Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 13 p. 129-138
  • “M Hụrụ Nna M n’Anya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “M Hụrụ Nna M n’Anya”
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụdị Ịhụnanya Kasị Ochie, nke Kasịkwa Sie Ike
  • Otú Jizọs Si Mee Ka Ịhụnanya Ọ Hụrụ Jehova Sie Ike
  • Ị̀ Ga-eṅomi Ịhụnanya Jizọs Hụrụ Jehova?
  • “O Bu Ụzọ Hụ Anyị n’Anya”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Hụ Chineke nke Hụrụ Gị n’Anya n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • “Hụ Jehova Bụ́ Chineke Gị n’Anya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 13 p. 129-138

ISI NKE IRI NA ATỌ

“M Hụrụ Nna M n’Anya”

1, 2. Gịnị ka Jọn onyeozi mere ka a mata banyere abalị ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọrọ?

OTU agadi nwoke metụrụ mkpịsị akwụkwọ ya na ink. Ihe ọ na-echeta ọ ga-ede juru ya isi. Aha nwoke a bụ Jọn. Ọ bụ onye ikpeazụ fọrọ n’ime ndịozi Jizọs Kraịst. Ugbu a Jọn dị ihe dị ka otu narị afọ, o chetara otu abalị ọ na-apụghị ichefu echefu n’ihe dị ka afọ iri asaa gara aga, ya bụ, abalị ikpeazụ ya na ndịozi ibe ya na Jizọs nọrọ tupu Jizọs anwụọ. Mmụọ nsọ Chineke nke na-eduzi Jọn mere ka o nwee ike icheta ihe ndị mere eme, deekwa ha n’ụzọ zuru ezu.

2 N’abalị ahụ, Jizọs mere ka o doo anya na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya. Ọ bụ naanị Jọn mere ka a mata ihe mere Jizọs ji kweta ịnwụ ụdị ọnwụ ahụ nke na-egbu mgbu. Ọ sịrị: “Ka ụwa wee mara na m hụrụ Nna m n’anya, ọbụna dị ka Nna m nyere m iwu ka m mee, otú ahụ ka m na-eme. Bilienụ, ka anyị pụọ n’ebe a.”—Jọn 14:31.

3. Olee otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ Nna ya n’anya?

3 “M hụrụ Nna m n’anya.” Ọ dịghị ihe dị Jizọs mkpa karịa nke a. Ọ pụtaghị na o kwuru okwu a ugboro ugboro. N’ezie, ọ bụ naanị na Jọn 14:31 bụ ebe anyị hụrụ Jizọs kwuru kpọmkwem otú a n’ime Baịbụl na ya hụrụ Nna ya n’anya. Otú ọ dị, Jizọs biri ndụ gosiri na ihe o kwuru bụ eziokwu. Kwa ụbọchị, o gosiri na ọ hụrụ Jehova n’anya. Obi ike Jizọs, nrubeisi ya, na ntachi obi ya gosiri na ọ hụrụ Chineke n’anya. Ọ bụ ịhụnanya kpaliri ya ije ozi dum o jere.

4, 5. Olee ụdị ịhụnanya Baịbụl kwusiri okwu ike banyere ya, gịnịkwa ka a pụrụ ikwu banyere ịhụnanya Jizọs hụrụ Jehova?

4 Taa, ụfọdụ pụrụ iche na mmadụ inwe ịhụnanya na-egosi na ọ dịghị ike. Ha pụrụ icheta uri ịhụnanya na abụ ịhụnanya. Ma eleghị anya, ha pụkwara icheta otú e si eji ịhụnanya nwoke na nwaanyị eme ihe egwuregwu mgbe ụfọdụ. Baịbụl kwuru banyere ịhụnanya nwoke na nwaanyị, kama, ọ bụ n’ụzọ nkwanye ùgwù karịa otú e si ekwu banyere ya n’oge anyị a. (Ilu 5:15-21) Okwu Chineke kwuru okwu nke ukwuu karị banyere ụdị ịhụnanya ọzọ. Ịhụnanya a abụghị mmetụta nkịtị nke mmadụ pụrụ inwe n’obi ya ruo nwa oge; ọ bụghịkwa ihe na-agwụ ike nke e chepụtara echepụta. Ọ na-emetụta obi mmadụ na uche mmadụ. Ụdị ịhụnanya ahụ na-esi n’ala ala obi. Ọ bụ nke ụkpụrụ dị elu na-achị. A na-egosikwa ya site n’ime omume ọma. Ọ bụtụdịghị ihe e ji egwuri egwu. Okwu Chineke sịrị: “Ịhụnanya adịghị ada ada.”—1 Ndị Kọrịnt 13:8.

