7:13, 14) N’ezie, ọ dịghị ihe ka mma ma ọ bụ ihe amamihe dị na ya karị anyị pụrụ ime!
a Ihe e ji mara okwu ahụ Jizọs kwuru n’ụbọchị ahụ bụ Ozizi Elu Ugwu. Dị ka e si dee ya na Matiu 5:3–7:27, ọ dị amaokwu otu narị na asaa. A pụkwara ikwucha ya n’ihe dị ka naanị minit iri abụọ.
b O doro anya na mgbe “eluigwe meghere” n’oge e mere Jizọs baptizim, e nyere ya ikike icheta ndụ ọ dịrị tupu ya aghọọ mmadụ.—Matiu 3:13-17.