ISI NKE IRI NA ASAA
“Ọ Dịghị Onye Nwere Ịhụnanya Karịrị Nke A”
1-4. (a) Gịnị mere mgbe Paịlet kpọpụtara Jizọs n’ihu ìgwè mmadụ iwe ji, ndị zukọtara n’èzí, n’ihu obí gọvanọ? (b) Gịnị ka Jizọs mere mgbe a na-eme ya ihe ihere, na-atakwa ya ahụhụ, oleekwa ajụjụ ndị ọ dị mkpa ka a zaa?
“LEE nwoke ahụ!” Nke ahụ bụ ihe onye Rom bụ́ Gọvanọ Pọntiọs Paịlet kwuru mgbe ọ kpọpụtara Jizọs Kraịst n’ihu ìgwè mmadụ iwe ji, ndị zukọtara n’èzí, n’ihu obí ya, n’isi ụtụtụ ụbọchị Ememme Ngabiga nke afọ 33 O.A. (Jọn 19:5) N’ụbọchị ole na ole gara aga, ìgwè mmadụ a nọ na-eto Jizọs mgbe ọ na-abanye Jeruselem dị ka onye nwere mmeri, bụ́ Eze nke Chineke họpụtara. Otú ọ dị, taa, ìgwè mmadụ a bụzi ndị iro ya. Otú ha si ele Jizọs anya dị iche nke ukwuu.
2 E yiwere Jizọs uwe mwụda nke na-acha odo odo, nke dị ka uwe ndị eze. E kpuwekwara ya okpueze. Uwe mwụda ahụ kpuchiri ebe ndị ka na-agba ọbara n’ihi ụtarị e ji pịarichaa ya azụ. E ji ogwu kpaa okpueze ahụ, kpuwe ya n’isi ya nke na-agba ọbara ugbu a. Ha ji uwe mwụda ahụ na okpueze ahụ na-akwa ya emo na ọ bụ eze. Ọ bụ ndị isi nchụàjà kpaliri ìgwè mmadụ ahụ ịjụ nwoke a e merụsịrị ahụ́, nke guzo n’ihu ha. Ndị nchụàjà tiri mkpu, sị: “Kpọgide ya n’osisi! Kpọgide ya n’osisi!” Ebe ọ bụ na ìgwè mmadụ ahụ chọrọ ka e gbuo ya, ha tiri mkpu, sị: “O kwesịrị ịnwụ.”—Jọn 19:1-7.
3 Jizọs ji nkwanye ùgwù na obi ike die ihe ihere ahụ na ahụhụ ahụ n’atamughị ntamu.a O jikeere nke ọma ịnwụ. Mgbe e mesịrị n’Ụbọchị Ememme Ngabiga ahụ, o kwetara ịnwụ ọnwụ na-egbu mgbu n’osisi ịta ahụhụ.—Jọn 19:17, 18, 30.
4 Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà wee gosi na ya bụ ezigbo enyi ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) Nke ahụ mere ka e nwee ajụjụ ụfọdụ dị mkpa. Ọ̀ dị mkpa n’ezie ka Jizọs taa ahụhụ ahụ niile ọ tara wee nwụọ? Gịnị mere o ji kwe ime otú ahụ? Ebe anyị bụ “ndị enyi ya” na ndị na-eso ụzọ ya, olee otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya ya?
Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa Ka Jizọs Taa Ahụhụ, Nwụọkwa?
5. Olee otú Jizọs si mata ọnwụnwa ndị ga-abịara ya?
5 Ebe Jizọs bụ Mesaya e kwere ná nkwa, ọ maara ihe a ga-eme ya. Ọ maara ọtụtụ amụma e buru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị kwuru ihe dị iche iche banyere ahụhụ Mesaya ga-ata na ọnwụ ọ ga-anwụ. (Aịzaya 53:3-7, 12; Daniel 9:26) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ugboro ugboro na ọnwụnwa ga-abịara ya. (Mak 8:31; 9:31) Mgbe ha na-aga Jeruselem maka Ememme Ngabiga ikpeazụ ọ ga-aga, ọ gwara ndịozi ya kpọmkwem, sị: ‘A ga-enyefe Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ, ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ, ha ga-ejikwa ya mee ihe ọchị, gbụọ ya ọnụ mmiri, pịakwa ya ihe ma gbuo ya.’ (Mak 10:33, 34) Ihe a abụghị okwu na-enweghị isi na ọdụ. Dị ka anyị hụworo, e ji Jizọs mee ihe ọchị, gbụọ ya ọnụ mmiri, pịa ya ihe, gbuokwa ya.
6. Gịnị mere o ji dị mkpa ka Jizọs taa ahụhụ, nwụọkwa?
6 Ma, gịnị mere o ji dị mkpa ka Jizọs taa ahụhụ, nwụọkwa? E nwere ọtụtụ ihe dị mkpa kpatara ya. Nke mbụ bụ na, ọ bụrụ na Jizọs ekwesị ntụkwasị obi, ọ ga-eji ya gosi na o guzosiri ike n’ebe Jehova nọ, na-akwadokwa otú O si achị. Cheta na Setan ghara ụgha, sị na ụmụ mmadụ na-ejere Chineke ozi n’ihi ọdịmma nke onwe ha naanị. (Job 2:1-5) Jizọs kụghasịrị ebubo ụgha Setan kpamkpam site n’ikwesị ntụkwasị obi “ruo ọnwụ . . . n’osisi ịta ahụhụ.” (Ndị Filipaị 2:8; Ilu 27:11) Nke abụọ bụ na ahụhụ Mesaya ga-ata na ọnwụ ọ ga-anwụ ga-ekpuchiri ndị ọzọ mmehie ha. (Aịzaya 53:5, 10; Daniel 9:24) Jizọs nyere “mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ,” megheere anyị ụzọ anyị na Chineke ga-esi dị ná mma. (Matiu 20:28) Nke atọ bụ na, site n’idi ụdị ihe isi ike na ahụhụ dị iche iche, ‘a nwalere Jizọs n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị.’ Ya mere, ọ bụ Nnukwu Onye Nchụàjà nke nwere ọmịiko, onye pụrụ “imere anyị ebere n’adịghị ike anyị.”—Ndị Hibru 2:17, 18; 4:15.
Gịnị Mere Jizọs Ji Kweta Iji Ndụ Ya Chụọ Àjà?
7. Olee ihe dị iche iche Jizọs hapụrụ n’eluigwe wee bịa n’ụwa?
7 Iji nyere gị aka ịghọta nke ọma ihe Jizọs kwetara ime, chee echiche banyere ihe atụ a: Ọ̀ dị nwoke ga-ahapụ ndị ezinụlọ ya na ụlọ ya, gaa n’ala ọzọ, ma ọ bụrụ na ọ maara na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ niile bi ebe ahụ agaghị achọ iji anya hụ ya, marakwa na a ga-eme ya ihe ihere, taa ya ahụhụ, mesịakwa gbuo ya? Ugbu a, tụlee ihe Jizọs mere. Tupu ya abịa n’ụwa, o nwere ọnọdụ pụrụ iche n’eluigwe mgbe ya na Nna ya nọ. Ma, Jizọs ji obi ya hapụ ebe o bi n’eluigwe wee bịa n’ụwa bụrụ mmadụ. Ọ bịara n’ụwa n’agbanyeghị na ọ maara na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ niile ga-ajụ ya, marakwa na a ga-eji obi ọjọọ mee ya ihe ihere, taa ya ahụhụ dị ukwuu, meekwa ka ọ nwụọ ọnwụ na-egbu mgbu. (Ndị Filipaị 2:5-7) Gịnị kpaliri Jizọs ịchụ àjà dị otú a?
8, 9. Gịnị mere Jizọs ji were ndụ ya chụọ àjà?
8 Nke kasịnụ bụ na Jizọs bịara n’ụwa n’ihi na ọ hụrụ Nna ya n’anya nke ukwuu. Ntachi obi Jizọs gosiri na ọ hụrụ Jehova n’anya. Ịhụnanya ahụ mere ka Jizọs na-echegbu onwe ya banyere aha Nna ya na otú e si ele Nna ya anya. (Matiu 6:9; Jọn 17:1-6, 26) Ihe kasị mkpa bụ na Jizọs chọrọ ime ka e wepụ nkọcha niile a kọchara aha Nna ya. Ya mere, Jizọs weere na ọ bụ ihe ùgwù kasị ukwuu ịta ahụhụ n’ihi ezi omume, n’ihi na ọ maara na ọ bụrụ na o guzosie ike n’ezi ihe, ọ ga-enye aka n’ime ka e doo aha ọma Nna ya nsọ.—1 Ihe E Mere 29:13.
9 Ọ dị ihe ọzọ mere Jizọs ji were ndụ ya chụọ àjà—ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ịhụnanya a bidoro mgbe e kere mmadụ ná mmalite. N’oge dị anya tupu Jizọs abịa n’ụwa, Baịbụl mere ka a mata otú obi dị ya, sị: “Ihe na-enye m obi ụtọ bụkwa ihe metụtara ụmụ mmadụ.” (Ilu 8:30, 31) Ịhụnanya o nwere pụtara ìhè nke ọma mgbe ọ nọ n’ụwa. Dị ka anyị hụrụ n’Isi nke Iri na Anọ ruo n’Isi nke Iri na Isii n’akwụkwọ a, Jizọs si n’ọtụtụ ụzọ gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ niile n’anya, hụkwa ndị na-eso ụzọ ya n’anya karịsịa. Ma, na Naịsan 14, 33 O.A., o nyere mkpụrụ obi ya n’ihi anyị. (Jọn 10:11) N’eziokwu, ọ dịghị ụzọ ọzọ ka ukwuu ọ ga-esi gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ànyị kwesịrị iṅomi ya n’ime otú a? Ee. N’ezie, e nyere anyị iwu ka anyị mee otú ahụ.
“Na-ahụrịta Ibe Unu n’Anya . . . Dị Ka M Hụrụ Unu n’Anya”
10, 11. Gịnị bụ iwu ọhụrụ ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, gịnị ka ọ pụtara, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị rube isi n’iwu ahụ?
10 N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ha na ya kasị kpachie anya, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) “Na-ahụrịta ibe unu n’anya”—gịnị mere nke a ji bụrụ “iwu ọhụrụ”? Iwu Mozis ebula ụzọ kwuo, sị: “Hụ mmadụ ibe gị [ma ọ bụ, onye agbata obi gị] n’anya dị ka onwe gị.” (Levitikọs 19:18) Ma, iwu ọhụrụ a chọrọ ịhụnanya karịrị nke ahụ, ya bụ, ịhụnanya nke ga-eme ka anyị were ndụ anyị chụọ àjà n’ihi ndị ọzọ. Jizọs n’onwe ya mere ka nke a doo anya mgbe ọ sịrị: “Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya. Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:12, 13) Ihe iwu ọhụrụ ahụ na-ekwu n’ezie bụ: “Hụ ndị ọzọ n’anya, ọ bụghị dị ka ị hụrụ onwe gị, kama, karịa ka ị hụrụ onwe gị.” N’ezie, Jizọs ji otú o si bie ndụ na otú o si nwụọ gosi ụdị ịhụnanya ahụ.
11 Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị rube isi n’iwu ọhụrụ ahụ? Cheta na Jizọs sịrị: “Mmadụ niile ga-eji nke a [ya bụ, ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà] mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” Ee, ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà na-eme ka a mara na anyị bụ ezi Ndị Kraịst. Anyị pụrụ iji ịhụnanya a tụnyere baajị e ji amata mmadụ. Ndị na-aga mgbakọ ukwu nke Ndịàmà Jehova na-enwe kwa afọ na-etinye baajị n’uwe ha. Baajị ahụ na-eme ka a mata onye tinyere ya, gosikwa aha ya na ọgbakọ o si. Ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà bụ “baajị” e ji amata ezi Ndị Kraịst. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, otú anyị si hụ ibe anyị n’anya kwesịrị ịpụta ìhè nke na ọ ga-abụ ihe àmà, ma ọ bụ, baajị, nke na-agwa ndị na-ahụ anyị na anyị bụ n’ezie ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘À na-ahụ “baajị” ahụ bụ́ ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà n’otú m si ebi ndụ?’
Ịhụnanya nke Ịchụ Onwe Onye n’Àjà—Gịnị ka Ọ Pụtara?
12, 13. (a) Olee otú anyị kwesịrị igosiru na anyị hụrụ ibe anyị n’anya? (b) Gịnị ka ịchụ onwe onye n’àjà pụtara?
12 Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, anyị kwesịrị ịhụrịta ibe anyị n’anya dị ka Jizọs hụrụ anyị n’anya. Nke a pụtara ịdị njikere ịchụ ihe dị iche iche n’àjà n’ihi ndị kwere ekwe ibe anyị. Olee otú anyị kwesịrị ịdịru njikere ime otú ahụ? Baịbụl gwara anyị, sị: “Anyị si otú a mara ihe bụ́ ịhụnanya, n’ihi na onye ahụ tọgbọrọ mkpụrụ obi ya n’ihi anyị; anyị jikwa ụgwọ ịtọgbọ mkpụrụ obi anyị n’ihi ụmụnna anyị.” (1 Jọn 3:16) Dị ka Jizọs, anyị kwesịrị ịdị njikere ịnwụ n’ihi ibe anyị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. N’oge mkpagbu, anyị ga-eji ndụ anyị chụọ àjà kama ịrara ụmụnna anyị nye, nke pụrụ itinye ndụ ha n’ihe ize ndụ. N’ala dị iche iche ebe esemokwu agbụrụ na nke ebo kewasịrị ndị mmadụ, anyị ga-etinye ndụ anyị n’ihe ize ndụ iji chebe ụmụnna anyị, n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ ebo ha si. Mgbe mba dị iche iche na-alụ agha, anyị na-adị njikere ikwe ka a tụọ anyị mkpọrọ ma ọ bụ ọbụna ka anyị nwụọ kama iburu ngwá agha gaa lụso ndị kwere ekwe ibe anyị ọgụ—ma ọ bụkwanụ onye ọ bụla ọzọ.—Jọn 17:14, 16; 1 Jọn 3:10-12.
13 Anyị ịdị njikere iji ndụ anyị chụọ àjà n’ihi ụmụnna anyị abụghị naanị ụzọ anyị ga-esi gosi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà. N’ezie, ọ bụghị anyị niile pụrụ ịnọ n’ebe ọ ga-adị mkpa ka anyị chụọ ụdị àjà ahụ dị ukwuu. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya nke na anyị pụrụ ịnwụ n’ihi ha, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị njikere ịchụ obere àjà dị iche iche n’ihi ha, na-agbalịsi ike inyere ha aka ugbu a? Ịchụ onwe anyị n’àjà pụtara ịhapụ ihe ụfọdụ baara anyị uru ma ọ bụ ihe na-atọ anyị ụtọ ka ndị ọzọ wee rite uru. Mkpa ha na ọdịmma ha na-adị anyị mkpa karịa nke anyị, ọ bụrụgodị na ọ dịrịghị anyị mfe. (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Olee ihe ụfọdụ anyị pụrụ ime iji gosi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà?
N’Ọgbakọ Nakwa n’Ezinụlọ
14. (a) Olee àjà ndị ọ dị mkpa ka ndị okenye na-achụ? (b) Olee otú obi dị gị n’ebe ndị okenye na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ unu nọ?
14 Ndị okenye ọgbakọ na-achụ ọtụtụ ihe n’àjà ka ha wee ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke.’ (1 Pita 5:2, 3) Ha na-elekọta ezinụlọ nke ha. Ọ pụkwara ịdị mkpa ka ha wepụta oge ná mgbede ma ọ bụ ná ngwụsị izu ịrụ ọrụ ọgbakọ, ma ịkwadebe ihe omume e kenyere ha, ma ịga nleta ọzụzụ atụrụ, ma ikpe ikpe. Ọtụtụ ndị okenye na-achụ àjà ndị ọzọ, ya bụ, ịrụsi ọrụ ike ná mgbakọ dị iche iche na ije ozi dị ka ndị so na Kọmitii Ndị Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ, Ndị Na-aga Eleta Ndị Ọrịa, tinyere ọrụ ndị ọzọ. Ndị okenye, unu echefula na mgbe unu wepụtara obi unu na-eje ozi—jiri oge unu, ike unu, na akụ̀ unu na-azụ atụrụ Chineke—unu na-egosi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà. (2 Ndị Kọrịnt 12:15) Ọ bụghị naanị na mgbalị unu na-eme n’achọghị naanị ọdịmma onwe unu na-atọ Jehova ụtọ, kama ọ na-atọkwa ọgbakọ unu na-azụ ụtọ.—Ndị Filipaị 2:29; Ndị Hibru 6:10.
15. (a) Olee àjà ụfọdụ ndị nwunye ndị okenye na-achụ? (b) Olee otú obi dị gị n’ebe ndị inyom ndị na-akwado di ha nọ, ndị na-ekwe ka di ha rụọrọ ọgbakọ unu ọrụ?
15 Ma, oleekwanụ banyere ndị nwunye ndị okenye—ọ̀ bụ na ndị inyom a ndị na-akwado di ha adịghị achụ ihe dị iche iche n’àjà ka di ha nwee ike ilekọta atụrụ Chineke? N’ezie, ọ bụ àjà ka nwunye na-achụ mgbe di ya ji oge ọ gaara eji soro ndị ezinụlọ ya nọrọ na-arụ ọrụ ọgbakọ. Cheekwa echiche banyere ndị nwunye ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na àjà ndị ha na-achụ ka ha wee soro di ha na-aga site n’ọgbakọ ruo n’ọgbakọ, sitekwa na sekit ruo na sekit. Ha na-ahapụ inwe ụlọ nke onwe ha. Ma eleghị anya, ha na-ehi ụra n’ihe ndina dị iche n’izu ọ bụla. Ndị nwunye, bụ́ ndị ji obi ha were ihe metụtara ọgbakọ dị ka ihe dị mkpa karịa ihe nke onwe ha, kwesịrị ka a jaa ha mma n’ihi ọtụtụ ụzọ ha si egosi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà.—Ndị Filipaị 2:3, 4.
16. Olee àjà dị iche iche Ndị Kraịst mụrụ ụmụ na-achụ n’ihi ụmụ ha?
16 Olee otú anyị pụrụ isi gosi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà n’ime ezinụlọ? Ndị mụrụ ụmụ, unu na-achụ ọtụtụ ihe n’àjà ka unu wee na-elekọta ụmụ unu, ‘na-azụlitekwa ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.’ (Ndị Efesọs 6:4) Ọ pụrụ ịbụ na unu na-arụ ọrụ na-agwụ ike ruo ọtụtụ awa ka unu wee nye ezinụlọ unu nri, ka unu wee hụkwa na ụmụ unu nwere uwe na ebe obibi kwesịrị ekwesị. Ọ na-akara unu mma ịhapụ ihe ga-abara unu uru kama ịhụ ka ihe ndị dị mkpa e ji ebi ndụ kọrọ ụmụ unu. Unu na-etinyekwa mgbalị dị ukwuu n’ịkụziri ụmụ unu ihe, n’ịkpọrọ ha gaa nzukọ Ndị Kraịst. Unu na ha na-ejekwa ozi ubi. (Diuterọnọmi 6:6, 7) Ịhụnanya unu nke ịchụ onwe onye n’àjà na-atọ Onye ahụ malitere ndụ ezinụlọ ụtọ. Ọ pụkwara ime ka ụmụ unu nweta ndụ ebighị ebi.—Ilu 22:6; Ndị Efesọs 3:14, 15.
17. Olee otú Ndị Kraịst bụ́ di pụrụ isi ṅomie àgwà Jizọs nke achọghị ọdịmma onwe ya naanị?
17 Ndị bụ́ di, olee otú unu pụrụ isi ṅomie Jizọs n’igosi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà? Baịbụl zara, sị: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Ndị Efesọs 5:25) Dị ka anyị hụworo, Jizọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya nke na ọ nwụrụ n’ihi ha. Di nke bụ́ Onye Kraịst na-eṅomi àgwà Jizọs nke achọghị ọdịmma onwe ya naanị. Jizọs “emeghị ihe masịrị onwe ya.” (Ndị Rom 15:3) Mkpa nwunye ya na ọdịmma nwunye ya na-adị di dị otú ahụ mkpa karịa nke onwe ya. Ọ naghị esi ọnwụ na a ga-emerịrị ihe ọ bụla otú dị ya mma, kama, ọ na-ekwe ka e mee ihe nwunye ya chọrọ ma ọ bụrụ na nke ahụ agaghị emebi ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ọ bụla. Di nke na-egosi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà na-enweta ihu ọma Jehova. Nwunye ya na ụmụ ya na-ahụ ya n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù.
Gịnị Ka Ị Ga-eme?
18. Gịnị na-akpali anyị iso iwu ọhụrụ nke bụ́ ịhụrịta ibe anyị n’anya?
18 Irube isi n’iwu ọhụrụ nke bụ́ ịhụrịta ibe anyị n’anya abụghị ihe dị mfe omume. Ma, anyị nwere ihe dị mkpa nke na-akpali anyị ime otú ahụ. Pọl dere, sị: “Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị, n’ihi na ihe anyị kwubiri bụ na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile . . . , ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.” (2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15) Ebe ọ bụ na Jizọs nwụrụ n’ihi anyị, ọ̀ bụ na nke ahụ ekwesịghị ịkpali anyị ịdịrị ya ndụ? Anyị pụrụ ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị esoro ihe nlereanya o setịpụrụ n’igosi ịhụnanya nke ịchụ onwe onye n’àjà.
19, 20. Olee onyinye dị oké ọnụ ahịa Jehova nyere anyị, oleekwa otú anyị pụrụ isi gosi na anyị nabatara ya?
19 Jizọs ekwubigaghị okwu ókè mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya nke karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) Nkweta o kwetara ịtọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi anyị bụ ihe kasị ukwuu nke gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. Ma, ọ dị onye ọzọ gosiri anyị ịhụnanya karịrị nke ahụ. Jizọs kọwara, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta, mee ka o kwee omume ịnapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. (Ndị Efesọs 1:7) Ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa nke Jehova nyere. Ma, ọ dịghị amanye anyị ịnara ya.
20 Ọ bụ anyị ka ọ dịịrị ịnara onyinye ahụ Jehova nyere. Olee otú anyị ga-esi nara ya? Ọ bụ site ‘n’inwe okwukwe’ n’Ọkpara ya. Otú ọ dị, okwukwe abụghị naanị ihe a na-ekwu n’ọnụ. A na-eji omume egosi ya, site n’otú anyị si ebi ndụ. (Jems 2:26) Anyị na-egosi na anyị nwere okwukwe na Jizọs Kraịst ma ọ bụrụ na anyị na-eso ya kwa ụbọchị. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị nweta ngọzi dị ukwuu, ma ugbu a ma n’ọdịnihu, dị ka isiokwu ikpeazụ n’akwụkwọ a ga-akọwa.
a A gbụrụ Jizọs ọnụ mmiri ugboro abụọ n’ụbọchị ahụ. Ọ bụ ndị ndú okpukpe bu ụzọ gbụọ ya ọnụ mmiri. E mesịa, ndị agha Rom gbụkwara ya ọnụ mmiri. (Matiu 26:59-68; 27:27-30) N’agbanyeghị mkparị ahụ, ọ tachiri obi n’atamughị ntamu, wee mezuo amụma e buru, nke sịrị: “Ewepụghị m ihu m iji zere mkparị na ịgbụ m ọnụ mmiri.”—Aịzaya 50:6.