5 N’ime ụmụ mmadụ niile dịworo ndụ, ọ bụ Jizọs hụrụ Jehova n’anya karịsịa. Ọ dịghị onye ka Jizọs n’imezu okwu ahụ ya onwe ya kwuru, nke bụ́ iwu kasị ukwuu n’ime iwu niile Chineke nyere, ya bụ: “Jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) Olee otú Jizọs si mụta ụdị ịhụnanya a? Olee otú o si mee ka ịhụnanya ọ hụrụ Chineke sie ike mgbe ọ nọ n’ụwa? Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ya?

Ụdị Ịhụnanya Kasị Ochie, nke Kasịkwa Sie Ike

6, 7. Olee otú anyị si mara na Ilu 8:22-31 na-akọwa Ọkpara Chineke, ọ bụghị amamihe nkịtị?

6 Ọ̀ dịtụla mgbe gị na enyi gị rụkọrọ ọrụ, i wee chọpụta na o mere ka unu abụọ ghọkwuo ezi ndị enyi na-akpachi anya? Mmekọrịta obi ụtọ ahụ pụrụ inyere gị aka ịghọta ịhụnanya nke dị n’etiti Jehova na Ọkpara ọ mụrụ naanị ya. Anyị ekwuola ugboro ugboro banyere Ilu 8:30. Ma, ka anyị lebakwuo anya n’amaokwu ahụ, ya na amaokwu ndị gbara ya gburugburu. Malite n’amaokwu nke iri abụọ na abụọ ruo na nke iri atọ na otu, anyị na-ahụ otú e si si n’ike mmụọ nsọ kọwaa amamihe dị ka à ga-asị na ọ bụ mmadụ. Olee otú anyị si mara na ọ bụ Ọkpara Chineke ka a na-ekwu banyere ya?

7 N’amaokwu nke iri abụọ na abụọ, amamihe sịrị: “Jehova kere m dị ka mmalite nke ụzọ ya, ihe mbụ n’ime ihe niile ọ rụrụ n’oge dị anya gara aga.” Ọ ghaghị ịbụ na amamihe a na-ekwu okwu ya abụghị amamihe nkịtị, n’ihi na ọ dịghị mgbe ‘e kere’ amamihe eke. O nweghị mmalite n’ihi na Jehova nọ anọ mgbe niile. O nwekwara amamihe mgbe niile. (Abụ Ọma 90:2) Otú ọ dị, Ọkpara Chineke bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” E kere ya eke; ọ bụ ya bụ onye mbụ n’ime ihe niile Jehova kere. (Ndị Kọlọsi 1:15) Ọkpara ahụ nọ tupu e kee ụwa na eluigwe, dị ka a kọwara n’akwụkwọ Ilu. Ebe ọ bụ Okwu ahụ, ya bụ, Ọnụ na-ekwuru Chineke, ọ bụ ya gosiri amamihe Jehova n’ụzọ zuru okè.—Jọn 1:1.

8. Gịnị ka Ọkpara ahụ rụrụ n’ogologo oge ọ dịrị ndụ tupu ya aghọọ mmadụ, gịnịkwa ka anyị pụrụ icheta mgbe ihe e kere eke anyị na-ekiri masịrị anyị?

8 Gịnị ka Ọkpara ahụ rụrụ n’ogologo oge ahụ ọ dịrị ndụ tupu ya abịa n’ụwa? Amaokwu nke iri atọ gwara anyị na ọ nọ n’akụkụ Chineke dị ka “onye ọkà ọrụ.” Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ndị Kọlọsi 1:16 kọwara, sị: “E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa . . . E kere ihe ndị ọzọ niile site n’aka ya nakwa maka ya.” Ya mere, Jehova, bụ́ Onye Okike, si n’aka Ọkpara ya, bụ́ Onye Ọkà Ọrụ, kee ihe ndị ọzọ niile—ma ndị mmụọ e kere eke bi n’ime eluigwe ma eluigwe dị ukwuu a na-ahụ anya, ma ụwa ma ihe ọkụkụ ma anụmanụ ndị dị n’ụdị dị iche iche magburu onwe ha, tinyere ihe kasị mma n’ime ihe niile e kere n’ụwa, ya bụ, ụmụ mmadụ. Anyị pụrụ iji mmekọrịta a Nna ahụ na Ọkpara ya nwere tụnyere mmekọrịta onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ na onye na-ewu ụlọ nwere. Ihe onye na-ewu ụlọ na-eme bụ iji ihe onye na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ ji nkà tụpụta wuo ụlọ. Mgbe ihe ọ bụla e kere eke nwụrụ anyị ibobo n’ahụ́, ọ bụ Onye Ukwu ahụ nke na-atụpụta ụkpụrụ ka anyị na-enye otuto n’ezie. (Abụ Ọma 19:1) Otú ọ dị, anyị pụkwara icheta mmekọrịta obi ụtọ nke Onye Okike na “onye ọkà ọrụ” ya nwere ruo ogologo oge.

9, 10. (a) Gịnị mere mmekọrịta Jehova na Ọkpara ya ji sie ike? (b) Gịnị pụrụ ime ka mmekọrịta gị na Nna gị nke eluigwe sie ike?

9 Mgbe mmadụ abụọ bụ́ ndị na-ezughị okè na-arụkọ ọrụ, ọ na-esiri ha ike mgbe ụfọdụ inwe mmekọrịta dị mma. Ọ dịghị otú ahụ n’ebe Jehova na Ọkpara ya nọ! Ọkpara ahụ na Nna ya rụkọrọ ọrụ ruo ọtụtụ afọ a na-apụghị ịgụta ọnụ. Ọkpara ahụ wee ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ihu ya mgbe niile.’ (Ilu 8:30) Ee, ọnụnọ ya na Nna ya nọrọ tọrọ ya ụtọ. Ọ tọkwara Nna ya ụtọ. Ọ bụghị ihe ijuanya na Ọkpara ahụ mesịrị dịkwuo ka Nna ya, mụta iṅomi àgwà Chineke. Ka a sịkwa ihe mere ịhụnanya nke dị n’etiti Nna ahụ na Ọkpara ya ji sie nnọọ ike! O ziri ezi ma a kpọọ ya ịhụnanya kasị ochie, nke kasịkwa sie ike n’eluigwe na ụwa.

10 Ma, gịnị ka nke ahụ pụtaara anyị? Ị pụrụ iche na ọ dịghị mgbe gị na Jehova ga-enwe ụdị mmekọrịta ahụ. N’ezie, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị nke nwere ọkwá ahụ dị elu Jizọs nwere. Otú ọ dị, anyị nwere ohere pụrụ iche. Cheta na Jizọs bịaruru Nna ya nso karị site n’ọrụ ya na Ya rụkọrọ. Jehova ji ịhụnanya na-enye anyị ohere ịbụ ‘ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ.’ (1 Ndị Kọrịnt 3:9) Ka anyị na-eso ihe nlereanya Jizọs n’ozi anyị, anyị kwesịrị icheta mgbe niile na anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. N’ihi ya, ịhụnanya nke jikọrọ anyị na Jehova na-esiwanye ike. Ọ̀ dị ihe ùgwù nke pụrụ ịkarị nke a?

Otú Jizọs Si Mee Ka Ịhụnanya Ọ Hụrụ Jehova Sie Ike

11-13. (a) Gịnị mere o ji baa uru ka anyị ghọta na ịhụnanya yiri ihe dị ndụ, oleekwa otú Jizọs si mee ka ịhụnanya ọ hụrụ Jehova sie ike mgbe ọ bụ nwata? (b) Olee otú Ọkpara Chineke si gosi na ọ masịrị ya ịmụta ihe n’aka Jehova, ma mgbe ọ na-abịabeghị n’ụwa ma mgbe o mesịrị bịa n’ụwa dị ka mmadụ?

11 N’ọtụtụ ụzọ, ọ bara uru ka anyị ghọta na ịhụnanya nke dị n’obi anyị yiri ihe dị ndụ. Dị ka ihe a kụrụ n’ubi, e kwesịrị ịzụ̀ ịhụnanya ma na-elekọta ya ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ na-eto eto, na-amakwa pokopoko. Ọ bụrụ na anyị eleghara ya anya, n’enyeghị ya ihe dị ya mkpa, ọ ga-akpọnwụ. Jizọs ejighị ịhụnanya ọ hụrụ Jehova gwurie egwu. O mere ka o sie ike, na-etokwa eto, n’oge niile o biri n’ụwa. Ka anyị hụ otú o si mee ya.

12 Cheta mgbe Jizọs bụ nwa okoro. O kwuru banyere Nna ya n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Cheta ihe ọ gwara ndị mụrụ ya mgbe ha chị obi n’aka. Ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m? Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?” (Luk 2:49) Mgbe Jizọs bụ nwata, o doro anya na o nwebeghị ike icheta ndụ ọ dịrị tupu ya aghọọ mmadụ. Ma, ịhụnanya ọ hụrụ Nna ya bụ́ Jehova siri ike. Ọ maara na e kwesịrị igosi ịhụnanya dị otú ahụ site n’ife Chineke. Ya mere, ọ dịghị ebe ọzọ na-atọ Jizọs ụtọ ịnọ karịa n’ụlọ a na-anọ efe Nna ya ofufe dị ọcha. Ọ na-agụsi ya agụụ ike ịga ebe ahụ. Ọ naghịkwa achọ isi ebe ahụ pụọ. Ihe ọzọkwa bụ na ọ naghị eje ebe ahụ naanị ka o kirie ihe a na-eme. Ọ na-anụ ya ọkụ n’obi ịmụ banyere Jehova, na ikwupụta ihe ọ maara. Ọ bụghị mgbe ọ gbara afọ iri na abụọ ka ọ malitere ịdị ya otú ahụ n’obi. Ọ kwụsịghịkwa ime otú ahụ mgbe ahụ.

13 Mgbe Ọkpara ahụ nọ n’eluigwe tupu ya aghọọ mmadụ, o ji ịnụ ọkụ n’obi mụta ihe n’aka Nna ya. Amụma e dere n’Aịzaya 50:4-6 mere ka a mata na Jehova kụziiri Ọkpara ya ihe n’ụzọ pụrụ iche banyere ọrụ ọ ga-arụ dị ka Mesaya. Ọ bụ ezie na ihe ọ kụziiri ya gụnyere ụfọdụ n’ime ihe isi ike ndị ga-adakwasị Onye Jehova Tere Mmanụ, Ọkpara ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi mụta ihe a kụziiri ya. Mgbe Jizọs mesịrị bịa n’ụwa, tookwa wee ghọọ dimkpa, ọ ka nọkwa na-anụ ya ọkụ n’obi ịga n’ụlọ Nna ya, sorokwa fee ụdị ofufe Jehova chọrọ ka a na-efe ya n’ebe ahụ, sorokwa kụzie ihe ọ chọrọ ka a na-akụzi n’ebe ahụ. Baịbụl si otú ahụ kwuo na Jizọs ji ikwesị ntụkwasị obi na-aga n’ụlọ nsọ nakwa n’ụlọ nzukọ. (Luk 4:16; 19:47) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ka ịhụnanya anyị hụrụ Jehova na-eto eto, gharakwa ịjụ oyi, anyị kwesịrị ịdị na-agachi nzukọ Ndị Kraịst anya. Anyị na-efe Jehova n’ebe ahụ, na-emekwa ka ihe ọmụma anyị na obi ekele anyị nwere n’ebe ọ nọ mikwuo emi.

