Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/15 p. 14-19
  • Ịdị Ndụ N’okwukwe ná Nkwa Chineke

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịdị Ndụ N’okwukwe ná Nkwa Chineke
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Akpaara Mmekọrịta Ya na Ụmụ Mmadụ Ókè
  • Chineke Emee Ihe Iji mezuo Uche Ya
  • Chineke Na-ebu Ụzọ Ahụ Ọdịnihu
  • Ọrụ Ihe Owuwu Buru Ibu
  • Jehova Akwadoo Ọrụ Ahụ
  • Adala Mbà Ma Ọlị!
  • O “So Ezi Chineke Jee Ije”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • O “So Ezi Chineke Jee Ije”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • E Chebere “Ya na Mmadụ Asaa Ndị Ọzọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/15 p. 14-19

Ịdị Ndụ N’okwukwe ná Nkwa Chineke

“Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị; abụ m Chineke, ọ dịghịkwa otu efu dị ka Mụ onwe m; na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie.”—AỊSAỊA 46:9, 10.

1, 2. Olee echiche ụfọdụ dịgasị iche e nwere banyere ókè Chineke na-etinyeru aka n’ihe ndị na-eme n’ụwa?

OLEE ókè Chineke na-etinyeru aka n’ihe ndị na-eme n’ụwa? Echiche ndị e nwere dịgasị iche. Otu echiche bụ na ọ dịghị etinye aka ma ọlị. N’ịbụ onye kesịworo ihe nile, ma ọ́ bụghị na ọ chọghị ọ bụrụ na o nweghị ike imere anyị ihe. N’echiche a, Chineke dị ka nna nke dokwasịrị nwa ya nwoke n’elu ịnyịnya ígwè ọhụrụ, mee ka o guzozie, ma nupụ ya ka nwa ya nwoke gbadawa n’okporo ámá. Mgbe nke ahụ gasịrị, nna ahụ apụọ. Nwa okoro ahụ nọ nanị ya; o nwere ike ịda, ma ọ bụ o nwere ike ọ gaghị ada. Otú ọ bụla o si dị, okwu ahụ apụọla n’aka nna ya.

2 Echiche ọzọ bụ na Chineke na-eduzi nnọọ akụkụ nile nke ndụ anyị nakwa na ọ na-etinye aka kpọmkwem n’ihe omume nile nke ihe ndị o kere eke. Otú ọ dị, ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, ụfọdụ pụrụ ikwubi na ọ bụghị nanị na Chineke na-akpata ezi ihe ndị na-emenụ kamakwa mpụ na ọdachi ndị na-emekpa ihe a kpọrọ mmadụ ahụ. Ịmara eziokwu banyere otú Chineke si eme ihe ga-enyere anyị aka ịmara ihe anyị ga-atụ anya n’aka ya. Ọ ga-emekwa ka okwukwe anyị sie ike ná mmezu e ji n’aka nke nkwa ya nile.—Ndị Hibru 11:1.

3. (a) Olee otú anyị si mara na Jehova bụ Chineke nke nzube? (b) N’ihi gịnị ka e ji kwuo banyere Jehova dị ka onye ‘na-ezube’ na onye ‘na-akpụzi’ nzube ya?

3 Eziokwu ahụ bụ́ na Jehova bụ Chineke nke nzube bụ isi ihe wetara okwu banyere ókè Chineke na-etinyeru aka n’ihe omume ụmụ mmadụ. Nke ahụ pụtara ìhè kpọmkwem n’aha ya. “Jehova” pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” N’ụzọ na-agawanye n’ihu, Jehova na-eme onwe ya ka ọ bụrụ Onye Mmezu nke nkwa ya nile. N’ihi ya, e kwuru banyere Jehova dị ka onye ‘na-ezube,’ ma ọ bụ na-akpụzi, nzube ya banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. (2 Ndị Eze 19:25; Aịsaịa 46:11) Okwu ndị a sitere n’okwu Hibru bụ́ ya·tsarʹ, nke ya na okwu pụtara “ọkpụite” nwere njikọ. (Jeremaịa 18:4) Dị nnọọ ka ọkpụite nwere nkà pụrụ ịkpụzi ọkpụrụkpụ ụrọ ịghọ ite mara mma, Jehova pụrụ ịkpụzi, ma ọ bụ chịkwaa ihe iji mezuo uche ya.—Ndị Efesọs 1:11.

4. Olee otú Chineke si kwadebe ụwa maka ụmụ mmadụ ibi na ya?

4 Dị ka ihe atụ, Chineke zubere ka ụwa bụrụ ebe mara ezigbo mma nke ụmụ mmadụ zuru okè bụ́ ndị na-erube isi ga-ebi. (Aịsaịa 45:18) Ogologo oge tupu o kee nwoke na nwanyị mbụ ahụ, Jehova ji ịhụnanya mee nkwadebe maka ha. Isiakwụkwọ ndị mbụ nke Jenesis na-akọwa otú Jehova si guzobe ehihie na abalị, ala na osimiri. Mgbe nke ahụ gasịrị, o kere ahịhịa ndụ na ụmụ anụmanụ. Nkwadebe a a kwadebere ụwa maka ụmụ mmadụ ibi na ya were ọtụtụ puku afọ. A rụzuru ọrụ ahụ n’ụzọ gara nke ọma. Nwoke na nwanyị mbụ ahụ malitere ndụ ha n’Iden, bụ́ paradaịs mara mma nke e tinyejuru ihe iji mee ka ha nwee ike ịnụ ụtọ ndụ. (Jenesis 1:31) Jehova si otú a tinye aka kpọmkwem n’ihe ndị na-eme n’ụwa, na-akpụzi ọrụ ya nile n’ụzọ na-agawanye n’ihu iji mezuo nzube ya bụ́ ịgba. Mmụba ezinụlọ mmadụ ọ̀ gbanwere òkè ọ na-ekere?

Jehova Akpaara Mmekọrịta Ya na Ụmụ Mmadụ Ókè

5, 6. N’ihi gịnị ka Chineke ji akpara mmekọrịta ya na ndị mmadụ ókè?

5 Jehova adịghị atụzi ma ọ bụ na-achịkwa ihe nile ụmụ mmadụ na-eme ọ bụ ezie na o nwere ikike ime otú ahụ. E nwere ihe ndị kpatara nke a. Otu bụ na e kere ụmụ mmadụ n’onyinyo Chineke, na-enwere onwe ha ime nhọrọ. Jehova adịghị amanye anyị ime ihe ndị o nyere n’iwu; anyị abụghịkwa ndị a na-achịkwa ihe nile ha na-eme. (Deuterọnọmi 30:19, 20; Joshua 24:15) Ọ bụ ezie na anyị ga-aza ya ajụjụ n’ihi omume anyị, Chineke ejiriwo ịhụnanya nye anyị nnwere onwe ruo n’ókè ụfọdụ ikpebi otú anyị ga-esi adị ndụ anyị.—Ndị Rom 14:12; Ndị Hibru 4:13.

6 Ihe ọzọ mere Chineke adịghị atụzi ihe nile na-emenụ metụtara ihe iseokwu ahụ Setan welitere n’Iden. Setan mara ọbụbụeze Chineke aka. O nyere Iv ihe yiri ka ọ bụ ohere maka nnwere onwe—onyinye nke ya onwe ya, e mesịakwa di ya, bụ́ Adam, nabatara. (Jenesis 3:1-6) Ná mmeghachi omume, Chineke ekwewo ka ụmụ mmadụ chịa onwe ha ruo oge ụfọdụ iji nwapụta ma ịma aka Setan ò ziri ezi. N’ihi nke a, a pụghị ịta Chineke ụta maka ihe na-ezighị ezi ndị mmadụ na-eme taa. Mosis dere banyere ndị na-enupụ isi, sị: “Ha ebibiwo onwe ha, ọ bụghị nke ụmụ [Chineke] ka ọrụ nke dị ha n’ahụ bụ.”—Deuterọnọmi 32:5.

7. Gịnị bụ nzube Jehova maka ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ?

7 Otú ọ dị, ọ bụ ezie na Jehova kwere ka mmadụ nwere onwe ya ime nhọrọ na ịnwale ịchị onwe ya n’adabereghị n’ebe Ọ nọ, Ọ kpawabeghị àgwà nke aka m adịghị ya banyere ihe ndị na-eme n’ụwa, bụ́ nke ga-eme ka anyị nwee olileanya dị nta na ọ ga-emezu nkwa ya nile. Ọ bụ ezie na Adam na Iv nupụụrụ ọbụbụeze Chineke isi, Jehova agbanweghị nzube ịhụnanya ya maka ụwa na maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ ga-agbanwerịrị ụwa ịghọ paradaịs nke ndị zuru okè, na-erube isi, ma na-enwe obi ụtọ ga-ebijupụta. (Luk 23:42, 43) Ihe ndekọ Bible site na Jenesis ruo Mkpughe na-akọwa otú Jehova siworo na-arụ ọrụ n’ụzọ na-agawanye n’ihu iji mezuo nzube ahụ.

Chineke Emee Ihe Iji mezuo Uche Ya

8. Gịnị ka ịkpọbata ụmụ Israel n’Ala Nkwa ahụ gụnyere?

8 N’ihe o so mba Israel mekọọ, Chineke gosipụtara na ya ga-emezu nzube ya. Dị ka ihe atụ, Jehova mesiri Mosis obi ike na Ya ga-agbapụta ụmụ Israel n’aka Ijipt ma kpọbata ha n’Ala Nkwa ahụ, bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. (Ọpụpụ 3:8) Nke a bụ nkwupụta dị mkpa ma na-emesi obi ike. Ọ ga-agụnye ịtọhapụ ụmụ Israel—ndị ọnụ ọgụgụ ha na ndị enyi ha dị ihe dị ka nde atọ—n’aka mba dị ike nke megidere nnọọ ọpụpụ ha. (Ọpụpụ 3:19) Ọ bụ mba ndị dị ike bụ́ ndị ga-eguzogide nnọọ mbịarute ha, bi n’ala ahụ a ga-akpọba ha. (Deuterọnọmi 7:1) E nwere ọzara n’agbata mba abụọ ahụ bụ́ ebe nri na mmiri ga-adị ụmụ Israel mkpa. Nke a bụ ọnọdụ nyere Jehova ohere igosipụta ọkaaka nke ike ya nakwa na ọ bụ Chineke.—Levitikọs 25:38.

9, 10. (a) N’ihi gịnị ka Joshua ji nwee ike ịgba akaebe na nkwa nile nke Chineke bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha? (b) Olee otú anyị inwe obi ike n’ikike Chineke nwere ịkwụghachi ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ dịruru ná mkpa?

9 Chineke si n’Ijipt kpọpụta ụmụ Israel site n’ịrụ ọtụtụ ọrụ dị ike. Nke mbụ, o wetaara mba Ijipt ihe otiti iri ndị bibiri ihe. Ọzọ, o kewara Osimiri Uhie, na-eme ka ụmụ Israel nwee ike ịlafere ebe usuu ndị agha Ijipt na-achụ ha lara n’iyi. (Abụ Ọma 78:12, 13, 43-51) Mgbe nke ahụ gasịrị, o lekọtara ụmụ Israel n’ime afọ 40 ha nọrọ n’ọzara, na-eji manna azụ ha, na-enye ha mmiri, ọbụna na-ahụ na uwe mgbokwasị ha akaghị aka nakwa na ụkwụ ha azaghị aza. (Deuterọnọmi 8:3, 4) Mgbe ụmụ Israel banyesịrị n’Ala Nkwa ahụ, Jehova dugara ha n’imeri ndị iro ha. Joshua, bụ́ onye nwere okwukwe siri ike ná nkwa nile nke Jehova, ji anya ya hụrụ ihe ndị a nile. Ọ bụ ya mere o ji nwee ike iji obi ike gwa ndị okenye nke oge ya, sị: “Unu amawo n’obi unu nile na n’ime mkpụrụ obi unu nile, na ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu.”—Joshua 23:14.

10 Dị ka Joshua nke oge ochie, ndị Kraịst taa nwere obi ike zuru ezu na Chineke chọrọ ma nwee ikike imere ndị na-ejere ya ozi ihe. Nkwenye a siri ike bụ akụkụ dị oké mkpa nke okwukwe anyị. Pọl onyeozi dere, sị: “A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ . . . [na-egosi] Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.

Chineke Na-ebu Ụzọ Ahụ Ọdịnihu

11. Ihe ndị dị aṅaa na-eme ka Chineke nwee ike imezu nkwa ya?

11 Ka ọ dịgodị, anyị ahụwo na ọ bụ ezie na Chineke kwere ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha ime nhọrọ ma na-achị onwe ha n’adabereghị n’ebe ọ nọ, o nwere ma ikike ma ọchịchọ ime ihe iji mezuo nzube ya. Ma, e nwere ihe ọzọ na-atụnye ụtụ ná mmezu e ji n’aka nke nkwa Chineke. Jehova pụrụ ibu ụzọ hụ ọdịnihu. (Aịsaịa 42:9) Chineke kwuru site n’ọnụ onye amụma ya, sị: “Chetanụ ihe mbụ nile site na mgbe ebighị ebi gara aga: n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị; abụ m Chineke, ọ dịghịkwa otu efu dị ka Mụ onwe m; na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie; na-asị, Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme.” (Aịsaịa 46:9, 10) Onye ọrụ ubi nwere ahụmahụ maara mgbe na ebe ọ ga-akụ mkpụrụ, ma ọ ka pụrụ inwe obi abụọ banyere otú ha ga-esi too. Otú ọ dị, “Eze nke mgbe nile” nwere ezi ihe ọmụma nke ibu ụzọ hụ kpọmkwem mgbe na ebe o kwesịrị ime ihe iji mezuo nzube ya.—1 Timoti 1:17.

12. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si gosipụta na o bu ụzọ mara ihe ndị ga-eme n’ụbọchị Noa?

12 Tụlee otú Chineke si gosipụta na o bu ụzọ mara ihe ga-eme n’oge Noa. N’ihi ihe ọjọọ jupụtara n’ụwa, Chineke kpebisiri ike ibibi ihe a kpọrọ mmadụ na-enupụ isi. O yiri oge mgbe ọ ga-eme nke a, afọ 120 n’ihu. (Jenesis 6:3) N’iyi oge ahụ a kapịrị ọnụ, Jehova chebaara ihe karịrị mbibi nke ndị ajọ omume echiche, bụ́ nke ọ pụrụ ime mgbe ọ bụla. Oge Jehova yiri nyekwara ohere maka nchebe nke ndị ezi omume. (Tụlee Jenesis 5:29.) N’amamihe ya, Chineke bu ụzọ mara oge ọ ga-eyi ọrụ nke ga-eduga n’ọgwụgwụ ahụ. O nyere Noa ihe ọmụma zuru nnọọ ezu. Noa ga-ewu ụgbọ maka “ịzọpụta ezinụlọ Ya,” iju mmiri zuru ụwa ọnụ gajekwa ibibi ndị ajọ omume.—Ndị Hibru 11:7; Jenesis 6:13, 14, 18, 19.

Ọrụ Ihe Owuwu Buru Ibu

13, 14. N’ihi gịnị ka owuwu ụgbọ ahụ ji bụrụ ọrụ na-ama aka?

13 Tụlee ọrụ a n’ụzọ Noa si lee ya anya. Ebe ọ bụ na Noa bụ onye nke Chineke, ọ maara na Jehova pụrụ ibibi ndị na-adịghị asọpụrụ Ya. Otú ọ dị, tupu nke ahụ emee, e nwere ọrụ a ga-arụ—ọrụ nke chọrọ okwukwe. Owuwu nke ụgbọ ahụ ga-abụ ọrụ buru ibu. Chineke ekwuwo kpọmkwem otú ọ ga-aha. Ụgbọ ahụ ga-adị ogologo karịa ámá egwuregwu ụfọdụ nke oge a, ọ ga-adịkwa elu ruo ogo ụlọ elu dị okpukpu ise. (Jenesis 6:15) Ndị ga-ewu ya ga-abụ ndị na-enweghị ahụmahụ n’iwu ihe ma dị ole na ole. Ha agaghị enwe ngwá ọrụ ndị bụ́ ọkpọka e nwere taa. Ọzọkwa, ebe ọ bụ na Noa enweghị ikike dị ka Jehova nwere nke ibu ụzọ ama ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọ dịghị otú ọ ga-esi mara ọnọdụ ndị a ga-enwe ka oge na-aga bụ́ ndị pụrụ inye aka ma ọ bụ weta ihe mgbochi n’ọrụ ihe owuwu ahụ. O yikarịrị ka Noa ò chebaara ọtụtụ ajụjụ echiche. Olee otú a ga-esi chịkọta ihe ndị a ga-eji ewu ihe owuwu ahụ? Olee otú ọ ga-esi kpọkọta ụmụ anụmanụ ndị ahụ? Olee nri ndị ga-adị mkpa, ọ̀ bụkwa n’ókè hà aṅaa? Olee mgbe Iju Mmiri ahụ e buru n’amụma ga-abịa kpọmkwem?

14 Mgbe ahụ e nwere ọnọdụ ndị metụtara ọha na eze. Ajọ omume jupụtara ebe nile. Ndị Nefilim—ndị bụ́ ọkara mmụọ ọkara mmadụ bụ́ ụmụ nke ajọ ndị mmụọ ozi na ndị inyom—ji ime ihe ike mejupụta ụwa. (Jenesis 6:1-4, 13) Ọzọkwa, iwu ụgbọ agaghị abụ ọrụ a pụrụ ịrụ na nzuzo. Ndị mmadụ ga-achọ ịma ihe Noa na-eme, ọ ga-agwakwa ha. (2 Pita 2:5) À pụrụ ịtụ anya ka ha lee ya anya ọma? Ọ dịghị ma ọlị! Ụfọdụ afọ tupu mgbe ahụ, Inọk kwesịrị ntụkwasị obi kpọsara mbibi nke ndị ajọ omume. Ozi ya adịghị nnọọ ọha na eze mma nke na Chineke “kuuru ya,” ma ọ bụ mee ka ndụ ya dị mkpirikpi, ihe àmà na-egosi na ọ bụ iji gbochie ndị iro Ya igbu ya. (Jenesis 5:24; Ndị Hibru 11:5; Jud 14, 15) Ọ bụghị nanị na Noa ga-akpọsa ozi na-agaghị adị ọha na eze mma otú ahụ kama ọ ga-ewukwa ụgbọ. Ka a na-ewu ụgbọ ahụ, ọ ga-abụ ihe ncheta dị ike banyere ikwesị ntụkwasị obi Noa n’agbanyeghị ajọ ndị ọgbọ!

15. N’ihi gịnị ka Noa ji nwee obi ike na ya pụrụ ịrụzu ọrụ ya?

15 Noa maara na ọrụ ahụ nwere nkwado na ngọzi nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ọ́ bụghị Jehova n’onwe ya nyere ọrụ ahụ? Jehova mesiri Noa obi ike na ya na ezinụlọ ya ga-abanye n’ụgbọ a rụchara arụcha ma bụrụ ndị e chebere ndụ ha gabiga Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ. Ọbụna Chineke ji ọgbụgba ndụ mesie ya ike na nke ahụ bụ ihe e ji n’aka. (Jenesis 6:18, 19) Ma eleghị anya, Noa ghọtara na Jehova chere echiche ma tụlee ihe nile ọrụ ahụ gụnyere tupu o kenye ya ya. Ọzọkwa, Noa maara na Jehova nwere ikike nke inye aka mgbe ọ dị mkpa. Ya mere okwukwe Noa kwaliri ya ime ihe. Dị ka nwa ya bụ́ Abraham, Noa “na-ekwezukwa na ihe [Chineke] kwererịị ná nkwa, Ọ pụrụ imekwa.”—Ndị Rom 4:21.

16. Ka ọrụ owuwu ụgbọ ahụ gara n’ihu, olee otú e si mee ka okwukwe Noa sikwuo ike?

16 Ka ọtụtụ afọ gabigara, ụgbọ ahụ akwụrụkwa, e mere ka okwukwe Noa sikwuo ike. E doziri nsogbu ihe owuwu na ihe ndị metụtara ya. E meriri ọnwụnwa dị iche iche. Ọ dịghị mmegide ọ bụla pụrụ ịkwụsị ọrụ ahụ. Ezinụlọ Noa nwere nkwado na nchebe Jehova. Ka Noa nọgidesiri ike, ‘nnwapụta nke okwukwe ya rụpụtara ntachi obi.’ (Jemes 1:2-4) N’ikpeazụ, a rụchara ụgbọ ahụ, Iju Mmiri ahụ bịara, Noa na ezinụlọ ya lanarịkwara. Noa hụrụ mmezu nke nkwa Chineke, dị ka Joshua hụrụ mgbe e mesịrị. A kwụghachiri okwukwe Noa ụgwọ ọrụ.

Jehova Akwadoo Ọrụ Ahụ

17. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka oge anyị si yie oge Noa?

17 Jisọs buru amụma na oge anyị ga-eyi oge Noa. Chineke ekpebiwo ọzọ ibibi ndị ajọ omume, o yiwokwa oge nke a ga-eme. (Matiu 24:36-39) O mewokwa nkwadebe maka ichebe ndị ezi omume. Ọ bụ ezie na Noa ga-ewu ụgbọ, ndị ohu Chineke taa ga-akpọsa nzube Jehova, kụzie Okwu ya, meekwa ndị na-eso ụzọ.—Matiu 28:19.

18, 19. Olee otú anyị si mara na Chineke na-akwado nkwusa nke ozi ọma ahụ?

18 Ọ bụrụ na Jehova anọnyeghịrị Noa iji kwado ma nyere ya aka, a garaghị ewu ụgbọ ahụ. (Tụlee Abụ Ọma 127:1.) N’otu aka ahụ, e wezụga nkwado Jehova, ezi Iso Ụzọ Kraịst eyighị ka ọ ga-adịgide, ya fọdụzie inwe ọganihu. Gameliel, bụ́ onye Farisii a na-asọpụrụ nke bụ́kwa onye nkụzi Iwu ahụ ghọtara nke a na narị afọ mbụ. Mgbe òtù Sanhedrin ndị Juu chọrọ igbu ndị ozi, ọ dọrọ òtù ikpe ahụ aka ná ntị, sị: “Wepụnụ aka n’ahụ mmadụ ndị a, hapụkwanụ ha: n’ihi na ọ bụrụ na izu a ma ọ bụ ọrụ a sitere n’aka mmadụ, a ga-akwatu ya n’ala: ma ọ bụrụ na o sitere n’aka Chineke, unu agaghị apụ ịkwatu ha n’ala.”—Ọrụ 5:38, 39.

19 Ịga nke ọma nke ọrụ nkwusa ahụ, ma na narị afọ mbụ ma taa, egosiwo na ọrụ a esiteghị n’aka mmadụ, kama o sitere n’aka Chineke. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ụfọdụ n’ime ọnọdụ na ihe omume ndị na-akpali mmasị bụ́ ndị nyeworo aka ime ka ọrụ a gaa nnọọ nke ọma n’ọ̀tụ̀tụ̀ sara mbara otú a.

Adala Mbà Ma Ọlị!

20. Olee ndị na-akwado anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ?

20 Ọ bụ ezie na anyị na-ebi ‘n’oge dị oké egwu,’ anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova na-achịkwa ihe nile n’ụzọ zuru ezu. Ọ na-akwado ma na-enyere ndị ya aka ka ha na-arụ ọrụ iji kwusazuo ozi ọma ahụ tupu oge Chineke kara aka iweta ajọ usoro ihe a ná njedebe eruo. (2 Timoti 3:1; Matiu 24:14) Jehova na-akpọ anyị òkù ịbụ “ndị ha na [ya] na-arụkọ ọrụ.” (1 Ndị Kọrint 3:9) Obi sikwara anyị ike na Kraịst Jisọs nọnyeere anyị n’ọrụ a nakwa na anyị pụrụ ịdabere ná nkwado na nduzi nke ndị mmụọ ozi.—Matiu 28:20; Mkpughe 14:6.

21. Nkwenyesi ike dị aṅaa ka anyị na-ekwesịghị ịhapụ ahapụ?

21 Ebe ọ bụ na Noa na ezinụlọ ya gosipụtara okwukwe ná nkwa nile nke Jehova, a zọpụtara ha gabiga iju mmiri ahụ. A ga-azọpụta ndị na-egosipụta okwukwe yiri nke ahụ taa gabiga ‘oké mkpagbu’ ahụ. (Mkpughe 7:14) Anyị na-ebi n’oge na-akpali akpali n’ezie. Ihe omume ndị dị mkpa dị n’ihu! N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ihe iji weta eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ dị ebube nke ezi omume ga-ebi n’ime ha. (2 Pita 3:13) Ya adịla mgbe ị ga-ahapụ nkwenye i kwenyesiri ike na Chineke pụrụ ime ihe ọ bụla o kwuru.—Ndị Rom 4:21.

Isi Ihe Ndị A Ga-echeta

◻ N’ihi gịnị ka Jehova na-ejighị achịkwa ihe omume nile nke mmadụ?

◻ Olee otú ikike Jehova nwere imezu nzube ya si pụta ìhè n’ụzọ o si mesoo Israel ihe?

◻ Olee otú e si gosipụta ikike Jehova nwere ibu ụzọ hụ ọdịnihu n’oge Noa?

◻ Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe ná nkwa nile nke Chineke?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya