Chekwaa Ya
Olee Ihe M Kwesịrị Ikpebi Ma A Chọọ Iji Ọbara M Gwọọ M Ọrịa Nakwa Ma A Chọọ Iji Ihe E Si n’Ihe Ndị Bụ́ Isi Mejupụtara Ọbara Nweta, Gwọọ M Ọrịa?
Bible nyere Ndị Kraịst iwu ka ha “na-ezere . . . ọbara.” (Ọrụ 15:20) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara ma ọ bụ ka a mịnye ha nke ọ bụla n’ime ihe anọ ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara—ya bụ, mkpụrụ ndụ na-acha uhie uhie nke na-adị n’ọbara, mkpụrụ ndụ na-acha ọcha nke na-adị n’ọbara, platelet, na plasma. Ha adịghịkwa amịpụta ọbara ha ka a mịnye ya onye ọzọ ma ọ bụkwanụ chekwaa ya, ka ọ ga-abụ, a chọọ ịgwọ ha, a mịnye ha ya.—Lev. 17:13, 14; Ọrụ 15:28, 29.
Gịnị mere o ji bụrụ ihe dịịrị Onye Kraịst ikpebiri onwe ya ma à ga-eji ihe e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara nweta, gwọọ ya ọrịa?
Iji ghọta ihe a na-ekwu mgbe anyị sịrị, ‘ihe ndị e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara nweta,’ were plasma dị ka ihe atụ, nke bụ́ otu n’ime ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara. A pụrụ isi na ya nweta ihe ndị na-esonụ: mmiri; protein ndị dị ka albumin, globulin, na fibrinogen; na ihe ndị ọzọ, dị ka ihe ndị na-eme ka mmadụ na-eto eto, mmiri ọgwụ ahụ́, ikuku, vitamin, ihe ndị ahụ́ mmadụ na-achọghị, na electrolyte.
N’iwu ahụ e nyere ka e zere ọbara, ihe ndị a e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara nweta, hà so n’ihe e kwuru ka e zere? Anyị apụghị ikwu ma hà so. Bible enyeghị iwu ọ bụla a kapịrị ọnụ banyere ihe ndị a e si n’ihe ndị bụ́ si mejupụtara ọbara enweta.a N’ezie, ebe e si enweta ọtụtụ n’ime ha bụ n’ọbara ndị mmadụ wetara ka a mịnye ndị ọzọ n’ahụ́. Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịdabere n’ihe akọnuche ya gwara ya kpebiere onwe ya ma ọ̀ ga-ekwe ka e jiri ihe ndị a gwọọ ya ọrịa ma ọ bụ na ọ gaghị ekwe.
Mgbe ị na-eme mkpebi dị otú a, tụlee ajụjụ ndị na-esonụ: Ọ bụrụ na mụ asị na achọghị m ka e jiri ihe ndị e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara nweta gwọọ m, m̀ ghọtara na ihe m na-ekwu bụ na agaghị m ekwe ka e jiri ọgwụ ụfọdụ gwọọ m, dị ka ọgwụ ụfọdụ e ji egbu nje virus na nje ndị ọzọ ma ọ bụkwanụ ọgwụ ndị nke na-eme ka ọbara kwụsị ịgba mmadụ? M̀ pụrụ ịkọwara dọkịta ihe mere m ga-eji kwere ma ọ bụ ghara ikwe ka e jiri ihe ụfọdụ e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara nweta gwọọ m?
Gịnị mere o ji bụrụ m ka ọ dịịrị ikpebiri onwe m ma m̀ ga-anabata ụdị ọgwụgwọ ụfọdụ a ga-eji ọbara m gwọọ m?
Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst adịghị enye ọbara ha ma ọ bụ na-echekwa ya ka a mịnye ya mmadụ, ụzọ ụfọdụ e si ele ahụ́ ma ọ bụ agwọ ọrịa, bụ́ ndị a ga-eji ọbara onye ọrịa ahụ mee ihe, emegidechaghị ụkpụrụ Bible. N’ihi ya, ọ bụ onye ọ bụla ka ọ dị n’aka ịdabere n’ihe akọnuche nke ya gwara ya kpebiere onwe ya ma ọ̀ ga-anabata ụdị ọgwụgwọ ụfọdụ a ga-eji ọbara ya gwọọ ya ma ọ bụ na ọ gaghị anabata ya.
Mgbe ị na-eme mkpebi dị otú ahụ, jụọ onwe gị ajụjụ ndị na-esonụ: Ọ bụrụ na a ga-eme ka ụfọdụ n’ime ọbara m na-esi n’ahụ́ m abanye n’ígwè ọrụ ma na-abanyeghachi n’ahụ́ m, ikekwe e meekwa ka ọ kwụsịtụ irugharị erugharị ruo oge ụfọdụ, akọnuche m ọ̀ ga-ekwe ka m were ọbara ahụ dị ka ihe ka nọ m n’ahụ́, nke ga-eme ka ọ ghara ịdị mkpa ka m ‘wụpụ ya n’ala’? (Deut. 12:23, 24) Akọnuche m e ji Bible zụọ ọ̀ ga-enye m nsogbu ma ọ bụrụ na a mịpụtara ọbara m n’oge a na-agwọ m, zaa ya, ma mịnyeghachi m ya n’ahụ́? Ọ bụrụ na mụ asị na achọghị m ka e jiri ọbara m gwọọ m ọrịa n’ụdị ọ bụla, m̀ ghọtara na ihe m na-ekwu bụ na agaghị m ekwe ka e mee ka ọbara m banye n’ígwè ọrụ ga-aza ya ma mee ka ọ banyeghachi n’ahụ́ m, ma ọ bụkwanụ ka e mee ka ọbara m na-esi n’ahụ́ m abanye n’ígwè na-arụ ọrụ obi na akpa ume na-arụ, ma si n’ígwè ọrụ ahụ na-abanyeghachi n’ahụ́ m? Ètinyela m okwu a n’ekpere tupu m mewe mkpebi a?b
Gịnị ka m kpebiri ime?
Tụlee akụkụ bụ́ “Ihe Ị Ga-eji Mee Ihe,” bụ́ ndị dị na peeji ndị na-esonụ. N’Ihe Ị Ga-eji Mee Ihe, nke 1, e depụtara ụfọdụ n’ime ihe ndị e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara enweta na ụzọ e sikarị eji ha agwọ ọrịa. N’ebe e mere maka igosi ebe ị kwụ, gosi ma ị̀ ga-anabata nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ma ọ bụ na ị gaghị anabata ya. N’Ihe Ị Ga-eji Mee Ihe, nke 2, e depụtara ụdị ọgwụgwọ ndị a na-ejikarị ọbara nke onye ahụ a na-agwọ eme ihe. N’ebe e mere maka igosi ebe ị kwụ, gosi ma ị̀ ga-anabata ụdị ọgwụgwọ ndị a ma ọ bụ na ị gaghị anabata ha. Akụkụ a bụ́ “Ihe Ị Ga-eji Mee Ihe” abụghị akwụkwọ iwu, ma otú i si dejupụta ya ga-enyere gị aka idejupụta kaadị DPA gị.
Mkpebi gị kwesịrị ịbụ mkpebi gị, o kwesịghịkwa ịdabere n’ihe akọnuche onye ọzọ gwara ya. N’otu aka ahụ, ọ dịghị onye kwesịrị ịkatọ ihe Onye Kraịst ọzọ kpebiri banyere nke a. Na nke a, “onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.”—Gal. 6:4, 5.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ị chọọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ Ụlọ Nche June 15, 2004, peeji nke 29-31.
b Ị chọọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ Ụlọ Nche October 15, 2000, peeji nke 30-31, kiriekwa vidio bụ́ Transfusion Alternatives—Documentary Series—nke dị na DVD.
[Chaatị dị na peeji nke 5]
IHE Ị GA-EJI MEE IHE, NKE 1
NDỊ KRAỊST ADỊGHỊ IHE Ị GA-EKPEBIRI ONWE GỊ
ANABATA YA
ỌBARA IHE E SI N’IHE NDỊ Nhọrọ Ndị Ọ Dị
BỤ́ ISI MEJUPỤTARA Mkpa Ka I Mee
ỌBARA NWETA
PLASMA ALBUMIN—O MEJUPỤTARA IHE
RURU PASENT 4 NKE PLASMA
Nke a bụ protein e si na
plasma enweta. Ebe ndị ọzọ
e si enweta albumin bụ
n’osisi, n’ihe ndị dị ka
mmiri ara ehi na àkwá, nakwa
ná mmiri ara nke nwanyị mụrụ ․․ Aga m anabata
nwa ọhụrụ. A na-eji albumin albumin
e si n’ọbara nweta eme ọgwụ ma ọ bụ
ndị e ji amụba ọbara bụ́ ndị ․․ Agaghị m anabata
e ji agwọ onye ahụ́ kụnwụrụ albumin
na onye ọkụ rere nke ukwuu.
Albumin na-emejupụta ihe ruru
otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ọgwụ
ndị a. A na-eji ntakịrị
albumin eme ọtụtụ ọgwụ ndị
ọzọ, tinyere ọgwụ ndị Bekee
na-akpọ erythropoietin (EPO).
IMMUNOGLOBULIN—O MEJUPỤTARA
IHE RURU PASENT 3 NKE PLASMA
Nke a bụ ihe e si na protein
enweta, nke a pụrụ iji mepụta
ọgwụ ụfọdụ e ji egbu nje
virus na nje ndị ọzọ ․․ Aga m anabata
na-akpata ọrịa ndị dị ka immunoglobulin
diphtheria, ọrịa tetanus, ma ọ bụ
ịba ọcha n’anya, na ọrịa ․․ Agaghị m anabata
rabies. A pụkwara iji ha gwọọ immunoglobulin
ọrịa ụfọdụ na-egbu nwa e bu
n’afọ, jirikwa ya gwọọ onye
agwọ ma ọ bụ ududo tara.
IHE NA-EME KA ỌBARA KPỤKỌTA—O
MEJUPỤTARA IHE NA-ERUGHỊ OTU
PASENT NKE PLASMA
E nwere protein dịgasị iche
iche na-eme ka ọbara kpụkọta
ma kwụsị ịgba mmadụ n’ahụ́. A ․․ Aga m anabata ihe
na-enye ndị ọbara na-agbakarị na-eme ka ọbara
ụfọdụ n’ime protein ndị a. A kpụkọta nke e si
na-ejikwa ha etechi ọnyá, n’ọbara nweta
jirikwa ha na-eme ka ọbara ma ọ bụ
kwụsị ịgba mmadụ mgbe a wasịrị ․․ Agaghị m anabata
ya ahụ́. Otu n’ime ọgwụ ndị ihe na-eme ka
na-eme ka ọbara kpụkọta bụ ọbara kpụkọta nke
ọgwụ ndị Bekee na-akpọ e si n’ọbara
cryoprecipitate. nweta
Ihe ị ga-arịba ama: E nwere
ụfọdụ ihe ndị na-eme ka ọbara
kpụkọta, bụ́ ndị a na-esighị
n’ọbara enweta.
MKPỤRỤ NDỤ HEMOGLOBIN—O MEJUPỤTARA
NA-ACHA PASENT 33 NKE MKPỤRỤ NDỤ
UHIE UHIE NA-ACHA UHIE UHIE NKE
NKE NA-ADỊ NA-ADỊ N’ỌBARA
N’ỌBARA Nke a bụ protein nke na-eburu
ikuku ndụ e kuuru ekuru agazu
ahụ́ nile, na-eburukwa ikuku a
na-ekupụ ekupụ aga n’akpa ․․ Aga m anabata
ume. A pụrụ iji ọgwụ ndị e si hemoglobin
na hemoglobin dị n’ọbara ma ọ bụ
mmadụ ma ọ bụ n’ọbara ụmụ ․․ Agaghị m anabata
anụmanụ mepụta gwọọ onye hemoglobin
ọbara kọrọ n’ahụ́ ma ọ bụ onye
ọbara gbara nke ukwuu.
HEMIN—O MEJUPỤTARA IHE
NA-ERUGHỊ PASENT 2 NKE
MKPỤRỤ NDỤ NA-ACHA UHIE
UHIE NKE NA-ADỊ N’ỌBARA
Nke a bụ ihe e si na
hemoglobin enweta nke e ji ․․ Aga m anabata
agwọ ụfọdụ n’ime ọrịa ndị dị hemin
mmadụ n’ọbara, (dị ka ọrịa ma ọ bụ
porphyria), nke bụ́ ọrịa ․․ Agaghị m anabata
na-emetụta akwara ozi, otú hemin
ahụ́ si agbari nri, na otú
ọbara si erugharị.
MKPỤRỤ NDỤ INTERFERON—E SI NÁ MKPỤRỤ
NA-ACHA NDỤ NA-ACHA ỌCHA NKE NA-ADỊ
ỌCHA NKE N’ỌBARA ENWETA YA KAMA NA
NA-ADỊ O PERE NNỌỌ MPE NA YA
N’ỌBARA Nke a bụ protein nke na-alụso ․․ Aga m anabata
ụfọdụ nje virus na ọrịa cancer interferon e si
ọgụ. Ọ bụghị n’ọbara ka e si n’ọbara nweta
enweta ọtụtụ n’ime protein a. ma ọ bụ
Ma, e si ná mkpụrụ ndụ na-acha ․․ Agaghị m anabata
ọcha nke na-adị n’ọbara ụmụ interferon e si
mmadụ enweta ụfọdụ n’ime ha. n’ọbara nweta
PLATELET Ka ọ dị ugbu a, e nwebeghị
ihe e si na platelet enweta,
nke e ji agwọ ọrịa.
[Chaatị dị na peeji nke 6]
IHE Ị GA-EJI MEE IHE, NKE 2
IHE Ị GA-EKPEBIRI ONWE GỊ
ỤDỊ ỌGWỤGWỌ NDỊ A PỤRỤ IJI ỌBARA GỊ GWỌỌ GỊ
*Ihe Ị Ga-arịba Ama: Otú otu dọkịta si eji nke ọ bụla n’ime ụzọ ndị a agwọ ọrịa na-adị iche n’otú dọkịta ọzọ na-esi eji ya agwọ ọrịa. I kwesịrị ịgwa dọkịta gị ka ọ kọwaara gị kpọmkwem otú ọ chọrọ isi agwọ gị ka i wee jide n’aka na ụdị ọgwụgwọ ahụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, kwekọọkwa ná mkpebi ị dabeere n’akọnuche gị wee mee.
ỤDỊ ỌGWỤGWỌ IHE Ọ GA-ARỤ Nhọrọ Ndị Ọ Dị
Mkpa Ka I Mee
(Ọ pụrụ ịdị mma ka gị na dọkịta gị
kwurịta ya tupu gị
anabata ma ọ bụ jụ
nke ọ bụla n’ime
ọgwụgwọ ndị a.)
NKE A NA-AKPỌ Ọ na-eme ka ọbara ga-apụ ․․ Aga m anabata ya
CELL SALVAGE mmadụ n’ahụ́ belata. A ․․ Enwere m ike
na-echete ọbara gbapụrụnụ ịnabata ya*
n’oge a na-awa ahụ́. E ․․ Agaghị m anabata
chetechaa ya, a zaa ya. E ya
mesịa, a mịnyeghachi ya
n’ahụ́ onye ahụ. Ikekwe, ọ
ga na-abanyeghachi n’ahụ́
onye ahụ ozugbo ahụ a
na-aza ya.
NKE A NA-AKPỌ Ọ na-eme ka ọbara ga-apụ
HEMODILUTION mmadụ n’ahụ́ belata. N’oge
a na-awa mmadụ ahụ́, a
na-eme ka ọbara onye ahụ ․․ Aga m anabata ya
na-abanye n’akpa, a ․․ Enwere m ike
na-amịnyekwa onye ahụ ihe ịnabata ya*
na-eme ka ọbara mụbaa. A ․․ Agaghị m anabata
mịnye ya onye ahụ, ọ pụtara ya
na ọbara dị ya n’ahụ́ aghọọla
ọbara a gwara agwa, mkpụrụ
ndụ na-acha uhie uhie nke
ga-adị n’ọbara ahụ
agaghịzikwa ehi nne. N’oge
a na-awa ahụ́ ahụ ma ọ bụ
n’oge a wasịrị ya, a na-ewere
ọbara ahụ e mere ka ọ banye
n’akpa mịnyeghachi n’ahụ́
onye ahụ.
NKE A NA-AKPỌ Ọ na-eme ka ọbara nọgide
HEART-LUNG na-erugharị. A na-eme ka
MACHINE ọbara si n’ahụ́ onye ọrịa ․․ Aga m anabata ya
na-abanye n’ígwè na-arụ ọrụ ․․ Enwere m ike
obi na akpa ume na-arụ. ịnabata ya*
Ọbara ahụ banye na ya, ya ․․ Agaghị m anabata
enweta ikuku ndụ ma ya
banyeghachi n’ahụ́ onye
ọrịa ahụ.
NKE A NA-AKPỌ Ọ na-arụ ọrụ ka akụkụ ahụ́
DIALYSIS mmadụ. A na-eme ka ọbara
si n’ahụ́ onye ọrịa banye ․․ Aga m anabata ya
n’ígwè ọrụ ga-aza ya ma ․․ Enwere m ike
mee ka ọ dị ọcha tupu ya ịnabata ya*
abanyeghachi n’ahụ́ onye ․․ Agaghị m anabata
ọrịa ahụ. ya
NKE A NA-AKPỌ Ọ na-eme ka mmiri na-adị
EPIDURAL BLOOD n’ime ọkpụkpụ azụ kwụsị
PATCH ịgbapụ mmadụ n’ahụ́. A
na-agbanye obere ọbara nke ․․ Aga m anabata ya
onye ọrịa ahụ gburugburu ․․ Enwere m ike
akwara ọkpụkpụ azụ. A ịnabata ya*
na-eji ya etechi ebe mmiri ․․ Agaghị m anabata
na-adị n’ime ọkpụkpụ azụ ya
si na-agbapụ mmadụ n’ahụ́.
NKE A NA-AKPỌ A na-eme ya iji gwọọ ọrịa.
PLASMAPHERESIS A na-amịrị ọbara ma zaa ya
iji wepụ plasma na ya. A
na-etinye ihe na-anọchi ․․ Aga m anabata ya
anya plasma n’ime ọbara ․․ Enwere m ike
ahụ, ma mịnyeghachi ya ịnabata ya*
n’ahụ́ onye ọrịa ahụ. Ụfọdụ ․․ Agaghị m anabata
ndị dọkịta pụrụ iji plasma ya
dị n’ọbara onye ọzọ dochie
plasma nke ahụ ha wepụrụ
n’ọbara onye ọrịa ahụ. Ọ
bụrụ otú ahụ, Onye Kraịst
agaghị anabata ya.
NKE A NA-AKPỌ E ji ya achọpụta ma ọ bụ
LABELING MA Ọ BỤ na-agwọ ọrịa. A na-amịrị
TAGGING ọbara n’ahụ́ onye ọrịa, ․․ Aga m anabata ya
jiri ọgwụ gwaa ya, ma ․․ Enwere m ike
mịnyeghachi ya n’ahụ́ ya. ịnabata ya*
Oge ga-agafe site n’oge a ․․ Agaghị m anabata
mịpụtara ọbara otu onye ya
ruo n’oge a mịnyeghachiri
ya pụrụ ịdị iche n’oge
ga-agafe na nke onye ọzọ.
NKE A NA-AKPỌ E ji ya etechi ọnyá, ọ
PLATELET GEL; na-eme ka ọbara kwụsịlata
NKE E SI N’ỌBARA ịgba mmadụ. A na-amịrị
GỊ NWETA ọbara ụfọdụ, jiri ọgwụ nke
platelet na mkpụrụ ndụ ․․ Aga m anabata ya
na-acha ọcha nke na-adị ․․ Enwere m ike
n’ọbara, juru na ya gwaa ịnabata ya*
ya. A na-ete ya n’ebe a ․․ Agaghị m anabata
wapuru mmadụ ahụ́ ma ọ bụ ya
n’ọnyá dị ya n’ahụ́.
Ihe ị ga-arịba ama:
A na-eji ihe na-akpọchi
ọbara nke e si n’ọbara ehi
nweta eme ụfọdụ n’ime ọgwụ
ndị a.