-
“Ike Ya Agwụla M!”Teta!—2010 | Eprel
-
-
“Ike Ya Agwụla M!”
Ụlọ a adịghị mma n’anya n’ihi na e leghaara ya anya. Oké ifufe na oké mmiri ozuzo akpaala ya aka ọjọọ kemgbe ọtụtụ afọ. Ugbu a ike agwụla ya, o yikwara ihe ga-ada taa na echi.
OTÚ ahụ ụlọ ahụ dị bụ otú ọtụtụ alụmdi na nwunye taa dị. Ò nwere mgbe ọ na-adị gị ka alụmdi na nwunye gị ọ̀ na-aga itisa? Ya bụrụ na o nwere, obi amapụla gị n’ihi na o nweghị di na nwunye na-anaghị enwe nsogbu. Baịbụl kwudịrị hoo haa na ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe “ọtụtụ nsogbu.”—1 Ndị Kọrịnt 7:28, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.
Iji gosi na ihe ahụ Baịbụl kwuru bụ eziokwu, mmadụ atọ ndị na-eme nnyocha kwuru na alụmdi na nwunye bụ “ihe kacha ebutere ụmụ mmadụ nsogbu, ọ bụkwa ihe ọtụtụ ndị na-etinye isi na ya n’oge anyị a.” Ha kwukwara, sị: “Alụmdi na nwunye e ji obi ụtọ bido, nke a tụkwara anya na ọ ga-adịgide otú ahụ, nwere ike ịghọ ihe kacha agbawa obi na ihe kacha akpata mwute ná ndụ.”
Olee otú alụmdi na nwunye nke gị dị? Ná nsogbu ndị a e dere n’okpuru ebe a, ò nwere otu n’ime ha ma ọ bụ karịa nke na-akpa ya aka ọjọọ?
● Ịrụkarị ụka
● Okwu ọjọọ
● Ịgba n’èzí
● Ibu iwe n’obi
Ọ bụrụ na alụmdi na nwunye gị dị ka ụlọ ahụ ike gwụrụla, nke yikwara ka ọ̀ ga-ada taa na echi, gịnị ka i kwesịrị ime? Ọ̀ bụ ịgba alụkwaghịm ga-ebi nsogbu unu?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 3]
‘IHE MMADỤ OLE NA OLE NA-EMEBU NKE GHỌRỌ IHE ỌTỤTỤ NDỊ NA-EME’
Ná mba ụfọdụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm bụzi ájá. Ka anyị were mba Amerịka mee ihe atụ. Ọtụtụ afọ gara aga, ọ na-esi ike ịhụ di na nwunye gbara alụkwaghịm. Babra Dafoo Waịthed dere n’akwụkwọ ya nke kwuru banyere ịgba alụkwaghịm na mgbe afọ 1960 gachara, “ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm rịrị elu n’ụdị dị egwu.” Ọ sịrị: “N’ihe na-erughị afọ iri, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm mụbara okpukpu abụọ, ọ nọgidekwara na-arị elu ruo ihe dị ka afọ 1984. N’oge ahụ, ọ rịrị elu otú ọ na-arịtụbeghị mbụ ná mba ndị mepere emepe, ọ rịtukwaghị arịtu. N’ihi otú ịgba alụkwaghịm si rịa elu ngwa ngwa n’Amerịka n’arịtughị arịtu, n’ime afọ iri atọ, o sizi n’ihe mmadụ ole na ole na-eme ghọọ ihe ọtụtụ ndị na-eme.”
-
-
Ihe Anọ I Kwesịrị Ịma Banyere Ịgba AlụkwaghịmTeta!—2010 | Eprel
-
-
Ihe Anọ I Kwesịrị Ịma Banyere Ịgba Alụkwaghịm
Mgbe ndị nwe ụlọ ahụ tụlechara ihe ndị mebirinụ, ha ga-ekpebi ma ihe ha ga-eme ọ̀ bụ ịkụtu ya ka ọ̀ bụ ịrụzi ya.
Ọ̀ BỤ ụdị ihe a ka ị na-eche banyere alụmdi na nwunye gị? O nwere ike di gị ma ọ bụ nwunye gị aghọọla nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu ma ọ bụ ya abụrụ na okwu unu na-esekarị emeela ka ị ghara inwezi obi ụtọ n’alụmdi na nwunye unu. Ya bụrụ otú ahụ, ihe i nwere ike ịna-eche bụ, ‘Anyị ahụghịzi onwe anyị n’anya’ ma ọ bụ ‘Anyị ekwesịghịdị ịlụ’ ma ọ bụkwanụ ‘Anyị amaghị ebe anyị lewere anya gaa lụọ.’ Ihe i nwedịrị ike ichewe bụ, ‘Ịgba alụkwaghịm dị ka ọ̀ ga-akara anyị mma.’
Kama iji ọsọ gbaa di gị ma ọ bụ nwunye gị alụkwaghịm, ọ ka mma ichebara ya echiche nke ọma. Ịgba alụkwaghịm abụghị ihe na-ebi nsogbu mmadụ na-enwe ná ndụ ya. Kama, ihe ọ na-emekarị bụ iwepụ nsogbu ụfọdụ ma butere gị ndị ọhụrụ. Ọka mmụta bụ́ Brad Saks kwuru n’otu akwụkwọ o dere, sị: “Di na nwunye ndị na-achọ ịgba alụkwaghịm na-eche na ọ ga-eme ka nsogbu ha bie. Ha na-ewere na ịgba alụkwaghịm ga-adị ha ka mmadụ isi n’ebe e nwere oké ifufe na oké mmiri ozuzo gafee n’ebe dị jụụ ahụ́ ga-eru ya ala. Ma otú ahụ a na-enweghị di na nwunye na-anaghị enwe nsogbu, otú ahụkwa ka ịgba alụkwaghịm na-agaghị eme ka nsogbu ha niile bie.” N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa na mmadụ ga-aghọta ihe niile ya na ịgba alụkwaghịm so tupu o kpebiwe ma ọ̀ ga-agba alụkwaghịm.
Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ịgba Alụkwaghịm
Baịbụl ejighị okwu ịgba alụkwaghịm egwu egwu. O kwuru na Jehova Chineke kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị, nakwa na o weere onye gbara nwunye ya ma ọ bụ di ya alụkwaghịm n’ihi ihe na-enweghị isi ka onye aghụghọ, nke ka nke ma ọ bụrụ na ihe onye ahụ bu n’obi gbaa alụkwaghịm bụ ịlụ onye ọzọ. (Malakaị 2:13-16) Di na nwunye ekwesịghị itisa etisa. (Matiu 19:6) Ọtụtụ ndị di na nwunye tisaranụ n’ihi ihe ndị na-enweghị isi agaaraghị etisa ma a sị na ha mụtara ịgbagharakwu ibe ha.—Matiu 18:21, 22.
Ma, Baịbụl kwuru na otu ihe nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye gbaa ibe ya alụkwaghịm ma lụrụ onye ọzọ bụ ịkwa iko. (Matiu 19:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọpụta na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko, i nwere ike ịgba ya alụkwaghịm. Ndị ọzọ ekwesịghị ịtụrụ gị ihe ị ga-eme, ihe anyị bu n’obi dee isiokwu a abụghịkwa ịgwa gị ihe ị ga-eme. Ọ bụ gịnwa ga-ebu ihe ọ bụla ga-esi ná mkpebi i mere pụta; n’ihi ya, ọ bụ naanị gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme.—Ndị Galeshia 6:5.
Ka o sina dị, Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.” (Ilu 14:15) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko, nke bụ́ ihe Baịbụl kwuru mere i nwere ike iji gbaa ya alụkwaghịm, ọ ga-adị mma ma i chebara ya echiche ma mara nsogbu ịgba alụkwaghịm nwere ike ịkpatara gị. (1 Ndị Kọrịnt 6:12) Otu nwoke bi na Briten aha ya bụ Devid sịrị: “Ụfọdụ nwere ike iche na ha kwesịrị ikpebi ịgba alụkwaghịm n’egbughị oge. Ma kemgbe m gbachara alụkwaghịm, achọpụtala m na mmadụ kwesịrị iwepụta oge chebara ya echiche tupu ya ekpebie ma ò kwesịrị ịgba alụkwaghịm.”a
Ka anyị tụlee ihe anọ dị mkpa i kwesịrị ichebara echiche. Ka anyị na-atụle ha, biko buru n’uche na o nweghị onye ọ bụla n’ime ndị gbara alụkwaghịm e kwuru okwu ha ebe a nke kwuru na mkpebi ya mere adịghị mma. Ma, ihe ndị ha kwuru gosiri ụfọdụ nsogbu ndị gbara alụkwaghịm na-enwekarị ma ọtụtụ ọnwa ma ọ bụdị ọtụtụ afọ gafee.
1 Ụkọ Ego
Daniela, onye bi n’Ịtali, na di ya ebiela afọ iri na abụọ tupu ya achọpụta na di ya na otu nwaanyị ya na di ya na-arụkọ ọrụ na-eme enyi. Daniela kwuru, sị, “Tupu m mara ihe na-eme, nwaanyị ahụ dịzi ime ọnwa isii.”
Daniela na di ya kewara ruo oge ụfọdụ tupu ya ekpebizie ịgba di ya alụkwaghịm. Ọ sịrị, “Agbalịrị m ka anyị ghara ịgba alụkwaghịm, ma di m ka nọkwa na-achụ nwaanyị.” Daniela weere na ya mere mkpebi dị mma. Ma, ọ sịrị: “Ozugbo m gbara di m alụkwaghịm, ihe bịara siere m ezigbo ike, nke na mgbe ụfọdụ, anaghị m ahụ ego m ga-eji azụta nri abalị. Naanị ihe m na-eme bụ ịṅụ otu iko mmiri ara ehi.”
Ụdị ihe ahụ mekwara Marịa, onye bi na Spen. Ọ sịrị, “Mgbe mụ na di m gbara alụkwaghịm, ọ kwụsịrị inye anyị ego, n’ihi ya, abịara m rụwa ọrụ karịa otú m kwesịrị ịrụ iji nwee ike ịkwụ ụgwọ ndị o ji. Esikwa m n’ọmarịcha ụlọ anyị bi kwapụ, kwagazie n’otu obere ụlọ nke dị n’ógbè na-adịchaghị mma obibi.”
Ihe a ndị a kọrọ gosiri na ịgba alụkwaghịm na-emekarị ka ụmụ nwaanyị nọrọ n’ụkọ ego. Nnyocha e mere ruo afọ asaa na Yurop gosidịrị na di na nwunye gbaa alụkwaghịm, nwoke anaghị emefuchazi ego otú o si emefubu, ebe nwaanyị na-amalitezi imefu ego karịa ka ọ na-emefubu. Mike Yensịn, onyeisi ndị mere nnyocha a, kwuru na “Ihe mere o ji esiri ụfọdụ ụmụ nwaanyị ike bụ n’ihi na ọ bụ ha ga-achọta ọrụ, na-elekọta ụmụ ha, ma na-edi obi mgbawa ịgba alụkwaghịm ahụ kpataara ha.” Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Lọndọn sịrị na ụfọdụ ndị ọkàiwu kwuru na nsogbu ndị a ụfọdụ ndị gbara alụkwaghịm na-enwe “na-emezi ka ndị mmadụ ghara iji ọsọ na-agba alụkwaghịm.”
Ihe nwere ike ime: Ọ bụrụ na ị gbaa alụkwaghịm, i nwere ike na-emefuzi ego karịa otú i si emefubu. O nwekwara ike ime ka i si ebe i bi kwapụ. Ọ bụrụ gịnwa kpọọrọ ụmụ unu, o nwere ike isiri gị ike ịkpata ihe ga na-ezuru ma gị ma ụmụ unu.—1 Timoti 5:8.
2 Okwu Ilekọta Ụmụ
Otu nwaanyị bi na Briten aha ya bụ Jen kwuru sị, “O riri m ọnụ mgbe m chọpụtara na di m nwere nwaanyị ya na ya na-eme enyi. Ike ụwa bịara gwụ m mgbe m hụrụ na o kpebiela ịhapụ anyị.” Jen gbara di ya alụkwaghịm. Obi ka siri ya ike na ihe ya mere dị mma, ma ọ sịrị: “Otu nsogbu m nwere bụ ịrụ ọrụ mama nakwa nke papa. Ọ bụ m na-ekpebi ihe niile a ga-eme.”
Ụdị ihe ahụ mekwara Grisila, bụ́ otu nwaanyị bi na Spen, ya na di ya gbara alụkwaghịm. Ọ sịrị, “Ọ bụ m kpọọrọ nwa anyị nwoke dị afọ iri na isii. Ma ịzụ nwa dị afọ iri na isii abụghị obere ọrụ, ọ dịghịkwa mgbe m bu n’obi ịzụ ya naanị m. Ebere m ákwá ọtụtụ ụbọchị. Ọ bịara dị m ka erughị m eru ịbụ nne.”
Ndị nke ụlọ ikpe gwara na ha abụọ ga-azụ nwa ha na-enwekwa nsogbu ọzọ. O nwere ike isiri ha abụọ ike ịbịakọta ọnụ kwurịta oge nwa ahụ ga-anọ na nke onye ọ bụla n’ime ha, ego ole a ga-eji na-elekọta ya, na otú a ga-esi na-adọ ya aka ná ntị. Otu nne bi na Amerịka aha ya bụ Kristen, onye ya na di ya gbara alụkwaghịm, sịrị: “Ọ naghị adị mfe nwaanyị na onye bụ́bu di ya ikwurịta ihe ndị ha chọrọ ikwu n’eseghị okwu. Ọtụtụ ihe ga na-abata gị n’uche, ọ bụrụkwa na ị kpachaghị anya, i nwere ike jiri nwa unu na-enweta ihe ọ bụla ị chọrọ n’aka ya.”
Ihe nwere ike ime: O nwere ike otú ụlọ ikpe kpebiri ka unu si na-azụ nwa unu agaghị abụ otú ị chọrọ. Ọ bụrụ na unu abụọ na-azụ nwa unu, o nwere ike ihe onye nke ọzọ ga-ekwu gbasara oge nwa ahụ ga-anọ na nke onye ọ bụla n’ime unu, ego ole a ga-eji na-elekọta nwa ahụ, na ihe ndị ọzọ, agaghị adị gị mma.
3 Otú Ịgba Alụkwaghịm Si Emetụta Gị
Nwunye otu nwoke bi na Briten, aha ya bụ Mak, mewara ya obi ihe karịrị otu ugboro. Mak sịrị: “Mgbe nke abụọ mere, ọ dị m ka m gaghị edili ya ma o mee ya ọzọ.” Mak gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ chọpụtara na ya ka hụkwara ya n’anya. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla ndị mmadụ kwuru okwu ọjọọ gbasara ya, ha na-eche na ha na-eme ka obi dị m mma; ma ha amaghị na ọ na-ewe m iwe. Ịhụnanya anaghị eji ike ala.”
Otu ihe ahụ mekwara Devid, onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a. Mgbe ọ chọpụtara na nwunye ya na nwoke ọzọ na-eme enyi, ike ụwa gwụrụ ya. Ọ sịrị: “O nyeghị m ọnụ okwu. N’eziokwu o nweghị mgbe m chọrọ ka ihe ọ bụla kewaa mụ na ya na ụmụ anyị.” Devid gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ maghị otú ụwa ya ga-adị adị. Ọ sịrị: “Ụjọ m bụ ma m̀ ga-ahụkwa onye ga-eji obi ya niile hụ m n’anya ma ọ bụ ma ụdị ihe a ọ̀ ga-eme ọzọ ma m lụọ onye ọzọ. Obi anaghịzi aka m n’ihe ọ bụla m na-eme.”
Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị gbara alụkwaghịm, o doro anya na ọtụtụ ihe ga na-aga gị n’uche. Ma, o nwekwara ike ị ka hụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ahụ n’anya, bụ́ onye gị na ya bụbu otu anụ ahụ́. (Jenesis 2:24) Ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na iwe ihe ahụ merenụ ka na-ewe gị. Grisila, onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “Ọtụtụ afọ gachaadị, ọ ka ga na-agbagwoju gị anya otú unu si gbasaa, ọ ga na-adị gị ka à kparịrị gị, ike ụwa ana-agwụkwa gị. Ị ga na-echeta oge ndị gị na ya bụ nnu na mmanụ, gị ana-eche sị: ‘Ọ naara agwa m na ụwa gaara agbụ ya ma a sị na ọ lụghị m. Ọ̀ pụtaziri na ọ na-aghara m ụgha n’oge ahụ? Gịnị mere ihe a ji mee?’”
Ihe nwere ike ime: O nwere ike iwe ihe ahụ di gị ma ọ bụ nwunye gị mere gị agaghị apụ gị apụ n’obi. Mgbe ụfọdụ, ụdị owu ga-ama gị agaghị enye gị ọnụ okwu.—Ilu 14:29; 18:1.
4 Otú Ịgba Alụkwaghịm Si Emetụta Ụmụaka
Otu nwoke onye Spen ya na nwunye ya gbara alụkwaghịm, aha ya bụ Hozeyi, sịrị: “Ihe nwunye m mere riri m ọnụ. Nke ka njọ bụ mgbe m chọpụtara na ọ bụ di nwanne m nwaanyị ka ya na ya na-eme enyi. Ọ dị m ka ọnwụ bịa gburu m.” Hozeyi chọpụtara na o nwere otú ihe ahụ nwunye ya mere si kpaa ụmụ ya nwoke dị afọ abụọ na afọ anọ aka ọjọọ. Ọ sịrị: “Ha enweghị ike ịghọta ihe na-emenụ. Ha aghọtaghị ihe mere mama ha na di nwanne papa ha ji biri, nakwa ihe mere m ji kpọrọ ha gaa bikwuru nwanne m nwaanyị na mama m. O nwee ebe m chọrọ ịga, ha ajụwa m, ‘Olee mgbe ị ga-alọta?’ ma ọ bụkwanụ ha asị, ‘Papa, ahapụkwala anyị!’”
Ọ na-abụkarị ụmụaka na-ata ahụhụ ma di na nwunye gbaa alụkwaghịm. Ma ọ́ bụrụkwanụ na di na nwunye na-esekarị okwu? Ọ̀ ga-akara ụmụ ha mma ma ha gbaa alụkwaghịm? Na nso nso a, ọtụtụ ndị na-ekwuzi na ọ naghị akara ha mma, karịchaa ma ọ bụrụ na nsogbu di na nwunye ahụ abụghị nke ha na-amaghị otú a ga-esi eme ya. Otu akwụkwọ kwuru gbasara ịgba alụkwaghịm, sịrị: “Ọ ga-eju ọtụtụ di na nwunye ndị na-esekarị okwu anya ma a gwa ha na enwechaghị ihe ụmụ ha ji esemokwu ha kpọrọ. Ọ bụrụhaala na ezinụlọ ha bikọtara ọnụ, ha achọghịdị ịma ma mama ha na papa ha hà na-esekarị okwu.”
N’eziokwu, ụmụaka na-ama mgbe ndị mụrụ ha na-ese okwu, esemokwu nne na nna ha nwekwara ike ime ka ahụ́ ghara iru ha ala. Ma, ọ dịghị mma ichewe na nne na nna ha ịgba alụkwaghịm kaara ha mma. Linda J. Waịt na Magị Galaga kwuru n’akwụkwọ ha dere banyere alụmdi na nwunye, sị: “Ezinụlọ bụ ebe nne na nna ga-enwe ike inye ụmụ ha ọzụzụ otú dị mma, na otú ọ ga-abara ụmụaka ahụ uru, a sịgodị na nne ha na nna ha na-esekarị okwu.”
Ihe nwere ike ime: Ịgba alụkwaghịm nwere ike ịkpa ụmụaka gị aka ọjọọ, karịchaa ma ọ bụrụ na ị naghị ekwe ka ha na papa ha ma ọ bụ mama ha ahụ gị na ya gbara alụkwaghịm dịrị ná mma.—Gụọ igbe bụ́ “Ọ Dị M Ka M̀ Tọrọ Atọ.”
N’isiokwu a, a tụlere ụzọ ihe anọ i kwesịrị ichebara echiche ma ọ bụrụ na ị na-eche echiche ịgba di gị ma ọ bụ nwunye gị alụkwaghịm. Dị ka anyị kwuru na mbụ, ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko, ọ bụ gị ga-ekpebi ma ị̀ ga-agba ya alụkwaghịm. Chetakwa na ọ bụ gị ga-eji isi gị ebu ihe si na mkpebi ọ bụla i mere pụta. Buru nsogbu ndị ị ga-enwe n’obi, jikerekwa ịma ihe ị ga-eme banyere ha.
I chebachaara ya echiche, i nwere ike ịchọpụta na ọ ga-aka mma idozi nsogbu unu na-enwe. Ma ọ̀ ga-ekwe omume idozi ya?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Aha a kpọrọ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
[Igbe dị na peeji nke 6]
“IHE NWATAKỊRỊ Ọ BỤLA KWESỊRỊ INWE”
“Mgbe m dị afọ ise, papa m na odeakwụkwọ ya kwara iko, nke mere ka papa m na mama m gbaa alụkwaghịm. Ha abụọ mere ike ha niile ilekọta m otú kwesịrịnụ dị ka ha nwere ike ime n’oge ahụ. Ha na-agwakwa m na ha ka hụrụ m nnọọ n’anya n’agbanyeghị na ha ahụghịzi ibe ha n’anya. Mgbe papa m mechara kwafee n’ụlọ naanị ya bi, ha abụọ nọgidere na-enye m ihe ndị dị m mkpa.
“Ka afọ abụọ gachara, mama m lụrụ di ọzọ, anyị akwagakwa mba ọzọ. N’ihi ya, ọ na-ete aka tupu mụ ahụ papa m. Naanị otu ugbo ka m hụrụla ya n’ime afọ itoolu gara aga. Mụ na ya ahụkebeghị anya mgbe m na-etolite, ọ hụbeghịkwa ụmụ m atọ bụ́ ụmụ ụmụ ya. Naanị ihe ọ maara banyere ha bụ ihe ndị m kọọrọ ya n’akwụkwọ ozi nakwa foto ha ndị m zigaara ya. Ọ na-ewute ụmụ m na ha amaghị nna mama ha.
“N’ihi alụkwaghịm papa m na mama m gbara, o nweghị mgbe obi na-adị m mma. Iwe na-ejukarị m obi mgbe niile, ike ụwa na-agwụkwa m, ahụ́ anaghị eru m ala, amaghịkwa m ihe kpatara ya. Anatụdịghị m atụkwasị ụmụ nwoke obi. Ọ bụ mgbe m gaferela afọ iri atọ ka otu enyi m katarala ahụ́ nyeere m aka ịghọta ihe mere anaghị m atụkwasịli ụmụ nwoke obi, ọ bụkwa mgbe ahụ ka m bidoro gbalịwa ịtụkwasị ha obi.
“Alụkwaghịm papa m na mama m gbara mere ka m ghara inwe ihe nwatakịrị ọ bụla kwesịrị inwe, nke bụ́, inwe obi iru ala na ịma na ndị mụrụ ya ga-echebe ya. Ịhụnanya adịghị n’ụwa a, ihe ndị na-eme na ya na-atụkwa ụjọ, ma m ga-asị na ezinụlọ bụ ebe a na-echebe nwatakịrị, ebe ọ ga-abụ ya lọta ya enwee onye ga-elekọta ya ma kasie ya obi. Ma di na nwunye gbasahaala, a gaghịzi enwe ebe ga-echebe nwatakịrị ahụ.”—Diyan.
[Igbe dị na peeji nke 7]
“Ọ DỊ M KA M̀ TỌRỌ ATỌ”
“Ndị mụrụ m gbara alụkwaghịm mgbe m dị afọ iri na abụọ. Enwere m ike ịsị na obi bịara rutụ m ala, n’ihi na ụlọ anyị abụghịzi ọgbọ agha; ọgụ nne na nna m na-alụkarị kwụsịrị. N’agbanyeghị nke ahụ, obi anaghị adịcha m mma.
“Mgbe ha gbachara alụkwaghịm, agbalịrị m ike m niile ịhụ na mụ na ha abụọ dịcha ná mma nakwa ka a ghara inwe onye nke ọ bụla chere na m ka hụ ya n’anya. N’agbanyeghị mgbalị niile m mere, ọ na-adịkarị m ka m̀ tọrọ atọ. Papa m gwara m na ọ na-adị ya ka mama m ọ̀ ga-eme ka m kpọọ ya asị. N’ihi ya, m na-eme ka obi sie ya ike mgbe niile na mama m anaghị agwa m ụdị ihe ahụ. Ọ dịkwa mama m otú ahụ. Ọ gwara m na ụjọ ya bụ na m ga-ekwere ihe ọjọọ papa m na-akọrọ m banyere ya. O ruziri n’ókè nke na anaghịzi m achọ ịkọrọ onye nke ọ bụla n’ime ha ihe mụ na ya na-alụ, n’ihi na achọghị m ịkpasu onye ọ bụla iwe. N’ihi ya, malite mgbe m dị afọ iri na abụọ, anaghịzi m akọrọ onye ọ bụla otú alụkwaghịm papa m na mama m gbara dị m n’obi.”—Sandra.
-
-
Ùnu Nwere Ike Idozi Nsogbu Unu?Teta!—2010 | Eprel
-
-
Ùnu Nwere Ike Idozi Nsogbu Unu?
Ndị nwe ụlọ ahụ kwetara na ụlọ ha na-achọ ịda, ha ekpebiekwala ịrụzi ya.
Ị̀ GA-ACHỌ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị biwekwa nke ọma? Ya bụrụ na ị ga-achọ, olee ebe ị ga-ebido? Gbalịa mee ihe ndị a.
1 Kpebienụ ihe unu ga-eme.
Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwekọrịta na unu ga-edozi nsogbu ọ bụla unu nwere. Detuonụ ihe unu kpebiri edetu. Obi gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị dịrị n’alụmdi na nwunye unu, ọ ga na-adị unu abụọ ọkụ n’obi idozi nsogbu ọ bụla unu nwere.—Ekliziastis 4:9, 10.
2 Chọpụtanụ ihe bụ́ nsogbu unu.
Gịnị seere unu okwu? Ná nkenke, dee ihe i chere unu na-anaghị emetecha ma ọ bụkwanụ ihe unu na-eme ị ga-achọ ka unu kwụsị ime. (Ndị Efesọs 4:22-24) O nwere ike nsogbu ị ga-achọpụta ga-adị iche na nke di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-achọpụta.
3 Nweenụ ihe mgbaru ọsọ.
Olee otú ị ga-achọ ka alụmdi na nwunye unu dịrị n’ọnwa isii na-abịa abịa? Olee mgbanwe ndị ị ga-achọ ka unu mee? Detuo ihe ndị a ị chọrọ edetu. Mgbe ị ghọtara ihe ndị ọ dị mkpa ka unu dozie, ọ ga-adịrị gị mfe ime ihe ndị unu kpebiri.—1 Ndị Kọrịnt 9:26.
4 Meenụ ihe Baịbụl kwuru.
Ozugbo ị chọpụtara ihe bụ́ nsogbu unu, marakwa mgbanwe ndị ị ga-achọ ka unu mee, chọpụta ndụmọdụ Baịbụl ndị ga-enyere gị aka. Ndụmọdụ ya na-aba uru mgbe niile, ha na-enyekwara mmadụ aka. (Aịzaya 48:17; 2 Timoti 3:17) Dị ka ihe atụ, Baịbụl gbara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ume ka unu na-agbaghara ibe unu. Baịbụl kwudịrị na ‘ileghara mmejọ anya bụ ịma mma.’—Ilu 19:11; Ndị Efesọs 4:32.
O yigodị ka mgbalị gị arụpụtaghị ihe ọ bụla ná mmalite, ike agwụla gị! Otu akwụkwọ na-ekwu gbasara alụmdi na nwunye kwuru ezigbo ihe a chọpụtara n’otu nnyocha e mere. Ọ sịrị: “Ihe a chọpụtara tụrụ onye ọ bụla n’anya: E kee ndị di na nwunye na-enwe nsogbu ụzọ ise, ihe dị ka ụzọ anọ n’ime ha ndị na-agbasaghị n’oge ahụ ha nwere nsogbu chọpụtara na ka afọ ise gachara, alụmdi na nwunye ha bịara ka mma.” Di na nwunye ndị kwudịrị na ha anaghị enwe obi ụtọ mechara nwewe obi ụtọ.
Ụdị ihe a nwekwara ike ime na nke gị. Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ebi akwụkwọ a, achọpụtala na Baịbụl nwere ndụmọdụ ndị ga-abara di na nwunye uru. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ di na nwunye na-aka enwe obi ụtọ ma ha na-egosi ibe ha obiọma, obi ọmịiko ma na-agbaghara ibe ha kpamkpam. Ndị nwunye achọpụtala uru ọ bara inwe “mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ,” ndị di ahụkwa na ọ na-abara ha ezigbo uru ma ọ bụrụ na ha anaghị eweso nwunye ha oké iwe.—1 Pita 3:4; Ndị Kọlọsi 3:19.
Ndụmọdụ ndị a si n’Akwụkwọ Nsọ na-aba nnọọ uru n’ihi na ọ bụ Jehova Chineke, onye e dere uche ya na Baịbụl, bidoro alụmdi na nwunye. Ọ́ gaghị adị mma ma ị gwa Ndịàmà Jehova ka ha kọwakwuoro gị otú Baịbụl ga-esi enyere gị aka n’alụmdi na nwunye gị?a
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke dị peeji 192, ka o nyere ndị ezinụlọ dị iche iche aka. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ị ga-eme, jiri otu n’ime adres dị na peeji nke ise na magazin a detara ndị bipụtara ya akwụkwọ ozi.
-