Ihe Osise dị na peeji nke 135

“Ọ rịgooro n’elu ugwu naanị ya ikpe ekpere”

14, 15. (a) Gịnị mere Jizọs ji chọọ ịnọ naanị ya? (b) Olee otú ekpere Jizọs kpekuru Nna ya si gosi na ya na ya nwere mmekọrịta chiri anya, gosikwa na ọ na-akwanyere Nna ya ùgwù?

14 Jizọs mekwara ka ịhụnanya ọ hụrụ Jehova sie ike site n’ikpe ekpere mgbe niile. N’agbanyeghị na ọ bụ enyi ndị mmadụ, bụrụkwa onye ya na ndị mmadụ na-adị ná mma, anyị kwesịrị icheta na ọ na-adị ya mma ịnọ naanị ya mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, Luk 5:16 kwuru, sị: “Ọ nọgidere n’ebe ahụ ọ nọpụrụ iche n’ọzara, na-ekpekwa ekpere.” Matiu 14:23 kwuru ihe yiri ya, sị: “E mesịa, mgbe ọ sịrị ìgwè mmadụ ahụ lawa, ọ rịgooro n’elu ugwu naanị ya ikpe ekpere. Ọ bụ ezie na chi ejiwo, ọ nọ n’ebe ahụ naanị ya.” Jizọs chọrọ ịnọ naanị ya n’oge ndị a nakwa n’oge ndị ọzọ, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ onye na-anọrọ onwe ya, ma ọ bụ na ọ dịghị achọ ka ya na ndị ọzọ nọrọ, kama ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ka naanị ya na Jehova nọrọ, ka o nwee ike ịgwa Nna ya okwu n’ekpere otú ọ dị ya n’obi.

15 Mgbe Jizọs na-ekpe ekpere, ọ na-ekwu mgbe ụfọdụ, sị, “Aba, Nna.” (Mak 14:36) N’oge Jizọs, “Aba” bụ okwu na-egosi mmekọrịta chiri anya. Ọ bụ ihe ndị mmadụ na-akpọ “nna” ha n’ezinụlọ. Ọ na-abụkarị otu n’ime okwu mbụ nwata na-amụta. Ma, ọ na-egosi nkwanye ùgwù. Ọ bụ ezie na okwu ahụ na-egosi na Ọkpara ahụ na Nna ya ọ hụrụ n’anya, nke ọ na-agwa okwu, nwere mmekọrịta chiri anya, ọ na-egosikwa na ọ na-akwanyere ikike Jehova nwere dị ka nna ya ùgwù. Anyị na-ahụ mmekọrịta chiri anya na nkwanye ùgwù dị otú ahụ n’ekpere niile Jizọs kpere ndị e dere ede. Dị ka ihe atụ, na Jọn isi iri na asaa, Jọn onyeozi dere ekpere dị ogologo Jizọs si n’ala ala obi ya kpee n’abalị ikpeazụ ya. Ịmụ banyere ekpere ahụ bụ ihe na-emetụ n’obi n’ezie. Ọ dịkwa mkpa ka anyị ṅomie ya, ọ bụghị site n’ikwu ya otú ahụ Jizọs si kwuo ya, kama, site n’ịmụta otú anyị ga-esi jiri obi anyị na-agwa Nna anyị nke eluigwe okwu ọtụtụ ugboro o kwere anyị omume. Ime otú ahụ ga-eme ka ịhụnanya anyị hụrụ ya sie ike, gharakwa ịjụ oyi.

16, 17. (a) Olee otú Jizọs si kwuo okwu banyere ịhụnanya ọ hụrụ Nna ya? (b) Olee otú Jizọs si kọwaa mmesapụ aka nke Nna ya?

16 Dị ka anyị hụrụ ná mmalite, Jizọs ekwughachighị ugboro ugboro, sị, “M hụrụ Nna m n’anya.” Otú ọ dị, o kwuru okwu na-egosi na ọ hụrụ Nna ya n’anya ọtụtụ ugboro. Olee otú o si kwuo ya? Jizọs n’onwe ya sịrị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha.” (Matiu 11:25) Mgbe anyị na-amụ Nkebi nke Abụọ n’akwụkwọ a, anyị hụrụ na ọ na-atọ Jizọs ụtọ inye Nna ya otuto site n’inyere ndị mmadụ aka ịmata Ya. Dị ka ihe atụ, o ji Jehova tụnyere nna nke ọ na-anụ ọkụ n’obi ịgbaghara nwa ya nke kpafuru akpafu nke na o cheere mgbe nwa ahụ nke chegharịrị echegharị ga-alọta. Ọ nọ n’ebe dị anya hụ ya, gbara ọsọ gaa zute ya, makụọkwa ya. (Luk 15:20) Ọ̀ dị onye pụrụ ịgụ akụkọ ahụ, otú Jizọs si kọwaa ịhụnanya Jehova na otú O si agbaghara mmehie aghara imetụ ya n’ahụ́?

17 Jizọs nyere Nna ya otuto ugboro ugboro n’ihi mmesapụ aka Ya. O ji ihe atụ nke ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị na-ezughị okè gosi na anyị pụrụ ijide n’aka na Nna anyị ga-enye anyị mmụọ nsọ nke dị anyị mkpa. (Luk 11:13) Jizọs jikwa ịnụ ọkụ n’obi kwuo banyere olileanya nke Nna ya ji obiọma nye anyị. Jizọs kọwara olileanya o nwere na a ga-eme ka ọ lakwuru Nna ya wee nọrọ n’akụkụ ya n’eluigwe. (Jọn 14:28; 17:5) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya banyere olileanya ahụ Jehova debere n’ihu “ìgwè atụrụ nta” nke Kraịst, ya bụ, ibi n’eluigwe, soro Eze Mesaya ahụ wee na-achị achị. (Luk 12:32; Jọn 14:2) O ji olileanya ibi na Paradaịs kasie otu onye ajọ omume nke na-aga ịnwụ anwụ obi. (Luk 23:43) Ikwu banyere oké mmesapụ aka nke Nna ya n’ụzọ ndị dị otú a nyeere Jizọs aka n’ezie ime ka ịhụnanya ọ hụrụ Jehova sie ike mgbe niile. Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Kraịst achọpụtawo na ọ dịghị ihe na-eme ka ịhụnanya ha hụrụ Jehova sikwuo ike, ma ọ bụ mee ka okwukwe ha nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike, karịa ikwu banyere Ya nakwa olileanya o debere n’ihu ndị hụrụ ya n’anya.

Ị̀ Ga-eṅomi Ịhụnanya Jizọs Hụrụ Jehova?

18. Olee ụzọ kasị mkpa anyị kwesịrị isi soro Jizọs, n’ihi gịnịkwa?

18 N’ime ụzọ niile anyị kwesịrị isi soro Jizọs, ọ dịghị nke dị mkpa karịa nke a, ya bụ: Anyị aghaghị iji obi anyị dum na mkpụrụ obi anyị dum na uche anyị dum na ike anyị dum hụ Jehova n’anya. (Luk 10:27) Ihe na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya otú ahụ abụghị naanị otú o si anụ anyị ọkụ n’obi, kamakwa, ọ bụ otú anyị si egosi ịhụnanya ahụ site n’omume anyị. Jizọs enweghị afọ ojuju naanị n’inwe ịhụnanya n’ebe Nna ya nọ, ma ọ bụ naanị n’ịsị, “M hụrụ Nna m n’anya.” Ọ sịrị: “Ka ụwa wee mara na m hụrụ Nna m n’anya, ọbụna dị ka Nna m nyere m iwu ka m mee, otú ahụ ka m na-eme.” (Jọn 14:31) Setan kwuru na ọ dịghị mmadụ ga-ejere Jehova ozi n’ihi ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe ya naanị. (Job 2:4, 5) Jizọs ji obi ike mee ihe, wee gosi ụwa na ọ hụrụ Nna ya n’anya nke ukwuu, ka o wee nye azịza kasị mma maka nkwutọ ọjọọ Setan kwutọrọ Nna ya. O rubere isi nke na o ji ndụ ya chụọ àjà. Ị̀ ga-esoro Jizọs? Ị̀ ga-egosi ụwa na ị hụrụ Jehova Chineke n’anya n’ezie?

19, 20. (a) Olee ihe ụfọdụ dị mkpa mere anyị ji kwesị ijechi nzukọ Ndị Kraịst anya? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ọmụmụ ihe onwe onye, ịtụgharị uche, na ekpere, anya?

19 Anyị nwere mkpa dị ukwuu n’ụzọ ime mmụọ igosi ịhụnanya dị otú ahụ. Ya mere, Jehova mere ndokwa ka anyị na-efe ya n’ụzọ ga-eme ka ịhụnanya anyị hụrụ Nna anyị na-eto eto ma na-esikwu ike. Mgbe i jere nzukọ Ndị Kraịst, gbalịa icheta na i jere ebe ahụ ife Chineke gị. Ihe ndị ọzọ so n’ofufe anyị na-efe ya bụ ekpere nke si n’ala ala obi, ịbụ abụ otuto, ige ntị nke ọma, na itinye ọnụ n’ihe a na-amụ mgbe o kwere omume. Nzukọ ndị dị otú ahụ na-emekwa ka i nwee ike ịgba Ndị Kraịst ibe gị ume. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ife Jehova mgbe niile ná nzukọ Ndị Kraịst ga-enyere gị aka ime ka ịhụnanya ị hụrụ Chineke na-eto eto ma na-esikwu ike.

20 Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ọmụmụ ihe onwe onye, ịtụgharị uche, na ikpe ekpere ga-emere gị. Ghọta na ihe ndị a bụ ụzọ naanị gị na Jehova ga-esi nọrọ. Mgbe ị na-amụ Okwu Chineke e dere ede, na-atụgharịkwa uche na ya, Jehova na-agwa gị ihe bụ́ echiche ya. Mgbe ị na-ekpe ekpere, ị na-emeghere ya obi gị. Cheta na ekpere abụghị naanị ịrịọ Chineke ihe. Ekpere bụkwa ohere ị ga-eji kelee Jehova n’ihi ngọzi ndị o nyere gị, tookwa ya n’ihi ọrụ ya ndị dị ebube. (Abụ Ọma 146:1) Iji ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi na-eto Jehova n’ihu ọha bụkwa ụzọ kasị mma ị ga-esi kelee Jehova, gosikwa na ị hụrụ ya n’anya.

21. Olee otú ịhụ Jehova n’anya dịruru mkpa, gịnịkwa ka anyị ga-atụle n’isiokwu ndị dị n’ihu?

21 Ịhụ Chineke n’anya bụ isi ihe ga-eme ka i nweta obi ụtọ ebighị ebi. Ọ gwụla ihe gaara enyere Adam na Iv aka inwe ihe ịga nke ọma. Ọ bụkwa otu ihe nke ha na-amụtaghị. Ọ bụ ihe kasị mkpa nke ga-eme ka ị gafee ule ọ bụla nke ga-anwale okwukwe gị, meekwa ka ị jụ ọnwụnwa ọ bụla, tachiekwa obi n’ọnwụnwa ọ bụla. Ọ bụ ya bụ isi ihe ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs pụtara. N’ezie, e nwere ihe jikọrọ ịhụ Chineke n’anya na ịhụ mmadụ ibe anyị n’anya. (1 Jọn 4:20) N’isiokwu ndị dị n’ihu, anyị ga-atụle otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. N’Isi nke Iri na Anọ, anyị ga-eleba anya n’ihe mere o ji dịrị ọtụtụ ndị mfe ịbịakwute Jizọs.

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?

  • Mgbe anyị na-ekpe ekpere, olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere obi ike n’ebe Jehova nọ, dị ka Jizọs mere?—Jọn 11:41, 42; Ndị Hibru 11:6.

  • Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị si n’ala ala obi anyị hụ Jehova n’anya site n’otú anyị si eji aha ya eme ihe?—Jọn 17:6-8.

  • Gịnị mere ịhụ Jehova n’anya ji chọọ ka anyị ṅomie Jizọs site n’ịnọpụ iche n’ụwa?—Jọn 17:14-16; Jems 4:8.

  • Olee otú anyị pụrụ isi soro ndụmọdụ Jizọs nyere banyere inwe ịhụnanya siri ike n’ebe Jehova nọ?—Mkpughe 2:1-5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya